Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) FEBỤWARỊ 2015

Onyinye Pụrụ Iche E Nyere Ndị Japan

Onyinye Pụrụ Iche E Nyere Ndị Japan

N’OTU nnọkọ pụrụ iche e nwere na Nagoya dị na Japan, n’abalị iri abụọ na asatọ n’ọnwa anọ n’afọ 2013, Anthony Morris, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi, mara ọkwa tọgburu ndị mmadụ atọgbu. O kwuru na e wepụtala otu akwụkwọ ọhụrụ n’asụsụ Japaniiz, nke isiokwu ya bụ The Bible—The Gospel According to Matthew [ya bụ, BaịbụlOziọma Dị Ka Matiu Si Dee Ya]. Ihe karịrị narị puku mmadụ abụọ na puku iri gere ihe e kwuru ná nnọkọ ahụ, ma ndị bịaranụ ma ndị si n’Ịntanet na-ahụ ihe a na-eme. Mgbe ha nụrụ ọkwa ahụ a mara, ha niile kụrụ aka ruo ogologo oge iji gosi na obi dị ha ụtọ.

E si ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Japaniiz bipụta akwụkwọ a dị otu narị peeji na iri abụọ na asatọ. Ma, ọ bụ ọpụrụiche. Nwanna Morris kwuru na ihe mere e ji wepụta akwụkwọ a bụ ka e jiri ya nyere ndị na-asụ Japaniiz aka. Gịnị mere akwụkwọ a ji pụọ iche? Gịnị mere e ji bipụta ya? Oleekwa otú obi dị ndị mmadụ n’ihi ya?

GỊNỊ MERE AKWỤKWỌ A JI PỤỌ ICHE?

Otú e si dee akwụkwọ a juru ọtụtụ ndị anya. E nwere ike isi n’aka ekpe dere asụsụ Japaniiz gaa n’aka nri ma ọ bụkwanụ si n’elu dere ya gbadaa n’ala. N’akwụkwọ ndị e dere n’asụsụ Japaniiz, e si n’aka ekpe dere ọtụtụ n’ime ha gaa n’aka nri. Otú ahụ ka e sikwa dee akwụkwọ ndị nzukọ Jehova bipụtara n’oge na-adịbeghị anya. Ma, e si n’elu dere akwụkwọ ọhụrụ a gbadaa n’ala. Ọ bụ otú a ka a na-esikarị ede akwụkwọ akụkọ na akwụkwọ ndị a ma ama n’asụsụ Japaniiz n’oge a. Isi otú a ede ihe n’asụsụ Japaniiz na-adịrị ọtụtụ ndị na-agụ ya mfe ọgụgụ. Ihe ọzọ bụ na isiokwu ndị na-adị n’elu peeji dịzi n’ime peeji ka ọ bụrụ isiokwu nta ga-eme ka ọ dịrị ndị na-agụ ya mfe ịmata isi ihe ndị e kwuru.

Ụmụnna nọ na Japan malitere ịgụ akwụkwọ ahụ ozugbo. Otu nwanna nwaanyị dị afọ iri asatọ na ụma kwuru, sị: “Tupu e wepụta akwụkwọ a, agụọla m akwụkwọ Matiu ọtụtụ ugboro. Ma, otú a e si si n’elu dere akwụkwọ a gbadaa n’ala nakwa isiokwu nta ndị dị na ya nyeere m aka ịghọtakwu ihe Jizọs kụziri n’elu ugwu.” Otu nwanna nwaanyị dị iri afọ atọ dere, sị: “Agụchapụrụ m akwụkwọ a ozugbo. Ọ maara m ahụ́ ịgụ nke e si n’aka ekpe dere gaa n’aka nri. Ma, nke e si n’elu dere gbadaa n’ala na-amasị ọtụtụ ndị Japan.”

E WEPỤTARA YA MAKA NDỊ NA-ASỤ JAPANIIZ

Gịnị mere otu akwụkwọ Baịbụl a ga-eji baara ndị na-asụ Japaniiz uru? Ọ bụ eziokwu na ihe gbasara Baịbụl edoghị ọtụtụ ndị Japan anya, ha na-enwe mmasị ịgụ ya. Oziọma Matiu a e wepụtara ga-eme ka ndị na-ahụtụbeghị Baịbụl nwee ike ịgụ nke obere a.

Gịnị mere e ji họrọ akwụkwọ Matiu? Ọ na-abụ ọtụtụ ndị Japan nụ okwu ahụ bụ́ “Baịbụl,” ha echeta Jizọs Kraịst. N’ihi ya, ihe mere e ji họrọ akwụkwọ Matiu bụ na ọ bụ ebe ahụ ka e dere aha ndị nna nna Jizọs, ihe gbasara ọmụmụ ya, ozizi ya a ma ama o ziri n’elu ugwu, na amụma ndị o buru gbasara oge ikpeazụ. Ihe a niile na-amasị ọtụtụ ndị na-asụ Japaniiz.

 Ụmụnna ndị nọ na Japan ji ịnụ ọkụ n’obi malite inye ndị mmadụ akwụkwọ ọhụrụ a n’ụlọ n’ụlọ nakwa mgbe ha gara nletaghachi. Otu nwanna nwaanyị dere, sị: “Enwekwuola m ohere m ga-eji na-enye ndị mmadụ Okwu Chineke n’ebe anyị na-ekwusa ozi ọma. N’eziokwu, m nyere mmadụ akwụkwọ ọhụrụ a n’ehihie ụbọchị ahụ e nwechara nnọkọ ahụ pụrụ iche.”

OLEE OTÚ OBI DỊ NDỊ MMADỤ N’IHI AKWỤKWỌ A?

Gịnị ka ndị nkwusa na-ekwu ma ha chọọ inye mmadụ akwụkwọ ọhụrụ a? Ọtụtụ ndị Japan ma okwu ndị dị ka ‘ọnụ ụzọ dị warara,’ ‘ịtụpụrụ ézì nkume pel,’ na “unu echegbula onwe unu mgbe ọ bụla maka echi.” (Mat. 6:34; 7:6, 13) Ọ na-eju ha anya ma ha chọpụta na ọ bụ Jizọs Kraịst kwuru ihe ndị a. Ọ na-abụ ọtụtụ ndị hụ ebe e dere ihe ndị a n’Oziọma Matiu, ha asị: “Ọ na-agụ m agụụ kemgbe ịgụ Baịbụl ma ọ́ dịghị ihe ọzọ otu ugboro.”

Ọ na-abụ ndị nkwusa gaa nletaghachi na nke ndị ha nyere akwụkwọ ọhụrụ a, ndị ahụ na-ekwukarị na ha malitere ịgụ ya ozugbo. Ụfọdụ gụchakwara ya ozugbo. Otu nwoke dị afọ iri isii na ụma gwara otu onye nkwusa, sị: “M gụrụ ya ugboro ugboro, ya akasie m obi. Biko, kụzikwuoro m Baịbụl.”

Ụmụnna na-enyekwa ya ndị mmadụ ma ha kwusawa ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị. Mgbe otu nwanna nwaanyị na-ekwusa ozi ọma n’ụdị ebe ahụ, o nyere otu nwaanyị akwụkwọ ahụ, nyekwa ya adres iimel ya. Mgbe otu awa gara, nwaanyị ahụ ziteere ya ozi iimel, gwa ya na ya agụọla ebe ụfọdụ n’akwụkwọ Baịbụl ahụ, chọọkwa ịmụtakwu ihe. Mgbe otu izu gara, a malitere ịmụrụ nwaanyị ahụ Baịbụl. N’oge na-adịghị anya, o bidoro ịga ọmụmụ ihe.

Akwụkwọ ọhụrụ a e zigaara ọgbakọ ndị dị na Japan dị ihe karịrị otu nde na narị puku isii. Kwa ọnwa, ụmụnna na-enye ndị mmadụ ọtụtụ puku n’ime ha. Ihe e dere n’okwu mmalite ya gosiri otú obi dị ndị bipụtara ya. Ha kwuru, sị: “Anyị na-atụsi anya ike na ịgụ akwụkwọ a ga-eme ka i nwekwuo mmasị na Baịbụl.”