Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) EPREL 2015

 AKỤKỌ NDỤ

Jehova Gọziri M ma ‘n’Oge Dị Mma ma n’Oge Nsogbu’

Jehova Gọziri M ma ‘n’Oge Dị Mma ma n’Oge Nsogbu’

A MỤRỤ m n’ọnwa Mach n’afọ 1930 n’obodo Namkumba nke dị nso n’obodo Lilongwe dị na Malawi. N’oge ahụ, ọtụtụ ndị ikwu na ibe m ji obi ha niile efe Jehova. N’afọ 1942, m raara onwe m nye Chineke, e meekwa m baptizim n’otu ọmarịcha osimiri. Ruo afọ iri asaa, m nọ na-agbasi mbọ ike ime ihe ahụ Pọl onyeozi gbara Timoti ume ka o mee. Ọ sịrị: “Kwusaa okwu Chineke, jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ya n’oge dị mma, n’oge nsogbu.”—2 Tim. 4:2.

Mgbe mbụ Nwanna Nathan H. Knorr na Milton G. Henschel bịara Malawi bụ ná mmalite afọ 1948. Ha si n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Bruklin, Niu Yọk, bịa ileta anyị. M ka na-echeta okwu ndị ha kwuru bụ́ ndị mere ka m nwee mmasị n’ozi oge niile. Anyị dị ihe dị ka puku mmadụ isii gee okwu Nwanna Knorr nke isiokwu ya bụ, “Onye Ọchịchị Na-adịgide Adịgide nke Mba Niile.”

M mechara mata otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Lidasi. Ndị ezinụlọ ha bụ Ndịàmà Jehova. M matakwara na o kpebiri ije ozi oge niile. Anyị lụrụ n’afọ 1950. Tupu afọ 1953 agafee, anyị amụtala ụmụ abụọ. N’agbanyeghị na ịzụ ha abụghị obere ọrụ, anyị kpebiri na m ga-amalite ịsụ ụzọ oge niile. Mgbe afọ abụọ gara, a gwara m ka m bụrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche.

Mgbe obere oge gara, e nyere m ihe ùgwù ịbụ onye nlekọta sekit. Otú nwunye m bụ́ Lidasi si na-akwado m mere ka m nwee ike ịna-egboro ezinụlọ m mkpa ha niile ma ka nọrọ n’ozi oge niile. * Ma, ọ gụsiri anyị agụụ ike ka anyị abụọ jewe ozi oge niile. N’ihi ya, anyị haziri ihe anyị na-eme nke ọma. Ụmụ anọ anyị mụtara jikwa obi ha niile kwado anyị. Ọ bụ ya mere nwunye m ji mechaa malite ije ozi oge niile n’afọ 1960.

Mgbakọ mere ka okwukwe anyị sie ike maka mkpagbu e mechara kpagbuwe anyị

Obi dị anyị ụtọ mgbe ahụ anyị na-aga eleta ụmụnna anyị n’ọgbakọ dị iche iche. Ọrụ ahụ mere ka anyị gaa ma n’ebe mara mma ndị dị n’akụkụ Ugwu Mulanje, n’ebe ndịda, ma n’akụkụ Ọdọ Mmiri Malawi, nke fọrọ obere ka ọ gazuo ebe ọwụwa anyanwụ obodo ahụ. Anyị hụrụ ka ọtụtụ ndị na-abata n’ọgbakọ, a na-ehiwekwa ọgbakọ ndị ọhụrụ na sekit ebe anyị na-eje ozi.

Mgbakọ distrikti e mere n’afọ 1962 tọrọ anyị ụtọ. N’afọ na-eso ya, Nwanna Henschel bịara Malawi ọzọ maka mgbakọ ukwu pụrụ iche e mere n’ebe dị nso n’obodo Blantaya. Ndị bịara  ya karịrị puku mmadụ iri. Ọ na-abụ m cheta ume niile a gbara anyị n’oge ahụ, obi adị m ụtọ na Jehova si otú ahụ kwadebe anyị maka nsogbu ndị na-abịanụ.

MGBE NSOGBU MALITERE

A machibidoro ọrụ anyị iwu, ndị ọchịchị eweghara alaka ụlọ ọrụ anyị

N’afọ 1964, a malitere ịkpagbu Ndịàmà Jehova n’ihi na ha ekweghị etinye aka n’ihe gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị. E bibiri ihe karịrị otu narị Ụlọ Nzukọ Alaeze na ihe karịrị otu puku ụlọ ụmụnna. Ma, anyị nọkwa na-eleta ọgbakọ dị iche iche ruo mgbe ndị ọchịchị Malawi machibidoro ọrụ anyị iwu n’afọ 1967. Ndị ọchịchị weghaara alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Blantaya, gbaara ndị ozi ala ọzọ ụgbọ nwa mkpi. Ha tụkwara mụ na nwunye m na ọtụtụ ụmụnna ndị obodo anyị mkpọrọ. Mgbe anyị si n’ụlọ mkpọrọ pụta, anyị malitekwara ileta ọgbakọ. Ma, anyị jizi akọ na-aga.

Otu ụbọchị n’ọnwa Ọktoba afọ 1972, ihe dị ka otu narị ụmụ okorobịa ndị na-alụrụ òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị e nwere na Malawi ọgụ nuuru bịawa n’ụlọ m. Ma tupu ha erute, otu onye n’ime ha ji ọsọ bịa gwa m ka m gaa zoo maka na ndị òtù ha na-abịa igbu m. M gwara nwunye m na ụmụ m ka ha gaa zoo n’úkwù unere ndị dị nso n’ụlọ anyị. M rịgoro n’elu otu nnukwu osisi mango. M nọ ebe ahụ na-ele ha ka ha na-emebisị ụlọ anyị na ihe niile anyị nwere.

A gbara ụlọ ụmụnna anyị ọkụ n’ihi na ha ekweghị etinye aka n’ihe gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị

Ka mkpagbu a na-esikwu ike, ọtụtụ ụmụnna si na Malawi gbaga obodo ọzọ. Mụ na ndị ezinụlọ m biri n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ dị n’ebe ọdịda anyanwụ Mozambik ruo n’ọnwa Jun afọ 1974. N’oge ahụ, a gwara mụ na nwunye m ka anyị bụrụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche n’obodo Domue dị na Mozambik, n’ebe dị nso n’ókè ha na Malawi. Anyị bụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche ruo n’afọ 1975, bụ́ mgbe ndị Pọtugal hapụrụ ndị Mozambik ka ha chịwa onwe ha. N’oge ahụ, a manyere anyị na ọtụtụ ụmụnna ndị ọzọ ịlaghachi Malawi, bụ́ ebe a ka na-akpagbu ụmụnna anyị.

Mgbe anyị laghachiri Malawi, a gwara m ka m gaa na-eleta ọgbakọ ndị dị na Lilongwe, bụ́ isi obodo Malawi. N’agbanyeghị mkpagbu a na-akpagbu anyị na nsogbu niile bịaara anyị, e kewapụtara ọgbakọ ndị ọhụrụ na sekit ahụ anyị na-eleta.

JEHOVA NỌ NA-ENYERE ANYỊ AKA

Otu ụbọchị, anyị batara n’otu obodo mgbe otu òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-enwe nzukọ ha. Ụfọdụ n’ime ha chọpụtara na anyị bụ Ndịàmà Jehova, ma manye anyị ka anyị nọrọ n’etiti ụmụ okorobịa ndị so n’òtù ọzọ na-alụrụ òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị e nwere na Malawi ọgụ. Anyị rịọsiri Jehova ike ka o nyere anyị aka ịma ihe anyị ga-eme n’oge ahụ. Mgbe ha gbasara nnọkọ ahụ, ha malitere iti anyị ihe. Otu agadi nwaanyị gbaara ọsọ bịa, tie, sị: “Biko, hapụnụ ha! Nwoke a bụ nwa nwanne m nwoke. Hapụnụ ya ka ọ gawa ebe ọ na-aga!” Onyeisi ha kwuru, sị: “Hapụnụ ha.”  Anyị amaghị ihe nwaanyị ahụ bu n’obi kwuo ihe ahụ n’ihi na ọ bụghị onye ikwu anyị. Obi anyị gwara anyị na Jehova azala ekpere anyị.

Kaadị òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị

N’afọ 1981, ụfọdụ ndị òtù ahụ hụrụ anyị ọzọ. Ha buuru ígwè anyị, akpa anyị, katọn akwụkwọ anyị, na faịlụ sekit anyị. Anyị gbagara n’ụlọ otu okenye, kpeekwa ekpere banyere nsogbu ahụ. Anyị nọ na-echegbu onwe anyị banyere ihe ndị dị na faịlụ ndị ahụ. Mgbe ndị òtù ahụ lere anya na faịlụ ndị ahụ, ha hụrụ akwụkwọ ozi ndị e si n’ebe dị iche iche na Malawi detara m. Ezigbo ụjọ tụrụ ha n’ihi na ha chere na m bụ onye ukwu na gọọmenti. N’ihi ya, ha weghachitere ihe ndị ahụ niile ozugbo otú ahụ ha dị, nye ha ndị okenye.

N’oge ọzọ, anyị ji ụgbọ mmiri na-agafe n’otu osimiri. Onye nwe ụgbọ mmiri ahụ bụ onyeisi òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’ebe ahụ. N’ihi ya, o kwuru ka onye ọ bụla nọ n’ụgbọ ahụ gosi ya kaadị òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọ na-akwado. Ka ọ na-erute ebe anyị nọ, ọ hụrụ onye ohi ndị ọchịchị na-achọ achọ. Ọgba aghara dara, mezie ka ọ ghara ịsị anyị gosi ya kaadị nke anyị. Ọzọkwa, anyị ghọtara na Jehova na-akwado anyị.

E JIDERE M, TỤỌ M MKPỌRỌ

Otu ụbọchị n’ọnwa Febụwarị afọ 1984, m na-aga Lilongwe ka m nye mmadụ akụkọ ozi ọ ga-ezigara alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Zambia. Otu onye uwe ojii jidere m, na-achọ ma ò nwere ihe ọ ga-ahụ n’akpa m. Mgbe ọ hụrụ akwụkwọ ụfọdụ e ji amụ Baịbụl, ọ kpụụrụ m gaa n’ụlọ ọrụ ha ma tiwe m ihe. O kere m agbụ ma tinye m n’ebe ha tinyere ndị zuru ohi.

N’echi ya, onyeisi ndị uwe ojii kpọgara m n’ọnụ ụlọ ọzọ, dee ihe n’akwụkwọ, sị m bịanye aka na ya. Ihe o dere bụ: “Abụ m Trophim R. Nsomba. Abụghịzi m Onyeàmà Jehova ka e wee tọhapụ m.” M gwara ya, sị: “Ọ bụghị naanị agbụ ka m dị njikere ka unu kee m, adịkwa m njikere ịnwụ. M ka bụ Onyeàmà Jehova.” M kweghị abịanye aka na ya. Ezigbo iwe were ya, ya esuo aka n’elu oche. Ụda aka ahụ o suru mere ka onye uwe ojii nọ n’ọnụ ụlọ nke dị anyị nso gbara bịa jụọ ya ihe merenụ. Onyeisi ahụ gwara ya, sị: “Nwoke a ekweghị abịanye aka na ya abụghịzi Onyeàmà Jehova. N’ihi ya, ka ọ bịanye aka na ya bụ Onyeàmà Jehova ka anyị ziga ya Lilongwe ka e kee ya agbụ.” N’oge a niile, nwunye m nọ na-eche ebe m nọ. Mgbe ụbọchị anọ gara, ụfọdụ ụmụnna gwara ya ihe merenụ.

Mgbe a kpọgara m n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii dị na Lilongwe, ndị uwe ojii meere m ebere. Onyeisi ha sịrị: “Were osikapa a rie n’ihi na ọ bụ Okwu Chineke mere ka e kee gị agbụ. Ma ndị ọzọ nọ ebe a bụ ndị ohi.” O mechara ziga m n’ụlọ mkpọrọ dị na Kachere. M nọrọ ebe ahụ ọnwa ise.

Obi dị onye na-elekọta ụlọ mkpọrọ ahụ ụtọ na m bịara. Ọ chọrọ ka m bụrụ “pastọ” ndị mkpọrọ. N’ihi ya, ọ gwara onye bụbu pastọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ, sị: “Achọghịzi m ka ọ bụrụ gị ga na-akụzi  Okwu Chineke ebe a n’ihi na ihe mere e ji tụọ gị mkpọrọ bụ na i zuru ohi na chọọchị unu.” Ọ gwaziri m ka m na-akụzi Baịbụl ná nnọkọ ndị mkpọrọ na-enwe kwa izu.

Ihe mechara ka njọ. Ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ mkpọrọ malitere ịgba m ajụjụ ọnụ ka ha chọpụta Ndịàmà Jehova ole nọ na Malawi. Azaghị m ha ihe juru ha afọ, ha akụwa m ihe ruo mgbe m tụbọrọ. N’oge ọzọ, ha jụrụ m ebe isi ụlọ ọrụ anyị dị. Mụ asị ha: “Ihe unu jụrụ m dị mfe. M ga-agwa unu.” Obi tọrọ ha ụtọ, ha agbanye ihe ha ga-eji tinye ihe m ga-ekwu na teepụ. M gwara ha na Baịbụl kọwara ebe isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị. O juru ha anya, ha asị m, “Ebee ka ọ dị na Baịbụl?”

M zara ha, sị, “Ọ dị n’Aịzaya 43:12.” Ha ji nwayọọ gụọ ebe ahụ, sị: “‘Unu bụ ndị àmà m,’ ka Jehova kwuru, ‘abụkwa m Chineke.’” Ha gụrụ ya ugboro atọ, jụzie m, sị: “Olee otú isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova ga-esi dịrị na Baịbụl ebe a kama ịdị n’Amerịka?” M gwara ha, sị: “Ndịàmà Jehova nọ n’Amerịka ghọtakwara na amaokwu a na-akọwa isi ụlọ ọrụ anyị.” Ebe ọ bụ na agwaghị m ha ihe ha chọrọ ịnụ, ha kpọgara m n’ụlọ mkpọrọ dị na Dzaleka, n’ebe ugwu Lilongwe.

JEHOVA GỌZIRI M N’OGE NSOGBU

Mgbe m ruru n’ụlọ mkpọrọ dị na Dzaleka n’ọnwa Julaị afọ 1984, ụmụnna ndị nọ ebe ahụ dị iri asatọ na otu. Ụlọ mkpọrọ ahụ juru eju, nke mere ka narị ndị mkpọrọ atọ na-ehi n’ala n’otu ọnụ ụlọ. Anyị bụ́ Ndịàmà Jehova ji nwayọọ nwayọọ kee onwe anyị ụzọ ole na ole ka anyị nwee ike ịna-atụle otu amaokwu Baịbụl kwa ụbọchị, nke ụmụnna dị iche iche na-atụ aro ya. Ọ gbara anyị ezigbo ume.

Onye na-elekọta ụlọ mkpọrọ ahụ mechara dewe anyị iche. Otu n’ime ndị na-eche nche n’ebe ahụ gwara anyị na nzuzo, sị: “Ndị ọchịchị akpọghị unu asị. E nwere ihe abụọ mere anyị ji tinye unu n’ụlọ mkpọrọ. Nke mbụ bụ na ndị ọchịchị na-atụ ụjọ na ụmụ okorobịa ndị na-alụrụ òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị e nwere na Malawi ọgụ ga-egbu unu. Nke ọzọ abụrụ na ebe unu na-ekwusa na e nwere agha a ga-alụ, ndị ọchịchị na-atụ egwu na ndị agha ha ga-agba ọsọ.”

Mgbe e kpechara ụmụnna ikpe, duru ha na-apụ

N’ọnwa Ọktoba afọ 1984, a kpọpụrụ anyị niile n’ụlọikpe, tụọ onye ọ bụla n’ime anyị mkpọrọ afọ abụọ. E tinyekọtara anyị na ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova n’ụlọ mkpọrọ otú e meburu anyị. Ma, onye na-elekọta ụlọ mkpọrọ ahụ maara mmadụ niile ọkwa, sị: “Ndịàmà Jehova anaghị aṅụ sịga. N’ihi ya, ndị nche, unu enyela ha nsogbu ka ha nye unu sịga ma ọ bụkwanụ gwa ha ka ha gaa wetara unu ihe unu ga-eji mụnye sịga unu ọkụ. Ha bụ ndị Chineke. E kwesịrị ịna-enye Ndịàmà Jehova niile nri ugboro abụọ n’ụbọchị, ebe ọ bụ na ihe mere e ji tụọ ha mkpọrọ abụghị na ha mere ihe ọjọọ, kama ọ bụ maka na ha kweere ihe Baịbụl kwuru.”

 E nwere uru ndị ọzọ àgwà ọma anyị baara anyị. Ọ na-abụ chi jie ma ọ bụ mmiri zowe, ndị nche anaghị ekwe ka ndị mkpọrọ pụọ n’èzí. Ma, a hapụrụ anyị ka anyị na-apụ mgbe ọ bụla anyị chọrọ. Ha ma na anyị agaghị anwa anwa gbaa ọsọ. E nwedịrị mgbe anyị gara n’otu ebe anyị nọ na-arụ ọrụ, onye na-eche anyị nche arịawa ọrịa. Anyị eburu ya laghachi n’ogige ụlọ mkpọrọ ahụ ka a gwọọ ya. Ndị na-arụ n’ụlọ mkpọrọ ahụ ma na anyị kwesịrị ntụkwasị obi. Obi tọrọ anyị ụtọ na àgwà ọma anyị mere ka ndị na-eche anyị nche too aha Jehova.—1 Pita 2:12. *

ANYỊ ENWEELA OGE ỌMA UGBU A

N’abalị iri na otu n’ọnwa Mee afọ 1985, a tọhapụrụ m n’ụlọ mkpọrọ ahụ dị na Dzaleka. Obi dị m ezigbo ụtọ mgbe m lakwuuru ndị ezinụlọ m. Anyị na-ekele Jehova maka na o nyeere anyị aka ịna-eme ihe ziri ezi n’anya ya n’oge ahụ tara akpụ. N’oge ahụ, obi dị anyị otú obi dị Pọl onyeozi mgbe o dere, sị: “Anyị achọghị ka unu ghara ịma, ụmụnna anyị, banyere mkpagbu nke dakwasịrị anyị . . . Anyị ejighị ọbụna ndụ anyị n’aka ma ọlị. N’eziokwu, anyị chere n’ime onwe anyị na a mawo anyị ikpe ọnwụ. Ihe mere anyị ji chee otú a bụ ka anyị ghara ịtụkwasị onwe anyị obi, kama ka anyị tụkwasị Chineke obi, bụ́ onye na-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. Ọ napụtara anyị n’oké ihe dị otú ahụ nke bụ́ ọnwụ.”—2 Kọr. 1:8-10.

Mgbe Nwanna Nsomba na nwunye ya, bụ́ Lidasi, nọ n’ihu otu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’afọ 2004

N’eziokwu, ọ dị anyị mgbe ụfọdụ ka ànyị ga-anwụ. Ma, anyị rịọrọ Jehova mgbe niile ka o nye anyị obi ike na amamihe ga-enyere anyị aka ịdị umeala n’obi ka anyị nwee ike ime ka e too aha ukwu ya.

Jehova agọziela ozi anyị, ma ‘n’oge dị mma ma n’oge nsogbu.’ Obi dị anyị ezigbo ụtọ ugbu a ịhụ alaka ụlọ ọrụ a rụchara na Lilongwe n’afọ 2000 nakwa ihe karịrị otu puku Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ a rụrụ n’ebe dị iche iche na Malawi. Ihe ọma a niile Jehova meere anyị tụrụ mụ na nwunye m n’anya. Ọ dị anyị ka ọ̀ bụ ná nrọ. *

^ para. 7 Ụmụnna ndị ụmụ ha ka dị obere anaghịzi abụ ndị nlekọta sekit.

^ para. 30 Ị chọọ ịmatakwu gbasara otú e si kpagbuo ụmụnna nọ na Malawi, gụọ Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 1999, peeji nke 171-223. Ọ dị n’asụsụ Bekee.

^ para. 34 Ka a na-akwadebe ibipụta isiokwu a, Nwanna Nsomba nwụrụ. Ọ gbara afọ iri asatọ na atọ.