Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) MEE 2015

 AKỤKỌ NDỤ

Icheta Ịhụnanya Mbụ M Na-enyere M Aka Ịna-atachi Obi

Icheta Ịhụnanya Mbụ M Na-enyere M Aka Ịna-atachi Obi

N’IHE dị ka n’ọnwa isii n’afọ 1970, edina m n’otu ụlọ ọgwụ gọọmenti, n’ebe a na-akpọ Finiksvil, Pensụlvenịa, dị n’Amerịka. Ná nkeji iri atọ ọ bụla, otu nwoke bụ́ nọọsụ na-abịa ele otú obi m si akụ. N’oge ahụ, abụ m onye agha na-arịa ajọ ọrịa na-efe efe. Adị m afọ iri abụọ. Nọọsụ ahụ ji obere ihe tọọ m. Ma ọ chị obi n’aka. M jụrụ ya, sị: “Ọ̀ kwa mmadụ anwụtụbeghị n’ihu gị?” Ụjọ bịara ya, ya asị m, “Mba.”

N’oge ahụ, ike ụwa gwụrụ m. Ma, olee otú m si hụzie onwe m n’ụlọ ọgwụ? Ka m kọtụrụ gị gbasara ndụ m.

OTÚ M SI MATA OTÚ AGHA NA-ADỊ

Ọrịa bịara m mgbe m na-arụ ọrụ n’ebe a na-anọ awa ndị mmadụ ahụ́ n’oge a na-alụ agha Vietnam. Obi na-adị m ụtọ inyere ndị ọrịa ma ọ bụ ndị e merụrụ ahụ́ aka. Ekpebiri m na m ga-abụ dọkịta na-awa ahụ́. M gara Vietnam n’ọnwa Julaị afọ 1969. Ebe ahụ na-ekpo ezigbo ọkụ. Oge ha dịkwa iche. A hapụrụ m ka m jiri otu izu mee ka obodo ahụ mara m ahụ́. Ọ bụ ihe a na-emere ndị niile bịara ọhụrụ.

M mechara gaa n’ebe e nyere m ọrụ, ya bụ, n’otu ụlọ ọgwụ a na-anọ awa ndị mmadụ ahụ́, n’ebe a na-akpọ Mekọng Delta, nke dị n’obodo Dọng Tam. Ọ dịghị anya, e jiri ọtụtụ ụgbọelu bute ndị agha e gburu egbu na ndị e merụrụ ahụ́. Ahụrụ m obodo m n’anya, ịrụ ọrụ na-atọkwa m ụtọ. N’ihi ya, m chọsiri ike iso nye aka ozugbo. A kwadebere ndị ahụ e merụrụ ahụ́ ma buga ha ozugbo n’obere ebe a ga-anọ waa ha ahụ́. Ndị dọkịta abụọ na ndị nọọsụ abụọ na-anọ ná ntakịrị ebe ahụ na-anwa ike ha ịzọ ndụ ndị agha ahụ. Achọpụtara m na e nwere nnukwu akpa ojii ndị a na-ebupụtaghị n’ụgbọelu ndị ahụ. A gwara m na ihe dị na ha bụ akụkụ ahụ́ ndị agha a gbajasịrị n’ọgbọ agha. Esi m otú ahụ mata otú agha na-adị.

M MALITERE ỊCHỌ CHINEKE

Mgbe m bụ nwa okorobịa, e nwere eziokwu Baịbụl ndị m mụtara n’aka Ndịàmà Jehova

Mgbe m bụ nwa okorobịa, e nwere eziokwu Baịbụl ndị m mụtara n’aka Ndịàmà Jehova. Ha na-abịa amụrụ mama m ihe. Ma, o nweghị ọganihu ọ bụla, nke o ji eme baptizim. N’oge ahụ, ọ na-atọ m ụtọ ịnọ mgbe ha na-amụrụ mama m  ihe. E nwere otu ụbọchị mụ na di mama m so na-agafe otu Ụlọ Nzukọ Alaeze, mụ ajụọ ya, sị, “Olee ebe dị ihe a?” Ya asị m, “Anwala anwa gaa ndị a nso.” Ahụrụ m di mama m n’anya ma tụkwasị ya obi. N’ihi ya, m mere ihe ahụ ọ gwara m. Malite mgbe ahụ, o nweghịzi ihe jikọrọ mụ na Ndịàmà Jehova.

Mgbe m si agha Vietnam lọta, aghọtara m na m kwesịrị ịmata onye Chineke bụ. Ihe ndị mere n’agha ahụ mere ka obi gbawaa m. O yiri ka o nweghị onye ghọtara ihe na-eme na Vietnam. Echetara m oge ndị e mere ngagharị iwe, ndị mmadụ ana-akpọ ndị agha Amerịka ‘ndị na-egbu ụmụaka,’ n’ihi na ha nụrụ na a na-egbu ọtụtụ ụmụaka na-enweghị ihe ha mere n’agha ahụ.

Amalitere m ịga chọọchị dị iche iche n’ihi na m chọrọ ịmata Chineke. M hụrụ Chineke n’anya kemgbe, ma ihe m hụrụ na chọọchị gwụrụ m ike. Emechara m gaa n’otu Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova dị na Flọrịda. Ọ bụ n’ụbọchị Sọnde n’ọnwa Febụwarị afọ 1971.

M batara mgbe ọ fọrọ obere ka e kwuchaa okwu ihu ọha. M nọzi a mụọ Ụlọ Nche. Echetaghị m isiokwu a mụrụ, ma m ka na-echeta otú ụmụaka si na-asapeta ebe a ga-agụ na Baịbụl ha. Ọ tọgburu m atọgbu. M gere ntị nke ọma, leruokwa anya n’ihe a na-eme. Mgbe m chọrọ ịla, otu nwanna nwoke dị ihe dị ka afọ iri asatọ bịakwutere m. Aha ya bụ Jim Gardner. O nyere m akwụkwọ bụ́ Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh-Ebi ma sị m, “Biko, were akwụkwọ a.” Mụ na ya kwuziri na ọ ga-abịa n’ụtụtụ Tọzdee ka anyị malite ịmụ ihe.

M gara ọrụ n’abalị Sọnde ahụ. M na-arụ n’ebe a na-edewe ndị ihe gbata gbata mere n’otu ụlọ ọgwụ na-abụghị nke gọọmenti na Flọrịda. M na-amalite ọrụ n’elekere iri na otu nke abalị, mechie n’elekere asaa nke ụtụtụ. M gụrụ akwụkwọ ahụ n’ihi na enweghị m ọtụtụ ọrụ n’abalị ahụ. Otu nọọsụ ka m n’ọkwá bịara napụ m akwụkwọ ahụ, lee azụ ya anya, sị m, “Ị̀ chọrọ ịbụ Onyeàmà Jehova?” M naara ya akwụkwọ ahụ, sị ya, “Naanị ọkara ya ka m gụrụla, ma o yiri ka m ga-abụ.” Ọ hapụrụ m pụwa. Agụchara m ya n’abalị ahụ.

Ọ bụ Nwanna Jim Gardner mụụrụ m ihe. Ọ bụ onye e tere mmanụ, marakwa Nwanna Charles Taze Russell

Ihe mbụ m jụrụ Nwanna Gardner mgbe anyị chọrọ ịmalite ịmụ ihe bụ, “Ehee, gịnịdị ka anyị ga-amụ?” Ọ sịrị, “Akwụkwọ ahụ m nyere gị.” Mụ asị ya, “Agụchaala m ya.” Nwanna Gardner weturu obi sị m, “Ka anyị mụgodị isi nke mbụ.” Ọ tụrụ m n’anya na e nwere ọtụtụ ihe m na-aghọtaghị mgbe m gụrụ ya. Ọ gwara m ka m jiri Baịbụl King James m gụọ ọtụtụ amaokwu Baịbụl dị ebe ahụ. Ọ bụ mgbe ahụ ka m mechara mụwa banyere ezi Chineke bụ́ Jehova. Ihe m na-akpọ Nwanna Gardner bụ Jim n’ihi na anyị dị n’ezigbo mma. N’ụtụtụ ahụ, anyị mụrụ isi nke mbụ ruo nke atọ n’akwụkwọ ahụ. Ụtụtụ Tọzdee  ọ bụla, anyị na-amụ isiokwu atọ. Ihe anyị na-amụ tọrọ m ezigbo ụtọ. Ọ bụ ezigbo ihe ùgwù na nwanna ahụ mụụrụ m ihe bụ onye e tere mmanụ, marakwa Nwanna Charles T. Russell.

Ka izu ole na ole gachara, e mere m onye nkwusa. Jim nyeere m aka ma n’ozi ụlọ n’ụlọ ma n’ọtụtụ ihe ndị ọzọ siiri m ike. (Ọrụ 20:20) Ka mụ na ya na-eso aga ozi ọma, ikwusa ozi ọma malitere ịtọ m ụtọ. M ka weere ikwusa ozi ọma ka ihe ùgwù kachanụ m nwere. Obi dị m ezigbo ụtọ na mụ na Chineke na-arụkọ ọrụ.—1 Kọr. 3:9.

ONYE MBỤ M HỤRỤ N’ANYA BỤ JEHOVA

Ka m kọziere gị banyere ihe dị m ezigbo mkpa, ya bụ, ịhụnanya m nwere na mbụ n’ebe Jehova nọ. (Mkpu. 2:4) Ịhụnanya ahụ nyeere m aka idi ihe ndị m na-echeta mere n’oge agha nakwa ọtụtụ nsogbu ndị ọzọ.—Aịza. 65:17.

Ịhụnanya m nwere n’ebe Jehova nọ nyeere m aka idi ihe ndị m na-echeta mere n’oge agha nakwa ọtụtụ nsogbu ndị ọzọ

E mere m baptizim n’ọnwa Julaị afọ 1971 ná mgbakọ distrikti “Aha Nsọ” e mere n’Ámá Egwuregwu Yanki

M na-echeta otu ụbọchị pụrụ iche n’afọ 1971. Ọ dịbeghị anya mama m na di ya chụpụrụ m n’ebe ha nyere m ka m biri. Di mama m achọghị ka Onyeàmà Jehova biri n’ụlọ ya. Ego m nwere mgbe ahụ enweghị ihe ọ bụ. Ụlọ ọgwụ ebe ahụ m na-arụ na-akwụ m ụgwọ izu abụọ ọ bụla. Eji m ego a kwụrụ m zụọ uwe m ga-eyi na-aga ozi ọma, ka m dịtụkwanụ ka onye na-efe Jehova. Ego m dewere dị n’otu ụlọ akụ̀ dị na Michigan, bụ́ ebe m nọ too. N’ihi ya, m rahụrụ n’ụgbọala m ụbọchị ole na ole. Ọ na-abụ m chọọ ịkpụ afụ ọnụ ma ọ bụ ịsa ahụ́, mụ agaa n’ebe a na-asa ahụ́ dị n’ebe a na-ere mmanụ ụgbọala.

Otu ụbọchị n’oge ahụ m na-ehi n’ụgbọala m, m gara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze awa ole na ole tupu a malite nzukọ ozi ubi. M ka rụchara ọrụ m na-arụ n’ụlọ ọgwụ. Ka m nọ ọdụ n’azụ Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ebe mmadụ na-agaghị ahụ m, ihe ndị  mere n’agha Vietnam bịara ju m isi, ma ísì ahụ́ mmadụ ọkụ na-ere ma ọbara ndị mmadụ m hụrụ. Ọ dị m ka m̀ na-anụ olu ụmụ okorobịa, na-ahụkwa ha ka onye nke ọ bụla na-asị m, “M̀ ga-adị ndụ? M̀ ga-adị ndụ?” Ama m na ha ga-anwụ. Ma, m gbalịrị ịkasi ha obi otú m nwere ike, jidekwa onwe m ka ihu m ghara ime ka ha mata na ha ga-anwụ. Ka m nọ ebe ahụ, o nweghị ụdị ihe na-abataghị m n’obi.

M na-agbalịsi ike ka m ghara ịkwụsị ịhụ Jehova n’anya otú m hụrụ ya na mbụ, karịchaa, mgbe nsogbu na ọnwụnwa bịaara m

Anya mmiri juru m anya, mụ ekpewe ekpere. (Ọma 56:8) M malitere ichesi echiche ike banyere olileanya mbilite n’ọnwụ. Ọ bụ mgbe ahụ ka m ghọtara na Jehova Chineke ga-eji mbilite n’ọnwụ mee ka ndị ahụ niile e gburu n’agha dị ndụ ọzọ, meekwa ka mụ na ndị ọzọ chefuo ihe ọjọọ ahụ niile. Chineke ga-akpọlite ụmụ okorobịa ndị ahụ n’ọnwụ, a kụziere ha eziokwu banyere ya. (Ọrụ 24:15) Eji m obi m niile kelee Jehova, sikwa n’ala ala obi m hụkwuo ya n’anya. Anaghị m echefu ụbọchị ahụ echefu. Kemgbe ahụ, m na-agbalịsi ike ka m ghara ịkwụsị ịhụ Jehova n’anya otú m hụrụ ya na mbụ, karịchaa, mgbe nsogbu na ọnwụnwa bịaara m.

JEHOVA NA-ELEKỌTA M NKE ỌMA

N’oge agha, o nweghị ụdị arụrụala ndị mmadụ na-anaghị arụ. Esokwa m rụọ ụfọdụ arụrụala. Ma, ihe nyeere m aka bụ ịtụgharị uche n’ebe abụọ na-amasị m na Baịbụl. Nke mbụ bụ Mkpughe 12:10, 11. Ebe ahụ kwuru na ọ bụghị naanị ozi ọma anyị na-ezi ka e ji emeri Ekwensu, kama e jikwa ọbara Nwa Atụrụ ahụ emeri ya. Nke abụọ bụ Ndị Galeshia 2:20. Amaokwu ahụ mere ka m ghọta na Kraịst Jizọs nwụrụ “maka m.” Jehova agbagharala m ihe niile m mere n’ihi àjà Jizọs ji ọbara ya chụọ. Ihe a m ghọtara emeela ka akọnuche m ghara ịna-ama m ikpe, meekwa ka m na-eme ihe ọ bụla m nwere ike ime iji nyere ndị ọzọ aka ịmata eziokwu banyere Jehova Chineke onye obi ebere.—Hib. 9:14.

M cheta ihe ndị mere ná ndụ m, m na-aghọta na Jehova na-elekọta m mgbe niile. Dị ka ihe atụ, ụbọchị Jim chọpụtara na ọ bụ n’ụgbọala m ka m na-ehi, ọ kpọgara m na nke otu nwanna nwaanyị nwere ụlọ ebe ndị mmadụ na-ebi. Ama m na Jehova ji Jim na nwanna nwaanyị ahụ nye m ebe dị mma m ga-ebi. Jehova dị nnọọ obiọma. Ọ na-elekọta ndị ji obi ha niile efe ya.

ỊNỤ ỌKỤ N’OBI MA DỊ AKỌ

N’ọnwa Mee afọ 1971, m gara Michigan ịrụ ọrụ. Tupu mụ ahapụ ọgbakọ ahụ dị na Flọrịda, m kpojuru akwụkwọ anyị na buutu ụgbọala m, tinye isi n’ụzọ awara awara gawara n’ebe ugwu. Akwụkwọ ahụ gwụrụ mgbe m na-agabeghịdị ọkara ebe m na-aga. M ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma n’ụdị ebe ọ bụla. M kwụsịtụrụ n’ụlọ mkpọrọ zie ndị mmadụ ozi ọma. M nyedịrị ụfọdụ ndị traktị n’ebe ndị na-aga ihe na-akwụsịtụ anyụ mamịrị. Ruo taa, m ka na-eche ma è nwere nke pulitere n’ime mkpụrụ ndị ahụ m kụrụ.—1 Kọr. 3:6, 7.

Mgbe m mụtara eziokwu, otú m si edowe ọnụ ezi ndị mmadụ ozi ọma adịghị mma, karịchaa ndị ezinụlọ anyị. N’ihi otú m si jiri obi m niile hụ Jehova n’anya kemgbe m mụtara eziokwu, m ji obi ike na-ekwusa ozi ọma n’ezoghị ọnụ. M hụrụ ụmụnne m abụọ, bụ́ John na Ron, n’anya nke ukwuu. Eji m oké ịnụ ọkụ n’obi na-ezi ha ozi ọma. M mechara rịọ ha mgbaghara maka otú m si dowe ọnụ na-ezi ha ozi ọma. Ma, m ka na-ekpe ekpere ka ha mụta eziokwu Baịbụl. Kemgbe ahụ, Jehova na-akụziri m ihe. Amụtakwuola m otú m ga-esi jiri akọ na-ezi ndị mmadụ ozi ọma, na-akụzikwara ha ihe.—Kọl. 4:6.

 NDỊ ỌZỌ M HỤRỤ N’ANYA

Ọ bụ eziokwu na m na-echeta ịhụnanya m nwere n’ebe Jehova nọ, anaghị m echefu ndị ọzọ m hụrụ n’anya. Onye mbụ n’ime ha bụ ezigbo nwunye m, bụ́ Susan. Ama m na m chọrọ ịlụ onye ga-enyere m aka n’ọrụ gbasara Alaeze Chineke. Susan ji obi ya niile hụ Jehova n’anya. M chetara ụbọchị m gara n’ụlọ ha mgbe anyị na-akpa. Susan nọ n’ihu ụlọ ha dị na Kranstịn, na steeti a na-akpọ Rod Aịland, na-agụ Ụlọ Nche. O jikwa Baịbụl ya. Ihe masịrị m bụ na ihe ọ na-agụ bụ isiokwu ndị ọzọ dị n’Ụlọ Nche ahụ, na-agụkwa amaokwu Baịbụl ndị e dere na ha. M gwara onwe m, sị, ‘Nwanna nwaanyị a hụrụ Jehova n’anya.’ Anyị lụrụ n’ọnwa Disemba afọ 1971. Obi dị m ụtọ na ọ na-akwado m kemgbe ahụ. Ihe na-eme m ezigbo obi ụtọ bụ na ọ bụ eziokwu na ọ hụrụ m n’anya, nke ọ hụrụ Jehova ka.

Mụ na nwunye m, bụ́ Susan, na ụmụ anyị, bụ́ Paul na Jesse

Mụ na Susan mụtara ụmụ nwoke abụọ. Aha ha bụ Jesse na Paul. Ka ha na-eto, Jehova nọnyeere ha. (1 Sam. 3:19) Ebe ọ bụ na ha jisiri eziokwu anyị kụziiri ha ike, anyị ji ha eme ọnụ. Ha ka na-efe Jehova n’ihi na ha na-echeta ịhụnanya mbụ ha nwere n’ebe ọ nọ. Onye nke ọ bụla n’ime ha ejeela ozi oge niile ihe karịrị iri afọ abụọ. Ejikwa m ndị nwunye ụmụ m eme ọnụ. Aha ha bụ Stephanie na Racquel. M weere ha ka  ụmụ m. Ndị ụmụ m lụrụ bụ ụmụ nwaanyị ji obi ha niile hụ Jehova Chineke n’anya.—Efe. 6:6.

Mgbe anyị gara kwusaa ozi ọma n’ókèala a na-adịghị ezikarị ozi ọma na ya

Mgbe e mechara m baptizim, m jere ozi afọ iri na isii na Rod Aịland. M metara ọtụtụ ndị enyi n’ebe ahụ. Obi na-adị m ụtọ ma m cheta ọtụtụ ndị okenye ma nke a na-akọ mụ na ha jekọrọ ozi. Obi dịkwa m ụtọ maka imirikitiimi ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị ndị m mụtara ezigbo ihe n’aka ha. Ọ bụ ezigbo ihe ùgwù na ndị mụ na ha rụkọrọ ọrụ bụ ndị na-ekweghị ka ịhụnanya mbụ ha nwere n’ebe Jehova nọ nyụọ ka ọkụ. N’afọ 1987, anyị kwagara n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu na Nọt Karolaịna. Anyị nwetakwara ọtụtụ ndị enyi n’ebe ahụ. *

Ebe m na-eduzi nzukọ ozi ubi mgbe m bụ onye nlekọta sekit

N’ọnwa Ọgọst afọ 2002, a kpọrọ mụ na Susan ka anyị bịa jewe ozi na Betel dị na Patasịn, n’Amerịka. M rụrụ ọrụ na Ngalaba Ije Ozi, Susan arụọ n’ebe a na-asa ákwà. Ịrụ ọrụ n’ebe ahụ tọgburu ya atọgbu. N’ọnwa Ọgọst afọ 2005, a họpụtara m ka m soro n’Òtù Na-achị Isi. Ọ dị m ka mụ erughị eru ịrụ ọrụ a. Ihe ùgwù a riri nwunye m ọnụ, ma ọrụ dị na ya ma ebe ndị anyị ga na-aga. Ụjọ ụgbọelu na-atụ Susan, ma anyị na-aba ya ugboro ugboro. Susan kwuru na ihe ụmụnna nwaanyị ndị ọzọ di ha so n’Òtù Na-achị Isi gwara ya enyerela ya aka ikpebisi ike iji obi ya niile na-akwado m n’ọrụ a. Ọ na-eme otú ahụ n’eziokwu, m hụkwara ya n’anya maka ya.

N’ọfis m, e nwere ọtụtụ foto m na-anaghị eji egwu egwu. Ha na-echetara m ndụ bara uru m birila. Jehova emeerela m ọtụtụ ihe ọma maka na m ji obi m niile na-echeta ịhụnanya mbụ m nwere n’ebe ọ nọ.

Obi na-adị m ụtọ mgbe mụ na ndị ezinụlọ m na-anọrị

^ para. 31 A kọrọ ọtụtụ ihe gbasara ozi oge niile Nwanna Morris jere n’Ụlọ Nche Mach 15, 2006, peeji nke 26.