Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) MACH 2015

Jiri Obi Gị Niile Na-akwado Ụmụnna Kraịst

Jiri Obi Gị Niile Na-akwado Ụmụnna Kraịst

“Ihe niile unu meere otu n’ime ndị kasị nta n’ime ụmụnna m ndị a, ọ bụ m ka unu meere ya.”—MAT. 25:40.

1, 2. (a) Olee ilu ụfọdụ Jizọs tụụrụ ezigbo ndị enyi ya? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Gịnị ka anyị kwesịrị ịghọta n’ilu Jizọs tụrụ gbasara atụrụ na ewu?

E NWERE mgbe Jizọs nọ na-agwa ezigbo ndị enyi ya bụ́ Pita, Andru, Jems, na Jọn okwu. Mgbe ọ tụchaara ha ilu gbasara ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, ụmụ agbọghọ iri ahụ na-amaghị nwoke, na talent ndị ahụ, ọ tụụrụ ha ilu ọzọ. N’ilu ahụ, ọ gwara ha banyere mgbe “Nwa nke mmadụ” ga-ekpe “mba niile” ikpe. O kwuru na “Nwa nke mmadụ” ga-ekewa ndị mmadụ ụzọ abụọ ma kwuo na otu ga-abụ atụrụ, nke ọzọ abụrụ ewu. Ndị nke atọ o kwukwara banyere ha bụ ndị ọ kpọrọ “ụmụnna” “eze ahụ.”—Gụọ Matiu 25:31-46.

2 O teela ndị Jehova chọwara ịmata ihe ilu ahụ pụtara n’ihi na ihe Jizọs kwuru na ya gbasara ihe ga-eme ndị mmadụ n’ọdịnihu. O kwuru ihe mere ụfọdụ ndị ga-eji nweta ndụ ebighị ebi, ma ndị ọzọ anwụọ ọnwụ ebighị ebi. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịdị ndụ, anyị kwesịrị ịghọta eziokwu o ji ilu ahụ kụzie ma mee ihe ọ kụziri. Ebe ọ bụ na ihe a bụ okwu  gbasara ọnwụ na ndụ, anyị kwesịrị ịjụ, sị: Olee otú Jehova si jiri nke nta nke nta mee ka anyị ghọtakwuo ihe ilu a pụtara? Gịnị mere anyị ga-eji kwuo na ilu a gosiri na ikwusa ozi ọma dị ezigbo mkpa? Olee ndị e nyere ọrụ ikwusa ozi ọma? Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-akwado “eze ahụ” na “ụmụnna” ya ugbu a?

OLEE OTÚ JEHOVA SI NYERE ANYỊ AKA ỊGHỌTAKWU ILU AHỤ?

3, 4. (a) Olee ihe atọ dị mkpa anyị kwesịrị ịmata iji ghọta ilu ahụ Jizọs tụrụ gbasara atụrụ na ewu? (b) N’afọ 1881, olee otú otu Ụlọ Nche si kọwaa ilu a?

3 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịghọta ihe ilu ahụ Jizọs tụrụ gbasara atụrụ na ewu pụtara, e nwere ihe atọ dị mkpa anyị kwesịrị ịghọta. Nke mbụ bụ ndị Jizọs kwuru banyere ha. Nke abụọ abụrụ mgbe ọ ga-ekpe ikpe ahụ. Nke atọ abụrụ ihe mere o ji kpọọ ụfọdụ ndị atụrụ ma ọ bụ ewu.

4 N’afọ 1881, otu Ụlọ Nche kwuru na ọ bụ Jizọs bụ “Nwa nke mmadụ,” ya bụ, “eze ahụ.” Ndị Mmụta Baịbụl n’oge ahụ ghọtara na ndị Jizọs kpọrọ “ụmụnna m” bụ ma ndị ga-eso ya chịa ma ụmụ mmadụ niile ga-ebi n’ụwa mgbe ha ga-ezu okè. Ha chere na ọ bụ n’otu puku afọ Kraịst ga-achị ka ọ ga-ekewapụ atụrụ n’ebe ewu nọ. Ha chekwara na ihe ga-eme ka a kpọọ ndị mmadụ atụrụ bụ na ha rubeere iwu Chineke isi ma hụ ndị mmadụ n’anya.

5. N’afọ 1923, olee otú Chineke si nyere ndị ya aka ịghọtakwu ilu ahụ Jizọs tụrụ gbasara atụrụ na ewu?

5 Jehova mechara nyere ndị ya aka ịghọtakwu ilu ahụ. Ụlọ Nche Bekee nke October 15, 1923, kwuru na “Nwa nke mmadụ” bụ Jizọs. Ma o ji amaokwu Baịbụl ụfọdụ kọwaa na ụmụnna Jizọs n’ilu ahụ bụ naanị ndị ga-eso Jizọs chịa, kwuokwa na atụrụ ahụ bụ ndị nwere olileanya ibi n’ụwa mgbe Alaeze Kraịst ga na-achị. Oleekwanụ mgbe ọ ga-ekewapụ atụrụ n’ebe ewu nọ? Ụlọ Nche ahụ kwuru na ụmụnna Kraịst ga-eso ya nọrọ n’eluigwe na-achị n’otu puku afọ ahụ. N’ihi ya, ọ bụghị mgbe ahụ ka ndị ahụ ga-ebi n’ụwa ga-enyere ha aka ma ọ bụ leghara ha anya. Ọ bụ ya mere o ji bụrụ na a ga-ekewapụ atụrụ n’ebe ewu nọ tupu otu puku afọ ahụ Kraịst ga-achị. Ụlọ Nche ahụ kwukwara na ihe mere Jizọs ga-eji kpọọ ndị mmadụ atụrụ bụ na ha kwetara na Jizọs bụ Onyenwe ha, nweekwa olileanya na Alaeze Chineke ga-eme ka ihe dị mma.

6. N’afọ 1995, olee otú anyị si ghọtakwuo ilu ahụ Jizọs tụrụ banyere atụrụ na ewu?

6 Ihe a kọwara n’Ụlọ Nche ahụ mere ka ndị ohu Jehova chee na ọ bụ n’oge ikpeazụ a ka a na-ekewa ndị bụ́ atụrụ na ndị bụ́ ewu n’ihi ihe ha mere mgbe e ziri ha ozi ọma. Ma n’afọ 1995, anyị ghọtakwuru ilu a. Isiokwu abụọ ndị gbara n’Ụlọ Nche October 15, 1995, kwuru otú ihe Jizọs kwuru na Matiu 24:29-31 (gụọ ya) si yie nke o kwuru na Matiu 25:31, 32. (Gụọ ya.) * Isiokwu nke mbụ kwuru na ọ bụ n’ọdịnihu ka Jizọs ga-ekpebi ndị bụ́ atụrụ na ndị bụ́ ewu. Olee mgbe ọ ga-abụ kpọmkwem? Ọ ga-abụ mgbe “oké mkpagbu” ahụ e kwuru okwu ya na Matiu 24:29, 30 malitechara, Nwa nke mmadụ ‘abịakwa n’ebube ya.’ Ebe ọ bụ na oge eruola mgbe ahụ ka e bibie ụwa ochie a, Jizọs ga-anọrọ n’oche ikpe, kpee ikpe ma bibie ndị ajọ omume.

7. Olee otú anyị si ghọtakwuo ilu ahụ ugbu a?

 7 Taa, anyị aghọtakwuola ilu ahụ Jizọs tụrụ banyere atụrụ na ewu. Anyị ma na “Nwa nke mmadụ” ma ọ bụ “Eze” ahụ bụ Jizọs. Ndị ọ kpọrọ “ụmụnna m” bụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị e tere mmanụ, bụ́ ndị ga-eso ya chịa n’eluigwe. (Rom 8:16, 17) “Atụrụ” na “ewu” nọchiri anya ndị mmadụ si ná mba niile. Ha abụghị ndị e tere mmanụ. Oleekwanụ mgbe a ga-ekpe ha ikpe? Ọ bụ mgbe ọ ga-afọ obere ka oké mkpagbu ahụ ga-amalite n’oge na-adịghị anya gwụchaa. Gịnị mere a ga-eji kpọọ ụfọdụ atụrụ ma ọ bụ ewu? Ọ bụ n’ihi otú ha si meso ndị e tere mmanụ, ya bụ, ụmụnna Jizọs ndị ka nọ n’ụwa. Ebe ọ bụ na ọgwụgwụ ụwa a adịla nso, obi dị anyị ezigbo ụtọ na Jehova ji nwayọọ nwayọọ nyere anyị aka ịghọta ilu a na ilu ndị ọzọ dị na Matiu isi 24 na 25.

OLEE OTÚ ILU A SI GOSI NA IKWUSA OZI ỌMA DỊ EZIGBO MKPA?

8, 9. Gịnị mere Jizọs ji kwuo na ndị bụ́ atụrụ bụ “ndị ezi omume”?

8 N’ilu ahụ Jizọs tụrụ banyere atụrụ na ewu, ọ kpọghị ikwusa ozi ọma aha. Ma, oleezi otú anyị si mara na ilu ahụ na-egosi na ikwusa ozi ọma dị ezigbo mkpa?

9 Anyị kwesịrị ibu ụzọ cheta na Jizọs ji ilu ahụ akụzi ihe. O doro anya na ọ naghị ekwu banyere atụrụ na ewu nkịtị. N’ihi ya, ọ naghị ekwu na onye ọ bụla bụ́ atụrụ ga-enye ụmụnna ya nri, yiwe ha uwe, lekọta ha, ma ọ bụ gaa hụ ha n’ụlọ mkpọrọ. Kama, ọ na-ekwu otú ndị ahụ bụ́ atụrụ ga-esi meso ụmụnna ya. O kwuru na ndị bụ́ atụrụ bụ “ndị ezi omume” n’ihi na ha ghọtara na Ndị Kraịst e tere mmanụ ka nọ n’ụwa bụ ụmụnna Kraịst, jirikwa obi ha niile na-akwado ha n’oge ikpeazụ a dị oké egwu.—Mat. 10:40-42; 25:40, 46; 2 Tim. 3:1-5.

10. Olee otú ndị bụ́ atụrụ si emere ụmụnna Kraịst ihe ọma?

10 Ihe ọzọ anyị ga-echebara echiche bụ ihe Jizọs na-ekwu mgbe ọ tụrụ ilu ahụ. Ọ na-ekwu banyere ihe ndị ga-egosi na ọgwụgwụ eruola nso. (Mat. 24:3) Ná mmalite, Jizọs kwuru na otu n’ime ihe ịrịba ama ndị ahụ bụ na a ga-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke “n’elu ụwa dum mmadụ bi.” (Mat. 24:14) Tupu o kwuo banyere atụrụ na ewu, ọ tụrụ ilu banyere talent. Dị ka anyị mụrụ n’isiokwu bu nke a ụzọ, Jizọs tụrụ ilu ahụ iji kụziere “ụmụnna” ya e tere mmanụ na ha kwesịrị iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma. Ma, ndị e tere mmanụ nọ n’ụwa dị naanị ole na ole. Ọrụ ha ga-arụ buru ibu, ya bụ, ikwusara “mba niile” ozi ọma tupu ọgwụgwụ eruo. Ilu ahụ Jizọs tụrụ banyere atụrụ na ewu gosiri na e nwere ndị ga-enyere ndị e tere mmanụ aka. N’ihi ya, otu n’ime ụzọ ndị bụ́ atụrụ si emere ụmụnna Kraịst ihe ọma bụ ịkwado ha n’ọrụ ikwusa ozi ọma. Ma, olee otú ha ga-esi na-akwado ha? Ọ̀ bụ naanị ịna-enye ha onyinye na ịna-agba ha ume, ka è nwere ihe ọzọ ha kwesịrị ịna-eme?

OLEE NDỊ KWESỊRỊ ỊNA-EKWUSA OZI ỌMA?

11. Olee ajụjụ ụfọdụ ndị nwere ike ịjụ, maka gịnị?

11 Taa, ndị na-eso ụzọ Jizọs eruola nde mmadụ asatọ. Ọtụtụ n’ime ha abụghị ndị e tere mmanụ. Ọ bụghị ha ka Jizọs nyere talent ndị ahụ, kama, ọ bụ ndị e tere mmanụ ka o nyere ha. (Mat. 25:14-18) N’ihi ya, ụfọdụ nwere ike ịjụ,  sị, ‘Ọrụ ikwusa ozi ọma ọ̀ gbasara ndị na-esoghị ná ndị e tere mmanụ?’ Ee, ọ gbasara ha. Ka anyị tụlee ihe ụfọdụ mere anyị ji kwuo otú ahụ.

12. Gịnị ka anyị mụtara n’ihe Jizọs kwuru na Matiu 28:19, 20?

12 Jizọs nyere ndị niile na-eso ụzọ ya iwu ka ha na-ekwusa ozi ọma. Mgbe o si n’ọnwụ bilie, ọ gwara ndịozi ya ka ha ‘mee ndị mmadụ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya,’ kụziekwara ha “ihe niile” o nyere ha n’iwu. Ikwusa ozi ọma so n’ihe ndị ahụ o nyere ha n’iwu. (Gụọ Matiu 28:19, 20.) N’ihi ya, ndị niile na-eso ụzọ Kraịst kwesịrị ịna-ekwusa ozi ọma, ma hà nwere olileanya iso ya chịa n’eluigwe ma hà nwere olileanya ibi n’ụwa.—Ọrụ 10:42.

13. Gịnị ka ọhụụ ahụ Jọn hụrụ na-egosi, n’ihi gịnị?

13 Akwụkwọ Mkpughe gosiri na ọ bụ ndị e tere mmanụ na ndị ọzọ ga-ekwusa ozi ọma. N’ọhụụ, Jizọs gosiri Jọn onyeozi “nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ” ebe ọ na-akpọ ndị mmadụ ka ha bịa “nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.” Nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ nọchiri anya otu narị puku mmadụ na puku iri anọ na puku anọ ahụ e tere mmanụ, bụ́ ndị ga-eso Kraịst chịa n’eluigwe. (Mkpu. 14:1, 3; 22:17) Mmiri ahụ nọchiri anya àjà Kraịst chụrụ iji gbapụta ụmụ mmadụ n’aka mmehie na ọnwụ. (Mat. 20:28; Jọn 3:16; 1 Jọn 4:9, 10) Àjà mgbapụta ahụ so n’isi ihe a na-ekwusa n’ozi ọma. Ndị e tere mmanụ jikwa obi ha niile na-akụziri ndị ọzọ banyere ya na uru ọ ga-abara ha. (1 Kọr. 1:23) Ma n’ọhụụ ahụ, Jọn hụrụ ndị na-esoghị ná ndị e tere mmanụ. A gwakwara ha ka ha sị ndị ọzọ, “Bịa!” Ha rubere isi, na-akpọkwa ndị ọzọ ka ha bịa nara mmiri nke ndụ. Ndị ahụ bụ ndị nwere olileanya ibi n’ụwa. N’ihi ya, o doro anya na ọhụụ a  na-egosi na ndị niile zara òkù a kwesịrị ikwusara ndị ọzọ ozi ọma.

14. Olee ihe irubere “iwu nke Kraịst” isi pụtara?

14 Ndị niile nọ ‘n’iwu nke Kraịst’ kwesịrị ịna-ekwusa ozi ọma. (Gal. 6:2) Ọ bụ otu iwu ka Jehova chọrọ ka ndị niile na-efe ya na-edebe. Dị ka ihe atụ, ọ gwara ndị Izrel, sị: “Otu iwu ga-adịrị nwa afọ, dịkwara onye mbịarambịa nke bi n’etiti unu dị ka ọbịa.” (Ọpụ. 12:49; Lev. 24:22) Taa, Ndị Kraịst anaghị edebe Iwu Mozis. Ma anyị niile na-erubere “iwu nke Kraịst” isi, ma ànyị so ná ndị e tere mmanụ ma ọ bụ na anyị esoghị. Ihe dị n’iwu ahụ bụ ihe niile Jizọs kụziri. Otu n’ime ihe kacha mkpa Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya bụ ịhụnanya. (Jọn 13:35; Jems 2:8) Ụzọ kacha mma anyị si egosi na anyị hụrụ Chineke, Kraịst, na ndị agbata obi anyị n’anya bụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke.—Jọn 15:10; Ọrụ 1:8.

15. Gịnị mere e nwere ike iji kwuo na Jizọs nyere ndị niile na-eso ụzọ ya iwu ka ha kwusaa ozi ọma?

15 Ihe Jizọs gwara mmadụ ole na ole nwere ike ịgbasa ọtụtụ ndị. Dị ka ihe atụ, ọ bụ naanị ndịozi iri na otu ka ha na Jizọs gbara ndụ banyere Alaeze ya, ma ọgbụgba ndụ ahụ gbasara otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ahụ niile. (Luk 22:29, 30; Mkpu. 5:10; 7:4-8) Mgbe Jizọs si n’ọnwụ bilie, ọ bụ naanị ndị na-eso ụzọ ya ole na ole, bụ́ ndị hụrụ ya, ka ọ gwara ka ha kwusawa ozi ọma. (Ọrụ 10:40-42; 1 Kọr. 15:6) Ma, ndị niile na-eso ụzọ Jizọs n’oge ndịozi ghọtara na ha niile kwesịrị ikwusa ozi ọma n’agbanyeghị na Jizọs agwaghị ha okwu ihu na ihu. (Ọrụ 8:4; 1 Pita 1:8) Taakwa, anyị na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị na anyị anọghị mgbe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha kwusaa ya. Anyị niile bụ́ ndị na-ekwusa ozi ọma eruola nde mmadụ asatọ. Anyị ghọtara na anyị kwesịrị ikwusa ozi ọma iji gosi na anyị nwere okwukwe na Jizọs.—Jems 2:18.

ANYỊ KWESỊRỊ IJI OBI ANYỊ NIILE NA-ERUBERE KRAỊST ISI UGBU A

16-18. Olee otú ndị ga-abụ atụrụ Jizọs ga-esi na-akwado ụmụnna Kraịst? Gịnị mere ha ji kwesị ime otú ahụ ugbu a?

16 Setan na-alụso Ndị Kraịst e tere mmanụ nọ n’ụwa ọgụ. Ọgụ ahụ ọ na-alụso ha ga na-aka njọ ka ntakịrị oge fọọrọ ya ji nwayọọ nwayọọ na-agwụ. (Mkpu. 12:9, 12, 17) N’agbanyeghị na ndị e tere mmanụ na-edi ọnwụnwa siri ike, ha na-agbasi mbọ ike ka e kwusaa ozi ọma karịa otú e kwusatụrụla ya. O doro anya na Jizọs nọnyeere ha ma na-eduzi ha.—Mat. 28:20.

17 Ndị so n’atụrụ ọzọ na-amụba n’ike n’ike. Ha ghọtara na ọ bụ ihe ùgwù ịkwado ụmụnna Kraịst ma n’ikwusa ozi ọma ma n’ihe ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, ha na-enye onyinye ma na-enye aka n’ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze, Ụlọ Mgbakọ, na alaka ụlọ ọrụ. Ha jikwa obi ha niile na-erubere ndị okenye na ndị ọzọ “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” họpụtara isi.—Mat. 24:45-47; Hib. 13:17.

Ndị yiri atụrụ na-esi n’ụzọ dị iche iche akwado ụmụnna Kraịst (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)

18 N’oge na-adịghị anya, a ga-aka ndị fọrọ ná ndị e tere mmanụ akara ikpeazụ. A kachaa ha, ndị mmụọ ozi ahụ ji “ifufe anọ nke ụwa” ga-ahapụ ya, oké mkpagbu ahụ amalite. (Mkpu. 7:1-3) Tupu Amagedọn ebido, Jizọs ga-akpọrọ ndị e tere mmanụ gaa eluigwe. (Mat. 13:41-43) Ya mere, ọ bụ ugbu a ka ndị chọrọ ka Jizọs kpọọ ha atụrụ kwesịrị iji obi ha niile na-akwado ụmụnna Kraịst.

^ para. 6 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu otú e si kọwaa ilu a, gụọ isiokwu bụ́ “Ị̀ Ga-esi Aṅaa Guzo n’Ihu Oche Ikpe Ahụ?” nakwa “Ọdịnihu Dị Aṅaa Dịịrị Atụrụ na Ụmụ Ewu Ahụ?” n’Ụlọ Nche October 15, 1995.