Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JULAỊ 2015

“Nnapụta Unu Na-eru Nso”

“Nnapụta Unu Na-eru Nso”

“Guzonụ kwem ma welie isi unu elu, n’ihi na nnapụta unu na-eru nso.”—LUK 21:28.

ABỤ: 133, 43

1. Olee ihe ndị mere na Jeruselem n’afọ 66? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

WEREGODỊ ya na ị bụ Onye Kraịst bi na Jeruselem n’afọ 66. Ọtụtụ ihe nọ na-eme. Onye ọchịchị Rom aha ya bụ Florọs gara n’ebe a na-edewe ego n’ụlọ nsọ were talent iri na asaa. Ozugbo ahụ, iwe were ndị Juu, ha egbuo ndị agha Rom nọ na Jeruselem ma kwuo na ha enwerela onwe ha, na ọ bụghịzi ndị Rom na-achị ha. Ma ndị Rom mere ihe ngwa ngwa. Tupu ọnwa atọ agaa, Sestiọs Galọs, bụ́ gọvanọ Rom nke na-achị Siria, du puku ndị agha iri atọ gbaa Jeruselem gburugburu. Ndị Juu ndị ahụ nupụrụ isi gara zoo n’ụlọ nsọ. Ma ndị agha Rom mechara rute ná mgbidi gbara ụlọ nsọ ahụ gburugburu, gbalịwa ịkwatu ya. Egwu jidere onye ọ bụla nọ n’obodo ahụ. Olee otú ọ gaara adị gị ma a sị na ị hụrụ ka ihe a niile na-eme?

2. Gịnị ka Ndị Kraịst kwesịrị ime mgbe ha hụrụ ka ndị agha Rom gbara Jeruselem gburugburu n’afọ 66? Gịnị mere o ji kwe ha omume?

2 O doro anya na ị ga-echeta ihe Jizọs kwuru nke Luk dere. O kwuru, sị: “Mgbe unu hụkwara Jeruselem ka ụsụụ ndị agha  ndị mara ụlọikwuu gbara ya gburugburu, mgbe ahụ maranụ na ime ka ọ tọgbọrọ n’efu adịwo nso.” (Luk 21:20) Ma, i nwere ike ịna-eche, sị: ‘Olee otú m ga-esi mee ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya mgbe ọ dọchara ha aka ná ntị ahụ?’ Ọ sịrị ha: “Ka ndị nọ na Judia malite ịgbaga n’ugwu, ka ndị nọkwa n’ime ya si na ya pụọ, ka ndị nọkwa n’obodo nta dị iche iche ghara ịbanye n’ime ya.” (Luk 21:21) Oleekwanụ otú ị ga-esi gbapụ na Jeruselem ebe ọ bụ na ndị agha gbara ya gburugburu? Ihe dị ịtụnanya mere na mberede. I jizi anya gị hụ ka ndị agha Rom lawara, mezie ka ọgụ ha bịara ịlụso Jeruselem “dị mkpirikpi” otú ahụ e buru n’amụma. (Mat. 24:22) Ọ bụzi mgbe ahụ ka ị ga-eme ihe ahụ Jizọs kwuru. Ị ga-agbaga ozugbo n’ugwu ndị dị n’ofe Osimiri Jọdan, gị na Ndị Kraịst ndị ọzọ niile kwesịrị ntụkwasị obi nọ na Jeruselem nakwa n’obodo ndị gbara ya gburugburu. * N’afọ 70, ndị agha Rom bịara bibie Jeruselem. Ma, ọkọ akọghị gị n’ihi na i mere ihe Jizọs kwuru.

3. Olee ihe mere n’oge ndịozi Jizọs ga-eme n’oge na-adịghị anya? Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

3 Ihe ahụ Jizọs kwuru gbasakwara oge anyị a. Ụdị ihe ahụ mere mgbe ahụ ga-eme n’oge na-adịghị anya. Jizọs ji ihe ndị mere n’oge ndịozi ya kọwaa ihe ga-eme mgbe “oké mkpagbu” ahụ ga-amalite na mberede. (Mat. 24:3, 21, 29) Obi dị anyị ụtọ na Chineke ga-echebe “oké ìgwè mmadụ” mgbe ọ ga-ebibi ụwa ochie a. (Gụọ Mkpughe 7:9, 13, 14.) Gịnị ka Baịbụl gwara anyị banyere ihe ndị ahụ ga-emenụ? Anyị kwesịrị ịchọ ịmata azịza ajụjụ a n’ihi na ọ gbasara nzọpụta anyị. Ka anyị leba anya n’otú ihe ndị ahụ ga-eme n’ọdịnihu ga-esi gbasa onye ọ bụla n’ime anyị.

OTÚ OKÉ MKPAGBU GA-ESI MALITE

4. Olee ihe ga-egosi na oké mkpagbu ahụ amalitela? Olee otú ọ ga-esi mee?

4 Gịnị ga-egosi na oké mkpagbu amalitela? Ọ bụ mbibi a ga-ebibi okpukpe ụgha niile. Na Baịbụl, a kpọrọ okpukpe ụgha “Babịlọn Ukwu ahụ, nne ụmụ nwaanyị akwụna.” (Mkpu. 17:5-7) Gịnị mere e ji kpọọ ya nwaanyị akwụna? Ọ bụ n’ihi na ndị ndú okpukpe anaghị eme ihe Chineke chọrọ. Kama ịna-akwado Jizọs na Alaeze ya, ha na-akwado ọchịchị ụmụ mmadụ ma na-eleghara ihe ndị Baịbụl kwuru anya ka ha wee bụrụ ndị a ma ama. Ha anaghị eme ka ndị e tere mmanụ, bụ́ ndị dị ka nwa agbọghọ na-amaghị nwoke. (2 Kọr. 11:2; Jems 1:27; Mkpu. 14:4) Ma, ònye ga-ebibi Babịlọn Ukwu ahụ? Jehova Chineke ga-etinye “echiche ya” n’obi “mpi iri” nke ‘anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie.’ ‘Anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie’ nọchiri anya Òtù Mba Ụwa. “Mpi iri” ahụ nọchiri anya ọchịchị niile na-akwado òtù ahụ.—Gụọ Mkpughe 17:3, 16-18.

5, 6. Gịnị mere anyị ji kwuo na mbibi Babịlọn Ukwu ahụ apụtaghị na a ga-egbu ndị niile na-ekpe okpukpe ụgha?

5 Ma, ànyị kwesịrị iche na mbibi Babịlọn Ukwu ahụ pụtara na a ga-egbu ndị niile na-ekpe okpukpe ụgha? Mba. Zekaraya onye amụma si n’ike mmụọ nsọ dee banyere ihe ga-emenụ. N’oge ahụ, onye nọbu n’okpukpe ụgha ga-asị: “‘Abụghị m onye amụma. Abụ m onye na-akọ ubi, n’ihi na mmadụ goro m ọrụ kemgbe m bụ nwa okorobịa.’ Mmadụ ga-ajụkwa ya, sị, ‘Gịnị bụkwanụ ọnyá a niile dị gị n’ahụ́?’ Ọ ga-azakwa ya, sị, ‘Ọ bụ ahụ́ e merụrụ m n’ụlọ ndị hụrụ m n’anya nke  ukwuu.’” (Zek. 13:4-6) N’ihi ya, ụfọdụ ndị ndú okpukpe ga-ahapụ okpukpe ha na-ekpe ma kwuo na o nwetụbeghị mgbe ha nọrọ n’okpukpe ụgha ndị ahụ.

6 Gịnị ga-eme ndị Chineke n’oge ahụ? Jizọs sịrị: “N’eziokwu, ọ bụrụ na e meghị ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpirikpi, a gaghị azọpụta anụ ahụ́ ọ bụla; ma n’ihi ndị a họọrọ, a ga-eme ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpirikpi.” (Mat. 24:22) Dị ka e kwuburu, e mere ka mkpagbu e nwere na Jeruselem “dị mkpirikpi” n’afọ 66. Ọ bụ ihe mere ka “ndị a họọrọ,” ya bụ, Ndị Kraịst e tere mmanụ, si na Jeruselem na obodo ndị gbara ya gburugburu gbapụ. Otú ahụkwa ka a ga-esi mee ka agba nke mbụ nke oké mkpagbu ahụ “dị mkpirikpi” n’ihi “ndị a họọrọ.” Chineke agaghị ekwe ka “mpi iri ahụ,” ya bụ, ndị ọchịchị, bibie ndị ya. Kama, a ga-enwe ihe ga-adị ka oge udo.

OGE ULE NA IKPE

7, 8. Gịnị ga-eme ma e bibichaa okpukpe ụgha? Olee otú ndị ohu Chineke ga-esi dị iche n’oge ahụ?

7 Gịnị ga-eme ma e bibichaa okpukpe ụgha niile? Ọ bụ mgbe ahụ ka anyị ga-egosi ihe dị anyị n’obi. Baịbụl kwuru na ọtụtụ ndị ga-aga zoo “n’oké nkume ndị dị n’ugwu,” ya bụ na ha ga-agbalị ka òtù ụmụ mmadụ chebe ha ma nyere ha aka. (Mkpu. 6:15-17) Ma, ndị ohu Jehova ga-atụkwasị Jehova obi ka o chebe ha. Mgbe e mere ka mkpagbu ahụ dị mkpirikpi n’oge ndịozi Jizọs, ọ bụghị ka ndị Juu niile ghọọ Ndị Kraịst. Ọ bụ mgbe Ndị Kraịst ga-esi na Jeruselem gbapụ otú ahụ Jizọs kwuru. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịtụ anya na mgbe oké mkpagbu ahụ ga-akwụsịtụ, ọtụtụ ndị ga-aghọ Ndị Kraịst. Kama, ezigbo Ndị Kraịst niile ga-eji oge ahụ gosi na ha hụrụ Jehova n’anya ma na-akwado ụmụnna Kraịst.—Mat. 25:34-40.

8 N’agbanyeghị na anyị amaghị ihe niile ga-eme n’oge ule ahụ, anyị ma na ihe agaghị adịcha mfe, anyị ga-ahapụkwa ihe ụfọdụ. N’oge ndịozi, Ndị Kraịst hapụrụ ụlọ ha, diekwa ihe isi ike ka ha nwee ike ịdị ndụ. (Mak 13:15-18) Iji mee uche Chineke, ànyị ga-enwe ike ịhapụ akụnụba anyị? Ànyị ga-eme ihe ọ bụla anyị kwesịrị ime iji gosi na anyị na-erubere Jehova isi? Chegodị echiche. N’oge ahụ, ọ ga-abụ naanị anyị na-eme ihe Daniel onye amụma mere, ya bụ, ịna-efe Chineke n’agbanyeghị ihe ọ bụla na-emenụ.—Dan. 6:10, 11.

9, 10. (a) Olee ozi ndị ohu Chineke ga-ekwusa n’oké mkpagbu ahụ? (b) Gịnị ka ndị iro ndị Chineke ga-eme?

9 Oge ahụ agaghị abụ oge ikwusa “ozi ọma nke a nke alaeze.” Oge ya ga-agaferela. N’oge ahụ, “ọgwụgwụ” abịala. (Mat. 24:14) O doro anya na ndị ohu Chineke ga-eji obi ike na-ekwusa ozi ikpe siri ike. Ozi ahụ nwere ike ịbụ na ọ fọrọ obere ka e bibie ụwa Setan kpamkpam. Baịbụl ji ozi ahụ tụnyere akụ́ mmiri ígwé. Ọ sịrị: “Oké akụ́ mmiri ígwé, tinyere nkume ọ bụla nke ịdị arọ ya dị ihe dị ka otu talent, wee si n’eluigwe dakwasị ndị mmadụ, ndị ahụ wee kwuluo Chineke n’ihi ihe otiti nke akụ́ mmiri ígwé ahụ, n’ihi na ihe otiti ya dị ukwuu hie nne.”—Mkpu. 16:21.

10 Ndị iro anyị ga-anụ ozi ahụ. Ezikiel si n’ike mmụọ nsọ kwuo ihe Gọg nke Megọg, bụ́ ọtụtụ mba ndị gbakọrọ aka ọnụ, ga-eme. Ọ sịrị: “Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ na ọtụtụ ihe ga-abata gị n’obi. Ị ga-eme atụmatụ ọjọọ. Ị ga-asịkwa: “M ga-agbago buso obodo  na-enweghị mgbidi agha. M ga-abịakwasị ndị na-enweghị nsogbu, bụ́ ndị bi n’obi iru ala, ha niile bi n’ebe na-enweghị mgbidi, ha enweghịdị ihe ntụchi ụzọ na ibo ụzọ.” Ọ bụ ka ị kwakọrọ ihe buru ibu, bukọrọkwa ihe dị ukwuu, ka i welie aka gị megide ebe a lara n’iyi bụ́ ebe ndị mmadụ birighachiiri na ha, ka ị bịakwasịkwa ndị e si ná mba dị iche iche kpọkọta, bụ́ ndị na-akpakọba akụ̀ na ihe onwunwe, ndị bikwa n’etiti ụwa.’” (Ezik. 38:10-12) Ndị ohu Chineke ga-agbapụ iche dị ka à ga-asị na ha nọ “n’etiti ụwa.” Ọ gaghị ekwe mba dị iche iche odidi. Ọ ga na-anụ ha ọkụ n’obi ịlụso ndị e tere mmanụ na ndị na-akwado ha ọgụ.

11. (a) Gịnị ka anyị kwesịrị icheta banyere ihe ndị ga-eme n’oké mkpagbu ahụ? (b) Gịnị ka ndị mmadụ ga-eme mgbe ha ga-ahụ ihe ịrịba ama n’eluigwe?

11 Ka anyị na-atụle ihe ọzọ ga-emenụ, anyị kwesịrị iburu n’obi na Baịbụl ekwughị kpọmkwem nke ga-ebu ibe ya ụzọ mee n’ime ihe ndị ahụ e buru n’amụma. O yiri ka ụfọdụ n’ime ha ga-eme otu mgbe. N’amụma Jizọs buru banyere ọgwụgwụ usoro ihe ochie a, ọ sịrị: “A ga-enwekwa ihe ịrịba ama dị iche iche n’anyanwụ na n’ọnwa nakwa na kpakpando, mba dị iche iche ga-anọkwa ná nhụjuanya n’elu ụwa, n’amaghị ihe ha ga-eme n’ihi mbigbọ nke oké osimiri na mmali ya, ndị mmadụ ga-atụbọkwa n’ihi egwu nakwa n’ihi ihe ndị ha na-atụ anya ga-abịakwasị elu ụwa mmadụ bi; n’ihi na a ga-eme ka ike nke eluigwe maa jijiji. Mgbe ahụ, ha ga-ahụkwa Nwa nke mmadụ ka ọ na-abịa n’ígwé ojii n’ike na ebube dị ukwuu.” (Luk 21:25-27; gụọ Mak 13:24-26.) Mmezu amụma a ọ̀ pụtara na a ga-enwe ihe ịrịba ama na ihe ndị na-emenye ndị mmadụ ụjọ n’eluigwe nkịtị? Anyị ga-amata ma o ruo mgbe ahụ. Ihe ọ sọrọ ya bụrụ, ihe ịrịba ama ndị ahụ ga-eme ka ụjọ tụọ ndị iro Chineke, obi awụba ha n’afọ.

Obi ga-esi anyị ike na Jehova ga-anapụta anyị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12 na nke 13)

12, 13. (a) Gịnị ga-eme mgbe Jizọs ga-abịa “n’ike na ebube dị ukwuu”? (b) Olee ihe ndị ohu Chineke ga-eme n’oge ahụ?

12 Olee ihe ga-eme mgbe Jizọs ga-abịa “n’ike na ebube dị ukwuu”? Ọ bụ mgbe ahụ ka ọ ga-akwụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi ụgwọ ma bibie ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi. (Mat. 24:46, 47, 50, 51; 25:19, 28-30) Matiu kwuru na Jizọs tụrụ ilu banyere atụrụ na ewu mgbe o kwuchara ihe ịrịba ama ndị ahụ. Ọ sịrị: “Mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube ya, ya na ndị mmụọ ozi ya niile, mgbe ahụ ka ọ ga-anọkwasị n’ocheeze ya dị ebube. A ga-emekwa ka mba niile zukọta n’ihu ya, ọ ga-ekewapụkwa ndị mmadụ n’ebe ibe ha nọ, dị nnọọ ka onye ọzụzụ atụrụ si ekewapụ atụrụ n’ebe ewu nọ. Ọ ga-edebe atụrụ n’aka nri ya, ma debe ewu n’aka ekpe ya.” (Mat. 25:31-33) Olee ihe ga-eme atụrụ na ewu ndị ahụ ma e kpechaa ha ikpe? Ihe ikpeazụ Jizọs kwuru n’ilu ahụ bụ: “Ndị a [ya bụ, ndị bụ́ ewu] ga-anwụ ọnwụ ebighị ebi, ma ndị ezi omume ga-enweta ndụ ebighị ebi.”—Mat. 25:46.

13 Gịnị ka ndị bụ́ ewu ga-eme mgbe ha matara na a ga-ebibi ha? Ha “ga-eti aka n’obi, kwaa ákwá arịrị.” (Mat. 24:30) Ma, gịnị ka ụmụnna Kraịst na ndị ji obi ha niile na-akwado ha ga-eme n’oge ahụ? Okwukwe ha nwere na Jehova Chineke nakwa n’Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst ga-eme ka ha mee ihe Jizọs kwuru. Ọ sịrị: “Mgbe ihe ndị a niile malitere ime, guzonụ kwem ma welie isi unu elu, n’ihi na nnapụta unu na-eru nso.” (Luk 21:28) N’eziokwu, obi ga-esi anyị ike na Jehova ga-anapụta anyị.

 INWU GBAA N’ALAEZE CHINEKE

14, 15. Olee otú a ga-esi ‘chịkọta ndị a họọrọ’ mgbe Gọg nke Megọg malitechara ịlụso ndị Chineke ọgụ?

14 Olee ihe ga-eme mgbe Gọg nke Megọg malitechara ịlụso ndị Chineke ọgụ? Matiu na Mak dere ihe ga-eme. Ha sịrị: “[Nwa nke mmadụ] ga-ezipụ ndị mmụọ ozi, ha ga-esikwa n’akụkụ anọ nke ụwa chịkọta ndị ọ họọrọ, site na nsọtụ ụwa ruo na nsọtụ eluigwe.” (Mak 13:27; Mat. 24:31) Nchịkọta a abụghị mgbe a kara ndị e tere mmanụ akara mbụ, ọ bụghịkwa mgbe a ga-aka ndị fọrọ n’ime ha akara ikpeazụ. (Mat. 13:37, 38) A ga-aka ha akara ikpeazụ tupu oké mkpagbu ahụ amalite. (Mkpu. 7:1-4) Gịnịkwanụ bụ nchịkọta a Jizọs kwuru okwu ya? Ọ bụ mgbe a ga-enye ndị fọrọ ná ndị e tere mmanụ ụgwọ ọrụ ha n’eluigwe. (1 Tesa. 4:15-17; Mkpu. 14:1) Ihe a ga-eme obere oge ka Gọg nke Megọg malitechara ịlụso ndị Chineke ọgụ. (Ezik. 38:11) Ihe ahụ Jizọs kwuru ga-emezuzi, ya bụ: “N’oge ahụ, ndị ezi omume ga-enwu gbaa dị ka anyanwụ n’alaeze nke Nna ha.”Mat. 13:43. *

15 Ihe a na-ekwu ebe a ọ̀ bụ ihe ọtụtụ ndị na-akpọ “mweli ndị nsọ”? Ọtụtụ ndị Krisendọm kweere na a ga-esi n’ụwa welie Ndị Kraịst, ha eburu ahụ́ ha gaa eluigwe. Ha chekwara na ha ga-eji anya nkịtị hụ Jizọs mgbe ọ ga-abịa ịchị ụwa. Ma, Baịbụl mere ka o doo anya na a ga-ahụ “ihe ịrịba ama nke Nwa nke mmadụ” n’eluigwe nakwa na Jizọs ga-abịa “n’ígwé ojii nke eluigwe.” (Mat. 24:30) Ihe a Baịbụl kwuru gosiri na a gaghị eji anya nkịtị ahụ ya. Ihe ọzọ bụ na  “anụ ahụ́ na ọbara apụghị iketa alaeze Chineke.” N’ihi ya, tupu a kpọga ndị e tere mmanụ eluigwe, a ‘ga-agbanwe ha, n’ime ntakịrị oge, n’otu ntabi anya, n’oge a ga-afụ opi ikpeazụ.’ * (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 15:50-53.) Ya mere, anyị anaghị ekwu banyere ihe ahụ na-ezighị ezi Krisendọm na-akụzi. Ma, a ga-achịkọta ndị e tere mmanụ fọrọ n’ụwa n’otu ntabi anya.

16, 17. Olee ihe ga-emerịrị tupu Nwa Atụrụ ahụ alụọ nwaanyị ọhụrụ?

16 Ozugbo ndị niile e tere mmanụ gachara eluigwe, a ga-amalite nkwadebe ikpeazụ maka ọlụlụ nwunye nke Nwa Atụrụ ahụ. (Mkpu. 19:9) Ma, e nwere ihe ga-eme tupu oge obi ụtọ ahụ. Cheta na obere oge tupu a kpọga ndị e tere mmanụ fọrọ n’ụwa eluigwe, Gọg ga-alụso ndị Chineke ọgụ. (Ezik. 38:16) Gịnị ka ndị Chineke ga-eme? N’ụwa, ọ ga-adị ka e nweghị onye ga-echebe ha. Ha ga-eme ihe a gwara ndị Izrel n’oge Eze Jehọshafat. A sịrị ha: “Unu agaghị alụ ọgụ na nke ugbu a. Nọrọnụ ebe unu kwesịrị ịnọ, guzoronụ otu ebe hụ otú Jehova ga-esi zọpụta unu. Juda na Jeruselem, unu atụla egwu, unu atụkwala ụjọ.” (2 Ihe 20:17) Ma, ihe a ga-eme n’eluigwe ga-adị nnọọ iche. Mgbe Mkpughe 17:14 na-ekwu banyere oge ndị niile e tere mmanụ ga-anọ n’eluigwe, ọ gwara anyị banyere ndị iro ndị Chineke, sị: “Ndị a ga-ebuso Nwa Atụrụ ahụ agha, ma Nwa Atụrụ ahụ ga-emeri ha, n’ihi na ọ bụ Onyenwenụ kasị ndị nwenụ niile na Eze nke ndị eze. Ndị so ya ga-emerikwa ha, ya bụ, ndị a kpọrọ, ndị a họọrọ, ndị kwesịkwara ntụkwasị obi.” Jizọs na otu narị puku na iri puku anọ na puku anọ ha na ya ga-achị n’eluigwe ga-abịa napụta ndị Chineke nọ n’ụwa.

17 Nnapụta ahụ ga-emezi ka agha Amagedọn malite. Agha ahụ ga-emekwa ka e too aha nsọ Jehova. (Mkpu. 16:16) N’oge ahụ, ndị niile yiri ewu “ga-anwụ ọnwụ ebighị ebi.” Ihe ọjọọ ọ bụla agaghịzi adị n’ụwa. Chineke ga-echebekwa oké ìgwè mmadụ n’Amagedọn, bụ́ ihe ikpeazụ ga-eme n’oké mkpagbu ahụ. Mgbe ihe niile a mechara, Nwa Atụrụ ahụ ga-alụzi nwaanyị ọhụrụ. Ọ bụ ihe ikpeazụ a kọrọ ná Mkpughe. (Mkpu. 21:1-4) * Ndị niile nọ n’ụwa mgbe ahụ ga-abụ ndị na-eme uche Chineke na ndị ọ hụrụ n’anya. Ọ ga-emekwara ha ọtụtụ ihe ọma. Ọ ga-abụ nnukwu oriri alụmdi na nwunye. Ànyị na-atụsi anya oge ahụ ike?—Gụọ 2 Pita 3:13.

18. N’ihi ihe ọma niile ga-eme n’oge na-adịghị anya, gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ịna-eme?

18 N’ihi ihe ọma niile ga-eme n’oge na-adịghị anya, olee ihe onye ọ bula n’ime anyị kwesịrị ịna-eme ugbu a? Pita onyeozi si n’ike mmụọ nsọ dee, sị: “Ebe a ga-esi otú a gbazee ihe ndị a niile, chebaranụ ụdị mmadụ unu kwesịrị ịbụ echiche n’ihe banyere àgwà dị nsọ na omume ịsọpụrụ Chineke, na-echere ma na-eburu ọbịbịa nke ụbọchị Jehova n’uche . . . Ya mere, ndị m hụrụ n’anya, ebe unu na-echere ihe ndị a, gbalịsienụ ike ka o wee hụ unu n’ikpeazụ dị ka ndị na-enweghị ntụpọ na ndị na-enweghị mmerụ na ndị nọ n’udo.” (2 Pita 3:11, 12, 14) N’ihi ya, ka anyị niile kpebisie ike ịna-efe naanị Jehova n’etinyeghị aka n’okpukpe ụgha, na-akwadokwa Jizọs, bụ́ Eze Udo.

^ para. 2 Gụọ Ụlọ Nche Eprel 15, 2012, peeji nke 25-26.

^ para. 15 Ndị e tere mmanụ nọ ndụ n’ụwa mgbe ahụ agaghị ebu ahụ́ ha gaa eluigwe. (1 Kọr. 15:48, 49) O nwere ike ịbụ na a ga-ewepụ ahụ́ ha otú ahụ e si wepụ nke Jizọs.

^ para. 17 Abụ ọma nke 45 kọwara ihe ndị ga-ebu ibe ha ụzọ mee. Eze ahụ ga-ebu ụzọ lụọ agha. Ọ lụchaa, ya alụzie nwaanyị.