Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JULAỊ 2015

Ihe dị n’Ụlọ Nche a bụ isiokwu ndị a ga-amụ malite n’Ọgọst 31 ruo Septemba 27, 2015.

Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha na Rọshịa

Gụọ banyere ndị lụrụ di na nwunye na ndị nke na-alụbeghị kwagara Rọshịa ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu. Ha mụtara ịna-atụkwasịkwu Jehova obi.

Na-eme Ka Paradaịs Ime Mmụọ Makwuo Mma

Paradaịs ime mmụọ na ụlọ nsọ ihe atụ hà bụ otu ihe? Olee “paradaịs” Pọl hụrụ “n’eluigwe nke atọ”?

Ijere Jehova Ozi ‘n’Oge Ọdachi’

Olee otú ị ga-esi na-eme ka okwukwe gị sie ike, gị ana-ejesikwa ozi Jehova ike? Tụlee banyere ndị mere agadi n’oge ochie, bụ́ ndị ji obi ụtọ jeere Chineke ozi.

“Nnapụta Unu Na-eru Nso”

Olee ozi ndị ohu Chineke ga-ekwusa mgbe oké mkpagbu ahụ malitechara? Gịnị ka a ga-eme ndị e tere mmanụ n’oge ahụ?

È Nwere Ihe O Mere ma Ọ Bụrụ na E Nweghị Onye Na-ahụ Ihe Ị Na-arụ?

Ihe Bezalel na Oholiab mere ga-enyere anyị aka ịghọta na Jehova na-ahụ ihe anyị na-arụ, ọ bụrụgodị na o yiri ka onye ọzọ ahụghị ya.

Jiri Obi Gị Niile Na-akwado Alaeze Chineke

Olee otú Ndị Kraịst ga-esi zụọ onwe ha ịkwado Jehova na Alaeze ya?

Ebe A Ka Anyị Na-anọ Efe Jehova

Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị na-akwanyere ebe anyị na-anọ efe Jehova ùgwù? Ebee ka e si enweta ego e ji arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze na nke e ji arụzi ya?

Ị̀ Maara?

Baịbụl kwuru na e nwere ebe ndị bụ́ oké ọhịa n’Ala Nkwa ahụ. Ihe a ọ̀ bụ eziokwu ebe ọ bụ na oké ọhịa adịghịzi n’ebe ndị ahụ taa?