Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JUN 2015

Na-eme Ihe E Kwuru n’Ekpere Onyenwe Anyị—Nke Mbụ

Na-eme Ihe E Kwuru n’Ekpere Onyenwe Anyị—Nke Mbụ

“Ka e doo aha gị nsọ.”—MAT. 6:9.

1. Olee otú anyị nwere ike isi jiri ekpere ahụ Jizọs kụziri na Matiu 6:9-13 zie ndị mmadụ ozi ọma?

ỌTỤTỤ ndị bu Ekpere Onyenwe Anyị n’isi. N’ozi ụlọ n’ụlọ, anyị na-agwakarị ndị mmadụ banyere ekpere a iji nyere ha aka ịghọta na Alaeze Chineke bụ ọchịchị dị adị nke ga-eme ka ụwa bụrụ paradaịs. Anyị na-agwakwa ha banyere ihe mbụ Jizọs kwuru n’ekpere ahụ iji gosi ha na Chineke nwere aha e kwesịrị ido nsọ.—Mat. 6:9.

2. Olee otú anyị si mara na Jizọs achọghị ka anyị na-ekwughachi ihe ndị o kwuru n’Ekpere Onyenwe Anyị otú ahụ o si kwuo ha?

2 Jizọs ọ̀ chọrọ ka anyị na-ekwughachi ihe ndị o kwuru n’ekpere ahụ otú ahụ ọtụtụ ndị chọọchị na-eme? Mba. Tupu Jizọs akụzie ekpere a, ọ sịrị: “Mgbe ị na-ekpe ekpere, ekwughachila otu ihe ugboro ugboro.” (Mat. 6:7) N’oge ọzọ ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya otú ha ga-esi na-ekpe ekpere, o kwughachiri ihe ndị o kwuru n’ekpere ahụ, ma otú o si kwuo ha dị iche. (Luk 11:1-4) N’ihi ya, Jizọs ji ekpere ahụ kụziere anyị ụdị ihe anyị kwesịrị ịna-arịọ  Chineke nakwa nke anyị kwesịrị ibu ụzọ rịọ.

3. Olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ichebara echiche ka anyị na-atụle ekpere ahụ Jizọs kụziri?

3 N’isiokwu a nakwa na nke na-eso ya, anyị ga-atụle ihe Jizọs kwuru n’ekpere ahụ ọ kụziri. Ka anyị na-eme otú ahụ, jụọ onwe gị, sị: ‘Olee otú m ga-esi jiri ihe e kwuru n’ekpere a mee ka ekpere m ka mma?’ Ajụjụ kadị mkpa ị ga-ajụ onwe gị bụ, ‘M̀ na-eme ihe Jizọs kwuru n’ekpere ahụ ọ kụziri?’

“NNA ANYỊ NKE BI N’ELUIGWE”

4. Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “Nna anyị” na-echetara anyị? Oleekwa otú Jehova si bụrụ Nna anyị?

4 Ihe mbụ Jizọs kwuru n’ekpere ahụ bụ “Nna anyị.” Ihe a o kwuru na-echetara anyị na anyị na ụmụnna anyị n’ụwa niile nwere otu Nna, ya bụ, Jehova. Anyị hụkwara ibe anyị n’anya. (1 Pita 2:17) Ọ bụ ihe ùgwù na-enweghị atụ. Ndị Kraịst e tere mmanụ nwere olileanya ịga eluigwe. Chineke mụrụ ha ọzọ, ha abụrụ ụmụ ya. Ọ bụ ya bụ ụzọ pụrụ iche Jehova si bụrụ Nna ha. (Rom 8:15-17) Ndị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa nwekwara ike ịkpọ Jehova “Nna.” Ọ bụ ya nyere ha ndụ, jirikwa obiọma na-egboro ndị niile na-efe ya mkpa ha. Mgbe a ga-akpọ ndị nwere olileanya ibi n’ụwa “ụmụ Chineke” bụ mgbe ha ga-ezu okè ma kwesị ntụkwasị obi n’ule ikpeazụ.—Rom 8:21; Mkpu. 20:7, 8.

5, 6. Olee ihe ọma kachanụ ndị nne na nna ga-emere ụmụ ha? Gịnịkwa ka nwatakịrị nke ọ bụla kwesịrị iji aka ya mee? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

5 Otu n’ime ihe ọma ndị nne na nna ga-emere ụmụ ha bụ ịna-akụziri ha otú e si ekpe ekpere, na-enyekwara ha aka ịghọta na Jehova bụ Nna anyị nke eluigwe nakwa na ọ hụrụ anyị n’anya. Otu onye nlekọta sekit na Saụt Afrịka kwuru, sị: “Malite n’ụbọchị a mụrụ ụmụ anyị, mụ na ha na-ekpekọ ekpere n’abalị ọ bụla, ọ gwụkwala ma mụ anọghị ya. Ha na-ekwukarị na ha anaghị echeta kpọmkwem ihe ndị m kwuru n’ekpere ndị ahụ anyị na-ekpe n’abalị. Ma, ha na-echeta otú ebe niile si ada jii, otú ikpegara Nna anyị bụ́ Jehova ekpere si bụrụ ihe dị nsọ, nakwa otú onye ọ bụla si anọ nwayọọ, obi eruokwa anyị ala. Ozugbo ha mụtara ikpe ekpere, m gwara ha ka ha na-ekpepụta ekpere ha ekpepụta ka m nụ ihe ha na-ekwu mgbe ha na-agwa Jehova ihe ha chere na otú obi dị ha. O nyeere m aka ịmata ihe dị ha n’obi. M jizi nwayọọ nwayọọ kụziere ha otú ha ga-esi na-etinye ihe ụfọdụ Jizọs kwuru n’ekpere ahụ ọ kụziri n’ekpere nke ha iji mee ka ekpere ha ka mma.”

6 Ụmụ nwaanyị abụọ ahụ ha mụtara ji nwayọọ nwayọọ na-eme nke ọma, ha na Jehova adịkwa ná mma. Ha alụọla di ugbu a. Ha na di ha ji obi ụtọ na-eje ozi oge niile. Ihe ọma kachanụ ndị nne na nna ga-emere ụmụ ha bụ inyere ha aka ka ha na Jehova dịrị ná mma. N’eziokwu, ọ bụ nwatakịrị nke ọ bụla ga-eji aka ya mee ka ya na Jehova na-adị ná mma. Otú ọ ga-esi mee ya bụ iji aha Chineke kpọrọ ihe ma na-akwanyere ya ezigbo ùgwù.—Ọma 5:11, 12; 91:14.

“KA E DOO AHA GỊ NSỌ”

7. Olee ihe ùgwù anyị nwere? Gịnị ka anyị kwesịrị ịna-eme?

7 Ọ bụ ihe ùgwù na anyị ma aha Chineke, bụrụkwa ndị o ‘wepụtaara aha ya.’ (Ọrụ 15:14; Aịza. 43:10) Anyị  na-arịọ Nna anyị nke eluigwe, sị: “Ka e doo aha gị nsọ.” Ọ pụtara na anyị ga na-arịọ Jehova ka o nyere anyị aka ka anyị ghara ikwu ma ọ bụ mee ihe ga-eme ka a kọchaa aha nsọ ya. Anyị achọghị ime ka ụfọdụ ndị n’oge ndịozi, ya bụ, ndị bụ́ soro okwu ọnụ m, esola omume m. Pọl onyeozi degaara ha akwụkwọ ozi, sị: “A na-ekwulu aha Chineke n’etiti ndị mba ọzọ n’ihi unu.”—Rom 2:21-24.

8, 9. Nye ihe atụ gosiri na Jehova na-agọzi ndị na-agbalịsi ike ka e doo aha ya nsọ.

8 Anyị chọrọ ka e doo aha Chineke nsọ. Na Nọọwee, e nwere otu nwanna nwaanyị di ya nwụrụ na mberede, ya afọzie ya na nwa ya nwoke dị afọ abụọ. O kwuru, sị: “Oge ahụ siiri m ezigbo ike. M na-ekpe ekpere kwa ụbọchị n’ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ n’otu awa ọ bụla ka m nwee ike idi ihe merenụ ka Setan ghara ịhụ ihe ọ ga-eji kwaa Jehova emo n’ihi mkpebi na-ezighị ezi m mere ma ọ bụ na mụ ekwesịghị ntụkwasị obi. M chọrọ ka e doo aha Jehova nsọ, chọọkwa ka nwa m hụ papa ya ọzọ na Paradaịs.”—Ilu 27:11.

9 Jehova ọ̀ zara ekpere nwanna nwaanyị ahụ? Ee. Ya na ụmụnna na-anọ mgbe mgbe, ha ana-agba ya ume. Mgbe afọ ise gara, ọ lụrụ otu nwanna bụ́ okenye. Nwa ya nwoke dị afọ iri abụọ ugbu a, bụrụkwa nwanna e mere baptizim. Nwanna nwaanyị ahụ sịrị: “Obi dị m ezigbo ụtọ na di m nyeere m aka ịzụ nwa m.”

10. Olee otú Jehova ga-esi mee ka e doo aha ya nsọ kpamkpam?

10 Olee otú Jehova ga-esi doo aha ya nsọ kpamkpam, wepụkwa nkọcha niile a na-akọcha ya? Otú ọ ga-esi mee ya bụ na ọ ga-ebibi ndị niile jụrụ ọchịchị ya. (Gụọ Ezikiel 38:22, 23.) A ga-eji nwayọọ nwayọọ mee ka ụmụ mmadụ zuo okè. Anyị na-atụsi anya ike mgbe ụmụ mmadụ niile ga na-eme ka e doo aha Jehova nsọ. Ọ bụ mgbe ahụ ka Nna anyị nke eluigwe ga-abụ “ihe niile n’ebe onye ọ bụla nọ.”—1 Kọr. 15:28.

“KA ALAEZE GỊ BỊA”

11, 12. N’afọ 1876, gịnị ka Jehova nyeere ezi Ndị Kraịst aka ịghọta?

11 Tupu Jizọs alaghachi eluigwe, ndịozi ya jụrụ ya, sị: “Onyenwe anyị, ị̀ na-eweghachiri Izrel alaeze ahụ n’oge a?” Ihe Jizọs zara ha gosiri na oge erubeghị ka ha mata mgbe Alaeze Chineke ga-amalite ịchị. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha lekwasị anya n’ozi ọma ha kwesịrị ịna-ekwusa. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 1:6-8.) Ma, Jizọs gwara ha ka ha na-atụ anya mgbe Alaeze Chineke ga-abịa. Ọ bụ ya mere Ndị Kraịst ji ekpe ekpere kemgbe oge ndịozi Jizọs ka ọ bịa.

12 Mgbe oge ruwere ka Jizọs malite ịchị n’eluigwe, Jehova nyeere ndị na-efe ya aka ịghọta afọ ọ ga-abụ. N’afọ 1876, Nwanna Charles Taze Russell dere otu isiokwu e bipụtara n’otu magazin a kpọrọ Bible Examiner. Isiokwu ahụ bụ “Oge Ndị Jentaịl: Olee Mgbe Ọ Ga-agwụ?” O kwuru na afọ 1914 ga-abụ afọ dị mkpa, kwuokwa na “oge asaa” ahụ Daniel buru n’amụma na “oge a kara aka nke ndị mba ọzọ” Jizọs kwuru okwu ya bụ otu ihe. *Dan. 4:16; Luk 21:24.

13. Gịnị mere n’afọ 1914, gịnịkwa ka ihe ndị na-eme n’ụwa kemgbe ahụ na-egosi?

13 N’afọ 1914, mba ndị dị na Yurop malitere ịlụ agha, ya ejiri nwayọọ nwayọọ  zuo ụwa niile. Mgbe agha ahụ biri n’afọ 1918, ụnwụ nri echiela ndị mmadụ ọnụ n’ala. E nwekwara ajọ ọrịa na-efe efe nke gburu ọtụtụ ndị karịa ndị nwụrụ n’agha ahụ. Otú a ka “ihe ịrịba ama” ahụ Jizọs kwuru a ga-eji mata na ọ chịwala n’eluigwe si malite imezu. (Mat. 24:3-8; Luk 21:10, 11) Ihe ndị na-emenụ gosiri na ọ bụ n’afọ 1914 ka ‘e nyere Onyenwe anyị Jizọs okpueze.’ “O wee gaa na-emeri, ka o wee nwezuo mmeri ya.” (Mkpu. 6:2) Agha dara n’eluigwe, ya achụpụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya, chụdata ha n’ụwa. Kemgbe ahụ, ụmụ mmadụ ahụla na ihe ahụ Mkpughe kwuru bụ eziokwu, ya bụ, “Ahụhụ ga-adịrị ụwa na oké osimiri, n’ihi na Ekwensu agbadatawo n’ebe unu nọ, ọ na-ewe oké iwe, ebe ọ maara na o nwere oge dị mkpirikpi.”—Mkpu. 12:7-12.

14. (a) Gịnị mere ọ ka ji dị mkpa ka anyị na-ekpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa? (b) Olee ọrụ dị mkpa anyị kwesịrị ịna-arụ?

14 Amụma ahụ e dere ná Mkpughe 12:7-12 nyeere anyị aka ịghọta ihe mere oké ihe ọjọọ ji malite ime n’ụwa mgbe Jizọs ghọrọ Eze. Ọ bụ eziokwu na Jizọs na-achị n’eluigwe, ọ bụ Setan ka na-achị ụwa a. Ma, otú Jizọs ga-esi nwezuo mmeri ya n’oge na-adịghị anya bụ iwepụ ihe ọjọọ niile n’ụwa. Anyị ga na-ekpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa ruo mgbe Jizọs ga-eme ya. Otú anyị ga-esikwa gosi na anyị na-eme ihe Jizọs kwuru n’ekpere ahụ bụ ịna-ekwusa ozi  ọma, nke so ‘n’ihe ịrịba ama’ ahụ Jizọs nyere anyị. O kwuru, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.”—Mat. 24:14.

“KA UCHE GỊ MEEKWA N’ỤWA”

15, 16. Olee otú àgwà anyị ga-esi gosi na anyị na-arịọ Chineke ka uche ya mee n’ụwa?

15 Ihe dị ka puku afọ isii gara aga, ọ bụ naanị uche Chineke ka a na-eme n’ụwa. Ọ bụ ya mere Jehova ji lechaa ebe mara mma o nyere ụmụ mmadụ ná mmalite ma sị na ọ “dị nnọọ mma.” (Jen. 1:31) Setan mechara nupụrụ ya isi. Kemgbe ahụ, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole na-eme uche Chineke n’ụwa. Ma, taa, obi dị anyị ụtọ na anyị ji anya anyị na-ahụ ka ihe dị ka nde mmadụ asatọ na-ejere Jehova ozi. Ọ bụghị naanị na ha na-ekpe ekpere ka uche Chineke mee n’ụwa, kama ha na-agbalịsi ike ime ihe Jizọs kụziri n’Ekpere Onyenwe Anyị. Otú ha si eme ya bụ ịkpa àgwà ọma na iji ịnụ ọkụ n’obi na-akụziri ndị ọzọ banyere Alaeze Chineke.

Ị̀ na-enyere ụmụ gị aka ime ihe gosiri na ha na-arịọ ka uche Chineke mee n’ụwa? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16)

16 Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwanna nwaanyị bụ́bu onye ozi ala ọzọ n’Afrịka. E mere ya baptizim n’afọ 1948. Ọ sịrị: “M na-ekpe ekpere mgbe niile ka Jehova mee ka e nwee ike izi ndị niile yiri atụrụ ozi ọma ma nyere ha aka ịmata Jehova tupu oge agaa. M chọọ izi mmadụ ozi ọma, m na-arịọ Jehova ka o nyere m aka ikwu ihe ga-eru ya n’obi. M na-ekpekwa ekpere ka Jehova gọzie mbọ anyị na-agba inyere ndị yiri atụrụ anyị na-amụrụ Baịbụl aka.” Ka a sịkwa ihe mere nwanna nwaanyị a dị afọ iri asatọ ji na-eme nke ọma n’ozi ọma. O nyerela ọtụtụ ndị aka ịghọ Ndịàmà Jehova. O doro anya na i nwere ike icheta ụmụnna ndị ọzọ ji obi ha niile na-eme uche Chineke n’agbanyeghị na ha emeela agadi.—Gụọ Ndị Filipaị 2:17.

17. Olee otú obi dị gị n’ihi ihe Jehova ga-eme n’ọdịnihu iji zaa ekpere anyị na-ekpe ka uche ya mee n’ụwa?

17 Anyị ga na-ekpe ekpere ka e mee uche Chineke n’ụwa ruo mgbe a ga-ebibi ndị iro Chineke niile. A ga-emekwu uche Chineke n’ụwa mgbe a ga-akpọlite ọtụtụ ijeri ndị nwụrụ anwụ ka ha biri n’ụwa mgbe ọ ga-aghọ paradaịs. Jizọs sịrị: “Ka ihe a ghara iju unu anya, n’ihi na oge awa na-abịa mgbe ndị niile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya wee pụta.” (Jọn 5:28, 29) Obi ga-adị anyị ezigbo ụtọ mgbe anyị ga-ahụ ndị ikwu na ibe anyị a kpọlitere n’ọnwụ. Chineke “ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya [anyị].” (Mkpu. 21:4) Ọtụtụ n’ime ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ga-abụ “ndị ajọ omume,” ndị dịrị ndụ ma nwụọ n’amụghị eziokwu banyere Jehova Chineke na Ọkpara ya. Ọ ga-abụ ezigbo ihe ùgwù ịkụziri ha uche Chineke na nzube ya, si otú ahụ nyere ha aka iru eru inweta “ndụ ebighị ebi.”—Ọrụ 24:15; Jọn 17:3.

18. Olee ihe kacha bụrụ mkpa ụmụ mmadụ?

18 Mgbe Alaeze Chineke ga-abịa, ọ ga-eme ka aha Jehova dị nsọ, ndị niile nọ n’eluigwe na n’ụwa ana-efekwa Chineke. Chineke ga-egboro ụmụ mmadụ ihe kacha bụrụ mkpa ha mgbe ọ ga-emezu ihe atọ mbụ Jizọs kwuru n’ekpere ahụ ọ kụziri. Ma, e nwere ihe ndị ọzọ dị anyị mkpa e kwuru n’ihe anọ fọrọ n’ekpere ahụ. Anyị ga-atụle ha n’isiokwu na-esonụ.

^ para. 12 Ị chọọ ịhụ ebe a kọwara otú amụma a si mezuo n’afọ 1914, gụọ akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? peeji nke 215-218.