Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) EPREL 2015

Gị na Jehova Ùnu Dị ná Mma n’Eziokwu?

Gị na Jehova Ùnu Dị ná Mma n’Eziokwu?

“Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.”—JEMS 4:8.

1. Gịnị mere anyị ji kwesị ịgbasi mbọ ike ka anyị na Jehova dị n’ezigbo mma?

Ị̀ BỤ Onyeàmà Jehova e mere baptizim? Ọ bụrụ na ị bụ, i nwere akụ̀ bara ezigbo uru, ya bụ, adịm ná mma gị na Chineke. Ma, ụwa Setan na anụ ahụ́ anyị na-ezughị okè na-agbalị ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma. Ihe a bụ nsogbu cheere Ndị Kraịst niile aka mgba. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike ka anyị na Jehova dị n’ezigbo mma mgbe niile.

2. (a) Olee ihe na-egosi na mmadụ abụọ dị ná mma? (Kwuo ihe e dere n’ala ala peeji.) (b) Olee otú anyị ga-esi mee ka anyị na Jehova dị n’ezigbo mma?

2 Gị na Jehova ùnu dị ná mma n’eziokwu? Ị̀ chọrọ ime ka unu dịkwuo ná mma? Jems 4:8 kwuru otú ị ga-esi eme ya. Ọ sịrị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.” Adịm ná mma ahụ gbasara gị na Jehova. * Ọ bụrụ na i mee ihe i kwesịrị ime iji bịaruo Chineke nso, ọ ga-abịaru gị nso.  Ka ị na-eme otú ahụ, ị ga-aghọta na Chineke dị adị, gị na ya adịkwuo ná mma. Ọ ga-adị gị otú ọ dị Jizọs mgbe ọ sịrị, “Onye zitere m dị adị n’ezie . . . Amaara m ya.” (Jọn 7:28, 29) Ma, olee ihe ndị i kwesịrị ime ka gị na Jehova dịkwuo ná mma?

Olee otú gị na Chineke ga-esi na-ekwurịta okwu? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 3)

3. Olee otú anyị na Jehova ga-esi na-ekwurịta okwu?

3 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịbịaru Jehova nso, gị na ya kwesịrị ịna-ekwurịta okwu mgbe niile. Olee otú gị na Chineke ga-esi na-ekwurịta okwu? Ka e were ya na enyi gị bi n’ebe dị anya, olee otú gị na ya ga-esi na-ekwurịta okwu? Unu nwere ike ịna-ederịta akwụkwọ ozi ma na-ekwurịta okwu n’ekwentị ugboro ugboro. Otú ị ga-esi na-agwa Jehova okwu bụ ịna-ekpegara ya ekpere mgbe niile. (Gụọ Abụ Ọma 142:2.) Otú ị ga-esi kwe ka Jehova na-agwa gị okwu bụ ịna-agụ Okwu ya bụ́ Baịbụl mgbe niile ma na-atụgharị uche na ya. (Gụọ Aịzaya 30:20, 21.) Ka anyị tụlee otú ime ihe ndị a ga-esi mee ka anyị na Jehova dịkwuo ná mma, anyị na ya abụrụkwa ezigbo enyi.

JEHOVA NA-AGWA GỊ OKWU MGBE Ị NA-AMỤ BAỊBỤL

4, 5. Olee otú Jehova si agwa gị okwu mgbe ị na-amụ Baịbụl? Nye ihe atụ.

4 O doro anya na i kwetara na ihe dị na Baịbụl bụ ihe Chineke chọrọ ka mmadụ niile mara. Ma, Baịbụl ò kwuru otú gịnwa ga-esi bịaruo Jehova nso? Eenụ. Ka ị na-agụ Baịbụl ma na-amụ ya mgbe niile, mata otú obi dị gị banyere ihe ị na-agụ. Cheekwa otú ị ga-esi mee ihe ị mụtara. I mee otú ahụ, ọ pụtara na ị na-ekwe ka Jehova gwa gị okwu. Ọ ga-abụ ezigbo Enyi gị, gị na ya adịkwuo ná mma.—Hib. 4:12; Jems 1:23-25.

5 Dị ka ihe atụ, gụọ ma tụgharịa uche n’ihe Jizọs kwuru, ya bụ, “Kwụsịnụ ịkpakọbara onwe unu akụ̀ n’ụwa.” Ọ bụrụ na i chere na ị na-agbalịsi ike ibu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke, obi gị ga-agwa gị na ị na-eme Jehova obi ụtọ. Ma, ọ bụrụ na ị chọpụta na i kwesịrị iselata aka n’ịchụ akụnụba ma gbakwuo mbọ ka i buru ụzọ na-achọ Alaeze Chineke, ọ pụtara na Jehova emeela ka ị mata ihe kwesịrị ime ka gị na ya dịkwuo ná mma.—Mat. 6:19, 20.

6, 7. (a) Olee uru ịmụ Baịbụl ga-abara anyị? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị ibu n’obi mgbe anyị na-amụ Baịbụl?

6 Ọ bụghị naanị na ịmụ Baịbụl na-eme ka anyị mata àgwà ndị anyị kwesịrị ịgbanwe,  ọ na-emekwa ka anyị ghọtakwuo ihe ọma Jehova na-eme nakwa àgwà ya ndị magburu onwe ha. Ihe ndị a na-eme ka anyị hụkwuo ya n’anya. Ọ bụrụ na anyị ahụkwuo Chineke n’anya, ọ ga-ahụkwu anyị n’anya, anyị na ya adịkwuo ná mma.—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 8:3.

7 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbịaru Jehova nso, anyị kwesịrị ibu ezi ihe n’obi na-amụ Baịbụl. Jọn 17:3 sịrị: “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” N’ihi ya, ihe anyị kwesịrị ibu n’obi na-agụ Baịbụl ekwesịghị ịbụ naanị ka anyị mata ihe ọhụrụ, kama o kwesịrị ịbụ ka anyị ‘matakwuo’ onye Jehova bụ.—Gụọ Ọpụpụ 33:13; Ọma 25:4.

8. (a) Olee ihe ụfọdụ ndị nwere ike iche banyere ihe 2 Ndị Eze 15:1-5 kwuru na Jehova mere Eze Azaraya? (b) Olee otú ịmata Jehova nke ọma ga-esi mee ka anyị ghara ichewe ma ihe o mere ò ziri ezi?

8 Ọ bụrụ na anyị amatakwuo ụdị onye Jehova bụ, anyị agaghị echegbuwe onwe anyị ma ọ bụrụ na Baịbụl ekwughị ihe mere Jehova ji mee ihe ụfọdụ o mere. Dị ka ihe atụ, gịnị ka ị ga-ekwu ma ị gụọ banyere ihe Jehova mere Azaraya bụ́ eze Juda? (2 Eze 15:1-5) Cheta na Azaraya nọ “na-eme ihe ziri ezi n’anya Jehova” n’agbanyeghị na “ndị mmadụ ka nọ na-achụ àjà ma na-esure ihe nsure ọkụ n’ebe ndị dị elu.” Ma Baịbụl kwuru, sị, “Jehova tiri eze ihe otiti, o wee bụrụ onye ekpenta ruo ụbọchị ọ nwụrụ.” N’ihi gịnị? Akwụkwọ Ndị Eze nke Abụọ ahụ agwaghị anyị. Ò kwesịrị inyewe anyị nsogbu n’obi ma ọ bụ mee ka anyị chewe ma Jehova ọ̀ tara Azaraya ahụhụ n’enweghị ihe o mere? Anyị agaghị eche otú ahụ ma ọ bụrụ na anyị mata nke ọma otú Jehova si eme ihe. Anyị ga-amata na Jehova na-adọ mmadụ aka ná ntị “ruo n’ókè kwesịrị ekwesị.” (Jere. 30:11) N’ihi ya, obi ga-esi anyị ike na Jehova mere ihe ziri ezi, ọ bụrụgodị na anyị amaghị ihe mere o ji tie Azaraya ihe otiti.

9. Olee ihe ndị mere ka anyị ghọtakwuo ihe mere Jehova ji mee ka Azaraya bụrụ onye ekpenta?

9 Ma, e nwere ebe ọzọ Baịbụl kọkwuuru anyị gbasara Eze Azaraya. Aha ọzọ a kpọrọ ya bụ Eze Ọzaya. (2 Eze 15:7, 32) Ihe E Mere nke Abụọ 26:3-5, 16-21 kwuru na o mere “ihe ziri ezi n’anya Jehova.” Ma, o kwukwara na obi Ọzaya mechara “dị mpako nke na ọ kpataara onwe ya mbibi.” Mpako mere ka ọ nwaa ịrụ ọrụ naanị ndị nchụàjà kwesịrị ịrụ. Ndị nchụàjà iri asatọ na otu gwara ya na ihe ọ chọrọ ime adịghị mma, gbalịakwa ka ha gbochie ya ime ya. Gịnị ka Ọzaya mere? O mere ihe gosiri na ọ dị mpako. O wesoro ndị nchụàjà ahụ “oké iwe.” Ka a sịkwa ihe mere Jehova ji mee ka ọ bụrụ onye ekpenta.

10. Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịchọwa ka a kọwaara anyị ihe mere Jehova ji mee ihe ọ bụla o mere? Olee otú anyị ga-esi mee ka obi sie anyị ike na ihe niile Jehova na-eme ziri ezi?

10 Anyị ekwesịghị ichefu ihe akụkọ a na-akụziri anyị. Ọ bụrụ na a kọrọ akụkọ na Baịbụl, ma e nweghị ebe ọzọ Baịbụl mere ka ihe ụfọdụ gbasara akụkọ ahụ dokwuo anya, gịnị ka ị ga-eme? Ị̀ ga-echewe na ihe Chineke mere adịghị mma? Ka ị̀ ga-aghọta na ihe Baịbụl gwara anyị kwesịrị ime ka obi sie anyị ike na ihe ọ bụla Jehova mere ziri ezi nakwa na ọ bụ ya kwesịrị ịgwa anyị ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi? (Diut. 32:4) Ọ bụrụ na ị na-amatakwu ụdị onye Jehova bụ, ị ga-ahụkwu ya n’anya ma tụkwasịkwuo ya obi. Ị gaghịzi achọwa ka a kọwaara gị ihe mere o ji mee ihe ọ bụla o mere.  Ka ị na-amụ Baịbụl ma na-atụgharị uche na ya, ị ga-aghọtakwu na Jehova bụ onye dị adị, gị na ya ana-adịkwu ná mma.—Ọma 77:12, 13.

Ị NA-AGWA JEHOVA OKWU MGBE Ị NA-EKPEGARA YA EKPERE

11-13. Olee otú i si mara na Jehova na-anụ ekpere? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

11 Mgbe anyị na-ekpe ekpere, anyị na-abịaru Jehova nso. Anyị na-eto ya, na-ekele ya ma na-arịọ ya ka o zi anyị ụzọ anyị ga-eso. (Ọma 32:8) Ma, ọ bụrụ na ị chọrọ ka gị na Jehova bụrụ ezigbo enyi, obi kwesịrị isi gị ike na ọ na-aza ekpere.

12 Ụfọdụ ndị chere na naanị uru ekpere bara bụ na ọ na-eme ka obi dị mmadụ mma. Ha na-ekwu na ọ bụrụ na ọ dị anyị ka à zara ekpere anyị, ọ bụ n’ihi na anyị kwupụtara ihe anyị bu n’obi, mata ihe bụ́ nsogbu anyị ma gbalịsie ike ka anyị mee ihe banyere ya. Ọ bụ eziokwu na ihe ndị a so n’uru ekpere bara, olee otú obi ga-esi sie gị ike na Jehova na-anụ ekpere i ji obi gị niile na-ekpe?

13 Chegodị echiche. Tupu Jizọs abịa n’ụwa, ọ hụrụ otú Jehova si zaa ekpere ndị ohu ya. Mgbe ọ bịara n’ụwa, o kpegaara Nna ya nke eluigwe ekpere ugboro ugboro ma gwa ya otú obi dị ya. O nwedịrị mgbe o kpere ekpere n’ogologo abalị niile. (Luk 6:12; 22:40-46) Jizọs ọ̀ gaara eme otú ahụ ma a sị na ọ ma na Jehova anaghị anụ ekpere? Ọ kụzikwaara ndị na-eso ụzọ ya otú ha ga-esi na-ekpe ekpere. Ọ̀ gaara eme otú ahụ ma a sị na o chere na naanị uru ekpere bara bụ na ọ na-eme ka obi dị mmadụ mma? O doro anya na ọ ma na ekpere bụ ụzọ mmadụ ga-esi gwa Jehova okwu. O nwere mgbe Jizọs kwuru, sị: “Nna, ana m ekele gị na ị nụwo olu m. N’eziokwu, amaara m na ị na-anụ olu m mgbe niile.” Obi kwesịkwara isi anyị ike na Jehova bụ “Onye na-anụ ekpere.”—Jọn 11:41, 42; Ọma 65:2.

14, 15. (a) Olee uru ịkpọ okwu aha mgbe anyị na-ekpe ekpere bara? (b) Olee otú ekpere otu nwanna nwaanyị kpere si mee ka ya na Jehova dịkwuo ná mma?

14 O nwere ike ịdị gị mgbe ụfọdụ ka Jehova azaghị ekpere gị. Ma, ọ bụrụ na ị kpọọ okwu aha mgbe ị na-ekpe ekpere, ọ ga-eme ka ị hụ otú Jehova si zaa ekpere  gị. Ị ga-aghọtakwu na Jehova bụ onye dị adị. Ọ bụrụ na ị na-agwa Jehova ihe ọ bụla na-echu gị ụra, gị na ya ga na-adịkwu ná mma.

15 Chegodị banyere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Karo. * Ozi ọma anaghị atọ ya ụtọ n’agbanyeghị na ọ na-agachi ya anya. Ọ sịrị: “Ịga ozi ọma anaghị atọ m ụtọ. N’eziokwu, ọ naghị atọ m ụtọ. Mgbe m lara ezumike nká, otu okenye kwuru na ya nwere olileanya na m ga-abụ ọsụ ụzọ oge niile. O nyedịrị m akwụkwọ m ga-edejupụta. M kpebiri ịsụ ụzọ. Ma, m malitere ikpe ekpere kwa ụbọchị, na-arịọ Jehova ka o mee ka ịga ozi ọma tọwa m ụtọ.” Jehova ọ̀ zara ekpere ya? Ọ sịrị: “Ihe a bụ afọ nke atọ kemgbe m sụwara ụzọ. Ejirila m nwayọọ nwayọọ mụtakwuo otú e si ezi ozi ọma. Ihe nyeere m aka bụ iwepụtakwu oge na-aga ozi ọma na ịmụta ihe n’aka ụmụnna nwaanyị ndị ọzọ. Taa, ọ bụghị naanị na ịga ozi ọma na-amasị m, kama ọ na-atọgbu m atọgbu. Ihe ọzọ bụ na mụ na Jehova adịkwuola ná mma.” O doro anya na ekpere Karo kpere nyeere ya aka ka ya na Jehova dịkwuo ná mma.

MEE IHE I KWESỊRỊ IME

16, 17. (a) Gịnị ka anyị kwesịrị ime ka anyị na Jehova dịkwuo ná mma? (b) Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

16 Ime ka anyị na Jehova na-adịkwu ná mma bụ ihe anyị ga na-eme ruo mgbe ebighị ebi. Anyị ga na-agbasi mbọ ike ịbịaru Chineke nso ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ọ bịaruo anyị nso. N’ihi ya, ka anyị na-agwa Chineke okwu mgbe niile n’ekpere, na-amụkwa Baịbụl n’ihi na ọ bụ otú anyị ga-esi na-ege ya ntị. Anyị mee otú ahụ, anyị na Jehova ga na-adịkwu ná mma. Ọ ga-enyekwara anyị aka imeri ọnwụnwa ndị na-abịara anyị.

Ime ka anyị na Jehova na-adịkwu ná mma bụ ihe anyị ga na-eme ruo mgbe ebighị ebi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16 na 17)

17 Ma, anyị na nsogbu ka nwere ike ịna-alụ n’agbanyeghị na anyị ji obi anyị niile na-ekpe ekpere. Ụdị ihe a nwere ike ime ka anyị ghara ịtụkwasịzi Jehova obi, anyị echewe ma Jehova ọ̀ ka na-anụ ekpere anyị. O nwekwara ike ịdị anyị ka anyị na ya adịghịzi ná mma. Gịnị ka anyị ga-eme ma ụdị ihe a mewe anyị? A ga-aza ajụjụ a n’isiokwu na-esonụ.

^ para. 2 Ihe na-egosi na mmadụ abụọ dị ná mma bụ otú ha abụọ si were ibe ha na otú ha si emeso ibe ha. N’ihi ya, ọ bụ ha abụọ ga-eme ka ha na-adị ná mma.

^ para. 15 Aha a kpọrọ ya abụghị ezigbo aha ya.