Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) ỌGỌST 2015

 AKỤKỌ NDỤ

“Ka Agwaetiti Niile Ṅụrịa Ọṅụ”

“Ka Agwaetiti Niile Ṅụrịa Ọṅụ”

Agaghị m echefu abalị iri abụọ na abụọ n’ọnwa Mee afọ 2000 echefu. Mụ na ụmụnna ndị ọzọ sí ebe dị iche iche n’ụwa nọ n’ebe Òtù Na-achị Isi na-anọ enwe nnọkọ. Anyị nọ na-eche ndị so na Kọmitii Ide Ihe. Ahụ́ erughị anyị ala. Tupu ụbọchị ahụ, anyị ji izu ole na ole leba anya ná nsogbu ndị nsụgharị na-enwe ma chọzie ịtụ aro otú e nwere ike isi nyere ha aka. Ma, gịnị mere nnọkọ a ji dị ezigbo mkpa? Tupu mụ akọwaa, ka m buru ụzọ kọọrọ gị banyere onwe m.

E mere m baptizim na Kwinsland. M sụrụ ụzọ oge niile na Tazmenia, jee ozi ala ọzọ na Tuvalu, Samoa nakwa na Fiji

A MỤRỤ m na Kwinsland dị́ n’Ọstrelia n’afọ 1955. Ka obere oge gara, mama m bụ́ Estelle na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl. O mere baptizim n’afọ na-eso ya. Papa m bụ́ Ron ghọrọ Onyeàmà Jehova ka afọ iri na atọ gachara. E mere m baptizim n’afọ 1968 n’otu ime ime obodo dị́ na Kwinsland.

Kemgbe m dị obere, ịgụ akwụkwọ na ịmụ asụsụ na-amasị m. Mgbe mụ na nne m na nna m na-aga elegharị anya, o nwere ike ịbụ na o wutere ha na m na-anọ n’azụ ụgbọala na-agụ akwụkwọ kama iso ha na-elegharị anya. Ma, mmasị m nwere n’ịgụ ihe nyeere m aka ime nke ọma n’ụlọ akwụkwọ. E nyedịrị m ọtụtụ ihe nrite mgbe m na-aga ụlọ akwụkwọ sekọndrị n’obodo Glenọki dị n’agwaetiti Tazmenia.

N’oge ahụ, e nwere ihe dị mkpa m kwesịrị ikpebi. M̀ ga-aga mahadum ebe ọ bụ na e nyere m ohere ịgụ akwụkwọ n’efu? N’agbanyeghị na ịgụ akwụkwọ na ịmụta ihe na-atọgbu m atọgbu, obi dị m ụtọ na mama m kụziiri m ka m hụ Jehova n’anya karịa onye ọ bụla ma ọ bụ ihe ọ bụla. (1 Kọr. 3:18, 19) N’ihi ya, agwara m nne m na nna m na m gachaa ụlọ akwụkwọ sekọndrị, m ga-amalite  ịsụ ụzọ oge niile. M malitere ịsụ ụzọ n’ọnwa Jenụwarị afọ 1971, mgbe m dị afọ iri na ise.

M nwere ihe ùgwù ịsụ ụzọ na Tazmenia ruo afọ asatọ. N’oge ahụ, m lụrụ ọmarịcha nwa agbọghọ aha ya bụ Jenny Alcock. Ọ bụ onye Tazmenia. Anyị bụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche n’ime ime obodo ndị dị́ na Smitịn na Kwinstaụn. Anyị jere ozi ebe ahụ ruo afọ anọ.

IJE OZI ALA ỌZỌ N’AGWAETITI NDỊ DỊ́ NA PASIFIK

N’afọ 1978, anyị gara mgbakọ mba niile n’isi obodo Papua Niu Gini. Ọ bụ ya bụ nke mbụ anyị gara mba ọzọ. M ka na-echeta okwu otu nwanna bụ́ onye ozi ala ọzọ kwuru n’asụsụ Hiri Motu. N’agbanyeghị na aghọtaghị m otu mkpụrụ ihe o kwuru, okwu ya mere ka m nwee mmasị ịbụ onye ozi ala ọzọ, ịmụta asụsụ ọzọ, na ịna-ekwu ụdị okwu ahụ o kwuru. Ọ bụ mgbe ahụ ka m ghọtara otú m ga-esi jiri mmasị m nwere ịmụ asụsụ ọzọ jeere Jehova ozi.

Mgbe anyị laghachiri Ọstrelia, o juru anyị anya na a kpọrọ anyị ka anyị bịa bido ozi ala ọzọ n’agwaetiti Funafuti nke dị́ na Tuvalu. Anyị ruru ebe ahụ n’ọnwa Jenụwarị afọ 1979. Ọ bụ naanị ndị nkwusa atọ e mere baptizim ka e nwere na Tuvalu n’oge ahụ.

Mgbe mụ na Jenny nọ na Tuvalu

Ịmụta asụsụ Tuvaluan adịghị mfe. Naanị akwụkwọ e nwere n’asụsụ ahụ bụ “Agba Ọhụrụ.” E nweghị akwụkwọ ọkọwa okwu ma ọ bụ ebe a na-akụzi asụsụ Tuvaluan. N’ihi ya, anyị kpebiri ịgbalị ịna-amụta ihe dị ka okwu iri ma ọ bụ iri abụọ kwa ụbọchị. Ma, o teghị aka anyị achọpụta na anyị aghọtachaghị ihe ọtụtụ okwu ndị anyị mụtara pụtara. Kama ịgwa ndị mmadụ na ịgba afa adịghị mma, ihe anyị nọ na-agwa ha bụ ka ha kwụsị iji ihe e ji atụ ihe atụ ihe, kwụsịkwa ịna-eji mkpara agagharị. Ma, anyị jisiri ike na-amụ asụsụ ahụ n’ihi na e nwere ọtụtụ ndị anyị maliteere ọmụmụ Baịbụl. Ka ọtụtụ afọ gara, otu n’ime ndị anyị mụụrụ ihe gwara anyị, sị: “Obi dị anyị ezigbo ụtọ na unu na-asụ asụsụ anyị ugbu a. Mgbe mbụ, anyị anaghị amadị ihe unu chọrọ ikwu ekwu.”

Ma, e nwere ihe nyeere anyị ezigbo aka ịmụta asụsụ ahụ ngwa ngwa. Anyị ahụghị ụlọ anyị ga-akwụ ụgwọ ma biri na ya. N’ihi ya, anyị gara biri na nke otu ezinụlọ bụ́ Ndịàmà Jehova bí n’ime obodo ahụ. O meziri ka anyị na-asụ asụsụ ndị obodo ahụ n’ebe ọ bụla anyị nọ. Mgbe anyị na-asụghị Bekee afọ ole na ole, asụsụ Tuvaluan ghọziri asụsụ anyị na-asụkarị.

Ọ dịghị anya, ọtụtụ ndị amalite inwe mmasị n’eziokwu Baịbụl. Ma, olee ihe anyị ga-eji na-amụrụ  ha ihe? E nweghị akwụkwọ anyị n’asụsụ ha. Olee otú ha ga-esi na-amụ ihe? Ha bịa ọmụmụ ihe, olee abụ ha ga na-abụ? Gịnị ka ha ga-eji na-eme ihe omume? Oleedị otú ha ga-esi na-akwadebe ihe a ga-amụ n’ọmụmụ ihe? Olee otú ha ga-esi mewe nke ọma ka e mee ha baptizim? E kwesịrị inwe ihe a ga-eji na-akụziri ha banyere Jehova n’asụsụ ha. (1 Kọr. 14:9) Anyị nọ na-eche, sị, ‘È nwere mgbe a ga-ebiwe akwụkwọ anyị n’asụsụ Tuvaluan ebe ọ bụ na ndị na-asụ ya erughịdị puku mmadụ iri na ise?’ Jehova zara ajụjụ ndị ahụ ma mee ka ihe abụọ doo anyị anya. Nke mbụ bụ na ọ chọrọ ka ndị bi “n’agwaetiti ndị dị anya” mụta banyere ya. Nke abụọ abụrụ na ọ chọrọ ka “ndị dị umeala n’obi na ndị dị nwayọọ” gbaba n’aha ya.Jere. 31:10; Zef. 3:12.

ỊSỤGHARỊ EZIOKWU BAỊBỤL

N’afọ 1980, alaka ụlọ ọrụ nyere anyị ọrụ ịsụgharị akwụkwọ anyị n’asụsụ Tuvaluan. Anyị bidoro ọrụ n’agbanyeghị na ọ dị anyị ka ànyị amụtachabeghị asụsụ ahụ. (1 Kọr. 1:28, 29) Ná mmalite, ndị ọchịchị resịrị anyị otu ígwè ochie e ji ebi akwụkwọ. Anyị ji ya na-ebi akwụkwọ ndị anyị na-amụ n’ọmụmụ ihe. Anyị sụgharịdịrị akwụkwọ bụ́ Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh-Ebi n’asụsụ Tuvaluan, jirikwa ígwè ahụ bipụta ya. M ka na-echeta otú ísì ink si eju ebe niile mgbe ahụ nakwa ụdị mbọ anyị gbara iji ígwè ahụ bie akwụkwọ ahụ niile n’agbanyeghị na ebe niile na-ekpo ọkụ. N’oge ahụ, anyị enweghị ọkụ eletrik.

Ọ dịghị mfe ịsụgharị akwụkwọ anyị n’asụsụ Tuvaluan n’ihi na e nweghị akwụkwọ ọkọwa okwu ma ọ bụ akwụkwọ ndị e ji eme nchọnchọ. Ma oge ụfọdụ, enyemaka si n’ebe anyị na-atụghị anya ya bịa. Dị ka ihe atụ, otu ụbọchị, m gara kụọ aka n’amaghị ama n’ụlọ otu nwoke na-anaghị achọ ịnụ ozi ọma. Ọ bụ onye nkụzi, ma ọ katala ahụ́. Mgbe ọ pụtara, o chetaara m na anyị ekwesịghị ịna-abịa ozi ọma n’ụlọ ya. Ọ sịziri m: “Ehee, e nwedịrị ihe m chọrọ ịgwa gị. Otú unu si asụgharị ihe abụghị otú e si ekwu okwu n’asụsụ Tuvaluan.” Mgbe m jụrụ ndị ọzọ, ha kwuru otu ihe  ahụ. N’ihi ya, anyị gbanwere otú anyị si asụgharị ihe. Ma, ihe tụrụ m n’anya bụ na Jehova si n’aka onye na-anaghị achọ ịnụ ozi ọma nyere anyị aka. O doro anya na nwoke ahụ na-agụ akwụkwọ anyị.

Akụkọ Alaeze nke 30 n’asụsụ Tuvaluan

Akwụkwọ mbụ anyị biri nye ndị mmadụ n’asụsụ Tuvaluan bụ akwụkwọ ịkpọ òkù maka Ncheta Ọnwụ Jizọs. Nke na-eso ya bụ Akụkọ Alaeze nke 30, nke e wepụtara mgbe e wepụtara nke Bekee ya. Obi tọrọ anyị ezigbo ụtọ iwepụta ihe ndị a n’asụsụ Tuvaluan. Ka oge na-aga, e bipụtakwara ụfọdụ broshọ na akwụkwọ anyị ndị ọzọ. N’afọ 1983, alaka ụlọ ọrụ anyị dị́ n’Ọstrelia malitere ibipụta Ụlọ Nche n’asụsụ Tuvaluan. Ọ na-adị peeji iri abụọ na anọ. A na-ebi ya n’ọnwa atọ ọ bụla. Anyị na-amụkwa ihe dị ka paragraf asaa kwa izu. Akwụkwọ ndị ahụ e bipụtara hà masịrị ndị bi na Tuvalu? Ebe ọ bụ na ịgụ ihe na-atọ ha ụtọ, ọtụtụ ndị malitere ịgụ ya. É wepụta akwụkwọ ọhụrụ, a na-ama ọkwa ya mgbe a na-akọ akụkọ ụwa n’ụlọ ọrụ redio gọọmenti obodo ahụ. Mgbe ụfọdụ, ọ na-abụdị isiokwu e ji mere akụkọ. *

Ná mmalite, anyị na-eji akwụkwọ na mkpịsị akwụkwọ ede ihe anyị na-asụgharị. Anyị dechaa, anyị ejiri ígwè taịpraịta dee ya ma degharịa ya ugboro ugboro tupu anyị eziga ya n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị́ n’Ọstrelia, bụ́ ebe a ga-ebipụta ya. Ụmụnna nwaanyị abụọ nọ́ ebe ahụ na-eji ngwá ọrụ kọmputa ede ihe anyị ziteere ha, n’agbanyeghị na ha amaghị asụsụ Tuvaluan. Mmadụ abụọ a dechaa ya, ha eleruo ya anya ka ha mara ma è nwere ihe dị iche. Ime otú a na-eme ka ha ghara ịna-edehie ihe. Ha na-ejikwa kọmputa hazie ya otú ọ ga-adị ma e bie ya, wegazie ya n’ebe a ga-eji ụgbọelu zitere anyị ya ka anyị leruo ya anya. Anyị mechaa, anyị na-ezighachiri ha ya ka ha bie ya.

Ihe agbanweela ugbu a. Ndị nsụgharị na-ejizi aka ha edenye okwu ndị ha na-asụgharị na kọmputa. Oge ụfọdụ, otu onye nọ́ n’ebe ndị nsụgharị ahụ nọ ga-ahazi otú ọ ga-adị ma e bie ya. O mechaa, ha esi n’Ịntanet ziga ya n’alaka ụlọ ọrụ ga-ebi ya. E nweghịzi onye na-agbaga na post ọfis izipụ ihe a sụgharịrị.

ỌRỤ NDỊ ỌZỌ E NYERE ANYỊ

Ka oge na-aga, mụ na Jenny rụrụ ọrụ n’ebe dị iche iche na Pasifik. E si Tuvalu ziga anyị n’alaka ụlọ ọrụ dị́ na Samoa n’afọ 1985. N’ebe ahụ, anyị nyeere ndị nsụgharị aka n’asụsụ Samoan, Tọngan, na Tokelauan n’agbanyeghị na anyị ka sokwa na-asụgharị Tuvaluan. * N’afọ 1996, e zigara anyị n’alaka ụlọ ọrụ dị́ na Fiji. N’ebe ahụ, anyị nyeere ndị nsụgharị aka n’asụsụ Fijian, Kiribati, Nauruan, Rotuman, na Tuvaluan.

Ebe m ji akwụkwọ anyị na-amụrụ mmadụ ihe n’asụsụ Tuvaluan

Ọ na-atụ m n’anya mgbe niile otú ndị nsụgharị si eji obi ha niile arụ ọrụ ha n’agbanyeghị na ọ dịghị mfe. Ụmụnna ndị a kwesịrị ntụkwasị obi na-agbasi mbọ ike ime ihe Jehova chọrọ, ya bụ, ka “mba niile na ebo niile na asụsụ niile na ndị niile” nụ ozi ọma. (Mkpu. 14:6) Dị ka ihe atụ, mgbe a na-ahazi otú a ga-esi sụgharịa Ụlọ Nche n’asụsụ Tọngan, mụ na ndị okenye niile nọ́ na Tọnga nwere  nnọkọ, mụ ajụọ ha onye e nwere ike ịzụ ka ọ bụrụ onye nsụgharị. Otu okenye nke na-arụzi ụgbọala kwetara ịgba arụkwaghịm n’echi ya ma malite ọrụ nsụgharị ozugbo n’agbanyeghị ezigbo ọrụ ahụ ọ na-arụbu. Ihe a o mere tọrọ m ụtọ ebe ọ bụ na o nwere ezinụlọ, ọ maghịkwa ebe ọ ga-esi enweta ego ọ ga-eji na-elekọta ha. Ma, Jehova lekọtara ya na ezinụlọ ya. Ọ rụkwara ọrụ nsụgharị ahụ ọtụtụ afọ.

Ihe ndị nsụgharị ndị a na-eme gosiri na ha ghọtara otú Òtù Na-achị Isi si ele ọrụ nsụgharị anya. Òtù Na-achị Isi chọrọ ka e nwee akwụkwọ anyị n’asụsụ niile, ọ bụrụgodị asụsụ ndị na-asụ ya dị ole na ole. Dị ka ihe atụ, e nwere mgbe a nọ na-ajụ ma mbọ niile anyị na-agba ka a na-ewepụta akwụkwọ anyị n’asụsụ Tuvaluan ọ̀ bara uru. Obi tọrọ m ụtọ mgbe m gụrụ ihe Òtù Na-achị Isi zara. Ha sịrị: “Anyị ahụghị ihe mere unu ga-eji kwụsị ịsụgharị akwụkwọ anyị n’asụsụ Tuvaluan. N’agbanyeghị na ndị na-asụ ya dị ntakịrị karịa ndị na-asụ asụsụ ndị ọzọ, ha ka kwesịrị ịna-anụ ozi ọma n’asụsụ ha.”

Ebe m na-eme ndị mmadụ baptizim n’osimiri

N’afọ 2003, e si na Ngalaba Nsụgharị dị́ na Fiji ziga mụ na Jenny Ngalaba Na-enyere Ndị Nsụgharị Aka na Patasịn, dị́ na Niu Yọk. Ọ dị anyị ka ọ̀ bụ ná nrọ. Anyị sozi ná ndị na-enye aka ahazi otú e si asụgharị akwụkwọ anyị n’asụsụ ndị ọzọ. Anyị rụrụ ọrụ ahụ ihe dị ka afọ abụọ, na-aga mba dị iche iche ma na-enye aka ịzụ ndị nsụgharị.

MKPEBI NDỊ DỊ́ EZIGBO MKPA

Ka m laghachi ná nnọkọ ahụ m kwuru banyere ya ná mmalite. N’afọ 2000, Òtù Na-achị Isi ghọtara na e kwesịrị inyere ndị nsụgharị aka n’ụwa niile. N’oge ahụ, o nweghị ezigbo ọzụzụ e nyere ọtụtụ ndị nsụgharị. Mgbe anyị na Kọmitii Ide Ihe nwechara nnọkọ ahụ, Òtù Na-achị Isi kpebiri na a ga-azụ ndị nsụgharị nọ́ n’ụwa niile. A ga-akụziri ha otú ha ga-esi na-aghọtakwu Bekee, otú kacha mma ha ga-esi na-asụgharị ihe, na otú ha ga-esi jiri otu obi na-arụkọ ọrụ.

Olee uru ọzụzụ a niile bara? O meela ka ihe a na-asụgharị ka mma, meekwa ka a na-asụgharị akwụkwọ anyị n’ọtụtụ asụsụ ndị ọzọ. Mgbe anyị malitere ozi ala ọzọ n’afọ 1979, a na-ebipụta Ụlọ Nche naanị n’asụsụ iri asatọ na abụọ. É bipụta nke Bekee, ọnwa ole na ole na-aga tupu e bipụta ya n’ọtụtụ asụsụ. Ma a na-ebizi Ụlọ Nche n’ihe karịrị narị asụsụ abụọ na iri anọ. N’ọtụtụ asụsụ, a na-ebipụta ya na nke Bekee otu mgbe. Ugbu a, e nwere akwụkwọ anyị n’ihe karịrị narị asụsụ asaa. Ọtụtụ afọ gara aga, ụdị ihe a yiri ihe na-agaghị eme eme.

N’afọ 2004, Òtù Na-achị Isi kpebiri ihe ọzọ dị ezigbo mkpa, ya bụ, ka a na-asụgharị Baịbụl ngwa ngwa. Mgbe ọnwa ole na ole gara, ha kwetara ka a sụgharịwa Baịbụl n’ọtụtụ asụsụ, nke mere ka e nwekwuo Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ n’asụsụ ndị ọzọ. N’afọ 2014, e biela Baịbụl a n’otu narị asụsụ na iri  abụọ na asatọ, ma ndị bụ́ naanị Akwụkwọ Nsọ Grik ma ndị bụ́ Akwụkwọ Nsọ Hibru na Akwụkwọ Nsọ Grik. Ụfọdụ n’ime asụsụ ndị ahụ bụ ndị a na-asụ n’Ebe Ndịda Pasifik.

Ebe m wepụtara Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst n’asụsụ Tuvaluan

Otu n’ime ihe na-eme m obi ụtọ bụ mgbakọ distrikti m gara na Tuvalu n’afọ 2011. Tupu mgbe ahụ, mmiri ezoghị n’obodo ahụ ruo ọtụtụ ọnwa. N’ihi ya, ụmụnna chere na mgbakọ ahụ agaghịzi enwe isi. Ma, obi dị anyị ụtọ na ezigbo mmiri zoro ná mgbede mgbe anyị rutere, nke mere na e mechara mee mgbakọ ahụ. Enwere m ihe ùgwù pụrụ iche iwepụta Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst n’asụsụ Tuvaluan ná mgbakọ ahụ. Ọ bụ ha kacha obere ná ndị niile e wepụtatụrụla Akwụkwọ Nsọ a n’asụsụ ha. Mmiri ọzọ zoro mgbe e mechara mgbakọ ahụ. N’ihi ya, ma mmiri nkịtị ma mmiri nke Okwu Chineke juru eju bara abara.

Ebe m na-agba papa m na mama m, bụ́ Ron na Estelle, ajụjụ ọnụ ná mgbakọ e nwere na Taụnsvil dị́ n’Ọstrelia, n’afọ 2014

Ọ dị mwute na ezigbo nwunye m bụ́ Jenny anọghịzi mgbe ihe a pụrụ iche mere. Ọrịa kansa gburu ya n’afọ 2009. Ọ rịara ya afọ iri. Mụ na ya biri ihe karịrị iri afọ atọ na ise. Mgbe a ga-akpọlite ya n’ọnwụ, obi ga-atọgbu ya atọgbu ịnụ na e wepụtara Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ n’asụsụ Tuvaluan.

Kemgbe ahụ, Jehova enyela m ọmarịcha nwaanyị ọzọ aha ya bụ Loraini Sikivou. Ya na Jenny rụkọrọ ọrụ na Betel dị́ na Fiji. Loraini bụkwa onye nsụgharị n’asụsụ Fijian. N’ihi ya, enweela m nwunye ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi, onye mụ na ya ji otu obi na-ejere Jehova ozi. Ihe banyere asụsụ na-atọkwa ya ụtọ otú ọ na-atọ m.

Ebe mụ na Loraini na-ezi ozi ọma na Fiji

M cheta afọ ndị gara aga, obi na-atọ m ụtọ na ejirila m anya m hụ otú Jehova, bụ́ Nna anyị nke eluigwe, si egboro ndị na-asụ asụsụ dị iche iche mkpa ha, n’agbanyeghị mmadụ ole na-asụ ha. (Ọma 49:1-3) Ahụla m ụdị obi ụtọ ndị mmadụ na-enwe mgbe mbụ ha nwetara akwụkwọ anyị n’asụsụ ha ma ọ bụ na-abụ abụ anyị n’asụsụ ha na-aghọta nke ọma. O meela ka m na-echeta na Jehova hụrụ anyị n’anya nke ukwuu. (Ọrụ 2:8, 11) M ka na-echeta ihe otu nwanna nwoke mere agadi kwuru. Aha ya bụ Saulo Teasi. Ọ bụ onye Tuvaluan. Mgbe mbụ ọ bụrụ abụ anyị n’asụsụ ha, ọ sịrị: “Biko, gwanụ Òtù Na-achị Isi na abụ ndị a na-atọ ụtọ n’asụsụ Tuvaluan karịa na Bekee.”

Kemgbe Septemba afọ 2005, e nyere m ihe ùgwù m na-atụghị anya ya, ya bụ, iso n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova. N’agbanyeghị na abụghịzi m onye nsụgharị, m na-ekele Jehova n’ihi na o kwere ka m soro na-enyere ndị nsụgharị nọ́ n’ụwa niile aka. Obi dị m ezigbo ụtọ ịma na Jehova na-egboro ndị na-efe ya mkpa ha niile, ma ndị bi n’agwaetiti ndị dịpụrụ adịpụ n’ime Oké Osimiri Pasifik. Ihe otu ọbụ abụ kwuru bụ eziokwu. Ọ sịrị, “Jehova aghọwo eze! Ka ụwa ṅụrịa ọṅụ. Ka agwaetiti niile ṅụrịa ọṅụ.”Ọma 97:1.

^ para. 18 Ị chọọ ịgụ ụfọdụ n’ime ihe ndị mmadụ kwuru banyere akwụkwọ anyị n’asụsụ Tuvaluan, gụọ Ụlọ Nche December 15, 2000, peeji nke 32; August 1, 1988, peeji nke 22; na Teta! January 8, 2001, peeji nke 21.

^ para. 22 Ị chọọ ịgụ ebe a kọwakwuru gbasara ọrụ nsụgharị na Samoa, gụọ Akwụkwọ Mgbaafọ 2009 (nke Bekee), peeji nke 120-121, 123-124.