Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) SEPTEMBA 2015

Olee Otú Anyị Ga-esi Gosi na Anyị Hụrụ Jehova n’Anya?

Olee Otú Anyị Ga-esi Gosi na Anyị Hụrụ Jehova n’Anya?

“Anyị onwe anyị nwere ịhụnanya, n’ihi na o bu ụzọ hụ anyị n’anya.”—1 JỌN 4:19.

ABỤ: 56, 138

1, 2. Olee otú Jọn onyeozi kwuru Chineke si kụziere anyị otú anyị ga-esi hụ ya n’anya?

ỤZỌ kacha mma onye bụ́ nna ga-esi akụziri ụmụ ya ihe bụ ịna-eme ihe ọ na-akụziri ha. Jọn onyeozi dere, sị: “Anyị onwe anyị nwere ịhụnanya, n’ihi na [Chineke] bu ụzọ hụ anyị n’anya.” (1 Jọn 4:19) N’ihi ya, o doro anya na Nna anyị, bụ́ Jehova, egosila anyị ịhụnanya na-enweghị atụ nke ga-enyere anyị aka ịhụ ya n’anya.

2 Olee otú Chineke si ‘buru ụzọ hụ anyị n’anya’? Pọl onyeozi sịrị: “Chineke mere ka anyị mata ịhụnanya ya, n’ihi na, mgbe anyị ka bụ ndị mmehie, Kraịst nwụrụ n’ihi anyị.” (Rom 5:8) Àjà ahụ Jehova ji Ọkpara ya chụọ iji gbapụta ụmụ mmadụ furu ya oké ihe. O si otú ahụ gosi anyị ihe bụ́ ezigbo ịhụnanya. Otú e si egosi ụdị ịhụnanya a bụ inye ndị ọzọ ihe na ime ihe gosiri na anyị anaghị achọ naanị ọdịmma onwe anyị. Ihe ọma a Chineke meere anyị mere ka anyị nwee ike ịbụ enyi ya iji rite uru n’ịhụnanya ya ma gosi na anyị hụrụ ya n’anya.—1 Jọn 4:10.

3, 4. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị hụrụ Chineke n’anya?

3 Ịhụnanya bụ àgwà kachanụ Jehova nwere. Ka a sịkwa ihe mere Jizọs ji gwa otu nwoke na iwu kachanụ Chineke nyere bụ:  “Jiri obi gị dum, jirikwa mkpụrụ obi gị dum, jirikwa uche gị dum, jirikwa ike gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.” (Mak 12:30) Ihe a Jizọs kwuru mere ka anyị mata na anyị kwesịrị iji obi anyị niile hụ Chineke n’anya. Ọ ga-ewute Jehova ma anyị ejighị obi anyị niile hụ ya n’anya. Ma, ịhụ Chineke n’anya ekwesịghị ịgbasa naanị otú ọ dị anyị n’obi. Jehova chọkwara ka anyị jiri “uche anyị dum,” na “ike anyị dum” hụ ya n’anya. Ọ pụtara na otú anyị si eche echiche na otú anyị si ebi ndụ kwesịrị igosi na anyị hụrụ Chineke n’anya. Ihe Maịka onye amụma kwuru gosiri na Chineke chọrọ ka anyị na-eme otú ahụ.—Gụọ Maịka 6:8.

4 Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị hụrụ Nna anyị nke eluigwe n’anya n’eziokwu? Cheta na Jizọs kwuru na ọ bụ iji ihe niile anyị nwere hụ Chineke n’anya. N’isiokwu bu nke a ụzọ, anyị lebara anya n’ụzọ anọ Jehova si egosi na ọ hụrụ ụmụ ya n’anya nke ukwuu. Ka anyị tụlezie otú anyị ga-esi gosi na anyị hụrụ Jehova n’anya nakwa otú anyị ga-esi hụkwuo ya n’anya.

NA-ENWE OBI ỤTỌ MAKA IHE JEHOVA NA-EMERE ANYỊ

5. Gịnị ka anyị kwesịrị ime n’ihi ihe niile Jehova na-emere anyị?

5 Gịnị ka ị na-eme ma mmadụ nye gị onyinye? Ọ ga-abụrịrị na ị na-ekele onye ahụ ma ọ bụ gosi ya na obi dị gị ụtọ. Ị gaghịkwa eji onyinye ahụ gwuo egwu, kama ị ga-eji ya mee ihe bara uru. Jems dere, sị: “Ezi onyinye ọ bụla na onyinye ọ bụla zuru okè si n’elu bịa, n’ihi na ọ na-esi n’aka Nna nke ìhè eluigwe abịa, ọ dịghị agbanwe agbanwe, ọ dịghị ka onyinyo nke na-atụgharị atụgharị.” (Jems 1:17) Jehova na-enye anyị ihe niile ga-eme ka anyị dị ndụ ma na-enwe obi ụtọ. Ọ̀ bụ na ihe a ọ na-eme ekwesịghị ime ka anyị hụ ya n’anya?

6. Gịnị ka ndị Izrel kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ha chọrọ ka Jehova na-agọzi ha?

6 Jehova meere ndị Izrel ọtụtụ ihe ọma. Ruo ọtụtụ narị afọ, o ji iwu ya na-eduzi ha ma na-enye ha ihe niile ga-eme ka ha na-adị ndụ. (Diut. 4:7, 8) Ma, ọ bụrụ na ha chọrọ ka Jehova na-agọzi ha, ha ga na-erubere iwu ya isi. Dị ka ihe atụ, ihe ha ga-eji na-achụrụ Jehova àjà ga-abụ ihe “kasị mma n’ime mkpụrụ mbụ kara aka” sí n’ala ha. (Ọpụ. 23:19) Ndị Izrel ga-esi otú ahụ gosi na ha ejighị ịhụnanya Jehova na ngọzi ya egwu egwu.—Gụọ Diuterọnọmi 8:7-11.

7. Olee otú anyị ga-esi jiri ‘ihe anyị ndị dị oké ọnụ ahịa’ gosi na anyị hụrụ Jehova n’anya?

7 Anyịnwa kwanụ? N’agbanyeghị na Jehova achọghị ka anyị na-achụrụ ya àjà taa, anyị kwesịrị iji ‘ihe anyị ndị dị oké ọnụ ahịa’ na-asọpụrụ ya ma na-egosi na anyị hụrụ ya n’anya. (Ilu 3:9) Olee ụzọ ụfọdụ anyị ga-esi eme ya? Anyị nwere ike iji ihe anyị nwere na-akwado ọrụ gbasara Alaeze Chineke a na-arụ ma n’ọgbakọ anyị ma n’ụwa niile. Ọ bụ otu n’ime ụzọ magburu onwe ya anyị ga-esi gosi na anyị hụrụ Jehova n’anya, ma ànyị bara ọgaranya ma ànyị dara ogbenye. (2 Kọr. 8:12) Ma, e nwere ụzọ ndị ọzọ anyị ga-esi gosi Jehova na anyị hụrụ ya n’anya.

8, 9. Olee ụzọ ọzọ anyị si egosi Jehova na anyị hụrụ ya n’anya? Gịnị ka otu nwanna na ndị ezinụlọ ya mere?

8 Cheta na Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha ghara ịna-echegbu onwe ha banyere nri na uwe, kama ka ha buru ụzọ na-achọ Alaeze Chineke. O kwuru na Nna anyị nke eluigwe ma ihe ndị na-akpa anyị. (Mat. 6:31-33) Anyị tụkwasịrị Jehova obi, marakwa na ọ ga-emezu nkwa ya. A sị ka e kwuwe, ọ bụ onye mmadụ hụrụ n’anya ka ọ na-atụkwasị obi. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na anyị ana-atụkwasịkwu Jehova obi, anyị ga na-egosikwu ya  na anyị hụrụ ya n’anya. (Ọma 143:8) N’ihi ya, anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘Ihe ndị m na-ekpebi ime na otú m si ebi ndụ ọ̀ na-egosi na m ji obi m niile hụ Jehova n’anya? Ihe m na-eme kwa ụbọchị ọ̀ na-egosi na obi siri m ike na Jehova ga-egboro m mkpa m?’

9 Otu nwanna aha ya bụ Mike mere ihe gosiri na ọ hụrụ Jehova n’anya, tụkwasịkwa ya obi. Mgbe ọ bụ nwa okorobịa, ọ chọrọ ịga kwusaa ozi ọma ná mba ọzọ. O mechara lụọ nwaanyị, mụta ụmụ abụọ, ma obi ya ka dị n’ịga kwusaa ozi ọma ná mba ọzọ. Mgbe ya na ndị ezinụlọ ya gụrụ banyere ụmụnna ndị na-eje ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu, ha kpebiri ịgbanwe ihe ndị ha na-eme ka ha nwee ike ịkwaga mba ọzọ. Ha rere ụlọ ha, kwaga n’obere ụlọ. Mike selatara aka n’ọrụ ya, mụtakwa otú ọ ga-esi nọrọ ná mba ọzọ jiri Ịntanet na-arụ ọrụ ya n’obodo ha. Ha mechara kwaga mba ọzọ. Mgbe ha jere ozi n’ebe ahụ afọ abụọ, Mike kwuru, sị: “Anyị hụrụ ihe gosiri na ihe ahụ Jizọs kwuru na Matiu 6:33 bụ eziokwu.”

NA-ATỤGHARỊ UCHE N’IHE CHINEKE NA-AKỤZIRI GỊ

10. Dị ka Eze Devid, gịnị mere o ji dị mma ka anyị na-atụgharị uche n’ihe anyị mụtara banyere Jehova?

10 Ihe dị́ ka puku afọ atọ gara aga, Eze Devid dere, sị: “Eluigwe na-akọsa ebube Chineke; mbara igwe na-akọkwa ọrụ aka ya.” Ọ sịkwara: “Iwu Jehova zuru okè, na-eweghachite mkpụrụ obi. Ihe ncheta Jehova bụ ihe a pụrụ ịtụkwasị obi, na-eme ka onye na-amaghị ihe mara ihe.” Ka Devid tụgharịrị uche n’iwu Jehova na ọmarịcha ihe ndị o kere, ọ bịarukwuru Jehova nso, chọọkwa igosi Jehova na ọ hụrụ ya n’anya. Devid kwuziri, sị: “Ka ihe ọnụ m na-ekwu na ihe m na-atụgharị n’uche bụrụ ihe na-atọ gị ụtọ, Jehova, Oké Nkume m na Onye Mgbapụta m.”—Ọma 19:1, 7, 14.

11. Olee otú anyị ga-esi jiri ọtụtụ ihe Jehova na-akụziri anyị gosi ya na anyị hụrụ ya n’anya? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

11 Taa, Jehova na-akụziri anyị ọtụtụ ihe banyere onwe ya, nzube ya, ihe ndị o kere, nakwa Okwu ya. Ndị ụwa na-agba ndị mmadụ ume ka ha gụọ oké akwụkwọ. Ma, ịgụ oké akwụkwọ na-emekarị ka ndị mmadụ kwụsị ịhụ Chineke n’anya, okwukwe ha anyụọkwa ka ọkụ. Ọ bụghị naanị na Baịbụl gwara anyị ka anyị na-amụtakwu ihe, kama ọ gwakwara anyị ka anyị nweta amamihe na nghọta. Ọ pụtara na anyị kwesịrị ịmụta otú anyị ga-esi jiri ihe Chineke kụziiri anyị na-eme ihe ga-abara anyị na ndị ọzọ uru. (Ilu 4:5-7) Chineke chọrọ “ka a zọpụta ụdị mmadụ niile, ka ha nwetakwa ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” (1 Tim. 2:4) Anyị ga-egosi na anyị hụrụ Jehova n’anya ma ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile na-agwa ndị ọzọ banyere Alaeze ya ma na-enyere ha aka ịghọta ihe Chineke ga-emere ụmụ mmadụ n’ọdịnihu.—Gụọ Abụ Ọma 66:16, 17.

12. Olee otú otu nwanna nwaanyị na-eto eto si gosi na obi dị ya ụtọ maka ihe ọma Jehova na-emere ya?

12 Ndị na-eto eto nwekwara ike ịtụgharị uche n’ihe niile Jehova nyere ha nakwa ihe ndị ọ kụziiri ha. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Shannon ka na-echeta otú obi dị ya mgbe ya na ndị ezinụlọ ha gara Mgbakọ Distrikti “Nsọpụrụ Chineke.” Ọ dị afọ iri na otu mgbe ahụ, nwanne ya adị afọ iri. Ná mgbakọ ahụ, e nwere oge a gwara ndị niile na-eto eto ka ha nọkọta otu ebe. Ahụ́ eruchaghị Shannon ala. Ma, ọ gara nọrọ ebe ahụ. Obi tọrọ ya ezigbo ụtọ mgbe e nyere onye ọ bụla n’ime ha ọmarịcha akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè. Olee otú obi dị ya maka ọmarịcha onyinye a Jehova  Chineke nyere ya? Ọ sịrị: “Ọ bụ mgbe ahụ ka m ghọtara na Jehova dị adị nakwa na ọ hụrụ mụnwa n’anya nke ukwuu. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Jehova Chineke anyị na-enye anyị ụdị ọmarịcha onyinye ahụ.”

NABATA NDỤMỌDỤ CHINEKE NA AKA NÁ NTỊ Ọ NA-ADỌ GỊ

13, 14. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma Jehova dọọ anyị aka ná ntị? N’ihi gịnị?

13 Baịbụl gwara anyị, sị: “Onye Jehova hụrụ n’anya ka ọ na-abara mba, ọbụna dị ka nna si abara nwa ya nke ihe ya dị ya mma mba.” (Ilu 3:12) Ma, gịnị ka anyị kwesịrị ime ma á dọọ anyị aka ná ntị? Pọl onyeozi kwuru eziokwu doro anya, sị: “Ọ dịghị ịdọ aka ná ntị ọ bụla nke na-eyi ihe na-enye ọṅụ mgbe a na-adọ ya, kama ọ na-eyi ihe mwute.” Ihe a Pọl kwuru apụtaghị na ịdọ aka ná ntị abaghị uru, n’ihi na ọ sịkwara: “Ma n’ikpeazụ, ọ na-amịrị ndị e ji ya zụọ mkpụrụ udo, ya bụ, ezi omume.” (Hib. 12:11) Ọ bụrụ na anyị hụrụ Jehova n’anya, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ịna-eleghara ndụmọdụ anya ma ọ bụkwanụ wee iwe ma á dụọ anyị ọdụ. O nwere ike isiri ụfọdụ ndị ike. Ịhụ Chineke n’anya ga-enyere anyị ezigbo aka.

14 N’oge Malakaị, ọtụtụ ndị Juu egeghị Jehova ntị. Ha ma ihe Iwu Jehova kwuru banyere ụdị ihe ha kwesịrị iji chụọrọ ya àjà, ma ha leghaara iwu ahụ anya. N’ihi ya, Jehova baara ha mba. (Gụọ Malakaị 1:12, 13.) Gịnị ka Jehova gwara ha? Ọ sịrị ha: “M ga-eme ka ọbụbụ ọnụ bịakwasị unu, m ga-emekwa ka ngọzi unu ghọọ ọbụbụ ọnụ. Ee, m meworị ka ngọzi unu ghọọ ọbụbụ ọnụ, n’ihi na unu etinyeghị [iwu m] n’obi.” (Mal. 2:1, 2) N’agbanyeghị na Jehova dọrọ ha aka ná ntị ugboro ugboro, ha egeghị ya ntị. O doro anya na ọ bụrụ na anyị akpachara anya na-eleghara ndụmọdụ Jehova anya, anyị na ya agaghị adị ná mma.

Na-ege Chineke ntị kama ịna-eme ihe ndị ụwa chọrọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)

15. Olee ụdị echiche ọtụtụ ndị nwere n’ụwa taa anyị kwesịrị izere?

15 Ụwa Setan na-eme ka ndị mmadụ dị mpako ma na-achọ naanị ọdịmma onwe ha. Ọtụtụ ndị anaghị achọ ka a gwa ha ihe ha na-emetaghị ma ọ bụ ihe ha ga-eme. Ụfọdụ ndị na-ege ntị mgbe a na-adụ  ha ọdụ ka a sịkwa na ha gere ntị. Anyị ekwesịghị ime otú ahụ. Baịbụl gwara anyị ka anyị ‘kwụsị ịna-eme omume dị ka usoro ihe nke a si dị.’ Kama, anyị kwesịrị ịghọta ihe Jehova chọrọ ka anyị mee ma na-eme ya. (Rom 12:2) Jehova na-eji nzukọ ya adụ anyị ọdụ n’oge kwesịrị ekwesị. Dị ka ihe atụ, a na-echetara anyị otú anyị kwesịrị isi na-emeso ndị na-abụghị nwoke ibe anyị ma ọ bụ nwaanyị ibe anyị, ụdị ndị anyị ga-emeta enyi, na ụdị ntụrụndụ dị́ mma. Ọ bụrụ na anyị anabata ndụmọdụ ndị ahụ, ọ ga-egosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe Jehova na-emere anyị nakwa na anyị hụrụ ya n’anya.—Jọn 14:31; Rom 6:17.

TỤKWASỊ JEHOVA OBI KA O NYERE GỊ AKA MA CHEBE GỊ

16, 17. (a) Gịnị mere anyị ji kwesị ịmata ihe Jehova chere tupu anyị ekpebie ihe anyị ga-eme? (b) Olee otú ndị Izrel si gosi na ha ahụghị Jehova n’anya nakwa na ha atụkwasịghị ya obi?

16 Ụmụaka na-agakwuru nne ha na nna ha ma ha nwee nsogbu. Ma, ka ha na-eto, ha nwere ike ijizi aka ha kpebiwe ihe ha ga-eme. O so n’ihe ga-egosi na ha etowela. Ma, ọ bụrụ na ha na nne ha na nna ha dị ná mma, ha ga na-agakwuru ha ka ha dụọ ha ọdụ tupu ha ekpebie ihe ha ga-eme. Otú ahụ ka Nna anyị bụ́ Jehova na-emere anyị. Ọ na-ahapụ anyị ka anyị kpebie ihe anyị ga-eme. Ma, ebe ọ bụ na anyị tụkwasịrị ya obi ma hụ ya n’anya, anyị na-arịọ ya mgbe niile ka o nyere anyị aka, na-agbalịsikwa ike ịmata ihe o chere tupu anyị ekpebie ihe anyị ga-eme. Ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi, ọ ga-enye anyị mmụọ nsọ ya, nke ga-enyere anyị aka ime ihe ziri ezi.—Fil. 2:13.

17 N’oge Samuel, a sụrụ ndị Izrel akwụ n’agha ha na ndị Filistia lụrụ. Kama ịjụ Jehova ihe ha kwesịrị ime, ha sịrị: “Ka anyị gaa Shaịlo buru igbe ọgbụgba ndụ Jehova, ka ọ bata n’etiti anyị ma zọpụta anyị n’ọbụ aka ndị iro anyị.” Olee nsogbu ihe ahụ ha kpebiri ime kpataara ha? Baịbụl kwuru, sị: “Ndị e gburu wee dị nnọọ ukwuu, nke mere na n’etiti ndị Izrel, puku ndị ikom iri atọ ndị ji ụkwụ aga nwụrụ. E bukwaara igbe Chineke.” (1 Sam. 4:2-4, 10, 11) Ndị Izrel chere na iburu igbe ọgbụgba ndụ gaa agha ga-eme ka Jehova nyere ha aka ma chebe ha. Ma, ha arịọghị Jehova ka o nyere ha aka ma ọ bụ gbaa mbọ ịmata ihe ọ chọrọ ka ha mee. Kama, ha mere ihe ha chere na o ziri ezi, taakwa ahụhụ sí na ya pụta.—Gụọ Ilu 14:12.

18. Gịnị ka Baịbụl gwara anyị banyere ịtụkwasị Jehova obi?

18 Otu ọbụ abụ gosiri na ọ hụrụ Jehova n’anya ma tụkwasị ya obi. O dere, sị: “Chere Chineke, n’ihi na m ka ga-enye ya otuto dị ka onye na-enye m nzọpụta dị ukwuu. Chineke m, mkpụrụ obi m adawo mbà n’ime m. Ọ bụ ya mere m ji na-echeta gị.” (Ọma 42:5, 6) Ị̀ mụtala ịhụ Jehova n’anya otú ahụ na ịtụkwasị ya obi? Ọ bụrụgodị na i chere na ị tụkwasịrị Jehova obi, ị ka nwere ike ịtụkwasịkwu ya obi otú Baịbụl gwara anyị mee. Ọ sịrị: “Jiri obi gị dum tụkwasị Jehova obi, adaberekwala ná nghọta gị. N’ụzọ gị niile, mara ya, ya onwe ya ga-emekwa ka ụzọ gị kwụrụ ọtọ.”—Ilu 3:5, 6.

19. Olee otú ị ga-esi gosi Jehova na ị hụrụ ya n’anya?

19 Jehova bu ụzọ hụ anyị n’anya. O si otú ahụ kụziere anyị otú anyị ga-esi hụ ya n’anya. Ka anyị na-echeta mgbe niile na ọ hụrụ anyị n’anya nke ukwuu, na-emekwara anyị ihe ọma. Ka ihe niile anyị na-eme gosi na anyị ji obi anyị dum, mkpụrụ obi anyị dum, uche anyị dum, na ike anyị dum hụ ya n’anya.—Mak 12:30.