Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) SEPTEMBA 2015

Ị̀ Na-agba Mbọ Itozu Okè Ka Kraịst?

Ị̀ Na-agba Mbọ Itozu Okè Ka Kraịst?

‘Toruo otú Kraịst toruru.’—EFE. 4:13.

ABỤ: 69, 70

1, 2. Gịnị ka Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ịgbalịsi ike ime? Nye ihe atụ.

GỊNỊ ka nwaanyị má ihe na-eme ma ọ́ gaa ịzụ mkpụrụ osisi? O nwere ike ọ gaghị achọwa mkpụrụ osisi ndị kacha ibu ma ọ bụ ndị kacha ọnụ ala. Kama, ọ ga-ahọta ndị dị́ mma n’anya, ga-atọ ụtọ, ga-enyekwa ihe n’ahụ́. Ọ gaghị ahọrọ ndị na-akaghị aka ma ọ bụ ndị na-achaghị acha.

2 Mmadụ mụwa banyere Jehova, kpebiekwa ime baptizim, ya na Chineke ga na-adịkwu ná mma. Ọ ga na-agbalị ka ọ bụrụ Onye Kraịst tozuru okè. Itozu okè anyị na-ekwu abụghị mmadụ ịgba dimkpa ma ọ bụ ịkata ahụ́, kama ọ bụ itozu okè n’ihe gbasara ofufe Chineke. N’akwụkwọ ozi Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst nọ́ n’Efesọs, ọ gwara ha na ha kwesịrị itozu okè. Ọ gbara ha ume ka ha dị́ n’otu n’okwukwe, na-amụkwa banyere Jizọs ka ha nwee ike ‘ịghọ dimkpa, ruo mgbe ha toruru otú Kraịst toruru.’—Efe. 4:13.

3. Olee otú ọgbakọ dị́ n’Efesọs si yie ọgbakọ ndị Jehova taa?

3 Mgbe Pọl degaara ụmụnna nọ́ n’Efesọs akwụkwọ ozi,  afọ ole na ole agaala kemgbe e hiwere ọgbakọ ha. Ọtụtụ ndị nọ́ n’ọgbakọ ahụ bụ Ndị Kraịst tozuru okè. Ma, e nwere ndị kwesịrị ịgbakwu mbọ ka ha na Jehova dịkwuo ná mma. Otú ahụ ka ọ dịkwa taa. Ọtụtụ ụmụnna efeela Jehova ọtụtụ afọ, bụrụkwa Ndị Kraịst tozuru okè. Ma, a ka nwere ndị na-etozuchabeghị okè. Dị ka ihe atụ, a na-eme ọtụtụ puku ndị ọhụrụ baptizim kwa afọ. N’ihi ya, ụfọdụ kwesịrị ịgbalịsi ike ka ha tozuo okè. Gịnwa kwanụ?—Kọl. 2:6, 7.

OLEE OTÚ ONYE KRAỊST GA-ESI NA-ETO?

4, 5. Olee ihe ụfọdụ nwere ike ịdị iche n’ebe Ndị Kraịst tozuru okè nọ? Ma, olee ihe ndị e ji ama ndị niile tozuru okè? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

4 I leruo mkpụrụ osisi ndị chara acha anya, ị ga-ahụ na ha niile anaghị aha. Ma, ha niile nwere ihe gosiri na ha chara acha. Otú ahụ ka ọ dị ná Ndị Kraịst tozuru okè. Ha nwere ike isi mba dị iche iche. Afọ ndụ ha, ihe ndị na-amasị ha, na otú ha si akpa àgwà nwekwara ike ịdị iche iche. Ma, ndị niile bụ́ Ndị Kraịst tozuru okè nwere àgwà na-eme ka a mata na ha tozuru okè. Olee ụfọdụ n’ime àgwà ndị ahụ?

5 Otú Onye Kraịst tozuru okè si ebi ndụ na-egosi na ọ na-eṅomi Jizọs ma ‘na-esochi nzọụkwụ ya anya.’ (1 Pita 2:21) Gịnị ka Jizọs kwuru na ọ dị ezigbo mkpa? Ọ bụ iji obi anyị dum, mkpụrụ obi anyị dum, na uche anyị dum hụ Jehova n’anya, hụkwa onye agbata obi anyị n’anya dị ka onwe anyị. (Mat. 22:37-39) Onye Kraịst tozuru okè na-agbalịsi ike ime ihe a Jizọs kwuru. Otú o si ebi ndụ na-egosi na ihe kacha ya mkpa bụ adịm ná mma ya na Jehova. Ọ na-ahụkwa ndị ọzọ n’anya n’eziokwu.

Otú Ndị Kraịst katarala ahụ́ ga-esi gosi na ha dị umeala n’obi ka Kraịst bụ ịna-akwado ndị na-akatabeghị ahụ́ na-edu ndú n’ọgbakọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6)

6, 7. (a) Olee àgwà ụfọdụ e ji ama Onye Kraịst tozuru okè? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?

6 Ma, ịhụnanya bụ otu n’ime àgwà Onye Kraịst tozuru okè kwesịrị inwe. (Gal. 5:22, 23) O kwesịkwara ịdị nwayọọ, na-ejide onwe ya, nweekwa ogologo ntachi obi. Àgwà ndị a ga-enyere ya aka idi nsogbu bịaara ya ma ghara iwewe iwe. Ọ ga-emekwa ka o nwee olileanya mgbe nsogbu ndị ọ na-atụghị anya ha bịaara ya. Mgbe Onye Kraịst tozuru okè na-amụ ihe, ọ na-achọsi ike ịhụ ndụmọdụ Baịbụl ndị ga-enyere ya aka ịma ihe dị́ iche n’ihe ọma na ihe ọjọọ. N’ihi ya, ihe ndị ọ na-ekpebi na-egosi na ọ bụ Onye Kraịst tozuru okè. Dị ka ihe atụ, ọ na-ege ntị n’ihe akọnuche ya e ji Baịbụl zụọ na-agwa ya. Ọ na-adị umeala n’obi. N’ihi ya, ọ na-ekweta na ntụziaka Jehova na iwu ya dị mma mgbe niile karịa nke ya. * Ọ na-eji ịnụ ọkụ n’obi ekwusa ozi ọma, na-agbalịsikwa ike ka ọgbakọ dịrị n’otu.

7 N’agbanyeghị afọ ole anyị ferela Jehova, onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị, ‘È nwere ebe ụfọdụ m kwesịrị ịgba mbọ na-emekwu ka Jizọs? È nwere ebe ndị m kwesịrị ịgbanwe?’

“NRI SIRI IKE DỊỊRỊ NDỊ TOZURU OKÈ”

8. Olee otú Jizọs maruru Akwụkwọ Nsọ ma ghọta ya?

8 Jizọs Kraịst ma ihe dị n’Akwụkwọ  Nsọ, ghọtakwa ya nke ọma. Mgbe ọ dị afọ iri na abụọ, ya na ndị nkụzi nọ́ n’ụlọ nsọ kwurịtara ihe e dere na ya. Baịbụl kwuru, sị: “Nghọta o nwere na ihe ọ na-aza ha nọ na-eju ndị niile na-ege ya ntị anya.” (Luk 2:46, 47) Mgbe Jizọs mechara malite ikwusa ozi ọma, otú o si jiri Okwu Chineke zaa ndị iro ya okwu mere ka ọnụ mechie ha.—Mat. 22:41-46.

9. (a) Olee ihe Onye Kraịst chọrọ itozu okè kwesịrị ịna-eme? (b) Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-amụ Baịbụl?

9 Onye chọrọ ịbụ Onye Kraịst tozuru okè na-eṅomi Jizọs, na-agbakwa mbọ ịghọta Baịbụl nke ọma. Ọ ga na-agụchi ya anya iji mata eziokwu ndị gbara ọkpụrụkpụ n’ihi na ọ ma na “nri siri ike dịịrị ndị tozuru okè.” (Hib. 5:14) Onye Kraịst tozuru okè na-agbalịsi ike inwe “ezi ihe ọmụma banyere Ọkpara Chineke.” (Efe. 4:13) N’ihi ya, jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị? M̀ na-ewepụta oge m ga-eji na-amụ ihe? Ànyị na-enwe ofufe ezinụlọ kwa izu?’ Ị mụwa Baịbụl, leruo anya ka ị chọta ihe ndị ga-enyere gị aka ịghọtakwu otú Jehova si ele ihe anya. Gbalịa jiri ihe ndị ị mụtara na-ekpebi ihe ị na-eme. Ime otú ahụ ga-enyere gị aka ịbịarukwu Jehova nso.

10. Olee otú Onye Kraịst tozuru okè si ele iwu Chineke na ụkpụrụ ya anya?

10 Onye Kraịst tozuru okè ma na ihe o kwesịrị ime abụghị naanị ịma ihe Baịbụl kwuru. O kwesịrị ịhụ iwu Chineke na ụkpụrụ ya n’anya. Otu n’ime  ụzọ ọ ga-esi gosi ya bụ ịna-eme ihe Jehova chọrọ kama ịna-eme ihe dị́ yanwa mma. O kwesịkwara ịgbanwe otú o si ebi ndụ, otú o si eche echiche, na otú o si akpa àgwà. Ka Onye Kraịst na-eme mgbanwe ndị a, ọ na-eyiri “mmadụ ọhụrụ ahụ nke e kere dị ka uche Chineke si dị, n’ezi omume na iguzosi ike n’ihe.” (Gụọ Ndị Efesọs 4:22-24.) Anyị kwesịrị icheta na Chineke ji mmụọ nsọ ya duzie ndị dere Baịbụl. N’ihi ya, mgbe Onye Kraịst na-amụ Baịbụl, mmụọ nsọ Chineke na-enyere ya aka ịghọtakwu Baịbụl na ịhụkwu Chineke n’anya. Ọ na-emekwa ka ya na Jehova dịkwuo ná mma.

NA-AGBA MBỌ KA ỌGBAKỌ DỊRỊ N’OTU

11. Olee ụdị ndị gbara Jizọs gburugburu mgbe ọ nọ n’ụwa?

11 Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o zuru okè. Ma, ndị gbara ya gburugburu bụ ndị na-ezughị okè. Nne ya na nna ya na ndị ikwu ya ezughị okè. Ndị na-eso ụzọ ya medịrị ihe gosiri na ha dị mpako, na-achọkwa naanị ọdịmma onwe ha. Dị ka ihe atụ, n’abalị bọtara ụbọchị Jizọs nwụrụ, ‘esemokwu kpụ ọkụ n’ọnụ bilitere n’etiti ha banyere onye ọ bụ n’ime ha nke yiri ka ọ̀ bụ ya kasị ukwuu.’ (Luk 22:24) N’agbanyeghị na ha ezughị okè, obi siri Jizọs ike na ha ga-emecha bụrụ Ndị Kraịst tozuru okè nakwa na ha ga-aghọ ọgbakọ dị́ n’otu. N’otu abalị ahụ, Jizọs rịọrọ Nna ya nke eluigwe ka o nyere ha niile aka ịdị n’otu. Ọ rịọrọ ya, sị: “Ka ha niile wee bụrụ otu, dị ka gị onwe gị, Nna, na mụ onwe m dị n’otu, mụ onwe m na gị adịrịkwa n’otu, ka anyị na ha wee dị n’otu, . . . ka ha wee bụrụ otu dị nnọọ ka anyị bụ otu.”—Jọn 17:21, 22.

12, 13. (a) Olee otú Ndị Efesọs 4:15, 16 si gosi na anyị kwesịrị ịna-eme ka ọgbakọ dịrị n’otu? (b) Gịnị nyeere otu nwanna aka ịmụta ịna-eme ka ọgbakọ dịrị n’otu?

12 Onye Kraịst tozuru okè na-enye aka eme ka ọgbakọ dịrị n’otu. (Gụọ Ndị Efesọs 4:1-6, 15, 16.) Ebe anyị bụ Ndị Kraịst, anyị chọsiri ike ka anyị bụrụ ndị ‘e jikọrọ ọnụ n’otu,’ ya bụ, ka anyị jiri otu obi na-arụkọ ọrụ. Baịbụl kwuru na anyị kwesịrị ịdị umeala n’obi ka anyị nwee ike ịdị n’otu. Onye Kraịst tozuru okè na-eji obi umeala eme ka ọgbakọ dịrị n’otu, á sịgodị na ndị ọzọ emejọọ ya n’ihi ezughị okè. N’ihi ya, jụọ onwe gị, sị: ‘Olee ihe m na-eme ma e nwee ihe nwanna na-emetaghị? Gịnị ka m na-eme ma nwanna mejọọ m? M̀ na-akwụsị ịtụpụrụ ya ọnụ? Ka m̀ na-agba mbọ ka anyị kpezie?’ Onye Kraịst tozuru okè na-agbalị idozi ihe seere ya na onye ọzọ kama ịna-akpata nsogbu.

13 Chegodị banyere ihe otu nwanna mere. N’oge mbụ, iwe na-ewe ya ma é nwee ihe nwanna na-emetaghị. O mechara kpebie iji Baịbụl na akwụkwọ bụ́ Insight on the Scriptures mụọ banyere ihe ndị mere Devid. Gịnị mere o ji chọọ ịmụ banyere Devid? Ọ sịrị: “Ụfọdụ ndị ohu Chineke mere Devid ihe ọjọọ. Dị ka ihe atụ, Eze Sọl gbara mbọ igbu ya, ụfọdụ ndị achọọ ịtụ ya nkume. E nwedịrị mgbe nwunye ya kwara ya emo. (1 Sam. 19:9-11; 30:1-6; 2 Sam. 6:14-22) Ma, Devid ekweghị ka ihe ndị ahụ mee ka ọ kwụsị ịhụ Jehova n’anya. Devid dịkwa obi ebere. M kwesịkwara ịmụta ịna-eme ebere. Ihe m mụtara mere ka m gbanwee otú m si ele ihe nwanna na-emetaghị  anya. Anaghịzi m agụkọrọ ụmụnna ihe ha mejọrọ. Kama, m na-agba mbọ ka ọgbakọ dịrị n’otu.” Ị̀ na-agba mbọ ka ọgbakọ dịrị n’otu?

META NDỊ NA-EME UCHE CHINEKE ENYI

14. Olee ụdị ndị Jizọs metara enyi?

14 Jizọs Kraịst mesoro onye ọ bụla omume ọma. Ahụ́ ruru onye ọ bụla bịara ya nso ala, ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị ma ndị na-eto eto ma ndị agadi ma ụmụaka. Ma, ọ bụghị onye ọ bụla ka o metara enyi. Ọ gwara ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi, sị: “Unu bụ ndị enyi m ma ọ bụrụ na unu emee ihe m na-enye unu n’iwu.” (Jọn 15:14) Ndị Jizọs metara enyi bụ ndị jí obi ha niile na-eso ya nakwa ndị hụrụ Jehova n’anya ma na-efe ya. Ndị ị na-emeta enyi hà bụ ndị jí obi ha niile efe Jehova? Gịnị mere anyị ji kwesị ime otú ahụ?

15. Olee uru ndị na-eto eto ga-erite ma ha meta Ndị Kraịst tozuru okè enyi?

15 E nwere mkpụrụ osisi ndị anwụ na-enyere aka ịcha nke ọma. Otú ahụkwa ka ịhụ ụmụnna anyị n’anya ga-enyere anyị aka ịbụ Ndị Kraịst tozuru okè. Ị̀ bụ onye na-eto eto nke na-eche ihe ị ga-eji ndụ gị eme? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ ga-adị mma ka i meta ndị ferela Jehova ọtụtụ afọ enyi nakwa ndị na-agba mbọ ka ọgbakọ dịrị n’otu. O nwere ike ịbụ na ha ediela ọtụtụ nsogbu na ihe isi ike ka ha na-efe Jehova. Ụdị ndị ahụ ga-enwe ike inyere gị aka ikpebi ihe kacha mma ị ga-eji ndụ gị eme. Ọ bụrụ na gị na ụdị ndị ahụ ana-akpa, ha ga-enyere gị aka ịna-eme mkpebi ndị dị́ mma, nyekwara gị aka itozu okè.—Gụọ Ndị Hibru 5:14.

16. Olee otú ụmụnna ndị katarala ahụ́ si nyere otu nwanna nwaanyị na-eto eto aka?

16 Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Helga kwuru na mgbe ọ nọ n’afọ nke ikpeazụ n’ụlọ akwụkwọ, ụmụ klas ha nọ na-ekwu ihe dị́ iche iche ha ga-eji ndụ ha eme. Ọtụtụ n’ime ha chọrọ ịga mahadum ka ha nweta ezigbo ọrụ. Ma, Helga na ndị enyi ya n’ọgbakọ kwurịtara ihe ọ ga-eme ma ọ gụchaa. Ọ sịrị: “Ọtụtụ n’ime ha tọrọ m, ha nyekwaara m aka nke ukwuu. Ha gbara m ume ka m malite ozi oge niile. M mechara sụọ ụzọ oge niile ruo afọ ise. Ugbu a ọtụtụ afọ garala, obi dị m ụtọ na m jeere Jehova ozi n’oge m na-eto eto. Anaghị m akwa ụta na m mere otú ahụ.”

17, 18. Olee otú itozu okè ga-esi baara anyị uru?

17 Iṅomi Jizọs ga-enyere anyị aka ịbụ Ndị Kraịst tozuru okè. Anyị ga-abịarukwu Jehova nso, na-agbalịsikwa ike ijere ya ozi. Ọ bụrụ na onye na-efe Chineke abụrụ Onye Kraịst tozuru okè, ọ ga-eji ike ya niile na-ejere Chineke ozi. Jizọs gbara ndị na-eso ụzọ ya ume, sị: “Meenụ ka ìhè unu na-enwu n’ebe ndị mmadụ nọ, ka ha wee hụ ọrụ ọma unu wee nye Nna unu nọ n’eluigwe otuto.”—Mat. 5:16.

18 Anyị amụtala na Onye Kraịst tozuru okè na-abara ọgbakọ ezigbo uru. Ihe ga-egosi na Onye Kraịst tozuru okè bụ ihe ọ na-eme n’ihi akọnuche Chineke nyere ya. Olee otú akọnuche anyị ga-esi nyere anyị aka ịna-eme mkpebi dị mma? Oleekwa otú anyị ga-esi na-akwanyere akọnuche ndị ọzọ ùgwù? Anyị ga-atụle ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.

^ para. 6 Dị ka ihe atụ, e nwere ike ịgwa ụfọdụ ụmụnna ndị katarala ahụ́ ka ha nyefee ụmụnna ndị na-akatabeghị ahụ́ ọrụ ha na-arụ nakwa ka ha kwadowe ụmụnna ndị ahụ.