Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JUN 2015

Na-eme Ihe E Kwuru n’Ekpere Onyenwe Anyị—Nke Abụọ

Na-eme Ihe E Kwuru n’Ekpere Onyenwe Anyị—Nke Abụọ

“Nna unu maara ihe ndị na-akpa unu.”—MAT. 6:8.

1-3. Gịnị mere obi ji sie otu nwanna nwaanyị ike na Jehova ma mkpa ya?

OTU nwanna nwaanyị aha ya bụ Lana agaghị echefu ihe mere otu ụbọchị mgbe ọ gara Jamanị n’afọ 2012. Obi siri ya ike na Jehova zara ekpere abụọ o kpere. O kpere nke mbụ mgbe ọ nọ n’ụgbọ okporo ígwè na-aga n’ọdụ ụgbọelu. Ọ rịọrọ Jehova ka o nyere ya aka ịhụ onye ọ ga-ezi ozi ọma. O kpere nke abụọ mgbe o rutere n’ọdụ ụgbọelu chọpụta na ọ bụzi n’echi ya ka ụgbọelu ha ga-efepụ. Lana rịọrọ Jehova ka o nyere ya aka n’ihi na ego o ji fọrọ obere, o nweghịkwa ebe ọ ga-ehi.

2 Ozugbo Lana kpechara ekpere ahụ, ọ nụrụ ka otu onye sịrị ya: “Bịa, Lana, ị̀ na-eme gịnị ebe a?” Onye jụrụ ya ihe ahụ bụ nwa okorobịa ya na ya gakọrọ akwụkwọ. Nwa okorobịa ahụ na nne ya bụ́ Elke na nne nne ya nọ. Ha dupụtara ya ka ọ baa ụgbọelu na-aga Saụt Afrịka. Lana kọọrọ ha nsogbu ya, ụmụ nwaanyị abụọ ahụ agwa ya ka ọ bịa hie n’ụlọ ha. Ha lere ya ọbịa nke ọma, jụọkwa ya ajụjụ banyere ihe ndị o kweere na otú o si jiri oge ya niile na-ekwusa ozi ọma.

 3 Mgbe ha richara nri n’ụtụtụ echi ya, Lana ji Baịbụl zaa ajụjụ ndị ọzọ ha jụrụ ya, natakwa ha adres ha na ihe ndị ọzọ a ga-eji nweta ha ka onye ọzọ nwee ike ịbịa mụwara ha ihe. Lana laruru n’udo, na-asụkwa ụzọ oge niile. O doro ya anya na ọ bụ Jehova, bụ́ “Onye na-anụ ekpere,” mere ka ihe niile gaara ya nke ọma.—Ọma 65:2.

4. Olee ihe ndị anyị ga-atụle?

4 Ọ bụrụ na nsogbu abịara anyị, o nwere ike ọ gaghị esiri anyị ike ịrịọ Jehova ka o nyere anyị aka. Obi na-adịkwa ya ụtọ ma anyị kpegara ya ekpere. (Ọma 34:15; Ilu 15:8) Ma, anyị tụgharịa uche n’ekpere ahụ Jizọs kụziri, anyị nwere ike ịchọpụta na e nwere ihe ndị ọzọ ka mkpa anyị na-eleghara anya. Dị ka ihe atụ, ọ ga-adị mma ka anyị tụlee otú ihe atọ ikpeazụ Jizọs kwuru n’ekpere ahụ si gosi ihe anyị ga-eme ka anyị na Jehova dịkwuo ná mma. Anyị ga-atụlekwa ihe ọzọ anyị ga-eme iji gosi na otú anyị si ebi ndụ dabara adaba n’ihe nke anọ Jizọs kwuru n’ekpere ahụ gbasara inye anyị nri ụbọchị.—Gụọ Matiu 6:11-13.

“NYE ANYỊ NRI TAA MAKA ỤBỌCHỊ TAA”

5, 6. Ọ bụrụgodị na anyị nwere nri ga-ezuru anyị, gịnị mere anyị ji kwesị ịna-ekpe ekpere maka nri ụbọchị anyị?

5 Ihe Jizọs kwuru abụghị ka anyị na-arịọ Jehova “nye m nri taa,” kama ọ bụ ka o “nye anyị nri taa.” Otu onye nlekọta sekit n’Afrịka aha ya bụ Victor kwuru, sị: “M na-eji obi m niile ekele Jehova maka na mụ na nwunye m anaghị echegbu onwe anyị banyere ihe anyị ga-eri ma ọ bụ onye ga-akwụrụ anyị ụgwọ ebe anyị ga-ehi. Ụmụnna anyị ji obiọma elekọta anyị kwa ụbọchị. Ma, m na-arịọ Jehova ka ọ na-enyere ụmụnna ndị ahụ aka ịna-enweta ihe ha ga-eji na-egbo mkpa ha.”

6 Ọ bụrụ na anyị nwere nri ga-ezuru anyị ọtụtụ ụbọchị, anyị kwesịrị ịna-echeta ụmụnna ndị dara ogbenye ma ọ bụ ndị bi n’ebe e nwere ọdachi. Ihe anyị kwesịrị ime abụghị naanị icheta ụmụnna anyị n’ekpere, kama anyị kwesịrị ịna-enyere ha aka. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike inye ha ihe anyị nwere. Anyị nwekwara ike ịna-etinye ego n’igbe onyinye, ebe anyị ma na a na-eji ya eme ihe bara uru.—1 Jọn 3:17.

7. Olee otú Jizọs si kụzie na anyị ekwesịghị ‘ịna-echegbu onwe anyị maka echi’?

7 Mgbe Jizọs kwuru banyere nri ụbọchị anyị, o nwere ike ịbụ na ọ na-ekwu banyere mkpa anyị ugbu a. Ọ bụ ya mere o ji sị: “Ọ bụrụ na Chineke na-eyiwe ahịhịa ndụ dị n’ubi uwe, . . . ọ̀ bụ na ọ gaghị eyiwe unu uwe karị, unu ndị okwukwe nta? Ya mere, unu echegbula onwe unu mgbe ọ bụla, sị, . . . ‘Gịnị ka anyị ga-eyi?’” Ihe o ji mechie okwu ya bụ ndụmọdụ dị mkpa o nyeburu, ya bụ, “Unu echegbula onwe unu mgbe ọ bụla maka echi.” (Mat. 6:30-34) Ihe a o kwuru gosiri na kama ịna-achụ akụnụba ọnwụ ọnwụ, afọ kwesịrị iju anyị ma ọ bụrụ na anyị nwere ihe ndị dị anyị mkpa kwa ụbọchị, ya bụ, ihe ndị dị ka ebe anyị ga-ebi, ọrụ anyị ga-eji na-egbo mkpa ezinụlọ anyị, na amamihe anyị ga-eji na-eme ihe anyị kwesịrị ime gbasara ahụ́ ike anyị. Ma, ọ bụrụ na anyị na-ekpe ekpere naanị maka ụdị mkpa ndị a, ọ ga-egosi na anyị na-echefu ihe ka mkpa. Ihe ndị ka mkpa anyị kwesịrị ịna-ekpe ekpere maka ha bụ ihe ndị ga-eme ka anyị na Chineke na-adị ná mma.

8. Gịnị ka ihe Jizọs kwuru banyere nri ụbọchị anyị kwesịrị ichetara anyị? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

8 Ihe Jizọs kwuru banyere nri ụbọchị anyị na-echetara anyị ihe ọzọ o kwuru. Ọ sịrị: “Ọ bụghị naanị achịcha ga-eme ka  mmadụ dị ndụ, kama ọ bụ okwu niile nke na-esi n’ọnụ Jehova pụta.” (Mat. 4:4) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-ekpe ekpere ka Jehova na-enye anyị ndụmọdụ n’oge kwesịrị ekwesị.

“GBAGHARA ANYỊ ỤGWỌ ANYỊ JI”

9. Olee otú mmehie anyị si bụrụ “ụgwọ anyị ji”?

9 Jizọs sịrị: “Gbaghara anyị ụgwọ anyị ji.” Ma n’oge ọzọ, ọ sịrị: “Gbaghara anyị mmehie anyị.” (Mat. 6:12; Luk 11:4) Ihe mere o ji kwuo otú ahụ bụ na mmehie anyị dị ka ụgwọ anyị ji. N’afọ 1951, Ụlọ Nche kọwara na ọ bụrụ na anyị emehie, e nwere ike ikwu na anyị ji Jehova ụgwọ. Anyị kwesịrị ịhụ Jehova n’anya ma na-erubere ya isi. N’ihi ya, mgbe anyị mehiere Chineke, ọ pụtara na anyị akwụghị ya ụgwọ anyị ji ya. Ụlọ Nche ahụ kwuru na a sị na Jehova chọrọ, ọ gaara ajụ anyị ka anyị gharazie ịbụ enyi ya. Ọ sịkwara na ime mmehie adịghị egosi na anyị hụrụ Chineke n’anya.—1 Jọn 5:3.

10. Gịnị mere Jehova ji agbaghara anyị mmehie anyị? Oleekwa otú obi kwesịrị ịdị anyị n’ihi ya?

10 Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Jehova ji Jizọs chụọ àjà iji gbaghara anyị mmehie anyị. Ọ dị mkpa ka Jehova na-agbaghara anyị kwa ụbọchị. Ọ fọrọ obere ka o ruo puku afọ abụọ Jizọs nwụrụ maka mmehie anyị, ma àjà ahụ ọ chụrụ baara anyị uru taa. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-ekele Jehova maka onyinye ahụ na-enweghị atụ. O nweghị onye n’ime anyị gaara akwụli ihe a ga-eji gbapụta anyị n’aka mmehie na ọnwụ. (Gụọ Abụ Ọma 49:7-9; 1 Pita 1:18, 19.) Ihe Jizọs kwuru n’ekpere ahụ, ya bụ, “gbaghara anyị mmehie anyị,” na-echetara anyị na ọ bụghị naanị anyị ka àjà ahụ Kraịst chụrụ baara uru, ọ bakwaara ụmụnna anyị. Jehova chọrọ ka anyị na-eche banyere ha na otú ha na ya ga-esi na-adị ná mma. Ọ pụtara na anyị ga na-agbaghara ha ma ha mehie anyị. Mmehie ndị ahụ na-abụkarị obere ihe ha mejọrọ anyị. Ma ọ bụrụ na anyị agbaghara ha, ọ ga-egosi na anyị hụrụ ha n’anya, gosikwa na obi dị anyị ụtọ na Chineke na-agbaghara anyị.—Kọl. 3:13.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ka Chineke na-agbaghara gị, na-agbaghara ndị ọzọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)

11. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-agbaghara ndị ọzọ?

11 Ezughị okè nwere ike ime mgbe ụfọdụ ka anyị buru iwe n’obi n’ihi ihe  nwanna mere anyị. (Lev. 19:18) Ọ bụrụ na anyị agwa ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ihe onye ahụ mere, ha nwere ike ịdụnyere anyị úkwù, ya akpata nkewa n’ọgbakọ. Ọ bụrụ na anyị ekwe ka ụdị ihe a mee, ọ ga-egosi na o nweghị ihe anyị ji obi ebere Chineke na àjà ahụ Kraịst chụrụ kpọrọ. Jehova agaghịkwa na-agbaghara anyị ma ọ bụrụ na anyị anaghị agbaghara ndị ọzọ. (Mat. 18:35) Ọ bụ ihe Jizọs kwuru ozugbo ọ kụzichara ekpere ahụ. (Gụọ Matiu 6:14, 15.) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke na-agbaghara anyị, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ka anyị ghara ịna-eme mmehie dị oké njọ. N’ihi ya, ka anyị leba anya n’ihe ọzọ Jizọs kwuru n’ekpere ahụ ọ kụziri.—1 Jọn 3:4, 6.

“EKWELA KA ANYỊ DABA N’ỌNWỤNWA”

12, 13. (a) Gịnị mere Jizọs obere oge e mechara ya baptizim? (b) Olee ihe mere na anyị ekwesịghị ịta ndị ọzọ ụta ma anyị kwe ka Ekwensu nwata anyị? (ch) Gịnị ka otú Jizọs si rubere Chineke isi ruo ọnwụ gosiri?

12 Jizọs kwukwara n’ekpere ahụ ọ kụziri, sị: “Ekwela ka anyị daba n’ọnwụnwa.” Ihe a o kwuru na-echetara anyị ihe mere obere oge e mechara ya baptizim. Mmụọ Chineke du Jizọs banye n’ala ịkpa. N’ihi gịnị? “Ka Ekwensu nwaa ya ọnwụnwa.” (Mat. 4:1; 6:13) Ò kwesịrị iju anyị anya? Ọ gaghị eju anyị anya ma ọ bụrụ na anyị aghọta ihe bụ́ isi sekpụ ntị mere Chineke ji zite Ọkpara ya n’ụwa. Ọ bụ iji zaa ajụjụ ndị e kwesịrị ịza n’ihi isi Adam na Iv nupụụrụ Chineke. Dị ka ihe atụ, ọ̀ pụtara na otú Chineke si kee mmadụ adịghị mma? Mmadụ zuru okè ò nwere ike irubere Chineke isi n’agbanyeghị ọnwụnwa si n’aka “ajọ onye ahụ”? Ihe ọ̀ ga-akara ụmụ mmadụ mma ma ọ bụrụ na ha ajụ ọchịchị Chineke otú ahụ Setan kwuru? (Jen. 3:4, 5) Ịza ajụjụ ndị ahụ ga-ewe oge. Ma, ọ ga-eme ka ndị niile nọ n’eluigwe na n’ụwa ghọta na otú Jehova si achị kacha mma.

13 Jehova dị nsọ. N’ihi ya, ọ naghị anwa onye ọ bụla. Kama, ọ bụ Ekwensu bụ “Onye Ọnwụnwa.” (Mat. 4:3) E nwere ọtụtụ ụzọ Ekwensu si anwa anyị. Ma, ọ bụ onye ọ bụla n’ime anyị ga-ekpebi ma ọ̀ ga-ekwe ka Setan nwata ya. (Gụọ Jems 1:13-15.) Mgbe Ekwensu nwara Jizọs, o kweghị ka ọ nwata ya, kama ọ gwara ya ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru. Jizọs si otú ahụ gosi na ọ bụ Chineke kwesịrị ịchị ihe niile o kere eke. Ma, ike agwụghị Setan. O cheere “ruo oge ọzọ ga-adaba adaba.” (Luk 4:13) Jizọs ekweghị ka Setan mee ka ọ kwụsị irubere Chineke isi. Kraịst gosiri na ọchịchị Jehova dị mma nakwa na mmadụ zuru okè ga-ejili obi ya niile fee Chineke n’agbanyeghị ọnwụnwa ndị siri ezigbo ike bịaara ya. Ma, Setan na-anwa ndị na-eso ụzọ Jizọs ọnwụnwa, ma gịnwa.

14. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ka Ekwensu ghara ịnwata anyị?

14 N’ihi ajụjụ ndị ahụ e kwesịrị ịza banyere ọchịchị Chineke, Jehova kwere ka Onye Ọnwụnwa ahụ jiri ụwa a na-anwa anyị. Ọ bụghị Chineke na-eme ka ọnwụnwa bịara anyị. Kama obi siri ya ike na anyị ga-erubere ya isi. Ọ chọkwara inyere anyị aka. Ma, ebe ọ bụ na Jehova kere anyị ka anyị jiri aka anyị na-ekpebi ihe anyị ga-eme, ọ naghị egbochi ọnwụnwa ịbịara anyị. Ihe abụọ anyị kwesịrị ime bụ ịmụrụ anya na ịna-ekpe ekpere mgbe niile. Olee otú Jehova si aza ekpere anyị?

Gbaa mbọ ka okwukwe gị sie ike nakwa ka ị na-anụ ọkụ n’obi n’ikwusa ozi ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)

15, 16. (a) Olee ụfọdụ ọnwụnwa anyị kwesịrị ịna-emeri? (b) Ònye ka e kwesịrị ịta ụta ma ọ bụrụ na anyị ekwe ka a nwata anyị?

15 Jehova na-enye anyị mmụọ nsọ ya, nke na-enye anyị ike ma na-enyere anyị aka imeri ọnwụnwa. Ọ na-ejikwa Okwu  ya na ọgbakọ ya adọ anyị aka ná ntị. Dị ka ihe atụ, ọ na-agwa anyị ka anyị kwụsị iji oge anyị, ego anyị, na ike anyị na-achụ ihe ndị na-adịchaghị mkpa. Otu nwanna aha ya bụ Espen na nwunye ya bụ́ Janne bi n’otu mba dị na Yurop. Ha bụ ndị ọsụ ụzọ oge niile ruo ọtụtụ afọ n’otu ebe e nwere mkpa ka ukwuu ná mba ahụ. Mgbe ha mụrụ nwa mbụ ha, ha kwụsịrị ịsụ ụzọ. Ha amụọkwala nke abụọ. Espen kwuru, sị: “Anyị na-ekpegara Jehova ekpere mgbe niile ka Ekwensu ghara ịnwata anyị ugbu a anyị selatara aka n’oge anyị ji ejere Jehova ozi. Anyị na-arịọ Jehova ka o nyere anyị aka ka okwukwe anyị sie ike nakwa ka anyị na-anụ ọkụ n’obi.”

16 Ọnwụnwa ọzọ Setan ji enweta ọtụtụ ndị taa bụ ile ndị gba ọtọ. Ọ bụrụ na anyị ekwe ka a nwata anyị, anyị ekwesịghị ịta Setan ụta. N’ihi gịnị? N’ihi na Setan na ụwa ya agaghị amanye anyị ime ihe ọ bụla anyị na-achọghị ime. Ụfọdụ ndị na-ele ndị gba ọtọ n’ihi na ha ewepụghị echiche ọjọọ n’obi ha. Ma, anyị ga-emerili ọnwụnwa a otú ahụ ọtụtụ ụmụnna anyị na-eme.—1 Kọr. 10:12, 13.

“NAPỤTA ANYỊ N’AKA AJỌ ONYE AHỤ”

17. (a) Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị chọrọ ka Jehova “napụta anyị n’aka ajọ onye ahụ”? (b) Olee otú Chineke ga-esi napụta anyị n’oge na-adịghị anya?

17 Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị chọrọ ka Jehova “napụta anyị n’aka ajọ onye ahụ”? Ọ bụ ịgbalịsi ike ka anyị ghara ‘ịbụ nke ụwa’ Setan. Anyị ekwesịghị ‘ịhụ ụwa ma ọ bụ ihe ndị dị n’ụwa n’anya.’ (Jọn 15:19; 1 Jọn 2:15-17) Ime otú ahụ adịghị mfe. Obi ga-eru anyị ala mgbe Jehova ga-anapụta anyị n’aka ajọ onye ahụ. Otú ọ ga-esi eme ya bụ ibibi Setan na ụwa ya. Ma, anyị kwesịrị icheta na mgbe a chụpụrụ Setan n’eluigwe, ọ ma na oge fọọrọ ya dị ntakịrị. O ji iwe na-eme ihe ọ bụla o nwere ike iji mee ka anyị nupụrụ Chineke isi. N’ihi ya, ka anyị na-ekpe ekpere ka Jehova napụta anyị n’aka ya.—Mkpu. 12:12, 17.

18. Gịnị ka anyị kwesịrị ịna-eme ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịhụ mgbe a ga-ebibi ụwa Setan?

18 Ị̀ chọrọ ibi n’ụwa mgbe Setan na-agaghịzi anọ? Ọ bụrụ otú ahụ, na-ekpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa, ka e doo aha Chineke nsọ, nakwa ka uche ya mee n’ụwa. Tụkwasị Jehova obi mgbe niile na ọ ga na-egboro gị mkpa gị, na-enyekwara gị aka ịna-erubere ya isi. Kpebisie ike ịna-eme ihe Jizọs kwuru n’ekpere ahụ ọ kụziri.