Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) NỌVEMBA 2014

Uru Mbilite n’Ọnwụ Jizọs Baara Anyị

Uru Mbilite n’Ọnwụ Jizọs Baara Anyị

“A kpọlitere ya.”MAT. 28:6.

1, 2. (a) Gịnị ka ụfọdụ ndị ndú okpukpe jụrụ Pita? Gịnị ka Pita zara ha? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Gịnị mere ka Pita jiri obi ike kwuo okwu mgbe ahụ?

IZU ole na ole Jizọs nwụchara, a kpọ Pita onyeozi gaa n’ihu ndị ndú okpukpe ndị Juu iwe juru obi. Ọ bụ ha mere ka e gbuo Jizọs. Ugbu a, ha na-ewesa Pita iwe n’ihi na ọ gwọrọ otu nwoke si n’afọ nne ya bụrụ onye ngwọrọ. Ha jụrụ Pita, sị: “Olee ike unu ji mee ihe a, ọ̀ bụkwa aha onye ka unu ji mee ya?” Pita ji obi ike gwa ha, sị: “Ọ bụ aha Jizọs Kraịst onye Nazaret, onye unu kpọgidere n’osisi, onye Chineke mere ka o si ná ndị nwụrụ anwụ bilie, ọ bụ aha ya ka e ji mee ka ahụ́ dị nwoke a guzo n’ihu unu n’ebe a mma.”—Ọrụ 4:5-10.

2 Tupu mgbe ahụ, ụjọ mere ka Pita gọnahụ Jizọs ugboro atọ. (Mak 14:66-72) Gịnị mere o ji nwee obi ike ugbu a ọ nọ n’ihu ndị ndú okpukpe? Mmụọ nsọ nyeere ya aka. Obi sikwara ya ike na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ. Gịnị mere obi ji sie ya ike? Gịnị mere obi kwesịkwara iji sie anyị ike otú ahụ?

3, 4. (a) Olee ndị a kpọlitere n’ọnwụ tupu a mụọ ndịozi Jizọs? (b) Olee ndị Jizọs kpọlitere n’ọnwụ?

3 Ndịozi Jizọs ma na e nwere ike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Tupu a mụọ ha, Jehova nyere Ịlaịja na Ịlaịsha ike, ha akpọlite ndị nwụrụ anwụ. (1 Eze 17:17-24; 2 Eze 4:32-37) Mgbe a tụbara otu nwoke nwụrụ anwụ n’ili Ịlaịsha, o bilitere mgbe  ozu ya metụrụ ọkpụkpụ Ịlaịsha. (2 Eze 13:20, 21) Ndị Kraịst oge mbụ kwetara na ihe ndị a Baịbụl kọrọ bụ eziokwu, otú ahụ anyị kweere na Okwu Chineke bụ eziokwu.

4 O doro anya na ọ na-eru anyị niile n’obi ma anyị gụọ gbasara ndị Jizọs kpọlitere n’ọnwụ. Dị ka ihe atụ, chegodị otú o si ju nwaanyị ahụ di ya nwụrụ anya mgbe Jizọs kpọlitere naanị otu nwa o nwere. (Luk 7:11-15) O nwekwara mgbe Jizọs kpọlitere nwata nwaanyị dị afọ iri na abụọ. Chegodị ụdị obi ụtọ papa ya na mama ya na-erubu uju nwere mgbe ha hụrụ na ọ dịzi ndụ. (Luk 8:49-56) O dokwara anya na ndị mmadụ nwere obi ụtọ mgbe ha hụrụ ka Lazarọs si n’ili pụta.—Jọn 11:38-44.

IHE MERE MBILITE N’ỌNWỤ JIZỌS JI PỤỌ ICHE

5. Olee otú mbilite n’ọnwụ Jizọs si dị iche ná mbilite n’ọnwụ ndị bu ya ụzọ?

5 Ndịozi Jizọs ma na mbilite n’ọnwụ Jizọs dị iche ná mbilite n’ọnwụ ndị bu ya ụzọ. Ndị a kpọlitere n’ọnwụ tupu a kpọlite Jizọs nwere ahụ́ mmadụ mgbe a kpọlitere ha. Ha mechakwara nwụọ ọzọ. Ma, mgbe a kpọlitere Jizọs, e nyere ya ahụ́ mmụọ nke a na-enweghị ike ibibi ebibi. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 13:34.) Pita kwuru na ‘e mere ka Jizọs nwụọ n’anụ ahụ́, ma e mere ka ọ dị ndụ na mmụọ.’ O kwukwara na Jizọs “nọ n’aka nri Chineke, n’ihi na ọ gara eluigwe; e mekwara ka ndị mmụọ ozi na ndị na-achị achị na ndị dị ike nọrọ n’okpuru ya.” (1 Pita 3:18-22) Mbilite n’ọnwụ ndị ọzọ ahụ dị ịtụnanya, bụrụkwa ọrụ ebube. Ma, o nweghị nke e nwere ike iji tụnyere nke Jizọs.

6. Olee uru mbilite n’ọnwụ Jizọs baara ndịozi ya?

6 Mbilite n’ọnwụ Jizọs baara ndịozi ya ezigbo uru. Ndị iro ya chere na o nweghị ihe ga-eme ka ọ dị ndụ ọzọ. Ma, ọ dịzi ndụ, bụrụkwa mmụọ dị ike. O nweghị ihe mmadụ ọ bụla ga-emeli ya. Mbilite n’ọnwụ ya gosiri na ọ bụ Ọkpara Chineke. Ebe ọ bụ na ndịozi ya ma na a kpọlitela ya n’ọnwụ, ụjọ anaghịzi atụ ha. Ha anaghịzi eru uju. Kama, o mere ka obi sikwuo ha ike. A sị na a kpọliteghị Jizọs n’ọnwụ, nzube Chineke agaghị emezu, ozi ọma ndịozi ya na-ekwusa agaghịkwa aba uru ọ bụla.

7. Gịnị ka Jizọs na-eme taa? Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza?

7 Anyị bụ́ ndị ohu Jehova ma nke ọma na ọ bụghị naanị na Jizọs bụ nnukwu mmadụ mgbe ọ nọ n’ụwa, ọ dị ndụ ugbu a, na-eduzikwa ozi ọma a na-ekwusa n’ụwa niile. Ebe ọ bụ Eze na-achị ugbu a n’eluigwe, n’oge na-adịghị anya, ọ ga-ewepụ ihe ọjọọ niile dị n’ụwa, meekwa ka ụwa bụrụ paradaịs, bụ́ ebe ndị mmadụ ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi. (Luk 23:43) Ihe a agaghị eme ma a sị na a kpọliteghị Jizọs n’ọnwụ. Gịnị mere obi ji kwesị isi anyị ike na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ? Olee uru mbilite n’ọnwụ ya baara anyị?

JEHOVA GOSIRI NA YA KA ỌNWỤ IKE

8, 9. (a) Gịnị mere ndị ndú okpukpe ndị Juu ji kwuo ka e chee ili Jizọs nche? (b) Gịnị mere mgbe ụmụ nwaanyị abụọ gara n’ili ahụ?

8 Mgbe e gbuchara Jizọs, ndị isi nchụàjà na ndị Farisii bịakwutere Paịlet ma sị ya: “Nna anyị ukwu, anyị chetara na onye nduhie ahụ kwuru mgbe ọ ka nọ ndụ, sị, ‘Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, a ga-akpọlite m.’ Ya mere, nye iwu ka a na-eche ili ahụ nche ruo n’ụbọchị nke atọ, ka ndị na-eso ụzọ ya ghara ịbịa zuru ya wee gwa ndị mmadụ, sị, ‘E mere ka o si ná ndị nwụrụ anwụ bilie!’ nduhie nke ikpeazụ a ga-akakwa nke mbụ njọ.” Paịlet wee sị ha: “Unu nwere ndị nche. Gaanụ chee ya nche otú ọ bụla unu maara unu ga-esi chee ya.” Ha mere otú ahụ.—Mat. 27:62-66.

 9 E liri Jizọs n’ili e gwuru n’oké nkume ma kwara nnukwu nkume kwachie ọnụ ụzọ ya. Ndị ndú okpukpe ndị Juu chọrọ ka Jizọs nọrọ n’ebe ahụ ruo mgbe ebighị ebi. Ma, ọ bụghị ihe Jehova bu n’obi. Mgbe Meri Magdalin na Meri nke ọzọ gara n’ili ahụ n’ụbọchị nke atọ, ha chọpụtara na a kwapụla nkume ahụ, mmụọ ozi anọrọ ya n’elu. Mmụọ ozi ahụ gwara ụmụ nwaanyị abụọ ahụ ka ha lee anya n’ime ili ahụ ma jiri anya ha hụ na o nweghị ihe dị na ya. Ọ gwara ha, sị: “Ọ nọghị n’ebe a, n’ihi na a kpọlitere ya.” (Mat. 28:1-6) A kpọlitela Jizọs n’ọnwụ.

10. Gịnị ka Pọl kwuru iji gosi na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ?

10 Ihe ndị mere n’ime ụbọchị iri anọ a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ mere ka o doo anya na Jizọs esila n’ọnwụ bilie. Mgbe Pọl onyeozi na-edegara ndị Kọrịnt akwụkwọ, ọ gwara ha, sị: “Enyefere m unu, n’ime ihe ndị mbụ, ihe ahụ m natakwara, na Kraịst nwụrụ maka mmehie anyị dị ka Akwụkwọ Nsọ si kwuo; nakwa na e liri ya, ee, na a kpọlitere ya n’ụbọchị nke atọ dị ka Akwụkwọ Nsọ kwuru; na ọ pụtakwara n’ihu Sifas, e mesịa, ọ pụtara n’ihu ndị ozi iri na abụọ ahụ. Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ pụtara n’ihu ihe karịrị narị ụmụnna ise n’otu mgbe, bụ́ ndị ihe ka ọtụtụ n’ime ha ka nọ ruo ugbu a, ma ụfọdụ adawo n’ụra ọnwụ. Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ pụtara n’ihu Jems, e mesịa, ọ pụtara n’ihu ndịozi niile; ma n’ikpeazụ, n’ime ha niile, ọ pụtara n’ihu m dị ka ọ̀ bụ n’ihu onye a mụkworo amụkwo.”—1 Kọr. 15:3-8.

IHE MERE ANYỊ JI MATA NA A KPỌLITERE JIZỌS N’ỌNWỤ

11. Olee otú o si bụrụ na mbilite n’ọnwụ Jizọs bụ “dị ka Akwụkwọ Nsọ si kwuo”?

11 Ihe mbụ mere anyị ji mata na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ bụ na mbilite n’ọnwụ ya bụ “dị ka Akwụkwọ Nsọ si kwuo.” Okwu Chineke buru amụma na a ga-akpọlite ya n’ọnwụ. Dị ka ihe atụ, Devid dere na a gaghị ahapụ “onye na-eguzosi ike” n’ebe Chineke nọ n’ili. (Gụọ Abụ Ọma 16:10.) Na Pentikọst afọ 33, Pita onyeozi kwuru na ọ bụ Jizọs ka Devid na-ekwu okwu ya. Pita sịrị: “[Devid] hụrụ ya tupu oge eruo ma kwuo okwu banyere mbilite n’ọnwụ Kraịst, na a hapụghị ya n’ime Hedis, anụ ahụ́ ya ereghịkwa ure.”—Ọrụ 2:23-27, 31.

12. Olee ndị hụrụ Jizọs mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ?

12 Ihe nke abụọ mere anyị ji mata na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ bụ na ọtụtụ ndị hụrụ ya mgbe a kpọlitechara ya. N’ime ụbọchị iri anọ a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ, ọ pụtara n’ihu ndị na-eso ụzọ ya ma n’ogige dị nso n’ebe ahụ e liri ya ma mgbe ha na-aga obodo Emeọs ma mgbe ha nọ n’ebe ndị ọzọ. (Luk 24:13-15) N’oge ndị ahụ, ọ gwara ma Pita ma ndị ọzọ okwu otu otu, gwakwa ọtụtụ mmadụ okwu. E nwedịrị mgbe ọ pụtara n’ihu ihe karịrị narị mmadụ ise. N’eziokwu, e nwere ọtụtụ ihe gosiri na ọtụtụ ndị hụrụ Jizọs mgbe a kpọlitechara ya.

13. Olee otú ịnụ ọkụ n’obi ndịozi Jizọs ji kwusaa ozi ọma si gosi na obi siri ha ike na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ?

13 Ihe nke atọ mere anyị ji mata na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ bụ na ndịozi ya ji ịnụ ọkụ n’obi kọọrọ ya ndị ọzọ. A kpagburu ndịozi Jizọs, taa ha ahụhụ, gbuokwa ụfọdụ n’ime ha n’ihi na ha ji ịnụ ọkụ n’obi na-akọrọ ndị ọzọ na a kpọlitere ya n’ọnwụ. Cheta na ndị ndú okpukpe kpọrọ Jizọs asị ma mee ka e gbuo ya. A sị na a kpọliteghị Jizọs n’ọnwụ, ì chere na Pita gaara agwawa ha na a kpọlitere ya ebe ọ ma na o nwere ike ime ka e gbuo ya? O doro Pita na ndịozi ndị ọzọ anya na Jizọs dị ndụ nakwa na ọ bụ ya na-eduzi  ọrụ ikwusa ozi ọma. Ọ bụ ya mere ha ji na-akọrọ ndị ọzọ gbasara ya. Ihe ọzọ bụ na mbilite n’ọnwụ Jizọs mere ka obi sie ndịozi ya ike na a ga-akpọlitekwa ha n’ọnwụ. Dị ka ihe atụ, mgbe Stivin na-anwụ, obi siri ya ike na a ga-akpọlite ya n’ọnwụ.—Ọrụ 7:55-60.

14. Gịnị mere anyị ji kwere na Jizọs dị ndụ?

14 Ihe nke anọ mere anyị ji mata na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ bụ na anyị na-ahụ ihe ndị gosiri na ọ bụ Eze ugbu a, bụrụkwa Onyeisi ọgbakọ Ndị Kraịst. Ọ bụ ya mere ọgbakọ Ndị Kraịst ji na-enwe ọganihu. Ì chere na ọ gaara adị otú a ma a sị na a kpọliteghị Jizọs n’ọnwụ? Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere ike anyị agaraghị ama ihe ọ bụla gbasara Jizọs ma a sị na a kpọliteghị ya n’ọnwụ. Ma, e nwere ọtụtụ ihe mere anyị ji kwere na Jizọs dị ndụ nakwa na ọ na-eduzi ozi ọma anyị na-ekwusa n’ụwa niile.

URU MBILITE N’ỌNWỤ JIZỌS BAARA ANYỊ

15. Gịnị mere mbilite n’ọnwụ Jizọs ji eme ka anyị jiri obi ike na-ekwusa ozi ọma?

15 Mbilite n’ọnwụ Jizọs na-eme ka anyị jiri obi ike na-ekwusa ozi ọma. Kemgbe puku afọ abụọ, ndị iro Chineke esila n’ụzọ dị iche iche na-agba mbọ ka a kwụsị ozi ọma Ndị Kraịst na-ekwusa. Mgbe ụfọdụ, ha na-esi n’aka ndị si n’ezi ofufe dapụ ma ọ bụ n’aka ndị na-eme ihe ike. E nwekwara oge ndị ha na-akwa Ndị Kraịst emo, machie ozi ọma ha na-ekwusa iwu, taa ha ahụhụ, ma ọ bụdị gbuo ụfọdụ n’ime ha. Ma, o nwebeghị ‘ngwá ọgụ ọ bụla a kpụrụ iji lụso anyị ọgụ’ mere ka anyị kwụsị ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke na ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. (Aịza. 54:17) Anyị anaghị atụ ndị Setan ji kwara ngwá ọrụ ụjọ. Jizọs na-akwado anyị ma na-enyere anyị aka otú ahụ o kwere anyị ná nkwa. (Mat. 28:20) Obi kwesịrị isi anyị ike n’ihi na ihe ọ sọkwara ndị iro anyị mee, ha agaghị eme ka anyị kwụsị ozi ọma anyị na-ekwusa.

Mbilite n’ọnwụ Jizọs na-eme ka anyị jiri obi ike na-ekwusa ozi ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)

16, 17. (a) Olee otú mbilite n’ọnwụ Jizọs si gosi na ihe niile ọ kụziri bụ eziokwu? (b) Olee ike Chineke nyere Jizọs nke e kwuru gbasara ya na Jọn 11:25?

16 Mbilite n’ọnwụ Jizọs gosiri na ihe niile ọ kụziri bụ eziokwu. Pọl kwuru na ọ bụrụ na a kpọliteghị Kraịst n’ọnwụ, ọ pụtara na ihe Ndị Kraịst kweere na ozi ọma ha na-ekwusa abaghị uru. Otu ọkà mmụta Baịbụl kwuru, sị: “Ọ bụrụ na Kraịst esighị n’ọnwụ bilie, . . . ọ pụtara na e gwuru Ndị Kraịst wayo mee ka ha kweta ihe na-abụghị eziokwu.” A sị na Jizọs esighị n’ọnwụ bilie, ọ pụtara na ihe niile a kọrọ n’Oziọma Matiu, Mak, Luk, na Jọn bụ naanị akụkọ dị mwute gbasara otu nwoke bụ́ ezigbo mmadụ na onye nwere amamihe, ndị iro ya emechaa gbuo ya. Ma, a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ. E si otú a gosi na ihe niile ọ kụziri gbasara ọdịnihu bụ eziokwu.—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 15:14, 15, 20.

17 Jizọs kwuru, sị: “Abụ m mbilite n’ọnwụ na ndụ. Onye nwere okwukwe n’ebe m nọ, ọ bụrụgodị na ọ nwụọ, ọ ga-adị ndụ ọzọ.” (Jọn 11:25) Nkwa a Jizọs kwere ga-emezurịrị. Jehova nyere Jizọs ike ka ọ kpọlite ndị ga-eso ya chịa n’eluigwe nakwa ọtụtụ ijeri ndị ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa. Àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ na mbilite n’ọnwụ ya mere ka o doo anya na ọnwụ agaghị adị ọzọ. Ihe a ó kwesịghị ime ka anyị die nsogbu ọ bụla bịaara anyị, meekwa ka anyị nwee obi ike ọ bụrụgodị na anyị nọ n’ọnụ ọnwụ?

18. Olee ihe mbilite n’ọnwụ Jizọs mere ka obi sie anyị ike na Jehova ga-eme?

18 Mbilite n’ọnwụ Jizọs mere ka obi sie anyị ike na Jehova ga-eji obiọma kpee ụmụ mmadụ ikpe. Mgbe Pọl na-agwa  ụfọdụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị okwu n’Atens oge ochie, ọ sịrị: ‘Chineke ewepụtawo otu ụbọchị nke o zubere ikpe elu ụwa mmadụ bi ikpe n’ezi omume site n’aka otu nwoke onye ọ họpụtara, o nyewokwa mmadụ niile ihe ga-emesi ha obi ike, ebe ọ bụ na o mere ka o si ná ndị nwụrụ anwụ bilie.’ (Ọrụ 17:31) Ọ bụ Jizọs ka Chineke họpụtara ka ọ bụrụ Onyeikpe. Obi kwesịrị isi anyị ike na ọ ga-eji obiọma kpee ikpe ziri ezi.—Gụọ Aịzaya 11:2-4.

19. Olee uru ikwere ná mbilite n’ọnwụ Jizọs baara anyị?

19 Ikwere na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ ga-eme ka anyị na-eme uche Chineke. A sị na Jizọs ejighị ndụ ya chụọ àjà, a kpọlitekwa ya n’ọnwụ, a garaghị agbapụta anyị n’aka mmehie na ọnwụ. (Rom 5:12; 6:23) Anyị agaraghị enwe olileanya. Anyị gaara ịna-asị: “Ka anyị rie ma ṅụọ, n’ihi na echi ka anyị ga-anwụ.” (1 Kọr. 15:32) Ihe bụ́ mkpa anyị abụghị ikpori ndụ. Kama, anyị ji olileanya mbilite n’ọnwụ kpọrọ ihe. Anyị dịkwa njikere mgbe niile irubere Jehova isi.

20. Olee otú mbilite n’ọnwụ Jizọs si gosi na Chineke dị ukwuu?

20 Mbilite n’ọnwụ Jizọs gosiri na Jehova dị ukwuu. Baịbụl kpọrọ ya “onye na-akwụ ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.” (Hib. 11:6) Jehova ji ike ya na amamihe ya kpọlite Jizọs n’ọnwụ, ya abụrụ onye na-anaghị anwụ anwụ n’eluigwe. Chineke si otú a gosi na ya ga-emezuli nkwa niile o kwere anyị. Dị ka ihe atụ, o kwere nkwa na otu “mkpụrụ” pụrụ iche ga-eme ka o doo anya na ọ bụ Jehova kwesịrị ịchị eluigwe na ụwa. Ka nkwa a nwee ike imezu, Jizọs ga-anwụ, a kpọlite ya n’ọnwụ.—Jen. 3:15.

21. Olee uru inwe olileanya na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ baara gị?

21 Obi ọ́ dịghị gị ụtọ na Jehova mere ka anyị nwee olileanya na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ? Baịbụl kwere anyị nkwa, sị: “Lee! Ụlọikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ, ya na ha ga-ebikwa, ha ga-abụkwa ndị nke ya. Chineke n’onwe ya ga-anọnyekwara ha. Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.” Ọ bụ Jọn onyeozi ka a gwara gbasara olileanya a dị ebube. A gwara ya, sị: “Dee ha ede, n’ihi na okwu ndị a kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu.” Ònye gosiri Jọn ihe a? Ọ bụ Jizọs Kraịst, onye a kpọlitere n’ọnwụ.Mkpu. 1:1; 21:3-5.