Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) ỌKTOBA 2015

 AKỤKỌ NDỤ

Ọ Kwaghị Mmakwaara Maka Ihe O Kpebiri Mgbe Ọ Na-eto Eto

Ọ Kwaghị Mmakwaara Maka Ihe O Kpebiri Mgbe Ọ Na-eto Eto

AFỌ ole na ole tupu nwanne nne nna m aha ya bụ Nikolai Dubovinsky anwụọ, o dere akụkọ ndụ ya, ma ihe ọma ndị meere ya ma nsogbu ndị bịaara ya n’afọ niile o jeere Jehova ozi. Ọtụtụ n’ime ihe ndị ahụ mere mgbe a machibidoro ọrụ anyị iwu n’ebe bụbu Sọviet Yuniọn. N’agbanyeghị nsogbu niile bịaara ya, o ji obi ya niile na-efe Jehova, na-enwekwa obi ụtọ. Ọ na-ekwukarị na ọ chọrọ ka ndị na-eto eto nụ akụkọ ndụ ya. N’ihi ya, ka m kọọ ihe ụfọdụ ọ kọrọ. A mụrụ ya n’afọ 1926 n’obodo Pọdvirivka nke dị́ na Kenivsi Ọblast, na Yukren. Ndị ezinụlọ ha abaghị ọgaranya.

OTÚ NIKOLAI SI NATA EZIOKWU

Ihe Nikolai kọrọ: “Otu ụbọchị n’afọ 1941, nwanne m nwoke bụ́ Ivan ji akwụkwọ ụfọdụ lọta, ya bụ, The Harp of God, The Divine Plan of the Ages, ụfọdụ Ụlọ Nche, na akwụkwọ nta dị́ iche iche. M gụchara ha niile. O juru m anya ịmụta na ọ bụghị Chineke na-akpata nsogbu ndị dị́ n’ụwa, kama na ọ bụ Ekwensu. Ka m gụchara akwụkwọ ndị ahụ, m gụkwara akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn ma ghọta na achọtala m eziokwu. M ji ịnụ ọkụ n’obi na-agwa ndị ọzọ ihe m mụtara banyere Alaeze Chineke. Ka m na-amụ akwụkwọ ndị ahụ, m ghọtakwuru eziokwu Baịbụl, chọsiekwa ike ịbụ ohu Jehova.

“Aghọtara m na m ga-ata ahụhụ n’ihi ihe m kweere. A na-alụ agha n’oge ahụ, achọghịkwa m igbu onye ọ bụla. N’ihi ya, m malitere ibu amaokwu Baịbụl ndị dị ka Matiu 10:28 na 26:52 n’isi iji kwadebe maka ọnwụnwa ndị ga-abịara m. M kpebisiri ike ịna-erubere Jehova isi, á sịgodị na a ga-egbu m.

“N’afọ 1944, mgbe m dị afọ iri na asatọ, a kpọrọ m ka m gaa agha. E nwekwara ụmụnna ndị ọzọ bụ́ ụmụ okorobịa a kpọkọtara ịga agha. Ọ bụ ya bụ nke mbụ mụ na ụmụnna ndị ọzọ nọkọrọ. Anyị gwara ndị isi hoo haa na anyị agaghị eso lụọ agha. Ezigbo iwe were ha, ha agwa anyị na ha agaghị enye anyị nri, na ha ga-amanye anyị igwu olulu, ma ọ bụkwanụ gbagbuo anyị. Anyị ji obi ike zaa ha, sị: ‘Anyị nọ unu n’aka. Ma, ihe sọkwara unu mee anyị, anyị agaghị ada iwu Chineke nyere, nke bụ́, “Egbula ọchụ.”’—Ọpụ. 20:13.

“E mechara kpọga mụ na ụmụnna abụọ ndị ọzọ Belarọs ka anyị sụwa ahịhịa ma na-arụzi ụlọ ndị mebiri emebi. M ka na-echeta otú agha ahụ si mebichaa ebe niile na gburugburu obodo Minsk. Osisi ndị ọkụ gbara juru n’ụzọ. Ịnyịnya ndị nwụrụ anwụ na ozu ndị mmadụ juru n’ọwa mmiri nakwa n’ọhịa. M hụrụ ihe ndị a gbahapụrụ agbahapụ, ma ụgbọ agha ma nnukwu égbè, hụkwa  ụgbọelu kpọkara akpọka. Ihe ndị ahụ so ná nsogbu imebi iwu Chineke kpatara.

“Agha ahụ biri n’afọ 1945, ma a tụrụ anyị mkpọrọ afọ iri n’ihi na anyị esoghị lụọ agha. N’afọ atọ mbụ anyị nọrọ n’ụlọ mkpọrọ, anyị enweghị ọmụmụ ihe ọ bụla, anyị ahụghịkwa akwụkwọ e ji amụ Baịbụl. Anyị na ụfọdụ ụmụnna nwaanyị malitere iderịta akwụkwọ ozi. Ma, e mechara jide ha, tụọ ha mkpọrọ iri afọ abụọ na ise.

“A hapụrụ anyị n’afọ 1950, anyị alaa. Mgbe m nọ n’ụlọ mkpọrọ, mama m na nwanne m nwaanyị nke m tọrọ aha ya bụ Maria abụrụla Ndịàmà Jehova. Ụmụnne m ndị nwoke abụbeghị Ndịàmà Jehova n’oge ahụ, ma ha na-amụ Baịbụl. Ndị uwe ojii chọkwara ịtụ m mkpọrọ ọzọ n’ihi na m na-ekwusasi ozi ọma ike. Ụmụnna ndị na-elekọta ọrụ anyị gwaziri m ka m soro na-ebipụta akwụkwọ anyị na nzuzo. Adị m afọ iri abụọ na anọ mgbe ahụ.”

OTÚ ANYỊ SI NA-EBI AKWỤKWỌ ANYỊ

“Ihe ụmụnna na-ekwukarị bụ, ‘Á machibido ọrụ anyị iwu, anyị ka ga na-arụ ya na nzuzo.’ (Ilu 28:28) N’oge ahụ, anyị nọzi na-ebi ọtụtụ akwụkwọ anyị na nzuzo, n’ụlọ ndị a rụrụ n’ime ala. Ebe mbụ m nọ rụọ ọrụ bụ n’ụlọ nwanne m nwoke aha ya bụ Dmitry, n’ọnụ ụlọ ya dị́ n’ime ala. Mgbe ụfọdụ, m na-anọ ebe ahụ izu abụọ n’apụtaghị apụta. Ọ bụrụ na mpanaka m anyụọ n’ihi na ezigbo ikuku anaghị abata ebe ahụ, m na-edina ala, chere ruo mgbe ikuku ga-abata.

Ihe e sere ebe a bụ ụlọ dị́ n’ime ala, bụ́ ebe Nikolai nọ na-ebipụta akwụkwọ

“Otu ụbọchị, otu nwanna mụ na ya na-arụkọ ọrụ jụrụ m, sị, ‘Nikolai, è meela gị baptizim?’ E mebeghị m baptizim  n’agbanyeghị na mụ ejeerela Jehova ozi afọ iri na otu. N’ihi ya, mụ na ya kwurịtara ihe banyere baptizim n’abalị ahụ, e mezie m baptizim n’otu ọdọ mmiri. Adị m afọ iri abụọ na isii mgbe ahụ. Mgbe afọ atọ gara, e nyere m ihe ùgwù ọzọ, ya bụ, iso na Kọmitii Na-elekọta Mba. N’oge ahụ, a na-ahọpụta ụmụnna ndị a na-ejidebeghị ka ha nọchie ndị nke e jidere. O mere ka a ghara ịkwụsị ọrụ anyị.”

NSOGBU NDỊ DỊ́ N’ỊRỤ ỌRỤ N’IME ALA

“Ịnọ n’ime ala na-ebi akwụkwọ siri ike karịa ịnọ n’ụlọ mkpọrọ. Ruo afọ asaa, agalighị m ọmụmụ ihe ka ndị uwe ojii nzuzo ghara ijide m. M ji aka m na-agba mbọ ka okwukwe m ghara ịnyụ ka ọkụ. M na-ahụ ndị ezinụlọ anyị naanị ma m gaa ileta ha. Ọ bụghị mgbe niile ka m na-aga. Ma, ha ghọtara otú o si dịrị m. Ihe a ha mere gbara m ume. Ihe ndị ahụ m nọ na-arụ na otú m si na-ezogharị mere ka ike na-agwụ m. Anyị na-adị njikere mgbe niile. Dị ka ihe atụ, n’otu mgbede, ndị uwe ojii abụọ bịara n’ebe ahụ m nọ, mụ esi na windo dị́ n’akụkụ nke ọzọ mịpụ, gbaba n’ọhịa. M pụtara n’ebe na-abụghị ọhịa ma nụ ihe dara ka mkpọrọhịhị. Ọ bụ mgbe m nụrụ ụda égbè ka m matara na ụda mbụ ahụ m nụrụ bụ mgbọ égbè. Otu n’ime ndị nọ́ na-achụ m rịgooro n’ịnyịnya, gbawa m égbè ruo mgbe mgbọ ya gwụrụ. Mgbọ tụtara m n’aka. Ha chụgidere m ruo ebe dị́ kilomita ise, mụ agaa zoo n’ọhịa. Ọ bụ otú m si gbanahụ ha. Mgbe e mechara kpewe m ikpe, a gwara m na ndị ahụ gbara égbè ahụ ugboro iri atọ na abụọ.

“Ebe ọ bụ na m na-anọkarị n’ebe dị́ n’ime ala, ahụ́ m chagharịrị. A na-ejikarị ya amata ihe m na-arụ. N’ihi ya, m na-apụta otú ike kwere m ka anwụ chaa m. Ịnọ n’ime ala mgbe niile mere ka m na-arịa ọrịa. E nwere mgbe ọbara nọ na-agba m ma n’imi ma n’ọnụ. O kweghịdị m soro ụmụnna ndị ọzọ gaa otu nnọkọ dị́ mkpa.”

MGBE E JIDERE NIKOLAI

N’ụlọ mkpọrọ dị́ na Mọdvinia, n’afọ 1963

“E jidere m n’abalị iri abụọ na isii n’ọnwa Jenụwarị afọ 1957. Mgbe ọnwa isii gara, Ụlọikpe Kacha Elu na Yukren kpebiri ikpe anyị. E kpebiri na a ga-agbagbu m. Ma, n’oge ahụ, mba Yukren amachiela ịma  mmadụ ikpe ọnwụ. N’ihi ya, a tụrụ m mkpọrọ iri afọ abụọ na ise. Á gụkọta afọ niile mụ na ụmụnna asaa ndị ọzọ ga-anọ n’ụlọ mkpọrọ, ọ ga-abụ otu narị afọ na iri atọ. A kpọgara anyị n’ụlọ mkpọrọ ndị dị́ na Mọdvinia, bụ́ ebe e nwere ihe dị́ ka narị ụmụnna ise. Anyị na-ezukọta na nzuzo amụ Ụlọ Nche. Mgbe otu onye nche lechara ụfọdụ n’ime magazin anyị ndị ha jichiri, ọ sịrị: ‘Ọ bụrụ na mmadụ ana-agụ akwụkwọ ndị a, o nweghị onye ga-emerili ya.’ Anyị na-arụ ihe niile anyị kwesịrị ịrụ n’ụbọchị, ọtụtụ mgbe, rụkarịadị ihe a sịrị anyị rụọ. Ma, onyeisi ebe ahụ kwuru, sị, ‘Ihe a unu na-arụ ebe a enweghị uru ọ baara anyị. Ihe anyị chọrọ bụ ka unu na-akwado anyị, na-emekwa ihe ọ bụla anyị kwuru.’”

“Anyị na-arụ ihe niile anyị kwesịrị ịrụ n’ụbọchị, ọtụtụ mgbe, rụkarịadị ihe a sịrị anyị rụọ”

Ọ KWỤSỊGHỊ IRUBERE JEHOVA ISI

Ụlọ Nzukọ Alaeze dị́ na Velikiye Luki

Mgbe a hapụrụ Nwanna Nikolai n’afọ 1967, o so hazie ọgbakọ ndị dị́ n’Estonia nakwa na Sent Pitasbọg dị́ na Rọshịa. Ná mmalite afọ 1991, a kagburu ikpe ahụ a mara ha n’afọ 1957 n’ihi na e nweghị ihe gosiri na ha dara iwu. N’oge ahụ, a hapụrụ ọtụtụ ụmụnna anyị ndị ọchịchị nọ na-echi ọnụ n’ala. N’afọ 1996, Nikolai kwagara n’obodo Velikiye Luki dị́ na Piskọv Ọblast. Ebe ahụ dị narị kilomita ise ma é si Sent Pitasbọg gawa ya. Ọ zụrụ obere ụlọ. N’afọ 2003, a rụrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ala ya. Taa, ọgbakọ abụọ na-amụ ihe n’ebe ahụ.

Mụ na di m na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị́ na Rọshịa. Ọnwa ole na ole tupu Nikolai anwụọ, ọ bịara leta anyị nke ikpeazụ ya n’ọnwa Mach afọ 2011. Ihe ndị o kwuru metụrụ anyị n’ahụ́ nke ukwuu. O ji obi ụtọ kwuo, sị: “Ihe niile na-eme ugbu a gosiri na e nwere ike ikwu na anyị amalitela ịga mgbidi Jeriko gburugburu n’ụbọchị nke asaa.” (Jọsh. 6:15) Ọ gbara iri afọ asatọ na ise. N’agbanyeghị na ọtụtụ nsogbu bịaara ya, o kwuru banyere ndụ o biri, sị: “Obi dị m ezigbo ụtọ na mgbe m na-eto eto, m kpebiri ijere Jehova ozi. O nwebeghị mgbe m kwara mmakwaara.”