Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) EPREL 2015

Tụkwasị Jehova Obi Mgbe Niile

Tụkwasị Jehova Obi Mgbe Niile

“Tụkwasịnụ ya obi mgbe niile.”—ỌMA 62:8.

1-3. Gịnị mere obi ji sie Pọl ike na Jehova ga-enyere ya aka? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

IHE siiri Ndị Kraịst bi na Rom ezigbo ike n’oge ochie. E boro ha ebubo na ọ bụ ha gbara obodo Rom ọkụ n’afọ 64 nakwa na ha kpọrọ ndị mmadụ ibe ha asị. Mmadụ niile kpọkwara ha asị. A sị na ị bụ Onye Kraịst n’oge ahụ, e nwere ike ịbịa otu ụbọchị kpụrụ gị, taa gị ahụhụ. O nwekwara ike ịbụ na e nweela ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị ndị anụ ọhịa dọgburu ma ọ bụ ndị a kpọgidere n’osisi, kpọọ ha ọkụ ka e jiri ha na-ahụ ụzọ n’abalị.

2 O yiri ka ọ̀ bụ n’oge ahụ ihe na-esiri Ndị Kraịst ike ka a tụrụ Pọl onyeozi mkpọrọ nke ugboro abụọ na Rom. Ụmụnna hà ga-abịa nyere ya aka? O nwere ike ịbụ ihe Pọl nọ na-eche, n’ihi na o degaara Timoti akwụkwọ ozi, sị: “Mgbe m na-azara ọnụ m na nke mbụ ya, ọ dịghị onye dịnyeere m, kama ha niile malitere ịgbahapụ m—ya esola n’ihe a ga-agụkọrọ ha.” Ma, Pọl ghọtara na a hapụghị ya ka ọ nọrọ naanị ya. O dere, sị: “Ma, Onyenwe anyị guzoro m nso ma nye m ike.” N’eziokwu, Jizọs nyere ya ike idi nsogbu ya. O doro anya na ọ baara Pọl uru. O dere, sị:  “A napụtakwara m n’ọnụ ọdụm.”—2 Tim. 4:16, 17. *

3 Pọl chetara otú Jehova si nyere ya aka n’oge gara aga. Obi sikwara ya ike na Jehova ga-enye ya ike ọ ga-eji die nsogbu ọ nọ na ya nakwa ndị ga-abịa n’ọdịnihu. O kwuru ozugbo, sị: “Onyenwe anyị ga-anapụta m n’ajọ ọrụ niile.” (2 Tim. 4:18) N’eziokwu, Pọl mụtara na ọ bụrụgodị mgbe ụmụ mmadụ na-enweghị ike inyere ya aka, Jehova na Jizọs ga-enyere ya aka.

MGBE Ị GA-EGOSI NA Ị ‘TỤKWASỊRỊ JEHOVA OBI’

4, 5. (a) Ònye ga na-enyere gị aka mgbe niile? (b) Olee otú ị ga-esi mee ka gị na Jehova dịkwuo ná mma?

4 Ò nwetụla mgbe ọ dị gị ka o nweghị onye ga-enyere gị aka ná nsogbu gị? O nwere ike ịbụ enweghị ọrụ, nsogbu a na-enye gị n’ụlọ akwụkwọ, ọrịa, ma ọ bụ ụdị nsogbu ọzọ. O nwere ike ịbụ na ị gwala ndị ọzọ ka ha nyere gị aka, ma e nweghị onye nyeere gị aka. Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere ụdị nsogbu ndị mmadụ na-agaghị akwụsịli. Ọ bụrụ na ụdị nsogbu ahụ abịara gị, gịnị ka ị ga-eme? Baịbụl gwara anyị, sị: “Tụkwasị Jehova obi.” (Ilu 3:5, 6) Obi ò kwesịrị isi gị ike na Jehova ga-enyere gị aka? Eenụ. Ihe Baịbụl kọrọ banyere ọtụtụ ndị mere ka anyị kweta na Jehova na-enyere ndị ohu ya aka.

5 N’ihi ya, kama iwewe iwe mgbe o yiri ka o nweghị onye na-enyere gị aka, were ya na ọ bụ oge i kwesịrị iji tụkwasị Jehova obi gị niile otú ahụ Pọl mere. Ị ga-ejikwa oge ahụ chọpụta na ihe banyere gị na-emetụ Jehova n’obi. Ihe ndị a ga-eme ka ị tụkwasịkwuo Chineke obi, gị na ya adịkwuo ná mma.

ỊTỤKWASỊ CHINEKE OBI GA-EME KA ANYỊ NA YA DỊ NÁ MMA

6. Olee ihe mere o nwere ike iji siere anyị ike ịtụkwasị Jehova obi mgbe nsogbu tara akpụ bịaara anyị?

6 O nwere ike ịbụ na e nwere nsogbu na-echu gị ụra. I meela ihe niile i nwere ike ime, kpeekwa ekpere ka Jehova nyere gị aka. Obi ò kwesịrị iru gị ala ugbu a n’ihi na obi siri gị ike na Chineke ga-enyere gị aka? Eenụ. (Gụọ Abụ Ọma 62:8; 1 Pita 5:7.) Ọ bụrụ na ị chọrọ ka gị na Jehova dị ná mma, i kwesịrị ịna-atụkwasị ya obi. Ma, ọ naghị adị mfe mgbe niile. N’ihi gịnị? Otu n’ime ihe kpatara ya bụ na ọ bụghị mgbe niile ka Jehova na-aza ekpere ozugbo.—Ọma 13:1, 2; 74:10; 89:46; 90:13; Hab. 1:2.

7. Gịnị mere na ọ bụghị mgbe niile ka Jehova na-aza ekpere anyị ozugbo?

7 Gịnị mere na ọ bụghị mgbe niile ka Jehova na-aza ekpere anyị ozugbo? Cheta na Baịbụl kwuru na Jehova dị ka nna anyị. (Ọma 103:13) Nwatakịrị ekwesịghị ịtụ anya na nna ya ga-emere ya ihe niile ọ rịọrọ ya ma ọ bụ nye ya ihe ọ bụla ọ rịọrọ ozugbo. Mgbe ụfọdụ, nwatakịrị nwere ike ịnọkata rịọ nna ya ihe, e mechaa ọ gaghịzi achọ ihe ahụ. O nwekwara ike ịrịọ ihe a na-ekwesịghị imere ya ozugbo. O nwedịrị ike ịrịọ ihe na-agaghị abara ya uru ma ọ bụ ihe nwere ike ịkpatara ndị ọzọ nsogbu. Ọ bụrụ na nna ya na-enye ya ihe ọ bụla ọ rịọrọ ozugbo, ọ ga-apụta na ọ bụ nwatakịrị ahụ na-ekwuzi nke na-eme. Otú ahụ ka ọ dị anyị na Jehova bụ́ Nna anyị nke eluigwe. O nwere ike ikwe ka oge gafetụ tupu ya emee ihe anyị rịọrọ ya n’ihi na ọ na-echere anyị echiche ọma. Ọ bụ ya kere anyị. Ọ hụrụ anyị n’anya, marakwa ihe. N’ihi ya, ọ ma mkpa anyị. Ọ bụkwa ya ga-ekpebi oge kacha mma ọ ga-emere anyị ihe anyị  rịọrọ ya. Ọ bụrụ na o meere anyị ihe niile anyị rịọrọ ya ozugbo, a gaghịzi ama anyị na ya onye bụ́ nna na onye bụ́ nwa.—Tụlee Aịzaya 29:16; 45:9.

8. Olee ihe Jehova kwere anyị ná nkwa banyere nsogbu bịaara anyị?

8 Ihe ọzọ bụ na Jehova ma ihe anyị na-agaghị emeli. (Ọma 103:14) N’ihi ya, ọ naghị atụ anya ka anyị jiri ike anyị die nsogbu ndị bịaara anyị, kama, ọ na-enyere anyị aka otú nna si enyere nwa ya aka. N’eziokwu, ike ụwa nwere ike ịgwụ anyị mgbe ụfọdụ. Ma, Jehova kwere anyị nkwa na ọ gaghị ekwe ka ọnwụnwa karịrị anyị bịara anyị. Ọ ‘ga-emere anyị ụzọ mgbapụ.’ (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 10:13.) N’ihi ya, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ma ihe anyị ga-edili.

9. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na Jehova azaghị ekpere anyị ozugbo?

9 Ọ bụrụ na anyị ekpee ekpere ka Jehova nyere anyị aka, ma ọ zaghị anyị ozugbo, ka anyị nwee ndidi maka na ọ ma mgbe ọ ga-aza ya. Chetakwa na ọ dị njikere inyere anyị aka, ma ọ na-enwe ndidi ka oge ọ ga-aza ekpere anyị ruo. Baịbụl kwuru, sị: “Jehova ga na-atụ anya imere unu amara, n’ihi ya ọ ga-ebili imere unu ebere. N’ihi na Jehova bụ Chineke nke ikpe ziri ezi. Obi ụtọ na-adịrị ndị niile na-atụ anya ya.”—Aịza. 30:18.

‘ỌNỤ ỌDỤM’

10-12. (a) Olee ihe nwere ike ime ka o siere Onye Kraịst ike ilekọta onye ezinụlọ ya na-arịa ọrịa? (b) Olee otú ịtụkwasị Jehova obi mgbe ihe siri ike ga-esi metụta adịm ná mma anyị na ya? Nye ihe atụ.

10 Mgbe ị nọ ná nnukwu nsogbu, o nwere ike ịdị gị ka ị̀ nọ “n’ọnụ ọdụm” otú ahụ ọ dị Pọl. N’ụdị oge ahụ, ịtụkwasị Jehova obi na-esi ezigbo ike. Ma, ọ bụ ihe anyị kwesịrị ime. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na ị na-elekọta onye ezinụlọ unu na-arịa ọrịa na-anaghị ala ala. I kpeela ekpere, rịọ Jehova ka o nye gị amamihe na ike. * I mechaa ihe niile i nwere ike ime, ọ̀ bụ na obi agaghị eru gị ala na Jehova na-ahụ gị nakwa na ọ ga-eme ka i nwee ike ịna-atachi obi?—Ọma 32:8.

11 Ihe ndị na-emenụ nwere ike ime ka ọ dị gị ka Jehova anaghị enyere gị aka. O nwere ike ịbụ na ihe ndị dọkịta na-agwa gị dị iche iche ma ọ bụ na ndị ezinụlọ gị ị tụrụ anya na ha ga-akasi gị obi na-emezi ka ihe sikwuoro gị ike. Ụdị ihe a mee, na-arịọ Jehova ka o nye gị ike. Gbalịsie ike ka ị bịarukwuo ya nso. (Gụọ 1 Samuel 30:3, 6.) Mgbe ị ga-emecha hụ otú Jehova si nyere gị aka, gị na ya ga-adịkwu ná mma.

12 Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Linda * chọpụtara na ihe a bụ eziokwu mgbe o lekọtachara nne ya na nna ya rịara ọrịa afọ ole na ole tupu ha anwụọ. O kwuru, sị: “N’oge ahụ, o siiri mụ na di m na nwanne m nwoke ike ịma ihe anyị ga-eme. E nwere mgbe ọ dị anyị ka o nweghị onye ga-enyeliri anyị aka. Ma, anyị cheta ihe ndị mere mgbe ahụ, anyị na-aghọta otú Jehova si nyere anyị aka. O nyere anyị ike idi nsogbu ndị ahụ, gbookwara anyị mkpa anyị, ma mgbe anyị na-amaghịzi ihe anyị ga-eme.”

13. Olee otú ịtụkwasị Jehova obi si nyere otu nwanna nwaanyị aka n’ọdachi ndị dakwasịrị ya?

13 Ịtụkwasị Jehova obi anyị niile ga-enyere anyị aka mgbe ọdachi dakwasịrị anyị. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Rut chọpụtara na ihe a bụ eziokwu. Di ya na-abụghị Onyeàmà Jehova chọrọ  ịgba ya alụkwaghịm. N’oge ahụkwa, a chọpụtara na nwanne ya nwoke na-arịa ọrịa ọjọọ nke nwere ike igbu ya. Ka ọnwa ole na ole gara, nwunye nwanne ya nwoke ahụ nwụrụ. Mgbe ọ dị Rut ka ò nwetatụwala onwe ya, ọ malitere ịsụ ụzọ oge niile. O teghị aka, mama ya anwụọ. Gịnị nyeere Rut aka idi nsogbu ndị ahụ? O kwuru, sị: “M na-agwa Jehova okwu kwa ụbọchị ma kọọrọ ya ihe ọ bụla m chọrọ ikpebi, ọ bụrụgodị obere ihe. Ime otú ahụ mere ka m ghọta na Jehova dị adị, meekwa ka m mụta ịna-atụkwasị ya obi, kama ịtụkwasị onwe m ma ọ bụ ndị ọzọ obi. Jehova nyekwaara m aka ma gbooro m mkpa m niile. Esila m otú ahụ soro ya na-aga ụkwụ na ụkwụ.”

Ọ bụrụgodị n’ezinụlọ, nsogbu ụfọdụ bịaara anyị nwere ike ime ka a mata ma ànyị tụkwasịrị Jehova obi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14 ruo 16)

14. Olee otú Jehova ga-esi nyere mmadụ aka ma a chụọ onye ezinụlọ ha n’ọgbakọ?

14 Chegodị banyere ụdị nsogbu ọzọ. Ka e were ya na a chụrụ onye ezinụlọ unu n’ọgbakọ. Ihe ị mụtara na Baịbụl emeela ka ị mata otú i kwesịrị isi na-emeso ndị a chụrụ n’ọgbakọ. (1 Kọr. 5:11; 2 Jọn 10) Ma, ebe ọ bụ na ị hụrụ onye ahụ n’anya, o nwere ike isiri gị ezigbo ike ime ihe ahụ Baịbụl kwuru. O nwedịrị ike iyi ihe na-agaghị ekwe omume. * Ị̀ ga-atụkwasị Nna gị nke eluigwe obi na ọ ga-enye gị ike ị ga-eji rubere ya isi? Ị̀ ga-aghọta na i kwesịrị iji oge ahụ bịarukwuo Jehova nso?

15. Gịnị mere Adam ji nupụrụ Jehova isi n’Iden?

15 Ka anyị chegodị banyere nwoke mbụ bụ́ Adam. Ò chere na ọ ka ga-adị ndụ ebighị ebi ma o nupụrụ Jehova isi? Mbanụ. Baịbụl kwuru na ‘ọ bụghị Adam ka a ghọgburu.’ (1 Tim. 2:14) Gịnịkwanụ  mere o ji nupụrụ Chineke isi? Ihe mere o ji taa mkpụrụ osisi ahụ nwunye ya nyere ya bụ na ọ hụrụ nwunye ya n’anya karịa Jehova. O gere nwunye ya ntị kama ige ntị n’iwu Chineke nyere ya.—Jen. 3:6, 17.

16. Ònye ka anyị kwesịrị ịkacha hụ n’anya, maka gịnị?

16 Ọ̀ pụtara na anyị ekwesịghị ịhụ ndị ezinụlọ anyị n’anya nke ukwuu? Mbanụ. Ma, ọ bụ Jehova ka anyị kwesịrị ịkacha hụ n’anya. (Gụọ Matiu 22:37, 38.) Ọ ga-eme ka anyị nwee ike inyere ndị ezinụlọ anyị ezigbo aka, ma hà na-efe Jehova ugbu a ma ọ bụ na ha anaghị efe ya. N’ihi ya, gbaa mbọ ka ị hụkwuo Jehova n’anya ma tụkwasịkwuo ya obi. Ọ bụrụ na ihe banyere onye ezinụlọ unu a chụrụ n’ọgbakọ na-echu gị ụra, kọọrọ Jehova otú obi dị gị. * (Rom 12:12; Fil. 4:6, 7) N’agbanyeghị na ihe merenụ na-ewute gị, jiri oge ahụ mee ka gị na Jehova dịkwuo ná mma. I mee otú ahụ, obi ga-esi gị ike na irubere Jehova isi na ịtụkwasị ya obi ga-emecha baa ezigbo uru.

MGBE ANYỊ NA-ECHERE JEHOVA

Na-arụsi ọrụ Jehova ike iji gosi na ị tụkwasịrị ya obi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)

17. Ọ bụrụ na anyị na-ekwusasi ozi ọma ike, olee otú ọ ga-esi gosi na anyị tụkwasịrị Jehova obi?

17 Gịnị mere Jehova ji ‘napụta Pọl n’ọnụ ọdụm’? Pọl kwuru, sị: “Ka e wee site n’aka m kwusaa ozi ọma ahụ n’ụzọ zuru ezu, ka mba niile wee nụkwa ya.” (2 Tim. 4:17) Ọ bụrụ na anyị na-ekwusasi ozi ọma ike otú ahụ Pọl mere, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ‘ga-atụkwasịrị’ anyị ihe ndị ọzọ dị anyị mkpa. (Mat. 6:33) Jehova enyela anyị ọrụ ikwusa “ozi ọma,” kpọọkwa anyị ‘ndị ha na ya na-arụkọ ọrụ.’ (1 Tesa. 2:4; 1 Kọr. 3:9) Ọ bụrụ na anyị na-arụsi ọrụ a ike, ọ ga-adịrị anyị mfe ichere Jehova.

18. Olee otú ị ga-esi mee ka ị tụkwasịkwuo Jehova obi, meekwa ka gị na ya dịkwuo ná mma?

18 N’ihi ya, na-agba mbọ kwa ụbọchị ka gị na Chineke dịkwuo ná mma. E nwee ihe ọ bụla na-echu gị ụra, jiri oge ahụ bịarukwuo Jehova nso. Na-agụ Baịbụl bụ́ Okwu Chineke, na-amụ ya, na-atụgharịkwa uche n’ihe ị na-amụ. Na-ekpe ekpere mgbe niile ma na-arụsi ọrụ Chineke ike. I mee ihe ndị a, obi ga-esi gị ike na Jehova ga-enyere gị aka idi nsogbu niile bịaara gị ugbu a nakwa nke ọ bụla ga-abịa n’ọdịnihu.

^ para. 2 “Ọnụ ọdụm” ahụ nwere ike ịbụ nsogbu ndị siri ike ma ọ bụ ezigbo ọnụ ọdụm.

^ para. 10 E nweela isiokwu ndị e bipụtara iji nyere Ndị Kraịst aka mgbe ha na-arịa ọrịa ma ọ bụ mgbe ha na-elekọta onye ọrịa. Gụọ Teta! May 8, 1994; February 8, 1997; May 22, 2000; na nke January 22, 2001.

^ para. 12 Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ para. 16 E nweela isiokwu ndị e bipụtara iji nyere Ndị Kraịst aka mgbe onye ezinụlọ ha kwụsịrị ife Jehova. Gụọ Ụlọ Nche September 1, 2006, peeji nke 17 ruo 21, nakwa nke January 15, 2007, peeji nke 17 ruo 20.