Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) SEPTEMBA 2015

Akọnuche Gị Ọ̀ Na-eduzi Gị Nke Ọma?

Akọnuche Gị Ọ̀ Na-eduzi Gị Nke Ọma?

“Ihe mere e ji nye iwu a bụ ka e nwee ịhụnanya nke si n’obi dị ọcha, n’ezi akọ na uche.”—1 TIM. 1:5.

ABỤ: 57, 48

1, 2. Ònye nyere anyị akọnuche? Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-ekele Chineke maka ya?

JEHOVA CHINEKE kere ụmụ mmadụ ka ha nwee ike ịna-ekpebi ihe ha ga-eme. O nyere anyị akọnuche iji nyere anyị aka ịna-ekpebi ihe dị́ mma. Akọnuche bụ ihe dị́ anyị n’ime nke na-enyere anyị aka ịma ihe dị́ mma na ihe dị́ njọ. Ọ bụrụ na anyị ana-ege akọnuche anyị ntị, ọ ga-enyere anyị aka ịna-eme ihe dị́ mma ma na-ezere ihe ọjọọ. N’ihi ya, akọnuche anyị na-egosi na Chineke hụrụ anyị n’anya, chọọkwa ka mmadụ niile na-eme ihe ziri ezi.

2 Taa, ụfọdụ ndị na-eme ihe dị́ mma ma kpọọ ihe ọjọọ asị n’agbanyeghị na ha amaghị ihe Baịbụl kwuru. (Gụọ Ndị Rom 2:14, 15.) N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi akọnuche ha. Ọ na-egbochi ọtụtụ ndị ime ihe ọjọọ. Chegodị otú ụwa a ga-adịru njọ ma á sị na ndị mmadụ enweghị akọnuche. Ma eleghị anya, ihe ọjọọ a na-eme gaara akarị nke a na-eme ugbu a. Anyị na-ekele Chineke maka na o nyere ụmụ mmadụ akọnuche.

3. Olee uru akọnuche na-abara anyị n’ọgbakọ?

 3 Ọtụtụ ndị echeghị na ha kwesịrị ịzụ akọnuche ha. Ma, ndị ohu Jehova chọrọ ka akọnuche ha na-arụ ọrụ nke ọma n’ihi na ọ ga-eme ka ọgbakọ dịrị n’otu. Anyị chọrọ ka akọnuche anyị na-echetara anyị ihe Baịbụl kpọrọ ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi, na ihe ọ kpọrọ ihe ọma na ihe ọjọọ. Ma, ọ bụrụ na anyị chọrọ ịzụ akọnuche anyị, ihe anyị kwesịrị ime abụghị naanị ịmụta ihe Baịbụl kwuru. Anyị kwesịrị ịhụ iwu Chineke n’anya ma nwee okwukwe na ọ ga-abara anyị uru. Pọl onyeozi dere, sị: “Ihe mere e ji nye iwu a bụ ka e nwee ịhụnanya nke si n’obi dị ọcha, n’ezi akọ na uche nakwa n’okwukwe nke na-abụghị nke ihu abụọ.” (1 Tim. 1:5) Ọ bụrụ na anyị azụọ akọnuche anyị ma na-ege ya ntị, anyị ga-ahụkwu Jehova n’anya, okwukwe anyị esikwuo ike. Otú anyị si eji akọnuche anyị ekpebi ihe anyị na-eme ga-egosi otú anyị na Chineke dịruru ná mma nakwa otú anyị chọruru ime ihe dị́ Jehova mma. Akọnuche anyị na-emekwa ka a mata ụdị onye anyị bụ n’eziokwu.

4. Olee otú anyị ga-esi zụọ akọnuche anyị?

4 Ma, olee otú anyị ga-esi zụọ akọnuche anyị? Ọ bụ ịna-amụ Baịbụl mgbe niile, ịna-atụgharị uche n’ihe anyị gụrụ, na ịna-arịọ Jehova ka o nyere anyị aka ime ihe anyị mụtara. Ọ pụtara na ihe anyị ga-eme abụghị naanị iburu ihe Baịbụl kwuru n’isi. Ịmụ Baịbụl kwesịrị ime ka anyị jiri nwayọọ nwayọ matakwuo Jehova, ụdị Onye ọ bụ, àgwà ya, ihe dị́ ya mma, na ihe ọ kpọrọ asị. Ka oge na-aga, akọnuche anyị ga na-amatazi ozugbo ihe bụ́ ihe ọma na ihe bụ́ ihe ọjọọ. Ka anyị na-azụkwu akọnuche anyị, anyị ga na-echekwu echiche ka Jehova.

5. Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu a?

5 Ma, anyị nwere ike ịjụ, sị: Olee otú akọnuche a zụrụ nke ọma ga-esi nyere anyị aka mgbe anyị chọrọ ikpebi ihe anyị ga-eme? Olee otú anyị ga-esi na-akwanyere akọnuche ụmụnna anyị ùgwù? Oleekwa otú akọnuche anyị ga-esi mee ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi na-eme ihe dị́ mma? Ka anyị buru ajụjụ ndị a n’obi ma leba anya n’ihe atọ akọnuche anyị ga-enyere anyị aka na ha. Nke mbụ bụ ihe gbasara otú e si agwọ ọrịa. Nke abụọ abụrụ ntụrụndụ. Nke atọ abụrụ ozi ọma.

NWEE EZI UCHE

6. Olee ihe ndị anyị kwesịrị ikpebi gbasara otú a ga-esi agwọ anyị ọrịa?

6 Baịbụl gwara anyị ka anyị zere ihe ọ bụla ga-akpatara anyị nsogbu na àgwà ndị dị́ ka iribiga ihe ókè na ịṅụbiga mmanya ókè. (Ilu 23:20; 2 Kọr. 7:1) Ọ bụrụ na anyị na-eme ihe Baịbụl kwuru, o nwere ike inyere anyị aka ka ahụ́ na-adị anyị mma n’agbanyeghị na anyị ka na-arịa ọrịa, na-akakwa nká. Olee mkpebi ụfọdụ anyị kwesịrị ime? Ná mba ụfọdụ, a na-enwe ma ọgwụ Bekee ma nke na-abụghị ọgwụ Bekee. Ụfọdụ ụmụnna ndị na-eche otú ka mma a ga-esi agwọ ha na-edegara alaka ụlọ ọrụ anyị akwụkwọ ozi. Ọtụtụ na-ajụ, sị: “Onye na-efe Jehova ò kwesịrị ikwe ka e si otú a gwọọ ya ọrịa?”

7. Olee otú anyị ga-esi na-eme mkpebi banyere otú a ga-esi agwọ anyị?

7 Alaka ụlọ ọrụ anyị ma ọ bụ ndị okenye ọgbakọ enweghị ikike ikpebiri nwanna otú a ga-esi gwọọ ya ọrịa, ọ bụrụgodị na ọ chọrọ ka a gwa ya. (Gal. 6:5) Ma, ha nwere ike ịgwa anyị ihe Jehova kwuru gbasara ihe anyị chọrọ ikpebi. Dị ka ihe atụ, Onye Kraịst kwesịrị icheta na Baịbụl nyere anyị iwu ka anyị “na-ezere . . . ọbara.” (Ọrụ 15:29)  Ọ pụtara na anyị ekwesịghị ikwe ka a mịnye anyị ọbara ma ọ bụ ihe anọ ndị bụ́ isi dị́ n’ọbara. Ọ bụrụ na Onye Kraịst eburu ihe a n’obi, o nwere ike inyere ya aka mgbe ọ na-ekpebi ma ọ̀ ga-ekwe ka e jiri irighiri ihe ndị sí n’ọbara gwọọ ya. * Ma, olee ihe ndị ọzọ Baịbụl kwuru ga-enyere anyị aka mgbe anyị na-ekpebi otú a ga-esi agwọ anyị?

8. Olee otú Ndị Filipaị 4:5 ga-esi nyere anyị aka ịna-ele ahụ́ ike anya otú kwesịrị ekwesị?

8 Ilu 14:15 kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke na-amaghị ihe na-ekweta okwu niile, ma onye maara ihe na-echebara nzọụkwụ ya echiche.” E nwere ụfọdụ ọrịa a na-amaghị otú e si agwọ ha. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịkpachapụ anya banyere ihe ndị mmadụ na-ekwu na e ji agwọ ọrịa, ma ya abụrụ na ha ahụbeghị onye e ji ya gwọọ. Pọl onyeozi dere, sị: “Meenụ ka mmadụ niile mara na unu nwere ezi uche.” (Fil. 4:5) Ọ bụrụ na anyị nwere ezi uche, anyị agaghị eji oge anyị niile na-echegbu onwe anyị banyere ahụ́ ike anyị ma leghara ozi Jehova anya. Ọ bụrụ na ihe kacha anyị mkpa abụrụ ihe gbasara ahụ́ ike, anyị ga na-echezi naanị banyere onwe anyị. (Fil. 2:4) Anyị ma na anyị agaghị enweli ahụ́ ike zuru okè n’ụwa ochie a. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịgba mbọ ka ihe kacha anyị mkpa bụrụ ofufe Jehova.—Gụọ Ndị Filipaị 1:10.

Ị̀ na-esi ọnwụ na ndị ọzọ ga-emerịrị ihe i chere? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9)

9. Olee otú Ndị Rom 14:13, 19 si gbasa ahụ́ ike? Gịnị nwere ike ịkpata esemokwu n’ọgbakọ?

9 Onye Kraịst nwere ezi uche anaghị esi ọnwụ na ndị ọzọ ga-emerịrị ihe o chere. N’otu obodo, otu nwanna na nwunye ya nọ na-agwa ndị ọzọ banyere ụdị ọgwụ na-edozi ahụ́ nakwa ụdị nri ha ga na-eri na ndị ha ga na-ezere. Ụfọdụ ụmụnna mere ihe ahụ ha kwuru, ma ụfọdụ ekweghị eme ya. Mgbe ihe ndị ahụ na-arụghị ihe a sị na ha na-arụ, iwe were ọtụtụ ụmụnna. Di na nwunye ahụ kwesịrị iji aka ha kpebie ụdị nri ha ga-eri na ụdị ọgwụ ha ga-aṅụ. Ma, hà kwesịrị ime ihe nwere ike ịkpata esemokwu n’ọgbakọ n’ihi ihe gbasara ọgwụ? Na Rom oge ochie, ụfọdụ ụmụnna nwere echiche dị́ iche iche banyere ụfọdụ nri na ememme. Gịnị ka Pọl onyeozi gwara ha? Ọ sịrị ha: “Otu onye na-ewere na otu ụbọchị ka nke ọzọ; onye ọzọ na-ewere na otu ụbọchị dị ka ụbọchị ndị ọzọ niile; ihe doro onye ọ bụla anya, ya kwenyesie ike na ya.” Anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ime ihe ga-eme ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ.—Gụọ Ndị Rom 14:5, 13, 15, 19, 20.

10. Gịnị mere anyị ji kwesị ịkwanyere ihe ndị ọzọ kpebiri ùgwù? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

10 Mgbe ụfọdụ, anyị agaghị aghọta ihe mere nwanna ji kpebie ihe ọ chọrọ ime. Gịnị ka anyị kwesịrị ime? Anyị ekwesịghị  ikpe ya ikpe ma ọ bụ manye ya ịgbanwe obi ya. O nwere ike ịbụ na akọnuche ya esichabeghị ike nakwa na o kwesịrị ịzụkwu ya ma ọ bụkwanụ na obere ihe na-enye akọnuche ya nsogbu. (1 Kọr. 8:11, 12) O nwekwara ike ịbụ na anyị kwesịrị ilebakwuru akọnuche anyị anya ma jiri ihe Baịbụl kwuru zụkwuo ya. Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị iji aka ya kpebie ihe banyere ahụ́ ike na ihe ndị ọzọ ma jiri isi ya buru ihe ga-esi na ya pụta.

NA-EJI IHE DÍ MMA ATỤRỤ NDỤ

11, 12. Olee ndụmọdụ dị́ na Baịbụl anyị kwesịrị iburu n’obi mgbe anyị chọrọ ikpebi ụdị ihe anyị ga-eji atụrụ ndụ?

11 Otú Jehova si kee ụmụ mmadụ mere ka ntụrụndụ na-atọ ha ụtọ ma na-abara ha uru. Sọlọmọn dere na e nwere “oge ịchị ọchị” na “oge ịwụli elu.” (Ekli. 3:4) Ma, ọ bụghị ntụrụndụ niile bara uru, na-emekwa ka ahụ́ ruo mmadụ ala ma ọ bụ ka mmadụ nweta onwe ya. Anyị ekwesịghịkwa iji oge karịrị akarị na-atụrụ ndụ. Olee otú akọnuche anyị ga-esi nyere anyị aka ịna-eji ihe ndị dị́ mma atụrụ ndụ? Oleekwa otú ọ ga-esi mee ka ọ baara anyị uru?

12 Baịbụl gwara anyị ka anyị zere “ọrụ nke anụ ahụ́,” ya bụ, “ịkwa iko, adịghị ọcha, omume rụrụ arụ, ikpere arụsị, ime mgbaasị, ibu iro, esemokwu, ekworo, iwe ọkụ, ndọrọ ndọrọ, nkewa, inwe òtù, anyaụfụ, ịṅụ oké mmanya, oriri oké mkpọtụ, na ihe ndị dị otú a.” Pọl onyeozi kwuru na “ndị na-eme ihe ndị dị otú ahụ agaghị eketa alaeze Chineke.” (Gal. 5:19-21) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘Akọnuche m ọ̀ na-eme ka m zere egwuregwu ọ bụla gbasara ime ihe ike, ịsọ mpi ma ọ bụ ịhụ mba n’anya? Akọnuche m ọ̀ na-adọ m aka ná ntị mgbe ọnwụnwa bịaara m ka m lee fim na-egosi ndị gba ọtọ ma ọ bụ nke na-eme ka mmadụ chewe banyere ime omume rụrụ arụ, ịṅụbiga mmanya ókè ma ọ bụ ime mgbaasị?’

13. Olee otú ndụmọdụ dị́ na 1 Timoti 4:8 nakwa n’Ilu 13:20 ga-esi nyere anyị aka n’ihe gbasara ntụrụndụ?

13 Baịbụl kwuru ihe ọzọ nwere ike inyere anyị aka ịzụ akọnuche anyị n’ihe banyere ntụrụndụ. Dị ka ihe atụ, o kwuru na “ọzụzụ nke ahụ́ bara ntakịrị uru.” (1 Tim. 4:8) Ọtụtụ ndị na-ekwu na imega ahụ́ mgbe niile na-eme ka ahụ́ na-adị mmadụ mma. Ọ bụrụkwanụ na anyị chọrọ ịna-eso ndị ọzọ emega ahụ́, ọ̀ bụ onye ọ bụla ka anyị ga-eso? Ilu 13:20 gwara anyị, sị: “Onye ya na ndị maara ihe na-eje ije ga-ama ihe, ma ihe agaghị agaziri onye ya na ndị nzuzu na-emekọ ihe.” Ihe a Baịbụl kwuru ó gosighị na anyị kwesịrị iji akọnuche anyị e ji Baịbụl zụọ kpebie ụdị ihe anyị ga-eji atụrụ ndụ?

14. Olee otú otu ezinụlọ si mee ihe e kwuru ná Ndị Rom 14:2-4?

14 E nwere otu nwanna na nwunye ya mụtara ụmụ nwaanyị abụọ. Nwanna ahụ kwuru, sị: “Anyị tụlere ihe gbasara ntụrụndụ n’Ofufe Ezinụlọ anyị. Anyị mụtara na e nwere ihe ndị dị́ mma e ji atụrụ ndụ, nweekwa ndị na-adịghị mma. Ònye ka anyị na ya kwesịrị ịna-akpa? Otu n’ime ụmụ anyị kwuru na ya echeghị na ihe ụmụaka ụfọdụ bụ́ Ndịàmà Jehova na-eme n’ụlọ akwụkwọ ma a pụọ brek dị mma. Ma, ọ na-adị ya ka ya soro ha. Anyị kwuru na onye ọ bụla n’ime anyị nwere akọnuche nakwa na anyị kwesịrị iji ya na-ekpebi ihe anyị ga-eme na ndị anyị ga-eso eme ya.”—Gụọ Ndị Rom 14:2-4.

Akọnuche gị e ji Baịbụl zụọ ga-enyere gị aka izere nsogbu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)

15. Olee otú Matiu 6:33 ga-esi nyere anyị aka mgbe anyị na-ekpebi ihe gbasara ntụrụndụ?

15 Ihe ọzọ anyị kwesịrị ichebara echiche bụ oge anyị ji atụrụ ndụ. Ihe i weere  ka ihe ka mkpa ọ̀ bụ ọmụmụ ihe, ozi ọma, na ịmụ Baịbụl, ka ọ̀ bụ ntụrụndụ? Olee ihe kacha mkpa ná ndụ gị? Jizọs sịrị: “Burunụ ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume Chineke, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị ọzọ a niile.” (Mat. 6:33) Mgbe ị na-ekpebi ihe ị ga-eji oge gị eme, akọnuche gị ọ̀ na-echetara gị ndụmọdụ a Jizọs nyere?

AKỌNUCHE ANYỊ GA-EME KA ANYỊ NA-EKWUSA OZI ỌMA

16. Gịnị ka akọnuche anyị na-emere anyị n’ihe gbasara ozi ọma?

16 Ihe ezigbo akọnuche na-eme abụghị naanị ịdọ anyị aka ná ntị ka anyị ghara ime ihe ọjọọ. Ọ na-emekwa ka anyị na-eme ihe ndị dị́ mma. Otu n’ime ha bụ ikwusa ozi ọma ụlọ n’ụlọ nakwa mgbe anyị na-anọghị n’ozi. Ọ bụ ihe Pọl onyeozi mere. O dere, sị: “Ozi ọma . . . bụ mkpa nke dịịrị m. N’ezie, ahụhụ dịịrị m ma ọ bụrụ na ezisaghị m ozi ọma!” (1 Kọr. 9:16) Ọ bụrụ na anyị eṅomie ya, anyị ga-enwe ezi akọnuche, obi esiekwa anyị ike na ihe anyị na-eme dị mma. Ozi ọma anyị na-ezi ndị ọzọ ga-eme ka ha mata nke bụ́ eziokwu. Pọl onyeozi dere, sị: “Site n’ime ka eziokwu ahụ pụta ìhè, n’ihu Chineke, anyị na-eme ihe n’ụzọ ga-adị akọ na uche mmadụ niile mma.”—2 Kọr. 4:2.

17. Olee otú otu nwanna nwaanyị si mee ihe akọnuche ya gwara ya?

17 Otu nwanna nwaanyị mụrụ ihe ọmụmụ bayọlọji n’ụlọ akwụkwọ mgbe ọ dị afọ iri na isii. A kụziiri ha na mmadụ si n’enwe pụta. Ọ sịrị: “Akọnuche m ekweghị m tinye ọnụ otú m na-emebu. E nweghị otú m ga-esi kwado ozizi ahụ. M gakwuuru onye nkụzi anyị, gwa ya obi m. O juru m anya na iwe eweghị ya, kama o kwere ka m gwa ụmụ klas anyị niile banyere okike.” Obi dị nwanna nwaanyị ahụ ezigbo ụtọ na o gere akọnuche ya e ji Baịbụl zụọ ntị, meekwa ihe ọ gwara ya. Akọnuche gị ọ̀ na-eme ka ị na-eme ihe ziri ezi?

18. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-agbalịsi ike ka anyị nwee ezi akọnuche nke ga na-eduzi anyị nke ọma?

18 Ọ ga-amagbu onwe ya ma anyị kpebisie ike ịna-erubere iwu Jehova na ụkpụrụ ya isi. Akọnuche anyị ga-enyere anyị aka ime otú ahụ. Ọ bụrụ na anyị ana-amụ Baịbụl mgbe niile, na-atụgharị uche na ya, na-agbalịsikwa ike ime ihe anyị mụtara, ọ pụtara na anyị na-azụ akọnuche anyị. Akọnuche anyị ga-esi otú ahụ baara anyị ezigbo uru n’ozi anyị na-ejere Chineke.

^ para. 7 Gụọ “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” n’Ụlọ Nche June 15, 2004, peeji nke 29-31.