Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) MEE 2015

 IHE SI N’EBE ANYỊ NA-EDEBE IHE OCHIE

Ọ Hụrụ na Ọ Bụ Ịhụnanya Mere Kafiteria Ahụ Ji Na-aga Siriri Werere

Ọ Hụrụ na Ọ Bụ Ịhụnanya Mere Kafiteria Ahụ Ji Na-aga Siriri Werere

KEMGBE ụwa, obi na-adị ndị ohu Jehova ezigbo ụtọ ịga mgbakọ ka ha nụrụ Okwu Chineke. Ha gaa mgbakọ, irikọ nri ọnụ na-emekarị ka ha nwekwuo obi ụtọ.

N’ọnwa Septemba afọ 1919, Ndị Mmụta Baịbụl nwere mgbakọ abalị asatọ na Sida Pọịnt, Ohayo, dị n’Amerịka. E mere ndokwa ka họtel dị iche iche nye ndị ga-abịa mgbakọ ahụ ụlọ na nri. Ma, ọtụtụ puku mmadụ bịara karịa ihe a tụrụ anya ya. Mgbe ndị na-ebunye ndị mmadụ nri na họtel hụrụ na ndị mmadụ karịrị akarị, ha hapụrụ ọrụ ha gbaa ọsọ. Onyeisi ha amaghị ihe ọ ga-eme eme. N’ihi ya, ọ jụrụ ma ndị ntorobịa bịara mgbakọ ahụ hà chọrọ inye aka, ọtụtụ n’ime ha ekweta. Otu n’ime ha aha ya bụ Sadie Green sịrị: “Ọ bụ ya bụ mgbe mbụ m rụrụ ụdị ọrụ ahụ, ma obi tọrọ anyị ụtọ.”

Siera Lion, n’afọ 1982

Malite mgbe ahụ, e mere ndokwa ka e nwee kafiteria ebe ọtụtụ ụmụnna anyị ga-eji obi ụtọ na-ejere ụmụnna ha ozi. Iso ụmụnna ndị ọzọ rụọ ọrụ nyeere ọtụtụ ndị na-eto eto aka ikpebi ihe ha ga-eji ndụ ha eme n’ozi Jehova. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Gladys Bolton rụrụ na kafiteria ná mgbakọ e mere n’afọ 1937. Ọ sịrị: “Mụ na ndị si ebe dị iche iche rụkọrọ ọrụ. Ha kọkwaara m otú ha si emeri nsogbu ndị na-abịara ha. Ọ bụ mgbe ahụ ka agụụ ịbụ ọsụ ụzọ malitere ịgụ m.”

Onye ọzọ so gaa mgbakọ mgbe ahụ bụ Nwanna Beulah Covey. Ọ sịrị: “Otú ndị niile na-arụ ọrụ si jiri obi ha na-arụ ya mere ka ihe na-aga siriri werere.” Ma, ọrụ ahụ adịghị mfe. Ná mgbakọ e mere n’afọ 1969, ọ bụ mgbe otu nwanna aha ya bụ Angelo Manera rutere n’ámá egwuregwu dị na Lọs Anjelis, Kalịfọnịa, ka ọ matara na ọ bụ ya ga-elekọta kafiteria. Ọ sịrị: “O riri m ọnụ.” Otu n’ime ihe e kwesịrị ime bụ igwu ebe a ga-esi na-enweta gas a ga-eji na-esi nri.

Frankfọt, dị na Jamanị, n’afọ 1951

Ná mgbakọ e mere na Siera Lion n’afọ 1982, ụmụnna wepụtara onwe ha sụchaa ọhịa, jirikwa ihe ndị ha hụrụ rụọ kafiteria. N’afọ 1951, ụmụnna nọ na  Frankfọt dị na Jamanị gara ṅụta isi ụgbọ okporo ígwè, chepụta otú a ga-esi jiri ya na-esi mmiri ọkụ. Ketụl ha ji esi ya dị iri anọ. Ndị na-eke nri na-ekunye puku efere nri iri atọ n’otu awa. Ndị na-asa efere dị narị ise na iri asaa na isii. Iji mee ka ọrụ dịrị ha mfe, a gwara ụmụnna ka ha jiri ngaji nke ha bịa. Ná mgbakọ e mere na Yọngọn dị na Mianmaa, ụmụnna anaghị etinye ose buru ibu ná nri ha na-esiri ndị si mba ọzọ.

“HA GUZO ỌTỌ NA-ERI NRI”

Ná mgbakọ e mere n’Amerịka n’afọ 1950, otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Annie Poggensee kwụ n’ahịrị mgbe anwụ na-acha, na-eche ka e bunye ya nri. Ma, Jehova gọziri ya. Annie sịrị: “M gere ntị nke ọma mgbe ụmụnna nwaanyị abụọ ndị ji ụgbọ mmiri si Yurop bịa mgbakọ ahụ na-akparịta ụka.” Onye nke ọ bụla kọrọ otú Jehova si nyere ya aka ịbịa mgbakọ ahụ. Annie kwuru, sị: “Obi dị ha abụọ ezigbo ụtọ. Ma anwụ na-acha ha ma oge ha ji kwụrụ n’ahịrị enweghị ihe ọ bụụrụ ha.”

Sol, dị na Koria, n’afọ 1963

N’ọtụtụ mgbakọ ndị buru ibu, a na-arụ nnukwu kafiteria, dewechaa tebụl ndị dị elu, bụ́ ebe ndị mmadụ ga-eguzoro ọtọ rie nri. Ọ na-eme ka ha rie ngwa ngwa, nyere ndị ọzọ ohere. A sị na e meghị otú ahụ, o nweghị otú a gaara esi enyecha ìgwè mmadụ ahụ nri n’oge nri ehihie. Otu nwoke na-abụghị nwanna sịrị: “Ahụtụbeghị m ụdị okpukpe a. Ha guzo ọtọ na-eri nri.”

Otú e si hazie ihe niile, ya ana-aga siriri werere tụrụ ndị ọchịchị n’anya, ma ndị agha ma ndị nkịtị. Mgbe ndị agha Amerịka bịara hụchaa kafiteria anyị n’Ámá Egwuregwu Yanki dị na Niu Yọk, ha gwara otu ọchịagha ndị Briten aha ya bụ Faulkner ka ọ gaa jiri anya ya hụrụ. Ọ bụ ya mere ya na nwunye ya ji bịa mgbakọ “Alaeze nke Na-enwe Mmeri” e mere n’afọ 1955 na Twikenam, dị n’Ịngland. Ọ sịrị na ọ bụ ịhụnanya ụmụnna mere kafiteria ahụ ji na-aga siriri werere.

Ruo ọtụtụ afọ, ụmụnna ji obi ha niile na-esi ezigbo nri na-adịghị oké ọnụ, nke ndị bịara mgbakọ ga-eri. Ma, ọ bụghị obere ọrụ. Ọtụtụ ụmụnna na-arụ ọrụ ọtụtụ awa, ya emezie ka ha ghara ịnụ ihe ọ bụla ma ọ bụ ihe ụfọdụ e kwuru ná mgbakọ. Malite n’ihe dị ka n’afọ 1977, e mere ka isi nri ná mgbakọ dịkwuo mfe. Kemgbe afọ 1995, a na-agwazi ụmụnna ka ha buru nri nke ha ma ha bịawa mgbakọ. O meela ka ndị na-arụbu ọrụ ndị ahụ na-egezi ntị nke ọma n’ihe a na-ekwu ná mgbakọ, ha na ụmụnna anọrịakwa. *

O doro anya na Jehova ji ndị ahụ rụsiri ọrụ ike n’oge ahụ kpọrọ ihe. O nwere ike ịna-adị ụfọdụ ndị so rụọ ọrụ na kafiteria ndị ahụ ka e weghachitere ha oge ahụ. Ma, otu ihe doro anya bụ na ịhụnanya ka bụkwa ihe kacha mkpa na-eme ka mgbakọ anyị na-aga nke ọma.—Jọn 13:34, 35.

^ para. 12 Ma, a ka nwere ọtụtụ ọrụ ndị bịara mgbakọ na-ewepụta onwe ha arụ ná ngalaba ndị ọzọ a na-enwe ná mgbakọ.