Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) DISEMBA 2014

‘Geenụ Ntị, Ghọtakwanụ Ihe Okwu Ndị A Pụtara’

‘Geenụ Ntị, Ghọtakwanụ Ihe Okwu Ndị A Pụtara’

“Geenụ m ntị, unu niile, ghọtakwanụ ihe okwu m pụtara.”MAK 7:14.

1, 2. Gịnị mere na ọtụtụ ndị nụrụ okwu Jizọs aghọtaghị ihe okwu ya pụtara?

Ọ BỤRỤ na mmadụ na-agwa anyị okwu, anyị nwere ike ịnụ olu ya. Anyị nwedịrị ike ịmata ụda olu ya. Ma, olee uru ọ ga-abara anyị ma ọ bụrụ na anyị aghọtaghị ihe o kwuru? (1 Kọr. 14:9) Ọtụtụ puku mmadụ nụkwara ihe Jizọs na-ekwu. Ọ gwadịrị ha okwu n’asụsụ ha na-aghọta. Ma, ọ bụghị ha niile ghọtara ihe okwu ya pụtara. Ọ bụ ya mere Jizọs ji kwuo, sị: “Geenụ m ntị, unu niile, ghọtakwanụ ihe okwu m pụtara.”Mak 7:14.

2 Gịnị mere ọtụtụ ndị aghọtaghị ihe Jizọs kwuru? Ụfọdụ n’ime ha achọghị ịgbanwe echiche ha na ihe ọjọọ ha bu n’obi. Jizọs gwara ha, sị: “Unu ji akọ na-eleghara ihe Chineke nyere n’iwu anya ka unu wee na-edebe ọdịnala unu.” (Mak 7:9) Ha agbaghị mbọ ọ bụla ka ha ghọta ihe okwu Jizọs pụtara. Ha achọghị ịgbanwe omume ha na echiche ha. Ntị ha ghere oghe, ma obi ha kpọchiri akpọchi. (Gụọ Matiu 13:13-15.) Ma, olee otú anyị ga-esi gbaa mbọ ka obi anyị ghere oghe ka ihe Jizọs na-akụzi nwee ike ịbara anyị uru?

 OTÚ IHE JIZỌS KỤZIRI GA-ESI BAARA ANYỊ URU

3. Gịnị mere ndị na-eso ụzọ Jizọs ji ghọta ihe ọ kụziri?

3 Anyị kwesịrị ime ka ndị na-eso ụzọ Jizọs, bụ́ ndị dị umeala n’obi. Jizọs gwara ha, sị: “Obi ụtọ na-adịrị anya unu n’ihi na ha na-ahụ ụzọ, na ntị unu n’ihi na ha na-anụ ihe.” (Mat. 13:16) Gịnị mere ha ji ghọta ihe Jizọs kụziri, ma ndị ọzọ aghọtaghị ya? E nwere ihe atọ kpatara ya. Nke mbụ bụ na ha jụrụ ajụjụ ma gbaa mbọ ka ha ghọta ihe okwu Jizọs pụtara. (Mat. 13:36; Mak 7:17) Nke abụọ bụ na ha dị njikere ịmụta ihe tụkwasị na nke ha ma ama. (Gụọ Matiu 13:11, 12.) Nke atọ abụrụ na ha dị njikere iji ihe ha nụrụ na ihe ha ghọtara nyere ma onwe ha ma ndị ọzọ aka.Mat. 13:51, 52.

4. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịghọta ihe atụ ndị Jizọs mere, olee ihe atọ anyị kwesịrị ime?

4 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịghọta ihe atụ ndị Jizọs mere, e nwere ihe atọ anyị kwesịrị ime, bụ́ ndị yiri ihe ndị ahụ ndị na-eso ụzọ ya mere. Nke mbụ bụ na anyị kwesịrị iwepụta oge na-amụ gbasara ihe ndị Jizọs kụziri, na-echebara ha echiche, na-eme nchọnchọ ma na-ajụ ajụjụ ndị dabara adaba. Ọ ga-eme ka anyị nweta ihe ọmụma. (Ilu 2:4, 5) Nke abụọ bụ na anyị kwesịrị ịchọpụta otú ihe anyị mụtara na ihe anyị mabu si yie nakwa otú ọ ga-esi baara anyị uru. Ọ ga-eme ka anyị nwee nghọta. (Ilu 2:2, 3) Nke atọ abụrụ na anyị kwesịrị ịna-eme ihe anyị mụtara. Anyị mee otú ahụ, ọ ga-egosi na anyị nwere amamihe.Ilu 2:6, 7.

5. Olee ihe atụ gosiri ihe dị iche n’ihe ọmụma, nghọta, na amamihe?

5 Olee ihe dị iche n’ihe ọmụma, nghọta, na amamihe? E nwere ike iji ihe atụ mee ka o doo anya. Ka e were ya na ị chọrọ ịgafe okporo ụzọ, gị ahụ ụgbọala ji oké ọsọ na-abịa. Ọ bụ ya bụ ihe ọmụma. Ihe ọzọ bụ na ị ghọtara na ọ bụrụ na ị gafewe, ụgbọala ahụ ga-akụtu gị. Ọ bụ ya bụ nghọta. N’ihi ya, ị ga-echere ka ụgbọala ahụ gbafere. Ọ bụ ya bụ amamihe. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji gwa anyị ka anyị “chekwaa ezi amamihe” n’ihi na ọ ga-eme ka anyị dị ndụ.Ilu 3:21, 22; 1 Tim. 4:16.

6. Olee ajụjụ anọ anyị ga-ajụ ka anyị na-atụle ihe atụ asaa Jizọs mere? (Kwuo ihe dị n’ igbe dị n’isiokwu a.)

6 N’isiokwu a nakwa na nke na-eso ya, anyị ga-eleba anya n’ihe atụ asaa Jizọs mere. Ka anyị na-atụle ihe atụ nke ọ bụla, anyị ga-ajụ ajụjụ ndị a: Gịnị ka ihe atụ a pụtara? (Ọ ga-eme ka anyị nweta ihe ọmụma.) Gịnị mere Jizọs ji mee ihe atụ a? (Ọ ga-eme ka anyị nwee nghọta.) Olee otú anyị ga-esi jiri ihe anyị mụtara nyere ma onwe anyị ma ndị ọzọ aka? (Ọ ga-egosi na anyị nwere amamihe.) Nke ikpeazụ bụ, gịnị ka ọ na-akụziri anyị gbasara Jehova na Jizọs?

MKPỤRỤ OSISI MỌSTAD

7. Gịnị ka ihe atụ Jizọs mere gbasara mkpụrụ osisi mọstad pụtara?

7 Gụọ Matiu 13:31, 32. Gịnị ka ihe atụ a Jizọs mere gbasara mkpụrụ osisi mọstad pụtara? Mkpụrụ osisi mọstad nọchiri anya ozi ọma Alaeze Chineke anyị na-ekwusa na ọgbakọ Ndị Kraịst. Mgbe ọgbakọ Ndị Kraịst malitere n’afọ 33, ọ dị ezigbo obere ka “mkpụrụ osisi kasị nta.” Ma, n’oge na-adịghị anya, ọ malitere ito n’ike n’ike. Ọtụtụ ndị atụghị anya na ọ ga-eto otú ahụ. (Kọl. 1:23) Otú ahụ o si too bara uru n’ihi na Jizọs kwuru na “anụ ufe nke eluigwe” bịara “nweta ebe obibi n’alaka ya.” Nnụnụ ndị a nọchiri anya ndị nwere ezi obi, bụ́ ndị na-abata n’ọgbakọ Ndị Kraịst ka ahụ́ ruo ha ala nakwa ka e jiri Okwu Chineke na-enyeju ha afọ.—Tụlee Ezikiel 17:23.

8. Gịnị mere Jizọs ji mee ihe atụ gbasara mkpụrụ osisi mọstad?

 8 Gịnị mere Jizọs ji mee ihe atụ a? O ji otú mkpụrụ osisi mọstad ahụ si too gosi otú Alaeze Chineke ga-esi na-agbasa, na-echebe ndị Chineke ma merie nsogbu niile nọchiiri ya ụzọ. Kemgbe afọ 1914, ọgbakọ Ndị Kraịst enweela ọganihu dị egwu. (Aịza. 60:22) A na-enyere ndị nọ na ya aka ka ha na Jehova dịrị ná mma. (Ilu 2:7; Aịza. 32:1, 2) Ihe ọzọ bụ na ọgbakọ Ndị Kraịst ga na-eto eto n’agbanyeghị ọgụ ọ bụla a na-alụso ya.Aịza. 54:17.

9. (a) Gịnị ka anyị ga-amụta n’ihe atụ Jizọs mere gbasara mkpụrụ osisi mọstad? (b) Gịnị ka ọ na-akụziri anyị gbasara Jehova na Jizọs?

9 Gịnị ka anyị ga-amụta n’ihe atụ a Jizọs mere gbasara mkpụrụ osisi mọstad? O nwere ike ịbụ na anyị bi n’ebe e nwere naanị Ndịàmà Jehova ole na ole ma ọ bụkwanụ n’ebe ọtụtụ ndị na-anaghị ekwe abata n’ọgbakọ. Ma, ọ bụrụ na anyị echeta na Alaeze Chineke nwere ike imeri nsogbu ọ bụla nọchiiri ya ụzọ, ọ ga-eme ka anyị ghara ịkwụsị ozi ọma anyị na-ekwusa. Dị ka ihe atụ, mgbe Nwanna Edwin Skinner gara India n’afọ 1926, ihe e nwere n’obodo ahụ bụ naanị Ndịàmà Jehova ole na ole. Ná mmalite, ikwusa ozi ọma n’ebe ahụ adịghị mfe n’ihi na ndị na-abata n’ọgbakọ dị naanị ole na ole. Ma, ọ kwụsịghị ikwusa ozi ọma. O ji anya ya hụ otú ozi ọma Alaeze Chineke si merie ọtụtụ nsogbu. Taa, e nwere ihe karịrị iri puku Ndịàmà Jehova atọ na puku asaa n’India. Ihe karịrị otu narị puku na puku asatọ bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs n’afọ 2013. N’afọ ahụ Nwanna Skinner gara India, a ka malitere ikwusa ozi ọma amalite na Zambia. Ugbu a, ihe karịrị otu narị puku ndị nkwusa na puku iri asaa na-ekwusa ozi ọma n’ebe ahụ. Narị puku asaa na puku iri isii na atọ, narị itoolu na iri na ise bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs n’afọ 2013. Ihe ọ pụtara bụ na e kee ndị Zambia ụzọ iri na asatọ, otu ụzọ bịara ya. Ihe a gosiri na ozi ọma na-aga n’ihu.

IHE IKO ACHỊCHA

10. Gịnị ka ihe atụ Jizọs mere gbasara ihe iko achịcha pụtara?

10 Gụọ Matiu 13:33. Gịnị ka ihe atụ a Jizọs mere gbasara ihe iko achịcha pụtara? Jizọs ji ihe atụ a na-akọ gbasara ozi  ọma Alaeze Chineke na otú o si na-agbanwe ndụ ndị mmadụ. “Ntụ ọka ahụ dum” nọchiri anya mba niile. Otú o si koo nọchiri anya otú ozi Alaeze Chineke si na-agbasa n’ihi ozi ọma anyị na-ekwusa. Mgbe mkpụrụ osisi mọstad na-eto, a na-ahụ ya. Ma, a naghị ahụ otú ihe iko achịcha si eme ka ntụ ọka koo. Ọ bụ mgbe e mechara ka a na-ahụ na ntụ ọka ahụ ekoola.

11. Gịnị mere Jizọs ji mee ihe atụ gbasara ihe iko achịcha?

11 Gịnị mere Jizọs ji mee ihe atụ a? O ji ya mee ka a ghọta na ozi Alaeze Chineke nwere ike ịgbasa nakwa na o nwere ike ịgbanwe ndụ ndị mmadụ. Ozi ọma Alaeze Chineke eruola “n’ebe kasị anya n’ụwa.” (Ọrụ 1:8) Ma, ọ bụghị mgbe niile ka a na-ahụ na ọ na-agbanwe ndụ ndị mmadụ. Ná mmalite, o nwedịrị ike ịdị ka ozi ọma anaghị akpa ike ná ndụ mmadụ. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na ọ na-agbanwe ndụ ndị mmadụ. Ọtụtụ ndị n’ebe niile na-anabata ozi ọma Alaeze Chineke ma kwe ka ọ gbanwee ndụ ha.Rom 12:2; Efe. 4:22, 23.

12, 13. Nye ihe atụ gosiri otú ozi ọma anyị na-ekwusa sirila gbasaa dị ka ihe iko achịcha ahụ Jizọs kwuru okwu ya n’ihe atụ ya.

12 Ọtụtụ mgbe, e zie ndị mmadụ ozi ọma, ọtụtụ afọ na-aga tupu a hụ ihe gosiri na ozi ọma ahụ na-akpa ike. Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwanna aha ya bụ Franz. N’afọ 1982, ya na Margit nwunye ya na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Brazil. Ma, ha na-eje ozi ugbu a n’alaka ụlọ ọrụ dị ná mba ọzọ. Mgbe ha nọ na Brazil, ha kwusara ozi ọma n’otu obere ime obodo. Otu nwaanyị na ụmụ ya anọ so ná ndị ha malitere ịmụrụ Baịbụl n’ebe ahụ. N’oge ahụ, ọkpara nwaanyị ahụ dị naanị afọ iri na abụọ. Ọ bụ ezigbo onye ihere. Ọ na-abụ a bịa ịmụrụ ha ihe, ya agaa zoo. E mechara ziga nwanna ahụ na nwunye ya ebe ọzọ. N’ihi ya, onye ọzọ malitere ịmụrụ ha ihe. Ma, mgbe iri afọ abụọ na ise gara, ha gara ebe ahụ ọzọ. Gịnị ka ha hụrụ? Ha hụrụ ọgbakọ nwere iri ndị nkwusa isii na itoolu. Mmadụ iri na atọ n’ime ha bụ ndị ọsụ ụzọ oge niile. Ha na-amụkwa ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ a rụụrụ ha. Nwa ahụ bụ́bu onye ihere etoola. Ọ bụzi onye na-ahaziri ndị okenye ọrụ n’ọgbakọ ahụ. Ozi ọma Alaeze Chineke mere ihe ahụ ihe iko achịcha Jizọs ji mee ihe atụ mere. Ọ gbasara ma gbanwee ndụ ọtụtụ ndị. Ihe a niile mere ka obi dị nwanna ahụ na nwunye ya ụtọ.

13 Ná mba ndị a machibidoro ozi ọma anyị iwu, ozi ọma Alaeze Chineke na-agbanwe ndụ ndị mmadụ. O siri ike ịmata ebe niile ozi ọma rurula ná mba ndị ahụ. Ma, ọ na-ejukarị anyị anya ịhụ otú ozi ọma si na-akpa ike n’ebe ndị ahụ. Were obodo Kuba dị ka ihe atụ. Ozi ọma ruru ebe ahụ n’afọ 1910. Nwanna Russell gara ebe ahụ n’afọ 1913. Ma, ná mmalite, ọ dị ka e nweghị ezigbo ihe a na-arụpụta. Ma, gịnị na-eme n’ebe ahụ ugbu a? E nwere ihe karịrị iri puku ndị nkwusa itoolu na puku isii. Narị puku abụọ na puku iri abụọ na itoolu, narị asaa na iri abụọ na isii bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs n’afọ 2013. Ihe ọ pụtara bụ na e kee ndị bi n’agwaetiti a ụzọ iri anọ na asatọ, otu ụzọ bịara ya. Ná mba ndị a na-amachibidoghị ozi ọma anyị iwu, o nwere ike ịbụ na ozi ọma eruokwala n’ebe ụmụnna ndị bi n’ebe ndị ahụ chere na ọ gaghị eruli. *Ekli. 8:7; 11:5.

14, 15. (a) Gịnị ka ị mụtara n’ihe atụ Jizọs mere gbasara ihe iko achịcha? (b) Gịnị ka ọ na-akụziri anyị gbasara Jehova na Jizọs?

14 Gịnị ka anyị ga-amụta n’ihe atụ a  Jizọs mere gbasara ihe iko achịcha? Ọ bụrụ na anyị echebara ihe ihe atụ a pụtara echiche, anyị ga-aghọta na anyị ekwesịghị ịna-echegbu onwe anyị gbasara otú ọtụtụ nde mmadụ na-anụbeghị ozi ọma ga-esi nụ ya. Ihe niile dị Jehova n’aka. Ma, olee ihe anyị kwesịrị ịna-eme? Okwu Chineke zara ajụjụ a. Ọ sịrị: “Ghaa mkpụrụ gị n’ụtụtụ, ekwekwala ka aka gị zuo ike ruo n’anyasị; n’ihi na ị maghị ebe ọ ga-eme nke ọma, ma ọ̀ bụ n’ebe a ma ọ bụ n’ebe ahụ, ma ọ̀ bụ na ha abụọ ga-adịcha mma.” (Ekli. 11:6) Anyị kwesịrị ịna-ekpe ekpere ka Jehova gọzie ozi ọma a na-ekwusa, nke ka nke ná mba ndị a machibidoro ozi ọma anyị iwu.Efe. 6:18-20.

15 Ihe ọzọ bụ na anyị ekwesịghị ịda mbà ma ọ bụrụ na anyị anaghị ahụ ihe anyị na-arụpụta n’ozi ọma anyị na-ekwusa. Anyị ekwesịghị ileda “ụbọchị ihe nta” anya. (Zek. 4:10) Uru ozi ọma anyị na-ekwusa ga-emecha baa nwere ike ịkarị ihe anyị tụrụ anya ya.Ọma 40:5; Zek. 4:7.

ONYE AHỊA NA AKỤ̀ ZORO EZO

16. Gịnị ka ihe atụ Jizọs mere gbasara onye ahịa na akụ̀ zoro ezo pụtara?

16 Gụọ Matiu 13:44-46. Gịnị ka ihe atụ a Jizọs mere gbasara onye ahịa na akụ̀ zoro ezo pụtara? Oge Jizọs nọ n’ụwa, ụfọdụ ndị ahịa na-achọ ezigbo nkume pel gaa ebe dị anya. Ha na-agarucha n’Oké Osimiri India. Onye ahịa ahụ Jizọs kwuru gbasara ya nọchiri anya ndị nwere ezi obi, bụ́ ndị na-eme ihe niile ha nwere ike ime ka ha chọta eziokwu gbasara Chineke. ‘Otu nkume pel ahụ dị oké ọnụ ahịa’ nọchiri anya eziokwu Alaeze Chineke nke bara ezigbo uru. Mgbe onye ahịa ahụ matara na nkume pel ahụ bara ezigbo uru, o rere ihe niile o nwere “ozugbo” ka o nwee ike ịzụta ya. Jizọs kwukwara gbasara otu nwoke na-arụ ọrụ ma hụ akụ̀ dị oké ọnụ ahịa “e zoro” n’ala. Ọ bụghị na ọ gara ịchọ akụ̀ otú ahụ onye ahịa ahụ gara ịchọ nkume pel. Ma, o mere ihe onye ahịa ahụ mere. O rere “ihe niile” o nwere ka ọ zụta akụ̀ ahụ.

17. Gịnị mere Jizọs ji mee ihe atụ gbasara onye ahịa na akụ̀ zoro ezo?

17 Gịnị mere Jizọs ji mee ihe atụ abụọ a? O ji ihe atụ abụọ a gosi na e nwere ụzọ dị iche iche ndị mmadụ nwere ike isi mụta eziokwu. Ụfọdụ ndị na-achọ ya, na-emekwa ihe niile ha nwere ike ime ka ha chọta ya. E nwekwara ndị na-achọta ya n’agbanyeghị na ha achọghị ya achọ. O nwere ike ịbụ na mmadụ bịara zie ha ozi ọma. N’agbanyeghị otú ha si mụta eziokwu, onye nke ọ bụla ghọtara na ihe ọ mụtara bara uru, dịkwa njikere ịhapụ ọtụtụ ihe ka o nwee ike ijidesi ya ike.

18. (a) Gịnị ka ị mụtara n’ihe atụ abụọ a Jizọs mere? (b) Gịnị ka ha na-akụziri anyị gbasara Jehova na Jizọs?

18 Gịnị ka anyị ga-amụta n’ihe atụ abụọ a? (Mat. 6:19-21) Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-eme ka mmadụ abụọ a? M̀ ji eziokwu m mụtara kpọrọ ihe? M̀ dị njikere ịhapụ ihe ụfọdụ ka m nwee ike ijidesi ya ike? Ka m̀ na-ekwe ka ihe ndị dịịrị m n’ụbọchị na ihe ndị ọzọ megharịa m anya?’ (Mat. 6:22-24, 33; Luk 5:27, 28; Fil. 3:8) Ọ bụrụ na obi dị anyị ezigbo ụtọ maka eziokwu Baịbụl anyị mụtara, anyị ga-eme ike anyị niile ka ọ bụrụ ihe kacha mkpa ná ndụ anyị.

19. Olee ihe anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu na-esonụ?

19 Ka anyị gosi na anyị gere ntị ma ghọta ihe ihe atụ ndị ahụ Jizọs mere gbasara Alaeze Chineke pụtara. Cheta na ihe anyị kwesịrị ime abụghị naanị ịghọta ihe ha pụtara. Anyị kwesịrị ịna-eme ihe anyị mụtara na ha. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-eleba anya n’ihe atụ atọ ọzọ nakwa ihe anyị ga-amụta na ha.

^ para. 13 Ụdị ihe a mekwara n’obodo ndị dị ka Ajentina (n’Akwụkwọ Mgbaafọ 2001, peeji nke 186); Ist Jamanị (n’Akwụkwọ Mgbaafọ 1999, peeji nke 83); Papiuwa Niu Gini (n’Akwụkwọ Mgbaafọ 2005, peeji nke 63); na Rọbịnsịn Kruso Aịland (n’Ụlọ Nche Bekee, June 15, 2000, peeji nke 9). Akwụkwọ Mgbaafọ ndị a bụ nke Bekee.