Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) NỌVEMBA 2015

Ị̀ Hụrụ “Onye Agbata Obi Gị n’Anya Dị Ka Onwe Gị”?

Ị̀ Hụrụ “Onye Agbata Obi Gị n’Anya Dị Ka Onwe Gị”?

“Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.”—MAT. 22:39.

ABỤ: 73, 36

1, 2. Olee otú Baịbụl si gosi na ịhụnanya dị mkpa?

ỊHỤNANYA bụ àgwà bụ́ isi Jehova Chineke nwere. (1 Jọn 4:16) Onye mbụ o kere bụ Jizọs. Ha abụọ nọrọ n’eluigwe ruo ọtụtụ ijeri afọ, nke mere ka Jizọs mụta na Jehova bụ Chineke ịhụnanya. (Kọl. 1:15) Ihe ndị Jizọs mere ma n’eluigwe ma n’ụwa gosiri na ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya otú ahụ Nna ya hụrụ ha. N’ihi ya, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova na Jizọs ga na-achị anyị n’ịhụnanya.

2 Mgbe otu nwoke jụrụ Jizọs iwu kachanụ n’ime Iwu Mozis, ọ sịrị: “‘Jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.’ Ọ bụ ya bụ iwu kasị ukwuu, bụrụkwa nke mbụ. Nke abụọ, nke dị ka ya, bụ, ‘Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.’”—Mat. 22:37-39.

3. Ònye bụ “onye agbata obi” anyị?

3 Cheta na Jizọs kwuru na e wepụ ịhụ Jehova n’anya, ihe ọzọ dị́ mkpa bụ ịhụ ndị agbata obi anyị n’anya. Ọ pụtara na anyị kwesịrị ịhụ ndị niile anyị na ha na-emekọ ihe n’anya. Ma, ònye bụ “onye agbata obi” anyị? Ọ bụrụ na anyị alụọla di ma ọ bụ nwunye, onye mbụ bụ́ onye agbata obi  anyị bụ di anyị ma ọ bụ nwunye anyị. Ndị ọzọ bụ ndị nọ́ n’ọgbakọ Ndị Kraịst, ya bụ, ndị anyị na ha na-efekọ Jehova. Ndị ọzọ bụ ndị anyị na-aga ezi ozi ọma. Olee otú ndị na-efe Jehova ma na-eme ihe Ọkpara ya na-akụzi si egosi na ha hụrụ ndị agbata obi ha n’anya?

HỤ DI GỊ MA Ọ BỤ NWUNYE GỊ N’ANYA

4. Olee otú di na nwunye ga-esi na-ebi n’udo n’agbanyeghị na ha ezughị okè?

4 Jehova malitere alụmdi na nwunye mbụ mgbe o kere Adam na Iv ma jikọọ ha. Ọ chọrọ ka ha na-enwe obi ụtọ ma mụjuo ụwa. (Jen. 1:27, 28) Ma, mgbe ha nupụụrụ Jehova isi, nsogbu batara n’alụmdi na nwunye ha, meekwa ka mmadụ niile keta mmehie na ọnwụ. (Rom 5:12) Ma, Akwụkwọ Nsọ gwara anyị otú anyị na di anyị ma ọ bụ nwunye anyị ga-esi na-ebi n’udo. Ihe dị́ na Baịbụl bụ ndụmọdụ kacha mma gbasara alụmdi na nwunye n’ihi na o si n’aka Jehova, bụ́ Onye malitere alụmdi na nwunye.—Gụọ 2 Timoti 3:16, 17.

5. Olee otú ịhụnanya dịruru mkpa n’alụmdi na nwunye?

5 Ihe Baịbụl kwuru gosiri na ezigbo ịhụnanya nke sí n’obi na-eme ka obi na-adị ndị mmadụ ụtọ n’ihe ọ bụla ha na ibe ha na-emekọ. Otú ahụ ka ọ dị n’alụmdi na nwunye. Pọl onyeozi gwara ọgbakọ dị́ na Kọrịnt, sị: “Ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi na obiọma. Ịhụnanya adịghị ekwo ekworo, ọ dịghị etu ọnụ, ọ dịghị afụli onwe ya elu, ọ dịghị akpa àgwà na-ekwesịghị ekwesị, ọ dịghị achọ ọdịmma nke ya, ọ dịghị abụ nke a kpasuru iwe. Ọ dịghị agụkọ ihe ọjọọ. Ọ dịghị aṅụrị ọnụ n’ihi ajọ omume, kama ọ na-eso eziokwu aṅụrị ọṅụ. Ọ na-edi ihe niile, na-ekwere ihe niile, na-enwe olileanya ihe niile, na-atachi obi n’ihe niile. Ịhụnanya adịghị ada ada.” (1 Kọr. 13:4-8) Ọ bụrụ na anyị echebara ihe a Pọl kwuru echiche ma na-eme ya, anyị na di anyị ma ọ bụ nwunye anyị ga na-enwe obi ụtọ.

Baịbụl gwara anyị otú di na nwunye ga-esi na-ebi n’udo (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6 na nke 7)

6, 7. (a) Gịnị ka Baịbụl kwuru banyere ịbụ onyeisi? (b) Olee otú Onye Kraịst bụ́ di kwesịrị isi na-emeso nwunye ya?

6 Jehova kpebiri onye ga-abụ onyeisi n’ezinụlọ. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ihe ndị ọzọ ọ haziri. N’ihi ya, ịhụnanya dị ezigbo mkpa. Pọl sịrị: “Achọrọ m ka unu mara na Kraịst bụ isi nke nwoke ọ bụla; nwoke bụkwa isi nke nwaanyị; Chineke bụkwa isi nke Kraịst.” (1 Kọr. 11:3) Ma,  Jehova chọrọ ka di jiri obiọma na-achị ezinụlọ ya. O kwesịghị ịdị aka ike ma ọ bụ obi ọjọọ. Jehova n’onwe ya na-eji obiọma achị onye nọ́ n’okpuru ya, bụ́ Jizọs. Ọ naghị achọkwa naanị ọdịmma onwe ya. Ọ bụ ya mere Jizọs ji jiri obi ya niile na-erubere Nna ya isi. O kwuru, sị: “M hụrụ Nna m n’anya.” (Jọn 14:31) Obi agaraghị adị Jizọs otú ahụ ma a sị na Jehova dị aka ike ma ọ bụ na-achị ya ọchịchị nchịgbu.

7 N’agbanyeghị na di bụ onyeisi nwunye ya, Baịbụl gwara ya ka ọ ‘na-enye nwunye ya nsọpụrụ.’ (1 Pita 3:7) Otu n’ime ụzọ di ga-esi eme ya bụ ichebara mkpa nwunye ya echiche, mgbe ụfọdụ, ya emee ihe nwunye ya chọrọ. Baịbụl kwuru, sị: “Ndị bụ́ di, na-ahụnụ nwunye unu n’anya, dị nnọọ ka Kraịst hụkwara ọgbakọ ahụ n’anya ma nyefee onwe ya maka ya.” (Efe. 5:25) Jizọs jidị ndụ ya chụọ àjà n’ihi ndị na-eso ụzọ ya. Ọ bụrụ na di ana-eṅomi otú Jizọs si achị ndị nọ́ n’okpuru ya, ọ ga-adịrị nwunye ya mfe ịhụ ya n’anya, na-akwanyere ya ùgwù, na-erubekwara ya isi.—Gụọ Taịtọs 2:3-5.

HỤ ỤMỤNNA GỊ N’ANYA

8. Olee otú ndị na-efe Jehova kwesịrị isi na-ele Ndị Kraịst ibe ha anya?

8 N’ụwa niile, e nwere ọtụtụ nde ndị na-efe Jehova ma na-agbara aha ya na nzube ya àmà. Olee otú onye ọ bụla na-efe Jehova kwesịrị isi na-ele Ndịàmà Jehova ibe ya anya? Baịbụl kwuru, sị: “Ka anyị na-eme ihe ọma n’ebe mmadụ niile nọ, ma karịsịa, n’ebe ndị ezinụlọ anyị n’okwukwe nọ.” (Gal. 6:10; gụọ Ndị Rom 12:10.) Pita onyeozi dere, sị: “Ebe unu meworo ka mkpụrụ obi unu dị ọcha site n’isi unu na-erubere eziokwu ahụ nke mere ka unu nwee ịhụnanya ụmụnna nke na-abụghị nke ihu abụọ, nweenụ ịhụnanya siri ike n’ebe ibe unu nọ site n’obi unu.” Ọ gwakwara Ndị Kraịst ibe ya, sị: “Karịsịa ihe niile, nweenụ ịhụnanya siri ike n’ebe ibe unu nọ.”—1 Pita 1:22; 4:8.

9, 10. Gịnị mere ndị Chineke ji dị́ n’otu?

9 Nzukọ Jehova zuru ụwa ọnụ enweghị atụ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na anyị ji obi anyị niile hụ ụmụnna anyị n’anya. Nke ka mkpa bụ na ebe ọ bụ na anyị hụrụ Jehova n’anya ma na-erubere iwu ya isi, ọ na-eji mmụọ nsọ ya akwado anyị, nke bụ́ ike kacha ike niile dị́ n’eluigwe na n’ụwa. Mmụọ nsọ na-eme ka anyị na ụmụnna anyị n’ụwa niile dịrị n’otu.—Gụọ 1 Jọn 4:20, 21.

10 Pọl chọrọ ime ka o doo anya na Ndị Kraịst kwesịrị ịhụ ibe ha n’anya. Ọ bụ ya mere o ji dee, sị: “Yirinụ obi ọmịiko, obiọma, ịdị umeala n’obi, ịdị nwayọọ, na ogologo ntachi obi, dị ka uwe. Na-ediri ibe unu ihe ma na-agbaghara ibe unu kpamkpam ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa megide ibe ya. Ọbụna dị ka Jehova gbaghaara unu kpamkpam, na-emekwanụ otú ahụ. Ma, e wezụga ihe ndị a niile, yirinụ ịhụnanya dị ka uwe, n’ihi na ọ bụ ihe nkekọ zuru okè nke ịdị n’otu.” (Kọl. 3:12-14) Obi dị anyị ezigbo ụtọ na n’agbanyeghị ebe anyị si, ịhụnanya dị n’etiti anyị. Ọ bụ “ihe nkekọ zuru okè nke ịdị n’otu.”

11. Olee ihe e ji amata nzukọ Jehova?

11 Ọ bụ ezigbo ịhụnanya na ịdị n’otu ka e ji amata na ọ bụ ndị Jehova na-ekpe ezi okpukpe. Jizọs sịrị: “Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” (Jọn 13:34, 35) Jọn onyeozi dere, sị: “Ụmụ Chineke na ụmụ Ekwensu pụtara ìhè site  n’ihe a: Onye ọ bụla nke na-adịghị eme ezi omume esiteghị na Chineke, onye na-ahụghị nwanna ya n’anya esiteghịkwa na Ya. N’ihi na ozi ahụ unu nụrụ site ná mmalite bụ na anyị kwesịrị ịhụ ibe anyị n’anya.” (1 Jọn 3:10, 11) Ọ bụ ịhụnanya na ịdị n’otu na-egosi na Ndịàmà Jehova bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst n’eziokwu. Ọ bụ ha ka Chineke ji emezu nzube ya, nke bụ́ ka e kwusaa ozi ọma Alaeze ya n’elu ụwa dum mmadụ bi.—Mat. 24:14.

ỊCHỊKỌTA “OKÉ ÌGWÈ MMADỤ”

12, 13. Gịnị ka “oké ìgwè mmadụ” na-eme ugbu a? Gịnịkwa ka Chineke ga-emere ha n’oge na-adịghị anya?

12 Ọtụtụ n’ime ndị ohu Jehova taa so ‘n’oké ìgwè mmadụ ndị si ná mba niile na ebo niile na ndị niile na asụsụ niile pụta.’ ‘Ha guzo n’ihu ocheeze Chineke nakwa n’ihu Nwa Atụrụ ahụ,’ bụ́ Jizọs Kraịst. Ole ndị ka ha bụ? “Ndị a bụ ndị si n’oké mkpagbu ahụ pụta, ha asawokwa uwe mwụda ha, meekwa ka ọ na-acha ọcha n’ime ọbara Nwa Atụrụ ahụ,” n’ihi na ha nwere okwukwe n’àjà Jizọs chụrụ. Ndị só ‘n’oké ìgwè mmadụ’ hụrụ Jehova na Ọkpara ya n’anya, ‘ha na-ejekwara Chineke ozi dị nsọ ehihie na abalị.’—Mkpu. 7:9, 14, 15.

13 N’oge na-adịghị anya, Chineke ga-ebibi ụwa ochie a ‘n’oké mkpagbu.’ (Mat. 24:21; gụọ Jeremaya 25:32, 33.) Ma, Jehova ga-echebe ndị ya, duba ha n’ụwa ọhụrụ ya n’ihi na ọ hụrụ ha n’anya. Dị ka Chineke buru n’amụma n’ihe fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga, ‘ọ ga-ehichapụ anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.’ Ọ̀ na-agụsi gị agụụ ike ibi na Paradaịs mgbe ‘ihe mbụ niile gabigarala’?—Mkpu. 21:4.

14. Olee otú oké ìgwè mmadụ ahụ hà ugbu a?

14 Mgbe oge ikpeazụ a malitere n’afọ 1914, ndị ohu Jehova dị naanị puku ole na ole n’ụwa niile. Ndị Kraịst ole na ole ahụ bụ́ ndị e tere mmanụ hụrụ ndị agbata obi ha n’anya. Mmụọ nsọ Chineke nyekwaara ha aka. Ọ bụ ya mere ha ji na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị nsogbu ndị bịaara ha. N’ihi ya, taa, a na-achịkọta oké ìgwè mmadụ ndị nwere olileanya ibi n’ụwa. E nwere ihe dị́ ka nde Ndịàmà Jehova asatọ n’ihe karịrị otu narị puku ọgbakọ na puku iri na ise na narị anọ n’ụwa niile. Ọnụ ọgụgụ anyị ka na-arịkwa elu. Dị ka ihe atụ, ndị e mere baptizim n’afọ ije ozi 2014 karịrị narị puku abụọ na iri puku asaa na ise na narị ise, ya bụ, ihe dị́ ka puku ise na narị atọ kwa izu.

15. Kọwaa otú e kwusarurula ozi ọma ugbu a.

15 Otú e kwusarurula ozi ọma taa enweghị atụ. A na-ebi akwụkwọ anyị ugbu a n’ihe karịrị narị asụsụ asaa. Ọ bụ Ụlọ Nche bụ magazin a kacha ebipụta n’ụwa niile. A na-ebi ihe karịrị iri nde ise na abụọ kwa ọnwa. A na-ebikwa ya na narị asụsụ abụọ na iri anọ na asaa. A sụgharịala akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? n’ihe karịrị narị asụsụ abụọ na iri ise. Ole e birila akarịala narị nde abụọ.

16. Gịnị mere ọtụtụ ndị ji na-abata ná nzukọ Jehova taa?

16 Ọtụtụ ndị na-abata ná nzukọ Jehova taa n’ihi na anyị nwere okwukwe na Chineke, jirikwa obi anyị niile kweta na Baịbụl bụ Okwu ya sí n’ike mmụọ nsọ. (1 Tesa. 2:13) Ihe kacha pụọ iche bụ otú Jehova si na-agọzi ndị ya n’agbanyeghị na Setan, bụ́ “chi nke usoro ihe a,” kpọrọ anyị asị, na-emegidekwa anyị.—2 Kọr. 4:4.

 NA-AHỤ NDỊ ỌZỌ N’ANYA

17, 18. Olee otú ndị ohu Chineke kwesịrị isi na-emeso ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova?

17 Olee otú ndị ohu Jehova kwesịrị isi na-emeso ndị na-anaghị efe Jehova? Ụfọdụ ndị na-ege anyị ntị ma anyị gaa ozi ọma. Ụfọdụ anaghị achọ ịnụ. Ma, n’agbanyeghị ihe ndị mmadụ mere, Baịbụl gwara anyị otú ndị Chineke kwesịrị isi na-akpa àgwà. Ọ sịrị: “Ka okwu unu dịrị n’amara mgbe niile, ka ọ bụrụ ihe e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ, ka unu wee mara otú unu kwesịrị isi azaghachi onye ọ bụla.” (Kọl. 4:6) Mgbe anyị na-agwa ndị mmadụ ihe anyị kweere, anyị kwesịrị iji “obi dị nwayọọ na nkwanye ùgwù” na-agwa ha okwu n’ihi na anyị hụrụ ndị agbata obi anyị n’anya.—1 Pita 3:15.

18 Ọ bụrụgodị na ndị anyị gara izi ozi ọma ewewe iwe ma ọ bụ jụ ige anyị ntị, anyị ga-egosi na anyị hụrụ ha n’anya ma mee ka Jizọs. Baịbụl sịrị: “Mgbe a na-ekwujọ ya, ọ dịghị ekwujọgwara. Mgbe ọ na-ata ahụhụ, o yighị onye ọ bụla egwu, kama ọ nọ na-enyefe onwe ya n’aka onye ahụ nke na-ekpe ikpe ziri ezi,” ya bụ, Jehova. (1 Pita 2:23) N’ihi ya, ma ndị anyị na ha nọ hà bụ ụmụnna anyị ma ọ bụ na ha abụghị, anyị kwesịrị ịdị umeala n’obi ma na-eme ihe Pita onyeozi kwuru. Ọ sịrị: “Unu ejila ihe ọjọọ akwụ ụgwọ ihe ọjọọ, unu ejila nkwujọ akwụ ụgwọ nkwujọ, kama nke ahụ, na-agọzinụ ndị mmadụ.”—1 Pita 3:8, 9.

19. Olee otú Jizọs kwuru anyị kwesịrị isi na-emeso ndị iro anyị?

19 Obi umeala na-enyere anyị aka ime ihe dị́ mkpa Jizọs kwuru. Ọ sịrị: “Unu nụrụ na a sịrị, ‘Hụ onye agbata obi gị n’anya ma kpọọ onye iro gị asị.’ Otú ọ dị, ana m asị unu: Na-ahụnụ ndị iro unu n’anya, na-ekpekwanụ ekpere maka ndị na-akpagbu unu; ka unu wee bụrụ ụmụ nke Nna unu nọ n’eluigwe, n’ihi na ọ na-eme ka anyanwụ ya waara ndị ọjọọ na ndị ọma, na-emekwa ka mmiri zooro ndị ezi omume na ndị ajọ omume.” (Mat. 5:43-45) N’eziokwu, anyị bụ́ ndị ohu Chineke kwesịrị ịmụta ‘ịna-ahụ ndị iro anyị n’anya’ n’agbanyeghị otú ha si na-emeso anyị.

20. Olee otú anyị si mara na n’ụwa ọhụrụ, mmadụ niile ga-ahụ Chineke na ndị agbata obi ha n’anya? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

20 N’ihe niile anyị na-eme, anyị na-egosi na anyị hụrụ Jehova na ndị agbata obi anyị n’anya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụgodị na ndị mmadụ na-emegide anyị na ozi ọma anyị, anyị ga-enyere ha aka mgbe ha nọ ná nsogbu. Pọl onyeozi dere, sị: “Unu ejila onye ọ bụla ụgwọ ihe ọ bụla, ma e wezụga ịhụ ibe unu n’anya; n’ihi na onye hụrụ mmadụ ibe ya n’anya edebezuwo iwu ahụ. N’ihi na ihe ndị e dere n’Iwu ahụ, bụ́ ‘Akwala iko, Egbula ọchụ, Ezula ohi, Enwela anyaukwu,’ na ihe ọ bụla ọzọ e nyere n’iwu, ka a chịkọtara n’okwu a, ya bụ, ‘Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.’ Ịhụnanya adịghị eme onye agbata obi mmadụ ihe ọjọọ; ya mere, ịhụnanya bụ idebezu iwu ahụ.” (Rom 13:8-10) Ebe anyị bụ Ndịàmà Jehova, anyị na-egosi ezigbo ịhụnanya n’ụwa ọjọọ a na-adịghị n’otu, nke dị́ n’aka Setan. (1 Jọn 5:19) O doro anya na mgbe Jehova ga-ebibicha Setan, ndị mmụọ ọjọọ ya, na ụwa ochie a, ndị niile bí n’ụwa ga-ahụ ibe ha n’anya. Ọ ga-amagbu onwe ya mgbe mmadụ niile ga-ahụ Chineke na ndị agbata obi ha n’anya.