Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) MEE 2015

Ha “Hụrụ” Ihe Ndị E Kwere ná Nkwa

Ha “Hụrụ” Ihe Ndị E Kwere ná Nkwa

“Ha enwetaghị mmezu nke nkwa ndị ahụ, ma ha hụrụ ha n’ebe dị anya.”—HIB. 11:13.

1. Gịnị mere o ji dị mma na anyị nwere ike iji uche anyị hụ ihe na-emebeghị eme? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

OTU n’ime onyinye Jehova nyere anyị bụ na anyị nwere ike iji uche anyị hụ ihe na-emebeghị eme. Ọ bụ ihe na-enyere anyị aka ịtụ anya ihe ọma ndị ga-eme n’ọdịnihu ma kpebie ihe anyị ga-eme na otú anyị ga-esi zere nsogbu. Jehova ma ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. Ọtụtụ mgbe, ọ na-agwa anyị ha na Baịbụl tupu ha emee. N’agbanyeghị na anyị anaghị ahụ ihe ndị ahụ, anyị nwere ike iji uche anyị hụ ha ma nwee okwukwe na ha ga-emezu.—2 Kọr. 4:18.

2, 3. (a) Olee uru iche banyere nkwa Chineke ga-abara anyị? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza n’isiokwu a?

2 N’eziokwu, mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ịna-eche banyere ihe ndị na-agaghị eme eme. Dị ka ihe atụ, nwatakịrị nwere ike ịna-eche echiche ebe urukurubụba bu ya na-efegharị. Ma, o nweghị ike ime eme. Mgbe Hana nọ na-eche ụdị obi ụtọ ọ ga-enwe mgbe ọ ga-akpọga nwa ya bụ́ Samuel n’ụlọ nsọ ka o jewe ozi n’ebe ahụ, ọ bụghị nrọ ka ọ na-arọ. Ọ bụ ihe o kpebiri ime. N’ihi ya, iche banyere ya mere ka obi ya dịrị n’ihe ahụ o kpebiri ime. (1 Sam. 1:22) Ọ bụrụ na anyị ana-eche banyere ihe  Chineke kwere ná nkwa, ihe anyị na-eche bụ ihe ga-emerịrị eme.—2 Pita 1:19-21.

3 Ọtụtụ ndị ohu Jehova n’oge ochie ji uche ha hụ ihe Chineke kwere ná nkwa. Olee uru ọ baara ha? Gịnị mere o ji dị mma ka anyị na-eche banyere ihe ọma Chineke kwere nkwa imere ndị na-erubere ya isi?

IHE HA JI UCHE HA HỤ MERE KA OKWUKWE HA SIE IKE

4. Gịnị mere Ebel ji nwee ike ichesi echiche ike banyere ihe ọma Chineke ga-eme n’ọdịnihu?

4 Ọ bụ Ebel bụ onye mbụ nwere okwukwe ná nkwa Jehova. Ọ ma ihe Jehova gwara agwọ ahụ mgbe Adam na Iv mehiechara. Ọ sịrị ya: “M ga-emekwa ka iro dịrị n’etiti gị na nwaanyị ahụ nakwa n’etiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya. Ọ ga-egwepịa gị isi, ị ga-emerụkwa ya ahụ́ n’ikiri ụkwụ.” (Jen. 3:14, 15) Ebel amaghị otú ihe a ga-esi emezu. Ma, o nwere ike ịbụ na o chesiri echiche ike banyere ihe ahụ Chineke kwuru. O nwere ike ịna-eche, sị: ‘Ònye bụ onye agwọ ahụ ga-emerụ ahụ́ nakwa onye ga-enyere ụmụ mmadụ aka izu okè otú ahụ Adam na Iv zuru tupu ha emehie?’ Ebel nwere okwukwe na nkwa ọ bụla Jehova kwere ga-emezu. Ọ bụ ya mere Jehova ji nabata àjà ọ chụrụ.—Gụọ Jenesis 4:3-5; Ndị Hibru 11:4.

5. Olee uru iji uche hụ ihe ga-eme n’ọdịnihu baara Inọk?

5 Inọk bụ onye ọzọ nwere okwukwe siri ike n’ebe Chineke nọ. O ji obi ike kwusaa ozi Chineke n’agbanyeghị na ọtụtụ ndị ọjọọ nọ na-ekwu ‘ihe na-awụ akpata oyi’ banyere Chineke. O si n’ike mmụọ nsọ buo amụma na Jehova ga-abịa, “ya na ọtụtụ iri puku ndị nsọ ya, ime ha niile ihe e kpere n’ikpe, na ịma ndị niile na-adịghị asọpụrụ Chineke ikpe banyere omume ha niile nke asọpụrụghị Chineke, bụ́ ndị ha mere n’ụzọ asọpụrụghị Chineke, nakwa banyere ihe niile na-awụ akpata oyi nke ndị mmehie na-adịghị asọpụrụ Chineke kwuru megide ya.” (Jud 14, 15) Ebe ọ bụ na Inọk nwere okwukwe, o nwere ike ịbụ na o ji uche ya hụ otú ụwa ga-adị mgbe ndị ọjọọ na-agaghịzi anọ.—Gụọ Ndị Hibru 11:5, 6.

6. Mgbe Iju Mmiri gachara, gịnị ka o nwere ike ịbụ na Noa nọ na-eche banyere ya?

6 Okwukwe Noa mere ka e chebe ya n’oge Iju Mmiri. (Hib. 11:7) Mgbe Iju Mmiri gachara, okwukwe ya mere ka o jiri anụmanụ chụọrọ Chineke àjà. (Jen. 8:20) O doro anya na o mere ka Ebel. O nwere okwukwe na Chineke ga-emecha napụta ụmụ mmadụ n’aka mmehie na ọnwụ. Ka ụwa jọwara njọ mgbe Iju Mmiri gachara, Nimrọd malitere ịchị ma mee ka ndị mmadụ na-enupụrụ Jehova isi. Ma, o meghị ka okwukwe Noa na olileanya ya nyụọ ka ọkụ. (Jen. 10:8-12) Ọ ga-abụ na o chere banyere mgbe Chineke ga-anapụta ndị mmadụ n’aka ndị na-achịgbu ha nakwa n’aka mmehie na ọnwụ. Anyị nwekwara ike iji uche anyị ‘hụ’ oge ahụ magburu onwe ya, nke dị ezigbo nso ugbu a.—Rom 6:23.

HA JI UCHE HA HỤ KA NKWA CHINEKE MEZURU

7. Gịnị ka ọ ga-abụ na Ebreham, Aịzik, na Jekọb ji uche ha hụ?

7 Ọ ga-abụ na Ebreham, Aịzik, na Jekọb ji uche ha hụ ihe Chineke ga-eme n’ọdịnihu n’ihi na Chineke kwere ha nkwa na a ga-esi ná mkpụrụ ha gọzie mba niile. (Jen. 22:18; 26:4; 28:14) Ụmụ ha ga-adị ọtụtụ ma biri n’Ala Nkwa Chineke ga-enye ha. (Jen. 15:5-7) Okwukwe mere ka ha nwee ike ‘ịhụ’ ka ụmụ ha bi  n’ala ahụ. A sị ka e kwuwe, kemgbe Adam na Iv mehiechara, Jehova na-enyere ndị ji obi ha niile na-efe ya aka ịghọta na otu ụbọchị, ụmụ mmadụ ga-ezu okè otú ahụ Adam zuru na mbụ.

8. Gịnị nyeere Ebreham aka inwe okwukwe siri ike ma rubere Chineke isi?

8 Ebe ọ bụ na Ebreham nwere okwukwe siri ike, o rubeere Jehova isi n’oge ihe siiri ya ezigbo ike. Ebreham na ndị ọzọ ji obi ha niile fee Jehova ji uche ha hụ ihe ndị Jehova kwere ná nkwa n’agbanyeghị na nkwa ndị ahụ emezughị n’oge ha dị ndụ. Baịbụl kwuru, sị: “Ha hụrụ ha n’ebe dị anya ma nabata ha.” (Gụọ Ndị Hibru 11:8-13.) Ebreham ma na Jehova mezuru nkwa ndị o kwere n’oge gara aga. N’ihi ya, obi siri ya ike na ihe niile Jehova kwere ná nkwa ga-emezucha otú ahụ ndị nke mbụ mezuru.

9. Olee otú okwukwe Ebreham nwere ná nkwa Chineke si baara ya uru?

9 Okwukwe Ebreham nwere ná nkwa Chineke kwere mere ka o kpebisie ike ịna-eme ihe Chineke chọrọ. Okwukwe ya mere ka ọ hapụ obodo Ọọ ma jụ ịga biri n’obodo ọ bụla bụ́ nke ndị Kenan. Ọ ma na obodo ndị ahụ agaghị adịru mgbe ebighị ebi n’ihi na ndị na-achị ha anaghị efe Jehova. (Jọsh. 24:2) N’oge niile Ebreham dị ndụ, ọ “nọ na-echere obodo ahụ nke nwere ezi ntọala, bụ́ obodo nke ọ bụ Chineke bụ onye wuru ma mee ya.” (Hib. 11:10) O ji uche ya hụ ka o bi n’ebe Jehova ga-achị, nke ga-adịru mgbe ebighị ebi. Ebel, Inọk, Noa, Ebreham, na ndị ọzọ dị ka ha kweere na Chineke ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. Ha nọ na-atụ anya ibi ‘n’obodo ahụ nke nwere ezi ntọala,’ ya bụ, Alaeze Chineke nke ga-achị ụwa niile. Iche banyere oge ọma ahụ mere ka okwukwe ha nwere na Jehova sikwuo ike.—Gụọ Ndị Hibru 11:15, 16.

10. Olee uru iche banyere ihe ga-eme n’ọdịnihu baara Sera?

10 Sera nwunye Ebreham nwere okwukwe siri ike na nkwa Jehova ga-emezu. Mgbe ọ dị afọ iri itoolu n’amụtaghị nwa, ọ tụsiri anya ike mgbe ọ ga-amụta nwa. O jidị uche ya hụ ka ụmụ ya ghọrọ mba ukwu. (Hib. 11:11, 12) Gịnị mere obi ji sie ya ike? Jehova gwara di ya, sị: “M ga-agọzi ya, m ga-emekwa ka ọ mụọrọ gị nwa nwoke; m ga-agọzi ya, ọ ga-aghọkwa mba dị iche iche; ọ bụ n’ahụ́ ya ka ndị eze na-achị ndị dị iche iche ga-esikwa pụta.” (Jen. 17:16) Mgbe Sera mụchara Aịzik, obi sikwuru ya ike na nkwa ndị ọzọ Chineke kwere Ebreham ga-emezu. Okwukwe anyị ga-esikwu ike ma ọ bụrụ na anyị ejiri uche anyị na-ahụ ihe ọma niile Jehova kwere anyị ná nkwa.

O LEGIDERE ANYA N’ỤGWỌ ỌRỤ A GA-AKWỤ YA

11, 12. Gịnị nyeere Mozis aka ịhụkwu Jehova n’anya?

11 Mozis bụ onye ọzọ nwere okwukwe ná nkwa Jehova, hụkwa ya n’anya nke ukwuu. A sị na Mozis chọrọ, obi ya gaara adị n’ọchịchị nakwa n’akụnụba mgbe ọ bụ nwa okorobịa n’obí eze Ijipt. Ma, o si n’aka nne ya na nna ya mụta banyere Jehova na nkwa o kwere ịnapụta ndị Hibru n’ohu ha na-agba ma nye ha Ala Nkwa. (Jen. 13:14, 15; Ọpụ. 2:5-10) Ọ bụrụ na Mozis na-echekarị banyere nkwa Chineke kwere ndị ya, gịnị ka i chere ga-eri ya obi? Ọ̀ bụ ịbụ onye a ma ama, ka ọ̀ bụ ịhụ Jehova n’anya?

12 Baịbụl gwara anyị, sị: “Mgbe Mozis tolitere, ọ bụ okwukwe ka o ji jụ ka a kpọọ ya nwa ada Fero, ọ họọrọ ka e megbukọta ya na ndị Chineke kama ịnụ ụtọ mmehie ruo nwa oge, n’ihi na o weere nkọcha nke Kraịst dị ka akụ̀ dị ukwuu  karịa akụ̀ ndị dị oké ọnụ ahịa nke Ijipt; n’ihi na o legidere anya n’ụgwọ ọrụ a ga-akwụ ya.”—Hib. 11:24-26.

13. Olee uru ichesi echiche ike banyere nkwa Chineke baara Mozis?

13 Ka Mozis na-echesi echiche ike banyere nkwa Jehova kwere ndị Izrel, o nwekwuru okwukwe na Chineke, hụkwuo ya n’anya. O nwere ike ịbụ na o ji uche ya hụ mgbe Jehova ga-anapụta ụmụ mmadụ n’aka ọnwụ otú ahụ ndị ọzọ fere Chineke ji uche ha hụ. (Job 14:14, 15; Hib. 11:17-19) Mozis ghọtara na Chineke na-enwere ma ndị Hibru ma ụmụ mmadụ niile ọmịiko. Ọ bụ ya mere o ji hụ ya n’anya. Okwukwe Mozis na ịhụnanya ya mere ka o jiri ndụ ya niile fee Jehova. (Diut. 6:4, 5) Mgbe Fero chọrọ igbu ya, okwukwe o nwere n’ebe Chineke nọ na ihe o ji uche ya hụ mere ka ụjọ ghara ịtụ ya. Ọ ma na Jehova ga-akwụ ya ụgwọ n’ọdịnihu.—Ọpụ. 10:28, 29.

JIRI UCHE GỊ NA-AHỤ IHE ALAEZE CHINEKE GA-EME

14. Olee ụdị echiche bụ́ mmadụ ịmụ anya arọ nrọ?

14 Ọtụtụ ndị taa na-amụ anya arọ nrọ banyere ihe ndị na-enweghị ike ime eme. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị ogbenye ọnụ ntụ na-arọ nrọ ebe ha bara ọgaranya n’enweghịzi ihe na-echegbu ha. Ma, Baịbụl kwuru na o nweghị mgbe “nsogbu na ihe ọjọọ” na-agaghị adị n’ụwa ochie a. (Ọma 90:10) Ụfọdụ ndị na-eche banyere mgbe ọchịchị ụmụ mmadụ ga-ewepụ nsogbu niile dị n’ụwa. Ma, Baịbụl kwuru na ọ bụ naanị ọchịchị Chineke ga-eme ya. (Dan. 2:44) Ọtụtụ ndị chere na Chineke agaghị ebibi ụwa ochie a. Ma, ihe Baịbụl kwuru gosiri na ihe ahụ ha chere abụghị eziokwu. (Zef. 1:18; 1 Jọn 2:15-17) Ihe ọ bụla ndị mmadụ na-eche n’obi ha nke dị iche n’ihe Jehova kwuru bụ ịmụ anya arọ nrọ.

Ì ji uche gị na-ahụ ka ị nọ n’ụwa ọhụrụ? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)

15. (a) Gịnị mere o ji dị mma ka anyị jiri uche anyị na-ahụ mgbe Chineke ga-emezu nkwa ndị o kwere anyị? (b) Kwuo otu ihe ị na-atụ anya ya mgbe Chineke ga-emezu nkwa ya n’ọdịnihu.

15 Ma ànyị nwere olileanya ịga eluigwe ma ọ̀ bụ ibi n’ụwa, ịtụgharị uche n’olileanya anyị nwere na-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike. Ì nwere ike iji uche gị hụ ka obi dị gị ụtọ mgbe Chineke ga-emezu nkwa ya? O doro anya na iche banyere ihe ndị ị ga-eme mgbe ahụ ga-eme ka ọṅụ ju gị obi. I nwere ike iji uche gị hụ ka i bi n’ụwa ọhụrụ ebe ị ga-adị ndụ ebighị ebi. Chegodị mgbe gị na ndị ọzọ ga na-arụ ọrụ iji mee ka ụwa bụrụ paradaịs, ndị agbata obi gị niile abụrụ ndị hụrụ Jehova n’anya otú ahụ ị hụrụ ya. Ahụ́ ga-agbasi gị ike, gị enwee ume ntorobịa, o nweghịkwa ihe ga na-echegbu gị. Ndị niile na-elekọta ọrụ mgbe ahụ ga-ahụ gị n’anya, meekwa ka obi na-adị gị ụtọ. Obi ga-adịkwa gị ụtọ na i ji ike gị na nkà gị na-arụ ọrụ n’ihi na ihe niile ị na-arụ ga-abara ndị ọzọ uru, wetakwara Jehova nsọpụrụ. Dị ka ihe atụ, ị ga na-enyere ndị a kpọlitere n’ọnwụ aka ịmata Jehova. (Jọn 17:3; Ọrụ 24:15) Iche banyere ihe ọma ndị a abụghị ịmụ anya arọ nrọ. Ha niile ga-emezu n’ihi na ọ bụ ihe Baịbụl kwuru ga-eme n’ọdịnihu.—Aịza. 11:9; 25:8; 33:24; 35:5-7; 65:22.

GỊNỊ MERE ANYỊ GA-EJI NA-EKWU BANYERE OLILEANYA ANYỊ?

16, 17. Olee uru ọ ga-abara anyị ma ọ bụrụ na anyị na-agwa ụmụnna anyị banyere olileanya anyị?

16 Ịgwa ụmụnna anyị banyere ihe anyị bu n’obi ime mgbe Jehova ga-emezu nkwa ya ga-eme ka anyị na ha jiri uche anyị na-ahụ ụwa ọhụrụ nke ọma. N’agbanyeghị na e nweghị onye n’ime anyị ma kpọmkwem ihe a ga-asị ya rụwa n’ụwa ọhụrụ, ọ bụrụ na anyị na-agwa ndị ọzọ banyere ihe anyị na-atụ anya ya, ọ ga-egosi  na anyị nwere okwukwe n’ihe Chineke kwere ná nkwa. Mgbe Pọl onyeozi letara ụmụnna bi na Rom, o doro anya na obi dị ha ụtọ maka na ha na ya ‘gbarịtara ibe ha ume.’ Anyị na-emekwa otú ahụ n’oge a tara akpụ.—Rom 1:11, 12.

17 Iji uche anyị na-ahụ ihe Jehova kwere nkwa imere anyị ga-eme ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị banyere nsogbu ndị anyị nwere ugbu a. O nwere ike ịbụ ụdị nchegbu ahụ mere Pita onyeozi ji sị Jizọs: “Lee! Anyị ahapụwo ihe niile, soro gị; gịnịkwanụ ka anyị ga-enweta?” Jizọs chọrọ ka Pita na ndị ọzọ na-eso ụzọ ya jiri uche ha hụ ihe ga-eme n’ọdịnihu. Ọ bụ ya mere o ji sị ha: “N’ezie, ana m asị unu, Mgbe a ga-eme ka ihe dị ọhụrụ, mgbe Nwa nke mmadụ ga-anọdụ ala n’ocheeze ya dị ebube, unu onwe unu ndị sowooro m ga-anọdụkwa ala n’ocheeze iri na abụọ, na-ekpe ebo iri na abụọ nke Izrel ikpe. Onye ọ bụla nke hapụworo ụlọ ma ọ bụ ụmụnne ndị ikom ma ọ bụ ụmụnne ndị inyom ma ọ bụ nna ma ọ bụ nne ma ọ bụ ụmụ ma ọ bụ ala n’ihi aha m ga-enweta ihe karịrị ya okpukpu okpukpu, ọ ga-eketakwa ndụ ebighị ebi.” (Mat. 19:27-29) N’ihi ya, Pita na ndị na-eso ụzọ Jizọs ndị ọzọ ga-eji uche ha hụ mgbe ha ga-eso Jizọs nọrọ n’eluigwe na-achị ụwa ma na-eme ka ndị na-erubere Chineke isi nweta ngọzi ndị magburu onwe ha.

18. Olee otú ịtụgharị uche n’oge Chineke ga-emezu nkwa ya si abara anyị uru taa?

18 Anyị amụtala na kemgbe ụwa, iche banyere mgbe Jehova ga-emezu nkwa ndị o kwere baara ndị ohu ya uru. Ihe Ebel ma banyere nzube Chineke nyeere ya aka iji uche ya hụ ihe ọma ndị ga-emezu n’ọdịnihu. O mekwara ka o nwee okwukwe na ezigbo olileanya. Ihe mere Ebreham ji nwee okwukwe siri ike bụ na o ji uche ya hụ mgbe Chineke ga-emezu amụma o buru banyere “mkpụrụ” ahụ e kwere ná nkwa. (Jen. 3:15) Mozis “legidere anya n’ụgwọ ọrụ a ga-akwụ ya.” O mere ihe gosiri na o nwere okwukwe ma hụ Jehova n’anya. (Hib. 11:26) Ọ bụrụ na anyị ejiri uche anyị na-ahụ oge Jehova ga-emezu nkwa ndị o kwere anyị, anyị ga-ahụkwu ya n’anya, okwukwe anyị esikwuo ike. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-amụta otú anyị ga-esi jiri uche anyị na-ahụ ihe ndị ahụ.