Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JENỤWARỊ 2015

Kwee Ka Jehova Mee Ka Gị na Di Gị ma Ọ Bụ Nwunye Gị Na-adị ná Mma ma Ghara Itisa

Kwee Ka Jehova Mee Ka Gị na Di Gị ma Ọ Bụ Nwunye Gị Na-adị ná Mma ma Ghara Itisa

“Ọ bụrụ na Jehova echeghị obodo, ọ bụ n’efu ka onye nche na-amụ anya.”—ỌMA 127:1b.

1, 2. (a) Gịnị mere na iri puku ndị Izrel abụọ na anọ abaghị n’Ala Nkwa ahụ? (b) Gịnị mere anyị kwesịrị iji chebara ihe ahụ mere ha echiche?

MGBE ọ fọrọ obere ka ụmụ Izrel baa n’Ala Nkwa ahụ, ọtụtụ puku n’ime ha na ‘ndị inyom Moab nwere mmekọahụ rụrụ arụ.’ N’ihi ya, Jehova gburu puku ndị Izrel iri abụọ na anọ. Chegodị echiche. Ha nọ na-atụ anya Ala Nkwa ahụ kemgbe. Ọ fọkwara obere ka o ruo ha aka. Ma, ha abaghị na ya n’ihi na ha kwere ka a nwata ha, ha akwaa iko.—Ọnụ Ọgụ. 25:1-5, 9.

2 Ihe mere e ji dee ihe a mere ha na Baịbụl bụ “ka ha bụụrụ anyị ihe ịdọ aka ná ntị, anyị ndị ọgwụgwụ nke usoro ihe ndị a bịakwasịworo.” (1 Kọr. 10:6-11) Ka ‘oge ikpeazụ’ a na-agba egwú ụla ya, ọ fọrọ obere ka ndị ohu Chineke baa n’ụwa ọhụrụ. (2 Tim. 3:1; 2 Pita 3:13) Ma, ọ dị mwute na e nwere ụfọdụ ndị ohu Jehova na-anọghị na nche. Ha ekwela ka a nwata ha, ha akwaa iko ma na-atazi ahụhụ ya. Ma há amaghị ihe ha mere, ndụ ebighị ebi agaghị eru ha aka.

3. Gịnị mere ndị di na nwunye kwesịrị iji kwe ka Jehova duzie ha ma chebe ha? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

3 Ara ịkwa iko na-agba ọtụtụ ndị taa. N’ihi ya, ndị di na  nwunye kwesịrị ikwe ka Jehova duzie ha ma chebe ha ka mbọ ha na-agba ka ha ghara itisa ghara ịbụ na nkịtị. (Gụọ Abụ Ọma 127:1.) N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe di na nwunye ga-eme ka ha ghara itisa. Ha kwesịrị ichebe obi ha, mee ka ha na Chineke dịkwuo ná mma, yiri mmadụ ọhụrụ, na-ekwurịta okwu nke ọma, na-enyekwa ibe ha ihe ruuru ya.

CHEBE OBI GỊ

4. Olee ihe mere ụfọdụ Ndị Kraịst ji kwaa iko?

4 Olee otú e nwere ike isi nwata Onye Kraịst, ya akwaa iko? Ọ na-amalitekarị n’ihe anyị ji anya anyị na-ele. Jizọs kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke na-ele nwaanyị anya, o wee gụọ ya agụụ ka ya na ya nwee mmekọahụ, ọ kwasowo ya iko n’obi ya.” (Mat. 5:27, 28; 2 Pita 2:14) Ọtụtụ Ndị Kraịst kwara iko bu ụzọ tinyewe aka n’ihe ndị ha ma na ọ dịghị mma, ya bụ, ihe ndị dị ka ile ndị gba ọtọ, ịgụ akwụkwọ ndị na-akọ gbasara inwe mmekọahụ na ile ihe ndị jọgburu onwe ha n’Ịntanet. E nwekwara ndị nke gara lee ebe a na-egosi ndị na-eme omume rụrụ arụ na fim, n’ebe a na-agba egwú ma ọ bụ na tiivi. Ụfọdụ agaala oriri na nkwari ndị a na-eme n’abalị nakwa ebe ndị mmadụ na-eyipụ efe ha na-agba egwú ma ọ bụkwanụ gaa ebe a na-ahịa ndị mmadụ aka n’ahụ́, ha emechaa kwaa iko.

5. Gịnị mere anyị kwesịrị iji chebe obi anyị?

5 Ụfọdụ ndị akwaala iko n’ihi na ha na onye na-abụghị di ha ma ọ bụ nwunye ha na-anọkarị. N’ụwa taa, ọtụtụ ndị anaghị ejide onwe ha. Ha na-aṅụkwa ịkwa iko ka mmiri. Obi anyị na-ezughị okè dị aghụghọ. Ọ naghịkwa ekwe njite. N’ihi ya, ma anyị akpacharaghị anya, onye na-abụghị di anyị ma ọ bụ nwunye anyị nwere ike iji nwayọọ nwayọọ riwe anyị obi. (Gụọ Jeremaya 17:9, 10.) Jizọs kwuru, sị: “N’obi ka echiche ọjọọ, igbu ọchụ, ịkwa iko nke di ma ọ bụ nwunye, ịkwa iko, . . . si apụta.”—Mat. 15:19.

6, 7. (a) Olee ihe nwere ike ime ma ọ bụrụ na ọchịchọ ọjọọ abata mmadụ n’obi? (b) Olee otú mmadụ nwere ike isi gbaara mmehie ọsọ?

6 Obi dị aghụghọ. N’ihi ya, ọ bụrụ na nwoke na nwaanyị dị ná mma, ozugbo ọchịchọ ọjọọ batara ha n’obi, ha nwere ike ikwuwe ihe ha kwesịrị ịgwa naanị di ha ma ọ bụ nwunye ha. N’oge na-adịghị anya, ha ga na-agba mbọ ka a na-enwe ihe ga-eme ka ha na-anọkọ. Ha ga na-ahụ ibe ha ọtụtụ mgbe, na-eme ka à ga-asị na o mere na mberede. Ha ga-eji nwayọọ nwayọọ na-erikwu ibe ha obi, ya emee ka ọ na-esikwuru ha ike ime ihe ziri ezi. Ka ha na-akpachikwu anya, ọ ga-esikwuru ha ike ịkwụsị ya n’agbanyeghị na ha ma na ihe ha na-eme adịghị mma.—Ilu 7:21, 22.

7 Ha ga-amalite ime ihe gosiri na ha echefuola iwu Jehova kpamkpam. Ọchịchọ ọjọọ na mkparịta ụka na-adịghị mma ga-eme ka ha abụọ jidewe aka, susuwe ọnụ, dịdawa aka, ma ọ bụ na-emetụ ibe ha aka n’ebe na-ekwesịghị ekwesị. Ihe a niile bụ ihe mmadụ na naanị di ya ma ọ bụ nwunye ya kwesịrị ịna-eme. N’ikpeazụ, ‘ọchịchọ nke aka ha na-arapụta ha wee rafuo ha.’ Mgbe ọchịchọ ahụ tụụrụ ime, “ọ na-amụpụta mmehie,” ya bụ, ịkwa iko. (Jems 1:14, 15) Ọ bụ ihe jọgburu onwe ya n’ihi na ha abụọ gaara agbara mmehie a ọsọ ma a sị na ha kwere ka Jehova nyere ha aka ịna-akwanyere alụmdi na nwunye ùgwù. Ma, olee otú mmadụ ga-esi gosi na ya na-akwanyere alụmdi na nwunye ùgwù?

MEENỤ KA UNU NA CHINEKE DỊKWUO NÁ MMA

8. Olee otú ịbụ enyi Jehova si eme ka anyị ghara ịkwa iko?

8 Gụọ Abụ Ọma 97:10. Ịbụ enyi Jehova ga-eme ka anyị ghara ịkwa iko. Ka anyị na-amụkwu gbasara àgwà Chineke ndị magburu  onwe ha, anyị ga na-agbalị ‘ịna-eṅomi ya dị ka ụmụ a hụrụ n’anya, na-ejekwa ije n’ịhụnanya.’ Anyị ga-esi otú ahụ mee ka okwukwe anyị sie ike ka anyị nwee ike ịgbara “ịkwa iko na ụdị adịghị ọcha ọ bụla” ọsọ. (Efe. 5:1-4) Ebe di na nwunye ma na “Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko na ndị bụ́ di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko ikpe,” ha kwesịrị ịgbalịsi ike na-akwanyere alụmdi na nwunye ha ùgwù, na-agbakwa mbọ ka a ghara imerụ ya.—Hib. 13:4.

9. (a) Olee otú Josef si rubere Jehova isi mgbe ọnwụnwa bịaara ya? (b) Gịnị na gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta n’ihe Josef mere?

9 E nwere ụfọdụ Ndị Kraịst ha na ndị ọrụ ibe ha na-abụghị Ndị Kraịst na-anọrị ma a gbasaa ọrụ, ya emee ka ọ na-esiri ha ike irubere Chineke isi. Ọnwụnwa nwedịrị ike ịbịara Ndị Kraịst n’oge ọrụ. Ụdị ihe a mere Josef bụ́ nwa okorobịa mara mma. Ọ bụ n’ebe ọ na-arụ ọrụ ka ọ matara na nwunye nna ya ukwu chọrọ ka ya na ya nwee mmekọahụ. Ọ nọ na-agba mbọ kwa ụbọchị ka ọ nwata Josef. N’ikpeazụ, ‘o jidere ya n’uwe ya, na-asị: “Ka mụ na gị dinaa!”’ Ma, Josef jisiri ike gbaa ọsọ. Gịnị mere obi ji sie Josef ike ime ihe ziri ezi mgbe ahụ ọnwụnwa bịaara ya? Ọ bụ n’ihi na o kpebisiri ike na ya agaghị eme ihe ọ bụla ga-eme ka ya na Chineke ghara ịdị ná mma. N’ihi otú Josef si kpebisie ike ime ihe Chineke chọrọ, a chụrụ ya n’ọrụ ma tụọ ya mkpọrọ. Ma, Jehova gọziri ya. (Jen. 39:1-12; 41:38-43) Ma ànyị nọ n’ebe anyị na-arụ ọrụ ma ànyị nọ naanị anyị, anyị ekwesịghị ime ihe ọ bụla ga-abụrụ anyị na onye na-abụghị di anyị ma ọ bụ nwunye anyị ọnwụnwa.

YIRINỤ MMADỤ ỌHỤRỤ AHỤ

10. Olee otú iyiri mmadụ ọhụrụ ahụ si enyere di na nwunye aka ka ha ghara ịkwa iko?

10 Ọ bụrụ na di na nwunye eyiri “mmadụ ọhụrụ ahụ nke e kere dị ka uche Chineke si dị, n’ezi omume na iguzosi ike n’ihe,” ọ ga-eme ka ha ghara ịkwa iko. (Efe. 4:24) Ndị niile yiiri mmadụ ọhụrụ ahụ na-eme ka akụkụ ahụ́ ha “nwụọ n’ihe banyere ịkwa iko, adịghị ọcha, agụụ mmekọahụ, ọchịchọ ọjọọ, na anyaukwu.” (Gụọ Ndị Kọlọsi 3:5, 6.) Ihe a Baịbụl kwuru pụtara na anyị ga-agbalịsi ike ka anyị ghara ime ihe ọjọọ na-agụ anyị. Anyị agaghị eme ihe ọ bụla ga-eme ka anyị chewe otú anyị na onye na-abụghị di anyị ma ọ bụ nwunye anyị ga-esi nwee mmekọahụ. (Job 31:1) Ọ bụrụ na anyị na-edebe iwu Chineke, anyị ‘ga-akpọ ihe ọjọọ asị, ma jidesie ezi ihe ike.’—Rom 12:2, 9.

11. Ọ bụrụ na di na nwunye eyiri mmadụ ọhụrụ, olee otú ọ ga-esi mee ka ha dịkwuo ná mma?

11 Ọ bụrụ na anyị eyiri mmadụ ọhụrụ ahụ, anyị ga na-akpa àgwà ka Jehova. (Kọl. 3:10) Ọ bụrụ na di na nwunye eyiri “obi ọmịiko, obiọma, ịdị umeala n’obi, ịdị nwayọọ, na ogologo ntachi obi,” dị ka uwe, ha ga na-adịkwu ná mma, Jehova ga-agọzikwa ha. (Kọl. 3:12) Ha ga-enwekwa otu obi ma ọ bụrụ na ha ‘ekwe ka udo nke Kraịst na-achị obi ha.’ (Kọl. 3:15) Ọ ga-abara di na nwunye ezigbo uru ma ọ bụrụ na ha ‘na-enwe obi ọmịiko n’ebe ibe ha nọ.’ Ọ ga na-atọ ha ụtọ ‘ibute ụzọ n’inye ibe ha nsọpụrụ.’—Rom 12:10.

12. Olee àgwà ndị i chere ga-eme ka di na nwunye na-enwe obi ụtọ?

12 E nwere otu nwanna aha ya bụ Sid. Mgbe a jụrụ ya na Sonja nwunye ya ihe mere ha ji na-enwe obi ụtọ, o kwuru, sị: “Ịhụnanya bụ àgwà kacha mkpa anyị na-agba mbọ mgbe niile ka anyị mụta. Anyị achọpụtakwala na ịdị nwayọọ dị ezigbo mkpa.” Nwunye ya kwetara ihe o kwuru ma sị: “Obiọma dị ezigbo mkpa. Anyị na-agbakwa mbọ adị umeala n’obi n’agbanyeghị na ọ naghị adị mfe mgbe niile.”

 NA-EKWURỊTANỤ OKWU NKE ỌMA

13. Gịnị ga-eme ka di na nwunye na-adịkwu ná mma? N’ihi gịnị?

13 Otu n’ime ihe ndị ga-eme ka di na nwunye na-adịkwu ná mma bụ iji obiọma na-agwa ibe ha okwu. Ọ dị mwute na mgbe ụfọdụ ndị di na nwunye na-agwa onye ha na-amaghị okwu, ha na-akwanyere ya ùgwù karịa mgbe ha na-agwa ibe ha okwu. Ọ bụrụ na di na nwunye na-akparị ibe ha, jirikwa ‘obi ilu, iwe, ọnụma, na iti mkpu’ na-agwa ibe ha okwu, adịm ná mma ha ga-eji nwayọọ nwayọọ na-anyụ ka ọkụ. (Efe. 4:31) Kama ịna-akatọ ibe ha ma ọ bụ na-agwa ibe ha okwu ọjọọ, di na nwunye kwesịrị iji obiọma, olu ọma, na obi ọmịiko na-agwa ibe ha okwu. Ha mee otú ahụ, ha ga na-adịkwu ná mma.—Efe. 4:32.

14. Gịnị ka di na nwunye na-ekwesịghị ịna-eme?

14 Baịbụl kwuru na e nwere “oge ịgbachi nkịtị.” (Ekli. 3:7) Ọ pụtaghị na anyị ga na-agbachi di anyị ma ọ bụ nwunye anyị nkịtị. Anyị mee otú ahụ, anyị na ya agaghị na-ekwurịta okwu nke ọma. Otu nwanna nwaanyị bi na Jamanị kwuru, sị: “Obi anaghị adị mmadụ mma ma ọ bụrụ na di ya ma ọ bụ nwunye ya anaghị atụpụrụ ya ọnụ.” Ma, o kwukwara, sị: “Ọ bụ eziokwu na ọ naghị adịchara mmadụ mfe ịgbachi nkịtị ma iwe bịa ya, mmadụ ekwesịghị iji iwe kwuo okwu naanị maka na ọ chọrọ ka obi jụrụ ya. I mee otú ahụ, ị ga-ekwu ma ọ bụ mee ihe nwere ike iwute di gị ma ọ bụ nwunye gị. Ọ ga-eme ka nsogbu ka njọ.” O nweghị otú di na nwunye ga-esi jiri iti mkpu ma ọ bụ ịgbachi nkịtị dozie nsogbu ha. Kama, ihe ga-eme ka ha na-adịkwu ná mma bụ ịgbalịsi ike ka ha ghara ịna-enwe nghọtahie mgbe niile ma ọ bụ ka nghọtahie ha nwere ghara ime ka ha na-ese okwu.

15. Olee otú ikwurịta okwu nke ọma ga-esi mee ka di na nwunye dịkwuo ná mma?

15 Di na nwunye ga-adịkwu ná mma ma ọ bụrụ na ha ana-akọrọ ibe ha otú obi dị ha na ihe ha chere. Ihe dị mkpa abụghị naanị ihe anyị kwuru, otú anyị si kwuo ya dịkwa mkpa. N’ihi ya, ọ bụrụgodị na gị na  di gị ma ọ bụ nwunye gị enwee nsogbu tara akpụ, gbalịsie ike ka ị na-agwa ya okwu ọma, jirikwa olu ọma na-agwa ya okwu. I mee otú ahụ, ọ ga-adịrị ya mfe ige gị ntị. (Gụọ Ndị Kọlọsi 4:6.) Ihe di na nwunye ga-eme ka ha nwee ike ịna-adịkwu ná mma bụ ịna-ekwurịta okwu nke ọma, ya bụ, ịna-agwa ibe ha “okwu dị mma maka iwuli elu dị ka ọ pụrụ ịdị mkpa, ka o wee mee ka ndị na-anụ ya nweta ihe dị mma.”—Efe. 4:29.

Ihe di na nwunye ga-eme ka ha nwee ike ịna-adịkwu ná mma bụ ịna-ekwurịta okwu nke ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)

NA-ENYENỤ IBE UNU IHE RUURU YA

16, 17. Gịnị mere di na nwunye kwesịrị iji na-enwe mmekọahụ, na-agbakwa mbọ ka obi dị ibe ha mma?

16 Di na nwunye ga-adịkwukwa ná mma ma ọ bụrụ na ihe ka ha mkpa bụ ime ihe dị ibe ha mma, ọ bụghị ọdịmma onwe ha. (Fil. 2:3, 4) Ha kwesịrị ịna-eme ihe ga-eme ka obi dị ibe ha mma, na-enwekwa mmekọahụ.—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 7:3, 4.

17 Ọ dị mwute na ụfọdụ ndị anaghị achọ igosi di ha ma ọ bụ nwunye ha na ha hụrụ ya n’anya ma ọ bụkwanụ wepụta oge ka ha nwee mmekọahụ. Ụfọdụ ụmụ nwoke chere na nwoke dị nwayọọ abụghị nwoke. Ma, Baịbụl kwuru, sị: “Unu ndị bụ́ di, ka unu na ndị nwunye unu na-ebi otú ahụ dị ka ihe ọmụma si dị.” (1 Pita 3:7) Di kwesịrị ịghọta na inye nwunye ya ihe ruuru ya apụtaghị naanị na ya na ya ga na-enwe mmekọahụ. O kwesịrị ịhụ nwunye ya n’anya, na-agbakwa mbọ mgbe niile ka obi dị ya mma. O mee otú ahụ, inwe mmekọahụ ga na-atọ nwunye ya ụtọ. Ọ bụrụ na ha abụọ ana-ahụ ibe ha n’anya, na-emekwara ibe ha ihe ọma, ọ ga-adịrị ha mfe ịna-egboro ibe ha mkpa ma mee ka obi na-adị ha ụtọ.

18. Gịnị ka di na nwunye ga-eme ka ha dịkwuo ná mma?

18 O nweghị ihe kwesịrị ime ka mmadụ hapụ di ya ma ọ bụ nwunye ya gaa kwaa iko. Ma, ọ bụrụ na ha abụọ anaghị eme ka obi dị ibe ha mma, o nwere ike ime ka otu onye n’ime ha lewe anya n’èzí. (Ilu 5:18; Ekli. 9:9) Ọ bụ ya mere Baịbụl ji gwa di na nwunye, sị: “Unu ajụla inye ya ibe unu, [ya bụ, inwe mmekọahụ] ọ gwụla ma ùnu kwekọrịtara maka oge a kara aka.” N’ihi gịnị? “Ka Setan wee ghara ịnọ na-anwa unu ọnwụnwa maka na unu enweghị ike ịchịkwa onwe unu.” (1 Kọr. 7:5) Ọ ga-ajọgbu onwe ya ma ọ bụrụ na di na nwunye ekwe ka Setan mee ka otu onye n’ime ha kwaa iko n’ihi na o nweghị ike ijide onwe ya. Ma, ọ bụrụ na mmadụ na-enye di ya ma ọ bụ nwunye ya ihe ruuru ya, ọ ga-egosi na ọ naghị ‘achọ uru nke ya, kama nke onye nke ọzọ.’ Ọ ga-eme otú ahụ iji gosi na ya hụrụ ya n’anya, ọ bụghị ka o mezuo iwu. Ịhụnanya na obiọma na-eme ka di na nwunye dịkwuo ná mma.—1 Kọr. 10:24.

UNU EKWELA KA IHE Ọ BỤLA MEE KA UNU TISAA

19. Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime? N’ihi gịnị?

19 Ụwa ọhụrụ adịla ezigbo nso. N’ihi ya, ọ ga-ajọgbu onwe ya ma ọ bụrụ na anyị ekwe ka e jiri ọchịchọ anụ ahụ́ rata anyị otú ahụ e ji ya rata iri puku ndị Izrel abụọ na anọ n’ọzara Moab. Ihe ahụ mere ha dị mwute ma bụrụ ihe ihere. Mgbe Baịbụl kwuchara gbasara ya, ọ dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Ka onye chere na ya guzosiri ike lezie anya ka ọ ghara ịda.” (1 Kọr. 10:12) N’ihi ya, ọ dị ezigbo mkpa ka anyị mee ka anyị na di anyị ma ọ bụ nwunye anyị dịkwuo ná mma. Otú anyị ga-esi eme ya bụ iji obi anyị niile na-erubere Jehova isi, gharakwa ịhapụ di anyị ma ọ bụ nwunye anyị lewe anya n’èzí. (Mat 19:5, 6) Ọ bụ ugbu a ka ọ kacha mkpa ka anyị ‘gbalịsie ike ka e wee hụ anyị n’ikpeazụ dị ka ndị na-enweghị ntụpọ na ndị na-enweghị mmerụ na ndị nọ n’udo.’—2 Pita 3:13, 14.