Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) NỌVEMBA 2015

Jehova Chineke Hụrụ Anyị n’Anya

Jehova Chineke Hụrụ Anyị n’Anya

“Chineke bụ ịhụnanya.”—1 JỌN 4:8, 16.

ABỤ: 18, 91

1. Gịnị bụ àgwà bụ́ isi Chineke nwere? Olee otú obi dị gị banyere ya?

OKWU CHINEKE bụ́ Baịbụl gwara anyị na “Chineke bụ ịhụnanya.” Ọ sịghị naanị na ịhụnanya so n’àgwà ndị magburu onwe ha Chineke nwere, kama ọ sịrị na “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Ọ bụ ya bụ isi sekpụ ntị n’àgwà ya niile, ya bụ, nke kacha mkpa. Ọ bụghị naanị na Jehova nwere ịhụnanya, kama ọ bụ ịhụnanya. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Onye kere eluigwe na ụwa na ihe niile dị́ ndụ bụ Chineke ịhụnanya. Ọ bụ ịhụnanya ka o ji eme ihe ọ bụla ọ na-eme.

2. Olee obi ike anyị nwere n’ihi ịhụnanya Chineke? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

2 Jehova hụrụ ihe niile o kere eke n’anya. Otú o si hụ anyị n’anya na-eme ka obi sie anyị ike na ọ ga-emezu nzube ya banyere ụmụ mmadụ n’ụzọ kacha mma, nke ga-eme ka ndị na-erubere ya isi nwee ezigbo obi ụtọ. Dị ka ihe atụ, n’ihi ịhụnanya Jehova, “o wepụtawo otu ụbọchị nke o zubere ikpe elu ụwa mmadụ bi ikpe n’ezi omume site n’aka otu nwoke  onye ọ họpụtara,” bụ́ Jizọs Kraịst. (Ọrụ 17:31) Obi siri anyị ike na ihe a ga-eme. Ikpe a ga-eme ka ndị na-erubere Chineke isi nwee obi ụtọ na-enweghị atụ, nke ga-adịrukwa mgbe ebighị ebi.

IHE IHE NDỊ MERE EME NA-EGOSI

3. Olee otú ụwa ga-adị n’ọdịnihu a sị na Chineke ahụghị ụmụ mmadụ n’anya?

3 Chegodị otú ọdịnihu gaara adị ma a sị na Chineke ahụghị ụmụ mmadụ n’anya. Ihe ga-enyere anyị aka bụ icheta ihe ọjọọ niile merela n’ụwa n’ihi ọchịchị ụmụ mmadụ nke dị́ n’aka Setan bụ́ Ekwensu, bụ́ chi ọjọọ obi tara mmiri. (2 Kọr. 4:4; 1 Jọn 5:19; gụọ Mkpughe 12:9, 12.) Ihe a na-egosi na ọdịnihu ụmụ mmadụ gaara ajọgbu onwe ya ma a sị na Chineke ahụghị anyị n’anya.

4. Gịnị mere Jehova ji kwe ka Setan na ụmụ mmadụ na-achị?

4 Mgbe Ekwensu nupụụrụ Jehova isi, o mere ka Adam na Iv nupụkwara Jehova isi. Ọ mara Chineke aka na ọ bụghị ya kwesịrị ịchị eluigwe na ụwa. Ihe Setan na-ekwu bụ na ọchịchị nke ya ga-aka nke Chineke mma. (Jen. 3:1-5) Ọ bụ eziokwu na Jehova nyere Setan ohere ka o gosi ma ihe o kwuru ọ̀ bụ eziokwu, ohere ahụ agaghị adịru mgbe ebighị ebi. N’ihi amamihe Jehova nwere, o nyere ohere ga-ezuru onye ọ bụla ịhụ na e nweghị ọchịchị ọ bụla ga-aka nke ya mma. Ihe ndị mere eme na-egosi na ọchịchị ụmụ mmadụ na nke Setan enweghị ike ịbara ụmụ mmadụ uru.

5. Olee ihe ihe ndị mere eme na-egosi?

5 Taa, ụwa na-akawanye njọ. Kemgbe otu narị afọ, e gbuola ihe karịrị otu narị nde mmadụ n’agha. Baịbụl kwuru na “n’oge ikpeazụ,” “ndị ajọ mmadụ na ndị nduhie ga na-ajọwanye njọ.” (2 Tim. 3:1, 13) Baịbụl kwukwara, sị: “Jehova, amaara m nke ọma na ụzọ mmadụ adịghị ya n’aka. Ọ dịrịghị mmadụ nke na-eje ije ọbụna iduzi nzọụkwụ ya.” (Jere. 10:23) Ihe ndị mere eme na-egosi na ihe a Baịbụl kwuru bụ eziokwu. N’eziokwu, Jehova ekeghị ụmụ mmadụ ka ha jiri aka ha na-achị onwe ha.

6. Gịnị mere Chineke ji kwe ka ihe ọjọọ diri?

6 Otú a Jehova kwere ka ihe ọjọọ dịrị emeela ka o doo anya na ọ bụ naanị ọchịchị ya ga-abara ụmụ mmadụ uru. N’ọdịnihu, Chineke ga-ewepụ ihe ọjọọ niile. Nke ahụ gachaa, é nwee onye ọ bụla mara ọchịchị Jehova aka ọzọ, Chineke ga-ebibi ya ozugbo. Ọ ga-eji ihe ndị mere eme gosi na e kwesịghị ịhapụ ụdị onye ahụ. Ọ gaghị ekwe ka ihe ọjọọ dịrị ọzọ.

JEHOVA EGOSILA NA Ọ HỤRỤ ANYỊ N’ANYA

7, 8. Olee ụfọdụ ụzọ Jehova sirila gosi na ọ hụrụ anyị n’anya nke ukwuu?

7 Jehova esila n’ụzọ dị́ iche iche gosi na ọ hụrụ anyị n’anya. Dị ka ihe atụ, chegodị otú eluigwe na ụwa si buo ibu ma maa mma. E nwere ọtụtụ ijeri ụyọkọ kpakpando na mbara igwe. Ọtụtụ ijeri kpakpando jukwara n’ụyọkọ nke ọ bụla. Anyanwụ so n’ihe ya na ụwa anyị a dị n’otu ụyọkọ. A sị na anyanwụ adịghị, e nweghị ihe ọ bụla gaara adị ndụ n’ụwa a. Ihe ndị a niile na-egosi na ọ bụ Jehova kere anyị. Ha na-egosikwa anyị àgwà ndị Jehova nwere, dị́ ka amamihe, ịhụnanya, na ike. N’eziokwu, “àgwà ya ndị a na-apụghị ịhụ anya ka a na-ahụ nke ọma malite mgbe e kere ụwa gaa n’ihu, n’ihi na a na-aghọta ha site n’ihe ndị e kere eke, ya bụ, ike ebighị ebi ya na ịbụ Chineke ya.”—Rom 1:20.

8 Jehova doziri ụwa ka ihe ndị dị́ ndụ o kere eke nwee ike ibi na ya. Ihe niile dị́  n’ụwa na-abara ụmụ anụmanụ na ụmụ mmadụ uru. Chineke meere ụmụ mmadụ ọmarịcha ebe ha ga-ebi, nyekwa ha uche zuru okè na ahụ́ nke nwere ike ịdịru mgbe ebighị ebi. (Gụọ Mkpughe 4:11.) ‘Ọ na-enyekwa anụ ahụ́ niile nri, n’ihi na obiọma ya na-adịru mgbe ebighị ebi.’—Ọma 136:25.

9. Gịnị ka Jehova kpọrọ asị n’agbanyeghị na ọ bụ Chineke ịhụnanya?

9 Ọ bụ eziokwu na Jehova bụ Chineke ịhụnanya, ọ kpọrọ ihe ọjọọ asị. Dị ka ihe atụ, Abụ Ọma 5:4-6 kwuru banyere Jehova, sị: “Ị bụghị Chineke nke ajọ omume na-atọ ụtọ . . . Ị kpọrọ ndị niile na-eme ihe ọjọọ asị.” Ọ sịkwara: “Jehova kpọrọ onye na-awụfu ọbara na onye na-aghọ aghụghọ asị.”

A GA-EWEPỤ IHE ỌJỌỌ N’OGE NA-ADỊGHỊ ANYA

10, 11. (a) Gịnị ka Jehova ga-eme ndị na-eme ihe ọjọọ? (b) Gịnị ka Jehova ga-emere ndị na-erubere ya isi?

10 N’oge kwesịrị ekwesị, Jehova ga-ewepụ ihe ọjọọ niile n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya, kpọọkwa ihe ọjọọ asị. Baịbụl kwere anyị nkwa, sị: “A ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ, ma ọ bụ ndị nwere olileanya n’ebe Jehova nọ ga-enweta ụwa. N’oge na-adịghị anya, onye ajọ omume agakwaghị anọ . . . Ndị iro Jehova ga-adịkwa ka ebe mara mma anụ na-ata ahịhịa; ha ga-akpọnwụ. Ha ga-aghọ anwụrụ ọkụ, ha agakwaghị anọ.”—Ọma 37:9, 10, 20.

11 Baịbụl kwekwara anyị nkwa, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Ọma 37:29) Ndị na-erubere Chineke isi “ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.” (Ọma 37:11) Nkwa a ga-emezu n’ihi na Chineke anyị, bụ́ onye hụrụ anyị n’anya, na-emere ndị na-erubere ya isi ihe ga-akacha baara ha uru. Baịbụl gwara anyị, sị: “Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.” (Mkpu. 21:4) Ndị niile na-erubere Jehova isi ma hụ ya n’anya ga-enwe obi ụtọ na-enweghị atụ n’oge ahụ.

12. Ònye bụ “onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta”?

12 Baịbụl gwara anyị, sị: “Legide onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta anya, legidekwa onye ziri ezi anya, n’ihi na ọ ga-enwe udo n’ọdịnihu. Ma a ga-ala ndị niile na-emebi iwu n’iyi; ndị ajọ omume agaghị enwe ọdịnihu.” (Ọma 37:37, 38) “Onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta” na-amụ banyere Jehova na Ọkpara ya, na-erubekwara iwu Chineke isi. (Gụọ Jọn 17:3.) Ụdị onye ahụ kwetara na ihe e kwuru na 1 Jọn 2:17 bụ eziokwu. Ebe ahụ sịrị: “Ụwa na-agabiga, ọchịchọ ya na-agabigakwa, ma onye na-eme uche Chineke ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” Ka ọgwụgwụ ụwa a na-eru nso, anyị kwesịrị ‘inwe olileanya n’ebe Jehova nọ, debekwa ụzọ ya.’—Ọma 37:34.

ỤZỌ KACHANỤ CHINEKE SI GOSI NA Ọ HỤRỤ ANYỊ N’ANYA

13. Olee ụzọ kachanụ Jehova si gosi na ọ hụrụ ndị mmehie n’anya?

13 N’agbanyeghị na anyị ezughị okè, anyị nwere ike ‘idebe ụzọ Chineke.’ Anyị na Jehova nwekwara ike ịdị ná mma n’ihi àjà Jizọs chụrụ, nke bụ́ ụzọ kachanụ Chineke si gosi na ọ hụrụ anyị n’anya. Jehova kwere ka Jizọs jiri ndụ ya chụọ àjà iji gbapụta ndị na-erubere ya isi n’aka mmehie na ọnwụ ha ketara n’aka Adam. (Gụọ Ndị Rom 5:12; 6:23.)  Obi siri Jehova ike na Ọkpara ya ga-erubere ya isi n’ụwa n’ihi na o rubeere ya isi n’eluigwe ruo ọtụtụ afọ. Ebe Jehova bụ Nna hụrụ ụmụ ya n’anya, o doro anya na o wutere ya nke ukwuu mgbe ọ hụrụ otú e si na-emesi Jizọs ike mgbe ọ nọ n’ụwa. Ma, Jizọs ji obi ya niile gosi na ọ bụ Chineke kwesịrị ịchị nakwa na mmadụ zuru okè nwere ike irubere Jehova isi ọ bụrụgodị na nsogbu siri ike abịara ya.

Ịhụnanya mere ka Chineke zite Ọkpara ya n’ụwa, Jizọs kwetakwara ịbịa (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13)

14, 15. Gịnị ka ọnwụ Jizọs meere ụmụ mmadụ?

14 N’agbanyeghị na nsogbu ndị tara ezigbo akpụ bịaara Jizọs, o ji obi ya niile kwado ọchịchị Jehova. Obi kwesịrị ịdị anyị ụtọ na Jizọs ji ndụ ya chụọ àjà iji gbapụta ụmụ mmadụ, nke mere ka anyị nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ Chineke kwere ná nkwa. Pọl onyeozi kọwara na àjà mgbapụta ahụ gosiri na Jehova na Jizọs hụrụ anyị n’anya nke ukwuu. Ọ sịrị: “N’ezie, mgbe anyị ka bụ ndị na-adịghị ike, Kraịst nwụrụ n’oge a kara aka maka ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke. N’ihi na o siri ike mmadụ ọ bụla ịnwụ maka onye ezi omume; n’ezie, ọ bụ maka ezi mmadụ ka mmadụ ga-anwa anwa nwụọ ma eleghị anya. Ma Chineke mere ka anyị mata ịhụnanya ya, n’ihi na, mgbe anyị ka bụ ndị mmehie, Kraịst nwụrụ n’ihi anyị.” (Rom 5:6-8) Jọn onyeozi dekwara, sị: “Ọ bụ site n’ihe a ka e mere ka ịhụnanya  Chineke pụta ìhè n’ebe anyị nọ, n’ihi na Chineke zitere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya n’ụwa ka anyị nwee ike inweta ndụ site n’aka ya. Ịhụnanya ahụ si otú a dịrị, ọ bụghị na ọ bụ anyị hụrụ Chineke n’anya, kama na ọ bụ ya hụrụ anyị n’anya wee zite Ọkpara ya ka ọ bụrụ àjà ime udo maka mmehie anyị.”—1 Jọn 4:9, 10.

15 Jizọs kwuru banyere ịhụnanya Chineke nwere n’ebe ụmụ mmadụ nọ, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Ịhụnanya mere ka Jehova jiri Ọkpara ya chụọ àjà n’agbanyeghị na o wutere ya nke ukwuu. O gosiri na ọ hụrụ anyị n’anya nke ukwuu. Ịhụnanya ya ga-adịrukwa mgbe ebighị ebi. Pọl dere, sị: “Ekwetara m na ọnwụ ma ọ bụ ndụ ma ọ bụ ndị mmụọ ozi ma ọ bụ ọchịchị ma ọ bụ ihe ndị dị ugbu a ma ọ bụ ihe ndị gaje ịbịa ma ọ bụ ike ma ọ bụ ịdị elu ma ọ bụ ịdị omimi ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ e kere eke agaghị enwe ike ikewapụ anyị n’ịhụnanya Chineke nke o gosiri site n’aka Kraịst Jizọs Onyenwe anyị.”—Rom 8:38, 39.

ALAEZE CHINEKE ACHỊWALA

16. Gịnị bụ Alaeze Mesaya? Ònye ka Jehova họpụtara ịbụ Eze ya?

16 Ọchịchị Chineke, ya bụ, Alaeze Mesaya, bụ ihe ọzọ na-egosi na Jehova hụrụ anyị n’anya. N’ihi gịnị? N’ihi na onye Jehova họpụtara ịbụ Eze ya ruru eru, hụkwa ụmụ mmadụ n’anya. Ọ bụ Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst. (Ilu 8:31) Chineke họpụtakwara otu narị puku mmadụ na puku iri anọ na puku anọ ga-eso Kraịst chịa n’eluigwe. Mgbe a ga-akpọlite ha n’ọnwụ, ha ga-eji ihe ndị ha ma banyere ụmụ mmadụ chịa anyị. (Mkpu. 14:1) Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, Alaeze Chineke bụ isi ihe ọ kụziiri ndị mmadụ. Ọ kụzikwaara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere, sị: “Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ. Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Mat. 6:9, 10) Mgbe Chineke ga-aza ekpere ndị dị́ otú a, chegodị ihe ọma niile ọ ga-emere ndị na-erubere ya isi.

17. Gịnị dị iche n’ọchịchị Jizọs na nke ụmụ mmadụ?

17 E nwere nnukwu ihe dị́ iche n’ọchịchị Jizọs na nke ụmụ mmadụ. Ọchịchị ụmụ mmadụ akpatala ọtụtụ agha ndị tarala isi ọtụtụ nde mmadụ. Ma, Eze anyị bụ́ Jizọs hụrụ anyị n’anya. Ọ na-eṅomikwa ọmarịcha àgwà ndị Chineke nwere, karịchaa ịhụnanya. (Mkpu. 7:10, 16, 17) Jizọs kwuru, sị: “Bịakwutenụ m, unu niile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ na ndị e boro ibu dị arọ, m ga-emekwa ka unu nweta ume. Nyaranụ yok m, mụtakwanụ ihe n’aka m, n’ihi na m dị nwayọọ, dịkwa umeala n’obi, mkpụrụ obi unu ga-enweta ume. N’ihi na yok m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.” (Mat. 11:28-30) Nkwa a o kwere gosiri na ọ hụrụ anyị n’anya.

18. (a) Gịnị na-eme kemgbe afọ 1914? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

18 Baịbụl gosiri na Alaeze Chineke malitere ịchị n’eluigwe n’afọ 1914. Kemgbe ahụ, a na-achịkọta ndị fọrọ ná ndị ga-eso Kraịst chịa n’eluigwe nakwa “oké ìgwè mmadụ” ndị ga-alanahụ mbibi ụwa ochie a ma baa n’ụwa ọhụrụ. (Mkpu. 7:9, 13, 14) Olee otú oké ìgwè mmadụ ahụ hà ugbu a? Gịnị ka Chineke chọrọ ka ha mee? A ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.