Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) FEBỤWARỊ 2015

Na-eṅomi Otú Jizọs Si Gosi na O Nwere Obi Ike na Nghọta

Na-eṅomi Otú Jizọs Si Gosi na O Nwere Obi Ike na Nghọta

“Ọ bụ ezie na unu ahụghị ya, unu hụrụ ya n’anya. Ọ bụ ezie na unu adịghị ele ya anya ugbu a, ma unu nwere okwukwe n’ebe ọ nọ.”—1 PITA 1:8.

1, 2. (a) Gịnị ka anyị ga-eme ka e wee zọpụta anyị? (b) Gịnị ga-enyere anyị aka ịnọsi ike n’ụzọ nke ndụ?

MGBE anyị ghọrọ Ndị Kraịst, anyị malitere ịga ije n’ụzọ nke ndụ. Ụzọ a nwere ike ime ka anyị nweta ndụ ebighị ebi n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa. Jizọs kwuru, sị: “Onye tachiri obi ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.” (Mat. 24:13) Ọgwụgwụ ahụ nwere ike ịbụ mgbe onye ahụ nwụrụ ma ọ bụ ọgwụgwụ nke ụwa ọjọọ a. N’eziokwu, ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile na-efe Chineke, a ga-azọpụta anyị. Ma, ka anyị na-aga n’ụzọ nke ndụ, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka ihe ọ bụla ghara imegharị anyị anya ma ọ bụ mee ka anyị fuo ụzọ. (1 Jọn 2:15-17) Olee otú anyị ga-esi nọsie ike n’ụzọ nke ndụ?

2 Otú Jizọs si bie ndụ bụ ezigbo ihe nlereanya anyị kwesịrị iso. Ọ bụ na Baịbụl ka e dere otú o si bie ndụ. Ọ bụrụ na anyị amụọ ihe Baịbụl kwuru gbasara Jizọs, anyị ga-amata ụdị onye ọ bụ. Anyị ga-ahụ ya n’anya ma nwee okwukwe na ya. (Gụọ 1 Pita 1:8, 9.) Cheta na Pita onyeozi kwuru na Jizọs hapụụrụ anyị ihe nlereanya anyị kwesịrị isochi anya. (1 Pita 2:21) Ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị  niile na-eso nzọụkwụ ya, anyị ga-enweta ihe anyị ji okwukwe na-agba mbọ inweta, ya bụ, nzọpụta. * N’isiokwu bu nke a ụzọ, anyị tụlere ihe anyị ga-eme ka anyị nwee ike iṅomi otú Jizọs si dị umeala n’obi na otú o si nwee ọmịiko. Ugbu a, ka anyị leba anya n’otú anyị ga-esi nwee obi ike na nghọta iji gosi na anyị na-eso nzọụkwụ ya.

JIZỌS NWERE OBI IKE

3. Gịnị bụ obi ike, oleekwa otú anyị ga-esi enwe ya?

3 Obi ike bụ ụdị obi ọ ga-abụ anyị nwee, anyị enwee ike idi nsogbu bịaara anyị. Ọ pụtara ‘mmadụ ijisi ike mee ihe dị mma n’agbanyeghị nsogbu.’ Ọ pụtakwara ‘ịkata obi mee ihe ziri ezi,’ na ‘mmadụ ijide onwe ya, obi esiekwa ya ike ọ bụrụgodị na ọ na-ata ahụhụ.’ Ọ bụ olileanya, ịhụnanya, na egwu Chineke na-eme ka mmadụ nwee ụdị obi ike a. Olee otú ihe ndị a si eme ka mmadụ nwee obi ike? Ịtụ egwu Chineke na-eme ka anyị nwee obi ike ma ghara ịtụ mmadụ ụjọ. (1 Sam. 11:7; Ilu 29:25) Inwe ezigbo olileanya na-eme ka anyị nwee obi ike na ọdịnihu ga-aka mma, kama ịna-eche naanị banyere ọnwụnwa bịaara anyị. (Ọma 27:14) Ezigbo ịhụnanya na-eme ka anyị nwee obi ike ọ bụrụgodị na a na-akpagbu anyị. (Jọn 15:13) Otú anyị ga-esi enwe obi ike bụ ịtụkwasị Chineke obi na iṅomi Ọkpara ya.—Ọma 28:7.

4. Olee otú Jizọs si gosi na ya nwere obi ike mgbe ọ nọ “n’etiti ndị nkụzi” n’ụlọ nsọ? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

4 Mgbe Jizọs dị afọ iri na abụọ, o ji obi ike kwado ihe ziri ezi. Cheta ihe mere mgbe ọ nọ “n’etiti ndị nkụzi” n’ụlọ nsọ. (Gụọ Luk 2:41-47.) Ndị nkụzi ahụ ma Iwu Mozis nke ọma, marakwa omenala ndị ha ji mee ka idebe iwu ahụ siere ndị mmadụ ike. Ma, Jizọs ekweghị ka ihe ahụ ha ma mee ka ọ gbachi nkịtị, kama, ọ nọ “na-ajụ ha ajụjụ.” O doro anya na ihe ndị ọ jụrụ ha abụghị ụdị ajụjụ nwatakịrị na-ajụ iji mata ihe ọ na-amaghị. Weregodị ya na ị na-ahụ Jizọs ka ọ na-ajụ ndị nkụzi ahụ ajụjụ mere ka ha chee echiche. Ọ bụrụgodị na ha gbara mbọ ịjụ Jizọs ajụjụ ga-eme ka ha na ya rụrịtawa ụka iji megharịa ya anya, mbọ ha kụrụ afọ n’ala. “Nghọta o nwere na ihe ọ na-aza ha nọ na-eju ndị niile na-ege ya ntị anya,” ma ndị nkụzi ahụ. Jizọs ji obi ike mee ka o doo anya na Okwu Chineke bụ eziokwu.

5. Mgbe Jizọs na-ezi ozi ọma, olee ụzọ dị iche iche o si gosi na ya nwere obi ike?

5 Mgbe Jizọs na-ezi ozi ọma, o mere ihe dị iche iche gosiri na o nwere obi ike. Dị ka ihe atụ, ọ katara obi gwa ndị mmadụ na ihe ndị ndú okpukpe ha na-akụziri ha bụ ozizi ụgha. (Mat. 23:13-36) O kweghị ka ụwa mebie ya. (Jọn 16:33) N’agbanyeghị na a nọ na-akpagbu ya, ọ kwụsịghị ikwusa ozi ọma. (Jọn 5:15-18; 7:14) Ugboro abụọ, o ji obi ike mee ka ụlọ nsọ dị ọcha mgbe ọ chụpụrụ ndị na-emetọ ya.—Mat. 21:12, 13; Jọn 2:14-17.

6. Olee otú Jizọs si gosi na ya nwere obi ike n’ụbọchị ahụ e gburu ya?

6 Okwukwe anyị ga-esikwu ike ma anyị tụlee otú Jizọs si gosi na ya nwere obi ike mgbe ọ na-ata ahụhụ. Chegodị ụdị obi ike o nwere n’ụbọchị ahụ e gburu ya. Ọ ma ihe niile a ga-eme ya ma Judas rara ya nye. Ma, mgbe ha na-eri Oriri Ngabiga, ọ sịrị Judas: “Ihe ị na-eme, mee ya ọsọ ọsọ.” (Jọn 13:21-27) Mgbe Jizọs nọ n’ogige Getsemeni, o ji obi ike gwa ndị agha bịara ijide ya na ọ bụ ya bụ Jizọs. Ọ bụ eziokwu na a chọrọ igbu ya, o chebere ndị na-eso ụzọ ya, ma gwa ndị agha ahụ, sị: “Hapụnụ ndị a ka ha laa.” (Jọn 18:1-8) Mgbe a na-agba ya ajụjụ n’ihu ndị Sanhedrin, o ji obi ike gwa ha na ya bụ  Kraịst na Ọkpara Chineke. Ụjọ atụghị ya n’agbanyeghị na ọ ma na ihe mere nnukwu onye nchụàjà ji ajụ ya ajụjụ bụ ka ọ chọta ihe ọ ga-eji maa ya ikpe, gbuo ya. (Mak 14:60-65) Jizọs ji obi ya niile rubere Chineke isi ruo mgbe ọ nwụrụ n’elu osisi ịta ahụhụ. Mgbe ọ chọrọ ikubi ume, o kwuru ihe gosiri na ya emeriela ụwa. Ọ sịrị: “E mechawo ya!”—Jọn 19:28-30.

ṄOMIE OBI IKE JIZỌS NWERE

7. Ndị na-eto eto, olee otú obi na-adị unu n’ihi na unu so ná ndị a kpọkwasịrị aha Jehova? Olee otú unu ga-esi gosi na unu nwere obi ike?

7 Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị nwere obi ike ka Jizọs? N’ụlọ akwụkwọ. Ndị na-eto eto, ọ bụrụ na unu akata obi mee ka ụmụ klas unu na ndị ọzọ mata na unu bụ Ndịàmà Jehova, ọ pụtara na unu nwere obi ike. Unu ga-esi otú ahụ gosi na unu ji aha Jehova a kpọkwasịrị unu na-akpa nganga, ọ bụrụgodị na ndị ọzọ na-achị unu ọchị. (Gụọ Abụ Ọma 86:12.) E nwere ike inyewe gị nsogbu ka i kweta na e keghị mmadụ eke. Ma, obi kwesịrị isi gị ike na ihe Baịbụl kwuru banyere otú Chineke si kee ihe niile bụ eziokwu. Ọ bụrụ na e nwere ndị chọrọ ịmata ‘ihe mere i ji nwee olileanya i nwere,’ i nwere ike iji Baịbụl kọwaara ha ya. (1 Pita 3:15) I mee otú ahụ, obi ga-adị gị ụtọ na ị na-eme ka o doo anya na Okwu Chineke bụ eziokwu.

8. Gịnị na gịnị mere anyị ji kwesị iji obi ike na-ekwusa ozi ọma?

8 N’ozi ọma. Ebe anyị bụ ezigbo Ndị Kraịst, anyị kwesịrị ‘ịna-ekwu okwu n’atụghị egwu site n’ikike Jehova.’ (Ọrụ 14:3) Gịnị na gịnị mere anyị ji kwesị iji obi ike na-ekwusa ozi ọma? Anyị ma na ihe anyị na-ekwusa bụ eziokwu n’ihi na o si na Baịbụl. (Jọn 17:17) Anyị ghọtara na anyị “bụ ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ” nakwa na o ji mmụọ nsọ ya na-akwado anyị. (1 Kọr. 3:9; Ọrụ 4:31) Anyị ghọtara na ọ bụrụ na anyị ejiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma, ọ ga-egosi na anyị na-asọpụrụ Jehova nakwa na anyị hụrụ ndị agbata obi anyị n’anya. (Mat. 22:37-39) Ebe ọ bụ na anyị nwere obi ike, anyị agaghị akwụsị ikwusa ozi ọma. Taa, ozizi ụgha emeela ka ndị mmadụ ghara ịma nke bụ́ eziokwu. Anyị kpebisiri ike na anyị ga na-agba ozizi ụgha ndị ahụ n’anwụ. (2 Kọr. 4:4) Anyị ga na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị na ọtụtụ ndị na-ajụ ozi ọma, na-akpagbu anyị ma ọ bụ na-achị anyị ọchị.—1 Tesa. 2:1, 2.

9. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị nwere obi ike mgbe nsogbu bịaara anyị?

9 Mgbe nsogbu bịaara anyị. Ịtụkwasị Chineke obi ga-eme ka anyị nwee okwukwe na obi ike mgbe anyị nọ ná nsogbu. Mgbe mmadụ nwụnahụrụ anyị, anyị na-eru uju, ma ọ naghị eme ka anyị ghara inwe olileanya. Anyị na-enwe obi ike na “Chineke nke nkasi obi niile” ga-eme ka okwukwe anyị sie ike. (2 Kọr. 1:3, 4; 1 Tesa. 4:13) Ọ bụrụ na anyị na-arịa ọrịa ma ọ bụ na anyị merụrụ ahụ́, anyị nwere ike ịna-ahụsi anya, ma anyị agaghị eme ihe ga-ewe Chineke iwe. Anyị anaghị ekwe ka e si n’ụzọ ọ bụla megidere iwu Chineke gwọọ anyị. (Ọrụ 15:28, 29) Ọ bụrụ na obi ajọwa anyị njọ, “obi anyị nwere ike ịma anyị ikpe,” ma anyị anaghị ada mbà. Anyị tụkwasịrị Chineke obi n’ihi na ọ “nọ ndị obi ha tiwara etiwa nso.” *1 Jọn 3:19, 20; Ọma 34:18.

JIZỌS NWERE NGHỌTA

10. Gịnị bụ nghọta? Oleekwa otú Onye Kraịst nwere nghọta si ekwu okwu na otú o si akpa àgwà?

10 Onye nwere nghọta ma ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi. Ọ na-emekwa ihe dị mma. (Hib. 5:14) Onye  nwere nghọta na-eme ihe ndị ga-eme ka ya na Chineke dịrị ná mma. Ọ na-agba mbọ ka ihe ọ na-ekwu na ihe ọ na-eme bụrụ ihe ga-eme Chineke obi ụtọ. Ọ na-akpachapụ anya ka okwu ya bụrụ ihe ga-agba ndị ọzọ ume, kama ikwu ihe ga-ewute ha. (Ilu 11:12, 13) Ọ naghị “ewe iwe ọsọ ọsọ.” (Ilu 14:29) Ọ “na-eje ije n’ụzọ kwụ ọtọ,” ya bụ, ịna-eme ihe dị mma ka ọ na-eje ije n’ụzọ nke ndụ. (Ilu 15:21) Olee otú anyị ga-esi nweta nghọta? Anyị kwesịrị ịmụ Okwu Chineke ma na-eme ihe anyị mụtara. (Ilu 2:1-5, 10, 11) Ihe ọzọ ga-enyere anyị aka bụ ịmụ banyere Jizọs n’ihi na ọ bụ ya bụ nwoke kacha nwee nghọta.

11. Olee otú ihe ndị Jizọs kwuru si gosi na o nwere nghọta?

11 Jizọs gosiri na ya nwere nghọta n’ihe niile o kwuru na ihe o mere. Okwu ya. Mgbe ọ na-ekwusa ozi ọma, o gosiri na ya nwere nghọta. Ọ gwara ndị na-ege ya ntị “okwu ọma” nke tụrụ ha n’anya. (Luk 4:22; Mat. 7:28) Ihe niile o kwuru si n’Okwu Chineke. Ọ gụụrụ ndị mmadụ Okwu Chineke ma ọ bụ gwa ha ihe e kwuru na ya. (Mat. 4:4, 7, 10; 12:1-5; Luk 4:16-21) Jizọs kọwakwaara ndị mmadụ Akwụkwọ Nsọ otú ọ ga-eru ha n’obi. Mgbe o si n’ọnwụ bilie, ọ hụrụ ndị na-eso ụzọ ya abụọ n’ụzọ ka ha na-aga Emeọs. Mgbe ha na ya na-akparịta ụka, ọ “kọwaara ha ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ dum banyere onwe ya.” Ndị na-eso ụzọ ya mechara kwuo, sị: “Ọ̀ bụ na obi ekporoghị anyị ọkụ mgbe . . . ọ nọ na-akọwara anyị Akwụkwọ Nsọ nke ọma?”—Luk 24:27, 32.

12, 13. Olee ihe atụ ndị gosiri na Jizọs anaghị ewe iwe ọsọ ọsọ nakwa na ọ na-echebara ndị mmadụ echiche?

12 Otú obi na-adị ya na otú o si eche echiche. Nghọta Jizọs nwere mere ka ọ na-ejide onwe ya, ghara ịna-ewe “iwe ọsọ ọsọ.” (Ilu 16:32) Ọ dị “umeala n’obi.” (Mat. 11:29) O nweere ndị na-eso ụzọ ya ndidi mgbe niile n’agbanyeghị ihe ndị ha mejọrọ. (Mak 14:34-38; Luk 22:24-27) Mgbe a na-emegbu ya, o megwaraghị.—1 Pita 2:23.

13 Nghọta o nwere mekwara ka ọ na-echebara ndị mmadụ echiche. Ọ ghọtara ihe mere e ji nye Iwu Mozis. Ọ bụ ya mere na ọ gụrụghị ndị mmadụ iwu. Dị ka ihe atụ, chegodị banyere ihe Baịbụl kọrọ na Mak 5:25-34. (Gụọ ya.) Otu nwaanyị na-arịa ọrịa oruru ọbara batara n’etiti ìgwè mmadụ, gaa bitụ uwe Jizọs aka, a gwọọ ya. Ihe e kwuru n’Iwu Mozis gosiri na nwaanyị ahụ adịghị ọcha. N’ihi ya, o kwesịghị imetụ onye ọ bụla aka. (Lev. 15:25-27) Ma ebe ọ bụ na Jizọs ghọtara na ‘ihe ndị ka mkpa n’Iwu ahụ bụ ebere na ikwesị ntụkwasị obi,’ ọ baraghị nwaanyị ahụ mba. (Mat. 23:23) Kama, o ji obiọma gwa ya, sị: “Nwa m nwaanyị, okwukwe gị emewo ka ahụ́ dị gị mma. Laa n’udo, gbakee n’ọrịa ọjọọ nke na-arịa gị.” Otú nghọta Jizọs nwere si mee ka o jiri obiọma gwa nwaanyị ahụ okwu na-emetụ anyị n’obi.

14. Olee ihe Jizọs kpebiri iji ndụ ya mee, oleekwa otú o si mee ya?

14 Otú o si bie ndụ. Otú Jizọs si bie ndụ gosiri na o nwere nghọta. O ji ndụ ya niile kwusaa ozi ọma. (Luk 4:43) Ihe ndị o mekwara bụ ihe ndị ga-enyere ya aka ilekwasị anya n’ọrụ ya ma rụchaa ya. Dị ka ihe atụ, o bighị ndụ okomoko ka o nwee ike iji oge ya na ike ya na-ekwusa ozi ọma. (Luk 9:58) Ọ ghọtara na ya kwesịrị ịzụ ndị ọzọ ka ha nwee ike ịna-arụ ọrụ ahụ ma ya nwụọ. (Luk 10:1-12; Jọn 14:12) O kwere ndị na-eso ụzọ ya nkwa na ọ ga-anọnyere ha n’ọrụ a “ruo ọgwụgwụ usoro ihe a.”—Mat. 28:19, 20.

NWEE NGHỌTA KA JIZỌS

Anyị na-agbalị ka anyị ghọta ihe bụ́ mkpa ndị anyị na-ezi ozi ọma na ihe na-amasị ha, matakwa ụdị okwu anyị kwesịrị ịgwa ha (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)

15. Olee otú okwu anyị ga-esi gosi na anyị nwere nghọta?

15 Ka anyị tụlee ụzọ ọzọ anyị si eṅomi Jizọs. Okwu anyị. Mgbe anyị na ụmụnna  anyị na-akparịta ụka, anyị na-ekwu ihe ga-agba ha ume, ọ bụghị ihe ga-akụda ha obi. (Efe. 4:29) Mgbe anyị na-agwa ndị ọzọ gbasara Alaeze Chineke, anyị na-eme ka okwu anyị dị ka “ihe e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ.” (Kọl. 4:6) Anyị na-agbalị ka anyị ghọta ihe bụ́ mkpa ndị anyị na-ezi ozi ọma na ihe na-amasị ha, matakwa ụdị okwu anyị kwesịrị ịgwa ha. Anyị na-echeta na okwu ọma nwere ike ime ka mmadụ gee anyị ntị, ihe anyị gwara ya eruokwa ya n’obi. Ihe ọzọ bụ na mgbe anyị na-akọwara mmadụ ihe anyị kweere, anyị na-agba mbọ ka o jiri anya ya hụ ebe ọ dị na Baịbụl. N’ihi ya, anyị na-agwa onye ahụ na ihe anyị na-akụziri ya si na Baịbụl, gụọkwara ya Baịbụl ma o kwee omume. Anyị ma na ihe Baịbụl kwuru na-akpa ike karịa ihe ọ bụla anyị nwere ike ikwu.—Hib. 4:12.

16, 17. (a) Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị anaghị ewe iwe ọsọ ọsọ nakwa na anyị na-echebara ndị ọzọ echiche? (b) Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị ji ikwusa ozi ọma kpọrọ ihe?

16 Otú obi na-adị anyị na otú anyị si eche echiche. Nghọta na-eme ka anyị jide onwe anyị, ghara ‘ịna-ewe iwe ngwa ngwa.’ (Jems 1:19) Ọ bụrụ na ndị ọzọ emejọọ anyị, anyị na-agbalị ka anyị ghọta ihe mere ha ji mee ihe ha mere ma ọ bụ kwuo ihe ha kwuru. Anyị mee otú ahụ, o nwere ike ime ka iwe anyị dajụọ, anyị ‘eleghara mmejọ ahụ anya.’ (Ilu 19:11) Nghọta na-enyere anyị aka ịna-echebara ndị ọzọ echiche. Anyị anaghị atụ anya ka ụmụnna anyị bụrụ ndị zuru okè. Anyị na-echetakwa na o nwere ike ịbụ na e nwere nsogbu ha na ya na-alụ, nke anyị na-aghọtachaghị. Ha kwuwe ihe ha chere, anyị na-ege ntị nke ọma. Ọ bụrụ na ihe ha chere adịghị njọ, anyị emee ya.—Fil. 4:5.

17 Otú anyị si ebi ndụ. Ebe anyị bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, anyị ma na o nweghị ihe ùgwù karịrị iso na-ekwusa ozi ọma. Otú anyị ga-esi gosi na anyị ji ya kpọrọ ihe bụ ịna-eme mkpebi ga-eme ka anyị jiri obi anyị niile na-ekwusa ya. Anyị na-ewere ihe gbasara ofufe Chineke ka ihe kacha mkpa. Anyị anaghịkwa ebi ndụ okomoko ka anyị nwee ike iji ike anyị niile na-ekwusa ozi ọma a dị ezigbo mkpa tupu ọgwụgwụ abịa.—Mat. 6:33; 24:14.

18. Olee otú anyị ga-esi nọsie ike n’ụzọ ahụ na-eduga ná nzọpụta? Gịnị ka i kpebisiri ike ime?

18 Ànyị ga-asị na ihe ndị anyị tụlere gbasara àgwà ndị magburu onwe ha Jizọs nwere atọghị anyị ụtọ? Chegodị uru anyị ga-erite ma ọ bụrụ na anyị amụọ gbasara àgwà ya ndị ọzọ ma mụta otú anyị ga-esi na-akpakwu àgwà ka ya. N’ihi ya, ka anyị kpebisie ike ịna-esochi nzọụkwụ ya anya. Anyị mee otú ahụ, anyị ga-anọsi ike n’ụzọ ahụ na-eduga ná nzọpụta. Anyị ga-abịarukwu Jehova nso. Ọ bụ ya ka Jizọs ṅomiri nke ọma.

^ para. 2 Ọ bụ Ndị Kraịst nwere olileanya ịga eluigwe ka a gwara ihe ahụ e kwuru na 1 Pita 1:8, 9. Ma, ihe ahụ Pita kwuru gbasakwara Ndị Kraịst nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa.

^ para. 9 Ị chọọ ịgụ banyere ụfọdụ ndị nwere obi ike mgbe ha na-ata ahụhụ, gụọ Ụlọ Nche, December 1, 2000, peeji nke 24-28; Teta! Bekee April 22, 2003, peeji nke 18-21; na nke January 22, 1995, peeji nke 11-15.