Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) EPREL 2015

Ihe Mere Ịchụpụ Mmadụ n’Ọgbakọ Ji Egosi na Chineke Hụrụ Anyị n’Anya

Ihe Mere Ịchụpụ Mmadụ n’Ọgbakọ Ji Egosi na Chineke Hụrụ Anyị n’Anya

OTU nwanna nwoke aha ya bụ Julian sịrị: “Mgbe a mara ọkwa na a chụọla nwa m n’ọgbakọ, ọ dị m ka ụwa ọ̀ gwụla. Ọ bụ ọkpara m. Tupu ihe ahụ emee, mụ na ya dị ná mma. Anyị na-emekọkwa ihe ọnụ. Ọ bụ nwa e ji ama atụ. Ma, ọ nọkatara kpawa àgwà ọjọọ. Nwunye m bere ákwá ugboro ugboro. Amaghị m otú m ga-esi kasie ya obi. Anyị nọ na-ajụ onwe anyị ma ọ̀ pụtara na anyị abụghị ezigbo nne na nna.”

Ebe ọ bụ na ịchụpụ mmadụ n’ọgbakọ na-agbawa obi, gịnịzi mere e nwere ike iji kwuo na o gosiri na Chineke hụrụ anyị n’anya? Gịnị na gịnị ka Baịbụl kwuru mere a ga-eji chụpụ mmadụ n’ọgbakọ? Olee ihe na-eme ka a chụọ mmadụ n’ọgbakọ?

IHE ABỤỌ NA-EME KA A CHỤỌ MMADỤ N’ỌGBAKỌ

E nwere ihe abụọ na-eme ka a chụọ Onyeàmà Jehova n’ọgbakọ. Nke mbụ bụ na onye ahụ mere mmehie dị oké njọ. Nke abụọ abụrụ na o kweghị echegharị.

Ọ bụ eziokwu na Jehova ebughị n’obi ka anyị metachaa ihe niile, o nwere iwu ndị ọ chọrọ ka anyị na-edebe ka anyị nwee ike ịdị nsọ. Dị ka ihe atụ, Jehova gwara anyị ka anyị ghara ịkwa iko, ikpere arụsị, izu ohi, ịpụnara mmadụ ihe, igbu mmadụ, na ime mgbaasị.—1 Kọr. 6:9, 10; Mkpu. 21:8.

Ọ̀ bụ na i kwetaghị na iwu Jehova na-echebe anyị, bụrụkwa ihe anyị kwesịrị idebe? Ò nwere onye na-anaghị achọ ibi n’ebe ndị mmadụ na-akpa ezigbo àgwà ma bụrụ ndị udo na ndị a ga-atụkwasịli obi? Ọ bụ ụdị ndị a ka anyị na-ahụ n’ọgbakọ. Ihe kpatara ya bụ na mgbe anyị raara onwe anyị nye Chineke, anyị kwere ya nkwa na anyị ga na-edebe iwu ya ndị dị na Baịbụl.

Gịnị ka a ga-eme ma nwanna e mere baptizim mee mmehie dị oké njọ n’ihi ezughị okè? Ndị fere Jehova n’oge ochie mere ụdị mmehie ahụ, ma Chineke ajụghị ha kpamkpam. Dị ka ihe atụ, Eze Devid kwara iko, gbuokwa ọchụ. Ma onye amụma bụ́ Netan gwara ya, sị: ‘Jehova emewo ka mmehie gị gabiga.’—2 Sam. 12:13.

Chineke gbaghaara Devid n’ihi na o ji obi ya niile chegharịa. (Ọma 32:1-5) Otú ahụ ka ọ dị taa. Naanị ihe ga-eme ka a chụpụ Onyeàmà Jehova n’ọgbakọ bụ ma ọ bụrụ na o chegharịghị ma ọ bụ na ọ ka na-akpa àgwà ọjọọ. (Ọrụ 3:19; 26:20) Ọ bụrụ na ndị okenye na-ekpe onye ahụ ikpe ahụghị ihe gosiri na o chegharịala n’eziokwu, a ga-achụpụ ya n’ọgbakọ.

A chụọ mmadụ n’ọgbakọ, o nwere ike ịdị anyị ka ndị kpere ikpe ahụ hà dị obi ọjọọ ma ọ bụ na ha anaghị eme ebere, karịchaa ma ọ bụrụ onye anyị na ya dị ná mma. Ma, Baịbụl gwara anyị ihe  mere anyị ga-eji kweta na mkpebi ahụ gosiri na Jehova hụrụ anyị n’anya.

URU ỊCHỤPỤ MMADỤ N’ỌGBAKỌ BARA

Jizọs kwuru na “a na-egosi na amamihe ziri ezi site n’ọrụ ya.” (Mat. 11:19) Ịchụpụ onye mere mmehie na-ekweghị echegharị n’ọgbakọ bara ezigbo uru. Ka anyị leba anya n’atọ n’ime uru ndị ahụ:

Ịchụpụ onye mere mmehie na-eme ka a sọpụrụ aha Jehova. Ebe ọ bụ na anyị na-aza aha Jehova, àgwà anyị ga-eme ka e too aha ya ma ọ bụ kọchaa ya. (Aịza. 43:10) Àgwà nwatakịrị na-akpa ga-eme ka ndị mmadụ na-ele nne ya na nna ya anya ọma ma ọ bụ anya ọjọọ. Ọ bụ otú ahụ ka àgwà anyị na-akpa nwere ike ime ka ndị mmadụ lewe Jehova anya ọma ma ọ bụ anya ọjọọ ebe ọ bụ na anyị na-aza aha ya. N’oge Ezikiel, ndị mba ọzọ ghọtara na ọ bụ ndị Juu na-aza aha Jehova. (Ezik. 36:19-23) Otú ahụ ka ọ dị taa. Ndị mmadụ ma na Ndịàmà Jehova na-aza aha Chineke. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị na-erubere iwu ya isi, anyị ga-eme ka a na-asọpụrụ ya.

Ọ bụrụ na anyị na-eme omume rụrụ arụ, anyị ga-ewetara aha nsọ Chineke nkọcha. Pita onyeozi dụrụ Ndị Kraịst ọdụ, sị: “Dị ka ụmụ na-erube isi, kwụsịnụ ịbụ ndị na-eme omume dị ka ọchịchọ unu nwere n’oge gara aga si dị, mgbe unu na-amaghị ihe, kama, dị ka Onye Nsọ ahụ nke kpọrọ unu, bụrụkwanụ ndị dị nsọ n’omume unu niile, n’ihi na e dere, sị: ‘Unu ga-adị nsọ, n’ihi na adị m nsọ.’” (1 Pita 1:14-16) Ịkpa àgwà dị nsọ na-eme ka a sọpụrụ aha Chineke.

Ma, ọ bụrụ na Onyeàmà Jehova emee ihe ọjọọ, ndị enyi ya na ndị ma ya nwere ike ịmata. Ịchụpụ onye ahụ n’ọgbakọ gosiri na ndị Jehova dị nsọ, na-emekwa ihe Baịbụl kwuru iji mee ka ha na-adị nsọ. Na Swizaland, otu nwoke na-abụghị Onyeàmà Jehova bịara ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma kwuo na ya chọrọ ịbụ Onyeàmà Jehova. A chụrụ nwanne ya nwaanyị n’ọgbakọ maka na ọ kwara iko. O kwuru na ya chọrọ ikpewe okpukpe “na-anaghị anabata àgwà ọjọọ.”

Ịchụpụ mmadụ n’ọgbakọ na-eme ka a ghara imetọ ọgbakọ Ndị Kraịst nke dị ọcha. Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt na ọ bụrụ na ha achụpụghị onye kpachaara anya na-eme mmehie n’ọgbakọ, ọ ga-akpata nsogbu. O ji àgwà ọjọọ onye ahụ tụnyere ihe iko achịcha nke na-eme ka ntụ ọka dum a gwakọtara agwakọta koo. O kwuru, sị: “Ntakịrị ihe iko achịcha na-eme ka ntụ ọka dum a gwakọtara agwakọta koo eko.” Ọ dụziri ha ọdụ, sị: “Wepụnụ onye ọjọọ ahụ n’etiti unu.”—1 Kọr. 5:6, 11-13.

O doro anya na “onye ọjọọ ahụ” Pọl kwuru okwu ya nọ na-akwa iko ma jụ ichegharị. Ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ malitekwara ikwu na ihe ọ na-eme adịghị njọ. (1 Kọr. 5:1, 2) A sị na a gbachiri onye ahụ nkịtị, Ndị Kraịst ndị ọzọ nwere ike ịmụta omume ahụ rụrụ arụ ọtụtụ ndị na-eme n’obodo ahụ ha bi. Ọ bụrụ na mmadụ kpachaara anya na-eme ihe ọjọọ, e leghara ya anya, ọ ga-eme ka ndị mmadụ na-emebi iwu Chineke otú masịrị ha. (Ekli. 8:11) Ihe ọzọ bụ na ndị mere mmehie na-ekweghị echegharị nwere ike ịdị ka “nkume ndị zoro n’ala ala mmiri,” nke nwere ike ime ka okwukwe ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ kpuo ka ụgbọ.—Jud 4, 12.

Ịchụpụ onye mere ihe ọjọọ n’ọgbakọ nwere ike ime ka anya doo ya. Jizọs kwuru otu mgbe banyere otu nwa okorobịa hapụrụ ụlọ nna ya ma jiri ihe nketa ya bie ndụ ịla n’iyi. Ahụhụ nwa mmefu ahụ tara kụziiri ya na ịhapụ ụlọ nna ya gaa biri n’ebe ọzọ abaghị uru ọ bụla nakwa na ọ ga-eme ka o jiri ezé kpee ekwere. Anya mechara doo ya, ya echegharịa ma lakwuru nna ya. (Luk 15:11-24) Obi tọrọ nna ahụ ụtọ mgbe nwa ya chegharịrị. Ihe Jizọs kwuru banyere nna ahụ na-enyere anyị aka ịmata otú obi na-adị Jehova. Jehova kwuru, sị: “Ọnwụ onye ajọ omume adịghị atọ m ụtọ, kama ihe na-atọ m ụtọ bụ ka onye ajọ omume hapụ ụzọ ya ma dịrị ndụ.”—Ezik. 33:11.

Ndị a chụrụ n’ọgbakọ nwere ike ime ka nwa mmefu. O nwere ike iwutewe ha na ha anọghịzi n’ọgbakọ Ndị Kraịst, nke bụ́ ezinụlọ Chineke.  Anya nwere ike ido ha ma ha cheta nsogbu ihe ha mere kpataara ha nakwa obi ụtọ ha na-enwebu mgbe ha na Jehova na ndị ya dị ná mma.

Ha ga-eme otú ahụ ma ọ bụrụ na anyị gosi na anyị hụrụ ha n’anya ma kata obi mee ihe Baịbụl kwuru. Devid kwuru, sị: “Ọ bụrụ na onye ezi omume etie m ihe, ọ ga-abụ obiọma; ọ bụrụkwa na ọ baara m mba, ọ ga-abụ mmanụ a wụsara m n’isi.” (Ọma 141:5) Dị ka ihe atụ, ka e were ya na onye na-agba ọsọ dara, gbajie ụkwụ. O nweghịzi ike ịna-agagharị. Ọ bụrụ na o kweghị ka a gbaa ya ọkpụkpụ ahụ, ihe ahụ nwere ike ịka njọ, mezie ka e gbupụ ya ụkwụ. N’ihi ya, ọ ga-ekwe ka a gbaa ya ọkpụkpụ ahụ. N’agbanyeghị na ọ ga-afụ ya ezigbo ụfụ, ọ ga-azọ ya ndụ. Otú ahụ ka ọ dị Devid. Ọ ghọtara na onye ezi omume nwere ike ịdọsi ya aka ná ntị ike iji nyere ya aka.

Ọtụtụ mgbe, ịchụ onye mere ihe ọjọọ n’ọgbakọ na-enyere ya aka ịgbanwe. Mgbe ihe dị ka afọ iri gachara, nwa Julian ahụ e kwuru okwu ya ná mmalite gbanwere, lọghachi n’ọgbakọ. Ọ bụkwa okenye ugbu a. O kwuru, sị, “Ọchụchụ a chụrụ m n’ọgbakọ mere ka m ghọta nsogbu ndụ ọjọọ m na-ebi kpataara m. Ụdị aka ná ntị ahụ a dọrọ m baara m uru.”—Hib. 12:7-11.

OTÚ E KWESỊRỊ ISI NA-EMESO NDỊ A CHỤRỤ N’ỌGBAKỌ

N’eziokwu, ịchụ mmadụ n’ọgbakọ bụ ezigbo ọdachi, ma o kwesịghị ịbụ nsogbu na-enweghị ngwọta. Anyị niile kwesịrị ịgba mbọ ka ọchụchụ a chụrụ mmadụ baara ya uru.

A na-agbalịsi ike inyere ndị chegharịrịnụ aka ka ha laghachikwute Jehova

Ndị Okenye na-agba mbọ iṅomi ịhụnanya Jehova. Obi anaghị adị ha ụtọ mgbe ha na-agwa mmadụ na e kpebiela ịchụ ya n’ọgbakọ. Mgbe ha na-agwa ya onye ahụ, ha na-ewetu obi kọwaara ya ihe o kwesịrị ime ka a nabata ya. Ọ bụrụ na onye a chụrụ n’ọgbakọ amalite ịgbanwe, ndị okenye nwere ike ịga na nke ya otu ugboro n’afọ ichetara ya ihe ọ ga-eme ka ya na Jehova dịghachi ná mma. *

Ndị ezinụlọ onye ahụ kwesịrị ịkwado ọchụchụ a chụrụ ya iji gosi na ha hụrụ ya na ọgbakọ Jehova n’anya. Julian sịrị: “Ọ ka bụ nwa m. Ma otú o si ebi ndụ emeela ka mụ na ya ghara ịdịzi ná mma.”

Ndị niile nọ n’ọgbakọ kwesịrị igosi na ha hụrụ onye ahụ n’anya. Ha na ya agaghị na-akpa ma ọ bụ na-ekwurịta okwu. (1 Kọr. 5:11; 2 Jọn 10, 11) Ha ga-esi otú ahụ mee ka ọ ghọtakwuo aka ná ntị Jehova si n’aka ndị okenye dọọ ya. Ihe ọzọ ha nwere ike ime bụ ịna-akwado ndị ezinụlọ ya ma hụkwuo ha n’anya. Ha kwesịrị icheta na ọchụchụ a chụrụ ya na-ewute ndị ezinụlọ ya nakwa na e kwesịghị ime ka ha chee na a jụrụ ha ajụ.—Rom 12:13, 15.

Julian sịrị: “Ịchụ onye na-ekweghị echegharị n’ọgbakọ bara ezigbo uru. Ọ na-enyere anyị aka ịna-ebi ndụ otú Jehova chọrọ. Ọ bụ eziokwu na ọ na-agbawa obi, ọ na-emecha rụpụta ezigbo ihe. A sị na m nabatara àgwà ọjọọ nwa m na-akpa, ọ gaaraghị emecha lọghachi n’ọgbakọ.”

^ para. 24 Gụọ Ụlọ Nche April 15, 1991, peeji nke 21 ruo 23.