Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) ỌKTOBA 2015

Na-atụgharị Uche n’Okwu Chineke Nakwa n’Ihe Ndị O Kere

Na-atụgharị Uche n’Okwu Chineke Nakwa n’Ihe Ndị O Kere

“Na-echebara ihe ndị a echiche; na-etinye obi gị dum na ha, ka ọganihu gị wee pụta ìhè n’ebe mmadụ niile nọ.”—1 TIM. 4:15.

ABỤ: 57, 52

1, 2. Gịnị mere ụmụ mmadụ ji dị́ iche n’ụmụ anụmanụ?

ỤBỤRỤ mmadụ enweghị atụ. Dị ka ihe atụ, ọ na-eme ka ụmụ mmadụ na-amụta asụsụ. Asụsụ na-eme ka anyị nwee ike ịgụ ihe, ide ihe, ikwu okwu, na ịghọta ihe e kwuru. Ọ na-emekwa ka anyị nwee ike ikpe ekpere, bụkuokwa Jehova abụ otuto. Ihe a niile mere anyị ji dị́ iche n’ụmụ anụmanụ. Ndị ọkà mmụta sayensị enweghị ike ịghọtacha otú ụbụrụ anyị si arụ ihe a niile dị́ ịtụnanya.

2 Ịsụ asụsụ so n’onyinye pụrụ iche Jehova nyere anyị. (Ọma 139:14; Mkpu. 4:11) E nwere ihe ọzọ mere anyị ji dị́ iche n’ụmụ anụmanụ. Baịbụl kwuru na e kere anyị “n’onyinyo Chineke.” Chineke mere ka anyị nwee ike ịna-ekpebi ihe anyị ga-eme. Anyị nwere ike ikpebi iji asụsụ anyị na-asụ na-ejere Jehova ozi ma na-eto ya.—Jen. 1:27.

3. Olee onyinye na-enweghị atụ Jehova nyere anyị iji mee ka anyị mara ihe?

3 Baịbụl bụ onyinye na-enweghị atụ Chineke nyere ndị niile chọrọ ịsọpụrụ onye kere asụsụ. E biela Baịbụl n’ihe karịrị puku asụsụ abụọ na narị asatọ, ma ndị bụ́ naanị Akwụkwọ Nsọ Grik ma ndị bụ́ Akwụkwọ Nsọ Hibru na  Grik. Ọ bụrụ na anyị ana-atụgharị uche n’ihe Baịbụl kwuru, anyị ga-echewe echiche otú Chineke si eche. (Ọma 40:5; 92:5; 139:17) Iche echiche ka Jehova ga-eme “ka ị mara ihe iji nweta nzọpụta.”—Gụọ 2 Timoti 3:14-17.

4. Gịnị ka ịtụgharị uche pụtara? Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle n’isiokwu a?

4 Ịtụgharị uche pụtara ichebara ihe echiche, ma ọ̀ bụ ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ. (Ọma 77:12; Ilu 24:1, 2) Ọ ga-akacha abara anyị uru ma ọ bụrụ na anyị ana-atụgharị uche n’ihe anyị mụtara banyere Jehova na Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst. (Jọn 17:3) Ma, anyị nwere ike ịna-eche, sị: Olee otú ịgụ ihe si gbasa ịtụgharị uche? Gịnị na gịnị ka anyị nwere ike ịtụgharị uche na ha? Olee ihe ga-enyere anyị aka ịna-atụgharị uche mgbe niile, ya ana-atọkwa anyị ụtọ?

GBALỊA KA IHE Ị NA-AMỤ BAARA GỊ URU

5, 6. Gịnị ga-enyere gị aka icheta ihe ị na-agụ na ịghọtakwu ya?

5 Ị̀ chọpụtala na e nwere ihe ndị i nwere ike ịna-eme n’echeghị ha eche, dị ka iku ume, ịga ije ma ọ bụ ịchị ọchị? Mgbe ụfọdụ, i nwekwara ike ịna-agụ ihe n’echebaraghị ya echiche. I nwedịrị ike ichewe ihe ọzọ mgbe ị na-agụ ihe, nke ga-eme ka ihe ị na-agụ ghara ịbara gị uru. Gịnị ka anyị ga-eme ka ụdị ihe a ghara ime anyị? Ọ bụ ime ka uche anyị dịrị n’ihe ihe anyị na-agụ pụtara. Ị́ gụchaa otu paragraf ma ọ bụ tupu ị banye n’isiokwu nta ọzọ, kwụsịtụ chebara nke ị gụrụ agụ echiche. Chebakwara ihe ị mụtara echiche ma gbaa mbọ ka ị ghọta ya nke ọma.

6 Ndị ọka mmụta sayensị achọpụtala na ịgụpụta ihe agụpụta na-eme ka ọ dị mfe icheta ya. Onye kere ụbụrụ anyị ma na ọ bụ eziokwu. Ọ bụ ya mere o ji gwa Jọshụa ka ọ na-agụ akwụkwọ Iwu ya “n’olu dị ala.” (Gụọ Jọshụa 1:8.) I nwere ike ịchọpụta na ịgụ Baịbụl n’olu dị ala, ya bụ, iwetu obi na-agụ ya, ga-eme ka o ruo anyị n’obi. Ọ ga-emekwa ka uche anyị dịrị na ya.

7. Olee oge kacha mma ịtụgharị uche n’Okwu Chineke? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

7 Anyị chọọ ịtụgharị uche, chọọkwa ka uche anyị dịrị n’ihe anyị na-amụ, anyị ga-agbasi mbọ ike. Ọ bụ ya mere uche anyị ji agakarị n’ihe ndị na-ataghị akpụ. N’ihi ya, oge kacha mma anyị ga-eji tụgharịa uche bụ mgbe anyị zuchara ike, nọrọkwa n’ebe ihe ọ bụla na-agaghị adọpụ uche anyị. Devid tụgharịrị uche n’elu ihe ndina ya mgbe ọ mụ anya n’abalị. (Ọma 63:6) N’agbanyeghị na Jizọs zuru okè, ọ ma na ịga ebe mkpọtụ na-adịghị tụgharịa uche ma kpee ekpere na-aba uru.—Luk 6:12.

EZIGBO IHE NDỊ ANYỊ KWESỊRỊ ỊNA-ATỤGHARỊ UCHE NA HA

8 E wezụga ihe ndị ị gụtara na Baịbụl, e nwere ihe ndị ọzọ i nwere ike ịtụgharị uche na ha. Dị ka ihe atụ, ị́ hụ ihe ndị dị́ ịtụnanya Jehova kere, kwụsịtụ jụọ onwe gị, ‘Gịnị ka ihe a na-akụziri m banyere Jehova?’ Iche ụdị ihe a ga-eme ka i kpee ekpere ma kelee Jehova. É nwee ndị gị na ha nọ, gwa ha otú obi dị gị maka ihe ndị ahụ. (Ọma 104:24; Ọrụ 14:17) Olee otú obi na-adị Jehova ma anyị mee otú ahụ? Ka anyị hụ  otú Okwu ya bụ́ Baịbụl si zaa ajụjụ a. O kwere anyị nkwa banyere oge ikpeazụ a, sị: “N’oge ahụ, ndị na-atụ egwu Jehova nọ na-akparịta ụka, otu onye na ibe ya, Jehova nọkwa na-ege ntị ma na-anụ ihe ha na-ekwu. E wee malite ide akwụkwọ ncheta n’ihu ya maka ndị na-atụ egwu Jehova nakwa maka ndị na-echebara aha ya echiche.”Mal. 3:16.

Ị̀ na-atụgharị uche n’otú ị ga-esi nyere ndị ị na-amụrụ Baịbụl aka? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9)

9. (a) Gịnị ka Pọl gwara Timoti ka ọ na-atụgharị uche na ya? (b) Olee otú anyị ga-esi eme ihe Pọl kwuru mgbe anyị na-akwadebe maka ozi ọma?

9 Pọl onyeozi gwara Timoti ka ọ na-atụgharị uche n’otú okwu ya, omume ya, na ihe ọ na-akụzi si emetụta ndị ọzọ. (Gụọ 1 Timoti 4:12-16.) Dị ka Timoti, anyị nwere ọtụtụ ihe anyị nwere ike ichebara echiche. Dị ka ihe atụ, anyị kwesịrị iwepụta oge tụgharịa uche mgbe anyị na-akwadebe maka ịmụrụ ndị mmadụ Baịbụl. Anyị kwesịrị iburu onye anyị ga-amụrụ ihe n’obi chee banyere ajụjụ ma ọ bụ ihe atụ ga-enyere ya aka ime nke ọma. Isi otú a kwadebe maka ịmụrụ ndị mmadụ ihe ga-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike, otú anyị si amụrụ ha ihe ga-aka mma, anyị ejirikwa ịnụ ọkụ n’obi na-akụziri ha ihe. Ịtụgharị uche tupu anyị agawa ozi ọma ga-abakwara anyị uru. (Gụọ Ezra 7:10.) I nwere ike ịgụ otu isi n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi ka o nyere gị aka ijikwu ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma. I nwekwara ike ịtụgharị uche n’amaokwu Baịbụl ndị ị ga-agụrụ ndị mmadụ n’ụbọchị ahụ nakwa n’akwụkwọ ndị ị ga-enye ha. (2 Tim. 1:6) Chee banyere ndị bí n’ókèala unu nakwa ihe ị ga-ekwu ga-eme ka ha nwee mmasị. Isi otú a akwadebe ga-eme ka anyị nwee  ike iji Baịbụl kụziere ndị mmadụ ihe nke ọma.—1 Kọr. 2:4.

10. Olee ezigbo ihe ndị ọzọ anyị nwere ike ịna-atụgharị uche na ha?

10 Olee ihe ndị ọzọ i nwere ike ichebara echiche? Ọ bụrụ na ị na-ede ihe ma e kwuwe okwu ihu ọha nakwa ná mgbakọ, wepụta oge chebara ihe i dere echiche. Jụọ onwe gị, sị, ‘Gịnị ka m mụtara n’Okwu Chineke nakwa ná nzukọ ya?’ I nwekwara ike ịtụgharị uche n’ihe ndị e kwuru n’Ụlọ Nche na Teta! ọ bụla e bipụtara nakwa n’akwụkwọ ndị e wepụtara ọhụrụ ná mgbakọ. Mgbe ị na-agụ Akwụkwọ Mgbaafọ, kwụsịtụ ma ị gụchaa akụkọ ọ bụla. Ọ ga-eme ka i nwee ike tụgharịa uche n’ihe ị gụrụ, ya eruokwa gị n’obi. I nwekwara ike ịka ihe n’isi ihe ndị ị gụtara ma ọ bụkwanụ gị edee ihe n’akụkụ ya. Ọ ga-enyere gị aka mgbe ị na-akwadebe ịga nletaghachi, nleta ọzụzụ atụrụ, ma ọ bụ ikwu okwu ihu ọha. Nke kacha mkpa bụ na ịkwụsịtụ tụgharịa uche ga-eme ka ị ghọtakwuo ihe ndị ị gụrụ. I nwekwara ike iji ohere ahụ kpee ekpere, kelee Jehova maka ihe ndị ị na-amụta.

NA-ATỤGHARỊ UCHE N’OKWU CHINEKE KWA ỤBỌCHỊ

11. Gịnị bụ ihe kacha mkpa anyị kwesịrị ịna-atụgharị uche na ya? (Kwuo ihe dị́ n’isiokwu e dere n’ala ala peeji.)

11 O doro anya na ọ bụ Baịbụl ka anyị kwesịrị ịkacha na-atụgharị uche na ya. Gịnịkwanụ ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na e kweghị gị nwee Baịbụl. * Mmadụ agaghị egbochili gị ịtụgharị uche n’ihe ndị i bu n’isi, dị ka amaokwu Baịbụl ndị na-amasị gị ma ọ bụ abụ Alaeze. (Ọrụ 16:25) Mmụọ nsọ ga-enyere gị aka icheta ihe ndị ị mụrụ, nke ga-eme ka okwukwe gị sie ike.—Jọn 14:26.

12. Olee otú i nwere ike isi hazie ọgụgụ Baịbụl gị kwa ụbọchị?

12 Olee otú i nwere ike isi hazie ọgụgụ Baịbụl gị kwa ụbọchị? I nwere ike iji ụbọchị ụfọdụ gụọ ebe a ga-agụ n’izu n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke ma tụgharịa uche na ya. I nweziri ike iji ụbọchị ndị ọzọ na-agụ Matiu, Mak, Luk, na Jọn, na-atụgharịkwa uche n’ihe ndị Jizọs kwuru na ihe ndị o mere. (Rom 10:17; Hib. 12:2; 1 Pita 2:21) Anyị nwere akwụkwọ kọrọ ihe ndị Jizọs mere n’ụwa nakwa usoro ha ji mee. Akwụkwọ ahụ ga-aka abara gị uru ma ị gụọ ya mgbe ị na-agụ Matiu, Mak, Luk, na Jọn.—Jọn 14:6.

GỊNỊ MERE ỊTỤGHARỊ UCHE JI DỊ́ MKPA?

13, 14. Gịnị mere o ji dị́ ezigbo mkpa ka anyị na-atụgharị uche n’ihe anyị mụtara banyere Jehova na Jizọs? Olee ihe ọ ga-eme ka anyị mee?

13 Ịtụgharị uche n’ihe anyị mụtara banyere Jehova na Jizọs ga-enyere anyị aka ịbụ Ndị Kraịst tozuru okè. (Hib. 5:14; 6:1) Onye na-ewepụta obere oge eche banyere Jehova na Jizọs agaghị enwe okwukwe siri ike. Ụdị onye ahụ ga-eji nwayọọ nwayọọ sí n’eziokwu kpafuo ma ọ bụdị jụ Chineke kpamkpam. (Hib. 2:1; 3:12) Jizọs dọrọ anyị aka ná ntị na ọ bụrụ na anyị ejighị “ezi obi nke dị mma” nabata Okwu Chineke, ọ gaghị adịgide n’obi anyị. Kama, ‘nchegbu na akụnụba na ihe ụtọ dị iche iche nke ndụ ga-adọpụ uche anyị.’—Luk 8:14, 15.

14 N’ihi ya, ka anyị na-atụgharị uche mgbe niile n’Okwu Chineke. Ọ ga-eme ka anyị na-eṅomikwu àgwà Jehova.  (2 Kọr. 3:18) Anyị ga na-amụtakwu banyere Nna anyị nke eluigwe ma na-eṅomi ya ruo mgbe ebighị ebi. E nweghị ihe ùgwù ka ya.—Ekli. 3:11.

15, 16. (a) Olee uru ị na-erite n’ịtụgharị uche n’ihe banyere Jehova na Jizọs? (b) Gịnị mere ịtụgharị uche ji esi ike mgbe ụfọdụ? Gịnị mere na ike ekwesịghị ịgwụ anyị?

15 Ịtụgharị uche n’ihe gbasara Jehova na Jizọs ga-eme ka eziokwu Baịbụl na-anụ anyị ọkụ n’obi. Anyị ga-esi otú ahụ na-agba ụmụnna anyị na ndị anyị na-ezi ozi ọma ume. Ọ bụrụ na anyị ana-atụgharị uche n’onyinye kachanụ Chineke nyere anyị, ya bụ, àjà ahụ Jizọs chụrụ, anyị ga-eji adịm ná mma anyị na Nna anyị dị́ nsọ bụ́ Jehova kpọrọ ihe. (Rom 3:24; Jems 4:8) Otu nwanna onye Saụt Afrịka nke nọrọ n’ụlọ mkpọrọ afọ atọ n’ihi okwukwe ya sịrị: “E nwere ike iji ịtụgharị uche tụnyere mmadụ ịkpapụ akpapụ. Ọ bụrụ na anyị ana-atụgharị uche n’ihe gbasara ofufe Chineke, anyị ga na-achọpụtakwu ihe ọhụrụ banyere Chineke anyị, bụ́ Jehova. Mgbe ụfọdụ, ọ bụrụ na obi adawa m mbà ma ọ bụ m chegbuwe onwe m banyere ọdịnihu, m na-agụ otu ebe na Baịbụl ma tụgharịa uche na ya. Ọ na-eme ka obi ruo m ala.”

16 N’eziokwu, otú ihe ndị na-adọpụ uche si ju ebe niile emeela ka ịtụgharị uche n’Okwu Chineke na-esi ezigbo ike. Nwanna ọzọ aha ya bụ Patrick bụ́ onye Afrịka sịrị: “Uche m yiri ebe e kpojuru akwụkwọ ozi, ma ndị dị́ mma ma ndị na-adịghị mma. M kwesịkwara ịna-ahọ ha ahọ kwa ụbọchị. Ka m na-ahọ ha, m na-achọpụtakarị ihe ndị na-echegbu m. M na-ekpe ekpere ka ha pụọ m n’obi tupu mụ atụgharịwa uche. N’agbanyeghị na ime otú a na-ewetụ m oge tupu mụ atụgharịwa uche n’ihe gbasara Jehova, ọ na-eme ka m bịarukwuo Jehova nso, meekwa ka m ghọtakwuo eziokwu.” (Ọma 94:19) O doro anya na anyị ga-erite ọtụtụ uru ‘n’inyocha Akwụkwọ Nsọ kwa ụbọchị’ nakwa n’ịtụgharị uche n’ihe anyị mụtara.—Ọrụ 17:11.

OLEE OTÚ Ị GA-ESI ENWETA OHERE?

17. Olee otú i si enweta ohere i ji atụgharị uche?

17 Ụfọdụ na-ebili n’isi ụtụtụ gụọ Baịbụl, tụgharịa uche, kpeekwa ekpere. E nwekwara ndị na-eme nke ha n’oge ha ji ezu ike n’ehihie. I nwere ike ịchọpụta na oge kaara gị mma ịgụ Baịbụl bụ ná mgbede ma ọ bụ tupu ị lakpuo ụra. Ụfọdụ na-agụ Baịbụl n’ụtụtụ, gụọkwa ya ọzọ tupu ha alakpuo. Ha na-esi otú ahụ ‘agụ ya ehihie na abalị,’ ya bụ, mgbe niile. (Jọsh. 1:8) Ihe dị́ mkpa bụ ịkwụsịlata ihe ndị na-adịchaghị mkpa anyị na-eme ka anyị nwee ike ịna-atụgharị uche kwa ụbọchị n’Okwu Chineke.—Efe. 5:15, 16.

18. Gịnị ka Baịbụl kwuru banyere ndị na-atụgharị uche n’Okwu Chineke kwa ụbọchị ma na-agba mbọ ime ihe ha mụtara?

18 Baịbụl kwere anyị nkwa ugboro ugboro na Chineke ga-agọzi ndị niile na-atụgharị uche n’Okwu ya nakwa ndị na-agba mbọ ime ihe ha mụtara. (Gụọ Abụ Ọma 1:1-3.) Jizọs sịrị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị na-anụ okwu Chineke ma na-edebe ya!” (Luk 11:28) Ma, nke kacha mkpa bụ na ịtụgharị uche n’Okwu Jehova kwa ụbọchị na-enyere anyị aka ịna-akpa àgwà ga-eme ka e too onye kere ụbụrụ mmadụ. Anyị mee otú ahụ, Jehova ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ ugbu a, nyekwa anyị ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ ya.—Jems 1:25; Mkpu. 1:3.

^ para. 11 Gụọ isiokwu bụ́ “Mgbalị Siri Ike Anyị Mere Iji Kwụsie Ike n’Ụzọ Ime Mmụọ” n’Ụlọ Nche December 1, 2006.