Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JUN 2015

Ọ Hụrụ Ndị Mmadụ n’Anya

Ọ Hụrụ Ndị Mmadụ n’Anya

“Ihe na-enye m obi ụtọ bụkwa ihe metụtara ụmụ mmadụ.”—ILU 8:31.

1, 2. Olee ihe gosiri na Jizọs hụrụ ụmụ mmadụ n’anya nke ukwuu?

MALITE ná mbido, Jizọs bụ́ Ọkpara Chineke bụ onye kacha gosi na Jehova nwere amamihe na-enweghị atụ. Akwụkwọ Ilu kpọrọ Jizọs amamihe, kwuokwa na ọ nọ n’akụkụ Nna ya dị ka “onye ọkà ọrụ.” Chegodị ụdị obi ụtọ o nwere mgbe Nna ya “kwadebere eluigwe” nakwa “mgbe ọ tọrọ ntọala ụwa.” N’agbanyeghị na Jizọs ji ihe niile Chineke kere kpọrọ ihe, ọ bụ ụmụ mmadụ kacha eme ya obi ụtọ. (Ilu 8:22-31) N’eziokwu, Jizọs hụrụ ụmụ mmadụ n’anya tupu ya abịa n’ụwa.

2 Jizọs mechara gosi na ya na-erubere Nna ya isi ma hụ ya na ụmụ mmadụ n’anya. Ọ bụ ya mere o ji hapụ eluigwe bịa n’ụwa ma bụrụ mmadụ. O mere otú ahụ iji gbapụta ụmụ mmadụ. (Fil. 2:5-8; Mat. 20:28) Jizọs hụrụ ụmụ mmadụ n’anya n’eziokwu. Mgbe ọ nọ n’ụwa, Chineke nyere ya ike ịrụ ọrụ ebube. Ọrụ ebube ndị ahụ gosiri na ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya nke ukwuu, gosikwa ụdị ihe ọma ọ ga-eme n’ụwa niile n’oge na-adịghị anya.

3. Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu a?

 3 Ọbịbịa Jizọs bịara n’ụwa mere ka o nwee ike ‘izisa ozi ọma alaeze Chineke.’ (Luk 4:43) Ọ ma na ọ bụ Alaeze a ga-eme ka e doo aha Nna ya nsọ, meekwa ka nsogbu ụmụ mmadụ niile bie. Ka Jizọs na-ekwusa ozi ọma, ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube gosiri na ihe banyere ụmụ mmadụ na-emetụ ya n’obi n’eziokwu. Gịnị mere ihe ndị ahụ Jizọs mere ji gbasa anyị? Ọ bụ n’ihi na ihe anyị na-amụta na ha na-eme ka anyị nwee olileanya, obi esiekwa anyị ike na ihe ga-aka mma n’ọdịnihu. Ka anyị tụlee anọ n’ime ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ.

JEHOVA NYERE YA IKE ỊGWỌ ỌRỊA

4. Kọọ ihe mere mgbe Jizọs hụrụ onye ekpenta.

4 Mgbe Jizọs na-eje ozi ya, ọ gara n’ebe a na-akpọ Galili. N’otu n’ime obodo dị ebe ahụ, Jizọs hụrụ ihe metụrụ ya n’ahụ́. (Mak 1:39, 40) Ọ hụrụ otu nwoke na-arịa ọrịa ọjọọ a na-akpọ ekpenta. Luk, bụ́ dọkịta, kwuru ihe gosiri na ọrịa ahụ jisiri nwoke ahụ ike. Ọ sịrị na ‘ekpenta zuru ya ahụ́.’ (Luk 5:12) Baịbụl kwuru na mgbe nwoke ahụ hụrụ Jizọs, “o gburu ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala, wee rịọ ya, sị: ‘Onyenwe anyị, ọ bụrụ nnọọ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.’” O doro nwoke ahụ anya na Jizọs nwere ike ịgwọ ya. Ma, ihe ọ chọrọ ịma bụ ma Jizọs ọ̀ chọrọ ịgwọ ya. Gịnị ka Jizọs ga-emere nwoke a rịọrọ ya arịrịọ a? Gịnị ka Jizọs na-eche mgbe ọ na-ele nwoke ekpenta ahụ anya? Jizọs ọ̀ ga-eme ka ndị Farisii bụ́ ndị na-anaghị emetere ndị na-arịa ụdị ọrịa ahụ ebere? Ọ bụrụ gị, gịnị ka ị gaara eme?

5. Gịnị mere Jizọs ji sị nwoke ekpenta ahụ, “Achọrọ m”?

5 O yiri ka onye ekpenta ahụ etighị, “Adịghị m ọcha, adịghị m ọcha!” otú ahụ Iwu Mozis kwuru. Ma, iwe eweghị Jizọs. Kama, o meteere nwoke ahụ ebere ma chọọ inyere ya aka. (Lev. 13:43-46) Anyị amaghị ihe Jizọs nọ na-eche, ma anyị ma otú obi dị ya. Jizọs nweere ya ọmịiko ma mee ihe tụrụ mmadụ niile n’anya. Ọ matịrị aka ya bitụ nwoke ekpenta ahụ, jiri obi ike na olu ọma sị ya: “Achọrọ m. Dị ọcha.” Ozugbo, “ekpenta ahụ pụrụ n’ahụ́ ya.” (Luk 5:13) O doro anya na ọ bụ Jehova nyere Jizọs ike ịrụ ọrụ ebube nakwa ka o gosi na ọ hụrụ ụmụ mmadụ n’anya nke ukwuu.—Luk 5:17.

6. Olee ihe masịrị gị n’ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ? Oleekwa ihe ha na-egosi?

6 Jizọs Kraịst ji ike Chineke nyere ya rụọ ọtụtụ ọrụ ebube tụrụ ndị mmadụ n’anya. Ọ bụghị naanị ekpenta ka ọ gwọrọ. Ọ gwọkwara ụdị ọrịa ọ bụla ndị mmadụ na-arịa. Baịbụl kwuru na “o juru ìgwè mmadụ ahụ anya ka ha hụrụ ndị ogbi ka ha na-ekwu okwu na ndị ngwọrọ ka ha na-eje ije na ndị ìsì ka ha na-ahụ ụzọ.” (Mat. 15:31) Taa, ndị dọkịta chọọ ịgwọ onye na-arịa ọrịa akụrụ, ha nwere ike ịrịọta akụrụ ha ga-etinye n’ahụ́ onye ahụ. Ma, mgbe Jizọs na-arụ ọrụ ebube, o meghị otú ahụ. Kama, ọ gwọrọ ebe ọ bụla na-enye mmadụ nsogbu. Ọ gwọrọ ndị mmadụ n’egbughị oge. E nwere ndị ọ gwọrọ n’agbanyeghị na ha nọ ebe dị anya. (Jọn 4:46-54) Olee ihe ọrụ ebube ndị a niile na-egosi? Ha na-egosi na Eze anyị bụ́ Jizọs Kraịst nwere ike ịgwọ ọrịa nakwa na ọ chọrọ ịgwọ ụdị ọrịa niile kpamkpam. Otú Jizọs si meso ndị  mmadụ na-eme ka obi sie anyị ike na amụma Baịbụl buru banyere Jizọs ga-emezu n’ụwa ọhụrụ. Ọ sịrị: “Ọ ga-emere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya na ogbenye ebere.” (Ọma 72:13) N’oge ahụ, Jizọs ga-enyere ndị niile na-ata ahụhụ aka.

“BILIE BURU IHE NDINA GỊ GAWA IJE”

7, 8. Kọwaa otú Jizọs si hụ otu nwoke na-arịa ọrịa n’ọdọ mmiri Betzeta.

7 Ọnwa ole na ole ka Jizọs gwọchara onye ekpenta ahụ, o si Galili gaa Judia na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Ọ ga-abụrịrị na ndị nụrụ ozi ọma ọ na-ekwusa na ndị ihe ọ na-eme metụrụ n’obi eruola ọtụtụ puku mmadụ n’oge ahụ. Jizọs chọsiri ike izi ndị ogbenye ozi ọma, ikwusara ndị a dọọrọ n’agha na a tọhapụla ha nakwa ikechi ọnyá ndị e tiwara obi.—Aịza. 61:1, 2; Luk 4:18-21.

8 N’ọnwa Naịsan, Jizọs rubeere Nna ya isi gaa Jeruselem ime Ememme Ngabiga. Obodo ahụ na-ekwo ekwo n’ihi na ndị mmadụ si ebe dị iche iche bịa maka ememme ahụ. É si n’ụlọ nsọ gawa n’ebe ugwu, e nwere ọdọ mmiri a na-akpọ Betzeta. N’ebe ahụ ka Jizọs hụrụ otu nwoke na-arịa ọrịa.

9, 10. (a) Olee ihe mere ndị mmadụ ji aga n’ọdọ mmiri Betzeta? (b) Gịnị ka Jizọs mere n’ọdọ mmiri ahụ, gịnịkwa ka ihe ahụ o mere na-akụziri anyị? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

9 Ìgwè mmadụ ahụ́ na-adịghị na-aga Betzeta. N’ihi gịnị? Ha chere na ahụ́ ga-adị onye ọrịa mma ma ọ bụrụ na ọ banye n’ọdọ mmiri ahụ mgbe mmiri ya mere ụṅara. Chegodị otú obi ga-adị ndị mmadụ n’ebe ahụ ka ọtụtụ ndị chị obi n’aka na-agbalị ka ha bụrụ ndị mbụ a ga-agwọ. E nwekwara ndị na-amaghị ihe ha ga-eme eme. Gịnịkwanụ ka Jizọs gara ebe ahụ ime ebe ọ bụ onye zuru okè, ọ naghịkwa arịa ọrịa? Ihe mere o ji gaa ebe ahụ bụ na ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya. Ọ bụ n’ebe ahụ ka ọ hụrụ otu nwoke rịawara ọrịa tupu a mụọ Jizọs n’ụwa.—Gụọ Jọn 5:5-9.

10 Jizọs jụrụ nwoke ahụ ma ọ̀ chọrọ ka ahụ́ dị ya mma. Chegodị otú o si na-ewute nwoke ahụ mgbe ọ na-agwa Jizọs na ya chọrọ ka ahụ́ dị ya mma, ma e nweghị onye ga-enyere ya aka ka ọ banye n’ọdọ mmiri ahụ. Jizọs gwaziri nwoke ahụ ka o mee ihe yiri ka ọ gaghị ekwe omume, ya bụ, ka o bilie buru ihe ndina ya gawa ije. Nwoke ahụ mere otú ahụ ozugbo. Ọrụ ebube ahụ Jizọs rụrụ gosiri ihe ọ ga-eme n’ụwa ọhụrụ nakwa na o nweere ndị mmadụ ọmịiko. O ji aka ya na-achọ ndị ọ ga-enyere aka. Ihe o mere kwesịrị ịgba anyị ume ịna-achọ n’ókèala anyị ka anyị hụ ndị ike ụwa gwụrụ n’ihi ihe ọjọọ ndị na-eme taa.

“ÒNYE BITỤRỤ UWE ELU M AKA?”

11. Olee otú Mak 5:25-34 si gosi na Jizọs nweere ndị na-arịa ọrịa ọmịiko?

11 Gụọ Mak 5:25-34. Otu nwaanyị rịara ọrịa oruru ọbara ruo afọ iri na abụọ. Ọrịa ahụ anaghị ekwe ya mee ihe ndị o kwesịrị ime n’ụbọchị, ma n’ihe gbasara ife Chineke. N’agbanyeghị na ‘ọ tara ahụhụ nke ukwuu n’aka ọtụtụ ndị ọgwọ ọrịa, mefuokwa ihe niile o nwere,’ ọrịa ya kara njọ. Ma, otu ụbọchị, nwaanyị ahụ kpebiri ihe ọ ga-eme ka ọrịa ya laa. Ọ gara ebe ọ ga-enwe ike imetụ uwe Jizọs aka. Ọ banyere n’etiti ìgwè mmadụ, metụ uwe Jizọs aka. (Lev. 15:19, 25) Jizọs ghọtara na ike apụọla ya n’ahụ́, ya ajụọ, sị: “Ònye bitụrụ uwe elu m aka?” Nwaanyị ahụ “tụrụ  ụjọ, marakwa jijiji bịa daa n’ala n’ihu ya wee gwa ya eziokwu niile.” Jizọs ma na ọ bụ Nna ya bụ́ Jehova gwọrọ nwaanyị ahụ. N’ihi ya, o ji obiọma sị ya: “Nwa m nwaanyị, okwukwe gị emewo ka ahụ́ dị gị mma. Laa n’udo, gbakee n’ọrịa ọjọọ nke na-arịa gị.”

Jizọs ji ọrụ ebube ndị ọ rụrụ gosi na ọ hụrụ anyị n’anya, chọọkwa igboro anyị mkpa anyị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11 na nke 12)

12. (a) N’ihi ihe ndị anyị tụlerela, olee otú ị ga-esi kọwaa Jizọs? (b) Gịnị ka ihe Jizọs mere na-akụziri anyị?

12 O doro anya na Jizọs dị obiọma. Ihe o mere gosiri na ihe banyere ndị ọrịa na-emetụ ya n’obi. Setan chọrọ ime ka anyị chee na anyị abaghị uru nakwa na o nweghị onye hụrụ anyị n’anya. Ma, Jizọs ji ọrụ ebube ndị ọ rụrụ gosi na ọ hụrụ anyị n’anya, chọọkwa igboro anyị mkpa anyị. N’eziokwu, ọ bụ Eze na Nnukwu Onye Nchụàjà nwere ọmịiko. (Hib. 4:15) O nwere ike isiri anyị ike ịghọta otú obi dị ndị na-arịa ọrịa na-anaghị ala ala, karịchaa ma ọ bụrụ na anyị arịatụbeghị ụdị ọrịa ahụ. Anyị kwesịrị icheta na Jizọs ghọtara otú obi dị ndị ọrịa n’agbanyeghị na yanwa arịatụbeghị ọrịa. Ka anyị gbalịsie ike ime otú ahụ Jizọs mere.—1 Pita 3:8.

“ANYA MMIRI GBARA JIZỌS”

13. Gịnị ka mkpọlite a kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ na-akụziri anyị banyere Jizọs?

13 Ihe na-ewute ndị ọzọ metụrụ Jizọs n’obi. Dị ka ihe atụ, mgbe enyi ya Lazarọs nwụrụ, Baịbụl kwuru na “ọ sụrụ ude n’ime mmụọ ya,” na “o nyekwara ya nsogbu” mgbe ọ hụrụ ka ndị ezinụlọ Lazarọs na ndị enyi ya na-eru uju. (Gụọ Jọn 11:33-36.) Anya mmiri gbara Jizọs n’agbanyeghị na ọ ma na ya ga-akpọlite Lazarọs n’ọnwụ. Ihere emeghị ya na ndị mmadụ ga-ahụ na ya na-ebe  ákwá. Ndị ọzọ ghọtara na Jizọs hụrụ Lazarọs na ndị ezinụlọ ya n’anya. Otú o si jiri ike Chineke nyere ya kpọlite enyi ya n’ọnwụ gosiri na o nwere ọmịiko.—Jọn 11:43, 44.

14, 15. (a) Olee ihe gosiri na Jehova chọsiri ike ime ka ndị mmadụ kwụsị ịta ahụhụ? (b) Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “ili ncheta” na-akụziri anyị?

14 Baịbụl kwuru na Jizọs yiri Nna ya nke eluigwe. (Hib. 1:3) N’ihi ya, Jizọs ji ọrụ ebube ndị ahụ ọ rụrụ gosi na ya na Nna ya chọrọ iwepụ ọrịa, ihe mgbu, na ọnwụ. Ihe gosiri na ha chọrọ ime otú ahụ abụghị naanị mmadụ ole na ole ahụ Baịbụl kwuru na a kpọlitere n’ọnwụ. Jizọs sịrị: “Oge awa na-abịa mgbe ndị niile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya wee pụta.”—Jọn 5:28, 29.

15 Ọ dabara adaba na Jizọs kwuru banyere “ili ncheta” n’ihi na ọ gbasara ihe Chineke na-echeta. Ọ bụ Chineke Pụrụ Ime Niile kere eluigwe na ụwa. N’ihi ya, ọ ga-echetali ihe niile banyere ndị nwụnahụrụ anyị, ma àgwà ha ma ihe ndị ọzọ gbasara ha. (Aịza. 40:26) Ọ bụghị naanị na ọ ga-echetali ha, kama ya na Ọkpara ya chọrọ icheta ha. Mkpọlite a kpọlitere Lazarọs na ndị ọzọ n’ọnwụ gosiri ihe ga-eme n’ụwa niile mgbe ụwa ga-aghọ paradaịs.

IHE ANYỊ KWESỊRỊ ỊMỤTA N’ỌRỤ EBUBE NDỊ JIZỌS RỤRỤ

16. Olee ihe ùgwù ọtụtụ ndị ohu Chineke n’oge anyị a ga-enwe?

16 Ọ bụrụ na anyị ekwesị ntụkwasị obi, anyị nwere ike iji anya anyị hụ otu n’ime ọrụ ebube kachanụ a rụtụrụla, ya bụ, nchebe Chineke ga-echebe anyị n’oké mkpagbu ahụ. Obere oge a lụchara agha Amagedọn, Jehova ga-arụ ọtụtụ ọrụ ebube, mee ka ụmụ mmadụ nwee ahụ́ ike. (Aịza. 33:24; 35:5, 6; Mkpu. 21:4) Chegodị otú obi ga-adị gị ịhụ ka ndị mmadụ ga-atụfu enyo anya ha, mkpara ha, ígwè ndị ngwọrọ, ihe na-enyere ha aka ịnụ ihe na ihe ndị ọzọ yiri ha. Jehova ga-eme ka ahụ́ gbasie ndị ga-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta ike n’ihi na e nwere ọrụ ha ga-arụ. Ha ga-eji ịnụ ọkụ n’obi mee ka ụwa a Chineke nyere anyị ghọọ paradaịs.—Ọma 115:16.

17, 18. (a) Gịnị mere Jizọs ji rụọ ọrụ ebube? (b) Gịnị mere i ji kwesị ịgbalịsi ike ka ị banye n’ụwa ọhụrụ?

17 Ọrịa Jizọs gwọrọ ndị mmadụ n’oge ochie na-eme ka obi sie “oké ìgwè mmadụ” ike na a ga-agwọ ha ọrịa ha niile n’ọdịnihu. (Mkpu. 7:9) Ọrịa ndị ahụ Ọkpara Chineke gwọrọ gosiri na o nwere obi ọmịiko nakwa na ọ hụrụ ụmụ mmadụ n’anya nke ukwuu. (Jọn 10:11; 15:12, 13) Ọmịiko Jizọs nwere gosiri na Jehova hụrụ ndị ohu ya n’anya nke ukwuu n’otu n’otu.—Jọn 5:19.

18 Ụmụ mmadụ na-asụ ude, na-ahụsi anya, na-anwụkwa anwụ. (Rom 8:22) Anyị chọrọ ka ụwa ọhụrụ Chineke bịa n’ihi na ọ bụ mgbe ahụ ka Chineke ga-agwọ anyị ọrịa anyị niile. Malakaị 4:2 mere ka obi sie anyị ike na Chineke ga-agwọ ndị ọrịa, ha ‘ana-awụgharị dị ka ehi mara abụba.’ Obi ga-adịkwa ha ezigbo ụtọ na a gwọọla ha ma mee ka ha zuo okè. Anyị na-ekele Chineke maka nkwa ya ndị a, obi sikwara anyị ike na ha ga-emezu. N’ihi ya, ka anyị mee ihe niile anyị nwere ike ime ka anyị ruo eruo ibi n’ụwa ọhụrụ ahụ. Obi dị anyị ụtọ ịma na ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ mgbe ọ nọ n’ụwa gosiri otú ọ ga-esi napụta ụmụ mmadụ mgbe ọ ga-achịwa ụwa n’oge na-adịghị anya.