Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) EPREL 2015

Ndị Okenye, Ùnu Na-azụ Ndị Ọzọ?

Ndị Okenye, Ùnu Na-azụ Ndị Ọzọ?

“E nwere oge a kara aka maka ihe ọ bụla.”—EKLI. 3:1.

1, 2. Gịnị ka ndị nlekọta sekit chọpụtara n’ọtụtụ ọgbakọ?

MGBE otu onye nlekọta sekit na-emechi nnọkọ ya na ndị okenye, o lere ha anya, obi adị ya ezigbo ụtọ maka otú ha si arụsi ọrụ ike. Ụfọdụ n’ime ndị okenye ahụ rudịrị ịbụ nna ya. Ma, e nwere ihe dị mkpa na-echegbu ya. Ọ jụrụ ndị okenye ahụ, sị: “Ụmụnna m, olee ihe ndị unu merela iji zụọ ndị ọzọ ka ha nwee ike ịna-arụkwu ọrụ n’ọgbakọ?” Ha chetara na mgbe o letara ha n’oge gara aga, ọ gwara ha ka ha wepụtakwuo oge na-azụ ndị ọzọ. Otu okenye zara ya, sị, “N’eziokwu, e nwebeghị ezigbo ihe anyị mere.” Ndị okenye ndị ọzọ kwetara ihe ahụ ọ zara.

2 Ọ bụrụ na ị bụ okenye, o nwere ike ịbụ na ị ga-aza ụdị ihe ahụ ha zara. Ndị nlekọta sekit achọpụtala na n’ọtụtụ ọgbakọ, ndị okenye kwesịrị iwepụtakwu oge na-azụ ụmụnna, ma ụmụ okorobịa ma ndị katarala ahụ́, ka ha soro na-elekọta atụrụ Jehova. Ma, o nwere ike isi ezigbo ike. N’ihi gịnị?

3. (a) Olee otú Baịbụl si gosi na ịzụ ndị ọzọ dị mkpa? Gịnị mere anyị niile ji kwesị inwe mmasị n’ịzụ ndị ọzọ? (Kwuo ihe e dere n’ala ala peeji.) (b) Gịnị mere o nwere ike iji siere ụfọdụ ndị okenye ike ịzụ ndị ọzọ?

 3 Ebe ị bụ onye ọzụzụ atụrụ, ị ma na ọ dị mkpa iwepụta oge na-azụ ụmụnna. * Ị makwa na e kwesịrị inwetakwu ụmụnna nwoke ga-enye aka na-eme ka ọgbakọ sikwuo ike, ka e nwee ndị ga-enyere ọgbakọ ndị ọhụrụ a ga-ekepụta aka. (Gụọ Aịzaya 60:22.) Ị makwa na Baịbụl gbara gị ume ka ị kụziere ndị ọzọ ihe. (Gụọ 2 Timoti 2:2.) Ma, o nwere ike isiri gị ike ịzụ ndị ọzọ otú ahụ o siiri ndị okenye ahụ e kwuru okwu ha ná mmalite. O doro anya na i ji oge gị na-elekọta ezinụlọ gị, na-arụ ma ọrụ ego ma ọrụ ọgbakọ ma ọrụ ndị ọzọ dị mkpa. O nwere ike ịdị gị ka i nweghị ohere ị ga-eji na-azụ ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ. N’ihi ya, ka anyị leba anya n’ihe mere o ji dị mkpa ka i wepụta oge na-azụ ndị ọzọ.

ỊZỤ NDỊ ỌZỌ DỊ EZIGBO MKPA

4. Olee ihe nwere ike ime ka ndị okenye ghara ịzụ ndị ọzọ ozugbo?

4 Olee ihe nwere ike ime ka o siere ụfọdụ ndị okenye ike iwepụta oge na-azụ ndị ọzọ? Ụfọdụ n’ime ha nwere ike ịna-eche, sị: ‘Ịzụ ndị ọzọ dị mkpa. Ma, e nwere ihe ndị ọzọ ka mkpa n’ọgbakọ. Ọ bụrụ na mụ azụghị ndị ọzọ ozugbo, o nweghị ihe ọ ga-eme ọgbakọ.’ Ọ bụ eziokwu na e nwere ọtụtụ ihe i kwesịrị ilebara anya ngwa ngwa, ọ bụrụ na ị zụghị ndị ọzọ ozugbo, o nwere ike ịkpa ọgbakọ aka ọjọọ.

5, 6. Gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta n’ihe atụ gbasara ọkwọ ụgbọala na otú o si elekọta ụgbọala ya? Olee otú o si gbasa ịzụ ndị ọzọ n’ọgbakọ?

5 Chegodị banyere ihe atụ a: Ọkwọ ụgbọala nwere ike ịma na ihe ga-eme ka ụgbọala ya ghara imebi bụ ịna-agbanwe mmanụ njin ya mgbe e kwesịrị ịgbanwe ya. Ma, o nwere ike iche na ihe ka mkpa bụ ịgbanye ya mmanụ ụgbọala. A sị ka e kwuwe, ọ bụrụ na ọ gbanyeghị ya mmanụ ụgbọala, ọ ga-emecha nyụọ ọkụ. Ma, ọkwọ ụgbọala nwere ike ịna-eche n’obi ya, sị: ‘Ọ bụrụ na mụ enweghị ohere gbanwee mmanụ njin a, njin a ka ga na-arụ ọrụ.’ Ma, olee nsogbu o nwere ike ịkpata? Ọ bụrụ na ọkwọ ụgbọala anaghị agbanwe mmanụ njin ya mgbe o kwesịrị ịgbanwe ya, ụgbọala ya ga-akụ njin otu ụbọchị. Ụdị ihe a mee, ịrụzi ụgbọala ahụ ga-egbu ya ezigbo oge, fuokwa ya ego buru ibu. Gịnị ka ihe atụ a na-akụziri anyị?

6 Ndị okenye na-arụ ọtụtụ ọrụ dị mkpa e kwesịrị ịrụ n’egbughị oge. Ma ọ́ bụghị ya, ihe ga-emebi n’ọgbakọ. Otú ahụ ọkwọ ụgbọala kwesịrị ịna-agbanye mmanụ ụgbọala n’ụgbọala ya ka ndị okenye kwesịrị ịgbalịsi ike na-eme “ihe ndị ka mkpa.” (Fil. 1:10) Ma, ụfọdụ ndị okenye nwere ike ịnọ ebe ha na-arụ ihe ndị dị mkpa, ha agaghịzi enwe ohere ịzụ ndị ọzọ. Ọ ga-adịzi ka onye leghaara njin ụgbọala ya anya. Ọ bụrụ na ndị okenye eleghara ịzụ ndị ọzọ anya, nsogbu ọ ga-emecha kpata bụ na a gaghịzi enwe ụmụnna nwoke ruru eru ga na-arụ ọrụ niile e kwesịrị ịrụ n’ọgbakọ.

7. Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ndị okenye na-ewepụta oge azụ ndị ọzọ anya?

 7 N’ihi ya, anyị ekwesịghị iche na ịzụ ndị ọzọ adịchaghị mkpa. Ndị okenye ndị na-eche banyere ihe ga-abara ọgbakọ uru n’ọdịnihu na-ewepụta oge azụ ndị ọzọ. Ha na-esi otú ahụ egosi na ha bụ ndị ohu ma ihe. Ọ ga-abakwara ọgbakọ ezigbo uru. (Gụọ 1 Pita 4:10.) Olee otú ọ ga-esi baara ọgbakọ uru?

OTÚ OKENYE GA-ESI JIRI OGE YA NA-EME IHE BARA URU

8. (a) Gịnị na gịnị mere ndị okenye ji kwesị ịna-azụ ndị ọzọ? (b) Olee ọrụ dị ezigbo mkpa ndị okenye nọ n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu kwesịrị ịna-arụ? (Kwuo ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ “ Ọrụ Dị Ezigbo Mkpa.”)

8 Ọ bụrụgodị ndị bụ́ okenye kemgbe ọtụtụ afọ, ha kwesịrị ịghọta na ka ha na-aka nká, ha agaghịzi enwe ike ịna-arụ ọtụtụ ọrụ ha na-arụbu n’ọgbakọ. (Maị. 6:8) Ha kwesịkwara ịghọta na “oge ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya” nwere ike ime ka ha ghara ịna-arụ ihe ndị ha kwesịrị ịrụ n’ọgbakọ. (Ekli. 9:11, 12; Jems 4:13, 14) N’ihi ya, ndị okenye ndị bu ọdịmma atụrụ Jehova n’obi na-eji oge kwesịrị ekwesị akụziri ndị na-eto eto ihe ndị ha mụtara n’ọtụtụ afọ ha jeerela Jehova ozi.—Gụọ Abụ Ọma 71:17, 18.

9. Olee ihe ga-eme n’ọdịnihu nke mere o ji dị ezigbo mkpa ịzụ ndị ọzọ?

9 Olee ihe ndị ọzọ mere ndị okenye ndị na-azụ ndị ọzọ ji abara ìgwè atụrụ Chineke uru? Mbọ ha na-agba na-eme ka ọgbakọ sie ike. Olee otú o si eme ka ọgbakọ sie ike? Ọ bụrụ na ndị okenye na-azụ ndị ọzọ, ọ ga-eme ka e nwekwuo ụmụnna nwoke ndị dị njikere inye aka mee ka ọgbakọ sie ike ma dị n’otu, ma ugbu a ma mgbe ihe ga-ata ezigbo akpụ n’oké mkpagbu ahụ na-abịanụ. (Ezik. 38:10-12; Maị. 5:5, 6) N’ihi ya, ndị okenye anyị hụrụ n’anya, anyị na-arịọ unu ka unu malite taa na-ewepụta oge na-azụ ndị ọzọ.

10. Gịnị ka okenye nwere ike ime ka o nwee efe ịzụ ndị ọzọ?

10 O doro anya na ọtụtụ ọrụ dị mkpa okenye na-arụ n’ọgbakọ nwere ike ime ka ọ ghara ịna-enwe efe. N’ihi ya, o nwere ike ịdị mkpa ka o wepụta oge ụfọdụ ọ na-eji arụ ọrụ ndị ahụ ma jiri ya zụọ ndị ọzọ. (Ekli. 3:1) Ọ bụrụ na okenye emee otú ahụ, ọ pụtara na o ji oge ya eme ihe ga-abara ọgbakọ uru ugbu a nakwa n’ọdịnihu.

KWADEBE OBI ONYE Ị CHỌRỌ ỊZỤ

11. (a) Olee ihe masịrị gị n’aro ndị okenye bi ná mba dị iche iche tụrụ gbasara ịzụ ndị ọzọ? (b) Dị ka e kwuru n’Ilu 15:22, gịnị mere anyị ji kwesị ileba anya n’aro ndị okenye ndị ọzọ tụrụ?

11 Ọtụtụ ndị okenye azụọla ụfọdụ ụmụnna nwoke ka ha nwee ike ịrụkwu ọrụ n’ọgbakọ. N’oge na-adịbeghị anya, a jụrụ ụfọdụ ndị okenye ahụ otú ha si azụ ndị ọzọ. * Ndụmọdụ ha niile nyere yiri n’agbanyeghị na ọnọdụ ha dị iche iche. Gịnị ka ihe a na-egosi? O gosiri na iji Baịbụl azụ ndị mmadụ na-aba uru “n’ebe niile na n’ọgbakọ niile,” otú ahụ ọ bara uru n’oge Pọl onyeozi. (1 Kọr. 4:17) N’isiokwu a nakwa na nke na-eso ya, anyị ga-eleba anya n’ụfọdụ aro ndị okenye ndị a tụrụ.—Ilu 15:22.

12. Gịnị ka onye chọrọ ịkụziri mmadụ ihe kwesịrị ibu ụzọ mee? N’ihi gịnị?

12 Ihe mbụ onye nkụzi kwesịrị ime bụ ịkwadebe obi onye ọ chọrọ ịkụziri ihe. Dị ka ihe atụ, onye ọrụ ugbo na-ebu ụzọ kọọ ala tupu ya akụọ ya ihe.  Onye chọrọ ịkụziri mmadụ ihe kwesịrị ime ụdị ihe ahụ. Ọ ga-ebu ụzọ kwadebe obi onye ahụ tupu ya akụziwere ya ihe ọhụrụ. Oleekwanụ otú onye na-akụziri mmadụ ihe ga-esi kwadebe obi onye ahụ? Ọ bụ ime ụdị ihe ahụ otu onye amụma mere n’oge ochie. Gịnị ka o mere?

13-15. (a) Gịnị ka Jehova gwara Samuel ka o mee? (b) Olee otú Samuel si mee ya? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (ch) Gịnị mere ihe a Baịbụl kọrọ ji kwesị ịbara ndị okenye uru taa?

13 Otu ụbọchị, n’ihe karịrị puku afọ atọ gara aga, Jehova gwara Samuel onye amụma, sị: “Ụdị ugbu a echi, m ga-ezitere gị otu nwoke si n’ala Benjamin, tee ya mmanụ ịbụ onye ndú nke ndị m bụ́ Izrel.” (1 Sam. 9:15, 16) Samuel ma na ọ bụghịzi ya ga na-edu ndị Izrel nakwa na Jehova chọrọ ịhọpụta onye ndú ọhụrụ. Samuel nwere ike ịna-eche, sị: ‘Oleekwanụ otú m ga-esi kwadebe nwoke ahụ maka ọrụ a?’ O chetara ihe ọ ga-eme na otú ọ ga-esi mee ya.

14 N’echi ya, mgbe Samuel hụrụ Sọl, Jehova gwara ya, sị: “Lee nwoke ahụ.” Samuel mere ihe ahụ o bu n’obi. Ọ kpọrọ Sọl ka ọ bịa rie nri n’ụlọ iri ihe. Mgbe Sọl na onye na-ejere ya ozi rutere, Samuel nyere ha oche pụrụ iche. O nyere Sọl anụ kacha mma ma sị ya: “Rie ya, n’ihi na e debeere gị ya ruo mgbe a kara aka.” Mgbe ha richara, Samuel na Sọl gawara n’ụlọ Samuel, na-akparịta ụka ka ha na-aga. Samuel ji oge ha ji rie nri na oge ha na-aga n’ụzọ kwadebe obi Sọl. Mgbe ha ruru n’ụlọ ya, ọ kpọ Sọl gaa n’elu ụlọ ya. Ka ha na-anara ikuku ná mgbede ahụ, ha nọ na-ekwurịta okwu ruo mgbe ha lakpuru. N’echi ya, Samuel tere Sọl mmanụ, susuo ya ọnụ, gwa ya ihe ndị ọzọ ọ ga-eme, gwazie ya ka ọ lawa. N’oge ahụ, Sọl adịla njikere maka ihe ga-emenụ.—1 Sam. 9:17-27; 10:1.

15 O doro anya na ite mmadụ mmanụ ka ọ bụrụ onye ndú ndị Izrel dị iche n’ịzụ nwanna ka ọ bụrụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi n’ọgbakọ. Ma, e nwere ọtụtụ ihe ndị okenye ga-amụta n’ihe Samuel mere. Ka anyị tụlee abụọ n’ime ha.

EZI NDỊ ENYI NDỊ NA-EJI OBI HA NIILE AZỤ ỤMỤNNA

16. (a) Olee otú obi dị Samuel mgbe ndị Izrel kwuru ka e nye ha eze? (b) Gịnị ka Samuel mere mgbe Jehova gwara ya ka o tee Sọl mmanụ?

16 Jiri obi gị niile nyere ha aka. Mgbe mbụ Samuel nụrụ na ndị Izrel chọrọ onye ga-abụ eze ha, o wutere ya. Ọ dịkwa ya ka hà ajụla ya. (1 Sam. 8:4-8) N’eziokwu, ọ chọghị ime ihe ndị Izrel kwuru. Ọ bụ ya mere Jehova ji gwa ya ugboro atọ ka o gee ha ntị. (1 Sam. 8:7, 9, 22) Ma, Samuel eweghị iwe ma ọ bụ nweere onye ga-anọchi ya anyaụfụ. Mgbe Jehova gwara ya ka o tee Sọl mmanụ, o kwetara. O ji obi ya niile mee ya, ọ bụghị ka o mezuo iwu, kama n’ihi na ọ hụrụ Jehova n’anya.

17. Olee otú ndị okenye taa si eme ka Samuel? Oleekwa otú obi na-adị ha?

17 Ọtụtụ ndị bụ́ okenye kemgbe ọtụtụ afọ na-eme ka Samuel. Ha na-eji obiọma azụ ụmụnna ha. (1 Pita 5:2) Ha na-eji obi ha niile azụ ndị ọzọ. Ụjọ anaghị atụ ha na ndị ahụ ga-anara ha ihe ùgwù ha nwere n’ọgbakọ. Ụdị ndị okenye ahụ anaghị ele ndị ha na-azụ anya ka ndị ha na ha na-asọ mpi, kama ha na-ewere ha ka ‘ndị ọrụ ibe ha.’ Ha ghọtara na ndị ahụ bụ onyinye  Chineke nyere ọgbakọ ya. (2 Kọr. 1:24; Hib. 13:16) Obi na-adịkwa ndị okenye ụtọ ịhụ ka ndị ha na-akụziri ihe na-eji ihe ha mụtara eme ihe na-abara ọgbakọ uru.—Ọrụ 20:35.

18, 19. Olee otú okenye ga-esi kwadebe obi onye ọ na-azụ? Gịnị mere o ji kwesị ime otú ahụ?

18 Bụrụ enyi ha, ọ bụghị naanị onye na-akụziri ha ihe. N’ụbọchị ahụ Samuel hụrụ Sọl, a sị na Samuel chọrọ, ọ gaara ewepụta mmanụ ozugbo, wụsa ya Sọl n’isi ka ọ bụrụ eze, sị ya lawa. Ọ ga-apụta na o teela ya mmanụ, ma ọ kwadebeghị ya maka idu ndị Izrel. Kama ime otú ahụ, Samuel wepụtara oge jiri nwayọọ nwayọọ kwadebe obi Sọl. Tupu Samuel etee ya mmanụ, ha abụọ bu ụzọ rikọọ nri, soro na-aga, kparịta ụka ruo ogologo oge ma hie ụra. Samuel cheere ruo oge kwesịrị ekwesị tupu ya etee Sọl mmanụ.

Ihe mbụ onye na-akụziri mmadụ ihe kwesịrị ime bụ imeta onye ahụ enyi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 18 na 19)

19 Taa, onye na-azụ mmadụ kwesịrị ime otú ahụ. Tupu okenye amalite ịzụ nwanna, o kwesịrị ibu ụzọ meta ya enyi. Ihe okenye ga-eme ka obi ruo onye ọ na-azụ ala nwere ike ịdị iche n’ihe okenye nọ ná mba ọzọ ga-eme. Ma, n’agbanyeghị ebe i bi, ọ bụrụ na i wepụta oge ka gị na onye ị na-azụ nọrịa, ọ ga-amata na i ji ya kpọrọ ihe. (Gụọ Ndị Rom 12:10.) O doro anya na obi ga-adị ndị ị na-azụ ụtọ maka otú i si hụ ha n’anya ma jiri ha kpọrọ ihe.

20, 21. (a) Olee otú ị ga-esi kọwaa ezigbo onye nkụzi? (b) Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu na-esonụ?

20 Ndị okenye, chetanụ na ihe na-eme ka mmadụ bụrụ ezigbo onye nkụzi abụghị naanị na o nwere mmasị ịna-akụziri mmadụ ihe, kama o kwesịrị ịhụ onye ọ na-akụziri ihe n’anya. (Tụlee Jọn 5:20.) Ọ bụrụ na onye na-akụziri mmadụ ihe hụrụ onye ọ na-akụziri ihe n’anya, onye ahụ ga-amata ozugbo. Ọ ga-adịkwara ya mfe ịmụta ihe a na-akụziri ya. N’ihi ya, ndị okenye anyị hụrụ n’anya, na-agbanụ mbọ ka unu na-emeta ndị unu na-azụ enyi.—Ilu 17:17; Jọn 15:15.

21 Mgbe okenye kwadebechara obi nwanna, o nweziri ike ịkụziri ya ihe. Olee otú ọ ga-esi kụziere ya ihe? Ọ bụ ihe anyị ga-amụ n’isiokwu na-esonụ.

^ para. 3 Ọ bụ ndị okenye ka e bu n’obi dee isiokwu a na nke na-eso ya. Ma, mmadụ niile nọ n’ọgbakọ kwesịrị ichebara ihe e kwuru echiche. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ ga-enyere ụmụnna nwoke niile aka ịghọta na e kwesịrị ịzụ ha ka e nwee ike inyekwu ha ọrụ n’ọgbakọ. Ọ bụrụ na e nwekwuo ụmụnna a kụziiri ịrụ ọrụ ọgbakọ, ọ ga-abara mmadụ niile uru.

^ para. 11 Ndị okenye ndị ahụ bi n’Amerịka, Bangladesh, Beljọm, Brazil, Frans, French Gịyana, Japan, Koria, Meksiko, Naịjirịa, Namibia, Ọstrelia, Riyuniọn, Rọshịa, na Saụt Afrịka.