Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) DISEMBA 2015

Jehova Ga-akwado Gị

Jehova Ga-akwado Gị

“Jehova ga-enye ya ume mgbe ọ nọ n’ute ọrịa.”—ỌMA 41:3.

ABỤ: 23, 138

1, 2. Gịnị ka anyị nwere ike ịna-eche mgbe ụfọdụ? Olee ihe Chineke mere n’oge ochie?

Ò NWETỤLA mgbe ị rịara ezigbo ọrịa, gị ana-eche, sị: ‘M̀ ga-agbakekwa n’ọrịa a?’ O nwekwara ike ịbụ na mgbe enyi gị ma ọ bụ onye ezinụlọ unu na-arịa ọrịa, ị nọ na-eche ma ahụ́ ọ̀ ga-emecha dị́ ya mma. Ọ bụghị ihe ọjọọ ma mmadụ chewe otú ahụ́ ga-esi dị́ ya mma. E nwere ndị eze abụọ chere ụdị ihe ahụ n’oge Ịlaịja na Ịlaịsha. Eze Ehazaya, bụ́ nwa Ehab na Jezibel, dara ada, rịawa ọrịa. N’ihi ya, ọ jụrụ, sị: ‘M̀ ga-agbakekwa n’ọrịa a?’ Ka oge na-aga, mgbe Eze Ben-hedad nke Siria na-arịa ọrịa, ọ jụrụ, sị: “M̀ ga-agbake n’ọrịa a?”—2 Eze 1:2; 8:7, 8.

2 N’eziokwu, anyị nwere olileanya na ihe ga-adịrị anyị na ndị anyị hụrụ n’anya mma. Ma, ọtụtụ ndị na-eche ihe Chineke ga-eme iji nyere ha aka. N’oge ndị eze ahụ, Chineke rụrụ ọrụ ebube mgbe ụfọdụ gwọọ ndị mmadụ ọrịa. O sikwa n’aka ndị amụma ya kpọlite ụfọdụ ndị n’ọnwụ. (1 Eze 17:17-24; 2 Eze 4:17-20, 32-35) Ànyị kwesịrị ịna-atụ anya na o nwere ike ime ụdị ihe ahụ n’oge anyị a?

3-5. Olee ike Chineke na Jizọs nwere? Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle?

3 Baịbụl kwuru banyere ụfọdụ ndị Chineke ji ọrịa taa ahụhụ. Ụfọdụ n’ime ha bụ Fero n’oge Ebreham na Miriam  nwanne Mozis. (Jen. 12:17; Ọnụ Ọgụ. 12:9, 10; 2 Sam. 24:15) Chineke gwara ndị Izrel na ọ bụrụ na ha ekwesịghị ntụkwasị obi, ọ ga-eme ka “ọrịa ọ bụla na ihe otiti ọ bụla” bịakwasị ha. (Diut. 28:58-61) Ma, e nwere mgbe ụfọdụ Jehova chebere ndị ya ka ha ghara ịrịa ọrịa. (Ọpụ. 23:25; Diut. 7:15) E nwekwara ndị ọ gwọrọ ọrịa ha. Dị ka ihe atụ, mgbe Job rịara ọrịa ma chewe na ọ ga-akara ya mma ịnwụ, Chineke gwọrọ ya.—Job 2:7; 3:11-13; 42:10, 16.

4 O doro anya na Jehova nwere ike ịgwọ ndị ọrịa. Jizọs nwekwara otu ike ahụ. Baịbụl kwuru na Jizọs gwọrọ ndị ekpenta, ndị akwụkwụ, ndị kpuru ìsì na ndị ahụ́ ha kpọnwụrụ akpọnwụ. (Gụọ Matiu 4:23, 24; Jọn 9:1-7) Obi na-esi anyị ezigbo ike ma anyị cheta na Jizọs ji ọrịa ndị ahụ ọ gwọrọ gosi ihe ka ukwuu ọ ga-eme n’ụwa ọhụrụ. N’oge ahụ, “ọ dịghị onye bi na ya nke ga-asị: ‘Ana m arịa ọrịa.’”—Aịza. 33:24.

5 Ma, ànyị kwesịrị ịtụ anya ka Chineke ma ọ bụ Jizọs rụọ ọrụ ebube gwọọ anyị ugbu a? Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ọrịa ndị tara akpụ anya? Gịnịkwa ka anyị kwesịrị ime banyere ha?

TỤKWASỊ JEHOVA OBI MGBE Ị NA-ARỊA ỌRỊA

6. Gịnị ka Baịbụl kwuru banyere “onyinye ịgwọ ọrịa” Chineke nyere ụfọdụ Ndị Kraịst oge mbụ?

6 Baịbụl gwara anyị na n’oge ndịozi Jizọs, Chineke nyere ụfọdụ Ndị Kraịst e tere mmanụ ike ịrụ ọrụ ebube. (Ọrụ 3:2-7; 9:36-42) N’oge ahụ, “onyinye ịgwọ ọrịa” so ‘n’onyinye dị iche iche’ nke mmụọ nsọ. (1 Kọr. 12:4-11) Ma, onyinye ndị ahụ na onyinye ndị ọzọ, dị́ ka ịsụ asụsụ dị́ iche iche na ibu amụma, mechara kwụsị. (1 Kọr. 13:8) Ha adịghịzi taa. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịtụ anya ka Chineke rụọ ọrụ ebube gwọọ anyị ma ọ bụ ndị anyị hụrụ n’anya.

7. Olee otú ihe e kwuru n’Abụ Ọma 41:3 si eme ka obi sie anyị ike?

7 Ma, anyị rịawa ọrịa, Jehova ga-akasi anyị obi, nye anyị amamihe ma kwado anyị otú ahụ o meere ndị fere ya n’oge ochie. Eze Devid dere, sị: “Obi ụtọ na-adịrị onye ji nghọta na-emeso onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ihe; Jehova ga-emere ya ụzọ mgbapụ n’ụbọchị ọdachi. Jehova ga-eche ya nche ma chebe ya ndụ.” (Ọma 41:1, 2) Anyị ma na, n’oge Devid, onye na-emere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ihe ọma agaghị adịrị ndụ na-aga ma ghara ịnwụ. N’ihi ya, ihe Devid kwuru apụtaghị na Chineke ga-arụ ọrụ ebube mee ka ụdị onye ahụ ghara ịnwụ, ya bụ, dịrịzie ndụ ebighị ebi. Anyị kwesịrị ịghọta na ihe ahụ o kwuru pụtara na Chineke ga-enyere onye tụkwasịrị ya obi otú ahụ aka. Olee otú ọ ga-esi enyere ya aka? Devid kwuru, sị: “Jehova ga-enye ya ume mgbe ọ nọ n’ute ọrịa; ị ga-agbanwe ihe ndina ya dum n’oge ọ na-arịa ọrịa.” (Ọma 41:3) Onye na-enyere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya aka kwesịrị inwe obi ike na Chineke ma ya, na-ahụkwa ihe ọma ọ na-eme. Ihe ọzọ bụ na otú Jehova si kee ahụ́ mmadụ mere ka o nwee ike ịna-alụso ọrịa ọgụ.

8. Gịnị ka Abụ Ọma 41:4 kwuru na Devid rịọrọ Jehova?

8 Devid kwuru banyere ihe mere ya. O kwuru, sị: “Mụ onwe m sịrị: ‘Jehova, biko, meere m amara. Gwọọ mkpụrụ obi m, n’ihi na emehiewo m gị.’” (Ọma 41:4) O nwere ike ịbụ na ọ na-ekwu banyere mgbe Absalọm gbalịrị ịnapụ ya ọchịchị, ọrịa ejide ya, o nweghịkwa ike idozi nsogbu ahụ. Devid echefughị iko ya na Bat-shiba kwara na nsogbu ọ kpataara ya n’agbanyeghị na Chineke agbagharala ya. (2 Sam. 12:7-14) Ma, obi siri ya ike na Chineke ga-akwado ya  n’ute ọrịa ya. Devid ọ̀ na-arịọ Jehova ka ọ rụọ ọrụ ebube gwọọ ya ma mee ka ọ dị ogologo ndụ?

9. (a) Gịnị ka Jehova meere Hezekaya nke dị́ iche n’ihe o meere Devid? (b) Gịnị ka Devid tụrụ anya ka Jehova meere ya?

9 Mgbe ọtụtụ afọ gara, Hezekaya “rịara ọrịa ruo n’ọnụ ọnwụ,” Chineke agwọọ ya, nke bụ́ ihe ọ na-anaghị emekarị. Hezekaya gbakere n’ọrịa ya ma dịkwuo ndụ afọ iri na ise. (2 Eze 20:1-6) Ma, Devid arịọghị Chineke ka ọ rụọ ọrụ ebube gwọọ ya. Ihe Devid kwuru n’amaokwu ndị ọzọ gosiri na ọ rịọrọ Jehova ka o nyere ya ụdị aka ahụ ọ na-enyere onye meere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ihe ọma. Ọ pụtara na ọ ga-akwado ya ‘n’ute ọrịa ya.’ Ebe ọ bụ na a gbagharala Devid mmehie ya, ọ rịọrọ Chineke ka ọ kasie ya obi, kwado ya ma nyere ya aka ka ọ gbakee. (Ọma 103:3) Anyị nwekwara ike ịrịọ Chineke ụdị ihe ahụ.

10. Gịnị mere Trọfimọs na Epafrọdaịtọs? Olee ihe ọ na-akụziri anyị?

10 Otú ahụ Jehova na-arụghị ọrụ ebube gwọọ Devid ka ọ na-arụghịkwa ọrụ ebube gwọọ Trọfimọs, bụ́ onye ya na Pọl jekọrọ ozi. O doro anya na e nwere mgbe ụfọdụ e nyere Pọl ike ịgwọ ndị ọrịa. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 14:8-10.) Ọ gwọrọ ‘nna Pọbliọs, bụ́ onye dina ala, ahụ́ ọkụ ejide ya, ya ana-anyụkwa ọbara.’ Pọl ‘kpere ekpere, bikwasị ya aka n’isi ma gwọọ ya.’ (Ọrụ 28:8) Ma, Pọl agwọghị Trọfimọs n’agbanyeghị na o so ya jee ozi ala ọzọ. (Ọrụ 20:3-5, 22; 21:29) Mgbe Trọfimọs malitere ịrịa ọrịa nke na ọ gaghị esoli Pọl gawa, Pọl agwọghị ya; kama ọ hapụrụ ya na Maịlitọs ka ọ gbakee. (2 Tim. 4:20) Onye ọzọ bụ ezigbo enyi Pọl a na-akpọ Epafrọdaịtọs. Mgbe “ọ dara ọrịa nke na ọ fọrọ nke nta ka ọ nwụọ,” Baịbụl ekwughị na Pọl gwọrọ ya.—Fil. 2:25-27, 30.

MEE IHE NDỊ I KWESỊRỊ IME

11, 12. Gịnị ka anyị ma banyere Luk, oleekwa aka o nwere ike ịbụ na o nyeere Pọl?

11 Luk bụ ọgwọ ọrịa. Ọ bụ ya dere akwụkwọ Ọrụ Ndịozi. O sokwa Pọl gaa ebe dị́ iche iche. (Kọl. 4:14; Ọrụ 16:10-12; 20:5, 6) O nwere ike ịbụ na ọ tụụrụ Pọl na ndị só ya jee ozi aro ihe ha ga-eme ma ha rịawa ọrịa, nyekwa aka gwọọ ha. N’ihi gịnị? N’ihi na Pọl rịadịrị ọrịa mgbe ọ na-eje ozi ala ọzọ. (Gal. 4:13) Luk gwọrọ ndị ọrịa otú ahụ Jizọs kwuru. Jizọs sịrị: “Mkpa ọgwọ ọrịa adịghị ndị ahụ́ dị mma, kama mkpa ya dị ndị ahụ́ na-enye nsogbu.”—Luk 5:31.

12 Baịbụl ekwughị ebe Luk mụrụ ịgwọ ọrịa ma ọ bụ mgbe ọ mụrụ ya. Ụfọdụ ndị ekwuola na ihe mere Pọl ji gwa Ndị Kraịst nọ́ na Kọlọsi na Luk bụ ọgwọ ọrịa bụ na ha ma onye ọ bụ. Ọ dabara adaba na e nwere ụlọ akwụkwọ ndị dọkịta na Leodisia, bụ́ ebe dị́ nso na Kọlọsi. Ihe ọ sọrọ ya bụrụ, Luk abụghị dọkịta adịgboroja nke na-atụrụ ndị mmadụ aro na-enweghị isi na ọdụ; ọ bụ dọkịta a zụrụ nke ọma. Ọ bụ ya mere o ji dee ọtụtụ ihe ndị dọkịta na-ekwu n’akwụkwọ Luk na Ọrụ Ndịozi, kọọkwa ọtụtụ ihe banyere ọrịa ndị Jizọs gwọrọ.

13. Gịnị ka anyị kwesịrị icheta tupu anyị atụọrọ ndị ọzọ aro gbasara ịgwọ ọrịa ma ọ bụkwanụ mee ihe a tụụrụ anyị n’aro?

13 Taa, e nweghị nwanna nwere ike ịrụ ọrụ ebube gwọọ ọrịa. Ma, ebe ọ bụ na ụmụnna anyị na-echere anyị echiche ọma, ụfọdụ nwere ike ịtụrụ anyị aro gbasara otú e si agwọ ọrịa, ọ bụrụgodị na anyị arịọghị ha. O doro anya na mmadụ nwere ike ịtụrụ anyị aro ga-abara anyị uru. Dị ka ihe atụ, Pọl gwara Timoti ka ọ na-aṅụ obere mmanya. Timoti na-arịakarị ọrịa afọ, ikekwe n’ihi  na ọ na-aṅụ mmiri na-adịghị mma. * (Gụọ 1 Timoti 5:23.) Ma, anyị kwesịrị ịkpachara anya. Nwanna nwere ike ịna-agwa anyị mgbọrọgwụ na mkpá akwụkwọ anyị ga-eji agwọ ọrịa na-arịa anyị ma ọ bụkwanụ gwawa anyị ụdị nri anyị ga-eri na ndị anyị ga-ezere. O nwere ike ikwu na ọ bụ ihe nyeere onye ezinụlọ ha nwere ụdị nsogbu ahụ aka. Ma, ọ pụtaghị na ọ ga-enyere anyị aka. Anyị kwesịrị icheta na ọgwụ ụfọdụ nwere ike ịkpata nsogbu n’agbanyeghị na ọtụtụ ndị na-aṅụ ya.—Gụọ Ilu 27:12.

GOSI NA Ị MA IHE

14, 15. (a) Olee ụdị ndị anyị kwesịrị ịkpachara anya banyere ha? (b) Olee otú Ilu 14:15 ga-esi nyere anyị aka mgbe a tụụrụ anyị aro gbasara ịgwọ ọrịa?

14 Anyị niile chọrọ ka ahụ́ sie anyị ike ka anyị nwee ike ịna-enwe obi ụtọ ma jiri ike anyị niile na-ejere Jehova ozi. Ma, anyị na-arịa ọrịa n’ihi na anyị ketara ezughị okè. Anyị rịawa ọrịa, e nwere ike inwe ụzọ dị́ iche iche e si agwọ ya. N’ihi ya, onye ọ bụla ga-eji aka ya kpebie otú ọ chọrọ ka e si gwọọ ya. Ọ dị mwute na anyaukwu emeela ka ọtụtụ ndị na-aghọgbu ndị ọrịa, na-apụnara ha ego ha. Ụfọdụ ndị na-ekwu na ha achọpụtala ụzọ ọhụrụ e si agwọ ọrịa nakwa na e sila otú ahụ gwọọ ọtụtụ ndị. Ma otu abụghị n’ezi. E nwekwara ndị na-agwa ndị mmadụ ka ha zụrụ ihe ndị dị́ oké ọnụ ka ha nwee ike irite nnukwu uru ahịa. Ihe ndị ahụ nwere ike ịmasị onye ọrịa, ebe ọ bụ na ọ na-agbalịsi ike ka ahụ́ dị́ ya mma. Ma, ka anyị cheta ndụmọdụ Baịbụl nyere anyị. Ọ sịrị: “Onye ọ bụla nke na-amaghị ihe na-ekweta okwu niile, ma onye maara ihe na-echebara nzọụkwụ ya echiche.”—Ilu 14:15.

15 Ọ bụrụ na anyị ma ihe, anyị ga-akpachara anya n’ihe anyị na-ekweta, karịchaa ma ọ bụrụ na onye na-atụrụ anyị aro ahụ abụghị ezigbo dọkịta. Anyị ga-ajụ onwe anyị, sị: ‘Onye a sịrị na ọgwụ a, mkpá akwụkwọ a, ma ọ bụ nri a nyeere ndị mmadụ aka, ma è nwere ihe gosiri na ọ bụ eziokwu? Ebe ọ bụ na ahụ́ ndị mmadụ abụghị otu, è nwere ihe kwesịrị ime ka obi sie m ike na ọ ga-enyere m aka? M̀ kwesịrị imekwu nchọnchọ ma ọ bụ gakwuru ụfọdụ ndị ụdị ọrịa a doro anya?’—Diut. 17:6.

16. Olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ichebara echiche iji gosi na anyị nwere ezi uche n’ihe gbasara ịgwọ ọrịa?

16 Baịbụl gwara anyị ka anyị ‘na-ebi ndụ n’uche zuru okè n’usoro ihe dị ugbu a.’ (Taị. 2:12) Anyị kwesịrị igosi na anyị nwere uche, nke ka nke, ma ọ bụrụ na otú a chọrọ isi chọpụta ihe na-arịa anyị ma ọ bụ gwọọ anyị yiri ihe a na-ahụtụbeghị ma ọ bụ ihe omimi. Onye ahụ ò nwere ike ịkọwa ya nke ọma? Ọ̀ na-ada ka ihe na-eme eme? Ọtụtụ ndị dọkịta hà kwetara na e nwere ike isi otú ahụ gwọọ mmadụ? (Ilu 22:29) Ka ọ̀ bụ naanị ihe e ji akọju mmadụ isi? E nwere ike na-ekwu na e mepụtara ya ma ọ bụ jiri ya gwọọ mmadụ n’obodo dị́ ezigbo anya, ka à ga-asị na e zochiiri ya ndị ọkachamara n’oge anyị a. Mmadụ ò kwesịrị igewe ụdị akụkọ ahụ ma ọ bụ kweta ya? E nwere ụzọ ụfọdụ e si agwọ ọrịa ndị a sịrị na ha bụ ihe nzuzo ma ọ bụ na ike e ji agwọ ya edochabeghị anya. Anyị kwesịrị ịkpachara ezigbo anya n’ihi na Chineke gwara anyị ka anyị zere “ime anwansi” na ndị na-agba afa.—Aịza. 1:13; Diut. 18:10-12.

 “NỌRỌNỤ NKE ỌMA!”

17. Olee ihe onye ọ bụla n’ime anyị chọrọ?

17 N’oge ndịozi Jizọs, òtù na-achị isi zigaara ọgbakọ dị́ iche iche akwụkwọ ozi, gwa ha ihe ụfọdụ ha kwesịrị izere. Ná ngwụcha akwụkwọ ozi ahụ, òtù na-achị isi dere, sị: “Ọ bụrụ na unu elezie anya zere ihe ndị a, ọ ga-adịrị unu mma. Nọrọnụ nke ọma!” (Ọrụ 15:29) N’asụsụ ụfọdụ, ụzọ ọzọ e nwere ike isi sụgharịa ‘nọrọnụ nke ọma’ bụ “ka ahụ́ sie unu ike.” N’eziokwu, ka anyị na-ejere Chineke anyị ozi, anyị chọrọ ka ahụ́ sie anyị ike.

Ka anyị na-ejere Chineke ozi, anyị chọrọ ka ahụ́ sie anyị ike (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)

18, 19. Gịnị ka anyị na-atụ anya ga-eme n’ụwa ọhụrụ?

18 Ebe anyị bụ mmadụ na-ezughị okè, ọrịa agaghị ala ala n’ụwa ochie a. Anyị ekwesịghị ịtụ anya ugbu a ka Jehova rụọ ọrụ ebube gwọọ anyị. Ma, Mkpughe 22:1, 2 kwuru banyere mgbe a ga-agwọ anyị ọrịa niile. Jọn onyeozi hụrụ “osimiri nke mmiri nke ndụ” na “osisi nke ndụ” a ga-eji akwụkwọ ya ‘gwọọ mba niile.’ Ọ naghị ekwu banyere iji mgbọrọgwụ na mkpá akwụkwọ agwọ ọrịa ugbu a ma ọ bụ n’ọdịnihu. Kama ọ na-ekwu banyere otú Jehova ga-esi sí n’aka Jizọs Kraịst mee ka ndị na-erubere ya isi nweta ndụ ebighị ebi. N’eziokwu, anyị kwesịrị ịna-atụsi anya ya ike.—Aịza. 35:5, 6.

19 Ka anyị na-echere oge ahụ dị́ ebube, anyị ma na ihe banyere anyị na-emetụ Jehova n’obi, ọ bụrụgodị na anyị na-arịa ọrịa. Obi kwesịrị isi anyị ike, otú ahụ o siri Devid, na Chineke anyị ga na-akwado anyị mgbe ọ bụla anyị na-arịa ọrịa. Anyị nwekwara ike ikwu ihe Devid kwuru. Ọ sịrị Jehova: “Ị kwadowo m n’ihi iguzosi ike n’ezi ihe m, ị ga-emekwa ka m nọrọ n’ihu gị ruo mgbe ebighị ebi.”—Ọma 41:12.

^ para. 13 Otu akwụkwọ nke kọrọ banyere otú e si malite ime mmanya n’oge ochie kwuru na ndị sayensị achọpụtala na nje ndị na-akpata ọrịa taịfọd nakwa nje ndị ọzọ na-anwụ ozugbo e tinyere ha n’ime mmanya.