Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JENỤWARỊ 2015

Otú Di na Nwunye Ga-esi Na-adịkwu ná Mma ma Na-enwe Obi Ụtọ

Otú Di na Nwunye Ga-esi Na-adịkwu ná Mma ma Na-enwe Obi Ụtọ

“Ọ bụrụ na Jehova ewughị ụlọ, ọ bụ n’efu ka ndị na-ewu ya na-arụsi ọrụ ike na ya.”ỌMA 127:1a.

1-3. Olee ihe ụfọdụ nwere ike ịkpa di na nwunye aka ọjọọ? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

E NWERE otu nwoke lụrụ nwaanyị kemgbe iri afọ atọ na asatọ. Ya na nwunye ya bi n’udo kemgbe ahụ. O kwuru, sị: “Ọ bụrụ na i ji obi gị niile na-agba mbọ ma gosi na ị chọrọ ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị na-enwe obi ụtọ, Jehova ga-agọzi gị.” N’eziokwu, di na nwunye nwere ike ịna-enwe obi ụtọ ma na-akwado ibe ha mgbe ihe siri ezigbo ike.—Ilu 18:22.

2 Ma, mgbe ụfọdụ, di na nwunye nwere ike inwe nsogbu. Baịbụl kpọrọ ya “mkpagbu n’anụ ahụ́ ha.” (1 Kọr. 7:28) Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na nsogbu ndị a na-enwe kwa ụbọchị nwere ike ịkpa di na nwunye aka ọjọọ. Ha abụọ ezughị okè. N’ihi ya, ha nwere ike ime ihe ga-ewute ibe ha ma ọ bụkwanụ ghara ịna-ekwurịta okwu nke ọma. (Jems 3:2, 5, 8) Ọtụtụ di na nwunye na-arụ ọrụ ego na-eri ha oge, nweekwa ụmụ ha na-azụ. Nchegbu na ike ọgwụgwụ na-eme ka o siere ụfọdụ di na nwunye ike inwe oge ha ga-eji na-eme ihe ndị ga-eme ka ha dịkwuo ná mma. Ụkọ ego, ọrịa, ma ọ bụ nsogbu ndị ọzọ nwere ike iji nwayọọ nwayọọ mee ka ịhụnanya ha nyụwa ka ọkụ, meekwa ka ha ghara ịna-akwanyechara  ibe ha ùgwù. Ihe ọzọ bụ na o nwere ike iyi ka di na nwunye hà dị n’ezigbo mma, ma ụfọdụ n’ime ihe Baịbụl kpọrọ “ọrụ nke anụ ahụ́” emee ka ha tisaa, ya bụ, ịkwa iko, omume rụrụ arụ, ibu iro, esemokwu, ekworo, iwe ọkụ, na ndọrọ ndọrọ.—Gal. 5:19-21.

3 Ihe mere nsogbu ji na-aka njọ bụ na “n’oge ikpeazụ” a, ndị mmadụ na-achọ naanị ọdịmma onwe ha. Ha anaghị asọpụrụ Chineke. Àgwà ọjọọ ndị a na-eme ka di na nwunye ghara ịna-ebi n’udo. (2 Tim. 3:1-4) E nwekwara onye iro obi tara mmiri nke kpebisiri ike ime ka di na nwunye tisaa. Ọ bụ ya mere Pita onyeozi ji dọọ anyị aka ná ntị, sị: “Onye mmegide unu, bụ́ Ekwensu, na-ejegharị dị ka ọdụm na-ebigbọ ebigbọ, na-achọ onye ọ ga-eripịa.”—1 Pita 5:8; Mkpu. 12:12.

4. Gịnị ga-eme ka di na nwunye na-adị ná mma, na-enwekwa obi ụtọ?

4 Otu nwoke bi na Japan kwuru, sị: “O nwere mgbe o siiri m ezigbo ike ịkpata ego ga na-ezuru anyị. Agwaghị m nwunye m ihe na-emenụ. N’ihi ya, ọ malitere ichegbu onwe ya. Ihe ọzọ bụ na ọrịa kpara ya aka ọjọọ n’oge na-adịghị anya. Nsogbu a niile mere ka mụ na ya see okwu mgbe ụfọdụ.” Di na nwunye ga-enwe nsogbu mgbe ụfọdụ. Ma, ha nwere ike idozi ya. N’ike Jehova, ha nwere ike ịna-adịkwu ná mma, na-enwekwa obi ụtọ. (Gụọ Abụ Ọma 127:1.) Ka anyị tụlee ihe ise ga-enyere di na nwunye aka ịna-adịkwu ná mma ma ghara itisa. Anyị ga-atụlekwa otú ịhụnanya ga-esi mee ka ha na-adịkwu ná mma.

MEENỤ KA JEHOVA BỤRỤ ONYE NKE ATỌ N’ALỤMDI NA NWUNYE UNU

5, 6. Gịnị ka di na nwunye ga-eme ka Chineke bụrụ onye nke atọ n’alụmdi na nwunye ha?

5 Ọ bụ Jehova malitere alụmdi na nwunye. N’ihi ya, ọ bụrụ na di na nwunye ji obi ha niile na-erubere ya isi, ha ga na-ebi n’udo. (Gụọ Ekliziastis 4:12.) Di na nwunye kwesịrị ime ka Jehova bụrụ onye nke atọ n’alụmdi na nwunye ha. Otú ha ga-esi eme ya bụ ịna-eme ihe o kwuru. Baịbụl kwuru banyere ndị Chineke n’oge ochie, sị: “Ntị gị ga-anụkwa okwu n’azụ gị, sị: ‘Lekwa ụzọ. Jeenụ ije na ya,’ ma ọ bụrụ na unu ahapụ ya gaa n’aka nri ma ọ bụ gaa n’aka ekpe.” (Aịza. 30:20, 21) Taa, otú di na nwunye nwere ike isi ‘na-anụ’ olu Jehova bụ ịna-agụkọ Okwu ya ọnụ. (Ọma 1:1-3) Ihe ọzọ ha ga-eme ka ha nwee ike ịna-adịkwu ná mma bụ ịna-enwe Ofufe Ezinụlọ otú ọ ga na-atọ ha ụtọ ma na-eme ka okwukwe ha sikwuo ike. Ọ bụrụkwa na ha na-ekpekọ ekpere ọnụ kwa ụbọchị, ha ga-enwe ike imeri n’ọgụ ụwa Setan na-alụso ndị di na nwunye taa.

Ọ bụrụ na di na nwunye na-emekọ ihe gbasara ofufe Chineke ọnụ, ha na Chineke ga na-adịkwu ná mma. Ha ga na-ebi n’udo, na-enwekwa obi ụtọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5 na nke 6)

6 Otu nwanna bi na Jamanị aha ya bụ Gerhard kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla obi na-adịghị anyị mma n’ihi na anyị nwere nsogbu ma ọ bụ nghọtahie, ndụmọdụ si n’Okwu Chineke na-enyere anyị aka inwe ndidi ma gbaghara ibe anyị. Di na nwunye kwesịrị inwe àgwà abụọ a ma ọ bụrụ na ha chọrọ ịna-ebi n’udo.” Ọ bụrụ na di na nwunye agbalịsie ike ka Chineke bụrụ onye nke atọ n’alụmdi na nwunye ha, na-emekọkwa ihe gbasara ofufe Chineke ọnụ, ha na Chineke ga na-adịkwu ná mma. Di na nwunye ahụ ga na-ebi n’udo, na-enwekwa obi ụtọ.

NDỊ BỤ́ DI, BỤRỤNỤ NDỊ ISI EZINỤLỌ NWERE OBIỌMA

7. Olee otú di kwesịrị isi na-emeso nwunye ya ihe?

7 Otú onye bụ́ di si emeso nwunye ya nwere ike ime ka ha dịkwuo ná mma ma na-enwe obi ụtọ. Baịbụl kwuru, sị: “Kraịst bụ isi nke nwoke ọ bụla; nwoke bụkwa isi nke nwaanyị.” (1 Kọr. 11:3) Ihe ndị ọzọ Pọl kwuru gosiri otú di kwesịrị isi na-emeso nwunye ya ihe. O kwesịrị ịna-emeso ya otú ahụ Kraịst si emeso ndị na-eso ụzọ ya. Jizọs adịghị obi ọjọọ ma ọ bụ aka ike. O nwere  ịhụnanya na obiọma, nwee ezi uche, dịrị nwayọọ n’obi, dịkwa obi umeala.—Mat. 11:28-30.

8. Olee otú di ga-esi mee ka nwunye ya hụ ya n’anya ma na-akwanyere ya ùgwù?

8 Ndị Kraịst bụ́ di ekwesịghị ịna-agụrụ ya ndị nwunye ha ka egwú na ha kwesịrị ịna-akwanyere ha ùgwù. Kama, ha na ha kwesịrị ‘ịna-ebi dị ka ihe ọmụma si dị,’ ya bụ, ha kwesịrị ịna-echebara ha echiche. Ha kwesịrị ‘ịna-enye nwaanyị nsọpụrụ dị ka arịa na-esighị ike.’ (1 Pita 3:7) Di kwesịrị ịna-agwa nwunye ya okwu ọma, na-emekwara ya ebere ma mgbe naanị ha nọ ma mgbe ha na ndị ọzọ nọ. (Ilu 31:28) Ọ bụrụ na di na-emeso nwunye ya otú ahụ, nwunye ya ga-ahụ ya n’anya ma na-akwanyere ya ùgwù. Jehova ga-agọzikwa ha abụọ.

NDỊ BỤ́ NWUNYE, NA-ERUBERENỤ DI UNU ISI

9. Olee otú nwaanyị ga-esi gosi na ya na-erubere di ya isi?

9 Ọ bụrụ na anyị ji obi anyị niile hụ Jehova n’anya ma na-asọpụrụ iwu ya, ọ ga-eme ka anyị ‘weda onwe anyị n’okpuru aka ya dị ike.’ (1 Pita 5:6) Otú nwaanyị ga-esi gosi na ya na-akwanyere Jehova ùgwù bụ ịna-akwado di ya. Baịbụl kwuru, sị: “Unu ndị bụ́ nwunye, na-edonụ onwe unu n’okpuru di unu, dị ka o kwesịrị ekwesị n’ime Onyenwe anyị.” (Kọl. 3:18) Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị mgbe niile ka ihe di kpebiri ga-adị nwunye ya mma. Ma, ọ bụrụ na ọ daghị iwu Chineke, ezigbo nwaanyị ga-eji obi ya niile kwado ya.—1 Pita 3:1.

10. Gịnị mere nwunye kwesịrị iji na-erubere di ya isi?

10 Jehova nyere onye bụ́ nwunye ọrụ dị mkpa n’ezinụlọ. Ihe Baịbụl kwuru gosiri na ya na di ya kwesịrị ịna-arụkọ ọrụ. (Mal. 2:14) Mgbe a na-ekpebi ihe a ga-eme n’ezinụlọ, nwunye kwesịrị iji obiọma kwuo ihe o chere na otú obi dị ya. Ma, ọ ka kwesịrị irubere di ya isi. Nwoke ọ bụla ma ihe ga-ege ntị nke ọma mgbe nwunye ya na-ekwu okwu. (Ilu 31:10-31) Ọ bụrụ na nwunye na-erubere di ya isi, ọ ga-eme ka e nwee obi ụtọ, udo, na otu obi n’ezinụlọ. Obi ga-adịkwa di na nwunye ahụ ụtọ n’ihi na  ha ma na ha na-eme ihe Chineke kwuru.—Efe. 5:22.

NA-AGBAGHARANỤ IBE UNU KPAMKPAM

11. Gịnị mere di na nwunye kwesịrị iji na-agbaghara ibe ha?

11 Ọ bụrụ na di na nwunye achọghị itisa, ha kwesịrị ịmụta ịna-agbaghara ibe ha. Di na nwunye ga-adịkwu ná mma ma ọ bụrụ na ha ‘na-ediri ibe ha ihe ma na-agbaghara ibe ha kpamkpam.’ (Kọl. 3:13) Ma, ha agaghị adị ná mma ma ọ bụrụ na ọ na-abụ, otu onye mejọọ ibe ya, onye ahụ ana-agụkọ ya n’obi ya, ma jiri ya na-agba onye nke ọzọ ka akụ́. Ọ bụrụ na ahụ́ ụlọ ana-agbawasị, o nwere ike ime ka ụlọ ahụ ghara isi ike. Otú ahụ ka ibu iwe n’obi nwere ike isi mee ka o siere di na nwunye ike ịgbaghara ibe ha. Ma, di na nwunye ga na-adị n’ezigbo mma ma ọ bụrụ na ha na-agbaghara ibe ha otú ahụ Jehova na-agbaghara ha.—Maị. 7:18, 19.

12. Olee otú ịhụnanya si ekpuchi “ọtụtụ mmehie”?

12 Ezigbo ịhụnanya anaghị “agụkọ ihe ọjọọ” e mere ya. N’eziokwu, “ịhụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie.” (1 Kọr. 13:4, 5; gụọ 1 Pita 4:8.) Ihe ọ pụtara bụ na ọ bụrụ na anyị hụrụ ndị ọzọ n’anya, anyị ga na-agbaghara ha n’agbanyeghị ugboro ole ha mejọrọ anyị. Mgbe Pita onyeozi jụrụ Jizọs ugboro ole ọ ga-agbaghara mmadụ, Jizọs zara ya, sị: “Ruo ugboro iri asaa na asaa.” (Mat. 18:21, 22) Ihe a Jizọs kwuru gosiri na o nweghị ugboro ole ọ ga-abụ e mejọọ Onye Kraịst, ya abụrụ na o kwesịghị ịgbaghara.—Ilu 10:12. *

13. Gịnị ga-enyere anyị aka ịna-agbaghara di anyị ma ọ bụ nwunye anyị?

13 Otu nwanna nwaanyị bi na Jamanị aha ya bụ Annette kwuru, sị: “Ọ bụrụ na di na nwunye achọghị ịna-agbaghara ibe ha, ọ ga-eme ka ha na-eburu ibe ha iwe n’obi ma na-enyo ibe ha enyo. Ụdị ihe a na-etisa di na nwunye. Ma, ọ bụrụ na ha na-agbaghara ibe ha, ọ ga-eme ka ha dịkwuo ná mma ma na-emekọ ihe ọnụ.” Ihe ga-enyere gị aka ịna-agbaghara di gị ma ọ bụ nwunye gị bụ ịgba mbọ na-enwe obi ụtọ maka ihe ọma ọ na-eme, na-ekelekwa ya maka ya. Gbalịsie ike ka ị na-achọpụta ihe o mere ma jaa ya mma maka ya. (Kọl. 3:15) Unu mee otú ahụ, obi ga-eru unu ala, unu enwee otu obi. Chineke ga-agọzikwa unu.—Rom 14:19.

NA-AKPA ÀGWÀ ỌMA AHỤ JIZỌS KỤZIRI

14, 15. Olee àgwà ọma Jizọs kụziri? Olee uru ihe ahụ o kwuru ga-abara di na nwunye?

14 O doro anya na ị chọrọ ka a na-akwanyere gị ùgwù. Obi na-adị gị ụtọ ma mmadụ gee gị ntị ma gosi na ọ chọrọ ka obi dị gị mma. Ma, ị̀ nụtụla mgbe mmadụ sịrị, “M ga-eme ya ihe o mere m ka ọ mara otú ọ na-adị”? Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ịdị mgbe ụfọdụ ka ime otú ahụ ọ̀ dị mma, Baịbụl gwara anyị, sị: “Asịla: ‘Dị nnọọ ka o mere m, otú ahụ ka m ga-eme ya.’” (Ilu 24:29) Jizọs kụziiri anyị ụzọ kacha mma anyị ga-esi dozie nsogbu tara akpụ. Ọtụtụ ndị taa ma ihe o kwuru na Luk 6:31, ya bụ, “otú unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emeso unu, na-emesonụ ha otú ahụ.” Ihe a o kwuru pụtara na anyị kwesịrị ịna-emeso ndị ọzọ otú anyị chọrọ ka a na-emeso anyị, ọ bụghị imegwara ihe ọjọọ ha mere anyị. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-emere di anyị ma ọ bụ nwunye anyị ihe anyị chọrọ ka ọ na-emere anyị.

15 Di na nwunye ga na-adịkwu ná mma  ma ọ bụrụ na ha na-eme ihe gosiri na ha chọrọ ka obi dị ibe ha mma. Otu nwanna nwoke bi na Saụt Afrịka kwuru, sị: “Anyị na-agbalị ịkpa àgwà ọma ahụ Jizọs kụziri. Ọ bụ eziokwu na anyị na-akpasu ibe anyị iwe mgbe ụfọdụ, anyị na-agba mbọ emeso ibe anyị otú anyị chọrọ ka e meso anyị. Otú anyị si eme ya bụ ịna-akwanyere ibe anyị ùgwù.”

16. Olee ihe di na nwunye na-ekwesịghị ime ibe ha?

16 Akọrọla ndị ọzọ ihe di gị ma ọ bụ nwunye gị na-anaghị emeta. Ejila àgwà ya ndị na-ewe gị iwe na-agụ egwú, ọ bụrụgodị na ị na-egwu egwu. Cheta na di na nwunye ekwesịghị ịmawa aka ka a mara onye ka ike, onye a ga-aka anụ olu ya, ma ọ bụkwanụ onye ga-aka agwa ibe ya okwu ọjọọ. Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị niile ezughị okè. Anyị na-akpasukwa ndị ọzọ iwe mgbe ụfọdụ. Ma, o nweghị ihe kwesịrị ime ka mmadụ na-agwa di ya ma ọ bụ nwunye ya okwu ọjọọ ma ọ bụ na-akparị ya, ma ya fọdụzie ịkwa ya aka ma ọ bụ iti ya ihe.—Gụọ Ilu 17:27; 31:26.

17. Olee otú onye bụ́ di ga-esi na-akpa àgwà ọma ahụ Jizọs kụziri?

17 Ná mba ụfọdụ, ụmụ nwoke na-arụsa ndị nwunye ha arụrụala ma ọ bụ na-eti ha ihe iji gosi na ha siri ike. Ma, Baịbụl kwuru, sị: “Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ dị mma karịa dike, onye na-achịkwa mmụọ ya dịkwa mma karịa onye weghaara obodo.” (Ilu 16:32) Jizọs Kraịst bụ nwoke kacha ukwuu nke bitụrụla n’ụwa a. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-ejide onwe anyị otú ahụ o mere, anyị kwesịrị ikpebisi ike ime ihe ziri ezi. Nwoke ọ bụla nke na-agwa nwunye ya okwu ọjọọ ma ọ bụ na-eti ya ihe esighị ike. Ya na Jehova agaghị adịkwa ná mma. Ọbụ abụ bụ́ Devid bụ nwoke siri ike na onye nwere obi ike. Ma, o kwuru, sị: “Weenụ iwe, ma unu emehiela. Kwuonụ ihe unu chọrọ ikwu n’ime obi unu, n’elu ihe ndina unu, ma gba nkịtị.”—Ọma 4:4.

“YIRINỤ ỊHỤNANYA DỊ KA UWE”

18. Gịnị mere di na nwunye kwesịrị iji nwee ịhụnanya?

18 Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 13:4-7. Ịhụnanya bụ àgwà kacha mkpa di na nwunye kwesịrị inwe. Baịbụl kwuru, sị: “Yirinụ obi ọmịiko, obiọma, ịdị umeala n’obi, ịdị nwayọọ, na ogologo ntachi obi, dị ka uwe. Ma, e wezụga ihe ndị a niile, yirinụ ịhụnanya dị ka uwe, n’ihi na ọ bụ ihe nkekọ zuru okè nke ịdị n’otu.” (Kọl. 3:12, 14) Ọ bụrụ na di na nwunye nwere ụdị ịhụnanya ahụ Kraịst nwere ma ghara ịna-achọ naanị ọdịmma onwe ha, ọ ga-eme ka ha na-ebi n’udo. E nweghị nsogbu ga-eme ka ha tisaa, ọ sọkwa ya bụrụ ụkọ ego, ajọ ọrịa ma ọ bụ na otu onye na-akpa àgwà na-akpasu ibe ya iwe ma ọ bụkwanụ na ihe anaghị adabara onye nke nwoke na ndị ọgọ ya ma ọ bụ onye nke nwaanyị na ndị ezinụlọ di ya.

19, 20. (a) Olee ihe ga-enyere di na nwunye aka ịna-ebi n’udo ma na-enwe obi ụtọ? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

19 Di na nwunye ga na-ebi n’udo ma ọ bụrụ na ha hụrụ ibe ha n’anya, jiri obi ha niile na-akwado ibe ha, na-agbalịsikwa ike ka ihe na-aga aga. Ọ bụrụ na nsogbu abịara ha, otu onye ekwesịghị ịhapụ ibe ya gbafuo. Kama, ha kwesịrị ikpebisi ike ime ka ha abụọ na-adịkwu ná mma. Ọ bụrụ na ha hụrụ Jehova n’anya, hụkwa ibe ha n’anya, ha ga-ekpebisi ike idozi nsogbu ha n’ihi na “ịhụnanya adịghị ada ada.”—1 Kọr. 13:8; Mat. 19:5, 6; Hib. 13:4.

20 Ọ na-esiri ndị di na nwunye ike ịna-ebi n’udo ma na-enwe obi ụtọ, karịchaa ‘n’oge a dị oké egwu.’ (2 Tim. 3:1) Ma, ha ga-emeli otú ahụ n’ike Jehova. Ha kwesịrị ịgbalịsi ike ka ara mmekọahụ na-agba ụwa Setan ghara ịkpa ha aka ọjọọ. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụle ihe di na nwunye ga-eme ka ha ghara ime omume rụrụ arụ.

^ para. 12 Ọ bụ eziokwu na di na nwunye kwesịrị ịgba mbọ na-agbaghara ibe ha ma na-edozi nsogbu ọ bụla ha nwere, Baịbụl kwuru na ọ bụrụ na otu n’ime ha akwaa iko, onye nke aka ya dị ọcha nwere ike ikpebi ma ọ̀ ga-agbaghara ma ọ̀ ga-agba alụkwaghịm. (Mat. 19:9) Gụọ isiokwu bụ́ “Echiche nke Baịbụl: Ịkwa Iko Ndị Lụrụ Di Ma Ọ Bụ Nwunye—Ịgbaghara Ka Ọ̀ Bụ Ịghara Ịgbaghara?” na Teta! August 8, 1995.