Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JENỤWARỊ 2015

Na-ekele Jehova Ka Ọ Gọzie Gị

Na-ekele Jehova Ka Ọ Gọzie Gị

“Keleenụ Jehova, n’ihi na ọ dị mma.”—ỌMA 106:1.

1. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-ekele Jehova?

Ọ BỤ Jehova na-enye anyị “ezi onyinye ọ bụla na onyinye ọ bụla zuru okè.” (Jems 1:17) Ọ na-eji obiọma azụ anyị dị ka atụrụ, na-egbokwara anyị mkpa anyị niile. (Ọma 23:1-3) N’eziokwu, anyị kwesịrị iji obi anyị niile na-ekele Jehova. Ọ bụ “ebe mgbaba anyị na ike anyị,” nke ka nke, mgbe anyị nọ ná nsogbu. (Ọma 46:1) Obi kwesịrị ịdị anyị otú ahụ ọ dị otu ọbụ abụ, bụ́ onye kwuru, sị: “Keleenụ Jehova, n’ihi na ọ dị mma; n’ihi na obiọma ya na-adịru mgbe ebighị ebi.”—Ọma 106:1.

Isiokwu afọ 2015 bụ: “Keleenụ Jehova, n’ihi na ọ dị mma.”—Abụ Ọma 106:1

2, 3. (a) Gịnị ga-eme anyị ma ọ bụrụ na anyị anaghị ekele Jehova maka ihe ọma ndị o meere anyị? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza n’isiokwu a?

2 Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị leba anya n’ihe gbasara ikele Jehova? Ndị mmadụ n’oge ikpeazụ a bụ ndị na-enweghị ekele otú ahụ e buru n’amụma. (2 Tim. 3:2) Ọtụtụ ndị anaghị ekele Jehova maka ihe ọma ndị o meere ha. Ịchụ akụnụba na ịkpọsa ngwá ahịa emeela ka ọtụtụ nde mmadụ na-agba mbọ ka ha nwetakwuo ihe. Ihe ha nwere anaghị eju ha afọ. Anyị nwere ike ịmụta ụdị àgwà a ma ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya. Anyị nwere ike imewe ka ndị Izrel oge ochie, ya bụ, ghara ịna-ekele  Jehova. E nwekwara ike, anyị agaghị eji adịm ná mma anyị na ya na ihe ọma ndị o meere anyị kpọrọ ihe.—Ọma 106:7, 11-13.

3 Ihe ọzọ anyị kwesịrị ichebara echiche bụ ihe nwere ike ime ma ọ bụrụ na ọnwụnwa ndị tara akpụ abịara anyị. Nsogbu anyị nwere ike ime ka ike gwụ anyị, anyị echefuo ihe ọma niile Jehova meere anyị. (Ọma 116:3) N’ihi ya, olee otú anyị ga-esi mụta ikele Jehova mgbe niile? Gịnị ga-enyere anyị aka ịna-enwe obi ụtọ ọ bụrụgodị na ọnwụnwa tara akpụ abịara anyị? Ka anyị leba anya n’ajụjụ ndị a.

“I MEWO ỌTỤTỤ IHE, JEHOVA”

4. Gịnị ga-eme ka anyị na-ekele Jehova mgbe niile?

4 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-ekele Jehova mgbe niile, anyị kwesịrị ịmata ihe ọma ndị o meere anyị, na-echebara ha echiche, matakwa otú ihe ndị ahụ si gosi na ọ hụrụ anyị n’anya nke ukwuu. Mgbe otu ọbụ abụ mere otú ahụ, o mere ka obi dị ya ezigbo ụtọ maka ọtụtụ ihe dị ebube Jehova meere ya.—Gụọ Abụ Ọma 40:5; 107:43.

5. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’aka Pọl gbasara ikele Chineke?

5 Ihe Pọl onyeozi mere ga-akụziri anyị ọtụtụ ihe gbasara ịna-ekele Jehova. O doro anya na Pọl chebaara ihe Jehova na-emere ya echiche. Ọ bụ ya mere o ji jiri obi ya niile na-ekele ya mgbe niile. Pọl ma nke ọma na ya bụbu “onye nkwulu na onye mkpagbu na onye na-akparị mmadụ.” N’ihi ya, o kelere Chineke maka ebere ya na Kraịst meere ya ma mee ka ọ na-ekwusara ndị ọzọ ozi ọma n’agbanyeghị ihe ọjọọ niile o mere n’oge gara aga. (Gụọ 1 Timoti 1:12-14.) Pọl jikwa ụmụnna ya kpọrọ ihe ma kelee Jehova ugboro ugboro maka àgwà ọma ha na otú ha si jiri obi ha niile na-eje ozi ha. (Fil. 1:3-5, 7; 1 Tesa. 1:2, 3) O kelekwara Jehova maka ihe niile ụmụnna meere ya mgbe ọnwụnwa bịaara ya. (Ọrụ 28:15; 2 Kọr. 7:5-7) N’ihi ya, ọ naghị eju anyị anya na Pọl gbara Ndị Kraịst ume, sị: “Gosikwanụ na unu bụ ndị nwere ekele. . . . Jirinụ abụ ọma na otuto a na-enye Chineke na abụ ime mmụọ na amara na-ezi ibe unu ihe, na-adụkwa ibe unu ọdụ, na-abụkunụ Jehova abụ n’ime obi unu.”—Kọl. 3:15-17.

ỊTỤGHARỊ UCHE NA IKPE EKPERE GA-ENYERE ANYỊ AKA ỊNA-EKELE JEHOVA

6. Gịnị mere i ji ekele Jehova?

6 Olee otú anyị ga-esi mee ka Pọl? Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịna-atụgharị uche n’ihe Jehova meere ya. (Ọma 116:12) Ọ bụrụ na mmadụ ajụọ gị, sị, ‘Olee ihe ọma Jehova meere gị nke mere ka obi dị gị ụtọ?’ gịnị ka ị ga-aza ya? Ị̀ ga-ekwu na ọ bụ adịm ná mma gị na Jehova? Ka ọ̀ bụ mmehie ọ gbaghaara gị n’ihi okwukwe i nwere n’àjà Kraịst chụrụ? Ị̀ ga-akpọ aha ụmụnna ndị nyeere gị aka mgbe ọnwụnwa ndị tara akpụ bịaara gị? O doro anya na ị gaghị echefu di gị ma ọ bụ nwunye gị ị hụrụ n’anya ma ọ bụkwanụ ụmụ gị. Ọ bụrụ na i wepụta oge tụgharịa uche n’ihe ọma niile Jehova meere gị, obi ga-adị gị ụtọ, gị ana-ekele ya kwa ụbọchị.—Gụọ Abụ Ọma 92:1, 2.

7. (a) Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-ekele Jehova mgbe anyị na-ekpe ekpere? (b) Olee uru ị ga-erite ma ọ bụrụ na ị na-ekele Jehova mgbe ị na-ekpe ekpere?

7 Ọ bụrụ na anyị atụgharịa uche n’ihe ọma niile Jehova meere anyị, anyị ga-achọ ịna-ekpe ekpere ma kelee ya. (Ọma 95:2; 100:4, 5) Ọtụtụ ndị na-ekpe ekpere naanị mgbe ha chọrọ ịrịọ Chineke ihe ọ ga-emere ha. Ma, anyị ma na obi na-adị Jehova ụtọ ma anyị kelee ya maka ihe ndị o nyere  anyị. Baịbụl kwuru gbasara ọtụtụ ndị ohu Jehova, ndị kpere ekpere ma kelee ya. Mmadụ abụọ n’ime ha bụ Hana na Hezekaya. (1 Sam. 2:1-10; Aịza. 38:9-20) N’ihi ya, na-eme ka ndị ji obi ha niile fee Chineke n’oge ochie. I kpewe ekpere, na-ekele Jehova maka ihe ọma ndị o meere gị. (1 Tesa. 5:17, 18) E nwere ọtụtụ uru ị ga-erite ma i mee otú ahụ. Obi ga na-adị gị mma, gị ahụkwuo Jehova n’anya, gị na ya adịkwuo ná mma.—Jems 4:8.

Olee ihe ọma Jehova meere gị nke mere ka obi dị gị ụtọ? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6 na nke 7)

8. Olee ihe ndị nwere ike ime ka anyị ghara iji ihe niile Jehova meere anyị kpọrọ ihe?

8 Gịnị mere anyị kwesịrị iji kpachara anya ka anyị ghara iji ihe ọma Jehova na-emere anyị gwuo egwu? Ọ bụ n’ihi na mmehie anyị ketara n’aka Adam na Iv nwere ike ime ka anyị ghara ịna-ekele Chineke maka ihe ọma ndị o meere anyị. Jehova nyere Adam na Iv paradaịs ka ha biri, na-egbokwara ha mkpa ha niile. Ha gaara adị ndụ ebighị ebi ma biri n’udo. (Jen. 1:28) Ma, ha ejighị ihe ọma a niile Chineke meere ha kpọrọ ihe. Ha ji anyaukwu chọọ inwetakwu ihe. Ọ bụ ya mere ihe niile ji funahụ ha. (Jen. 3:6, 7, 17-19) Ọtụtụ ndị n’ụwa taa anaghị ekele Chineke. N’ihi ya, anyị nwere ike ichefu ihe niile Jehova meere anyị. Anyị nwere ike iji adịm ná mma anyị na ya gwuwe egwu. Otu ihe ọma o meere anyị bụ ịkpọbata anyị ná nzukọ ya zuru ụwa ọnụ. Ma ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, anyị agaghịzi eji ihe ùgwù a kpọrọ ihe. Ihe nke ụwa nweziri ike iri anyị isi. (1 Jọn 2:15-17) Ọ bụrụ na anyị achọghị ka ụdị ihe a mee anyị, anyị kwesịrị ịna-atụgharị uche n’ihe ọma Jehova meere anyị, na-ekelekwa ya maka na o mere ka anyị soro ná ndị na-efe ya.—Gụọ Abụ Ọma 27:4.

MGBE ỌNWỤNWA BỊAARA ANYỊ

9. Ọ bụrụ na ọnwụnwa siri ike abịara anyị, gịnị mere anyị kwesịrị iji tụgharịa uche n’ihe ọma Jehova meere anyị?

9 Ikele Chineke mgbe niile maka ihe ndị o meere anyị nwere ike inyere anyị aka idi ọnwụnwa ndị tara akpụ. Ike nwere ike ịgwụ mmadụ ma ọ bụrụ na ọnwụnwa abịara ya na mberede ma kpatara ya ezigbo nsogbu. Ma eleghị anya, di ya ma ọ bụ nwunye ya kwara iko ma ọ bụkwanụ na onye ahụ na-arịa ajọ ọrịa ma ọ bụ na mmadụ nwụnahụrụ ya. O nwekwara ike ịbụ na ọdachi ọzọ dakwasịrị ya. Ụdị ihe ahụ mee, ịtụgharị uche n’ihe ọma Jehova na-emere anyị ga-akasi anyị obi, meekwa ka okwukwe anyị sie ike. Ka anyị leba anya n’akụkọ ụfọdụ mere eme.

10. Olee uru otu nwanna nwaanyị ritere n’ihi na ọ na-atụgharị uche n’ihe ọma Jehova na-emere ya?

 10 E nwere otu nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ n’Amerịka. Aha ya bụ Irina. * Di ya bụ okenye ma mechaa kwaa iko, hapụ ya na ụmụ ha. Gịnị nyeere Irina aka iji obi ya niile na-ejere Jehova ozi? O kwuru, sị: “Obi dị m ụtọ na Jehova na-elekọta m. Ana m ekele ya kwa ụbọchị maka ihe ọma ndị ọ na-emere m. N’ihi ya, aghọtala m na ọ bụ ihe ùgwù na Nna anyị nke eluigwe ma m ma hụ m n’anya. Ama m na ọ gaghị ahapụ m.” N’agbanyeghị na ọtụtụ nsogbu abịarala ya, obi ụtọ ọ na-enwe na-enyere ya aka idi ha niile ma na-agba ndị ọzọ ume.

11. Gịnị nyeere otu nwanna nwaanyị aka idi ajọ ọrịa na-arịa ya?

11 E nwere otu nwanna nwaanyị bi n’Eshia aha ya bụ Kyung-sook. Ya na di ya sụrụ ụzọ ihe karịrị iri afọ abụọ. Na mberede, a chọpụtara na ọrịa kansa eriela ya ahụ́. A gwara ya na ihe ọ ga-anọ nwụọ bụ ihe dị ka ọnwa atọ, ma ọ gaghị anọfe ọnwa isii. Tupu ihe a emee, ya na di ya chere na ahụ́ gbasiri ha ike n’agbanyeghị na ụdị ọnwụnwa dị iche iche abịarala ha. O kwuru, sị: “Ọrịa a a chọpụtara mere ka obi gbawaa m. O mere ka ọ dị m ka ụwa agwụla. Ezigbo ụjọ bịakwara m.” Gịnị nyeere ya aka idi nsogbu a? O kwuru, sị: “Tupu mụ alakpuo n’abalị ọ bụla, m na-agbago n’elu ụlọ anyị kpee ekpere n’olu dara ụda ma gwa Jehova ihe ise o meere m n’ụbọchị ahụ mere m ji na-ekele ya. Ọ na-abụ m kpechaa, obi esie m ike, mụ ana-eme ihe gosiri na m hụrụ Jehova n’anya.” Olee uru ekpere a ọ na-ekpe n’abalị ọ bụla baara ya? O kwuru, sị: “O meela ka m ghọta na Jehova na-enyere anyị aka idi ọnwụnwa ọ bụla bịaara anyị nakwa na ihe ọma ọ na-emere anyị karịrị ọnwụnwa ndị na-abịara anyị.”

Ihe a bụ foto ya na nwanne ya fọrọnụ aha ya bụ John (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13))

12. Gịnị kasiri Jason obi mgbe nwunye ya nwụrụ?

12 Onye ọzọ bụ otu nwanna nwoke aha ya bụ Jason. Ọ na-eje ozi n’otu alaka ụlọ ọrụ anyị dị n’Afrịka. O jeela ozi oge niile ihe karịrị iri afọ atọ. O kwuru, sị: “Nwunye m nwụrụ afọ asaa gara aga. O mere ka obi gbawaa m. Ike na-agwụ m ma m chewe ụdị ahụhụ ọ tara mgbe ya na ọrịa kansa na-alụ.” Gịnị nyeere Jason aka ịna-edi nsogbu a? O kwuru, sị: “O nwere mgbe m chetara oge mụ na nwunye m ji nọrịa, mụ ekpee ekpere kelee Jehova maka ihe ahụ o mere ka m cheta. O mere ka m nwetatụ onwe m ma malitezie ikele Jehova mgbe niile maka oge ndị ahụ mụ na nwunye m ji nọrịa. Ikele Chineke mgbe niile emeela ka m gbanwee otú m si ele nsogbu m anya. Ihe a mere m ka na-ewute m. Ma, m na-ekele Jehova maka na o mere ka mụ na nwunye m bie n’udo nakwa maka na o nyere m nwunye hụrụ ya n’anya nke ukwuu. Ime otú a emeela ka m gbanwee otú m si ele nsogbu m anya.”

“Obi dị m ezigbo ụtọ na Jehova bụ Chineke m.”—Sheryl

13. Gịnị nyeere otu nwata nwaanyị aka idi ọnwụ ọtụtụ ndị ezinụlọ ha?

13 Na Filipinz, e nwere otu nwata nwaanyị aha ya bụ Sheryl. Ọ dị afọ iri na atọ mgbe ajọ ifufe kpara mkpamkpa n’obodo ahụ ná ngwụcha afọ 2013. Ọ fọrọ obere ka ifufe ahụ bibie ihe niile nwata nwaanyị a na ndị ezinụlọ ya nwere. O kwuru, sị: “Ụlọ anyị lara n’iyi. Ọ fọkwara obere ka ọ bụrụ na ndị ezinụlọ anyị niile nwụrụ.” Ma papa ya ma mama ya ma ụmụnne ya atọ nwụrụ n’ọdachi ahụ. Gịnị nyeere ya aka ka nsogbu ahụ ghara ime ka obi na-ajọ ya njọ mgbe niile? Ọ na-echebara ihe ọma niile Jehova na-emere ya echiche ma na-ekele ya mgbe niile. O kwuru, sị: “Ahụrụ m mbọ niile ụmụnna  na-agba iji gbaa ndị ọdachi dakwasịrị ume, meekwa ka ha chefutụ ihe mere ha. Ama m na ụmụnna anyị n’ụwa niile na-echeta m n’ekpere.” O kwukwara, sị: “Obi dị m ezigbo ụtọ na Jehova bụ Chineke m. Ọ na-egboro anyị mkpa anyị mgbe niile.” N’eziokwu, ọ bụrụ na anyị na-echebara ihe ọma Chineke na-emere anyị echiche, ọ ga-eme ka anyị ghara inwebiga mwute ókè n’ihi nsogbu bịaara anyị. Ikele Chineke mgbe niile ga-enyere anyị aka ịna-edi nsogbu ọ bụla bịaara anyị.—Efe. 5:20; gụọ Ndị Filipaị 4:6, 7.

“M GA-AṄỤRỊ ỌṄỤ N’IME JEHOVA”

14. Olee olileanya magburu onwe ya anyị nwere? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

14 Kemgbe ụwa, obi na-adị ndị Jehova ụtọ maka ihe ọma ọ na-emere ha. Dị ka ihe atụ, mgbe Chineke napụtachara ndị Izrel n’aka Fero na ndị agha ya n’Oké Osimiri Uhie, ha ji obi ụtọ bụọ abụ iji too Chineke ma kelee ya. (Ọpụ. 15:1-21) Taa, otu n’ime ihe ọma kachanụ Chineke meere anyị bụ na o mere ka anyị nwee olileanya na ọ ga-ewepụrụ anyị nsogbu niile n’oge na-adịghị anya. (Ọma 37:9-11; Aịza. 25:8; 33:24) Chegodị otú obi ga-adị anyị mgbe Jehova ga-ebibi ndị iro ya niile ma mee ka anyị baa n’ụwa ọhụrụ, bụ́ ebe a ga-enwe udo na ezi omume. Anyị ga-eji obi anyị niile kelee Jehova n’ụbọchị ahụ.—Mkpu. 20:1-3; 21:3, 4.

15. Gịnị ka i kpebisiri ike ime n’afọ a?

15 Anyị na-atụ anya ọtụtụ ihe ọma Jehova ga-emere anyị n’afọ a. O doro anya na ọnwụnwa nwere ike ịbịara anyị. Ihe ọ sọkwara ya bụrụ, anyị ma na Jehova agaghị ahapụ anyị. (Diut. 31:8; Ọma 9:9, 10) Ọ ga na-enye anyị ihe ọ bụla ga-eme ka anyị nwee ike iji obi anyị niile na-ejere ya ozi. N’ihi ya, ka anyị kpebisie ike ime ka Habakọk onye amụma, bụ́ onye kwuru, sị: “Ọ bụ ezie na osisi fig nwere ike ghara ịma ifuru, osisi vaịn nwekwara ike ghara ịmị mkpụrụ; osisi oliv nwere ike ghara ịmị mkpụrụ, mbara ala nwekwara ike ghara imepụta nri ọ bụla; ìgwè ewu na atụrụ ndị nọ n’ogige nwere ike nwụchaa, e nwekwara ike a gaghị enwe ìgwè ehi n’ogige ha; ma mụ onwe m ga-aṅụrị ọṅụ n’ime Jehova.” (Hab. 3:17, 18) N’afọ a, ka anyị jiri obi ụtọ na-echebara ihe ọma niile Jehova meere anyị echiche. Ka anyị na-emekwa ihe isiokwu afọ 2015 gwara anyị ka anyị mee, ya bụ, “Keleenụ Jehova, n’ihi na ọ dị mma.”—Ọma 106:1.

^ para. 10 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

GỤKWUO GBASARA YA

“Mụrụnụ Anya Ka Unu Wee Na-ekpe Ekpere”

Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-ekpe ekpere mgbe niile? Anyị cheta ndị ọzọ n’ekpere, olee ndị ọ ga-abara uru?