Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) NỌVEMBA 2015

 IHE SÍ N’EBE ANYỊ NA-EDEBE IHE OCHIE

“Unu Ekwela Ka Ihe Ọ Bụla Dị́ n’Okpuru Anyanwụ Gbochie Unu”

“Unu Ekwela Ka Ihe Ọ Bụla Dị́ n’Okpuru Anyanwụ Gbochie Unu”

N’ỌNWA Mee afọ 1931, ndị sí ná mba iri abụọ na atọ yicha ọmarịcha ákwà sí n’ụgbọala dị́ iche iche na-arịtu n’ihu otu ụlọ ezumezu a ma ama a na-akpọ Pleyel, nke dị́ na Paris. Ha nọ na-abanye n’ụlọ ezumezu ahụ. A na-abịa ebe ahụ ele ndị na-agba egwú. O gbughị oge ihe fọrọ obere ka o ruo puku mmadụ atọ eju n’ụlọ ahụ. Ma, ọ bụghị egwú ka ha bịara ile, kama ha bịara ige okwu Joseph F. Rutherford, bụ́ onye na-eduzi ọrụ ikwusa ozi ọma anyị n’oge ahụ. A na-atụgharị okwu kpụ ọkụ n’ọnụ ọ na-ekwu n’asụsụ French, Jaman, na Polish. A na-anụ olu Nwanna Rutherford n’ebe niile n’ime ụlọ ezumezu ahụ.

Mgbakọ ahụ e mere na Paris gbanwere ọtụtụ ihe n’ọrụ ikwusa ozi ọma na Frans. Nwanna Rutherford gwara ndị bịara mgbakọ ahụ, karịchaa Ndị Kraịst na-eto eto, ka ha bụrụ ndị kọpọtụa na Frans, ya bụ, ka ha malite ozi oge niile. Nwanna John Cooke, bụ́ onye Ịngland, dị afọ iri na ụma mgbe ahụ, ọ naghịkwa echefu ihe a a gwara ha echefu, ya bụ: “Unu ekwela ka ihe ọ bụla dị́ n’okpuru anyanwụ gbochie unu bụ́ ndị na-eto eto ịmalite ozi oge niile.” *

John Cooke na ọtụtụ ụmụnna ndị ọzọ zara òkù ahụ. (Ọrụ 16:9, 10) Ọnụ ọgụgụ ndị kọpọtụa nọ́ na Frans rịrị elu n’ime otu afọ. N’afọ 1930, ha dị iri abụọ na asaa. Ma, n’afọ 1931, ha eruola otu narị na anọ. Ọtụtụ n’ime ndị mbụ ahụ sụrụ ụzọ oge niile amaghị asụsụ French. Ha enwechaghị ego. Ha ebikọtaghịkwa ọnụ. Ma, olee otú ha si merie nsogbu a niile?

IZI OZI ỌMA N’AGBANYEGHỊ NA HA AMAGHỊ ASỤSỤ FRENCH

Ndị ọsụ ụzọ na-abụghị ndị Frans na-eji kaadị e ji ezi ozi ọma ka o kwuchite ọnụ ha. Otu nwanna bụ́ onye Jamanị kwuru otú ha si jiri obi ike na-ekwusa ozi ọma na Paris. Ọ sịrị: “Anyị ma na Chineke anyị dị ike. Ọ bụrụ na obi na-akụ anyị kpum kpum n’ozi ọma, ọ bụghị n’ihi na anyị na-atụ egwu mmadụ, kama ọ bụ n’ihi na anyị na-atụ egwu ma ànyị ga-echefu otú e si ekwu ‘Biko, gụọ kaadị a’ n’asụsụ French. Obi siri anyị ike na ọrụ anyị dị ezigbo mkpa.”

Ndị kọpọtụa mbụ ahụ ji ígwè na ọgba tum tum kwusaa ozi ọma na Frans

Ọ na-abụ ndị kọpọtụa gaa izi ozi ọma n’ebe e nwere ọtụtụ flat, ndị na-elekọta ebe ahụ na-achụpụkarị ha. Otu ụbọchị, mgbe ụmụnna nwaanyị abụọ na-amaghị asụ French gara ikwusa ozi ọma, onye na-eche nche ebe ahụ ji iwe jụọ ha onye ha na-achọ. Iji meda ya obi, otu n’ime ụmụnna nwaanyị ahụ legharịrị anya hụ otu obere ihe e kowere n’ọnụ ụzọ. Ihe e ji asụsụ French dee na ya bụ “Pịa bel a.” Mgbe nwanna ahụ hụrụ ihe ahụ, o chere na ọ bụ aha onye bí n’ọnụ ụlọ ahụ. Ya ejiri obi ụtọ gwa onye nche ahụ, sị: “Anyị na-achọ ‘Pịa bel a.’” Otú ha si jiri ihu ọchị na-ekwusa ozi ọma nyeere ha ezigbo aka.

 HA AKWỤSỊGHỊ IKWUSA OZI ỌMA N’AGBANYEGHỊ ỤKỌ EGO NA IBI N’EBE DỊ́ ICHE ICHE

Malite n’ihe dị́ ka n’afọ 1931, ihe siiri ọtụtụ ndị bí na Frans ike, ma ndị ọsụ ụzọ ahụ na-abụghị ndị Frans. Otu nwanna nwaanyị bụ́ onye Ịngland aha ya bụ Mona Brzoska kwuru ihe mere ya na nwanna nwaanyị ọzọ ya na ya sụkọrọ ụzọ. Ọ sịrị: “Ebe anyị bi dị nnọọ ka ụlọ ndị mgbe ochie. Otu n’ime nsogbu dị́ ebe ahụ bụ na e nweghị ihe e ji eme ka ụlọ kporo ọkụ n’oge oyi. Ọ na-ajụ nnọọ oyi ka friji. N’ụtụtụ, anyị chọọ ịsa ihu, anyị na-ebu ụzọ kụwaa aịs blọk dị́ n’elu mmiri anyị gbanyere n’iko.” Ihe a ò mere ka ndị ọsụ ụzọ ahụ daa mbà? Mbanụ. Otu n’ime ha kwuru otú obi dị ha. Ọ sịrị: “E nweghị ihe anyị nwere, ma e nweghị ihe kọrọ anyị.”—Mat. 6:33.

Ndị ọsụ ụzọ bụ́ ndị Ịngland, ndị gara mgbakọ e mere na Paris n’afọ 1931

Ihe isi ike ọzọ ndị kọpọtụa ahụ nwere bụ na ha ebikọtaghị ọnụ. Malite n’ihe dị́ ka n’afọ 1933, ndị nkwusa nọ́ na Frans akarịghị narị mmadụ asaa. Ọtụtụ n’ime ha bicha ebe dị́ iche iche. Gịnị mere ka ndị kọpọtụa ndị a na-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị na ha bisasịrị ebisasị? Nwanna Nwaanyị Mona na onye ọsụ ụzọ ibe ya nwere ụdị ihe isi ike a. Ọ sịrị: “Otú anyị si emeri nsogbu ahụ bụ ịna-amụchi akwụkwọ nzukọ Jehova na-ebipụta anya. Ebe ọ bụ na n’oge ahụ, anyị anaghị aga nletaghachi, anyị anaghịkwa amụrụ ndị mmadụ ihe, anyị na-eji oge mgbede edere ndị ezinụlọ anyị na ndị ọsụ ụzọ ndị ọzọ akwụkwọ ozi, kọọrọ ha ihe ndị mere n’ozi ọma, gbarịtakwa ibe anyị ume.”—1 Tesa. 5:11.

Ndị kọpọtụa ndị ahụ ekweghị ka nsogbu mee ka ha ghara ịna-enwe obi ụtọ. Akwụkwọ ozi ndị ha degaara alaka ụlọ ọrụ dị́ na Frans gosiri na obi dị ha ụtọ. Ụfọdụ dere nke ha ọtụtụ afọ ha sụchara ụzọ na Frans. E nwere otu nwanna nwaanyị e tere mmanụ aha ya bụ Annie Cregeen. Ozi ya na di ya jere mere ka ha gazuo Frans malite n’afọ 1931 ruo n’afọ 1935. O dere, sị: “Obi na-adị anyị ezigbo ụtọ. Ozi anyị jere n’oge ahụ bakwara uru. Anyị bụ́ ndị ọsụ ụzọ ji otu obi rụkọọ ọrụ. Dị́ ka Pọl onyeozi kwuru, ‘Akụrụ m mkpụrụ, Apọlọs gbara ya mmiri, ma ọ bụ Chineke na-eme ka o too.’ Ọ na-eme anyị obi ụtọ na anyị só nye aka n’ebe ahụ ọtụtụ afọ gara aga.”—1 Kọr. 3:6.

Ntachi obi ndị mbụ ahụ sụrụ ụzọ oge niile na ịnụ ọkụ n’obi ha ga-abara ndị chọrọ ijekwuru Jehova ozi uru. Taa, ndị ọsụ ụzọ oge niile nọ́ na Frans dị ihe dị́ ka puku iri na anọ. Ọtụtụ n’ime ha nọ n’ọgbakọ na obere ìgwè ndị na-eji asụsụ mba ọzọ amụ ihe. * Ha na-eṅomi ndị mbụ ahụ. Ha anaghị ekwe ka ihe ọ bụla dị́ n’okpuru anyanwụ gbochie ha.—Ihe sí n’ebe anyị na-edebe ihe ochie na Frans.

^ para. 4 Gụọ isiokwu bụ́ “Jehova Kpọtara Unu Frans Ka Unu Mụta Eziokwu,” n’Ụlọ Nche Ọgọst 15, 2015, ka ị mata otú ndị Poland bí na Frans si kwusaa ozi ọma.

^ para. 13 N’afọ 2014, ọgbakọ na obere ìgwè ndị na-eji asụsụ mba ọzọ amụ ihe n’ebe niile alaka ụlọ ọrụ dị́ na Frans na-elekọta dị ihe karịrị narị itoolu. Ha na-enyere ndị na-asụ asụsụ iri asaa dị́ iche iche aka ịmụta eziokwu Baịbụl.