Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) ỌKTOBA 2015

Ekwela Ka Ihe Ọ Bụla Dọpụ Uche Gị n’Ozi Jehova

Ekwela Ka Ihe Ọ Bụla Dọpụ Uche Gị n’Ozi Jehova

‘Meri nọ na-ege ntị n’ihe Jizọs na-ekwu. Ma ọtụtụ ihe Mata nọ na-eme dọpụrụ uche ya.’—LUK 10:39, 40.

ABỤ: 94, 134

1, 2. Gịnị mere Jizọs ji hụ Mata n’anya? Ma, olee ihe gosiri na Mata bụ mmadụ na-ezughị okè?

GỊNỊ na-agbata gị n’obi ma i cheta Mata nwanne Lazarọs? Baịbụl kwuru na ọ bụ ezigbo enyi Jizọs, kwuokwa na Jizọs hụrụ ya n’anya. N’eziokwu, ọ bụghị naanị ya bụ nwaanyị Jizọs hụrụ n’anya ma na-akwanyere ùgwù. Dị ka ihe atụ, Meri nwanne Mata bụkwa ezigbo enyi Jizọs. Jizọs hụkwara nne ya bụ́ Meri n’anya. (Jọn 11:5; 19:25-27) Gịnịzi mere Baịbụl ji kwuo na Jizọs hụrụ Mata n’anya?

2 Ihe mere Jizọs ji hụ Mata n’anya abụghị naanị na ọ ma otú e si ele mmadụ ọbịa, na-arụsikwa ọrụ ike, kama ọ bụ n’ihi na o nwere okwukwe siri ike. O kweere n’ihe niile Jizọs kụziri. Obi sikwara ya ike na Jizọs bụ Mesaya ahụ e kwere ná nkwa. (Jọn 11:21-27) Ma, Mata bụ mmadụ na-ezughị okè. E nwere ihe ndị o mejọrọ otú ahụ anyị niile na-emejọ. Dị ka ihe atụ, otu mgbe Jizọs gara n’ụlọ ha, Mata wesara Meri nwanne ya nwaanyị iwe ma gwa Jizọs ka ọ baara ya mba. Mata sịrị: “Onyenwe anyị, ọ́ bụghịrị gị ihe ọ bụla na nwanne m nwaanyị  hapụụrụ naanị m ihe niile ka m mewe? Ya mere, gwa ya ka ọ bịa nyere m aka.” (Gụọ Luk 10:38-42.) Gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta n’akụkọ a?

IHE MATA NA-EME DỌPỤRỤ UCHE YA

3, 4. Gịnị mere Jizọs ji kwuo na Meri họọrọ “òkè dị mma”? Gịnị ka Mata mụtara? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

3 Obi tọrọ Jizọs ụtọ na Mata na Meri kpọrọ ya ka ọ bịa n’ụlọ ha. Ọ chọkwara iji oge ahụ kụziere ha eziokwu bara ezigbo uru. Meri bịara ozugbo nọrọ n’akụkụ Jizọs, “na-ege ntị n’ihe ọ na-ekwu.” Ọ chọrọ ịmụta ihe niile o nwere ike ịmụta n’ọnụ Onye Ozizi Ukwu ahụ. Mata gakwaara eme otú ahụ ma á sị na ọ chọrọ. Jizọs gaara aja ya mma ma á sị na ọ hapụrụ ihe ahụ ọ na-eme bịa gewe ya ntị.

4 Ma, ihe Mata na-eme dọpụrụ uche ya. Ọ nọ na-agba mbọ ka o siere Jizọs nri pụrụ iche, na-emekwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ iji mee ka obi dị́ Jizọs ezigbo ụtọ. Mgbe Mata hụrụ na Meri abịaghị nyewere ya aka, iwe were ya, ya ekpesawara Jizọs. Ma Jizọs ma na ihe Mata na-agbalị ime karịrị akarị. Ọ bụ ya mere o ji wetuo obi sị ya: “Mata, Mata, ị na-echegbu onwe gị, na-esogbukwa onwe gị banyere ọtụtụ ihe.” Ọ gwaziri Mata na ihe ole na ole ma ọ bụkwanụ naanị otu nri ga-ezu. Ọ jara Meri mma maka ige ntị nke ọma. Ọ sịrị: “Ma Meri họọrọ òkè dị mma, a gaghịkwa anapụ ya nke ahụ.” Meri nwere ike ichefu ihe o riri n’ụbọchị ahụ, ma o doro anya na o chefughị ihe ọ mụtara n’ọnụ Jizọs na otú o si jaa ya mma. Mgbe ihe karịrị iri afọ isii gara, Jọn onyeozi dere, sị: ‘Jizọs hụrụ Mata na nwanne ya nwaanyị n’anya.’ (Jọn 11:5) Ihe a Baịbụl kwuru gosiri na Mata nabatara ndụmọdụ Jizọs nyere ya ma gbalịsie ike iji obi ya niile jeere Jehova ozi ruo ọnwụ.

5. Gịnị mere o ji esi ezigbo ike n’oge anyị a ilekwasị anya n’ihe ndị ka mkpa? Olee ajụjụ e kwesịrị ịza?

5 Olee otú ihe ndị na-adọpụ ndị mmadụ uche n’ụwa taa si karịa ndị e nwere n’oge Baịbụl? Ụlọ Nche Bekee nke September 15, 1958, kwughachiri ihe a gwara ụmụ akwụkwọ nọ́ n’Amerịka ihe karịrị iri afọ isii gara aga, ya bụ, na e nwetụbeghị ihe ọgbara ọhụrụ otú e nwere ya n’oge anyị a, ma ihe e ji ezirịta ozi, ma ígwè ndị bụ́ ọkpọka e ji ebi akwụkwọ, ma ọmarịcha ihe ndị a na-ese n’akwụkwọ, ma redio, ma fim, ma tiivi. A gwakwara ha na ihe ndị a bụ ụzọ ọhụrụ e si adọpụ uche ndị mmadụ n’ihe ndị ka mkpa. N’oge ahụ, ndị mmadụ ji obi ụtọ na-ekwu na ọgbọ anyị a bụ ọgbọ hụrụ ụzọ, ma o ji nwayọọ nwayọọ na-aghọ ọgbọ nwere ọtụtụ ihe na-adọpụ ndị mmadụ uche. Ụlọ Nche ahụ kwuru na a ga na-enwekwu ihe na-adọpụ ndị mmadụ uche ka ụwa ochie a na-agba egwú ụla. Ọ bụ eziokwu doro anya. N’ihi ya, ajụjụ dị́ mkpa bụ: Gịnị ka anyị ga-eme ka ihe ndị na-adịghị mkpa ghara ịdọpụ anyị uche nakwa ka anyị lekwasị anya n’ihe gbasara ofufe Chineke otú ahụ Meri mere?

‘EJILA ỤWA EME IHE N’UJU’

6 Nzukọ Jehova na-eji ihe ọgbara ọhụrụ a na-emepụta n’ụwa a ekwusa ozi ọma. Dị ka ihe atụ, chegodị banyere ihe nkiri slaịd a kpọrọ “Photo-Drama of Creation.” Ọ mara mma. A na-anụkwa olu mmadụ na ya. Tupu Agha Ụwa Mbụ amalite nakwa mgbe a lụchara ya, ọtụtụ nde mmadụ eleela ya, ya akasie ha obi. Ihe ikpeazụ e gosiri na ya bụ ọchịchị Jizọs Kraịst ga-achị otu puku afọ. Ndị  Jehova mechara jiri redio kwusaara ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa niile ozi ọma Alaeze Chineke. Taa, anyị na-eji kọmputa na Ịntanet ezi ndị mmadụ ozi ọma n’ebe niile, ma ndị bí n’ebe ndị dịpụrụ adịpụ.

Ekwela ka ihe ndị na-adịghị mkpa na-adọpụ uche gị n’ozi Jehova (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7)

7. (a) Olee nsogbu iji oge anyị niile na-achụ ihe ndị dị́ n’ụwa na-akpata? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị ịkpachara anya banyere ya? (Kwuo ihe dị́ n’isiokwu e dere n’ala ala peeji.)

7 Baịbụl dọrọ anyị aka ná ntị ka anyị ghara iji ụwa eme ihe n’uju, ya bụ, iji oge anyị niile na-achụ ihe ndị dị́ n’ụwa. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 7:29-31.) Ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ adịghị njọ. Ma, ha nwere ike ịna-eri anyị oge ma ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya. Ụfọdụ n’ime ha bụ ịtụrụ ndụ, ịgụ akwụkwọ, ile tiivi, ịga legharịa anya, na ịgba mbọ ịmata ihe ndị pụtara ọhụrụ na ihe ndị e ji ekpori ndụ. Ọ na-atọ ọtụtụ ndị ụtọ ịkparịta ụka n’Ịntanet, iji ekwentị na kọmputa ederịta ozi, ma ọ bụ ịgba mbọ ka ha mata ihe ndị na-eme n’ụwa na otú ihe si na-aga n’egwuregwu. Ma ihe ndị a na-erizi ụfọdụ ndị isi. * (Ekli. 3:1, 6) Ọ bụrụ na anyị ekwe ka ihe ndị na-adịghị mkpa na-eri anyị oge, anyị nwere ike ịna-eleghara ihe kacha mkpa anya, ya bụ, ife Jehova.—Gụọ Ndị Efesọs 5:15-17.

8. Gịnị mere o ji dị ezigbo mkpa ka anyị ghara ịhụ ihe ndị dị́ n’ụwa n’anya?

8 Setan na-eme ihe niile o nwere ike iji ihe ndị dị́ n’ụwa rata anyị ma mee ka uche anyị pụọ n’ife Jehova. O mere otú ahụ n’oge ndịozi Jizọs. Nke ọ na-eme taa kadị njọ. (2 Tim. 4:10) N’ihi ya, anyị kwesịrị ime ihe Baịbụl gwara anyị, ya bụ, ‘Unu ahụla ihe ndị dị n’ụwa n’anya.’ Ọ bụrụ na anyị na-achọpụta ebe anyị na-anaghị emezi ma na-agbanwe àgwà anyị, ihe ndị na-adịghị mkpa agaghị adọpụ uche anyị n’ozi Jehova. Anyị ga-ahụkwu Nna anyị nke eluigwe n’anya. Anyị mee otú ahụ, ọ ga-adịrị anyị mfe ịna-eme uche Chineke, anyị na ya adịrị ná mma ruo mgbe ebighị ebi.—1 Jọn 2:15-17.

LEKWASỊ ANYA N’IHE KACHA MKPA

9. Gịnị ka Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha lekwasị anya na ya? Olee otú o si mee ihe ọ kụziiri ha?

9 Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya otu ihe ahụ ọ gwara Mata, ya bụ, ka ha ghara ikwe ka ime ọtụtụ ihe dọpụ uche ha n’ihe ka mkpa. Ọ gwara ha ka ha lekwasị anya n’ozi Jehova nakwa n’Alaeze ya.  (Gụọ Matiu 6:22, 33.) Jizọs mere ihe ahụ ọ kụziiri ha. Ihe o nwere adịghị ọtụtụ. O nweghịdị ụlọ ma ọ bụ ala.—Luk 9:58; 19:33-35.

10. Gịnị ka Jizọs mere nke anyị kwesịrị ịmụta?

10 Jizọs ekweghị ka ihe ọ bụla mee ka uche ya pụọ n’ozi ọma ọ na-ekwusa. Ná mmalite ozi ya, mgbe ọ kụzichaara ìgwè mmadụ ihe ma rụọ ụfọdụ ọrụ ebube na Kapaniọm, ndị mmadụ rịọrọ ya ka ọ ghara isi n’obodo ha pụọ. Gịnị ka Jizọs mere? Ọ sịrị: “Aghaghịkwa m izisara obodo ndị ọzọ ozi ọma alaeze Chineke, n’ihi na ọ bụ nke a mere e ji zite m.” (Luk 4:42-44) Jizọs mere ihe ahụ o kwuru. O ji ụkwụ gazuo ala Izrel niile, na-ekwusa ozi ọma ma na-akụzi okwu Chineke. N’agbanyeghị na o zuru okè, ike gwụrụ ya mgbe ụfọdụ, ya achọọkwa izu ike n’ihi na o ji ike ya niile na-arụ ọrụ Chineke nyere ya.—Luk 8:23; Jọn 4:6.

11. Gịnị ka Jizọs gwara otu nwoke ya na nwanne ya na-ese okwu? Gịnị ka Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya?

11 N’oge ọzọ, mgbe Jizọs na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya ihe ha ga-eme ma é megidewe ha, otu nwoke nabiiri ya okwu n’ọnụ, sị ya: “Onye Ozizi, gwa nwanne m nwoke ka mụ na ya kee ihe nketa anyị.” Ma, Jizọs ekweghị etinye ọnụ n’esemokwu ahụ. Ọ sịrị nwoke ahụ: “Nwoke m, ònye mere m ọkàikpe ma ọ bụ onye na-ekere unu ihe?” O kweghị ka ihe ọ bụla dọpụ uche ya n’ihe ọ na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya. O ji ohere ahụ kụziere ha na ọ bụrụ na obi ha adịrị n’ịkpatakwu akụ̀, uche ha agaghịzi adị n’ijere Chineke ozi.—Luk 12:13-15.

12, 13. (a) Obere oge tupu Jizọs anwụọ, gịnị mere ụfọdụ ndị Grik obi ụtọ? (b) Gịnị ka Jizọs mere mgbe Filip gwara ya na e nwere ndị chọrọ ịhụ ya?

12 Izu ikpeazụ Jizọs nọrọ n’ụwa adịrịghị ya mfe. (Mat. 26:38; Jọn 12:27) O nwere ọtụtụ ihe ọ ga-arụ. A ga-atakwa ya ahụhụ ma gbuo ya. Dị ka ihe atụ, chegodị ihe mere n’ụbọchị Sọnde, abalị itoolu n’ọnwa Naịsan afọ 33. Dị ka e buru n’amụma, Jizọs nọ n’elu nwa ịnyịnya ibu banye Jeruselem, ìgwè mmadụ ana-eto ya, na-akpọ ya ‘Eze nke na-abịa n’aha Jehova.’ (Luk 19:38) N’echi ya, Jizọs banyere n’ụlọ nsọ ma jiri obi ike chụpụ ndị anyaukwu nọ́ n’ụlọ nsọ Chineke na-apụnara ndị Juu ibe ha ego ha.—Luk 19:45, 46.

13 Ụfọdụ ndị Grik só bịa Jeruselem ime Ememme Ngabiga hụrụ ihe Jizọs mere, obi adị ha ezigbo ụtọ. N’ihi ya, ha gwara Filip na ha chọrọ ịhụ Jizọs. Ma Jizọs ekweghị ka ihe ọ bụla mee ka uche ya pụọ n’ihe ndị ka mkpa ọ chọrọ ime. Ọ chọwaghị otú ọ ga-esi nweta ndị ga-akwado ya ka ndị iro Chineke ghara ịta ya ahụhụ ma gbuo ya. N’ihi ya, mgbe ọ kọwachara na a ga-egbu ya n’oge na-adịghị anya, ọ sịrị Andru na Filip: “Onye hụrụ mkpụrụ obi ya n’anya na-ebibi ya, ma onye kpọrọ mkpụrụ obi ya asị n’ụwa a ga-echebe ya maka ndụ ebighị ebi.” Kama ime ihe ndị Grik ahụ chọrọ, o kwuru na mmadụ kwesịrị iji ndụ ya niile jeere Chineke ozi otú ahụ ọ na-eme. O kwere nkwa, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla ga-ejere m ozi, Nna m ga-eme ka o nwee ùgwù.” O doro anya na Filip gara gwa ndị Grik ahụ ihe a Jizọs kwuru.—Jọn 12:20-26.

14. N’agbanyeghị na Jizọs ji ikwusa ozi ọma kpọrọ ihe, olee ihe gosiri na ọ na-ewepụta oge eme ihe ndị ọzọ?

14 N’agbanyeghị na Jizọs ekweghị ka ihe ọ bụla dọpụ uche ya n’ozi ọma dị́ mkpa ọ na-ekwusa, ọ bụghị mgbe niile ka ọ nọ na-eche banyere ọrụ. Ọ́ dịkarịa ala, e nwere otu mgbe ọ gara  agbamakwụkwọ a kpọrọ ya. O medịrị ka mmiri ghọọ mmanya, nke mere ka agbamakwụkwọ ahụ tọkwuo ụtọ. (Jọn 2:2, 6-10) E nwekwara oge ndị ọzọ ndị enyi ya na ndị chọrọ ịbụ ndị na-eso ụzọ ya kpọrọ ya oriri, ya agaa. (Luk 5:29; Jọn 12:2) Nke kadị mkpa bụ na Jizọs wepụtara oge na-ekpe ekpere, na-atụgharị uche mgbe naanị ya nọ, na-ezukwa ike.—Mat. 14:23; Mak 1:35; 6:31, 32.

‘YIPỤ IHE Ọ BỤLA DỊ ARỌ’

15. Olee ndụmọdụ Pọl nyere? Gịnị ka o mere anyị kwesịrị ịmụta?

15 Pọl onyeozi ji Ndị Kraịst tụnyere ndị na-agba ọsọ e ji ntachi obi agba. O dere, sị: “Ka anyị yipụkwa ihe ọ bụla dị arọ.” (Gụọ Ndị Hibru 12:1.) Pọl mere ihe ahụ o kwuru. Ọ hapụrụ okpukpe ndị Juu nke gaara eme ka ọ bụrụ aka ji akụ̀ na onye a ma ama. O lekwasịrị anya ‘n’ihe ndị ka mkpa.’ Ọ gara ebe dị́ iche iche, ma Siria, ma Eshia Maịnọ, ma Masedonia, ma Judia iji jeere Chineke ozi. O dere banyere olileanya o nwere ịdị ndụ ebighị ebi n’eluigwe, sị: “Ana m echefu ihe ndị dị n’azụ, na-amatịkwa onwe m inweta ihe ndị dị n’ihu, ana m achụso ihe mgbaru ọsọ ahụ iji nweta ihe a na-agbata n’ọsọ.” (Fil. 1:10; 3:8, 13, 14) Pọl alụghị nwaanyị. Ọ bụ ihe nyeere ya aka “ijere Onyenwe anyị ozi mgbe niile n’enweghị ndọpụ uche.”—1 Kọr. 7:32-35.

16, 17. Ma ànyị alụọla di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ na anyị alụbeghị, olee otú anyị ga-esi eme ihe Pọl mere? Gịnị ka otu nwanna na nwunye ya mere?

16 Ụfọdụ ụmụnna anyị taa na-eme ka Pọl. Ha kpebiri na ha agaghị alụ di ma ọ bụ nwunye ka ha nwee ike ijekwuru Chineke ozi. (Mat. 19:11, 12) Ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye na-enwekarị ọtụtụ ọrụ n’ezinụlọ. Ma, ànyị lụrụ ma ọ bụ na anyị alụghị, anyị niile kwesịrị ịhapụ ihe ọ bụla nwere ike ime ka uche anyị pụọ n’ozi Jehova. O nwere ike ịpụta ịhapụ ihe na-eri anyị oge ma kpebie ihe ndị anyị ga-eme ka anyị nwee ike iwepụtakwu oge jeere Chineke ozi.

17 Chegodị banyere otu nwanna aha ya bụ Mark, nwunye ya abụrụ Claire. Ha bụ ndị Briten. Onye nke ọ bụla malitere ịsụ ụzọ mgbe ọ gachara ụlọ akwụkwọ, ka na-asụkwa ụzọ mgbe ha lụchara. Nke nwoke sịrị: “Anyị hapụrụ ụlọ butụrụ ibu anyị bi, kwụsịkwa ọrụ anyị na-arụ ka anyị nwee ike iso ná ndị na-aga ná mba dị́ iche iche arụ ụlọ ndị a na-arụ ná nzukọ Jehova.” Kemgbe iri afọ abụọ, ha agaala mba dị́ iche iche n’Afrịka, nye aka rụọ ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze. E nwere mgbe ego niile ha nwere fọrọ obere ka ọ gwụchaa, ma Jehova lekọtara ha. Nke nwaanyị sịrị: “Ijere Jehova ozi kwa ụbọchị na-atọgbu anyị atọgbu. Anyị emetala ọtụtụ ndị enyi. O nweghị ihe kọrọ anyị. Ihe anyị hapụrụ iji na-ejere Jehova ozi enweghị ihe ọ bụ ma é jiri ya tụnyere obi ụtọ anyị na-enwe ugbu a n’ihi ozi oge niile anyị na-ejere Jehova.” Otú ahụ ka ọ dịkwa ọtụtụ ndị ọzọ nọ́ n’ozi oge niile. *

18. Olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ichebara echiche?

18 Gịnwa kwanụ? Gịnị ka ị ga-eme ma ị́ chọpụta na ị naghịzi eji ịnụ ọkụ n’obi ejere Chineke ozi n’ihi ihe ndị na-adọpụ gị uche? O nwere ike ịbụ na i kwesịrị ime ka ọgụgụ Baịbụl gị na ịmụ ihe gị bakwuoro gị uru. Olee otú ị ga-esi eme ya? Ọ bụ ihe anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ.

^ para. 17 Gụọkwa akụkọ ndụ Hadyn Sanderson na nwunye ya Melody, nke isiokwu ya bụ “Ịmata Ihe Dị Mma ma Mee Ya,” n’Ụlọ Nche March 1, 2006. Ha hapụrụ achụmnta ego ha n’Ọstrelia ma malite ozi oge niile. Gụọ ihe mere mgbe ha na-eje ozi ala ọzọ n’India, ego ha agwụ.