Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) MEE 2015

Ṅomie Onye Ahụ Kwere Nkwa Ndụ Ebighị Ebi

Ṅomie Onye Ahụ Kwere Nkwa Ndụ Ebighị Ebi

“Ghọọnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya.”—EFE. 5:1.

1. Olee onyinye Chineke nyere anyị nke ga-enyere anyị aka iṅomi àgwà ya?

JEHOVA kere anyị otú anyị ga-enwe ike ịghọta otú obi dị ndị ọzọ, ọ bụrụgodị na ihe mere ha emetụbeghị anyị. (Gụọ Ndị Efesọs 5:1, 2.) Olee otú anyị ga-esi jiri onyinye a Chineke nyere anyị na-eme ihe bara uru? Gịnị ka anyị kwesịrị ime ka ọ ghara ịkpatara anyị nsogbu?

2. Olee otú obi na-adị Jehova mgbe anyị na-ata ahụhụ?

2 O doro anya na obi dị anyị ụtọ na Chineke kwere ndị e tere mmanụ nkwa na ha ga-adị ndụ ebighị ebi n’eluigwe nakwa na ndị so ‘n’atụrụ ọzọ’ ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa. (Jọn 10:16; 17:3; 1 Kọr. 15:53) Ma ndị ga-ebi n’eluigwe ma ndị ga-ebi n’ụwa agaghị ata ụdị ahụhụ anyị na-ata ugbu a. Jehova ma ahụhụ anyị na-ata. Cheta na mgbe ndị Izrel na-agba ohu n’Ijipt, Jehova ma ahụhụ ha na-ata. Baịbụl sịrị: “N’oge niile ha nọ na-ata ahụhụ, ọ nọ na-ewute ya.” (Aịza. 63:9) Mgbe ọtụtụ narị afọ gara, ụjọ tụwara ndị Juu maka na ndị iro ha nọ na-agba mbọ ka a ghara ịrụghachi ụlọ nsọ. Ma, Chineke gwara  ha, sị: “Onye na-emetụ unu aka na-emetụ mkpụrụ anya m aka.” (Zek. 2:8) Otú ahụ nne na-enwere nwa ya ọmịiko ka Jehova na-enwekwara ndị na-efe ya ọmịiko ma na-enyere ha aka. (Aịza. 49:15) Ọ bụrụ na anyị na-agbalị ịghọta otú obi dị ndị ọzọ, ọ pụtara na anyị na-eṅomi ịhụnanya Jehova.—Ọma 103:13, 14.

OTÚ JIZỌS SI ṄOMIE ỊHỤNANYA CHINEKE

3. Olee ihe gosiri na Jizọs nwere ọmịiko?

3 N’agbanyeghị na Jizọs atatụbeghị ahụhụ, ọ ghọtara otú obi na-adị ndị na-ata ahụhụ. Dị ka ihe atụ, mgbe ọ nọ n’ụwa, ọ ma na ihe na-esiri ọtụtụ ndị ike. Ndị ndú okpukpe na-eduhie ha, nyekwa ha ọtụtụ iwu ndị ha ji aka ha mee. Ndị mmadụ na-atụ ndị ndú okpukpe ndị ahụ ụjọ. (Mat. 23:4; Mak 7:1-5; Jọn 7:13) O nweghị onye duhiere Jizọs, ụjọ anaghịkwa atụ ya, ma ọ ghọtara nsogbu ndị ahụ nọ na ya. N’ihi ya, “mgbe ọ hụrụ ìgwè mmadụ ahụ, o nwere ọmịiko n’ebe ha nọ, n’ihi na a gbara ha akpụkpọ, na-achụsakwa ha, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.” (Mat. 9:36) Jizọs si n’aka Nna ya mụta ịhụ ndị mmadụ n’anya na inwere ha ọmịiko.—Ọma 103:8.

4. Gịnị ka Jizọs mere mgbe ọ hụrụ ndị na-ata ahụhụ?

4 Mgbe Jizọs hụrụ ndị na-ata ahụhụ, o nyeere ha aka n’ihi na ọ hụrụ ha n’anya. O si otú ahụ mee ka Nna ya. Dị ka ihe atụ, mgbe Jizọs na ndịozi ya gara kwusachaa ozi ọma n’ebe dị anya, ike gwụrụ ha, ha achọọkwa ịga ebe naanị ha ga-anọ zuo ike. Ma, mgbe Jizọs hụrụ ìgwè mmadụ nọ na-eche ya, o nweere ha ọmịiko ma wepụta oge kụziere “ha ọtụtụ ihe.”—Mak 6:30, 31, 34.

OTÚ ANYỊ GA-ESI NA-EṄOMI ỊHỤNANYA JEHOVA

5, 6. Ọ bụrụ na anyị chọrọ iṅomi ịhụnanya Chineke, olee otú anyị ga-esi na-emeso ndị ọzọ? Nye ihe atụ. (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

5 Otú anyị si emeso ndị ọzọ ga-egosi ma ànyị na-eṅomi ịhụnanya Chineke. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na otu nwanna na-eto eto aha ya bụ Alamba na-eche banyere otu nwanna mere agadi nke na-anaghị ahụcha ụzọ, ịga ije na-esikwara ya ike. Alamba chetara na Jizọs sịrị: “Otú unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emeso unu, na-emesonụ ha otú ahụ.” (Luk 6:31) N’ihi ya, ọ jụrụ onwe ya, sị, ‘Gịnị ka m chọrọ ka ndị mmadụ meere m?’ Ya azaa, sị, ‘M chọrọ ka ha bịa ka mụ na ha gbaa bọl.’ Ma, nwanna ahụ mere agadi ọ̀ ga-enwe ike ịgba bọl? Ihe Jizọs kwuru pụtara na ihe anyị ga-ajụ onwe anyị bụ, ‘Ọ bụrụ m ka ụdị ihe a mere, gịnị ka m ga-achọ ka ndị mmadụ meere m?’

6 N’agbanyeghị na Alamba ka bụ nwa okorobịa, o nwere ike ịghọta otú ọ ga-adị ya ma a sị na o meela agadi. Ọ ga na-anọnyere nwanna ahụ mere agadi, na-egekwa ya ntị nke ọma ma o kwuwe ihe na-eme ya. Alamba ga-ejizi nwayọọ nwayọọ ghọtawa otú ọ na-adị onye mere agadi anya na-anaghị ekwe gụọ Baịbụl ma ọ bụ ụkwụ na-anaghị ekwe gaa ozi ụlọ n’ụlọ. Mgbe ọ ghọtara ihe ya na nwanna ahụ mere agadi na-alụ, ọ matara otú ọ ga-esi nyere ya aka, chọọkwa ime ihe ọ bụla o nwere ike iji nyere ya aka. Anyị nwere ike ime otú ahụ. Ọ bụrụ na anyị aghọta otú obi dị ụmụnna anyị ma gosi ha na anyị hụrụ ha n’anya, ọ pụtara na anyị na-eṅomi Chineke.—1 Kọr. 12:26.

Otú ị ga-esi ṅomie Jehova bụ igosi ndị ọzọ ịhụnanya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7)

7. Olee otú anyị ga-esi ghọta nsogbu ya na ụmụnna anyị na-alụ?

7 Ọ bụghị mgbe niile ka ọ na-adị  mfe ịghọta nsogbu bịaara ndị ọzọ, karịchaa ma ọ bụrụ na ụdị nsogbu ahụ abịatụbereghị anyị. Dị ka ihe atụ, e nwere ọtụtụ ụmụnna ahụ́ na-egbu mgbu n’ihi ọrịa, nká ma ọ bụ ahụ́ ha merụrụ. E nwere ndị obi na-ajọkarị njọ n’ihi oké nchegbu ma ọ bụ arụrụala a rụsara ha n’oge gara aga. E nwekwara ndị naanị ha na-azụ ụmụ ha ma ọ bụ ndị ndị ezinụlọ ha na-anaghị efe Jehova. O nweghị onye na-enweghị nsogbu nke ya. Ọtụtụ mgbe, nke onye ọzọ na-adị iche na nke anyị. Olee otú anyị ga-esi ṅomie ịhụnanya Chineke? Ọ bụ ige ntị nke ọma ruo mgbe anyị ghọtara otú obi dị onye na-akọrọ anyị nsogbu ya. Ọ ga-eme ka anyị nyere onye ahụ aka, si otú ahụ gosi na anyị na-eṅomi Jehova. Ihe anyị ga-emere Okeke nwere ike ịdị iche n’ihe anyị ga-emere Okafọ, ma anyị nwere ike ịgba nwanna ume ma ọ bụ si n’ụzọ ọzọ nyere ya aka.—Gụọ Ndị Rom 12:15; 1 Pita 3:8.

ṄOMIE OBIỌMA JEHOVA

8. Olee ihe nyeere Jizọs aka igosi na o nwere obiọma?

8 Jizọs kwuru, sị: “Onye Kasị Elu . . . nwere obiọma n’ebe ndị na-enweghị ekele na ndị ọjọọ nọ.” (Luk 6:35) Jizọs ṅomiri obiọma Jehova. Gịnị nyeere ya aka ime otú ahụ? O chere otú okwu ya na omume ya nwere ike ime ka obi dị ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, otu nwaanyị nke mere ọtụtụ ihe ọjọọ bịakwutere Jizọs, na-ebe ákwá, jirikwa anya mmiri ya na-ede ụkwụ ya. Jizọs ghọtara na nwaanyị ahụ echegharịala, marakwa na obi ga-agbawa ya ma ọ chụpụ ya. Kama ime otú ahụ, Jizọs jara nwaanyị ahụ mma ma gbaghara ya. Mgbe ihe ahụ Jizọs mere were otu onye Farisii iwe, Jizọs ji obiọma gwa ya okwu.—Luk 7:36-48.

9. Olee ihe ga-enyere anyị aka iṅomi obiọma Chineke? Nye ihe atụ.

9 Olee otú anyị ga-esi ṅomie obiọma Chineke? Pọl onyeozi dere, sị: “Ohu nke Onyenwe anyị ekwesịghị ịlụ ọgụ, kama o kwesịrị ịbụ onye na-emeso mmadụ niile n’ụzọ dị nwayọọ.” (2 Tim. 2:24) Ndị dị akọ na-aghọta ihe ha kwesịrị ime mgbe ihe siri ike ka ha ghara ịkpasu ndị ọzọ iwe. Chegodị otú ị ga-esi gosi obiọma ma ihe ndị a mee: Ọ bụrụ na onye ị na-arụrụ ọrụ anaghị arụ ọrụ ya nke ọma, gịnị ka ị ga-eme? Ọ bụrụ na nwanna na-abịabeghị ọmụmụ ihe kemgbe ọtụtụ ọnwa abịa ọmụmụ ihe, gịnị ka ị ga-agwa ya? Ọ bụrụ na ị gaa ozi ọma, mmadụ asị na ya enweghị efe ige ntị, olee otú ị ga-esi gosi ya na i nwere obiọma? Ọ bụrụ na di gị ma ọ bụ nwunye gị ajụọ gị ihe mere na ị gwaghị ya ihe ụfọdụ ị chọrọ ime, ị̀ ga-ewetu obi saa ya okwu? Anyị kwesịrị ịgbalị na-aghọta otú obi dị ndị ọzọ na otú ihe anyị chọrọ ikwu ga-esi mee ka obi dị ha. Ime otú ahụ ga-eme ka anyị mara ihe anyị kwesịrị ikwu na ihe anyị kwesịrị ime ka anyị nwee ike iṅomi Jehova.—Gụọ Ilu 15:28.

ṄOMIE AMAMIHE CHINEKE

10, 11. Olee ihe ga-enyere anyị aka iṅomi amamihe Chineke? Nye ihe atụ.

10 Cheta na anyị nwere ike ịghọta nsogbu ndị anyị na-enwetụbeghị. Ọ ga-enyere anyị aka iṅomi amamihe Jehova ma mata ihe omume anyị nwere ike ịkpata. Amamihe so n’ihe e ji mara Jehova. Ọ bụrụ na ọ chọrọ, ọ ga-ahụ ihe àgwà mmadụ nwere ike ịkpata. N’agbanyeghị na anyị enweghị ike ịma ihe ga-eme echi, tupu anyị emee ihe ọ bụla, anyị kwesịrị iche banyere ihe o nwere ike ịkpata. Ndị Izrel echeghị echiche banyere ihe ga-eme ha ma ha nupụrụ Chineke isi. N’agbanyeghị  ihe niile Chineke meere ha, Mozis ma na ha ga-eme ihe na-adịghị mma n’anya Jehova. Mgbe ọ na-agwa ndị Izrel niile okwu, ọ sịrị: “Ha bụ mba nke na-enweghị uche, nghọta adịghịkwa n’etiti ha. A sị nnọọ na ha maara ihe, ha gaara echebara ihe a echiche! Ha gaara eche echiche banyere ihe ga-emesị bụrụ ọgwụgwụ ha.”—Diut. 31:29, 30; 32:28, 29.

11 Ọ bụrụ na anyị chọrọ iṅomi amamihe Chineke, anyị kwesịrị iche banyere nsogbu ihe anyị chọrọ ime nwere ike ịkpata. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị na onye anyị chọrọ ịlụ na-akpa, anyị kwesịrị ịghọta na agụụ mmekọahụ na-akpa ike. Anyị ekwesịghị ime ihe ọ bụla ga-eme ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma. Kama ime otú ahụ, ka anyị mee ihe Baịbụl gwara anyị. Ọ sịrị: “Onye maara ihe bụ onye hụrụ ọdachi gaa zoo, ma ndị na-amaghị ihe nọ na-aga, ha ga-atakwa ahụhụ ga-esi na ya pụta.”—Ilu 22:3.

ECHELA IHE GA-AKPATARA GỊ NSOGBU

12. Olee otú ihe anyị na-eche n’obi anyị nwere ike isi kpatara anyị nsogbu?

12 Onye ma ihe ma na ihe ọ na-eche n’obi ya nwere ike ime ka ọkụ. Ọkụ bara uru ma e jiri ya mee ihe kwesịrị ekwesị, dị ka isi nri. Ma, ọ bụrụ na a kpachapụghị anya, ọkụ nwere ike ịgba ụlọ, gbagbuokwa ndị bi na ya. E nwere ike iji ya tụnyere ihe anyị na-eche n’obi anyị. Ọ ga-abara anyị uru ma ọ bụrụ na anyị na-eche otú anyị ga-esi ṅomie Jehova. Ma, ọ ga-akpatara anyị nsogbu ma ọ bụrụ na anyị na-eche banyere omume rụrụ arụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị na-echekarị gbasara ime mmehie, ọ ga-eme ka anyị mewe ihe ahụ anyị na-eche. O nwere ike ime ka anyị na Jehova ghara ịbụ enyi.—Gụọ Jems 1:14, 15.

13. Gịnị ka Iv nọ na-eche banyere otú ndụ ya ga-adị?

13 Chegodị otú o si gụwa nwaanyị mbụ bụ́ Iv agụụ iri mkpụrụ si “n’osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ.” (Jen. 2:16, 17) Agwọ ahụ sịrị ya: “Unu agaghị anwụ ma ọlị. N’ihi na Chineke maara na n’ụbọchị unu riri mkpụrụ si na ya, anya unu ga-emeghe, unu ga-adịkwa ka Chineke, mara ihe ọma na ihe ọjọọ.” Iv “wee hụ na mkpụrụ osisi ahụ dị mma oriri nakwa na ọ na-agụsi anya agụụ ike.” Gịnịzi ka o mere? “O wee ghọrọ mkpụrụ ya rie. E mesịa, o nyetụrụ di ya mgbe ya na ya nọ, o wee rie.” (Jen. 3:1-6) Iv chere na e nwere uru ọ ga-erite n’ihe Setan gwara ya. Kama onye ọzọ ga na-agwa ya ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ, ọ ga-ejizi aka ya na-ekpebi ya. Ihe ahụ ọ nọ na-eche kpataara ya nsogbu. Di ya bụ́ Adam mehiere, mmehie esizie n’aka ya  “bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata.”—Rom 5:12.

14. Olee otú Baịbụl si enyere anyị aka izere omume rụrụ arụ?

14 Mmehie Iv mere n’ogige Iden abụghị mmekọahụ rụrụ arụ. Ma, Jizọs dọrọ anyị aka ná ntị ka anyị ghara ịna-eche banyere ime omume rụrụ arụ. Ọ sịrị: “Onye ọ bụla nke na-ele nwaanyị anya, o wee gụọ ya agụụ ka ya na ya nwee mmekọahụ, ọ kwasowo ya iko n’obi ya.” (Mat. 5:28) Pọl dọkwara anyị aka ná ntị, sị: “Unu ebukwala ụzọ na-eme atụmatụ maka ihe anụ ahụ́ na-achọ.”—Rom 13:14.

15. Olee ụdị akụ̀ anyị kwesịrị ịna-akpakọba? Maka gịnị?

15 Ihe ọzọ na-adịghị mma bụ mmadụ ịnọ na-eche banyere otú ọ ga-esi nwee ego kama ịna-eche banyere ime ihe dị Chineke mma. Ọ bụrụgodị na mmadụ bụ ọgaranya, ego ya enweghị ike ichebe ya n’eziokwu. (Ilu 18:11) Jizọs kọrọ akụkọ gosiri na “onye na-akpakọbara onwe ya akụ̀ ma ghara ịbụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ” bụ onye nzuzu. (Luk 12:16-21) Obi na-adị Jehova ụtọ ma anyị mee ihe dị ya mma. (Ilu 27:11) Obi ga-adịkwa anyị ụtọ ma anyị kpakọbara onwe anyị “akụ̀ n’eluigwe” ma mee ya obi ụtọ. (Mat. 6:20) Akụ̀ kacha baa uru anyị nwere bụ adịm ná mma anyị na Jehova.

ECHEGBUZILA ONWE GỊ

16. Olee ihe nwere ike inyere anyị aka ịkwụsị ichegbu onwe anyị?

16 Chegodị otú anyị ga-esi na-echegbu onwe anyị ma ọ bụrụ na anyị ji ike anyị niile na-achọ otú anyị ga-esi ‘kpakọbara onwe anyị akụ̀ n’ụwa a.’ (Mat. 6:19) Jizọs mere ihe atụ gosiri na “nchegbu nke usoro ihe a na ike dị aghụghọ nke akụnụba” nwere ike ime ka mmadụ ghara ibu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke. (Mat 13:18, 19, 22) Ụfọdụ ndị na-echegbu onwe ha mgbe niile banyere ihe ọjọọ ndị nwere ike ime. Ma, ọ bụrụ na anyị na-echegbu onwe anyị mgbe niile, ọrịa nwere ike ịbịa anyị ma ọ bụ okwukwe anyị anyụwa ka ọkụ. Ka anyị tụkwasị Jehova obi ma cheta na “ọ bụ nchegbu nke dị n’obi mmadụ ga-anyịgbu ya, ma, ọ bụ okwu ọma na-eme ka ọ ṅụrịa ọṅụ.” (Ilu 12:25) N’ihi ya, e nwee ihe na-echegbu gị, kọọrọ ya onye ma gị nke ọma nke na-efe Jehova. Nne gị ma ọ bụ nna gị, di gị ma ọ bụ nwunye gị, ma ọ bụ ezigbo enyi gị nwere ike ịgba gị ume ka ị tụkwasị Jehova obi, nyekwara gị aka ịkwụsị ichegbu onwe gị.

17. Olee otú Jehova si enyere anyị aka ma anyị chegbuwe onwe anyị?

17 Jehova na-aghọta nchegbu anyị karịa onye ọ bụla ọzọ. Pọl dere, sị: “Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla, kama n’ihe niile, jirinụ ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike na inye ekele mee ka Chineke mara ihe unu na-arịọ; udo nke Chineke nke karịrị echiche niile ga-eche obi unu na ike iche echiche unu nche site n’aka Kraịst Jizọs.” (Fil. 4:6, 7) Chegodị banyere ndị niile na-enyere anyị aka ka ihe ọ bụla ghara ime ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma, ya bụ, ndị okenye na ụmụnna ndị ọzọ, ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, ndị mmụọ ozi, Jizọs, na Jehova n’onwe ya.

18. Olee otú ikike iche echiche Chineke nyere anyị ga-esi baara anyị uru?

18 Anyị amụtala na otú anyị ga-esi ṅomie ịhụnanya Jehova na àgwà ya ndị ọzọ bụ ịgbalịsi ike ịna-aghọta otú obi dị ndị ọzọ. (1 Tim. 1:11; 1 Jọn 4:8) Obi ga-adị anyị ụtọ ma ọ bụrụ na anyị na-egosi ezigbo ịhụnanya. Anyị chọọ ime ihe, anyị echee ihe ọ ga-akpata, gharakwa ịna-echegbu onwe anyị mgbe niile. N’ihi ya, ka anyị jiri ikike iche echiche Chineke nyere anyị na-eche otú ụwa ọhụrụ ga-adị ma na-eṅomi ịhụnanya Jehova, obiọma ya, amamihe ya, na obi ụtọ ya.—Rom 12:12.