Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) DISEMBA 2015

Jehova Bụ Chineke nke Na-agwa Ndị Mmadụ Okwu

Jehova Bụ Chineke nke Na-agwa Ndị Mmadụ Okwu

“Biko, gee ntị, mụ onwe m ga-ekwukwa okwu.”—JOB 42:4.

ABỤ: 113, 114

1-3. (a) Gịnị mere echiche Chineke na asụsụ ya ji ka nke ụmụ mmadụ? (b) Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu a?

JEHOVA kere ndị mmụọ ozi na ndị mmadụ n’ihi na ọ chọrọ ka ndị ọzọ dị́ ndụ, na-enwekwa obi ụtọ otú ahụ ọ na-enwe. (Ọma 36:9; 1 Tim. 1:11) Jọn onyeozi kpọrọ Ọkpara Chineke “Okwu ahụ” na “mmalite nke ihe Chineke kere.” (Jọn 1:1; Mkpu. 3:14) Jehova Chineke gwara Ọkpara ya ihe o bu n’obi nakwa otú obi dị ya. (Jọn 1:14, 17; Kọl. 1:15) Pọl onyeozi kwuru banyere ‘asụsụ ndị mmụọ ozi,’ ya bụ, asụsụ e ji ekwurịta okwu n’eluigwe, nke na-adịghị ka asụsụ ndị mmadụ.—1 Kọr. 13:1.

2 Jehova ma ihe niile banyere ọtụtụ ijeri ndị mmụọ ozi nakwa ụmụ mmadụ o kere. Ọ na-anụ ekpere ọtụtụ nde mmadụ na-ekpegara ya otu mgbe, na-aghọtakwa ihe ha na-ekwu n’asụsụ ọ bụla ha ji kpee ya. Ka ọ na-ege ekpere ndị ahụ, ya na ndị mmụọ ozi na-akparịta ụka, ya ana-agwa ha ihe ha ga-eme. Iji mee ihe ahụ niile, echiche Jehova na asụsụ ya ga-akarị echiche ụmụ mmadụ na asụsụ ha. (Gụọ Aịzaya 55:8, 9.) O doro anya na mgbe Jehova na-agwa ndị mmadụ okwu, ọ na-eme ka okwu ya dị́ mfe ka ha nwee ike ịghọta ya.

3 N’isiokwu a, anyị ga-amụta otú Jehova si agwa ndị mmadụ ihe ga-edo ha anya. Anyị ga-ahụkwa otú o si agbanwe  asụsụ o ji agwa ndị mmadụ okwu n’ihi ihe ọ chọrọ ikwu na ndị ọ na-agwa ya.

OTÚ CHINEKE SI GWA NDỊ MMADỤ OKWU

4. (a) Olee asụsụ Jehova ji gwa Mozis, Samuel, na Devid okwu? (b) Gịnị ka e dere na Baịbụl?

4 O nwere ike ịbụ asụsụ Hibru oge ochie ka Jehova ji gwa Adam okwu n’ogige Iden. Ka oge na-aga, Jehova gwara Mozis, Samuel, Devid, na ndị ọzọ okwu. N’agbanyeghị na ha ji asụsụ Hibru dee ihe ọ gwara ha n’okwu nke aka ha nakwa otú ha si ede ihe, ihe ha dere bụ echiche Chineke. Ha dere ihe Jehova gwara ha, deekwa banyere otú Chineke na ndị ya si mekọọ ihe. Dị ka ihe atụ, Baịbụl gwara anyị banyere okwukwe ha na otú ha si hụ Chineke n’anya nakwa ihe ndị ha mejọrọ na otú ha si nupụrụ Chineke isi. Ihe a niile ha dere na-abara anyị ezigbo uru taa.—Rom 15:4.

5. Ọ̀ bụ naanị asụsụ Hibru ka Jehova ji gwa ndị mmadụ okwu? Kọwaa.

5 Ka ihe na-agbanwe, Chineke jikwa asụsụ na-abụghị Hibru gwa ndị mmadụ okwu. Mgbe ndị Izrel si Babịlọn lọta, ụfọdụ n’ime ha na-asụzi asụsụ Arameik. O nwere ike ịbụ ihe mere Daniel, Jeremaya, na Ezra ji dee ebe ụfọdụ na Baịbụl n’asụsụ Arameik. *

6. Olee otú e si sụgharịa Akwụkwọ Nsọ Hibru n’asụsụ Grik?

6 Alegzanda Onye Ukwu meriri ọtụtụ ebe n’ụwa, nke mere ka a na-asụzi ụdị asụsụ Grik a na-akpọ Koine n’ọtụtụ mba. Ọtụtụ ndị Juu malitere ịsụ asụsụ ahụ. Ọ bụ ya mere e ji sụgharịa Akwụkwọ Nsọ Hibru n’asụsụ Grik. E mechara kpọwa Akwụkwọ Nsọ ahụ a sụgharịrị Septuagint. Ọ bụ ya bụ Baịbụl mbụ a sụgharịrị. O sokwa ná ndị kacha mkpa. Ndị ọkachamara kwuru na ndị sụgharịrị ya dị iri mmadụ asaa na abụọ. * Ka oge na-aga, ọtụtụ ndị ọzọ sụgharịrị Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ụfọdụ n’ime ha sụgharịrị ihe mkpụrụ okwu nke ọ bụla pụtara, ma ụfọdụ emeghị otú ahụ. Ma, obi siri ndị Juu na Ndị Kraịst na-asụ asụsụ Grik ike na Septuagint bụ Okwu Chineke.

7. Olee asụsụ o nwere ike ịbụ na Jizọs ji na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya ihe?

7 Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o nwere ike ịbụ asụsụ Hibru ka o ji na-akụziri ndị mmadụ ihe. (Jọn 19:20; 20:16; Ọrụ 26:14) O nwekwara ike ịbụ na o kwuru ihe ụfọdụ n’asụsụ Arameik a na-asụ n’oge ahụ. Ma, ọ makwa asụsụ Hibru a sụrụ n’oge Mozis na ndị amụma, bụ́ ndị a na-agụpụta ihe ndị ha dere n’ụlọ nzukọ kwa izu. (Luk 4:17-19; 24:44, 45; Ọrụ 15:21) N’oge ahụ, a na-asụkwa Grik na Latịn n’Izrel. Ma, Akwụkwọ Nsọ ekwughị ma Jizọs ọ̀ sụrụ asụsụ ndị ahụ.

8, 9. Ka ozi ọma na-agbasa, gịnị mere ọtụtụ Ndị Kraịst ji na-asụ Grik? Olee ihe ọ na-akụziri anyị banyere Jehova?

8 Ndị mbụ soro ụzọ Jizọs sụrụ asụsụ Hibru. Ma mgbe Jizọs nwụchara, ndị na-eso ụzọ ya malitere ịsụ asụsụ ndị ọzọ. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 6:1.) Ka ozi ọma na-agbasa, ọtụtụ Ndị Kraịst na-asụzi Grik, kama ịsụ Hibru. Ebe ọ bụ na a na-asụkarị Grik mgbe ahụ, a nọ na-ekesa akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn n’asụsụ Grik. * Ọ bụkwa  Grik ka Pọl na ndị ọzọ ji dee akwụkwọ Baịbụl ndị ha dere.

9 Anyị kwesịrị iburu n’obi na mgbe ndị dere Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst na-ede ihe e kwuru n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, ha na-edekarị ya otú e si sụgharịa ya na Septuagint. Mgbe ụfọdụ, ihe ha dere na-adịtụ iche n’otú e si kwuo ya n’asụsụ Hibru mbụ e ji dee Baịbụl. Otú ahụ ka ihe ndị mmadụ na-ezughị okè sụgharịrị si soro n’ihe dị́ na Baịbụl e nwere taa. Ihe a na-akụziri anyị na Jehova anaghị ewere na e nwere asụsụ ma ọ bụ mba ka ibe ya mma.—Gụọ Ọrụ Ndịozi 10:34.

10. Gịnị ka anyị mụtara n’otú Jehova si gwa ụmụ mmadụ okwu?

10 Anyị amụtala na Jehova na-agbanwe otú o si agwa ndị mmadụ okwu n’ihi ihe ọ chọrọ ikwu na ndị ọ na-agwa ya. E nweghị otu asụsụ o kwuru na anyị ga-amụrịrị ka anyị nwee ike ịmata ya ma ọ bụ nzube ya. (Gụọ Zekaraya 8:23; Mkpughe 7:9, 10.) Jehova nyere ndị dere Baịbụl ike mmụọ nsọ ya, ma o kwere ka ha jiri okwu nke aka ha dee ya.

OTÚ CHINEKE SI CHEBE OKWU YA

11. Gịnị mere asụsụ dị́ iche iche emeghị ka Chineke ghara ịgwa ndị mmadụ okwu?

11 Asụsụ ndị mmadụ na-asụ taa karịrị akarị. Ma, ò meela ka Jehova ghara ịgwa ndị mmadụ ihe ọ chọrọ ịgwa ha? Mbanụ. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ naanị okwu Hibru ole na ole Jizọs kwuru mgbe ọ nọ n’ụwa ka anyị ma. (Mat. 27:46; Mak 5:41; 7:34; 14:36) Ma, Jehova mere ka e dee ihe Jizọs kụziri, meekwa ka a sụgharịa ya n’asụsụ Grik nakwa n’asụsụ ndị ọzọ ka oge na-aga. Ndị Juu na Ndị Kraịst depụtaghachikwara Okwu Chineke ugboro ugboro, nke mere ka ọ dịrị ruo taa. A sụgharịkwara ya n’ọtụtụ asụsụ ndị ọzọ. Ihe dị́ ka narị afọ anọ Kraịst nwụchara, otu nwoke aha ya bụ Jọn Krisọstọm kwuru na a sụgharịala ihe Jizọs kụziri n’asụsụ dị́ iche iche, ya bụ, nke ndị Siria, Ijipt, India, Itiopia, na ọtụtụ ndị ọzọ.

12. Olee otú e si lụso Baịbụl ọgụ?

12 Ruo ọtụtụ afọ, e nwere ọtụtụ ndị na-achọghị iji anya ahụ Baịbụl. Ha lụsokwara ndị na-asụgharị ya na ndị na-ekesa ya ọgụ. N’ihe dị́ ka narị afọ atọ a mụchara Jizọs, eze ukwu Rom bụ́ Dayọklishan nyere iwu ka e bibie Baịbụl niile. Mgbe ihe dị́ ka otu puku afọ na narị abụọ gara, otu nwoke aha ya bụ Wiliam Tindel si n’asụsụ Hibru na Grik sụgharịwa Baịbụl n’asụsụ Bekee. O kwuru na ọ bụrụ na Chineke ekwe ka ya dịtee ndụ aka, na ya ga-eme ka nwata nwoke na-akọ ugbo mara Baịbụl karịa onye ụkọchukwu. A malitere ịkpagbu Tindel, ya esi n’Ịngland gbaga mba ọzọ dị́ na Yurop ka o nwee ike  ịsụgharị Baịbụl ma bipụta ya. Ọtụtụ ndị nwetara Baịbụl ahụ Tindel sụgharịrị n’agbanyeghị na ndị ụkọchukwu gbalịsiri ike ịkpọ Baịbụl ọ bụla ha hụrụ ọkụ. E mechara rara Tindel nye n’aka ndị iro ya, kwụgbuo ya, kpọọkwa ya ọkụ n’elu osisi. Ma, Baịbụl ahụ ọ sụgharịrị ka dịkwa. Ndị sụgharịrị Baịbụl Bekee a na-akpọ King James Version sikwa na ya nweta ihe nyeere ha aka.—Gụọ 2 Timoti 2:9.

13. Gịnị ka nchọpụta e mere banyere Baịbụl ndị e ji aka dee n’oge ochie na-egosi?

13 N’eziokwu, e nwere obere ihe ndị e dehiere n’ụfọdụ Akwụkwọ Nsọ ndị kacha ochie e nwere ugbu a, nweekwa ebe ụfọdụ ihe e dere na ha na-abụchaghị otu. Ma, ndị ọkà mmụta eleruola ọtụtụ puku n’ime Baịbụl ndị ahụ e ji aka dee anya, ma ndị nke bụ́ iberibe akwụkwọ ma ndị nke zuru ezu, chọpụta na ọ bụ naanị n’amaokwu ole na ole ka e nwere ihe dị́ iche ma é were otu tụnyere ibe ya. Ihe ndị ahụ abụghị oké ihe, ha emeghịkwa ka ihe Baịbụl kwuru gbanwee. Ihe a ndị ọkà mmụta chọpụtara na-eme ka obi sie ndị jí obi ha niile na-amụ Baịbụl ike na Baịbụl e nwere taa bụ Okwu Jehova, nke sí n’ike mmụọ nsọ.—Aịza. 40:8. *

14. Olee otú e kesarurula Baịbụl?

14 N’agbanyeghị ọgụ niile a lụsoro Baịbụl, Jehova emeela ka Okwu ya bụrụ akwụkwọ a kacha asụgharị n’ụwa. Ọtụtụ ndị enweghị okwukwe na Chineke, ma Okwu ya bụ́ Baịbụl ka bụ akwụkwọ a kacha ekesa n’ụwa. A sụgharịala ya n’ihe karịrị puku asụsụ abụọ na narị asatọ. E nweghị akwụkwọ ọzọ hụrụ azụ ya anya ma n’otú e si ekesa ya ma n’otú e si agụ ya. E nwere Baịbụl ndị na-esi ike ọgụgụ, nweekwa ndị otú e si sụgharịa ha na-adịchaghị mma. Ma, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na ha niile na-eme ka anyị mata ozi ga-eme ka anyị nwee olileanya na ndụ ebighị ebi.

IHE MERE E JI KPEBIE ỊSỤGHARỊ BAỊBỤL ỌZỌ

15. (a) Gịnị mere ọtụtụ asụsụ a na-asụ taa emeghị ka ndị mmadụ ghara ịna-agụ akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl? (b) Gịnị mere e ji ebu ụzọ ede akwụkwọ anyị n’asụsụ Bekee?

15 N’afọ 1919, a họpụtara ụmụnna ole na ole n’ime Ndị Mmụta Baịbụl ka ha bụrụ “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche.” N’oge ahụ, ọ bụ asụsụ Bekee ka ha na-ejikarị agwa ndị ohu Chineke okwu. (Mat. 24:45) Ma, “ohu ahụ” na-agbasi mbọ ike ka a na-asụgharịkwu akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’ọtụtụ asụsụ. Akwụkwọ anyị dịzi n’ihe karịrị narị asụsụ asaa. Otú ahụ  ụdị asụsụ Grik a na-akpọ Koine si gbasaa ka asụsụ Bekee si gbasaa, bụrụkwa asụsụ e ji azụ ahịa nakwa nke e ji agụ akwụkwọ. Ọ bụ ya mere e ji ebu ụzọ ede akwụkwọ anyị na Bekee ma sụgharịa ya n’asụsụ ndị ọzọ.

16, 17. (a) Gịnị ka ndị ohu Chineke chọrọ? (b) Olee otú e si nye ha ihe ahụ ha chọrọ? (ch) Olee olileanya Nwanna Knorr nwere gbasara Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ n’afọ 1950?

16 Baịbụl bụ ebe bụ́ isi e si enweta ihe a na-ede n’akwụkwọ anyị. Ná mmalite, Baịbụl ndị ohu Chineke na-agụ bụ King James Version, nke a sụgharịrị n’afọ 1611. Ma, ihe e dere na ya bụ Bekee ndị mgbe ochie. O sikwara ike nghọta. E dere aha Chineke na ya naanị ugboro ole na ole n’agbanyeghị na aha ahụ gbara ọtụtụ puku ugboro n’Akwụkwọ Nsọ ndị e ji aka dee n’oge ochie. Nsogbu ọzọ bụ na e nwere ihe ndị e dehiere na Baịbụl ahụ, ụfọdụ amaokwu dị́ na ya adịghịkwa ná ndị nke kacha ochie e nwere. Baịbụl Bekee ndị ọzọ nwekwara ụdị nsogbu ndị ahụ.

17 O doro anya na ndị Chineke chọrọ Baịbụl dị́ mfe nghọta, nke a sụgharịkwara nke ọma. Ọ bụ ya mere e ji hiwe Kọmitii Nsụgharị Baịbụl Ụwa Ọhụrụ. Ụmụnna só na kọmitii a wepụtara Baịbụl a ná nkebi ná nkebi malite n’afọ 1950 ruo n’afọ 1960. Ha niile dị nkebi isii. E wepụtara nkebi nke mbụ ná mgbakọ e mere n’abalị abụọ n’ọnwa asatọ n’afọ 1950. Ná mgbakọ ahụ, Nwanna Knorr kwuru na ndị ohu Chineke chọrọ nsụgharị Baịbụl ziri ezi, nke dị́ mfe nghọta, nke ga-enyekwara ha aka ịghọtakwu eziokwu Baịbụl. Ha chọrọ Baịbụl ga-adị mfe ọgụgụ, dịkwa mfe nghọta otú Akwụkwọ Nsọ ahụ ndị na-eso ụzọ Kraịst dere n’oge ochie dị. Nwanna Knorr kwuru na ya nwere olileanya na Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ ga-enyere ọtụtụ nde mmadụ aka ịmata Jehova.

18. Olee ihe nyerela aka n’ịsụgharị Baịbụl?

18 Ihe ahụ Nwanna Knorr tụrụ anya ya malitere imezu n’afọ 1963, mgbe a sụgharịrị Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ n’asụsụ isii ndị ọzọ, ya bụ, Dọch, French, Jaman, Ịtalian, Pọchugiiz, na Spanish. N’afọ 1989, Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova hiwere otu ngalaba n’isi ụlọ ọrụ anyị, nke ga na-enyere ụmụnna na-asụgharị Baịbụl aka. N’afọ 2005, e nyere ikike ka a sụgharịa Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ n’asụsụ ọ bụla a na-ebipụta Ụlọ Nche na ya. N’ihi ya, e nwere Baịbụl a n’ihe karịrị otu narị asụsụ na iri atọ, ma ndị nke bụ́ naanị Akwụkwọ Nsọ Grik ma ndị nke bụ́ Akwụkwọ Nsọ Hibru na Grik.

19. Olee ihe dị́ mkpa mere n’afọ 2013? Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

19 Asụsụ Bekee agbanweela kemgbe ahụ e wepụtara Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Bekee. N’ihi ya, e kwesịrị ịsụgharị ya ka ya na Bekee a na-asụ ugbu a buru otu. N’abalị ise na isii n’ọnwa iri n’afọ 2013, otu nde mmadụ, narị puku anọ na iri na atọ, narị isii na iri asaa na isii ndị nọ́ ná mba iri atọ na otu gere ihe omume nnọkọ a na-enwe kwa afọ nke Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania. Ọ bụ nwanna só n’Òtù Na-achị Isi mara ọkwa na e wepụtala Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Bekee e degharịrị edegharị. Obi dị ndị niile bịara nnọkọ ahụ ụtọ. Anya mmiri gbara ọtụtụ ndị mgbe ha natara Baịbụl ọhụrụ a. Ka a na-agụ ihe e dere na ya, o doro mmadụ niile anya na Baịbụl ọhụrụ a ka mfe ọgụgụ, kakwa mfe nghọta. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-eleba anya n’ihe ndị ọzọ gbasara Baịbụl ọhụrụ a nakwa n’otú e si na-asụgharị ya n’asụsụ ndị ọzọ.

^ para. 5 Asụsụ mbụ e ji dee Ezra 4:8; 7:12; Jeremaya 10:11; na Daniel 2:4 bụ Arameik.

^ para. 6 Okwu ahụ bụ́ Septuagint pụtara “Iri Asaa.” Ọ dị ka ọ̀ bụ n’ihe dị́ ka narị afọ atọ tupu Kraịst ka a malitere ịsụgharị ya ma sụgharịchaa ya mgbe otu narị afọ na iri ise gachara. Baịbụl a ha sụgharịrị ka bara uru taa n’ihi na ọ na-enyere ndị ọkà mmụta aka ịghọta okwu ma ọ bụ amaokwu siri ike n’asụsụ Hibru.

^ para. 8 Ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ Hibru ka Matiu ji dee Oziọma ya, nakwa na e mechara sụgharịa ya n’asụsụ Grik. O nwekwara ike ịbụ yanwa sụgharịrị ya.

^ para. 13 Gụọ peeji nke 1726 ruo 1730 ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Bekee, nke afọ 2013; nakwa peeji nke 7 ruo nke 9, n’isiokwu bụ́ “Olee Otú Akwụkwọ Ahụ Si Lanarị?” na broshọ bụ́ Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile.