Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JENỤWARỊ 2015

Ihe Mere Anyị Ji Eme Ncheta Ọnwụ Jizọs

Ihe Mere Anyị Ji Eme Ncheta Ọnwụ Jizọs

“Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.”—1 KỌR. 11:24.

1, 2. Gịnị ka Jizọs mere mgbe chi jiri n’abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan afọ 33? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

N’ABALỊ iri na anọ n’ọnwa Naịsan afọ 33, ọnwa gbazuru na Jeruselem. Jizọs na ndịozi ya mere Ememme Ngabiga iji cheta otú Jehova si napụta ndị Izrel n’Ijipt otu puku afọ na narị afọ ise tupu mgbe ahụ. Ya na ndịozi ya iri na otu nọ mgbe ọ malitere ihe ọhụrụ, ya bụ, ihe a ga-eji na-echeta ọnwụ ọ ga-anwụ tupu ụbọchị ahụ agaa. *Mat. 26:1, 2.

2 Jizọs weere achịcha na-ekoghị eko, gọzie ya ma nye ya ndịozi ya. Ọ sịrị ha: “Naranụ, taa.” O bukwaara iko mmanya, kelee Chineke ma sị ha: “Ṅụọnụ, unu niile.” (Mat. 26:26, 27) E nweghị ihe ọzọ Jizọs nyere ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi ka ha rie. Ma, ọ gwara ha ọtụtụ ihe n’abalị ahụ dị ezigbo mkpa.

3. Olee ajụjụ ndị a ga-aza n’isiokwu a?

3 Otú ahụ ka Jizọs si malite Ncheta Ọnwụ ya, nke a na-akpọkwa “Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị.” (1 Kọr. 11:20) Mmadụ nwere ike ịjụ, sị: Gịnị mere a ga-eji na-echeta ọnwụ Jizọs?  Gịnị ka achịcha ahụ na mmanya ahụ nọchiri anya ya? Olee otú anyị ga-esi kwado maka Ncheta Ọnwụ Jizọs? Ole ndị kwesịrị ịta achịcha ahụ ma ṅụọ mmanya ahụ? Gịnị ka Ndị Kraịst na-eme n’ihi ihe Baịbụl kwuru gbasara olileanya ha nwere?

IHE MERE ANYỊ JI ECHETA ỌNWỤ JIZỌS

4. Olee ihe ọnwụ Jizọs mere ka o kwee omume?

4 Ebe anyị bụ ụmụ Adam, anyị ketara mmehie na ọnwụ. (Rom 5:12) O nweghị mmadụ na-ezughị okè nwere ike inye Chineke ihe mgbapụta maka ndụ ya ma ọ bụ nke ndị ọzọ. (Ọma 49:6-9) Ma, Jizọs ji ọnwụ ya kwụọ ụgwọ a ga-eji gbapụta ndị mmadụ. O ji ahụ́ ya zuru okè na ọbara ya chụọ àjà Chineke nabatara. O mere ka e nwee ike ịnapụta anyị n’aka mmehie na ọnwụ, meekwa ka anyị nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. Otú o si mee ya bụ igosi Chineke uru àjà ahụ ọ chụrụ bara.—Rom 6:23; 1 Kọr. 15:21, 22.

5. (a) Olee otú anyị si mara na Chineke na Kraịst hụrụ ụmụ mmadụ n’anya? (b) Gịnị mere anyị kwesịrị iji gaa Ncheta Ọnwụ Jizọs?

5 Àjà ahụ Jizọs chụrụ gosiri na Chineke hụrụ ụmụ mmadụ n’anya. (Jọn 3:16) O gosikwara na Jizọs hụrụ anyị n’anya. Tupu Jizọs abịa n’ụwa, ya bụ, mgbe ahụ ọ bụ “onye ọkà ọrụ” Chineke, ihe gbasara ụmụ mmadụ na-eme ya obi ụtọ. (Ilu 8:30, 31) Obi dị anyị ezigbo ụtọ maka ihe Jehova na Jizọs meere anyị. Ọ bụ ya mere anyị ji aga Ncheta Ọnwụ Jizọs, si otú ahụ gosi na anyị na-eme ihe ahụ ọ gwara anyị, nke bụ́, “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.”—1 Kọr. 11:23-25.

IHE ACHỊCHA NA MMANYA AHỤ NỌCHIRI ANYA YA

6. Gịnị ka anyị kwesịrị ịghọta gbasara achịcha na mmanya e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs?

6 Mgbe Jizọs na ndịozi ya na-eri nri ikpeazụ ahụ, ọ rụghị ọrụ ebube ma mee ka achịcha ahụ ghọọ ahụ́ ya ma ọ bụkwanụ mee ka mmanya ahụ ghọọ ọbara ya. Kama, o kwuru gbasara achịcha ahụ, sị: “Nke a pụtara ahụ́ m.” O kwukwara gbasara mmanya ahụ, sị: “Nke a pụtara ‘ọbara m nke ọgbụgba ndụ ahụ,’ nke a ga-awụpụ n’ihi ọtụtụ mmadụ.” (Mak 14:22-24) N’ihi ya, o doro anya na e nwere ihe achịcha ahụ na mmanya ahụ nọchiri anya ya.

7. Gịnị ka achịcha na mmanya e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs nọchiri anya ya?

7 Ná nri anyasị ahụ Jizọs na ndịozi ya riri n’afọ 33, ihe o nyere ha bụ achịcha na-ekoghị eko fọrọ mgbe ha richara oriri Ngabiga. (Ọpụ. 12:8) Na Baịbụl, ihe iko achịcha na-anọchi anya mmehie mgbe ụfọdụ. (Mat. 16:6, 11, 12; Luk 12:1) N’ihi ya, achịcha ahụ na-ekoghị eko Jizọs nyere ndịozi ya nọchiri anya ahụ́ ya zuru okè. (Hib. 7:26) Ọ bụ ya mere anyị ji eji ụdị achịcha ahụ eme Ncheta Ọnwụ Jizọs.

8. Gịnị ka mmanya e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs nọchiri anya ya?

8 Mmanya ahụ Jizọs nyere ndịozi ya n’abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan afọ 33 nọchiri anya ọbara ya. Mmanya anyị ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs taa nọchikwara anya otu ihe ahụ. N’ebe a na-akpọ Gọlgọta, nke dị n’azụ Jeruselem, a wụpụrụ ọbara Jizọs “maka mgbaghara mmehie.” (Mat. 26:28; 27:33) O doro anya na achịcha na mmanya e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs nọchiri anya àjà bara ezigbo uru ọ chụrụ maka ndị na-erubere Chineke isi. Obi dịkwa anyị ụtọ maka ya. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịkwado nke ọma maka Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị a na-eme kwa afọ.

OTÚ ANYỊ NWERE IKE ISI KWADEBE

9. (a) Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị na-agụ Ọgụgụ Baịbụl maka Ncheta Ọnwụ Jizọs? (b) Olee otú obi na-adị gị ma i cheta àjà ahụ Jizọs chụrụ?

9 Otu ụzọ anyị ga-esi kwadebe maka Ncheta Ọnwụ Jizọs bụ ịna-agụ Ọgụgụ  Baịbụl maka Ncheta Ọnwụ Jizọs otú ahụ e si dee ya n’Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị. Ọ ga-enyere anyị aka ịtụgharị uche n’ihe Jizọs mere tupu ya anwụọ. * Otu nwanna nwaanyị dere, sị: “Anyị na-atụ anya Ncheta Ọnwụ Jizọs. Kwa afọ, ọ na-apụkwu iche. Echetara m mgbe papa m nwụrụ, mụ agaa guzoro n’ebe e dewere ozu ya na-ele ya. Ọ bụ mgbe ahụ ka m ghọtara uru àjà ahụ Jizọs chụrụ baara anyị n’eziokwu. . . . Tupu mgbe ahụ, ama m amaokwu Baịbụl niile kwuru gbasara ya nakwa otú e si akọwa ha. Ma, ọ bụ mgbe ọnwụ gburu papa m m hụrụ n’anya ka ọ na-abụ m cheta uru àjà ahụ Jizọs chụrụ ga-abara anyị, obi adị m ụtọ.” Mgbe anyị na-akwado maka Ncheta Ọnwụ Jizọs, anyị kwesịrị ịna-atụgharị uche n’otú àjà ahụ Jizọs chụrụ ga-esi mee ka a napụta anyị n’aka mmehie na ọnwụ.

Jiri ihe ndị nzukọ Jehova wepụtaara anyị kwadebe obi gị maka Ncheta Ọnwụ Jizọs (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9)

10. Olee ihe ọzọ anyị nwere ike ime iji kwado maka Ncheta Ọnwụ Jizọs?

10 Otú ọzọ anyị nwere ike isi kwado maka Ncheta Ọnwụ Jizọs bụ iwepụtakwu oge gaa ozi ọma, kpọọ ma ndị anyị na-amụrụ Baịbụl ma ndị ọzọ ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs. Anyị nwere ike ịsụ ụzọ inyeaka. Ka anyị na-agwa ndị ọzọ gbasara Chineke, Ọkpara ya, na olileanya anyị nwere ịdị ndụ ebighị ebi, obi ga na-adị anyị ụtọ na anyị na-eme ihe Chineke chọrọ.—Ọma 148:12, 13.

11. Gịnị mere Pọl ji kwuo na ụfọdụ Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt erughị eru taa achịcha ma ṅụọ mmanya e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs?

11 Ka ị na-akwado maka Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, tụgharịa uche n’ihe Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt n’akwụkwọ ozi o degaara ha. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 11:27-34.) Pọl kwuru na ọ bụrụ na mmadụ erughị eru taa achịcha ma ọ bụ ṅụọ mmanya e ji na-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs, onye ahụ “ga-abụ onye ikpe mara n’ihe banyere ahụ́ na ọbara nke Onyenwe anyị” Jizọs Kraịst. N’ihi ya, ọ bụrụ na onye e tere mmanụ emee omume rụrụ arụ ma taa achịcha ahụ, ṅụọkwa mmanya ahụ, ọ “na-ata ma na-aṅụtara onwe ya ikpe ọmụma.” N’oge Pọl onyeozi, ọtụtụ ụmụnna nọ na Kọrịnt mere ihe ha na-ekwesịghị ime. O nwere ike ịbụ na ụfọdụ n’ime ha rifere nri ókè, ṅụbigakwa mmanya ókè tupu Ncheta Ọnwụ Jizọs ma ọ bụkwanụ mgbe a na-eme ya. O nwere ike ịbụ na o mere ka ha na-ero ụra. Ha si otú ahụ gosi na o nweghị ihe ha ji Ncheta Ọnwụ Jizọs kpọrọ.  N’ihi ya, obi anaghị adị Chineke ụtọ ma ha taa achịcha ahụ ma ṅụọ mmanya ahụ.

12. (a) Olee ihe Pọl ji Ncheta Ọnwụ Jizọs tụnyere? Gịnị ka ọ gwara ndị na-eri ya? (b) Ọ bụrụ na onye na-ata achịcha ma na-aṅụ mmanya e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs emee mmehie dị oké njọ, gịnị ka o kwesịrị ime?

12 Pọl ji Ncheta Ọnwụ Jizọs tụnyere nri mmadụ so ndị ọzọ na-eri. Ọ gwara ndị na-eri ya, sị: “Unu apụghị ịdị na-aṅụ iko Jehova na iko ndị mmụọ ọjọọ; unu apụghị ịdị na-eri na ‘tebụl Jehova,’ na-erikwa na tebụl ndị mmụọ ọjọọ.” (1 Kọr. 10:16-21) Ọ bụrụ na onye na-ata achịcha ma na-aṅụ mmanya e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs emee mmehie dị oké njọ, o kwesịrị ịgakwuru ndị okenye ka ha nyere ya aka. (Gụọ Jems 5:14-16.) Onye ahụ kwesịrị ime ihe gosiri na o chegharịala n’eziokwu. Ọ bụrụzie na ọ taa achịcha ahụ, ṅụọkwa mmanya ahụ, ọ gaghị egosi na o nweghị ihe o ji àjà ahụ Jizọs chụrụ kpọrọ.—Luk 3:8.

13. Gịnị mere anyị kwesịrị iji kpee ekpere ma tụgharịa uche n’olileanya Chineke mere ka anyị nwee?

13 Ihe ọzọ anyị nwere ike ime iji kwado maka Ncheta Ọnwụ Jizọs bụ ikpe ekpere ma tụgharịa uche n’olileanya Chineke mere ka anyị nwee. O nweghị onye bụ́ ezigbo onye na-eso ụzọ Jizọs na onye nyefere Jehova onwe ya ga-achọ ime ihe gosiri na o jighị àjà ahụ Jizọs chụrụ kpọrọ ihe. N’ihi ya, anyị agaghị ata achịcha ma ọ bụ ṅụọ mmanya e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs ma ọ bụrụ na o doghị anyị anya na anyị bụ ndị e tere mmanụ. Oleekwanụ otú mmadụ ga-esi mata ma ò kwesịrị ịta achịcha ahụ ma ṅụọ mmanya ahụ?

ÒNYE KWESỊRỊ ỊTA ACHỊCHA AHỤ MA ṄỤỌ MMANYA AHỤ?

14. Ebe ọ bụ na ndị e tere mmanụ so n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, gịnị ka ha na-eme mgbe a na-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs?

14 Ọ bụ ndị o doro anya na ha so n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ na-ata achịcha ahụ, na-aṅụkwa mmanya ahụ. Jizọs kwuru gbasara mmanya ahụ, sị: “Iko a pụtara ọgbụgba ndụ ọhụrụ nke dabeere n’ọbara m.” (1 Kọr. 11:25) Jehova si n’ọnụ Jeremaya onye amụma kwuo na ya ga-eji ọgbụgba ndụ ọhụrụ dochie ọgbụgba ndụ Iwu ahụ ya na ndị Izrel gbara. (Gụọ Jeremaya 31:31-34.) Ọ bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ ka ha na Chineke gbara ọgbụgba ndụ ọhụrụ a. (Gal. 6:15, 16) Ọ bụ ọbara Jizọs ji chụọ àjà mere ka ọgbụgba ndụ a nwee isi. (Luk 22:20) Jizọs bụ onye ogbugbo ọgbụgba ndụ ọhụrụ a. Ndị e tere mmanụ so na ya. Ọ bụrụ na ha ekwesị ntụkwasị obi, ha ga-eso Jizọs chịa n’eluigwe.—Hib. 8:6; 9:15.

15. Ole ndị so n’ọgbụgba ndụ Alaeze? Ọ bụrụ na ha ekwesị ntụkwasị obi, gịnị ka ha ga-eso mee?

15 Ndị e tere mmanụ ma na ha so n’ọgbụgba ndụ Alaeze. (Gụọ Luk 12:32.) Ọ bụ Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ gbara ndụ a. Ha ji obi ha niile soro ya taa ahụhụ. (Fil. 3:10) Ndị e tere mmanụ kwesịrị ntụkwasị obi taa sokwa n’ọgbụgba ndụ a. Ha ga-eso Jizọs bụrụ ndị eze n’eluigwe ruo mgbe ebighị ebi. (Mkpu. 22:5) Ha ruru eru ịta achịcha na ịṅụ mmanya e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs.

16. Ná nkenke, kọwaa ihe Pọl kwuru ná Ndị Rom 8:15-17.

16 Ọ bụ naanị ndị mmụọ nsọ gbaara àmà na ha bụ ụmụ Chineke kwesịrị ịta achịcha ma ṅụọ mmanya e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs. (Gụọ Ndị Rom 8:15-17.) Pọl kwuru na ha na-eti mkpu, sị: “Aba, Nna!” N’asụsụ Arameik, “Aba” bụ ihe nwatakịrị na-akpọ nna ya iji gosi na ọ hụrụ ya n’anya ma na-akwanyere ya ùgwù. Ọ dị ka okwu ahụ bụ́ “papa.” Pọl kwuru na ndị a e ji mmụọ nsọ mụọ ọzọ “natara mmụọ nke ịbụ ndị e doro dị ka ụmụ.” Mmụọ nsọ na-agbara mmụọ ha àmà, mee ka ha ghọta na ha bụ ụmụ Chineke e tere mmanụ. Ọ pụtaghị na ike ibi n’ụwa agwụla ha. Obi siri  ha ike na ha ga-eso Jizọs chịa n’Alaeze ya n’eluigwe ma ọ bụrụ na ha ekwesị ntụkwasị obi ruo mgbe ha nwụrụ. Taa, ndị fọrọ n’ime otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ na-eso ụzọ Kraịst adịghịzi ọtụtụ. Ọ bụ ha ka Jehova, bụ́ ‘Onye nsọ, tere mmanụ.’ (1 Jọn 2:20; Mkpu. 14:1) Mmụọ nsọ na-eme ka ha tie mkpu, sị: “Aba, Nna!” Adịm ná mma ha na Chineke pụrụ ezigbo iche.

JIRI OLILEANYA GỊ SI NA BAỊBỤL KPỌRỌ IHE

17. Olee olileanya ndị e tere mmanụ nwere? Olee otú ha si amata na ha bụ ndị e tere mmanụ?

17 Ọ bụrụ na ị bụ Onye Kraịst e tere mmanụ, o doro anya na ị na-ekpesi ekpere ike maka olileanya i nwere ịga eluigwe. Baịbụl kwuru na Jizọs Kraịst ga-alụ nwaanyị ọhụrụ n’eluigwe. N’ihi ya, ị gụọ ihe Baịbụl kwuru gbasara ndị Jizọs ‘kwere nkwa na ọ ga-alụ,’ ị na-amata na i so ná ndị a na-agwa. Ị na-atụkwa anya iso ná ndị bụ́ ‘nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ.’ (2 Kọr. 11:2; Jọn 3:27-29; Mkpu. 21:2, 9-14) Mgbe Chineke kwuru na Baịbụl na ya hụrụ ndị e tere mmanụ n’anya, ị na-ekwu, sị, “Eso m ná ndị a na-agwa.” Ị gụọ gbasara ndụmọdụ Jehova nyere ndị e tere mmanụ, mmụọ nsọ na-eme ka i rube isi ma sị n’obi gị, “Ọ bụ m ka a na-agwa.” Mmụọ nsọ Chineke na-esi otú ahụ eso mmụọ gị na-agba àmà na i nwere olileanya ịga eluigwe.

18. Olee olileanya “atụrụ ọzọ” nwere? Olee otú obi na-adị gị ma i cheta ya?

18 Ma, ọ bụrụ na i so ‘n’oké ìgwè mmadụ’ ndị so ‘n’atụrụ ọzọ,’ Chineke emeela ka i nwee olileanya ibi n’ụwa. (Mkpu. 7:9; Jọn 10:16) Ị chọrọ ịdị ndụ ebighị ebi na Paradaịs. Obi na-adị gị ụtọ mgbe ị na-eche banyere ihe Baịbụl kwuru gbasara ụdị ndụ ndị mmadụ ga-ebi n’ụwa ọhụrụ. Ị na-atụ anya ibi n’ụwa, mgbe udo ga-adị ebe niile, gị na ndị ezinụlọ gị na ndị ezi omume ndị ọzọ ana-enwe obi ụtọ. Ọ na-agụsi gị agụụ ike ịhụ mgbe ụkọ nri, ịda ogbenye, ịta ahụhụ, ọrịa, na ọnwụ na-agaghịzi echi ndị mmadụ ọnụ n’ala. (Ọma 37:10, 11, 29; 67:6; 72:7, 16; Aịza. 33:24) Ọ na-agụ gị agụụ ịnabata ndị a kpọlitere n’ọnwụ, bụ́ ndị ga-enwe olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa. (Jọn 5:28, 29) Ị na-ekele Jehova maka na o mere ka i nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa. Ọ bụ eziokwu na ị naghị ata achịcha ahụ ma ọ bụ na-aṅụ mmanya ahụ, ị na-aga Ncheta Ọnwụ Jizọs iji gosi na obi dị gị ụtọ maka àjà ahụ Jizọs Kraịst chụrụ.

Ị̀ GA-AGA NKE AFỌ A?

19, 20. (a) Gịnị ka ị ga-eme ka olileanya gị mezuo? (b) Gịnị mere ị ga-eji gaa Ncheta Ọnwụ Jizọs?

19 Ma olileanya gị ọ̀ bụ ibi n’ụwa ma ọ̀ bụ ịga eluigwe, naanị ihe ga-eme ka o mezuo bụ ma i nwee okwukwe na Jehova Chineke, Jizọs Kraịst nakwa n’àjà ọ chụrụ. Ọ bụrụ na ị gaa Ncheta Ọnwụ Jizọs, ị ga-eji ohere ahụ tụgharịa uche n’olileanya gị nakwa n’ihe mere ọnwụ Jizọs nwụrụ ji dị ezigbo mkpa. N’ihi ya, kpebisie ike na ị ga-eso n’ọtụtụ nde mmadụ ga-aga Ncheta Ọnwụ Jizọs mgbe anyanwụ dachara na Fraịdee, abalị atọ n’ọnwa anọ n’afọ 2015. A ga-eme ya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nakwa n’ebe ndị ọzọ n’ụwa niile.

20 Ịga Ncheta Ọnwụ Jizọs ga-eme ka obi dịkwuo gị ụtọ maka àjà Jizọs chụrụ. I gee ntị nke ọma n’okwu a ga-ekwu, ọ ga-eme ka ị gbakwuo mbọ gosi ndị agbata obi gị na ị hụrụ ha n’anya. Otú ị ga-esi eme ya bụ ịna-agwa ha ihe ị mụtara gbasara ịhụnanya Jehova na ihe magburu onwe ya ọ ga-emere ndị mmadụ. (Mat. 22:34-40) Gbalịsie ike ka ị gaa Ncheta Ọnwụ Jizọs.

^ para. 1 Ụbọchị ndị Hibru na-amalite mgbe anyanwụ dara, kwụsịkwa mgbe anyanwụ dara n’echi ya.

^ para. 9 Gụọ akwụkwọ bụ́ Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịghọta Baịbụl, isi nke 16.