Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) EPREL 2015

Otú Ndị Okenye Si Azụ Ndị Ọzọ Ka Ha Ruo Eruo

Otú Ndị Okenye Si Azụ Ndị Ọzọ Ka Ha Ruo Eruo

“Ihe ị nụrụ n’ọnụ m . . . , nyefee ya n’aka ndị kwesịrị ntụkwasị obi.”—2 TIM. 2:2.

1. (a) Kemgbe ụwa, gịnị ka ndị ohu Chineke ma banyere ịzụ ndị ọzọ? Olee otú o si gbasa anyị taa? (b) Olee ajụjụ a ga-aza n’isiokwu a?

KEMGBE ụwa, ndị ohu Chineke ma na ịzụ ndị ọzọ na-aba ezigbo uru. Dị ka ihe atụ, Ebram ‘kpọkọtara ndị ikom ya e nyere ọzụzụ,’ ha na ya agaa napụta Lọt. (Jen. 14:14-16) N’oge Eze Devid, ‘a zụrụ ndị na-abụ abụ n’ụlọ Jehova azụ ịbụrụ Jehova abụ.’ Ha jikwa abụ ha na-eto Chineke. (1 Ihe 25:7) Taa, anyị na-alụso Setan na ndị òtù ya ọgụ. (Efe. 6:11-13) Anyị na-agbalịsikwa ike ka e too aha Jehova. (Hib. 13:15, 16) N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ihe gaara anyị nke ọma otú ahụ ọ gaara ndị ohu Chineke n’oge ochie, e kwesịrị ịzụ anyị azụ. N’ọgbakọ, ọ bụ ndị okenye ka Jehova nyere ọrụ ịzụ ndị ọzọ. (2 Tim. 2:2) Olee ụzọ dị iche iche ụfọdụ ndị okenye si zụọ ụmụnna nwoke ka ha ruo eruo ịna-elekọta atụrụ Chineke?

NYERE ONYE Ị NA-AZỤ AKA ỊHỤKWU JEHOVA N’ANYA

2. Tupu okenye akụziere nwanna ihe ọhụrụ, olee ihe o nwere ike ịdị mkpa ka okenye ahụ mee? N’ihi gịnị?

2 E nwere ike iji okenye tụnyere onye ọrụ ugbo. Tupu onye ọrụ ugbo akụọ ihe, o nwere ike ịchọpụta na o kwesịrị itinye nri ala ka ihe ọ kụrụ nwee ike ime nke ọma. Okenye kwesịrị  ime ụdị ihe ahụ. Tupu ya akụziere nwanna ihe ọhụrụ, o nwere ike ịdị mkpa ka ọ gwa ya ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru iji kwadebe obi ya maka ihe ọ chọrọ ịkụziri ya.—1 Tim. 4:6.

3. (a) Olee otú mmadụ na onye ọ na-azụ nwere ike isi jiri ihe Jizọs kwuru na Mak 12:29, 30 kwurịta okwu? (b) Olee otú ekpere okenye kpere nwere ike isi baara onye ọ na-azụ uru?

3 Ọ bụrụ na ị na-azụ mmadụ ma chọọ ịma ma eziokwu Baịbụl ọ̀ gbanweela echiche ya na omume ya, i nwere ike ịjụ ya, sị: ‘Olee otú nrara ị raara onwe gị nye Jehova si gbanwee ihe i ji ndụ gị na-eme?’ Ajụjụ a nwere ike ime ka gị na ya kwurịta otú anyị ga-esi jiri obi anyị niile jeere Jehova ozi. (Gụọ Mak 12:29, 30.) Mgbe unu kwurịtachara, i nwere ike ikpe ekpere, rịọ Jehova ka o nye ya mmụọ nsọ ga-eme ka ọ mụta ihe a na-akụziri ya. Ọ bụrụ na nwanna ahụ anụ ka i ji obi gị niile kpee ekpere n’isi ya, ọ ga-agba ya ezigbo ume.

4. (a) Olee akụkọ ụfọdụ a kọrọ na Baịbụl ga-eme ka onye a na-akụziri ihe nwee ọganihu? (b) Gịnị ka ndị okenye kwesịrị ibu n’obi mgbe ha na-azụ ndị ọzọ?

4 Mgbe ị malitere ịzụ mmadụ, ọ ga-adị mma ka gị na ya kwurịta akụkọ ụfọdụ Baịbụl kọrọ nwere ike inyere ya aka ịghọta na o kwesịrị ịna-arụ ọrụ, bụrụ onye a tụkwasịrị obi ma dị umeala n’obi. (1 Eze 19:19-21; Nehe. 7:2; 13:13; Ọrụ 18:24-26) Àgwà ndị a ga-abara onye ahụ a na-azụ uru otú ahụ nri ala na-abara ihe a kụrụ akụ uru. Onye ahụ ga-enwekwa ọganihu ngwa ngwa. Otu okenye nọ na Frans aha ya bụ Jean-Claude sịrị: “Ihe m na-ebu n’obi mgbe m na-azụ mmadụ bụ ka m nyere onye ahụ aka iji ihe Baịbụl kwuru na-ekpebi ihe ọ ga-eme. M na-achọ oge dị iche iche mụ na ya ga-eji gụkọọ amaokwu Baịbụl ma nyere ya aka ka ‘anya ya meghee’ ka ọ hụ ‘ihe ndị dị ebube’ dị n’Okwu Chineke.” (Ọma 119:18) Olee ụzọ ndị ọzọ a ga-esi mee ka ụkwụ sie onye a na-akụziri ihe ike n’ọgbakọ?

TỤỌRỌ YA ARO IHE Ọ GA-EME, GWAKWA YA IHE MERE Ọ GA-EJI MEE YA

5. (a) Gịnị mere o ji dị mkpa ka mmadụ jụọ onye ọ na-azụ banyere ihe ndị o kpebiri ime n’ozi Jehova? (b) Gịnị mere okenye ji kwesị ịna-azụ ndị ka na-eto eto? (Kwuo ihe e dere n’ala ala peeji.)

5 Jụọ onye ị na-akụziri ihe, sị, ‘Olee ihe ndị i kpebiri ime n’ozi Jehova?’ Ọ bụrụ na o nweghị ihe doro anya o bu n’obi, nyere ya aka ka o kpebie ihe ọ ga-emeli. Gwa ya otu ihe i kpebiri n’oge gara aga ime n’ozi Jehova. Jiri ịnụ ọkụ n’obi gwa ya ụdị obi ụtọ i nwere mgbe i mechara mee ihe ahụ. O nwere ike ịdị ka ịgwa ya ihe ndị a abụghị oké ihe. Ma, ọ na-aba uru. E nwere otu nwanna bi n’Afrịka aha ya bụ Victor. Ọ bụ okenye na ọsụ ụzọ. Ọ sịrị: “Mgbe m bụ nwata, otu okenye jụrụ m ajụjụ ole na ole gbasara ihe m kpebiri ime n’ozi Jehova. Ajụjụ ndị ahụ nyeere m aka ichesi echiche ike banyere ozi m na-ejere Jehova.” Ndị bụ́ okenye kemgbe ọtụtụ afọ kwuru na e kwesịrị ịmalite ịzụ ụmụnna mgbe ha ka na-eto eto, ikekwe mgbe ha dị ihe dị ka afọ iri na atọ. I nwere ike ịgwa ha ihe ụfọdụ ha ga na-arụ n’ọgbakọ, ya bụ, ihe onye dị afọ ole ahụ ga-arụli. Ọ bụrụ na ị malite mgbe ahụ zụwa ha, ọ ga-eme ka anya ha dịrị n’ozi Jehova ma ha too, é nwegodị ọtụtụ ihe chọrọ imegharị ha anya.—Gụọ Abụ Ọma 71:5, 17. *

Kọwaa ihe mere e ji kwesị ịrụ ihe ị chọrọ ka a rụọ, jaakwa onye ahụ mma maka mbọ ọ gbara ịrụ ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5 ruo 8)

6. Olee ụzọ dị mkpa Jizọs si zụọ ndị mmadụ?

 6 Ọ bụrụ na ị chọrọ ime ka onye ị na-azụ nwee mmasị ịrụ ọrụ n’ọgbakọ, ihe i kwesịrị ime abụghị naanị ịgwa ya ihe ọ ga-eme, kama i kwesịrị ịgwa ya ihe mere ọ ga-eji mee ya. I mee otú ahụ, ọ pụtara na ị na-eme ka Jizọs, bụ́ Onye Ozizi Ukwu. Dị ka ihe atụ, tupu Jizọs agwa ndịozi ya ka ha gaa kwusaa ozi ọma, ọ gwara ha ihe mere ha ji kwesị ikwusa ya. Ọ sịrị: “E nyewo m ikike niile n’eluigwe na n’elu ụwa.” Ọ gwaziri ha, sị: “Gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.” (Mat. 28:18, 19) Olee otú i nwere ike isi mee ka Jizọs mgbe ị na-azụ mmadụ?

7, 8. (a) Olee otú ndị okenye nwere ike isi mee ka Jizọs mgbe ha na-azụ ndị ọzọ? (b) Olee uru ịja mma na-abara onye a na-azụ? (ch) Olee aro ndị nwere ike inyere ndị okenye aka ịzụ ndị ọzọ? (Kwuo ihe e dere n’igbe bụ́ “ Otú E Si Azụ Ndị Ọzọ.”)

7 Ọ bụrụ na ị gwa nwanna ihe ọ ga-arụ, jiri Baịbụl kọwaara ya ihe mere ọrụ ahụ ji dị mkpa. Ị ga-esi otú ahụ kụziere ya iji ihe Baịbụl kwuru na-ekpebi ihe ọ ga-eme. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị gwara nwanna ka ọ na-ehicha oche n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, i nwere ike ịgwa ya ihe Taịtọs 2:10 kwuru. Kọwaara ya otú ime ka Ụlọ Nzukọ Alaeze dị ọcha ga-esi “chọọ ozizi Onye Nzọpụta anyị, bụ́ Chineke, mma.” I nwekwara ike ịgwa ya ka o chee banyere ụmụnna nọ n’ọgbakọ na otú ọrụ ahụ ga-esi baara ha uru. Ụdị mkparịta ụka ahụ ga-enyere onye ahụ aka iche banyere ndị mmadụ, kama iche naanị banyere idebe iwu. Ọ bụrụ na ọ hụ otú ọrụ ahụ si abara ụmụnna uru, ọ ga-eme ka obi dị ya ụtọ maka na ọ na-ejere ndị ọzọ ozi.

8 Ihe ọzọ ị ga-eme bụ ịja onye ahụ mma ma ọ bụrụ na o mee ihe ị gwara ya. Olee uru ịja mma na-aba? Ọ ga-enyere onye ahụ aka ime nke ọma n’ozi Jehova otú ahụ mmiri si enyere ihe a kụrụ akụ aka ịna-eto nke ọma.—Tụlee Matiu 3:17.

NSOGBU ỌZỌ

9. (a) Ná mba ndị bara ọgaranya, olee nsogbu ndị okenye ụfọdụ na-enwe n’ịzụ ndị ọzọ? (b) Gịnị mere ụfọdụ ụmụnna na-eto eto ewereghị ozi Jehova ka ihe kacha mkpa?

9 Nsogbu ọzọ ndị okenye ndị nọ ná mba ndị bara ọgaranya nwere ike inwe bụ otú a ga-esi nyere ụmụnna nwoke rurula afọ iri abụọ ma ọ bụ iri atọ aka ka ha nwee mmasị ịrụ ọrụ n’ọgbakọ. E nwere ndị bụ́ okenye kemgbe ọtụtụ afọ n’ihe dị ka mba iri abụọ. Anyị jụrụ ha ihe ha chere mere ụfọdụ ụmụ okorobịa anaghị achọ ka e nyekwuo ha ọrụ n’ọgbakọ.  Otu ihe ọtụtụ n’ime ha kwuru bụ na a gbaghị ụfọdụ ụmụnna ume ikpebi ihe ha ga-eme n’ozi Jehova mgbe ha ka na-eto eto. E nwedịrị ụfọdụ ndị na-eto eto chọrọ ijekwuru Jehova ozi, ma ndị mụrụ ha agbaa ha ume ka ha kpebie ịgụkwu akwụkwọ ma ọ bụ iji oge ha niile na-achụ ihe nke ụwa. N’ihi ya, o nweghị mgbe ozi Jehova bụ ihe kacha mkpa ná ndụ ha.—Mat. 10:24.

10, 11. (a) Ọ bụrụ na o yiri ka nwanna achọghị ịrụ ọrụ n’ọgbakọ, olee otú okenye nwere ike isi jiri nwayọọ nwayọọ nyere ya aka ịgbanwe echiche ya? (b) Olee ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru okenye nwere ike ịgwa nwanna ahụ? N’ihi gịnị? (Kwuo ihe e dere n’ala ala peeji.)

10 Ọ bụrụ na o yiri ka nwanna achọghị ịrụ ọrụ n’ọgbakọ, ị ga-agba ezigbo mbọ ma nwee ndidi tupu gị emee ka ọ gbanwee echiche ya. Ma, ị ga-emeli ya. E nwere ike iji ya tụnyere onye ọrụ ubi chọrọ ka ome ji ya kwụọ n’osisi o gwunyeere ya. Ọ ga-eji nwayọọ nwayọọ na-eduzi ya. Otú ahụ ka i nwere ike iji nwayọọ nwayọọ nyere ụmụnna ụfọdụ aka ịghọta na ha kwesịrị ịgbanwe otú ha si ele ọrụ ọgbakọ anya. Ma, olee otú ị ga-esi eme ya?

11 E nwee nwanna ị chọrọ inyere aka, wepụta oge ka gị na ya bụrụ ezigbo enyi. Mee ka ọ ghọta na ọ bara uru n’ọgbakọ. Ka oge na-aga, gị na ya nọdụ ala ka unu tụgharịa uche n’ụfọdụ amaokwu Baịbụl. Nyere ya aka ichebara nrara ọ raara onwe ya nye Jehova echiche. (Ekli. 5:4; Aịza. 6:8; Mat. 6:24, 33; Luk 9:57-62; 1 Kọr. 15:58; 2 Kọr. 5:15; 13:5) I nwere ike ịjụ ya, sị, ‘Gịnị ka i kwere Jehova ná nkwa mgbe ị raara onwe gị nye ya?’ Jụọ ya ajụjụ ndị ga-eru ya n’obi, dị ka, ‘Olee otú i chere obi dị Jehova mgbe e mere gị baptizim?’ (Ilu 27:11) ‘Olee otú obi dị Setan?’ (1 Pita 5:8) Cheta na ọ bụrụ na nwanna agụọ amaokwu Baịbụl ndị e chere echiche nke ọma họta, o nwere ike iru ya n’obi.—Gụọ Ndị Hibru 4:12. *

NDỊ A NA-AZỤ, KWESỊNỤ NTỤKWASỊ OBI

12, 13. (a) Olee ụdị àgwà Ịlaịsha kpara mgbe Ịlaịja na-azụ ya? (b) Olee otú Jehova si gọzie Ịlaịsha maka na o kwesịrị ntụkwasị obi?

12 Ụmụ okorobịa nọ n’ọgbakọ, unu dị ọgbakọ mkpa. Olee ụdị àgwà ga-enyere unu aka ime nke ọma n’ozi unu na-ejere Jehova? Ịtụle ihe ụfọdụ otu onye fere Jehova n’oge ochie mere ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ a.

13 Ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ puku afọ atọ gara aga, Ịlaịja onye amụma kpọrọ otu nwa okorobịa aha ya bụ Ịlaịsha ka ọ bịa jewere ya ozi. Ịlaịsha kwetara ozugbo, jirikwa obi ya niile na-arụrụ ya ọrụ a na-eleda anya. (2 Eze 3:11) Mgbe Ịlaịja zụchara Ịlaịsha ihe dị ka afọ isii, Ịlaịsha nụrụ na Ịlaịja arụchawala ọrụ ya n’Izrel. Ịlaịja gwara Ịlaịsha, bụ́ onye ọ zụrụ nke ọma, ka ọ kwụsị ijere ya ozi. Ma, Ịlaịsha gwara ya ugboro atọ, sị: “Agaghị m ahapụ gị.” O kpebisiri ike na ya ga-esoru nna ya ukwu n’isi. Jehova kwere ka Ịlaịsha hụ mgbe oké ifufe buuru Ịlaịja. O si otú ahụ gọzie ya maka na o ji obi ya niile jeere nna ya ukwu ozi ma kwesị ntụkwasị obi.—2 Eze 2:1-12.

14. (a) Olee otú ndị a na-azụ taa nwere ike isi mee ka Ịlaịsha? (b) Gịnị mere o ji dị ezigbo mkpa ka onye a na-azụ kwesị ntụkwasị obi?

14 Olee otú ị ga-esi mee ka Ịlaịsha? E nye gị ọrụ, kweta ịrụ ya ozugbo, ọ bụrụgodị ọrụ a na-eleda anya. Were onye na-azụ gị ka enyi, meekwa ka ọ mata na obi dị gị ụtọ maka aka ọ na-enyere gị.  Àgwà gị nwere ike igosi ya na ị chọrọ ka ọ na-akụziri gị ihe. Ihe ọzọ bụ na i kwesịrị iji obi gị niile na-arụ ọrụ ọ bụla e nyere gị. Gịnị mere o ji dị ezigbo mkpa? Ọ bụ n’ihi na naanị ihe ga-eme ka obi sie ndị okenye ike na Jehova chọrọ ka e nyekwuo gị ọrụ n’ọgbakọ bụ ma i gosi na i kwesịrị ntụkwasị obi.—Ọma 101:6; gụọ 2 Timoti 2:2.

NA-AKWANYERE NDỊ OKENYE ÙGWÙ

15, 16. (a) Olee otú Ịlaịsha si gosi na ọ na-akwanyere nna ya ukwu ùgwù? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Gịnị ka Ịlaịsha mere nke mere ka obi sie ndị amụma ibe ya ike?

15 Ihe Baịbụl kọrọ banyere Ịlaịsha, bụ́ onye na-ejere Ịlaịja ozi, gosikwara otú ụmụnna nwoke taa ga-esi na-akwanyere ndị bụ́ okenye kemgbe ọtụtụ afọ ùgwù. Mgbe Ịlaịja na Ịlaịsha gachara hụ ụmụ ndị amụma nọ na Jeriko, ha abụọ sooro gawa Osimiri Jọdan. Mgbe ha ruru, ‘Ịlaịja weere uwe e ji mara ya, fụkọta ya ma tie ya na mmiri ahụ, o wee kewaa abụọ.’ Mgbe ha gafechara, ha nọ “na-ekwu okwu ka ha na-aga.” O doro anya na Ịlaịsha echeghị na ya amụtachaala ihe niile. Ruokwa mgbe Ịlaịja hapụrụ Ịlaịsha, ọ nọ na-ege ntị nke ọma n’ihe niile Ịlaịja na-agwa ya. Ịlaịja mechara rịgoro n’eluigwe n’oké ifufe. Mgbe Ịlaịsha na-alaghachi, rute na Jọdan, o tiri uwe Ịlaịja na mmiri ahụ, sị: “Olee ebe Jehova bụ́ Chineke Ịlaịja nọ?” Ọzọkwa, mmiri ahụ kewara abụọ.—2 Eze 2:8-14.

16 Ị̀ chọpụtara na ọrụ ebube mbụ Ịlaịsha rụrụ yiri ọrụ ebube ikpeazụ Ịlaịja rụrụ? Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị? O doro anya na Ịlaịsha echeghị na ebe ọ bụ ya bụzi nna ukwu, na ya ga-emewe ihe dị iche n’ihe Ịlaịja mere. Kama, ọ ka nọkwa na-eme otú ahụ Ịlaịja mere, nke gosiri na ọ na-akwanyere nna ya ukwu ùgwù, meekwa ka obi sie ndị amụma ibe ya ike. (2 Eze 2:15) Ịlaịsha bụ onye amụma afọ iri isii. N’afọ ndị ahụ, Jehova nyere ya ike ịrụ ọrụ ebube karịrị nke Ịlaịja rụrụ. Gịnị ka ndị a na-azụ taa kwesịrị ịmụta n’ihe a?

17. (a) Olee otú ndị a na-azụ taa ga-esi mee ka Ịlaịsha? (b) Ka oge na-aga, gịnị ka Jehova nwere ike ime ka ndị a na-azụ mee?

17 Echela na ozugbo e nyekwuru gị ọrụ n’ọgbakọ, na i kwesịrị ịgbanwe otú e si eme ihe n’ọgbakọ. Cheta na ihe kwesịrị ime ka a gbanwee otú e si eme ihe bụ mkpa e nwere n’ọgbakọ ma ọ bụ ntụziaka nzukọ Jehova nyere. Otú ahụ àgwà Ịlaịsha si mee ka obi sie ndị amụma ibe ya ike ma gosi na ọ na-akwanyere Ịlaịja ùgwù, i nwere ike ime ka obi sie ụmụnna ike ma ọ bụrụ na ị na-eme ihe Baịbụl kwuru. Ọ ga-egosi na ị na-akwanyere ndị bụ́ okenye kemgbe ọtụtụ afọ ùgwù. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 4:17.) Ma, ka ị na-amụtakwu ihe, o doro anya na ị ga-eso mee mgbanwe ụfọdụ ga-enyere ọgbakọ aka iso nzukọ Jehova na-aga ụkwụ na ụkwụ. N’eziokwu, Jehova nwere ike ime ka unu bụ́ ndị a na-azụ rụọ ọrụ karịrị nke ndị na-azụ unu rụrụ otú ahụ o meere Ịlaịsha.—Jọn 14:12.

18. Gịnị mere ịzụ ụmụnna nwoke ji dị ezigbo mkpa taa n’ọgbakọ?

18 Anyị nwere olileanya na aro ndị a tụrụ n’isiokwu a nakwa na nke bu ya ụzọ ga-eme ka ndị okenye wepụtakwuo oge na-azụ ndị ọzọ. Ka ụmụnna ndị ruru eru jiri obi ha niile nabata ihe a na-akụziri ha ma jiri ya na-eme ihe bara uru ka ha na-elekọta atụrụ Jehova. Ime otú ahụ ga-eme ka ọgbakọ Jehova zuru ụwa ọnụ sie ike, nyekwara onye ọ bụla n’ime anyị aka ikwesị ntụkwasị obi n’oge dị oké mkpa na-abịanụ.

^ para. 5 Ọ bụrụ na onye na-eto eto na-akpa àgwà ka Onye Kraịst ma nke a na-akọ, dị umeala n’obi ma nwee àgwà ndị ọzọ Baịbụl kwuru na mmadụ ga-enwe tupu a họpụta ya n’ọgbakọ, ndị okenye nwere ike ikwu ka a họpụta ya ka ọ bụrụ ohu na-eje ozi, ọ bụrụgodị na o rubeghị afọ iri abụọ.—1 Tim. 3:8-10, 12; gụọ Ụlọ Nche July 1, 1989, peeji nke 29.

^ para. 11 Gị na ya nwere ike ikwurịta ihe e kwuru n’Ụlọ Nche, Eprel 15, 2012, peeji nke 14-16, paragraf nke 8-13; na “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke,” isi nke 16, paragraf nke 1-3.