Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JULAỊ 2015

Jiri Obi Gị Niile Na-akwado Alaeze Chineke

Jiri Obi Gị Niile Na-akwado Alaeze Chineke

“Ha abụghị nke ụwa.”—JỌN 17:16.

ABỤ: 63, 129

1, 2. (a) Gịnị mere Ndị Kraịst ji eji obi ha niile akwado Chineke? Olee otú o si gbasa etinyeghị aka n’esemokwu ụwa a? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Olee ụfọdụ ihe ndị mmadụ na-eji obi ha niile akwado? Gịnị ka ọ na-akpata?

NDỊ ohu Jehova anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ n’agha. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na anyị hụrụ Jehova n’anya, jiri obi anyị niile na-akwado ya ma na-erubere ya isi. (1 Jọn 5:3) Anyị na-edebe iwu Chineke n’agbanyeghị ebe anyị bi, agbụrụ anyị, obodo anyị, na omenala ndị obodo anyị. Anyị na-eji obi anyị niile akwado Jehova na Alaeze ya karịa ihe ọ bụla ọzọ. (Mat. 6:33) Ime otú ahụ pụtara na anyị agaghị etinye aka n’agha ma ọ bụ n’esemokwu ụwa a.—Aịza. 2:4; gụọ Jọn 17:11, 15, 16.

2 Ọtụtụ ndị n’ụwa na-eji obi ha niile akwado obodo ha, agbụrụ ha, omenala ha ma ọ bụdị òtù egwuregwu obodo ha. O meela ka ndị mmadụ na-ama ibe ha aka, na-akpọ ibe ha asị ma na-egbu ibe ha mgbe ụfọdụ. N’agbanyeghị na anyị anaghị eso eme ihe ndị a, ha nwere ike ịkpatara anyị na ndị ezinụlọ anyị nsogbu, meekwa ka anyị taa ezigbo ahụhụ oge ụfọdụ.  Otú Chineke si kee anyị mere ka anyị na-ama ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi. N’ihi ya, ezigbo iwe nwere ike iwe anyị ma ọ bụrụ na ndị ọchịchị emee ihe na-adịghị mma. (Jen. 1:27; Diut. 32:4) Olee otú obi na-adị gị ma ụdị ihe a mee? Ma ị kpachapụghị anya, i nwere ike ịdụnyere otu ndị úkwù ma tinye aka n’esemokwu ha.

3, 4. (a) Gịnị mere Ndị Kraịst anaghị etinye aka n’esemokwu ụwa a? (b) Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu a?

3 E nwee esemokwu, ọtụtụ ndị na-adụnyere otu ndị úkwù n’ihi na ndị ọchịchị gwara ha na ọ bụ ihe ezigbo nwa amaala kwesịrị ime. Ezigbo Ndị Kraịst anaghị eme otú ahụ. Anyị anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, anyị anaghịkwa aga agha. (Mat. 26:52) Anyị anaghị ekwe ka a ghọgbuo anyị ka anyị chewe na e nwere òtù ka ibe ya mma n’ụwa Setan a. (2 Kọr. 2:11) Anyị achọghị ka e nwee ihe ọ bụla jikọrọ anyị na esemokwu ụwa a.—Gụọ Jọn 15:18, 19.

4 Ma ezughị okè nwere ike ime ka ọ na-esiri ụfọdụ n’ime anyị ike ịkwụsị ịkpọ ndị si ebe ọzọ asị. (Jere. 17:9; Efe. 4:22-24) N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru ga-enyere anyị aka imeri ụdị àgwà ahụ. Anyị ga-atụlekwa otú anyị ga-esi zụọ uche anyị na akọnuche anyị ịna-akwado Alaeze Chineke.

IHE MERE NA ANYỊ ANAGHỊ ETINYE AKA N’ESEMOKWU ỤWA A

5, 6. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, olee otú o si lee ndị si ebe dị iche iche anya? N’ihi gịnị?

5 Ihe mee, ya abụrụ na ihe i kwesịrị ime edochaghị gị anya, i kwesịrị ịjụ onwe gị, sị: ‘Gịnị ka Jizọs gaara eme?’ N’obodo ebe Jizọs biri mgbe ọ nọ n’ụwa, e nwere ndị si ebe dị iche iche, ma Judia ma Galili ma Sameria ma ebe ndị ọzọ. Baịbụl gosiri na e nwere ihe na-esere ndị si n’obodo ndị ahụ okwu. (Jọn 4:9) Ndị Farisii na ndị Sadusii anaghị eji anya ahụ ibe ha. (Ọrụ 23:6-9) Ọtụtụ ndị kpọrọ ndị ọnaụtụ asị. (Mat. 9:11) Ndị gara ụlọ akwụkwọ ndị rabaị chere na ha ka ndị na-agaghị mma. (Jọn 7:49) N’oge ndịozi Jizọs, ndị Juu anaghị achọ iji anya ahụ ndị Rom na-achị ha. N’agbanyeghị na Jizọs kụziri eziokwu mgbe niile, kwuokwa na nzọpụta bidoro n’ebe ndị Juu nọ, o nweghị mgbe ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya na ha ka ndị ọzọ mma. (Jọn 4:22) Kama, ọ gwara ha ka ha hụ mmadụ niile n’anya.—Luk 10:27.

6 Gịnị mere Jizọs akwadoghị na ndị Juu ka ndị ọzọ mma? Ọ bụ n’ihi na ya na Nna ya anaghị etinye aka n’esemokwu ụwa a. Mgbe Jehova si n’aka Ọkpara ya kee nwoke mbụ na nwaanyị mbụ, ọ chọrọ ka ha mụjuo ụwa. (Jen. 1:27, 28) Chineke kere ndị mmadụ ka ha nwee ike ịmụta agbụrụ dị iche iche. Jehova na Jizọs anaghị ewere na e nwere agbụrụ, mba, ma ọ bụ asụsụ ka ibe ya. (Ọrụ 10:34, 35; Mkpu. 7:9, 13, 14) Anyị kwesịrị ịna-eṅomi àgwà ọma ha.—Mat. 5:43-48.

7, 8. (a) Olee onye Ndị Kraịst kwesịrị ịna-akwado, maka gịnị? (b) Gịnị ka Ndị Kraịst kwesịrị icheta n’ihe gbasara iwepụ nsogbu ụmụ mmadụ?

7 Gịnị mere anyị anaghị akwado onye ọchịchị ọ bụla ma ọ bụ ọchịchị ụmụ mmadụ? Ọ bụ n’ihi na anyị na-akwado Jehova. Ọ bụ ya na-achị anyị. N’ogige Iden, Setan kwuru na ọ bụghị ọchịchị Jehova ga-akacha abara ụmụ mmadụ uru. Ọ chọrọ ka ndị mmadụ kweta na otú o si eme ihe ka otú Chineke si eme ihe mma. Jehova chọrọ ka anyị jiri aka anyị kpebie onye anyị ga-akwado. Gịnwa kwanụ? Ị̀ na-erubere Jehova isi n’ihi na i kwetara na otú o si eme ihe ka nke gị mma? Obi  ò siri gị ike na ọ bụ naanị Alaeze ya ga-ewepụ ahụhụ niile ndị mmadụ na-ata? Ka ì chere na ndị mmadụ ga-achịli onwe ha nke ọma ma ọ bụrụ na Chineke enyeghịrị ha aka?—Jen. 3:4, 5.

8 Ihe ị zara n’ajụjụ ndị a ga-egosi ihe ị ga-ekwu ma a jụọ gị ihe i chere banyere òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ ndị na-agbalị ka a gbanwee ọchịchị. Ọ dịla anya òtù dị iche iche na-agba mbọ ka e wepụ nsogbu ndị na-eme ka mba dị iche iche ghara ịdị n’otu. Ha nwere ike iji obi ha niile na-agbalị inyere ndị mmadụ aka. Ma, Ndị Kraịst ma na ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-ewepụ nsogbu ụmụ mmadụ, meekwa ka ihe ọma ruo onye ọ bụla aka. Anyị kwesịrị ịhapụrụ ya Jehova. A sị ka e kwuwe, ọ bụrụ na onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ na-eme ihe dị ya mma, ọ̀ bụ na nkewa agaghị adị n’ọgbakọ?

9. Olee nsogbu e nwere n’ọgbakọ Kọrịnt n’oge ndịozi? Gịnị ka Pọl gwara ha iji dozie nsogbu ahụ?

9 Ka anyị tụlegodị ihe mere n’oge ndịozi Jizọs. E nwere ihe chọrọ ịkpata esemokwu n’ọgbakọ n’oge ahụ. Ụmụnna nọ na Kọrịnt nọ na-asị: “‘Abụ m nke Pọl,’ ‘Ma abụ m nke Apọlọs,’ ‘Ma abụ m nke Sifas,’ ‘Ma abụ m nke Kraịst.’” N’agbanyeghị ihe na-esere ha okwu, ihe ahụ ha nọ na-ekwu were Pọl onyeozi iwe. Ọ dịzi ka e kewara Kraịst ekewa. Gịnị ka Pọl gwara ha iji dozie esemokwu ahụ? Ọ sịrị ha: “M na-agba unu ume, ụmụnna m, site n’aha Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, ka unu niile na-ekwu otu ihe, ka nkewa gharakwa ịdị n’etiti unu, kama ka unu dị n’otu n’ụzọ kwesịrị ekwesị n’otu obi na n’otu echiche.” Otú ahụ ka ọ dịkwa taa. Nkewa ọ bụla ekwesịghị ịdị n’ọgbakọ Ndị Kraịst.—1 Kọr. 1:10-13; gụọ Ndị Rom 16:17, 18.

10. Olee ihe Pọl onyeozi ji kọwaa ihe mere na Onye Kraịst ekwesịghị itinye aka n’esemokwu ụwa a?

10 Pọl chetaara Ndị Kraịst e tere mmanụ na ha bụ ụmụ amaala eluigwe, na ha ekwesịghị ịtụkwasị uche ha n’ihe ndị dị n’ụwa. (Fil. 3:17-20) * Ndị e tere mmanụ na-anọchite anya Kraịst. Ndị na-anọchite anya obodo ha n’obodo ọzọ anaghị etinye aka n’esemokwu ọ bụla obodo ahụ nwere ma ọ bụ n’ihe gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ọ bụ naanị obodo ha ka ha na-eji obi ha niile akwado. (2 Kọr. 5:20) Ndị nwere olileanya ibi n’ụwa na-akwadokwa naanị Alaeze Chineke. N’ihi ya, ha ekwesịghị ịna-etinye aka n’esemokwu ụwa a.

NA-AZỤ ONWE GỊ ỊNA-AKWADO ALAEZE JEHOVA

11, 12. (a) Olee ụdị ihe nwere ike ime ka o siere Onye Kraịst ike iji obi ya niile na-akwado Alaeze Chineke? (b) Olee nsogbu otu nwanna nwaanyị nwere? Gịnị nyeere ya aka ịgbanwe echiche ya?

11 N’ọtụtụ ebe n’ụwa, ndị ndị mmadụ na-ahụkarị n’anya bụ ndị obodo ha, ndị ha na ha na-asụ otu asụsụ, nakwa ndị ha na ha nwere otu omenala. Ha na-ejikwa ebe ha si etu ọnụ. Ma, Ndị Kraịst ekwesịghị ịna-eme otú ahụ. Anyị kwesịrị ịzụ uche anyị na akọnuche anyị ka anyị ghara ịna-etinye aka n’ihe ọ bụla na-esere òtù ọ bụla ma ọ bụ agbụrụ ọ bụla okwu. Olee otú anyị ga-esi eme ya?

12 Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Mata * si n’ebe a na-akpọbu Yugoslavia. Ndị obodo ha kpọrọ ndị Sebia asị. Ọ mụtara na Jehova anaghị ele mmadụ anya n’ihu nakwa na ọ bụ Setan chọrọ  ka ndị mmadụ na-akpọ ibe ha asị. N’ihi ya, ọ gbalịsiri ike ịgbanwe otú o si ele ndị agbụrụ ọzọ anya. Ma, mgbe agbụrụ dị iche iche malitere ịlụso ibe ha ọgụ n’ebe ha bi, Mata malitekwara ile ndị Sebia anya ọjọọ. Ọ chọghịzi ịna-ezi ha ozi ọma. Ọ ma na ihe a ọ na-eme adịghị mma. Ma, ọ ghọtara na ya agaghị afanye aka n’ụkwụ na-eche ka echiche ọjọọ ahụ pụọ ya n’obi. Ọ rịọrọ Jehova ka o nyere ya aka imeri nsogbu ahụ nakwa ka o wepụtakwuo oge na-aga ozi ọma ka o nwee ike ịbụ ọsụ ụzọ oge niile. Ọ sịrị: “Achọpụtala m na ihe kacha nyere m aka bụ iji obi m niile na-ekwusa ozi ọma. N’ozi ọma, m na-agbalị iṅomi ịhụnanya Jehova. Ime otú ahụ emeela ka m kwụsị ịkpọ ndị agbụrụ ọzọ asị.”

13. (a) Gịnị mere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Zola? Gịnịkwa ka o mere? (b) Olee ihe anyị kwesịrị ịmụta n’aka nwanna nwaanyị a?

13 Onye ọzọ anyị ga-atụle ihe banyere ya bụ otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Zola, bụ́ onye Meksiko. O bi na Yurop ugbu a, ma ụfọdụ ụmụnna nọ n’ọgbakọ ha si n’obodo ndị ọzọ. O kwuru na ụfọdụ n’ime ha na-achị ya ọchị maka obodo o si, omenala ha, na egwú ha. Ọ bụrụ gị, gịnị ka ị ga-eme? Ihe ụmụnna ndị ahụ na-ekwu were Zola iwe, ma ọ rịọrọ Jehova ka o nyere ya aka ka ọ ghara ịkpọ ha asị. Ọ ka na-esiri ụfọdụ ụmụnna anyị ike iwetu obi mgbe e kwuru ihe na-adịghị mma banyere obodo ha. Anyị ekwesịghị ịna-ekwu ma ọ bụ na-eme ihe ga-eme ka o yie ka è nwere agbụrụ ka ibe ya mma. Anyị ekwesịghịkwa ime ihe ga-akpata nkewa n’ọgbakọ ma ọ bụ n’ebe ọzọ.—Rom 14:19; 2 Kọr. 6:3.

14. Olee otú Ndị Kraịst ga-esi zụọ uche ha na akọnuche ha ka ha nwee ike ịna-ele ndị mmadụ anya otú Jehova si ele ha?

14 Anyị niile ma na ndị na-efe Jehova dị n’otu. N’ihi ya, anyị ekwesịghị iche na e nwere agbụrụ ma ọ bụ obodo ka ibe ya mma. Ma, o nwere ike ịbụ na ezinụlọ unu ma ọ bụ ebe i toro emeela ka ị hụ obodo unu n’anya. Ụdị ihe ahụ nwere ike ime ka i ledawa ndị ọzọ anya n’ihi ebe ha si, omenala ha, asụsụ ha, ma ọ bụ agbụrụ ha. Olee ihe ga-enyere gị aka ịgbanwe? Tụgharịa uche n’otú Jehova si ele ndị obodo ha na-ebu isi anya ma ọ bụ ndị chere na ha ka ndị ọzọ mma. Mekwuo nchọnchọ banyere ya n’ofufe ezinụlọ unu ma ọ bụ mgbe naanị gị na-amụ ihe. Rịọzie Jehova ka o nyere gị aka ịna-ele ndị mmadụ anya otú o si ele ha.—Gụọ Ndị Rom 12:2.

Iji obi anyị niile na-akwado Jehova pụtara na anyị ga na-erubere ya isi n’agbanyeghị ihe ndị ọzọ nwere ike ime anyị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15 na nke 16)

15, 16. (a) Gịnị ka ụfọdụ ndị ga-eme n’ihi na anyị ji obi anyị niile akwado Alaeze Chineke? (b) Olee otú ndị nne na nna ga-esi nyere ụmụ ha aka iji obi ha niile na-akwado Jehova?

15 Anyị chọrọ iji ezigbo akọnuche na-efe Jehova. N’ihi ya, mgbe ụfọdụ, anyị ga-eme ihe gosiri na anyị dị iche n’ebe ndị ọzọ nọ, ya bụ, ụmụ akwụkwọ ibe anyị, ndị agbata obi anyị ma ọ bụ ndị ikwu anyị. (1 Pita 2:19) Jizọs kwuru na ndị ọzọ ga-akpọ anyị asị n’ihi na anyị dị iche. Cheta na ọtụtụ n’ime ndị na-emegide anyị amaghị banyere Alaeze Chineke. N’ihi ya, ha aghọtaghị ihe mere anyị ji jiri obi anyị niile na-akwado Alaeze Chineke kama ịna-akwado ọchịchị ụmụ mmadụ.

16 Iji obi anyị niile na-akwado Jehova pụtara na anyị ga na-erubere ya isi n’agbanyeghị ihe ndị ọzọ nwere ike ime anyị ma ọ bụ gwa anyị. (Dan. 3:16-18) Ọ bụ eziokwu na onye ọ bụla nwere ike ịtụ egwu mmadụ, ma o nwere ike ịkacha siere ndị na-eto eto ike ime ihe dị iche n’ihe ndị ọzọ na-eme. Ndị nne na nna, nyerenụ ụmụ unu aka inwe obi ike n’ụlọ akwụkwọ. Ụjọ nwere ike ịna-atụ ụmụ gị ịjụ igbupụrụ ọkọlọtọ ma ọ bụ iso mee ihe  ndị ọzọ e ji eto mba. N’oge ofufe ezinụlọ, unu nwere ike ịtụle otú Jehova si ele ihe ndị ahụ anya. Kụziere ha otú ha ga-esi wetuo obi kọwaara ndị ọzọ ihe ha kweere. (Rom 1:16) Otú ọzọ i nwere ike isi nyere ụmụ gị aka bụ ịgakwuru ndị nkụzi ha ma kọwaara ha ihe anyị kweere.

JIRI IHE NIILE JEHOVA KERE KPỌRỌ IHE

17. Gịnị ka anyị na-ekwesịghị ịna-ekwu? Maka gịnị?

17 O doro anya na otú obodo anyị dị, omenala anyị, asụsụ anyị, na nri ndị obodo anyị na-atọ anyị ụtọ. Ma, anyị ekwesịghị ịna-ekwu na ọ bụ nke anyị kacha mma. Jehova kere ọtụtụ ihe ka ha dị iche iche n’ihi na ọ chọrọ ka anyị na-enwe obi ụtọ. (Ọma 104:24; Mkpu. 4:11) N’ihi ya, gịnị mere mmadụ ga-eji na-esi ọnwụ na otú otu obodo si eme ihe ka nke ndị ọzọ mma?

18. Gịnị mere o ji dị mma ka anyị na-ele ndị ọzọ anya otú Jehova si ele ha?

18 Chineke chọrọ ka ụdị mmadụ niile mụta eziokwu banyere ya, fee ya, ma dị ndụ ebighị ebi. (Jọn 3:16; 1 Tim. 2:3, 4) N’ihi ya, mgbe ụmụnna anyị kwuru ihe dị iche n’ihe anyị chere, anyị na-ege ha ntị, ma ọ bụrụhaala na ihe ha kwuru emegideghị iwu Jehova. Anyị mee otú ahụ, obi ga na-adị anyị ụtọ, anyị na ụmụnna anyị adịrị n’otu. E kwesịghị inwe òtù dị iche iche na ndị na-akwado ha n’ọgbakọ. Anyị na-ekele Jehova maka na ọ napụtara anyị n’ihe dị iche iche na-agba ndị mmadụ ara n’ụwa Setan, ya bụ, nkewa, mpako, na ịsọ mpi. Ka anyị kpebisie ike ka anyị na ụmụnna anyị na-adị n’udo otú ahụ otu ọbụ abụ kwuru. Ọ sịrị: “Lee ka o si dị mma, bụrụkwa ihe na-enye obi ụtọ mgbe ụmụnne bikọtara ọnụ n’ịdị n’otu!”—Ọma 133:1.

^ para. 10 Ọ bụ ndị Rom na-achị Filipaị n’oge ndịozi. O yikwara ka ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ Filipaị bụ ụmụ amaala Rom, nke mere ka ha nwee ụfọdụ ikike ụmụnna ndị ọzọ na-enweghị.

^ para. 12 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.