Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JENỤWARỊ 2015

Ịhụnanya Ò Nwere Ike Ịdịgide?

Ịhụnanya Ò Nwere Ike Ịdịgide?

“[Ịhụnanya] na-enwu dị ka ọkụ, bụ́ ire ọkụ nke Jaa.”—ABỤ SỌLỌ. 8:6.

1, 2. Olee ndị Abụ Sọlọmọn nwere ike ịbara uru? N’ihi gịnị? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

E NWERE ụmụnna abụọ gbara akwụkwọ. Mgbe ha na-agba akwụkwọ, ha jidere ibe ha aka, leekwa ibe ha anya, ọnụ abụrụ ha ọchị ọchị. O nweghị onye hụrụ ha ga na-eche ma hà hụkwara ibe ha n’anya. Okenye kwuru okwu agbamakwụkwọ ha nọ na-eche, sị: ‘Ka afọ na-aga, ịhụnanya ha ọ̀ ga-esikwu ike, ka ọ̀ ga-eji nwayọọ nwayọọ nyụọ ka ọkụ?’ Ọ bụrụ na di na nwunye hụrụ ibe ha n’anya n’eziokwu, ha abụọ ga na-ebi n’udo ọ bụrụgodị na nsogbu tara akpụ abịara ha. Ma, ọ dị mwute na ọtụtụ di na nwunye anaghị enwe obi ụtọ. E nwekwara ndị na-etisa. N’ihi ya, mmadụ nwere ike ịna-eche, sị: ‘Ịhụnanya di na nwunye ò nwere ike ịdịgide?’

2 Ezigbo ịhụnanya dị ụkọ n’oge Eze Sọlọmọn. N’ihi gịnị? Sọlọmọn kwuru, sị: “Achọtawo m otu nwoke ziri ezi n’ime otu puku mmadụ, ma ọ dịghị otu nwaanyị m chọtara n’ime ha niile. Lee! Naanị nke a ka m chọpụtara, na ụmụ mmadụ ziri ezi mgbe ezi Chineke kere ha, ma ha onwe ha echepụtawo ọtụtụ atụmatụ.” (Ekli. 7:26-29) N’oge ahụ, e nwere ụmụ nwaanyị si mba ọzọ bi n’etiti ndị Izrel. Ha na-efe Bel, na-emekwa omume rụrụ arụ. N’ihi ya, ọtụtụ ndị Izrel, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị, malitere ime omume rụrụ arụ. * Ma, ihe dị ka iri afọ  abụọ tupu mgbe ahụ, Eze Sọlọmọn dere otu abụ gbasara otu nwoke na otu nwaanyị hụrụ ibe ha n’anya n’eziokwu. Ma ànyị alụọla di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ na anyị alụbeghị, Abụ Sọlọmọn nwere ike inyere anyị aka ịghọta ihe bụ́ ezigbo ịhụnanya nakwa otú anyị ga-esi gosi ya.

EZIGBO ỊHỤNANYA DỊ ADỊ

3. Gịnị mere o ji bụrụ na nwoke na nwaanyị nwere ike ịhụ ibe ha n’anya n’eziokwu?

3 Gụọ Abụ Sọlọmọn 8:6. N’ebe a, Baịbụl kwuru na ịhụnanya yiri “ire ọkụ nke Jaa.” N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na àgwà kachanụ Jehova nwere bụ ịhụnanya. O kere anyị n’oyiyi ya ka anyị nwee ike ịmụta ịhụnanya ya. (Jen. 1:26, 27) Mgbe Jehova kechara nwoke mbụ bụ́ Adam, o kere ọmarịcha nwaanyị ma kpọrọ ya kpọnye Adam. Mgbe Adam hụrụ Iv, obi tọrọ ya ezigbo ụtọ. Ọ bụ ya mere o ji kwuo otú obi dị ya. Obi ruru Iv ala mgbe ya na di ya nọ. A sị ka e kwuwe, Jehova ji ọgịrịga Adam kee Iv. (Jen. 2:21-23) Ebe ọ bụ na Jehova kere ụmụ mmadụ ma mee ka ha nwee ike ịhụ ibe ha n’anya, nwoke na nwaanyị ga-ahụli ibe ha n’anya n’eziokwu, ịhụnanya ha adịgidekwa.

4, 5. Olee akụkọ a kọrọ n’Abụ Sọlọmọn?

4 Otú Abụ Sọlọmọn si kọwaa ịhụnanya nwoke na nwaanyị magburu onwe ya. N’abụ ahụ, ọ kọrọ otú otu nwa agbọghọ Shunem na otu nwa okorobịa na-azụ atụrụ si hụ ibe ha n’anya. Ka anyị leba anya n’akụkọ ahụ ọ kọrọ. O kwuru na nwa agbọghọ ahụ nọ na-arụ ọrụ n’ubi vaịn ụmụnne ya nwoke nke dị nso n’ebe Eze Sọlọmọn na ndị agha ya mara ụlọikwuu. Sọlọmọn hụrụ nwa agbọghọ ahụ ma gwa ndị ohu ya ka ha gaa kpọbata ya n’ụlọikwuu ya. Mgbe ha kpọtara ya, Sọlọmọn gwara ya na ọ mara ezigbo mma, nyekwa ya ọtụtụ onyinye. Ma, nwa agbọghọ ahụ gwara ya na e nwere otu nwa okorobịa na-azụ atụrụ ya hụrụ n’anya. O sikwara ọnwụ na ọ bụ nwa okorobịa ahụ ka ya chọrọ. (Abụ Sọlọ. 1:4-14) Nwa okorobịa ahụ mechara chọrọ nwa agbọghọ ahụ bata n’ụlọikwuu ahụ. Mgbe ọ hụrụ nwa agbọghọ ahụ, ha abụọ kwuru ọtụtụ ihe gbasara otú ha si hụ ibe ha n’anya.—Abụ Sọlọ. 1:15-17.

5 Sọlọmọn kpọ nwa agbọghọ ahụ laghachi Jeruselem, nwa okorobịa ahụ achọrọ ya gawa. (Abụ Sọlọ. 4:1-5, 8, 9) Mbọ niile Sọlọmọn gbara ka o nweta nwa agbọghọ ahụ kụrụ afọ n’ala. (Abụ Sọlọ. 6:4-7; 7:1-10) N’ihi ya, Sọlọmọn hapụrụ ya ka ọ laa. N’ikpeazụ, nwa agbọghọ ahụ kpọrọ nwa okorobịa ahụ ọ hụrụ n’anya ka ọ gbara ọsọ bịa “dị ka nne mgbada.”—Abụ Sọlọ. 8:14.

6. Gịnị mere o nwere ike iji sie ike ịmata onye kwuru nke o kwuru n’Abụ Sọlọmọn?

6 Abụ Sọlọmọn magburu onwe ya. Ọ bụ ya mere e ji kpọọ ya “abụ kasị abụ.” (Abụ Sọlọ. 1:1) Ma, n’abụ ahụ, Sọlọmọn akpọghị aha ndị kwuru nke ha kwuru. Ihe dị ya mkpa bụ ka a hụ otú abụ ahụ si maa mma nakwa ka o doo anya, ọ bụghị ịgbakwụnye ọtụtụ ihe na-adịghị mkpa. N’agbanyeghị na ọ kpọghị aha ndị kwuru nke ha kwuru, ihe ndị ha kwuru nwere ike ime ka anyị mata onye kwuru nke o kwuru.

“OTÚ I SI EGOSI ỊHỤNANYA DỊ ỤTỌ KARỊA MMANYA”

7, 8. Olee otú onye ahụ na-azụ atụrụ na nwa agbọghọ ahụ si kwuo ihe gosiri na ha hụrụ ibe ha n’anya? Nye ihe atụ.

7 Nwa agbọghọ ahụ na onye ahụ na-azụ atụrụ kwuru ọtụtụ ihe magburu onwe ha iji gosi na ha hụrụ ibe ha n’anya. Ụfọdụ ihe ha kwuru nwere ike iju anyị anya n’ihi na e dere ha ihe karịrị puku afọ atọ gara aga. Ọ bụ eziokwu na otú ndị oge ahụ si eme ihe dị iche n’otú anyị si eme, anyị nwere ike ịghọta otú obi dị ha. Dị ka ihe atụ, nwa okorobịa ahụ na-azụ atụrụ kwuru na anya nwa agbọghọ ahụ yiri “anya nduru.” Ihe ọ pụtara bụ na anya ya mara mma.  (Abụ Sọlọ. 1:15) Nwa agbọghọ ahụ kwukwara na anya nwa okorobịa ahụ na-azụ atụrụ mara mma ka nduru. (Gụọ Abụ Sọlọmọn 5:12.) Anya ojii ya nke dị n’etiti anya ọcha ya mara ezigbo mma. Ọ dị ka nduru na-asa ahụ́ n’ime mmiri ara ehi.

8 Onye nke ọ bụla toro ibe ya maka mma ọ mara. Ma, ha ekwughị naanị gbasara mma elu ahụ́. Dị ka ihe atụ, otú nke nwaanyị si agwa ndị ọzọ okwu tọgburu nke nwoke atọgbu. (Gụọ Abụ Sọlọmọn 4:7, 11.) O kwukwara na ‘ihe si n’egbugbere ọnụ ya na-atasị bụ mmanụ aṅụ nke si n’ụgbụgbọ ya.’ N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na mmanụ aṅụ nke si n’ụgbụgbọ ya na-atọ ụtọ, dịkwa mma karịa mmanụ aṅụ e tinyere n’ebe ọzọ. Ihe ọzọ o kwuru bụ na ‘mmanụ aṅụ na mmiri ara ehi dị n’okpuru ire nwa agbọghọ ahụ.’ Ihe a o kwuru pụtara na okwu na-esi ya n’ọnụ apụta na-atọ ụtọ ná ntị ma bụrụ okwu ọma. E nwere ike iji ya tụnyere mmanụ aṅụ na mmiri ara ehi. N’ihi ya, mgbe nwa okorobịa ahụ na-azụ atụrụ gwara nwa agbọghọ ahụ, sị, “Ị mara ezigbo mma, . . . i nweghị ntụpọ,” ihe ọ na-ekwu gbasara ya abụghị naanị mma elu ahụ́ nwa agbọghọ ahụ mara.

9. (a) Olee ụdị ịhụnanya di na nwunye kwesịrị ịna-egosi ibe ha? (b) Gịnị mere o ji dị mkpa ka di na nwunye na-eme ihe gosiri na ha hụrụ ibe ha n’anya?

9 Taa, di na nwunye na-efe Jehova kwesịrị ịghọta na alụmdi na nwunye apụtaghị naanị na nwoke na nwaanyị kwekọrịtara na ha ga-ebi. Onye nke ọ bụla kwesịrị ịhụ ibe ya n’anya, meekwa ka ọ mata na ya hụrụ ya n’anya. Olee ụdị ịhụnanya a na-ekwu okwu ya ebe a? Ọ̀ bụ ụdị ịhụnanya ahụ Baịbụl kwuru ka anyị na-egosi mmadụ niile? (1 Jọn 4:8) Ka ọ̀ bụ ụdị ịhụnanya anyị na-egosi ndị ezinụlọ anyị? Ka ịhụnanya ahụ ọ̀ bụ adịm ná mma enyi na enyi? (Jọn 11:3) Ọ̀ bụ ịhụnanya nwoke na nwaanyị? (Ilu 5:15-20) Nke bụ́ eziokwu bụ na di na nwunye kwesịrị inwe ụdị ịhụnanya a niile iji gosi na ịhụnanya ha bụ nke ezigbo ya. I nwere ike isi n’okwu gị nakwa n’omume gị mee ka di gị ma ọ bụ nwunye gị mata na ị hụrụ ya n’anya, obi ana-adịkwa unu abụọ ụtọ. I kwesịrị ịna-eme otú ahụ, ọ bụrụgodị na ị naghị enwe efe. N’obodo ụfọdụ, ọ bụ ndị ọzọ na-ahọtara mmadụ onye ọ ga-alụ. O nwere ike ime ka mmadụ lụọ onye ọ na-amaghị. Ọ bụrụ na mmadụ abụọ si otú ahụ lụọ, ha ga-eji nwayọọ nwayọọ na-amata ibe ha ma na-ahụkwu ibe ha n’anya. Onye nke ọ bụla kwesịrị ịna-agwa ibe ya na ya hụrụ ya n’anya. Ọ ga-eme ka ha na-adịkwu ná mma, na-ebikwa n’udo.

10. Ọ bụrụ na di na nwunye na-egosi ibe ha ịhụnanya, olee uru ọ ga-abara ha?

10 Ọ bụrụ na di na nwunye na-eme ihe gosiri na ha hụrụ ibe ha n’anya, o nwere uru ọzọ ọ na-aba. N’abụ ahụ Eze Sọlọmọn bụrụ, ọ gwara nwa agbọghọ ahụ, sị: “Anyị ga-eji ọlaedo rụọrọ gị ihe a na-ekpu n’isi, tinyere ihe ịchọ mma ọlaọcha.” O toro nwa agbọghọ ahụ, gwa ya na ọ ‘mara mma dị ka ọnwa gbazuru agbazu, dịkwa ọcha dị ka anyanwụ.’ (Abụ Sọlọ. 1:9-11; 6:10) Ma, ihe ahụ Sọlọmọn kwuru emeghị ka obi nwa agbọghọ ahụ pụọ n’ebe nwa okorobịa ahụ ọ hụrụ n’anya nọ. Gịnị kasiri ya obi, meekwa ka obi ya ghara ịpụ n’ebe nwa okorobịa ahụ nọ n’oge ahụ ha abụọ na-anọghị? Ihe o kwuru zara ajụjụ a. (Gụọ Abụ Sọlọmọn 1:2, 3.) O chetara otú obi si adị ya ụtọ ma nwa okorobịa ahụ gwa ya ihe gosiri na ọ hụrụ ya n’anya. Ihe ọ na-agwa ya na-atọ ya ụtọ “karịa mmanya” nke na-eme ka obi mmadụ ṅụrịa ọṅụ. Ọ bụ ihe kasiri ya obi mgbe ọ nọ n’obí eze. Ọ na-adị ya ka a wụsara ya ‘mmanụ na-esi ísì ụtọ’ n’isi. (Ọma 23:5; 104:15) Di na nwunye kwesịrị ịna-egosi mgbe niile na ha hụrụ ibe ha n’anya n’ihi na ọ ga-eme ka ịhụnanya ha sikwuo ike. Mgbe ọ bụla ha chetara ya, ọ ga-enyere ha aka ka ịhụnanya ha ghara ịnyụ ka ọkụ.

 AKPỌTELA ỊHỤNANYA “RUO MGBE Ọ CHỌRỌ”

11. Gịnị ka Ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye nwere ike ịmụta n’ihe nwa agbọghọ Shunem gwara ụmụ nwaanyị Jeruselem n’obí Eze Sọlọmọn?

11 Abụ Sọlọmọn na-akụzikwara Ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ezigbo ihe, nke ka nke, ndị na-achọ onye ha ga-alụ. Nwa agbọghọ ahụ ahụghị Sọlọmọn n’anya. Ọ gwasiri ụmụ nwaanyị Jeruselem ike ka ha ‘ghara ịkpọte ịhụnanya dị n’ime ya ma ọ bụ kpalie ya ruo mgbe ọ chọrọ.’ (Abụ Sọlọ. 2:7; 3:5) N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ bụghị onye ọ bụla mmadụ hụrụ ka ọ ga-ekwe ka o rie ya obi. N’ihi ya, ọ bụrụ na Onye Kraịst chọrọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye, o kwesịrị ichere ruo mgbe ọ ga-ahụ onye ọ hụrụ n’anya n’eziokwu.

12. Gịnị mere nwa agbọghọ Shunem ji hụ onye ahụ na-azụ atụrụ n’anya?

12 Gịnị mere nwa agbọghọ Shunem ji hụ onye ahụ na-azụ atụrụ n’anya? O doro anya na nwa okorobịa ahụ mara mma. Baịbụl kwuru na o yiri “nne mgbada,” na aka ya siri ike ka “ọlaedo,” nakwa na ụkwụ ya mara mma, siekwa ike ka “ogidi e ji mabụl rụọ.” Ma, ọ bụghị naanị na o siri ike, maakwa mma okorobịa. Nwa agbọghọ ahụ sịrị: “Dị ka osisi apụl nke dị n’etiti osisi ndị dị n’oké ọhịa, otú ahụ ka onye m hụrụ n’anya dị n’etiti ụmụ nwoke.” Ebe ọ bụ na nwa agbọghọ ahụ ji obi ya niile na-efe Jehova, ọ ga-abụrịrị na nwoke a o kwuru ụdị ihe a gbasara ya hụrụ Jehova n’anya n’eziokwu.—Abụ Sọlọ. 2:3, 9; 5:14, 15.

13. Gịnị mere onye ahụ na-azụ atụrụ ji hụ nwa agbọghọ Shunem n’anya?

13 Gịnị ka Baịbụl kwuru banyere nwa agbọghọ Shunem? Ọ bụ eziokwu na ụdị mma ọ mara mere ka Eze Sọlọmọn hụ ya hụkpọọ anya n’agbanyeghị na, n’oge ahụ, o nwere ‘nwunye iri isii na ndị iko nwaanyị iri asatọ na ụmụ agbọghọ a na-apụghị ịgụta ọnụ,’ nwa agbọghọ Shunem kwuru na ya bụ “okooko safrọn nke puru n’ụsọ oké osimiri.” Ihe a o kwuru pụtara na ọ bụ okooko osisi na-enweghị ihe ọ bụ. Ọ dị umeala n’obi n’eziokwu. Ka a sịkwa ihe mere o ji “dị ka okooko lili nke puru n’etiti ahịhịa ogwu.” O ji obi ya niile na-efe Jehova. Onye ahụ na-azụ atụrụ ejighị ya egwu egwu.—Abụ Sọlọ. 2:1, 2; 6:8.

14. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye, gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe onye ahụ na-azụ atụrụ na nwa agbọghọ Shunem mere?

14 Jehova nyere Ndị Kraịst iwu ka ha lụọ di ma ọ bụ nwunye “naanị n’ime Onyenwe anyị.” (1 Kọr. 7:39) Ihe ọ pụtara bụ na Onye Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ  nwunye ekwesịghị ikwe ka onye na-abụghị Onye Kraịst rie ya obi. O kwesịrị ịlụ naanị onye ji obi ya niile na-efe Jehova. Olee uru ọ ga-abara di na nwunye? E nwere ọtụtụ nsogbu na-abịara di na nwunye kwa ụbọchị. Ma, ọ bụrụ na ha na Jehova dị n’ezigbo mma, ha ga na-ebi n’udo, obi ana-adịkwa ha ụtọ. N’ihi ya, ọ bụrụ na ị chọrọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye, mee ihe onye ahụ na-azụ atụrụ na nwa agbọghọ Shunem mere. Chọọ onye nwere ezigbo àgwà na onye hụrụ Jehova n’anya n’eziokwu.

Onye Kraịst ekwesịghị ikwe ka onye na-abụghị Onye Kraịst rie ya obi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)

“NWAANYỊ M NA-ALỤ ỌHỤRỤ BỤ UBI A GBARA OGIGE MA KPỌCHIE”

15. Gịnị mere ihe nwa agbọghọ Shunem mere ji kwesị ịkụziri Ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ezigbo ihe?

15 Gụọ Abụ Sọlọmọn 4:12. Gịnị mere onye ahụ na-azụ atụrụ ji kwuo na nwa agbọghọ ahụ ọ hụrụ n’anya bụ “ubi a gbara ogige ma kpọchie”? Ọ bụghị onye ọ bụla nwere ike ịbanye n’ubi a gbara ogige ma kpọchie. Ọ bụ naanị n’ebe ahụ a kpọchiri akpọchi ka a ga-esi banye na ya. Nwa agbọghọ Shunem yiri ụdị ebe ahụ n’ihi na onye obi ya dị n’ebe ọ nọ bụ naanị onye ahụ ga-alụ ya, ya bụ, onye ahụ na-azụ atụrụ. Mgbe eze chọrọ ịrata ya, o kweghị ege ya ntị. O si otú ahụ gosi na ya bụ “mgbidi,” ọ bụghị “ibo ụzọ” na-emeghere onye ọ bụla kwara ya aka. (Abụ Sọlọ. 8:8-10) Mmadụ abụọ bụ́ Ndị Kraịst chọọ ịlụ, ọ bụ otú ahụ ka ha kwesịrị ime. Ha ekwesịghị ikwe ka onye ọzọ rie ha obi ma ọ bụ nwewe mmasị n’onye ọzọ.

16. Ọ bụrụ na e nwere onye ị chọrọ ịlụ gị na ya na-akpa, olee ihe i kwesịrị ịmụta n’Abụ Sọlọmọn?

16 Mgbe onye ahụ na-azụ atụrụ gwara nwa agbọghọ Shunem ka o soro ya gagharịa, ụmụnne ya ndị nwoke ekweghị ya gaa. Ha nyere ya ọrụ ilekọta ubi vaịn ha. N’ihi gịnị? Ọ̀ bụ n’ihi na ha atụkwasịghị ya obi? Ọ̀ ga-abụ na ha chere na ọ chọrọ ịga mee omume rụrụ arụ? Nke bụ́ eziokwu bụ na ha achọghị ka nwanne ha nwaanyị gaa ebe nwere ike ime ka ọnwụnwa bịara ya. (Abụ Sọlọ. 1:6; 2:10-15) N’ihi ya, e nwere ezigbo ihe Ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye kwesịrị ịmụta n’ihe a ha mere. Mgbe ha na onye ha chọrọ ịlụ na-akpa, ha kwesịrị ịgbalịsi ike ka ha ghara ime omume rụrụ arụ. Ha ekwesịghị ịga ebe ha ga-anọ naanị ha. Ọ bụ eziokwu na ikwu ihe gosiri na ha hụrụ ibe ha n’anya abụghị ihe ọjọọ, ha ekwesịghị ime ihe ọ bụla ga-eme ka ha mee omume rụrụ arụ.

17, 18. Olee ihe ị mụtara n’Abụ Sọlọmọn?

17 Jehova achọghị ka di na nwunye tisaa. Ọ chọrọ ka ha hụ ibe ha n’anya. Mgbe ha abụọ lụrụ ọhụrụ, a naghị ajụ ajụ ma hà hụkwara ibe ha n’anya. Ma, ọ bụrụ na ha achọghị itisa, ha kwesịrị ịna-eme ka ịhụnanya ha sie ezigbo ike. Ha mee otú ahụ, ịhụnanya ha ga-adị ka ọkụ na-anaghị anyụ anyụ.—Mak 10:6-9.

18 Ọ bụrụ na ị na-achọ onye ị ga-alụ, i kwesịrị ịchọ onye ị ga-ahụ n’anya n’eziokwu, na-agbakwa mbọ ka ịhụnanya ahụ ghara ịnyụ ka ọkụ. N’Abụ Sọlọmọn, anyị mụtara na nwoke na nwaanyị nwere ike ịhụ ibe ha n’anya n’eziokwu nakwa na ịhụnanya ha nwere ike ịdịgide adịgide. Ma ị̀ lụọla ma ị̀ ka na-achọ onye ị ga-alụ, i nwere ike inwe ezigbo ịhụnanya, nke Baịbụl kpọrọ “ire ọkụ nke Jaa.”—Abụ Sọlọ. 8:6.

^ para. 2 Gụọ Ụlọ Nche, Jenụwarị 15, 2007, peeji nke 31.