Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) DISEMBA 2015

Jiri Ire Gị Na-ekwu Okwu Ọma

Jiri Ire Gị Na-ekwu Okwu Ọma

“Ka ihe ọnụ m na-ekwu . . . bụrụ ihe na-atọ gị ụtọ, Jehova.”—ỌMA 19:14.

ABỤ: 82, 77

1, 2. Gịnị mere Baịbụl ji jiri ọkụ tụnyere ire anyị?

N’ỌNWA iri n’afọ 1871, ọkụ malitere ịgba n’ọhịa dị́ na Wiskọnsịn, dị́ n’Amerịka. Ọkụ ahụ gbasara n’egbughị oge ma repịa ihe dị́ ka ijeri osisi abụọ, taakwa isi ihe karịrị otu puku mmadụ na narị abụọ. E nwetụbeghị ọkụ gbagburu ọtụtụ ndị otú ahụ n’Amerịka. Ihe kpatara ọkụ ahụ nwere ike ịbụ obere ọkụ sí n’ụgbọ okporo ígwè na-agbafe ebe ahụ. Ihe ahụ merenụ na-echetara anyị ihe Baịbụl kwuru na Jems 3:5. Ọ sịrị: “Lee ntakịrị ọkụ ọ na-ewe iji suo oké ọhịa ọkụ!” Gịnị mere Jems ji kwuo ihe a?

2 O kwuru n’amaokwu nke isii, sị: “Ire bụ ọkụ.” Ire nọchiri anya okwu anyị na-ekwu. Otú ahụ ọkụ nwere ike ibibi nnukwu ihe ka okwu anyị nwekwara ike ịkpata ezigbo nsogbu. Baịbụl kwudịrị na “ọnwụ na ndụ dị ire n’aka.” (Ilu 18:21) Ma, ọ̀ pụtara na anyị ga-akwụsị ikwu okwu ka anyị ghara ikwu ihe na-adịghị mma? Mbanụ. Anyị agaghị akwụsị iji ọkụ eme ihe dị́ anyị mkpa naanị n’ihi na anyị achọghị ka ọ gbaa anyị. Kama, anyị ga na-akpachapụ anya. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịnya ọkụ, jirikwa ya sie nri ma ọ bụ hụ ụzọ n’abalị. Otú ahụ ka ọ dị n’ihe anyị na-ekwu. Ọ bụrụ na anyị akpachara anya, anyị nwere ike iji ire anyị  too Jehova, kwuokwa ihe ga-abara ndị ọzọ uru.—Ọma 19:14.

3. Olee ihe atọ anyị ga-atụle gbasara okwu anyị?

3 Ma ihe anyị ji ekwu okwu ọ̀ bụ ọnụ ma ọ̀ bụ aka, Jehova mere ka anyị nwee ike ịna-agwa ndị ọzọ ihe anyị chere na otú obi dị anyị. Oleekwanụ otú anyị ga-esi jiri onyinye a Chineke nyere anyị na-agba ndị ọzọ ume? (Gụọ Jems 3:9, 10.) Anyị ga-eleba anya n’ihe atọ dị́ mkpa gbasara okwu anyị, ya bụ, mgbe anyị kwesịrị ikwu okwu, ihe anyị kwesịrị ikwu, na otú anyị kwesịrị isi ekwu ya.

MGBE ANYỊ KWESỊRỊ IKWU OKWU

4. Olee mgbe anyị kwesịrị ịgbachi nkịtị?

4 Ikwu okwu so n’ihe ndị anyị na-eme kwa ụbọchị. Ma ọ bụghị mgbe niile ka anyị kwesịrị ịna-ekwu okwu. Baịbụl kwuru na e nwere “oge ịgbachi nkịtị.” (Ekli. 3:7) Dị ka ihe atụ, ịgbachi nkịtị mgbe ndị ọzọ na-ekwu okwu na-egosi na anyị na-akwanyere ha ùgwù. (Job 6:24) Ọ bụrụ na anyị anụ okwu nzuzo ma ghara ịgwa ya ndị ọzọ, ọ ga-egosi na anyị ma ihe ma nwee nghọta. (Ilu 20:19) Ihe ọzọ ga-egosi na anyị ma ihe bụ ịgbachi nkịtị ma ndị ọzọ kpasuo anyị iwe.—Ọma 4:4.

5. Olee otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka onyinye ikwu okwu Jehova nyere anyị?

5 Ma, Baịbụl kwukwara na e nwere “oge ikwu okwu.” (Ekli. 3:7) Ọ bụrụ na enyi anyị enye anyị ọmarịcha onyinye, anyị agaghị edewe ya n’ebe a na-agaghị ahụ ya. Kama, anyị ga-eji ya na-eme ihe bara uru iji gosi na obi dị anyị ụtọ maka ya. Otú anyị si egosi na obi dị anyị ụtọ maka onyinye ikwu okwu Jehova nyere anyị bụ iji ya na-eme ihe bara uru. Anyị nwere ike iji ya na-ekwu otú obi dị anyị na ihe dị́ anyị mkpa, jirikwa ya na-agba ndị ọzọ ume ma na-eto Chineke. (Ọma 51:15) Olee otú anyị ga-esi mata mgbe anyị kwesịrị “ikwu okwu”?

6. Olee otú Baịbụl si gosi na ọ dị mkpa ka anyị mata mgbe anyị kwesịrị ikwu okwu?

6 Ihe e kwuru n’Ilu 25:11 na-egosi na ịmata mgbe anyị kwesịrị ikwu okwu dị ezigbo mkpa. O kwuru, sị: “Dị ka mkpụrụ osisi apụl ọlaedo nke dị n’ime ihe e ji ọlaọcha tụọ, otú ahụ ka okwu e kwuru n’oge kwesịrị ya dị.” Apụl ọlaedo na-ama ezigbo mma. Ma, ọ na-amakwu mma ma é tinye ya n’ihe e ji ọlaọcha mee. Otú ahụ ka okwu anyị dị. Ihe anyị chọrọ ikwu nwere ike ịdị mma, ma ọ ga-adịkwu mma ma anyị kwuo ya n’oge kwesịrị ekwesị. Olee otú anyị ga-esi mara mgbe anyị kwesịrị ikwu okwu?

7, 8. Olee otú ụmụnna anyị bí na Japan si mee ka Jizọs?

7 Ihe anyị chọrọ ikwu nwere ike ịbara ndị anyị na-agwa okwu uru. Ma anyị kwuo ya n’oge na-ekwesịghị ekwesị, o nwere ike ha agaghị aghọta ya. (Gụọ Ilu 15:23.) Dị ka ihe atụ, n’ọnwa atọ n’afọ 2011, ala ọma jijiji mere ka mmiri sí n’oké osimiri bibie ọtụtụ obodo na Japan. Ihe karịrị puku mmadụ iri na ise nwụrụ. N’agbanyeghị na Ndịàmà Jehova so ná ndị ihe ahụ mere, ha ji Baịbụl kasie ndị mmadụ obi n’oge ahụ. Ma, ọtụtụ n’ime ndị ahụ ha na-akasi obi na-ekpe okpukpe Buda, ha amachaghị gbasara Baịbụl. N’ihi ya, kama ịgwawa ha banyere mbilite n’ọnwụ, ụmụnna anyị kasiri ha obi ma kọwaara ha ihe mere ụdị ihe ahụ ji eme ndị bụ́ ezigbo mmadụ.

8 Jizọs ma mgbe o kwesịrị ịgba nkịtị na mgbe o kwesịrị ikwu okwu. (Jọn 18:33-37; 19:8-11) E nwere mgbe ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “M ka nwere ọtụtụ ihe m ga-agwa unu, ma unu apụghị ịghọta ha ugbu a.” (Jọn 16:12) Ụmụnna  anyị ndị ahụ bí na Japan mere ka Jizọs. Mgbe afọ abụọ na ọkara gachara, ha so ụmụnna ha n’ụwa niile kesaa Akụkọ Alaeze nke 38, nke isiokwu ya bụ “Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Ga-adị Ndụ Ọzọ?” N’oge ahụ, ọtụtụ ndị naara traktị ahụ, ihe o kwuru banyere mbilite n’ọnwụ kasikwara ha obi. Obodo ọ bụla nwere omenala nke ha, ihe ndị mmadụ kweere dịkwa iche iche. N’ihi ya, anyị kwesịrị ileru anya ka anyị mata mgbe anyị kwesịrị ịgwa ndị bí n’ókèala anyị okwu.

9. Olee oge ndị ọzọ anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị mata mgbe anyị kwesịrị ikwu okwu?

9 E nwere oge ndị ọzọ anyị kwesịrị ịmata mgbe anyị kwesịrị ikwu okwu. Dị ka ihe atụ, mmadụ nwere ike ikwu ihe were anyị iwe n’agbanyeghị na o bughị ihe ọjọọ n’obi. Ọ ga-adị mma ka anyị kwụsịtụ chee ma ànyị kwesịrị ịsa onye ahụ okwu. Ọ bụrụ na anyị kwesịrị ikwu okwu, ọ gaghị adị mma ka anyị gakwuru onye ahụ mgbe iwe ji anyị, nke nwere ike ime ka anyị kwuo ihe na-adịghị mma. (Gụọ Ilu 15:28.) Anyị kwesịkwara ịkpachara anya mgbe anyị na-agwa ndị ezinụlọ anyị na-abụghị Ndịàmà Jehova banyere eziokwu Baịbụl. Ọ bụ eziokwu na anyị chọrọ ka ha bịa fewe Jehova, ma anyị kwesịrị inwe ndidi, chebara ihe anyị chọrọ ikwu echiche. Ikwu ihe dị́ mma n’oge kwesịrị ekwesị nwere ike ime ka ha gee anyị ntị.

IHE ANYỊ KWESỊRỊ IKWU

10. (a) Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-ekwu ihe kwesịrị ekwesị? (b) Olee ụdị okwu anyị na-ekwesịghị ịna-ekwu?

10 Ihe anyị kwuru nwere ike ịgba mmadụ ume ma ọ bụ gbawaa ya obi. (Gụọ Ilu 12:18.) N’ụwa Setan a, ọtụtụ ndị na-eji ire ha ekwu ihe ga-agbawa ndị ọzọ obi. Fim na tiivi na-akụziri ha ‘ịmụ ire ha amụ dị ka mma agha’ na iji “okwu ọjọọ” na-agba ndị ọzọ ka akụ́. (Ọma 64:3) Onye Kraịst ekwesịghị ịna-eme otú ahụ. Njakịrị so n’okwu ọjọọ ndị mmadụ na-ekwukarị, ya bụ, okwu e ji akparị mmadụ ma ọ bụ akọ ya ọnụ. Njakịrị nwere ike ịna-atọ ọchị, ma e nwere ike iji ya mee ka mmadụ yie onye iberiibe. Ụdị njakịrị ahụ so n’okwu ọjọọ Ndị Kraịst kwesịrị izere. Ikwu ihe na-atọ ọchị adịghị njọ. Ma, anyị ekwesịghị ikwu ihe ga-ewe mmadụ iwe ma ọ bụ ihe ga-emenye ya ihere iji mee ka a chịa ọchị. Baịbụl kwuru, sị: “Ka okwu rere ure ghara isi unu n’ọnụ pụta, kama nke ahụ, ka ọ bụrụ okwu dị mma maka iwuli elu dị ka ọ pụrụ ịdị mkpa, ka o wee mee ka ndị na-anụ ya nweta ihe dị mma.”—Efe. 4:29, 31.

11. Olee ihe ga-enyere anyị aka ịna-ekwu ihe kwesịrị ekwesị?

11 Jizọs kwuru na “ọ bụ ihe jupụtara mmadụ n’obi ka ọnụ ya na-ekwu.” (Mat. 12:34) Ọ pụtara na ihe anyị na-ekwu na-egosi ihe dị́ anyị n’obi. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị hụrụ ndị mmadụ n’anya, na-echekwa banyere ha, anyị ga na-ekwu ihe dị́ mma na ihe ga-agba ha ume.

12. Olee ihe ọzọ nwere ike inyere anyị aka ịna-ekwu ihe anyị kwesịrị ikwu?

12 Onye chọrọ ikwu okwu kwesịrị ekwesị ga-ebu ụzọ chee echiche nke ọma. N’agbanyeghị na Eze Sọlọmọn ma ihe, “o chemiri echiche, meekwa nchọpụta nke ọma” ka ọ ‘chọta okwu dị ụtọ ma dee okwu ziri ezi bụ́ eziokwu.’ (Ekli. 12:9, 10) Ọ̀ na-esikarịrị gị ike icheta okwu ọma ị ga-ekwu? Ọ bụrụ otú ahụ, i nwere ike ịgba mbọ mụta okwu dị́ iche iche mmadụ nwere ike ikwu. Otú i nwere ike isi eme ya bụ ileru anya n’ihe ndị e kwuru na Baịbụl nakwa n’akwụkwọ anyị ka ị mụta ụzọ ọhụrụ i nwere ike isi na-ekwu ihe dị́ gị n’obi. Ị hụ okwu ndị  ị na-amaghị, gbalịa mata ihe ha pụtara. Anyị nwekwara ike ịmụ banyere ihe Jizọs mere iji mata otú anyị ga-esi na-ekwu ihe ga-abara ndị ọzọ uru. Ọ ma ihe o kwesịrị ikwu n’ihi na Jehova kụziiri ya ‘otú ọ ga-esi zaa onye ike gwụrụ okwu.’ (Aịza. 50:4) Iwepụta oge chebara ihe anyị chọrọ ikwu echiche nwere ike inyere anyị aka ịmata ihe anyị kwesịrị ikwu. (Jems 1:19) Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị, ‘M kwuo ihe a, onye nụrụ ya ọ̀ ga-aghọta ihe m chọrọ ịgwa ya? Olee otú obi ga-adị ya?’

13. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-ekwu okwu ga-adị mfe nghọta?

13 N’Izrel oge ochie, e nwere ụda opi ndị mmadụ ga-anụ, ha ezukọta. E nwere nke ha ga-anụ, ha agbasaa, nweekwa nke a ga-afụ, ndị agha ejikere agha. Ọ dabara adaba na Baịbụl ji ụda opi mee ihe atụ iji gosi na anyị kwesịrị ịna-ekwu ihe dị́ mfe nghọta. Chegodị ihe ga-eme ndị agha ma ọ bụrụ na opi a fụrụ edoghị anya. E nwere ike iji ya tụnyere okwu anyị. Ọ bụrụ na ihe anyị kwuru edoghị anya, o nwere ike ịgba ndị mmadụ gharịị ma ọ bụ duhie ha. Ma, ikwu okwu doro anya apụtaghị na anyị agaghị eji akọ ekwu okwu ma ọ bụ dowe ọnụ otú masịrị anyị na-ekwu okwu.—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 14:8, 9.

14. Nye ihe atụ gosiri na Jizọs kwuru ihe dị́ mfe nghọta.

14 Jizọs gosiri otú e si ekwu ihe kwesịrị ekwesị. Chegodị banyere ihe ọ kụziri, nke e dere na Matiu isi ise ruo isi asaa. Ọ dị nkenke ma na-eru n’obi. Jizọs ekwughị okwu ga-agba ndị mmadụ gharịị ma ọ bụ okwu na-enweghị isi na ọdụ. O kwughịkwa ihe ga-ewute ndị ọzọ. Kama, o kwuru ihe dị́ mfe nghọta, nke ga-eru ndị mmadụ n’obi. Dị ka ihe atụ, o kwuru banyere otú Jehova si enye ụmụ nnụnụ nri iji mee ka ndị mmadụ ghọta na ha ekwesịghị ịna-echegbu onwe ha banyere ihe ha ga-eri n’ụbọchị. Ọ jụziri ndị ọ na-agwa okwu, sị: “Ọ̀ bụ na unu adịghị oké ọnụ ahịa karịa ha?” (Mat. 6:26) O si otú ahụ kwuo ihe dị́ mfe nghọta, nke na-erukwa n’obi. Ka anyị lebazie anya n’ihe nke atọ gbasara okwu anyị.

OTÚ ANYỊ KWESỊRỊ ISI NA-EKWU OKWU

15. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-agwa ndị mmadụ okwu ọma?

15 Otú anyị si ekwu okwu dịkwa mkpa otú ahụ ihe anyị na-ekwu dị. Mgbe Jizọs nọ na-ekwu okwu n’ụlọ nzukọ dị́ n’obodo ya bụ́ Nazaret, “okwu ọma ndị si n’ọnụ ya na-apụta” tụrụ ndị mmadụ n’anya. (Luk 4:22) Okwu ọma anyị kwuru na-eru ndị mmadụ n’obi, ma ọ pụtaghị na okwu anyị anaghị akpa ike. Nke bụ́ eziokwu bụ na ikwu okwu ọma ga-eme ka ndị mmadụ kweta ihe anyị na-agwa ha. (Ilu 25:15) Anyị kwesịrị iṅomi Jizọs. Otú anyị ga-esi eme ya bụ iji obiọma na-agwa ndị ọzọ okwu, na-akwanyere ha ùgwù ma na-echebara ha echiche. Mgbe Jizọs hụrụ mbọ ìgwè mmadụ gbara bịa igere okwu ya, o nweere ha ọmịiko ma “malite izi ha ọtụtụ ihe.” (Mak 6:34) Mgbe ndị mmadụ nọkwa na-ekwujọ ya, ọ sịghị ka o kwujọgwara ha.—1 Pita 2:23.

16, 17. (a) Olee otú anyị ga-esi ṅomie Jizọs mgbe anyị na-agwa ndị ezinụlọ anyị na ndị enyi anyị n’ọgbakọ okwu? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Nye ihe atụ gosiri uru okwu ọma na-aba.

16 O nwere ike isiri anyị ike ikwu okwu ọma ma ọ bụrụ na onye anyị na-agwa okwu bụ onye anyị ma nke ọma. Anyị nwere ike ichewe na anyị ekwesịghị ịkpachara anya n’otú anyị si agwa ya okwu. Ụdị ihe a nwere ike ime ma anyị gwawa onye ezinụlọ anyị ma ọ bụ  ezigbo enyi anyị n’ọgbakọ okwu. Jizọs ò chere na ebe ọ bụ na ya na ndị na-eso ụzọ ya dị n’ezigbo mma, na ya nwere ike ịgwawa ha okwu ọjọọ? Mba. Mgbe ha nọ na-arụrịta ụka banyere onye ka ibe ya ukwuu, Jizọs ji obiọma gbazie ha ma jiri otu nwatakịrị kụziere ha na ha kwesịrị ịgbanwe otú ha si eche echiche. (Mak 9:33-37) Otú ndị okenye nwere ike isi ṅomie Jizọs bụ iji “mmụọ dị nwayọọ” na-enye ndị ọzọ ndụmọdụ.—Gal. 6:1.

17 Mmadụ gwa anyị okwu were anyị iwe, iji obiọma zaghachi onye ahụ nwere ike ịba uru. (Ilu 15:1) Dị ka ihe atụ, otu onye na-eto eto naanị mama ya na-azụ malitere ibi ndụ ihu abụọ. Otu nwanna nwaanyị na-ebughị ihe ọjọọ n’obi asị mama ya: “Ọ dị mwute na ị maghị otú e si azụ nwa.” Mama nwa ahụ echetụ echiche, sị ya: “Ọ bụ eziokwu na ihe anaghị aga otú o kwesịrị ugbu a, ma azụchabeghị m ya. Gwa m ya ma Amagedọn gachaa; ọ bụ mgbe ahụ ka anyị ga-amata ma m̀ zụtara ya.” Otú a o si jiri obiọma zaghachi ya mere ka ha abụọ ghara ise okwu, gbaakwa nwa ya nwoke ahụ ume n’ihi na ọ nọ na-ege ihe ha abụọ na-ekwurịta. Ọ ghọtara na ike ya agwụbeghị mama ya. N’ihi ya, ọ kwụsịrị iso ndị enyi ọjọọ. Ka oge na-aga, e mere ya baptizim, ya emechaa jee ozi na Betel. Ma ndị anyị na ha nọ hà bụ ụmụnna anyị, ndị ezinụlọ anyị, ma ọ bụ ndị anyị na-amaghị, anyị kwesịrị ime ‘ka okwu anyị dịrị n’amara mgbe niile, ka ọ bụrụ ihe e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ.’—Kọl. 4:6.

18. Olee otú iṅomi Jizọs ga-esi nyere anyị aka iji ire anyị na-ekwu ihe dị́ mma?

18 Jehova mere ka anyị nwee ike ịna-agwa ndị ọzọ ihe anyị chere na otú obi dị anyị. Ọ bụ onyinye magburu onwe ya o nyere anyị. Iṅomi Jizọs pụtara na anyị ga na-ekwu okwu n’oge kwesịrị ekwesị, na-akpachara anya n’ihe anyị na-ekwu, na-ekwukwa okwu ọma. Anyị mee otú ahụ, okwu ọnụ anyị ga na-agba ndị ọzọ ume, na-emekwa Jehova obi ụtọ.