Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) ỌGỌST 2015

Na-atụgharị Uche n’Ịhụnanya Na-adịgide Adịgide Jehova Nwere

Na-atụgharị Uche n’Ịhụnanya Na-adịgide Adịgide Jehova Nwere

“M ga-atụgharị uche n’ọrụ gị dum.”ỌMA 77:12.

ABỤ: 18, 61

1, 2. (a) Gịnị mere obi ji sie gị ike na Jehova hụrụ ndị ya n’anya? (b) Otú Jehova si kee ụmụ mmadụ mere ka ha nwee ike ịna-eme gịnị?

GỊNỊ mere obi ji sie gị ike na Jehova hụrụ ndị ya n’anya? Tupu ị zaa ajụjụ a, chebara ihe atụ ndị a echiche: Ruo afọ ole na ole, ụmụnna ji obiọma na-agba otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Taylene ume. Ha gwara ya ka ọ ghara ịna-atụ anya ime ihe ọ na-agaghị emeli. Ọ sịrị: “A sị na Jehova ahụghị m n’anya, ọ gaaraghị na-adụ m ọdụ mgbe niile.” E nwere nwanna nwaanyị ọzọ aha ya bụ Brigitte. Ọ bụ naanị ya zụrụ ụmụ ya abụọ mgbe di ya nwụchara. Ọ sịrị: “Ịzụ ụmụ n’ụwa Setan a so n’ihe kacha sie ike, nke ka nke, ma ọ bụrụ onye naanị ya na-azụ ụmụ ya. Ma obi siri m ike na Jehova hụrụ m n’anya n’ihi na ọ na-eduzi m ma mgbe anya mmiri juru m n’anya ma mgbe obi gbawara m. O kwetụbeghị ka ọnwụnwa karịrị m bịara m.” (1 Kọr. 10:13) Nwanna nwaanyị ọzọ aha ya bụ Sandra na-arịa ọrịa na-enweghị ngwọta. N’otu mgbakọ, nwunye otu nwanna a ma ama mere ihe gosiri na ihe banyere ya na-emetụ ya n’obi. Di Sandra kwuru, sị: “Ọ bụ eziokwu na anyị amachaghị nwanna nwaanyị ahụ, obiọma ya mere ka ọṅụ ju anyị obi. Ọ bụrụgodị obere ihe ka ụmụnna anyị mere iji gosi na ha hụrụ anyị n’anya, ọ na-eme ka m ghọta na Jehova hụrụ anyị n’anya nke ukwuu.”

 2 Otú Jehova si kee ụmụ mmadụ mere ka ha nwee ike ịna-ahụ ndị ọzọ n’anya, na-achọkwa ka a hụ ha n’anya. Ma, obi nwere ike ịjọwa anyị njọ n’ihi ọrịa ma ọ bụ ụkọ ego ma ọ bụkwanụ na anyị anaghị ahụ ihe anyị na-arụpụta n’ozi anyị. Ọ bụrụ na ọ dịwa anyị ka Jehova ahụghịzi anyị n’anya, anyị kwesịrị icheta na o ji anyị kpọrọ ihe, na-akwado anyị, nakwa na o ‘sekpụ anyị n’aka nri’ ma na-enyere anyị aka. Ọ gaghị echefu anyị ma ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile na-efe ya.Aịza. 41:13; 49:15.

3. Olee ihe ga-eme ka obi sikwuo anyị ike na Jehova nwere ịhụnanya na-adịgide adịgide n’ebe anyị nọ?

3 Obi siri ụmụnna ndị a anyị kwuru okwu ha ike na Chineke nọnyeere ha mgbe ihe siiri ha ike. Obi kwesịkwara isi anyị ike otú ahụ na ọ nọnyeere anyị. (Ọma 118:6, 7) N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe anọ gosiri na Jehova hụrụ anyị n’anya. Nke mbụ bụ ihe ndị o kere. Nke abụọ abụrụ Okwu ya bụ́ Baịbụl. Nke atọ abụrụ ekpere. Nke anọ abụrụ ihe mgbapụta ahụ. Ịtụgharị uche n’ihe ọma niile Jehova meere anyị nwere ike ime ka anyị na-ekelekwu ya maka ịhụnanya ya na-adịgide adịgide.Gụọ Abụ Ọma 77:11, 12.

NA-ATỤGHARỊ UCHE N’IHE JEHOVA KERE

4. Gịnị ka anyị ga-amụta ma anyị tụgharịa uche n’ihe Jehova kere?

4 Anyị lee anya n’ihe Jehova kere, anyị ga-amụta na ọ hụrụ anyị n’anya nke ukwuu. (Rom 1:20) Dị ka ihe atụ, ihe ndị o kere n’ụwa mere ka anyị dịrị ndụ. Ma, o keghị anyị naanị ka anyị dịrị ndụ. O nyere anyị ihe ndị ga-eme ka ndụ na-atọ anyị ụtọ. Anyị chọọ ịdị ndụ, anyị ga na-eri nri. Ma, Jehova kere ụdị nri dị iche iche, nke mere ka iri nri na-atọ anyị ụtọ. (Ekli. 9:7) Na Kanada, obi na-adị otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Catherine ụtọ mgbe ọ na-ahụ ihe dị iche iche Jehova kere, nke ka nke, n’ihe dị ka n’ọnwa Eprel. Ọ sịrị: “Ọ na-atụ m n’anya otú ihe niile si ama mma, ma okooko osisi ndị na-epulite ọhụrụ ma nnụnụ ndị si n’ebe ha gara lọta, dị ka ụmụ nnụnụ ndị na-abịa atụrụ nri n’ihe e ji etinyere ha nri n’akụkụ windo usekwu m. O doro anya na ọ bụ ịhụnanya Jehova mere ka o kee ụdị ihe ndị a na-eme anyị obi ụtọ.” Nna anyị nke eluigwe hụrụ ihe ndị o kere eke n’anya, chọọkwa ka ha na-eme anyị obi ụtọ.Ọrụ 14:16, 17.

5. Olee otú otú Jehova si kee ụmụ mmadụ si gosi na ọ hụrụ anyị n’anya?

5 Jehova kere anyị ka anyị nwee ike ịna-arụ ọrụ bara uru ga na-eme anyị obi ụtọ. (Ekli. 2:24) Ọ gwara ụmụ mmadụ ka ha mụjuo ụwa ma na-elekọta ya na ihe ndị dị́ n’ime ya, ma azụ̀ ma nnụnụ ma ihe ndị ọzọ. (Jen. 1:26-28) O kekwara anyị ka anyị nwee àgwà ọma ndị ga-eme ka anyị nwee ike ịna-eṅomi ya.Efe. 5:1.

JIRI OKWU CHINEKE KPỌRỌ IHE

6. Gịnị mere obi kwesịrị iji dị anyị ụtọ maka Okwu Chineke bụ́ Baịbụl?

6 Jehova nyere anyị Okwu ya bụ́ Baịbụl n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya. Baịbụl na-agwa anyị ihe anyị kwesịrị ịma banyere Jehova na otú o si emeso ndị mmadụ. Dị ka ihe atụ, Baịbụl gwara anyị otú o si meso ndị Izrel n’agbanyeghị na ha nupụụrụ ya isi ọtụtụ ugboro. Abụ Ọma 78:38 kwuru, sị: “Ma ọ na-eme ebere; ọ na-ekpuchi njehie ha, wee ghara ibibi ha. O mekwara ka iwe ya dajụọ ọtụtụ ugboro, ọ dịghịkwa awụkwasị ha ọnụma ya dum.” Ichebara amaokwu a echiche nwere ike inyere gị aka ịghọta na Jehova hụrụ gị n’anya nakwa na ihe banyere gị  na-emetụ ya n’obi. Ka obi sie gị ike na Jehova ji gị kpọrọ ihe.Gụọ 1 Pita 5:6, 7.

7. Gịnị mere anyị ji kwesị iji Baịbụl kpọrọ ihe?

7 Anyị kwesịrị iji Baịbụl kpọrọ ihe n’ihi na Chineke si na ya agwa anyị okwu. Ọ bụrụ na nna na nwa ya na-ekwurịta okwu nke ọma, ha ga-ahụkwu ibe ha n’anya ma tụkwasị ibe ha obi. Jehova bụ ezigbo Nna anyị. N’agbanyeghị na anyị ahụtụbeghị ya ma ọ bụ nụ olu ya, o si na Baịbụl agwa anyị okwu. Anyị kwesịkwara ịna-ege ya ntị. (Aịza. 30:20, 21) Jehova chọrọ ịna-eduzi anyị ma na-echebe anyị ka ihe ọ bụla ghara ime anyị. Ọ chọkwara ka anyị mara ya ma tụkwasị ya obi.Gụọ Abụ Ọma 19:7-11; Ilu 1:33.

Jehova hụrụ “ihe ndị dị mma” n’ime Jehọshafat n’agbanyeghị na Jihu dụrụ ya ọdụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8 na nke 9)

8, 9. Gịnị ka Jehova chọrọ ka anyị mara? Jiri akụkọ a kọrọ na Baịbụl nye ihe atụ.

8 Jehova chọrọ ka anyị mara na ọ hụrụ anyị n’anya nakwa na ọ bụghị naanị ezughị okè anyị ka ọ na-ahụ. Ọ na-ahụkwa ihe ọma ndị anyị na-eme. (2 Ihe 16:9) Dị ka ihe atụ, o meere Eze Jehọshafat nke Juda otú ahụ. E nwere mgbe o mere iberiibe ma soro Eze Ehab nke Izrel gaa agha ka ha nata ndị Siria ala Remọt-gilied. N’agbanyeghị na narị ndị amụma ụgha anọ gwara Eze Ehab na ọ ga-emeri, Mịkaya, bụ́ ezigbo onye amụma Jehova, gwara ya na a ga-emeri ya. Ehab nwụrụ n’agha ahụ. Ọ fọdịrị obere ka e gbuo Jehọshafat. Mgbe ọ lọrutere Jeruselem, Jehova si n’aka Jihu baara ya mba maka iso Ehab gaa agha. Ma, Jihu sịrị ya: “E nwere ihe ndị dị mma a hụrụ n’ime gị.”2 Ihe 18:4, 5, 18-22, 33, 34; 19:1-3.

9 Ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ, Jehọshafat gwara ndị isi, ndị Livaị, na ndị nchụàjà  ka ha gaa n’obodo niile dị́ na Juda kụziere ndị mmadụ iwu Jehova. Ihe ahụ ha mere bara ezigbo uru. O mere ka ndị bi ná mba ndị gbara Juda gburugburu tụwa egwu Jehova. (2 Ihe 17:3-10) N’agbanyeghị na Jehọshafat mechara mee ihe na-adịghị mma, Jehova echefughị ihe ọma ndị ahụ o mere ná mmalite ọchịchị ya. Ihe a Baịbụl kọrọ na-eme ka anyị cheta na n’agbanyeghị na anyị ezughị okè, Jehova ga-ahụ anyị n’anya ma ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile na-eme uche ya.

JIRI EKPERE KPỌRỌ IHE

10, 11. (a) Gịnị mere ekpere ji bụrụ onyinye pụrụ iche Jehova nyere anyị? (b) Olee otú Chineke nwere ike isi zaa ekpere anyị? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

10 Ezigbo nna na-ewepụta oge ege ụmụ ya ntị ma ha chọọ ịgwa ya okwu. Ọ na-achọ ịma ihe na-echu ha ụra n’ihi na ihe banyere ha na-emetụ ya n’obi. Otú ahụ ka Nna anyị nke eluigwe bụ́ Jehova na-eme. Ọ na-ege anyị ntị mgbe anyị na-ekpegara ya ekpere. Ịgwa ya okwu bụ ezigbo ihe ùgwù.

11 Anyị nwere ike ikpegara Jehova ekpere mgbe ọ bụla. O gbochighị anyị ikpegara ya ekpere. Ọ bụ Enyi anyị, na-egekwa anyị ntị mgbe niile. Ì chetara nwanna nwaanyị ahụ aha ya bụ Taylene anyị kwuru okwu ya ná mmalite? Ọ sịrị: “I nwere ike ịgwa Jehova ihe ọ bụla nakwa ihe niile.” Anyị kpee ekpere gwa Jehova otú ọ dị anyị n’obi, o nwere ike iji otu amaokwu Baịbụl, otu isiokwu dị n’Ụlọ Nche ma ọ bụ na Teta! ma ọ bụ ume nwanna gbara anyị zaa anyị ekpere ahụ. Jehova na-anụ arịrịọ anyị ma na-aghọta otú obi dị anyị ọ bụrụgodị na o nweghị onye ọzọ ghọtara. Ekpere anyị ọ na-aza gosiri na ọ hụrụ anyị n’anya mgbe niile.

12. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-atụle ekpere ndị e dere na Baịbụl? Nye ihe atụ.

12 Anyị nwere ike ịmụta ezigbo ihe n’ekpere ndị e dere na Baịbụl. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-atụle ụdị ekpere ahụ mgbe ụfọdụ n’ofufe ezinụlọ anyị. Ịtụgharị uche n’otú ndị ohu Jehova n’oge ochie si gwa ya ihe dị́ ha n’obi nwere ike inyere anyị aka ime ka ekpere anyị ka mma. Dị ka ihe atụ, chegodị banyere ekpere ahụ Jona ji obi umeala kpee mgbe ọ nọ n’afọ nnukwu azụ̀. (Jona 1:17–2:10) Tụlee ekpere ahụ Sọlọmọn ji obi ya niile kpee mgbe ọ na-enyefe Jehova ụlọ nsọ ọ rụrụ. (1 Eze 8:22-53) Tụgharịa uche n’ekpere ahụ Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya. (Mat. 6:9-13) Nke ka nke, ‘na-eme ka Chineke mara ihe ị na-arịọ.’ I mee otú ahụ, ‘udo nke Chineke nke karịrị echiche niile ga-eche obi gị na ike iche echiche gị nche.’ Obi ga-adịkwu anyị ụtọ maka ịhụnanya na-adịgide adịgide Jehova nwere n’ebe anyị nọ.Fil. 4:6, 7.

GOSI NA OBI DỊ GỊ ỤTỌ MAKA IHE MGBAPỤTA AHỤ

13. Olee uru ihe mgbapụta ahụ baara ụmụ mmadụ?

13 Jehova nyere anyị ihe mgbapụta “ka anyị nwee ike inweta ndụ.” (1 Jọn 4:9) Àjà ahụ Jizọs chụrụ gosiri na otú Chineke si hụ anyị n’anya enweghị atụ. Ọ bụ ya mere Pọl onyeozi ji dee, sị: “Kraịst nwụrụ n’oge a kara aka maka ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke. N’ihi na o siri ike mmadụ ọ bụla ịnwụ maka onye ezi omume; n’ezie, ọ bụ maka ezi mmadụ ka mmadụ ga-anwa anwa nwụọ ma eleghị anya. Ma Chineke mere ka anyị mata ịhụnanya ya, n’ihi na, mgbe anyị ka bụ ndị mmehie, Kraịst nwụrụ n’ihi anyị.” (Rom 5:6-8) Ihe mgbapụta ahụ bụ ihe kacha gosi na Chineke hụrụ anyị n’anya. O mere ka ụmụ  mmadụ na Jehova nwee ike ịdị n’ezigbo mma.

14, 15. Olee uru ihe mgbapụta ahụ baara (a) Ndị Kraịst e tere mmanụ? (b) ndị nwere olileanya ibi n’ụwa?

14 Ihe mgbapụta ahụ mere ka ụfọdụ Ndị Kraịst ghọta na adịm ná mma ha na Jehova pụrụ iche. (Jọn 1:12, 13; 3:5-7) Ha aghọọla “ụmụ Chineke” n’ihi na o ji mmụọ nsọ tee ha mmanụ. (Rom 8:15, 16) Pọl kwuru na Chineke ‘kpọlitekọrọ Kraịst na ndị a e tere mmanụ ma nyekọọ ha na ya oche n’ebe ndị dị n’eluigwe n’ihi na ha na Kraịst Jizọs dị n’otu.’ (Efe. 2:6) Gịnị mere Pọl ji kwuo ihe a ebe ọ bụ na ụfọdụ n’ime ha ka nọ n’ụwa? Ọ bụ n’ihi na Jehova ‘ji mmụọ nsọ ahụ e kwere ná nkwa kaa ha akara, bụ́ ihe àmà e bu ụzọ nye ha tupu ha enweta ihe nketa ha,’ nke bụ́ ‘olileanya ahụ e debeere ha n’eluigwe.’Efe. 1:13, 14; Kọl. 1:5.

15 Ndị niile na-esoghị ná ndị e tere mmanụ nwekwara ike ịbụ ndị enyi Chineke ma ọ bụrụ na ha enwee okwukwe n’ihe mgbapụta ahụ. Ha nwere olileanya na Chineke ga-eme ka ha bụrụ ụmụ ya. Ha ga-adịkwa ndụ ebighị ebi n’ụwa mgbe ọ ga-abụ Paradaịs. N’ihi ya, Jehova ji ihe mgbapụta ahụ gosi na ya hụrụ mmadụ niile nọ́ n’ụwa n’anya. (Jọn 3:16) Ọ bụrụ na anyị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa ma jiri obi anyị niile na-efe Jehova, obi kwesịrị isi anyị ike na ọ ga-eme ka ndụ na-atọ anyị ụtọ n’ụwa ọhụrụ. Ya mere, ka anyị gosi na anyị ji ihe mgbapụta ahụ kpọrọ ihe n’ihi na ọ bụ ya kacha gosi na ịhụnanya Chineke nwere n’ebe anyị nọ enweghị atụ.

GOSI NA Ị HỤRỤ JEHOVA N’ANYA

16. Olee uru anyị ga-erite ma anyị na-atụgharị uche n’ụzọ dị iche iche Jehova si egosi na ya hụrụ anyị n’anya?

16 Anyị agaghị agụtali ụzọ dị iche iche Jehova si egosi na ọ hụrụ anyị n’anya. Eze Devid bụrụ abụ, sị: “Lee ka echiche gị si dị oké ọnụ ahịa n’anya m! Chineke, lee ka ha si dị ọtụtụ ma a gụkọta ha! M sị ka m gụwa ha ọnụ, ha dị ọtụtụ karịa ọbụna ájá.” (Ọma 139:17, 18) Ọ bụrụ na anyị ana-atụgharị uche n’ụzọ dị iche iche Jehova si egosi na ya hụrụ anyị n’anya, anyị ga-ahụkwu ya n’anya ma were obi anyị niile na-ejere ya ozi.

17, 18. Olee ụzọ ụfọdụ anyị ga-esi gosi na anyị hụrụ Jehova n’anya?

17 E nwere ụzọ dị iche iche anyị ga-esi gosi na anyị hụrụ Jehova n’anya. Dị ka ihe atụ, mgbe anyị ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke, ọ na-egosi na anyị hụrụ Jehova na ndị agbata obi anyị n’anya. (Mat. 24:14; 28:19, 20) Anyị na-egosikwa na anyị hụrụ Jehova n’anya ma anyị tachie obi n’ọnwụnwa ndị na-abịara anyị. (Gụọ Abụ Ọma 84:11; Jems 1:2-5.) Ọ bụrụ na ọnwụnwa anyị esie ike, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova na-ahụ ya nakwa na ọ ga-enyere anyị aka n’ihi na o ji anyị kpọrọ ihe.Ọma 56:8.

18 Ịhụ Jehova n’anya ga-eme ka anyị na-atụgharị uche n’ihe ndị o kere nakwa n’ihe ndị ọzọ dị ebube ọ na-eme. Otu n’ime ụzọ anyị si egosi na anyị hụrụ Jehova n’anya ma jiri Okwu ya kpọrọ ihe bụ ịna-amụsi Baịbụl ike. Anyị na-ekpegara Jehova ekpere mgbe niile n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya, chọọkwa ka anyị na ya na-adịkwu ná mma. Ọ bụrụ na anyị ana-atụgharị uche n’ihe mgbapụta ahụ, ọ ga-eme ka anyị hụkwuo Jehova n’anya. (1 Jọn 2:1, 2) Ihe ndị a bụ naanị ụfọdụ n’ime ọtụtụ ụzọ anyị si egosi na anyị hụrụ Jehova n’anya maka ịhụnanya na-adịgide adịgide o nwere n’ebe anyị nọ.