Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) NỌVEMBA 2015

Zụọ Ụmụ Gị Ka Ha Na-efe Jehova—Nke Abụọ

Zụọ Ụmụ Gị Ka Ha Na-efe Jehova—Nke Abụọ

“Jizọs nọkwa na-eto, na-enwekwu amamihe na ihu ọma Chineke na nke ndị mmadụ.”—LUK 2:52.

ABỤ: 41, 89

1, 2. (a) Olee ihe na-echegbu ụfọdụ ndị nne na nna ụmụ ha dị afọ iri na ụma? (b) Olee ihe ndị nwere ike ime ka ụmụaka na-eme nke ọma mgbe ha ka dị afọ iri na ụma?

OTU n’ime ihe ndị na-eme ndị nne na nna obi ụtọ bụ ịhụ ka nwa ha mere baptizim. * Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Berenice mụtara ụmụ anọ. Ha anọ mechara baptizim tupu ha eruo afọ iri na anọ. Nwanna nwaanyị a kwuru, sị: “Ọṅụ juru anyị obi. Obi dị anyị ụtọ na ụmụ anyị chọrọ ife Jehova. Ma, anyị makwa na ọtụtụ ọnwụnwa ga-abịara ha.” I nwere ike ịna-echegbu onwe gị otú ahụ ma ọ bụrụ na i nwere nwa dị́ afọ iri na ụma.

2 Otu ọkachamara kwuru na oge ụmụaka nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu anaghị adịrị ma ha ma nne na nna ha mfe. Ma, ndị nne na nna ekwesịghị iche na isi ekopụla ụmụ ha ma ọ bụ na ha na-akpa àgwà ụmụaka. Kama, o kwuru na ụbụrụ na-aghọ ha nkọ, ihe na-emetụ ha n’ahụ́ nke ukwuu, ha na-achọkwa ka ha na ndị enyi ha na-anọrị. N’ihi ya, mgbe ụmụ gị  na-eto eto, ha nwere ike ịgba mbọ ka ha na Jehova dịrị n’ezigbo mma, otú ahụ Jizọs mere mgbe ọ na-eto eto. (Gụọ Luk 2:52.) Ha nwekwara ike ịmụtakwu otú e si ekwusa ozi ọma nke ọma, kpebiekwa ịna-ewepụta onwe ha na-ejere Chineke ozi. Ha nwekwara ike iji aka ha na-ekpebi ihe ha ga-eme, dị́ ka ịrara onwe ha nye Jehova ma na-erubere ya isi. Ma, gịnị ka gịnwa bụ́ nne ma ọ bụ nna ga-eme iji nyere nwa gị aka ịna-efe Jehova? I nwere ike ịmụta ihe n’otú Jizọs si jiri ịhụnanya, obi umeala, na nghọta zụọ ndị na-eso ụzọ ya.

HỤ ỤMỤ GỊ N’ANYA

3. Gịnị mere Jizọs ji kpọọ ndịozi ya ndị enyi ya?

3 Jizọs abụghị naanị Nna Ukwu ndịozi ya, kama ọ bụkwa enyi ha. (Gụọ Jọn 15:15.) N’oge Baịbụl, ndị bụ́ nna ukwu anaghị akọrọ ndị ohu ha ihe niile ha na-eme nakwa otú obi dị ha. Ma, Jizọs emeghị ndịozi ya ka ndị ohu. Kama, ya na ha na-anọrị, ya akọọrọ ha ihe ndị dị́ ya n’obi, geekwa ha ntị nke ọma mgbe ha na-akọrọ ya otú obi dị ha. (Mak 6:30-32) Otú ahụ Jizọs na ndịozi ya si akparịta ụka mere ka ha na ya dịrị n’ezigbo mma, meekwa ka ha dịrị njikere maka ọrụ ndị ha ga-arụ n’ọdịnihu.

4. Ndị nne na nna, olee otú unu ga-esi bụrụ enyi ụmụ unu? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

4 E nwere otu nwoke aha ya bụ Michael. Ọ mụtara ụmụ abụọ. Ọ sịrị, “Ọ bụ eziokwu na ndị nne na nna na ụmụ ha enweghị ike ịbụ ọgbọ, ha nwere ike ịbụ ndị enyi.” Ndị enyi na-ewepụta oge anọrị. O nwere ike ịbụ na ị ga-ewetulata aka n’ọrụ gị ma ọ bụ n’ihe ndị ọzọ ị na-eme ka i nweta ohere gị na ụmụ gị ga-eji na-anọrị. I kwesịrị ichebara ihe a echiche nke ọma, kpeekwa ekpere banyere ya. Ndị enyi na-emekọkwa ihe ọnụ. N’ihi ya, gbaa mbọ ka i nwee mmasị n’ụdị ihe na-atọ ụmụ gị ụtọ, dị́ ka ụdị egwú ha na-ege, ụdị fim ndị ha na-ele, ma ọ bụ ụdị egwuregwu na-amasị ha. Otu nwa agbọghọ bí n’Ịtali aha ya bụ Ilaria sịrị: “Nne na nna m malitere ige ụdị egwú na-amasị m. Papa m ghọdịrị ezigbo enyi m, obi na-erukwa m ala ịkọrọ ya ihe niile.” Ọ bụrụ na gị na ụmụ gị abụrụ enyi, gị ana-enyere ha aka ịbụ enyi Jehova, ọ pụtaghị na ị bụghịzi nne ha ma ọ bụ nna ha ma ọ bụkwanụ na ọ bụghịzi gị ga na-agwa ha ihe ha ga-eme. (Ọma 25:14) Kama, ọ ga-egosi na ị hụrụ ha n’anya ma na-akwanyere ha ùgwù. Ọ ga-adịkwara ha mfe ịna-agwa gị ihe ọ bụla, ma ihe ndị na-echegbu ha.

5. Olee otú Jizọs si nyere ndị na-eso ụzọ ya aka inwe obi ụtọ n’ozi Jehova?

5 Jizọs chọrọ ka ndị na-eso ụzọ ya nwee obi ụtọ mmadụ na-enwe ma o jesiwe ozi Jehova ike. N’ihi ya, ọ gụsiri ya agụụ ike ka ha jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ejere Chineke ozi. Jizọs chọrọ ka ha jiri obi ha niile na-eme ka ndị ọzọ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. O kwekwara ha nkwa na ọ ga-enyere ha aka n’ọrụ ahụ.—Mat. 28:19, 20.

6, 7. Gịnị mere ịkụziri ụmụ gị ịna-agachi ọmụmụ ihe na ozi ọma anya ji egosi na ị hụrụ ha n’anya?

6 Ị chọrọ ka ụmụ gị na Jehova dịrị ná mma. Chineke chọkwara ka ị na-azụ ha ma na-adọ ha aka ná ntị. O nyekwara gị ikike ime otú ahụ. (Efe. 6:4) N’ihi ya, i kwesịrị ịgba mbọ na-azụ ụmụ gị mgbe niile. Chegodị banyere ihe a: Ị na-agba mbọ ka ụmụ gị gaa akwụkwọ n’ihi na ị ma na agụmakwụkwọ bara uru, ị chọkwara ka ha na-amụta ihe ọhụrụ. Otú ahụ ka ndị nne na nna hụrụ ụmụ ha n’anya na-agbakwa mbọ ka ụmụ ha na-aga ọmụmụ ihe na mgbakọ, sorokwa na-enwe ofufe ezinụlọ. Ebe ọ bụ na ihe Jehova na-akụziri anyị ga-eme ka anyị dịrị ndụ, gbaa mbọ na-eme ka ịmụ banyere Jehova na-agụ ụmụ gị agụụ, meekwa ka ha ghọta na ọ bụ ya  ga-eme ka ha mara ihe. (Ilu 24:14) Kụziekwara ha ịna-agachi ozi ọma anya. Nyere ha aka ka ịgwa ndị ọzọ banyere Chineke na-atọ ha ụtọ otú ahụ Jizọs nyeere ndị na-eso ụzọ ya aka.

7 Olee otú ịmụ ihe mgbe niile na ịgachi ọmụmụ ihe na ozi ọma anya ga-esi baara ndị na-eto eto uru? Otu nwanna nwaanyị bí na Saụt Afrịka aha ya bụ Erin sịrị: “Mgbe anyị bụ ụmụaka, e kwute okwu ịmụ ihe, ịga ọmụmụ ihe, na ịga ozi ọma, anyị ebewe ákwá. Oge ụfọdụ, anyị na-akpachara anya nyewe nsogbu n’ọmụmụ ihe ezinụlọ anyị ka anyị nwee ike ịpụ. Ma, ike agwụghị papa anyị na mama anyị.” Obi dị ya ezigbo ụtọ maka otú nne ya na nna ya si zụọ ha n’ihi na ha nyeere ya aka ịghọta na ihe ndị ahụ dị ezigbo mkpa. Ugbu a, é nwee ihe ọ bụla mere ka ọ ghara ịga ọmụmụ ihe ma ọ bụ ozi ọma, ọ na-agbasi mbọ ike ịhazigharị ihe ọ na-eme ka o nwee ike ịgachiwe ọmụmụ ihe na ozi ọma anya.

DỊRỊ UMEALA N’OBI

8. (a) Olee otú Jizọs si gosi na ọ dị umeala n’obi? (b) Olee uru ịdị umeala n’obi Jizọs baara ndị na-eso ụzọ ya?

8 N’agbanyeghị na Jizọs zuru okè, ọ dị umeala n’obi ma mee ka ndị na-eso ụzọ ya mata na ọ tụkwasịrị Jehova obi. (Gụọ Jọn 5:19.) Otú Jizọs si dị́ umeala n’obi ò mere ka ndị na-eso ụzọ ya ghara ịna-akwanyere ya ùgwù? Mba. Ha tụkwasịkwuru ya obi ka ha ji anya ha hụ otú o si tụkwasị Jehova obi. Ha mechara mụta ịdị umeala n’obi ka Jizọs.—Ọrụ 3:12, 13, 16.

9. Ọ bụrụ na ị na-ekweta ebe i mejọrọ ma na-arịọ mgbaghara, olee uru ọ ga-abara nwa gị?

9 Jizọs zuru okè, ma anyịnwa ezughị okè. Anyị na-emejọkwa ihe. N’ihi ya, i kwesịrị ịdị umeala n’obi. Ghọta na e nwere ọtụtụ ihe ị na-agaghị emeli. Na-ekwetakwa ihe i mejọrọ. (1 Jọn 1:8) A sị ka e kwuwe, olee onye ị ga-aka akwanyere ùgwù? Ọ̀ bụ nna ukwu nke na-ekweta ebe o mejọrọ, ka ọ̀ bụ nke na-anaghị ekweta? Ọ bụrụ na nwa gị anụ ka ị na-arịọ mgbaghara maka ihe i mejọrọ, o nwere ike ịna-akwanyekwuru gị ùgwù. O nwekwara ike ịmụta ikweta ebe o mejọrọ. Otu nwanna nwaanyị mụtara ụmụ atọ torola eto kwuru, sị: “Anyị na-ekweta ebe anyị mejọrọ. O mere ka ụmụ anyị na-agwa anyị ihe dị́ ha n’obi mgbe ọ bụla ha nwere nsogbu. Anyị ghọtara na e nwere ihe ndị anyị na-agaghị emeli. N’ihi ya, anyị kụziiri ụmụ anyị ihe ga-akacha nyere ha aka ná nsogbu ha. Ha chọọ enyemaka, anyị na-agwa ha akwụkwọ e ji amụ Baịbụl ga-enyere ha aka. Anyị na ha na-ekpekọkwa ekpere.”

10. Olee otú Jizọs si gosi na ọ dị umeala n’obi mgbe ọ na-agwa ndị na-eso ụzọ ya ihe ha ga-eme?

10 Jizọs nwere ikike ịgwa ndị na-eso ụzọ ya ihe ha ga-eme. Ma, ọ na-agwakarị ha ihe mere ha ga-eji mee ihe ọ gwara ha n’ihi na ọ dị umeala n’obi. Dị ka ihe atụ, ọ gwaghị ha naanị ka ha buru ụzọ na-achọ Alaeze Chineke na ezi omume ya, kama ọ sịkwara ha: “A ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị ọzọ a niile.” Mgbe ọ gwara ha ka ha kwụsị ikpe ndị ọzọ ikpe, o kwuru ihe mere o ji kwuo ya. Ọ sịrị ha: “Ka a ghara ikpe unu ikpe; n’ihi na otú unu si ekpe ikpe ka a ga-esi kpee unu ikpe.”—Mat. 6:31–7:2.

11. Gịnị mere o ji dị́ mma ka ị na-akọwara nwa gị ihe mere i ji nye iwu ma ọ bụ kpebie ihe i kpebiri?

11 Mata mgbe i kwesịrị ịkọwara nwa gị ihe mere i ji nye iwu ma ọ bụ kpebie ihe i kpebiri. Ọ bụrụ na nwa gị aghọta ihe mere i ji nye iwu, o nwere ike ime ka o rubere gị isi. Otu nwanna aha ya bụ Barry mụrụ ụmụ torola eto. Ọ sịrị: “Ikwu ihe mere i ji nye iwu ga-enyere nwa gị aka ịtụkwasị gị obi n’ihi na ọ ga-aghọta na ihe mere i ji nye iwu abụghị na ị dị aka ike,  kama na e nwere ezigbo ihe kpatara ya.” I kwesịkwara icheta na ndị na-eto eto abụghịzi taata. Ha na-amụta otú ha ga-esi na-echere onwe ha echiche, jirikwa aka ha na-ekpebi ihe ha ga-eme. (Rom 12:1) Barry kwukwara, sị: “Ndị na-eto eto kwesịkwara iji uche ha na-ekpebi ihe ha ga-eme, ọ bụghị ime ihe ọ bụla batara ha n’obi.” (Ọma 119:34) N’ihi ya, dị umeala n’obi ma na-akọwara nwa gị ihe mere i ji kpebie ihe i kpebiri. Ime otú ahụ ga-eme ka ọ mụta iji aka ya na-ekpebi ihe ọ ga-eme. Ọ ga-amakwa na ị na-akwanyere ya ùgwù nakwa na ị ghọtara na o towela.

NA-AGHỌTA ỤMỤ GỊ

12. Olee otú Jizọs si jiri nghọta o nwere nyere Pita aka?

12 Jizọs gosiri na o nwere nghọta. Ọ ghọtara otú ọ ga-esi nyere ndị na-eso ụzọ ya aka. Dị ka ihe atụ, mgbe Jizọs gwara ha na a ga-egbu ya, Pita gwara ya ka o meere onwe ya ebere. Jizọs ma na Pita hụrụ ya n’anya. Ma, ọ makwa na ihe Pita chere ezighị ezi. Olee otú Jizọs si nyere ya na ndị na-eso ụzọ ya ndị ọzọ aka? O bu ụzọ baara Pita mba, gwazie ha niile ihe ga-eme ndị na-anaghị eme uche Jehova mgbe ihe siri ike. Jizọs kwukwara na Jehova ga-agọzi ndị na-anaghị achọ naanị ọdịmma onwe ha. (Mat. 16:21-27) Pita mụtara ihe ahụ ọ kụziri.—1 Pita 2:20, 21.

13, 14. (a) Olee ihe nwere ike igosi na okwukwe nwa gị anyụwala ka ọkụ? (b) Olee otú nghọta ga-esi mee ka i nwee ike inyere nwa gị aka?

13 Rịọ Jehova ka o mee ka i nwee nghọta, ka i nwee ike ịmata ebe i kwesịrị inyere nwa gị aka. (Ọma 32:8) Dị ka ihe atụ, gịnị nwere ike igosi na okwukwe nwa gị anyụwala ka ọkụ? O nwere ike ịbụ na ọ naghịzi enwe obi ụtọ, ma ọ bụ na ọ na-akatọ ụmụnna, ma ọ bụkwanụ na ọ dị ka è nwere ihe ọ na-ezoro gị. Echela ozugbo na ihe ndị a gosiri na ọ na-eme ihe ọjọọ na nzuzo. * Ma, agbala nkịtị ma ọ bụ chee na ọ ga-eji aka ya gbanwee ka oge na-aga. O nwere ike ịbụ na i kwesịrị inyere ya aka ka okwukwe ya sie ike.

Nyere ụmụ gị aka imeta ezigbo ndị enyi n’ọgbakọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)

14 Wetuo obi jụọ nwa gị ajụjụ ka ị mata otú ị ga-esi nyere ya aka. Ọ dị ka isepụta mmiri n’olulu mmiri. Ọ bụrụ na i sepụta  ya ọsọ ọsọ, mmiri ahụ nwere ike ịwụfucha. Otú ahụ ka ọ dị ma ị chọọ ịmata ihe dị́ nwa gị n’obi. Ọ bụrụ na i nwereghị ya ndidi ma ọ bụ manye ya ikwu okwu, ị gaghị amata ihe o chere na otú obi dị ya. (Gụọ Ilu 20:5.) Nwa agbọghọ ahụ aha ya bụ Ilaria sịrị na mgbe ọ na-eto eto, ọ chọrọ ka ya na ụmụ klas ha na-anọkarị n’agbanyeghị na ọ ma na ọ dịghị mma. Nne ya na nna ya chọpụtara na e nwere ihe na-echegbu ya. Ọ sịrị: “N’otu mgbede, ha gwara m na ha chọpụtara na obi anaghịzi adị m mma, jụọkwa m ihe bụ́ nsogbu m. M bidoro ibe ákwá, gwa ha ihe merenụ, rịọkwa ha ka ha nyere m aka. Ha makụrụ m, gwa m na ha ghọtara, kwekwa nkwa inyere m aka.” Papa ya na mama ya malitere inyere ya aka ozugbo ka o meta ezigbo ndị enyi n’ọgbakọ.

15. Kọwaa otú Jizọs si gosi na ya nwere nghọta mgbe ya na ndị ọzọ na-emekọ ihe.

15 Jizọs gosikwara na o nwere nghọta mgbe ọ hụrụ àgwà ọma ndị na-eso ụzọ ya nwere. Dị ka ihe atụ, mgbe Nataniel nụrụ na Jizọs si Nazaret, ọ sịrị: “Ọ̀ dị ihe ọma ọ bụla pụrụ isi na Nazaret pụta?” (Jọn 1:46) Ọ bụrụ na ị nọ ebe ahụ, ị̀ gaara eche na Nataniel na-akatọ mmadụ ma ọ bụ na-akpa ókè agbụrụ ma ọ bụkwanụ na o nweghị okwukwe? Jizọs echeghị otú ahụ. Kama, o nwere nghọta, marakwa na Nataniel na-akwụwa aka ọtọ. Jizọs kpọrọ ya “onye Izrel n’ezie, onye aghụghọ ọ bụla na-adịghị n’ime ya.” (Jọn 1:47) Jizọs ma ihe dị́ mmadụ n’obi. Ọ bụ ya mere o ji nwee ike ịna-ahụ àgwà ọma ndị mmadụ nwere.

16. Olee otú i nwere ike isi nyere nwa gị aka ịna-emekwu nke ọma?

16 N’agbanyeghị na ị naghị enyocha obi ka Jizọs, i nwere ike inwe nghọta. Jehova nwere ike inyere gị aka ịhụ àgwà ọma ụmụ gị nwere. Ọ bụrụgodị na nwa gị emee ihe ị na-atụghị anya ya, ekwula na ọ bụ onye ọjọọ ma ọ bụ akpa nsogbu. Echedịla ya n’echiche. Kama, gwa ya na ị hụrụ àgwà ọma ndị o nwere nakwa na obi siri gị ike na ọ chọrọ ime ihe dị́ mma. Mata mbọ ọ na-agba iji gbanwee ma jaa ya mma. Nyekwuo ya ihe ọ ga na-arụ ka i nwee ike inyere ya aka ịgbakwu mbọ na-akpa àgwà ọma. Jizọs meere ndị na-eso ụzọ ya otú ahụ. Mgbe ihe dị́ ka otu afọ na ọkara gachara Jizọs hụrụ Nataniel (onye a kpọkwara Batọlọmiu), Jizọs họọrọ ya ka o soro ná ndịozi ya. Nataniel gosiri na ọ bụ Onye Kraịst na-anụ ọkụ n’obi. (Luk 6:13, 14; Ọrụ 1:13, 14) N’ihi ya, kama ime ka nwa gị chee na ya abaghị uru, na-aja ya mma, na-agbakwa ya ume. Mee ka ọ mara na o nwere ike ime ma gị ma Jehova obi ụtọ nakwa na o nwere ike ijere Jehova ozi.

ỊZỤ ỤMỤ GỊ GA-EME KA I NWEE EZIGBO OBI ỤTỌ

17, 18. Ọ bụrụ na ị na-agbasi mbọ ike ịzụ nwa gị ka o fewe Jehova, olee uru ọ ga-aba?

17 Ka ị na-azụ ụmụ gị, o nwere ike ịdị gị mgbe ụfọdụ otú ọ dị Pọl onyeozi. Ọ nọ na-echegbu onwe ya banyere ụmụnna ndị o weere ka ụmụ ya. Ọ bụ ya nyeere ha aka ịmụta banyere Jehova. Ọ hụkwara ha n’anya nke ukwuu. N’ihi ya, ọ na-ewute ya ma o cheta na ụfọdụ n’ime ha nwere ike ịkwụsị ife Jehova. (2 Kọr. 2:4; 1 Kọr. 4:15) Otu nwanna aha ya bụ Victor mụrụ ụmụ atọ torola eto. Ọ sịrị: “Ọ dịghị mfe ịzụ ụmụaka nọ́ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu. Ma, obi ụtọ anyị nwere n’oge ahụ karịrị nsogbu ndị anyị nwere. Jehova nyeere anyị aka ka anyị na ụmụ anyị bụrụ ezigbo enyi.”

18 Na-agbasi mbọ ike ịzụ ụmụ gị ka ha fewe Jehova. Ka ị na-egosi na ị hụrụ ha n’anya nke ukwuu, obi ga-adị gị ezigbo ụtọ ịhụ ka ha mụtara eziokwu ma soro ná ndị “na-eje ije n’eziokwu ahụ.”—3 Jọn 4.

^ para. 1 Ndị a na-ekwu okwu ha n’isiokwu a bụ ndị nọ́ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu.

^ para. 13 Ndị nne na nna nwere ike ịgụ peeji nke 317 n’akwụkwọ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1, nakwa na peeji nke 136-141 na nwanne ya bụ́ Nke 2.