Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) MACH 2015

Ọ̀ Ka Na-ekwe Omume Ịlụ “Naanị n’Ime Onyenwe Anyị”?

Ọ̀ Ka Na-ekwe Omume Ịlụ “Naanị n’Ime Onyenwe Anyị”?

“Ahụghị m onye m ga-alụ n’ọgbakọ. Achọghịkwanụ m ịnọ naanị m ruo mgbe m kara nká.”

“Ụfọdụ ụmụ nwoke bụ́ ndị ụwa dị obiọma, na-akpa àgwà ọma, na-echebakwara mmadụ echiche. Ha anaghị enye m nsogbu maka na m bụ Onyeàmà Jehova. O yiri ka hà kadị ụfọdụ ụmụnna mma.”

Ụfọdụ ndị ohu Chineke ekwuola ụdị ihe a mgbe ha na-achọ onye ha ga-alụ. Ma, ha na-echeta na Pọl onyeozi gwara ndị na-achọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye ka ha lụọ “naanị n’ime Onyenwe anyị.” O doro ha anya na ọ bụ ihe Ndị Kraịst niile kwesịrị ime. (1 Kọr. 7:39) Gịnị meziri ha ji ekwu ụdị ihe ahụ?

IHE MERE ỤFỌDỤ JI ENWE OBI ABỤỌ

Ndị na-ekwu ụdị ihe ahụ nwere ike ịna-eche na ụmụnna nwaanyị na-alụbeghị di ka ụmụnna nwoke na-alụbeghị nwaanyị. N’eziokwu, e nwere obodo ndị ọ dị otú ahụ. Dị ka ihe atụ, na Koria, e kee ụmụnna na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ụzọ iri, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na ụzọ isii bụ ụmụnna nwaanyị, ebe ihe dị ka ụzọ anọ bụ ụmụnna nwoke. Na Kolombia, e kee ụmụnna niile ụzọ iri, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na ụzọ asaa bụ ndị nwaanyị, ndị nwoke ejiri obere karịa ụzọ atọ.

Ná mba ụfọdụ, otu n’ime nsogbu a na-enwe bụ na ndị nne na nna na-abụghị Ndịàmà Jehova nwere ike isi ọnwụ na onye bịara ịlụ nwa ha ga-enye ha ego buru ibu. O nwekwara ike ịbụ na ụfọdụ ụmụnna ndị chọrọ ịlụ nwaanyị enweghị ụdị ego ahụ. N’ihi ya, nwanna nwaanyị nwere ike iche na ọ ga-esiri ya ike ịlụta di n’ọgbakọ. Ụdị ihe a emeela ka ụfọdụ ụmụnna nwaanyị chewe ma hà ga-ahụli nwanna nwoke ga-alụ ha. *

 TỤKWASỊ JEHOVA OBI

Ọ bụrụ na i chetụla ụdị ihe ahụ, ka obi sie gị ike na Jehova ma ihe gị na ya na-alụ. N’eziokwu, ọ ma otú obi dị gị.—2 Ihe 6:29, 30.

Ma, Jehova nyere anyị iwu na Baịbụl ka anyị lụọ naanị n’ime Onyenwe anyị. Maka gịnị? Maka na ọ ma ihe ga-abara ndị ohu ya uru. Ọ bụghị naanị na ọ chọrọ ichebe anyị ka anyị ghara ime ihe ga-akpatara anyị nsogbu, kama ọ chọkwara ka anyị na-enwe obi ụtọ. N’oge Nehemaya, ọtụtụ ndị Juu gara lụọ ụmụ nwaanyị ndị na-anaghị efe Jehova. N’ihi ya, Nehemaya chetaara ha ihe ọjọọ Sọlọmọn mere. N’agbanyeghị na Sọlọmọn bụ “onye Chineke ya hụrụ n’anya, . . . ndị inyom ọ lụtara ná mba ọzọ mere ka o mehie.” (Nehe. 13:23-26) Jehova ma na anyị ga-erite uru ma anyị rubere ya isi. Ọ bụ ya mere o ji gwa anyị ka anyị ghara ịlụ onye na-abụghị Onyeàmà Jehova. (Ọma 19:7-10; Aịza. 48:17, 18) Ebe anyị bụ ezi Ndị Kraịst, obi dị anyị ụtọ na Chineke hụrụ anyị n’anya ma na-enye anyị ndụmọdụ ga-abara anyị uru. Ọ bụrụ na anyị erubere ya isi, ọ ga-egosi na anyị kwetara ọ bụ ya na-achị anyị nakwa na ọ bụ ya bụ Ọkaakaa Eluigwe na Ụwa.—Ilu 1:5.

O doro anya na ị chọghị ka gị na onye na-ekweghị ekwe ‘kekọta onwe unu,’ ya bụ, ịlụ onye na-anaghị efe Jehova. Onye ahụ nwere ike ime ka ị kwụsị ife Chineke. (2 Kọr. 6:14) Taa, ọtụtụ Ndị Kraịst eruberela iwu ahụ Chineke nyere isi. Ha achọpụtakwala na ọ bụ ihe kacha mma mmadụ ga-eme nakwa na iwu ya bara uru mgbe niile. Ma, e nweekwala ndị nupụụrụ iwu ahụ isi.

Ọ KA NA-EKWE OMUME

Otu nwanna nwaanyị bi n’Ọstrelia aha ya bụ Mata * kwuru ihe mere mgbe ya na onye na-abụghị nwanna malitere ịkpa. Ọ sịrị: “Anaghịzi m agachi ọmụmụ ihe anya ka mụ na ya nwee ike ịnọrị. Ụkwụ esighịzi m ike n’ọgbakọ.” N’India, nwanna nwaanyị ọzọ aha ya bụ Rut na nwa klas ha na-amụ Baịbụl malitere ịkpa. Ma ka oge na-aga, o doro anya na ihe mere nwa okorobịa ahụ ji mụwa ihe bụ ka ya na Rut nwee ike ịna-akpa. Rut mechara hapụ ọgbakọ, kpewe okpukpe ọzọ ka ha nwee ike ịlụ.

Na Kameruun, otu nwa agbọghọ aha ya bụ Neomi lụrụ di mgbe ọ dị afọ iri na itoolu. Tupu ha alụọ, nwoke ahụ kwere ya nkwa na ya ga-ekwe ka ọ na-efe Jehova. Ma izu abụọ ha gbachara akwụkwọ, di ya nyere ya iwu ka ọ ghara ịgakwa ọmụmụ ihe. Neomi kwuru, sị: “M nọzi naanị m, na-ebe ákwá mgbe niile. M chọpụtara na enweghịzi m onwe m. M na-akwa mmakwaara mgbe niile.”

N’eziokwu, ọ bụghị ndị niile bụ́ ndị ụwa na-emesi di ha ma ọ bụ nwunye ha bụ́ Onye Kraịst ike. Ma, ọ bụrụ na Onye Kraịst alụọ onye ụwa, ya na Jehova hà ka ga-adị ná mma, ọ bụrụgodị na di ya ma ọ bụ nwunye ya anaghị emesi ya ike? Olee otú obi ga-adị gị maka na i nupụrụ isi n’iwu o nyere gị nke ga-abara gị uru? Nke kachanụ bụ, olee otú obi ga-adị Jehova maka ihe i mere?—Ilu 1:33.

N’ụwa niile, ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị ndị rubeere Jehova isi kwetara na ịlụ “naanị n’ime Onyenwe anyị” bara ezigbo uru. Ụmụnna ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ekpebiekwala na ọ bụ naanị ndị na-efe Jehova ka ha ga-alụ ka ha wee mee Chineke obi ụtọ. Na Japan, otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Michiko kpebiri irubere Jehova isi. Ma, ndị ikwu ya gbalịrị ime ka o kweta ịlụ onye na-abụghị Onyeàmà Jehova. Ihe ọzọ bụ na ndị enyi ya lụtara di n’ọgbakọ, ma yanwa ahụbeghị onye ga-alụ ya. Ọ sịrị: “M nọ na-agwa onwe m na ebe Jehova bụ ‘Chineke onye obi ụtọ,’ anyị ga na-enwe obi ụtọ ma ànyị lụrụ di ma ọ bụ na anyị alụghị. M makwa na ọ na-enye anyị ihe na-akpa anyị. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị ahụghị onye anyị ga-alụ, ọ ka mma ka anyị nọrọ otú ahụ ruo mgbe anyị ga-ahụ onye anyị ga-alụ.” (1 Tim. 1:11) Michiko mechara lụọ ezigbo nwanna nwoke, obi dịkwa ya ụtọ na o nwere ndidi.

Ụfọdụ ụmụnna nwoke echerekwala ruo mgbe ha chọtara onye ha ga-alụ. Dị ka ihe atụ, e nwere nwanna nwoke bụ́ onye Ọstrelia aha ya bụ Bill. O kwuru na e nwere mgbe ọ malitere inwe mmasị n’ebe ụmụ nwaanyị na-abụghị Ndịàmà Jehova nọ. Ma, o kweghị ka ya na ha na-akpa. Maka gịnị? Maka na ọ chọghị ime ihe ‘ga-ekekọta’ ya na onye na-ekweghị ekwe. Kemgbe ọtụtụ afọ, e nweela ụmụnna nwaanyị ole na ole o nwere mmasị n’ebe ha nọ, ma ha ahụghị ya n’anya. Bill cheere ruo iri afọ atọ tupu  ya ahụ nwanna nwaanyị ọ dabaara ya na ya. Bill sịrị: “Anaghị m akwa mmakwaara.” O kwukwara, sị: “Obi na-adị m ezigbo ụtọ n’ihi na mụ na ya na-eso aga ozi ọma, na-amụkọ ihe ọnụ, na-efekọkwa Jehova ọnụ. Obi na-adị m ụtọ mgbe m hụrụ ndị enyi nwunye m nakwa mgbe anyị na ha na-anọrị n’ihi na ha niile na-efe Jehova. Mụ na nwunye m na-eji ihe Baịbụl kwuru edozi nsogbu anyị nwere.”

MGBE Ị NA-ECHERE JEHOVA

Gịnị ka i nwere ike ịna-eme ka ị tụkwasịrị Jehova obi, na-eche ka ị lụta onye na-efe ya? Otu n’ime ihe ị ga-eme bụ ichebara ihe mere na ị lụbeghị di ma ọ bụ nwunye echiche. Ọ bụrụ na i chere na ọ bụ maka na Baịbụl sịrị ka anyị lụọ “naanị n’ime Onyenwe anyị,” i mere nke ọma. Ka obi sie gị ike na obi dị Jehova ụtọ n’ihi na i kpebisiri ike irubere ya isi. (1 Sam. 15:22; Ilu 27:11) Na-agwa Chineke ihe dị gị n’obi. (Ọma 62:8) Ka ị na-ekpesi ekpere ike mgbe niile, gị na ya ga-adịkwu ná mma. Ihe ọzọ ga-eme ka gị na ya na-adịkwu ná mma bụ ịna-agbalịsi ike ka i merie ọnwụnwa ndị na-abịara gị kwa ụbọchị. Ka obi sie gị ike na Jehova anaghị eleghara ndị ji obi ha niile na-efe ya anya nakwa na ị bara ezigbo uru n’anya ya. Ọ na-eche banyere ihe na-akpa gị na ihe ndị na-echegbu gị. O nweghị onye o kwere nkwa di ma ọ bụ nwunye. Ma, ọ bụrụ na ịlụ di ma ọ bụ nwunye bụ mkpa gị n’eziokwu, Chineke ma otú kacha mma ọ ga-esi gbooro gị ya.—Ọma 145:16; Mat. 6:32.

Oge ụfọdụ, o nwere ike ịdị gị otú ọ dị Devid mgbe ọ sịrị: “Jehova, biko, mee ngwa za m. Ike agwụla mmụọ m. Ewepụla ihu gị n’ebe m nọ.” (Ọma 143:5-7, 10) Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, nye Jehova ohere ka o gosi gị ihe ọ chọrọ ka i mee. I nwere ike iji oge ahụ na-agụ Okwu ya bụ́ Baịbụl, na-echebakwara ihe ị na-agụ echiche. Ime otú ahụ ga-enyere gị aka ịmata ihe ọ chọrọ ka i mee. Ị ga-ahụkwa otú o si nyere ndị fere ya n’oge ochie aka. Ime ihe ndị a ga-egosi na ị na-ege Chineke ntị, ọ ga-emekwa ka obi sie gị ike na irubere iwu ya isi bara uru.

Ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye bara ezigbo uru n’ọgbakọ. Ha na-enyere ezinụlọ dị iche iche na ụmụaka aka

Olee ihe ọzọ ị ga-eme ka oge ị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye baara gị uru, obi ana-adịkwa gị ụtọ? I nwere ike ịgbakwu mbọ ka gị na Jehova dịkwuo ná mma nakwa ka i nwee aha ọma. I nwekwara ike ịmụtakwu imesapụ aka, ịrụsi ọrụ ike, inwe obiọma, na irubere Jehova isi. Ihe a niile na-eso eme ka ezinụlọ na-enwe obi ụtọ. (Jen. 24:16-21; Rut 1:16, 17; 2:6, 7, 11; Ilu 31:10-27) Buru ụzọ na-achọ Alaeze Chineke. Otú ị ga-esi eme ya bụ iwepụtakwu oge na-ekwusa ozi ọma, na-emekwa ihe ndị ọzọ a na-eme n’ọgbakọ. Ihe ndị a ga-eme ka ị ghara ime ihe ị na-ekwesịghị ime. Nwanna ahụ aha ya bụ Bill kwuru banyere oge ahụ ọ na-alụbeghị nwaanyị, sị: “Oge ahụ gafere ngwa ngwa. Eji m ya sụọ ụzọ oge niile.”

N’eziokwu, ịlụ “naanị n’ime Onyenwe anyị” ka na-ekwe omume. Irubere iwu ahụ isi ga-eme ka anyị sọpụrụ Jehova, anyị enweekwa obi ụtọ. Baịbụl kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị onye na-atụ egwu Jehova, bụ́ onye ihe o nyere n’iwu na-atọ ụtọ nke ukwuu. Ihe ndị dị oké ọnụ ahịa nakwa akụnụba dị n’ụlọ ya; ezi omume ya na-adịrukwa mgbe ebighị ebi.” (Ọma 112:1, 3) N’ihi ya, kpebisie ike na ị ga-erube isi n’iwu Chineke nyere ka anyị lụọ “naanị n’ime Onyenwe anyị.”

^ para. 7 N’agbanyeghị na ọ bụ ụmụnna nwaanyị ka anyị ga-ekwu banyere ha n’isiokwu a, ihe ndị e kwuru gbasakwara ụmụnna nwoke.

^ para. 13 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.