Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) DISEMBA 2014

Anyị Kwesịrị Ịna-emekọ Ihe Ọnụ Ka Ọgwụgwụ Ụwa A Na-eru Nso

Anyị Kwesịrị Ịna-emekọ Ihe Ọnụ Ka Ọgwụgwụ Ụwa A Na-eru Nso

“Anyị bụ akụkụ dị iche iche nke otu ahụ́.”EFE. 4:25.

1, 2. Olee otú Chineke chọrọ ka ndị ya si na-efe ya, ma hà bụ ndị na-eto eto ma hà bụ ndị agadi?

Ị̀ BỤ onye na-eto eto? Ọ bụrụ na ị bụ, obi kwesịrị isi gị ike na ị bara uru n’ọgbakọ Jehova nke zuru ụwa ọnụ. N’ọtụtụ mba, ọ bụ ndị na-eto eto ka a kacha eme baptizim. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na ọtụtụ ndị na-eto eto na-ekpebi ife Jehova.

2 Ugbu a ị na-eto eto, obi ọ̀ na-adị gị ụtọ ma gị na ndị na-eto eto ibe gị nọrọ? O nwere ike ịbụ na obi na-adị gị ụtọ. Anyị na-enwe obi ụtọ ma anyị na ndị ọgbọ anyị nọrọ. Ma, Jehova chọrọ ka anyị soro ụmụnna anyị niile na-efe ya. Ọ chọrọ ka ndị ya dịrị n’otu n’agbanyeghị afọ ole ha dị ma ọ bụkwanụ otú ihe si dịrị ha. Pọl onyeozi kwuru na ọ bụ uche Chineke “ka a zọpụta ụdị mmadụ niile, ka ha nwetakwa ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” (1 Tim. 2:3, 4) Mkpughe 7:9 kwuru na ndị na-efe Chineke “si ná mba niile na ebo niile na ndị niile na asụsụ niile pụta.”

3, 4. (a) Olee àgwà e ji mara ọtụtụ ndị na-eto eto taa? (b) Olee ụdị àgwà anyị kwesịrị ịna-akpa, nke dabara adaba n’ihe Pọl kwuru ná Ndị Efesọs 4:25?

3 E nwere ezigbo ihe dị iche ná ndị na-eto eto na-efe Jehova na ndị nke na-anaghị efe ya. Ọtụtụ ndị na-anaghị efe Jehova na-achọ naanị ọdịmma onwe ha. Mkpa ha bụ ime ihe ga-abara  naanị onwe ha uru. Ụfọdụ ndị ọkachamara kwuru na ọ bụ n’oge anyị a ka ndị na-eto eto kacha achọ naanị ọdịmma onwe ha. Otú ha si ekwu okwu na otú ha si eji ejiji na-egosi na e nweghị ihe ha ji ndị tọrọ ha kpọrọ. Ha na-ele ha anya ka ndị na-amaghi nke a na-akọ.

4 Ụdị àgwà a juru eju n’ụwa taa. N’ihi ya, ọ naghị adịrị ndị na-eto eto mfe ime ihe dị Jehova mma ma ghara ịna-eme ka ndị ụwa. N’oge ndịozi Jizọs, Pọl dọrọ Ndị Kraịst aka ná ntị gbasara ụdị àgwà a. Ọ kpọrọ ya “mmụọ nke na-arụ ọrụ ugbu a n’ime ụmụ nnupụisi,” nke ha “jere ije na ha n’otu mgbe.” (Gụọ Ndị Efesọs 2:1-3.) Obi dị anyị ụtọ na a bịa n’ọgbakọ, e nwere ndị na-eto eto na-anaghị eme otú ahụ. Kama, ha chọrọ iso ụmụnna ha na-ejere Jehova ozi. Ha ghọtara na ọgbakọ yiri akụkụ ahụ́ dị iche iche nke na-arụkọ ọrụ ọnụ. Ụdị àgwà a dabara adaba n’ihe Pọl kwuru na “anyị bụ akụkụ dị iche iche nke otu ahụ́.” (Efe. 4:25) Ka ọgwụgwụ ụwa ochie a na-eru nso, ọ ga na-adịkwu mkpa ka anyị na ụmụnna anyị dịrị n’otu. Ka anyị tụlee ihe Baịbụl kọrọ gbasara ụfọdụ ndị. Ọ ga-enyere anyị aka ịghọta ihe mere anyị niile kwesịrị iji dị n’otu.

HA MEKỌRỌ IHE ỌNỤ

5, 6. Gịnị ka anyị mụtara n’otú Lọt na ụmụ ya ndị nwaanyị si mekọọ ihe ọnụ?

5 N’oge ochie, e nwere oge ụfọdụ ihe siiri ndị Chineke ezigbo ike. Jehova chebere ha mgbe ha ji otu obi nyere ibe ha aka. Ma ànyị ka na-eto eto ma ànyị emeela agadi, anyị nwere ike ịmụta ihe n’ihe Baịbụl kọrọ gbasara ụfọdụ n’ime ha. Otu onye n’ime ha bụ Lọt.

6 Lọt na ndị ezinụlọ ya nọ n’ezigbo nsogbu mgbe Chineke chọrọ ibibi Sọdọm bụ́ ebe ha bi. Chineke dunyere ndị mmụọ ozi ka ha gaa gwa Lọt ka o si n’obodo ahụ pụọ ma gbaga n’ebe bụ́ ugwu ugwu. Ha gwara Lọt, sị: “Gbalaga n’ihi mkpụrụ obi gị!” (Jen. 19:12-22) Lọt na ụmụ ya nwaanyị abụọ mere ihe a gwara ha. Ma, ọ dị mwute na ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ ya jụrụ ime ihe a gwara ha. Mgbe Lọt gwara ụmụ okorobịa chọrọ ịlụ ụmụ ya na ha kwesịrị isi n’obodo ahụ gbapụ, ọ dị ha ka Lọt ọ̀ bụ agadi nwoke “na-egwu egwu.” Ihe a ha mere tara isi ha. (Jen. 19:14) Ọ bụ naanị Lọt na ụmụ ya nwaanyị abụọ ka a na-egbughị n’ihi na ha rubeere Chineke isi, mekọọkwa ihe ọnụ.

7. Mgbe ndị Izrel ji otu obi si n’Ijipt pụọ, olee otú Jehova si nyere ha aka?

7 Ka anyị leba anya n’ihe atụ ọzọ. Mgbe ndị Izrel hapụrụ Ijipt, ha ekeghị onwe ha n’ìgwè n’ìgwè, ìgwè nke ọ bụla achọrọ ụzọ ọ ga-esi baa n’Ala Nkwa ahụ. Ha niile so gaa ogologo ije ma baa n’Ala Nkwa ahụ. Mgbe Mozis ‘setịrị aka ya n’elu oké osimiri uhie,’ Jehova emee ka oké osimiri ahụ kewaa abụọ, Mozis agafeghị naanị ya ma ọ bụ kpọrọ naanị ndị Izrel ole na ole gafee. Kama, ha niile sooro gafee, Jehova echebekwa ha. (Ọpụ. 14:21, 22, 29, 30) Ọtụtụ ndị na-abụghị ndị Izrel kpebidịrị ife Jehova ma soro ndị Izrel si n’Ijipt pụọ. Ha niile mekọrọ ihe ọnụ. (Ọpụ. 12:38) Ọ gaara abụ ihe jọgburu onwe ya ma a sị na ụfọdụ n’ime ha, ikekwe ndị na-eto eto, kpebiri itinye isi ebe ọzọ ma soro ụzọ ha chere ka mma. A sị na e nwere onye n’ime ha hapụrụ ndị ọzọ ma tinye isi ebe ọzọ, ì chere na Jehova gaara echebe ya?1 Kọr. 10:1.

8. N’oge Jehọshafat, olee otú ndị Chineke si gosi na ha dị n’otu?

8 N’oge Eze Jehọshafat, nnukwu ìgwè ndị agha siri ezigbo ike bịara ịlụso ndị Chineke ọgụ. Ha si ná mba ndị ha na ndị Izrel gbara agbata obi. (2 Ihe 20:1, 2) Ndị Chineke agaghị ka ha lụso ha ọgụ n’ike aka ha. Kama, ha rịọrọ Jehova ka o nyere ha aka. (Gụọ 2 Ihe E Mere 20:3, 4.) O nweghị mgbe onye nke ọ bụla gara mee otú dị ya mma. Kama, ha niile gbakọrọ aka.  Baịbụl kwuru, sị: “Ndị Juda niile guzo ọtọ n’ihu Jehova, ọbụna ụmụntakịrị ha, ndị nwunye ha na ụmụ ha.” (2 Ihe 20:13) Ha niile, ma ụmụaka ma ndị agadi, ji otu obi mee ihe Jehova kwuru, Jehova anapụta ha n’aka ndị iro ha. (2 Ihe 20:20-27) Ihe atụ a ó gosighị na ndị Chineke nwere ike imeri nsogbu ndị bịaara ha ma ọ bụrụ na ha emekọọ ihe ọnụ?

9. Gịnị ka anyị ga-amụta n’aka Ndị Kraịst oge mbụ?

9 Ihe e ji mara Ndị Kraịst oge mbụ bụ na ha na-emekọ ihe ọnụ. Dị ka ihe atụ, mgbe ọtụtụ ndị Juu na ndị mba ọzọ ghọrọ Ndị Kraịst, ha niile ‘nọ na-ege ntị n’ozizi ndịozi, ha na ibe ha ana-ekerịta ihe, na-erikọ nri, na-ekpekọkwa ekpere.’ (Ọrụ 2:42) Mgbe a na-akpagbu ha, ha gosiri na ha dị n’otu. Ọ bụ mgbe ahụ ka ha kwesịrị inyere ibe ha aka karịchaa. (Ọrụ 4:23, 24) Í cheghị na anyịnwa kwesịkwara ịna-emekọ ihe ọnụ mgbe ihe siri ezigbo ike?

ANYỊ KWESỊRỊ ỊDỊ N’OTU TUPU ỤBỌCHỊ JEHOVA ABỊA

10. Olee mgbe ọ ga-akacha mkpa ka ndị Chineke dịrị n’otu?

10 N’oge na-adịghị anya, ihe ga-esi ezigbo ike n’ụwa a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Joel onye amụma kpọrọ oge ahụ “ụbọchị ígwé ojii na oké ọchịchịrị.” (Joel 2:1, 2; Zef. 1:14) Ọ bụ n’oge ahụ karịchaa ka ndị Chineke kwesịrị ịdị n’otu. Cheta na Jizọs kwuru, sị: “Alaeze ọ bụla nke kewara wee na-emegide onwe ya na-atọgbọrọ n’efu.”Mat. 12:25.

11. Gịnị ka ndị Chineke ga-amụta gbasara ịdị n’otu n’ihe e kwuru n’Abụ Ọma 122:3, 4? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

11 Anyị kwesịrị ịdị n’otu mgbe ahụ ihe ga-ata ezigbo akpụ n’ụwa. Anyị nwere ike iji otú anyị kwesịrị isi dịrị n’otu tụnyere otú e si arụ ụlọ na Jeruselem oge ochie. Ha na-arụkọ ụlọ ha ọnụ. Ọ bụ ya mere otu ọbụ abụ ji kwuo na Jeruselem bụ “obodo nke e jikọtara ọnụ ka ọ bụrụ otu.” Otú a ha si arụkọta ụlọ ọnụ mere ka ndị bi na ya nyere ibe ha aka ma chebe ibe ha. O nwekwara ike ịbụ na otú ụlọ ndị ahụ si dịkọta ọnụ mere ka ọbụ abụ ahụ cheta mgbe ebo niile dị n’Izrel bịakọtara ọnụ ka ha fee Jehova. (Gụọ Abụ Ọma 122:3, 4.) Anyị kwesịrị ịna-emekọ ihe ọnụ ugbu a nakwa mgbe ihe ga-esi ezigbo ike n’ọdịnihu.

12. Gịnị ga-enyere anyị aka ịlafere mgbe Gọg ga-alụso ndị Chineke ọgụ?

12 Gịnị mere ịdị n’otu anyị ga-eji baara anyị uru n’ọdịnihu? Ezikiel isi iri atọ na asatọ buru amụma na “Gọg nke ala Megọg” ga-alụso ndị Chineke ọgụ. Anyị ekwesịghị ikwe ka e nwee ihe ga-eme ka anyị ghara ịdị n’otu n’oge ahụ. N’oge ahụ, o doro anya na anyị agaghị agbakwuru ụwa Setan ka o nyere anyị aka. Kama, anyị ga-achọ ịnọ ụmụnna anyị nso. Ihe mere a ga-eji chebe anyị abụghị naanị maka na anyị nọkọtara ọnụ. Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi ma rubere ya isi. Ọ bụ mgbe anyị mere otú ahụ ka Jehova na Jizọs ga-anapụta anyị ma kpọba anyị n’ụwa ọhụrụ. (Joel 2:32; Mat. 28:20) Ma, anyị na ụmụnna anyị kwesịkwara ịdị n’otu. Ì chere na Jehova ga-echebe ndị hapụrụ ụmụnna ha ma kpebie itinye isi ebe ọzọ?Maị. 2:12.

13. Gịnị ka ndị na-eto eto kwesịrị ịmụta n’ihe ndị anyị tụlerela n’isiokwu a?

13 Ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto, ị̀ hụrụ ihe mere o ji dị ezigbo mkpa ka ị nọrọ ụmụnna gị nso? Gbalịa ka ndị gị na ha na-akpa ghara ịbụ naanị ndị ọgbọ gị. Agbakwarala ụmụnna gị ọsọ. N’oge na-adịghị anya, enyemaka ụmụnna anyị ga-adị anyị mkpa, ma ànyị bụ ndị na-eto eto ma ànyị bụ ndị agadi. Ọ bụ ugbu a ka anyị kwesịrị ime ka anyị na ụmụnna anyị dị n’ezigbo mma ma soro ha na-efe Jehova. Ọ bụrụ na anyị na ụmụnna anyị adịrị n’otu, ọ ga-eme ka e chebe anyị n’ọdịnihu.

 ANYỊ BỤ “AKỤKỤ AHỤ́ NDỊ DỊỊRỊ IBE ANYỊ”

14, 15. (a) Gịnị mere Jehova ji na-azụ anyị niile taa ka anyị dịrị n’otu? (b) Gịnị ka Jehova gwara anyị, nke ga-eme ka anyị dịrị n’otu?

14 Jehova na-enyere anyị aka ka anyị “jiri otu obi na-efe ya ofufe.” (Zef. 3:8, 9) Ọ na-azụ anyị maka ọdịnihu, mgbe ọ ‘ga-achịkọtaghachi ihe niile n’ime Kraịst.’ (Gụọ Ndị Efesọs 1:9, 10.) Ọ chọrọ ka ndị niile nọ n’eluigwe na ndị niile nọ n’ụwa dịrị n’otu ma na-efekọ ya ọnụ. O doro anya na ọ ga-emezu ihe a o bu n’obi. Ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto, i nwere ike iso n’ezinụlọ Chineke ruo mgbe ebighị ebi. Ị̀ chọrọ iso nzukọ Jehova na-emekọ ihe ọnụ?

15 Jehova na-azụ anyị ka anyị dịrị n’otu ugbu a n’ihi na ọ ga-eme ka anyị na ibe anyị biri n’udo n’ụwa ọhụrụ. Ugboro ugboro, Akwụkwọ Nsọ gwara anyị ka anyị ‘na-elekọta ibe anyị,’ ‘na-enwe obi ọmịiko n’ebe ibe anyị nọ,’ ‘na-akasirịta ibe anyị obi,’ nakwa ka anyị ‘na-ewulirịta ibe anyị elu.’ (1 Kọr. 12:25; Rom 12:10; 1 Tesa. 4:18; 5:11) Jehova ma na ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, o nwere ike isiri anyị ike ịdị n’otu mgbe ụfọdụ. Ọ bụ ya mere o ji gwa anyị ka anyị gbaa mbọ ‘na-agbaghara ibe anyị kpamkpam.’Efe. 4:32.

16, 17. (a) Olee otu ihe mere anyị ji aga ọmụmụ ihe Ndị Kraịst? (b) Gịnị ka ndị na-eto eto nwere ike ịmụta n’aka Jizọs?

16 Jehova ji ọmụmụ ihe Ndị Kraịst na-enyekwara anyị aka ka anyị dịrị n’otu. Anyị na-agụkarị ihe e kwuru ná Ndị Hibru 10:24, 25. Otu ihe mere anyị ji aga ọmụmụ ihe bụ ka anyị nwee ike ‘ịna-echebara ibe anyị echiche iji kpalie ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ.’ Ma, otu ihe anyị na-ekwesịghị ichefu bụ na anyị na-aga ọmụmụ ihe ka anyị nwee ike ‘ịna-agbarịta ibe anyị ume, na-emekwa otú ahụ karị, ka anyị na-ahụ ụbọchị ahụ ka ọ na-eru nso.’

17 Anyị ga-amụta ihe n’aka Jizọs n’ihi na mgbe ọ na-eto eto, iso ndị Jehova zukọọ na-atọ ya ụtọ. Mgbe ọ dị afọ iri na abụọ, o so papa ya na mama ya gaa nzukọ e nwere n’ụlọ nsọ. Ọtụtụ ndị bịara ya. E nwere mgbe o ruru, papa ya na mama ya ahụghịzi ya. Ọ bụghị maka na ọ gawara ka ya na ndị na-eto eto ibe ya nọrọ. Kama, mgbe Josef na Meri hụrụ ya, ya na ndị na-akụzi ihe n’ụlọ nsọ nọ na-ekwurịta ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ.Luk 2:45-47.

18. Olee otú ekpere ga-esi mee ka anyị dịkwuo n’otu?

18 Ihe ga-eme ka anyị dịkwuo n’otu abụghị naanị ịhụ ụmụnna anyị n’anya  na ịna-aga ọmụmụ ihe Ndị Kraịst. Anyị kwesịkwara ịna-ekpe ekpere ka Chineke nyere ụmụnna anyị aka. Ọ bụrụ na anyị akpọọ okwu aha mgbe anyị na-ekpe ekpere ma gwa Jehova ihe anyị chọrọ ka o meere ụmụnna anyị, ọ ga-eme ka anyị ghọtakwuo na anyị kwesịrị ịna-echebara ibe anyị echiche. Ọ bụghị naanị ndị torola eto kwesịrị ịna-eme ihe ndị a. Ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto, ị̀ gbaala mbọ mee ihe ndị a ka gị na ndị nọ n’ọgbakọ unu nwee ike ịdịkwu ná mma? Ihe ga-enyere anyị aka ịlafere mgbe ọgwụgwụ ga-abịa bụ anyị na ụmụnna anyị ịna-emekọ ihe ọnụ, ọ bụghị anyị na ụwa Setan.

Anyị niile nwere ike ikpe ekpere ka Jehova nyere ụmụnna anyị aka (A ga-akọwa ya na paragraf nke 18)

OTÚ ANYỊ GA-ESI GOSI NA ANYỊ BỤ “AKỤKỤ AHỤ́ NDỊ DỊỊRỊ IBE ANYỊ”

19-21. (a) Olee ụzọ pụrụ iche anyị si egosi na anyị bụ “akụkụ ahụ́ ndị dịịrị ibe anyị”? Nye ihe atụ. (b) Gịnị ka ị mụtara n’otú ụmụnna anyị si nyere ibe ha aka mgbe ọdachi mere?

19 Ndị Jehova na-eme ihe e kwuru ná Ndị Rom 12:5. Ebe ahụ sịrị na anyị bụ “akụkụ ahụ́ ndị dịịrị ibe anyị.” Otú anyị si enyere ụmụnna anyị aka ma ọdachi mee gosiri na ọ bụ eziokwu. N’ọnwa iri na abụọ n’afọ 2011, e nwere oké mmiri ozuzo n’agwaetiti a na-akpọ Mindanao dị na Filipinz. N’otu abalị naanị, mmiri riri ihe karịrị iri puku ụlọ anọ. Ọtụtụ ụlọ ụmụnna anyị so n’ụlọ ndị ahụ. Ma, alaka ụlọ ọrụ anyị dị n’ebe ahụ kwuru na tupu kọmitii na-enyere ndị ọdachi dakwasịrị aka erute, “ụmụnna ndị si n’ebe ndị ọzọ ezitewela ihe enyemaka.”

20 Mgbe ala ọma jijiji mere n’oké osimiri ma mee ka mmiri mebisịa ihe n’ebe ọwụwa anyanwụ Japan, ọtụtụ ụmụnna anyị tara ezigbo ahụhụ. E nwedịrị ndị nke na-enweghịzi ihe ọ bụla. Dị ka ihe atụ, ala ọma jijiji ahụ lara ụlọ otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Yoshiko n’iyi. Isi n’ebe nwanna nwaanyị ahụ bi ruo n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị ihe dị ka iri kilomita anọ. O kwuru, sị: “O juru anyị anya na mgbe ala ọma jijiji ahụ mechara, onye nlekọta sekit na nwanna nwoke ọzọ chọ anyị bịa n’echi ya.” Nwanna nwaanyị ahụ chịrị ọchị ma kwuo, sị: “Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Jehova si n’ọgbakọ ya gbaa anyị ume. E nyekwara anyị kootu, akpụkpọ ụkwụ, akpa, na uwe e ji ehi ụra.” Otu nwanna so na kọmitii na-ahụ maka inyere ụmụnna ndị a aka kwuru, sị: “Ụmụnna ndị si n’ebe dị iche iche n’obodo Japan ji otu obi nyere ibe ha aka. E nwedịrị ụmụnna ndị si Amerịka bịa nye aka. Mgbe anyị jụrụ ha ihe mere ha ji bịa n’agbanyeghị na Amerịka dị ezigbo anya, ha kwuru, sị, ‘Anyị na ụmụnna anyị ndị bi na Japan dị n’otu, e kwesịkwara inyere ha aka.’ ” Obi ọ́ dịghị gị ụtọ na i so ná nzukọ ndị nọ na ya hụrụ ibe ha n’anya n’eziokwu? Obi kwesịrị isi gị ike na obi na-adị Jehova ụtọ ma ọ hụ na anyị dị n’otu.

21 Ọ bụrụ na anyị adịrị n’otu ugbu a, ọ ga-enyere anyị aka iji otu obi die nsogbu ndị ga-abịara anyị n’ọdịnihu, ọ bụrụgodị na e nwee ihe mere ka anyị na ụmụnna anyị nọ ná mba ndị ọzọ ghara ịna-emekọ ihe. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ ga-enyere anyị aka ijikere ejikere maka nsogbu ndị nwere ike ịbịara anyị ka ụwa ochie a na-eru ọgwụgwụ ya. Na Japan, e nwere otu nwanna nwaanyị ajọ ifufe mebiri ihe ya. Aha ya bụ Fumiko. O kwuru, sị: “Ọgwụgwụ dị ezigbo nso. Anyị kwesịrị ịna-enyere ụmụnna anyị aka ka anyị na-atụ anya mgbe a na-agaghịzi enwe ọdachi.”

22. Olee uru ịdị n’otu ga-abara anyị n’ọdịnihu?

22 Ọ bụrụ na anyị niile agbaa mbọ dịrị n’otu ugbu a, ọ pụtara na anyị ejikerela ịlanahụ mgbe a ga-ebibi ụwa ọjọọ a na-adịghị n’otu. Chineke anyị ga-anapụta ndị ya otú ahụ o si napụta ndị fere ya n’oge ochie. (Aịza. 52:9, 10) Buru n’obi mgbe niile na i nwere ike iso ná ndị Chineke ga-anapụta ma ọ bụrụ na ị gbaa mbọ soro ndị ya dịrị n’otu. Ihe ọzọ ga-enyere gị aka bụ iji ihe Chineke nyere anyị kpọrọ ihe. Ọ bụ ya ka anyị ga-eleba anya n’isiokwu na-esonụ.