Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) NỌVEMBA 2014

“Ugbu A, Unu Bụ Ndị Chineke”

“Ugbu A, Unu Bụ Ndị Chineke”

“O nwere mgbe unu na-abụghị otu ndị, ma ugbu a, unu bụ ndị Chineke.”—1 PITA 2:10.

1, 2. Olee ihe gbanwerenụ na Pentikọst afọ 33? Ole ndị ghọrọ mba ọhụrụ nke Chineke? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

NA PENTIKỌST afọ 33, Jehova mere ka e nwee mgbanwe dị mkpa nke gbasara ndị ohu ya nọ n’ụwa. N’ụbọchị ahụ, Jehova ji mmụọ nsọ ya mee ka e nwee mba ọhụrụ, ya bụ, “Izrel nke Chineke.” (Gal. 6:16) Kemgbe oge Ebreham, ihe e ji amata ndị Chineke bụ na a na-ebi onye ọ bụla bụ́ nwoke úgwù. Ma, ọ bụ n’ụbọchị ahụ ka ihe gbanwere. Kama ikwu na a ga-ebi ndị so ná mba ọhụrụ a úgwù, Pọl kwuru gbasara onye ọ bụla n’ime ha, sị: “Úgwù e biri ya bụkwa n’obi site na mmụọ.”—Rom 2:29.

2 Ndị mbụ so ná mba ọhụrụ a bụ ndịozi Jizọs na ihe karịrị otu narị ndị ọzọ na-eso ụzọ Jizọs, bụ́ ndị gbakọtara n’ọnụ ụlọ dị n’elu na Jeruselem. (Ọrụ 1:12-15) Chineke wụkwasịrị ha mmụọ nsọ ya, nke mere ka ha bụrụ ụmụ Chineke. (Rom 8:15, 16; 2 Kọr. 1:21) Ihe ahụ merenụ gosiri na ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ Jizọs bụ onye ogbugbo ya amalitela ịdị irè. Ọ bụ ọbara Jizọs ka e ji mee ka ọ dị irè. (Luk 22:20; gụọ Ndị Hibru 9:15.) Ndị ahụ na-eso ụzọ Jizọs ghọrọ mba ọhụrụ, ya bụ, ndị Chineke họọrọ. Mmụọ nsọ mere ka ha nwee ike izi ndị Juu na ndị mba ọzọ na-asụ asụsụ dị iche iche ozi ọma n’asụsụ ha, ya bụ, ndị si n’ebe dị iche iche ndị Rom na-achị bịa  Jeruselem ka ha mee ememme ndị Juu a na-akpọ Ememme Izu ma ọ bụ Pentikọst. Ndị ahụ niile nụrụ ka Ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ mụọ ji asụsụ ha na-ekwu “banyere ihe ndị dị ebube nke Chineke.”—Ọrụ 2:1-11.

MBA ỌHỤRỤ CHINEKE

3-5. (a) Gịnị ka Pita onyeozi gwara ndị Juu n’ụbọchị Pentikọst? (b) Mgbe mba ọhụrụ ahụ ka malitere amalite, olee ihe ndị merenụ ka ọtụtụ ndị nwee ike ịbata na ya?

3 Jehova si n’aka Pita onyeozi megheere ndị Juu na ndị mba ọzọ ụzọ ka ha nwee ike iso ná mba ọhụrụ ahụ, ya bụ, ọgbakọ Ndị Kraịst. N’ụbọchị Pentikọst, Pita ji obi ike gwa ndị Juu na ha kwesịrị ịnabata Jizọs, bụ́ onye ha “kpọgidere n’osisi,” n’ihi na Chineke mere ka ọ bụrụ “Onyenwe anyị na Kraịst.” Mgbe ìgwè mmadụ ahụ Pita na-agwa okwu jụrụ ya ihe ha ga-eme, ọ gwara ha, sị: “Chegharịanụ, ka e meekwa onye ọ bụla n’ime unu baptizim n’aha Jizọs Kraịst ka e wee gbaghara unu mmehie unu, unu ga-anatakwa mmụọ nsọ ahụ a na-enye n’efu.” (Ọrụ 2:22, 23, 36-38) N’ụbọchị ahụ, ihe dị ka puku mmadụ atọ bụ́ ndị ọhụrụ batara ná mba ọhụrụ ahụ, bụ́ “Izrel nke Chineke.” (Ọrụ 2:41) Ka oge na-aga, ndịozi Jizọs ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma, ọtụtụ ndị ana-aghọkwa Ndị Kraịst. (Ọrụ 6:7) Ọtụtụ ndị nọ na-abata ná mba ọhụrụ ahụ.

4 Ndịozi Jizọs mechara kwusawara ndị Sameria ozi ọma, ọtụtụ n’ime ha ana-echegharị. Filip onye na-ekwusa ozi ọma mere ọtụtụ n’ime ha baptizim. Ma, ha anataghị mmụọ nsọ ozugbo. Òtù na-achị isi nọ na Jeruselem zigara Pita na Jọn ka ha gaa hụ ụmụnna ndị ahụ bụ́ ndị Sameria. “Ha bikwasịrị ha aka n’isi, ha wee malite ịnata mmụọ nsọ.” (Ọrụ 8:5, 6, 14-17) Ọ bụ otú ahụ ka e si jiri mmụọ nsọ tee ndị Sameria ndị ahụ mmanụ, ha esoro ‘n’Izrel nke Chineke.’

Pita ziri Kọnịliọs na ndị ezinụlọ ya ozi ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5)

5 N’afọ 36 nke Oge Ndị Kraịst, Chineke sikwa n’aka Pita megheere ndị ọzọ ụzọ ka ha soro ná mba ọhụrụ ahụ bụ́ Izrel nke Chineke. Pita mere otú ahụ mgbe o ziri ọchịagha ndị Rom bụ́ Kọnịliọs na ndị ezinụlọ ya na ndị enyi ya ozi ọma. (Ọrụ 10:22, 24, 34, 35) Baịbụl kwuru, sị: “Ka Pita nọ na-ekwu banyere ihe ndị a, mmụọ nsọ dakwasịrị ndị niile nụrụ okwu ahụ, [ya bụ, ndị na-abụghị ndị Juu]. O juru ndị niile kwesịrị ntụkwasị obi so Pita bịa anya, bụ́ ụfọdụ n’ime ndị e biri úgwù, n’ihi na a na-awụkwasị ndị mba ọzọ onyinye ahụ a na-enye n’efu bụ́ mmụọ nsọ.” (Ọrụ 10:44, 45) N’ihi ya, Chineke malitere ịnabata ndị kwere ekwe, bụ́ ndị Jentaịl a na-ebighị úgwù, ka ha soro ná mba ọhụrụ ahụ bụ́ Izrel nke Chineke.

‘O WEPỤTAARA AHA YA OTU NDỊ’

6, 7. Olee otú ndị so ná mba ọhụrụ ahụ ga-esi gosi na ha bụ ndị Jehova ‘wepụtaara aha ya’? Olee otú ha meruru ya?

6 Ná nnọkọ òtù na-achị isi nwere  n’oge ndịozi Jizọs n’afọ 49, Jems onye na-eso ụzọ Jizọs kwuru, sị: “Simiọn [ya bụ, Pita] kọrọ nke ọma otú Chineke si chee ihu ya n’ebe ndị mba ọzọ nọ na nke mbụ ya, isi n’etiti ha wepụtara aha ya otu ndị.” (Ọrụ 15:14) Ndị Kraịst bụ́ ndị Juu na ndị mba ọzọ so ná ndị a Jehova wepụtaara aha ya ma mee ka ha bụrụ otu mba. (Rom 11:25, 26a) Pita mechara dee, sị: “O nwere mgbe unu na-abụghị otu ndị, ma ugbu a, unu bụ ndị Chineke.” Pita kwuru ihe mere e ji nwee mba ọhụrụ a. Ọ sịrị: “Unu bụ ‘agbụrụ a họọrọ, òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze, mba dị nsọ, otu ndị pụrụ iche nke Chineke, ka unu wee kwusaa n’ebe niile ịdị mma’ nke onye ahụ kpọpụtara unu n’ọchịchịrị wee kpọba unu n’ìhè ya dị ebube.” (1 Pita 2:9, 10) Ha ga-ekwusa gbasara Onye ahụ ha na-anọchite anya ya ma na-eto aha ya n’ihu ọha. Ha ga-eji obi ike na-akọrọ ndị ọzọ gbasara Jehova bụ́ Ọkaakaa Eluigwe na Ụwa.

7 N’Aịzaya 43:21, Jehova kpọrọ mba Izrel “ndị m kpụụrụ onwe m, ka ha wee kọọ akụkọ otuto m.” Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị Izrel nke Chineke. Ndị Kraịst oge mbụ ji obi ike mee ka a mata na ọ bụ naanị Jehova bụ ezi Chineke nakwa na chi niile ndị mmadụ na-efe n’oge ahụ abụghị ezi Chi. (1 Tesa. 1:9) Ha gbara àmà banyere Jehova na Jizọs “ma na Jeruselem ma na Judia dum nakwa na Sameria, ruokwa n’ebe kasị anya n’ụwa.”—Ọrụ 1:8; Kọl. 1:23.

8. Olee aka ná ntị Pọl onyeozi dọrọ ndị Chineke?

8 Pọl onyeozi ji obi ike gosi na o so ná ndị Jehova ‘wepụtaara aha ya.’ Mgbe ọ nọ n’ihu ndị ọkà ihe ọmụma na-ekpere arụsị, o ji obi ike mee ka o doo anya na Jehova bụ Ọkaakaa. O kwuru na ọ bụ “Chineke nke kere ụwa na ihe niile dị n’ime ya” nakwa na “ọ bụ Onyenwe eluigwe na ụwa.” (Ọrụ 17:18, 23-25) Mgbe ọ fọrọ obere ka Pọl gachaa ozi ala ọzọ ya nke atọ, ọ dọrọ ọgbakọ Ndị Kraịst aka ná ntị, sị: “Amaara m na mgbe m pụsịrị, anụ ọhịa wolf ndị obi tara mmiri ga-abata n’etiti unu, ha agaghịkwa emere ìgwè atụrụ ahụ ebere, ndị ikom ga-esikwa n’etiti unu onwe unu bilie, na-ekwu ihe gbagọrọ agbagọ iji dọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ka ha sowe ha.” (Ọrụ 20:29, 30) Tupu ndịozi anwụchaa, e nweela ọtụtụ ndị si n’ezi ofufe dapụ.—1 Jọn 2:18, 19.

9. Gịnị mere ndị Chineke mgbe ndịozi nwụchara?

9 Mgbe ndịozi nwụchara, e nwekwuru ndị si n’ezi ofufe dapụ. Ha malitere chọọchị dị iche iche nke Krisendọm. Ndị a si n’ezi ofufe dapụ ewepụla aha Jehova n’ọtụtụ Baịbụl ha sụgharịrị. Ha abụghị ndị e wepụtaara aha Jehova. Ha na-eme ememme ndị na-ekpere arụsị, na-akụzikwa ihe ndị na-adịghị na Baịbụl. Ha na-alụkwa agha ha kpọrọ agha dị nsọ ma na-ekwu na ha na-alụrụ ya Chineke. Ha na-emekwa omume rụrụ arụ. N’ihi ya, ruo ọtụtụ narị afọ, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole ji obi ha niile na-efe Jehova. E nweghịkwa ndị a haziri ka ha bụrụ ndị ‘e wepụtaara aha ya.’

OTÚ E SI MỤỌ MBA ỌHỤRỤ NKE CHINEKE

10, 11. (a) Gịnị ka Jizọs kwuru n’ihe atụ ahụ o mere gbasara ọka wit na ata? (b) Olee otú ihe ahụ Jizọs kwuru si mezuo mgbe afọ 1914 gachara? Gịnị ka o mere ka e nwee?

10 N’ihe atụ Jizọs mere gbasara ọka wit na ata, o kwuru na ndị si n’ezi ofufe dapụ ga-eme ka o sie ike ịmata ezigbo Ndị Kraịst. Ọ sịrị na ‘mgbe ndị mmadụ ga na-ehi ụra,’ Ekwensu ga-akụ ata n’ebe Nwa nke mmadụ kụrụ ọka wit. Ha abụọ ga na-eto ruo “ọgwụgwụ nke usoro ihe a.” Jizọs kwuru na  “ezi mkpụrụ ahụ bụ ụmụ nke alaeze.” “Ata ahụ” abụrụ “ụmụ ajọ onye ahụ.” N’ọgwụgwụ nke usoro ihe a, Nwa nke mmadụ ga-agwa ‘ndị na-ewere ya ihe ubi,’ ya bụ, ndị mmụọ ozi, ka ha dowe ata ahụ iche, dowekwa ọka wit ahụ iche. Ndị mmụọ ozi ga-achịkọtazi “ụmụ nke alaeze.” (Mat. 13:24-30, 36-43) Olee otú ihe a Jizọs kwuru si mezuo? Olee otú o si mee ka Chineke nwee ndị ọ haziri ga na-efe ya n’ụwa?

11 “Ọgwụgwụ nke usoro ihe a” malitere n’afọ 1914. N’oge ahụ, Ndị Kraịst e tere mmanụ dị naanị puku mmadụ ole na ole. Mgbe agha malitere n’afọ ahụ, Babịlọn Ukwu ahụ ka dọọrọ ndị a bụ́ “ụmụ nke alaeze” n’agha. N’afọ 1919, Jehova napụtara ha, mee ka o doo anya na ha dị iche ná ndị ahụ bụ́ “ata,” ya bụ, Ndị Kraịst adịgboroja. Ọ haziri “ụmụ nke alaeze” otú ahụ Aịzaya buru n’amụma. Aịzaya kwuru, sị: “À ga-amụ ala n’otu ụbọchị site n’ime oké mgbalị? Ka à ga-amụ mba n’otu mgbe? N’ihi na ime mere Zayọn, ọ mụwokwa ụmụ ya ndị ikom.” (Aịza. 66:8) Zayọn e kwuru okwu ya n’amaokwu a bụ nzukọ Jehova nke ndị mmụọ ozi nọ na ya. Amaokwu ahụ kwuru na Zayọn mụrụ nwa. Ihe ọ pụtara bụ na a malitere inwe mba ọhụrụ n’ụwa, ya bụ, Ndị Kraịst e tere mmanụ.

12. Olee otú ndị e tere mmanụ sirila gosi na ha bụ ndị Jehova ‘wepụtaara aha ya’ taa?

12 Ndị Kraịst oge mbụ bụ ndị àmà Jehova. Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị “ụmụ nke Alaeze” bụ́ ndị e tere mmanụ. (Gụọ Aịzaya 43:1, 10, 11.) Ha ga-adị iche n’ihi àgwà ọma ha na ozi ọma Alaeze Chineke ha na-ekwusa “ka ọ bụrụ àmà nye mba niile.” (Mat. 24:14; Fil. 2:15) Ha esila otú a mee ka ọtụtụ nde mmadụ bụrụ ndị ezi omume n’anya Jehova.—Gụọ Daniel 12:3.

“ANYỊ GA-ESO UNU”

13, 14. Ọ bụrụ na ndị na-abụghị ndị e tere mmanụ chọrọ ka Jehova nabata ofufe ha, gịnị ka ha kwesịrị ime? Olee otú Baịbụl si buo ya n’amụma?

13 Isiokwu bu nke a ụzọ gosiri na n’Izrel oge ochie, ọ bụrụ na ndị mba  ọzọ esoro ndị Izrel na-efe Jehova, ọ na-anabata ofufe ha. (1 Eze 8:41-43) Taakwa, ọ bụrụ na ndị na-abụghị ndị e tere mmanụ chọrọ ka Chineke nabata ofufe ha, ha ga-eso ndị bụ́ Ndịàmà Jehova e tere mmanụ na-efe Chineke. Ọ bụ ndị ahụ ka Baịbụl kpọrọ “ụmụ nke Alaeze.”

14 N’oge ochie, e nwere ndị amụma abụọ kwuru na ọtụtụ ndị ga-eso ndị Jehova na-efe ya n’oge ikpeazụ a. Aịzaya buru amụma, sị: “Ọtụtụ ndị ga-ejekwa wee sị: ‘Bịanụ ka anyị gbagoo n’ugwu Jehova, n’ụlọ Chineke nke Jekọb; ọ ga-akụziri anyị ụzọ ya, anyị ga-ejekwa ije n’ụzọ ya.’ N’ihi na ọ bụ na Zayọn ka iwu ga-esi pụta, okwu Jehova ga-esikwa na Jeruselem pụta.” (Aịza. 2:2, 3) Zekaraya bukwara amụma na “ọtụtụ ndị nakwa mba ndị dị ike ga-abịa chọọ Jehova nke ụsụụ ndị agha n’ime Jeruselem, meekwa ka obi Jehova jụrụ.” O kwuru na ha ga-abụ “ndị ikom iri ndị si n’asụsụ niile nke mba dị iche iche” nakwa na ha ga-ejide uwe mwụda nke ndị so n’Izrel nke Chineke ma sị ha: “Anyị ga-eso unu, n’ihi na anyị anụwo na Chineke nọnyeere unu.”—Zek. 8:20-23.

15. Olee ọrụ “atụrụ ọzọ” ‘so’ Izrel nke Chineke na-arụ?

15 “Atụrụ ọzọ” ‘so’ Izrel nke Chineke na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. (Mak 13:10) Ha so bụrụ ndị Chineke. Ha na ndị e tere mmanụ bụkwa “otu ìgwè atụrụ” “onye ọzụzụ atụrụ ọma,” bụ́ Kraịst Jizọs, na-edu.—Gụọ Jọn 10:14-16.

NỌSIE IKE N’ỌGBAKỌ KA JEHOVA CHEBE GỊ

16. Olee otú Jehova ga-esi mee ka ihe ikpeazụ ga-eme “n’oké mkpagbu” malite?

16 E bibichaa Babịlọn Ukwu ahụ, a ga-alụso ndị Jehova ọgụ. N’oge ahụ, ọ bụ naanị Jehova ga-echebe anyị ka a ghara ikpochapụ anyị. Ebe ọ bụ na ọgụ ahụ a ga-alụso ndị Jehova ga-akpata ihe ikpeazụ ga-eme “n’oké mkpagbu ahụ,” ọ bụ Jehova ga-eme ka ihe o bu n’obi mee. Ọ bụkwa ya ga-ekpebi mgbe ọ ga-abụ. (Mat. 24:21; Ezik. 38:2-4) N’oge ahụ, Gọg ga-alụso ndị Jehova ọgụ. Baịbụl kpọrọ ha “ndị e si ná mba dị iche iche kpọkọta.” (Ezik. 38:10-12) Ọgụ ahụ ga-egosi na oge eruola ka Jehova napụta ndị ya ma lụso Gọg na ndị agha ya ọgụ. Jehova ga-egosi na ọ bụ ya bụ Ọkaakaa, meekwa ka aha ya dị nsọ. O kwuru, sị: “M ga-eme . . . ka a mara m n’anya ọtụtụ mba; ha ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova.”—Ezik. 38:18-23.

“N’oké mkpagbu” ahụ, anyị kwesịrị ịnọsi ike n’ọgbakọ anyị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16 ruo nke 18)

17, 18. (a) Mgbe Gọg ga-amalite ịlụso ndị Chineke ọgụ, gịnị ka Chineke ga-agwa ndị ya ka ha mee? (b) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Jehova chebe anyị, gịnị ka anyị kwesịrị ime?

17 Mgbe Gọg ga-amalite ịlụso ndị Chineke ọgụ, Jehova ga-agwa ndị ohu ya, sị: “Ndị m, gaanụ banye n’ọnụ ụlọ unu dị n’ime, mechiekwanụ ọnụ ụzọ mgbe unu banyesịrị. Zoonụ ruo nwa mgbe nta, ruo mgbe oké iwe gafere.” (Aịza. 26:20) N’oge ahụ, Jehova ga-agwa anyị ihe anyị ga-eme ka anyị dị ndụ. ‘Ọnụ ụlọ dị n’ime’ Jehova kwuru okwu ya nwere ike ịbụ ọgbakọ anyị dị iche iche.

18 N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Jehova chebe anyị n’oké mkpagbu ahụ, anyị kwesịrị ịghọta na Jehova nwere ndị na-anọchite anya ya n’ụwa nakwa na ọ haziri ha n’ọgbakọ dị iche iche. Anyị kwesịrị ịna-akwado ndị Jehova, nọsiekwa ike n’ọgbakọ anyị. Ka anyị jiri obi anyị niile soro ọbụ abụ kwuo, sị: “Ọ bụ Jehova nwe nzọpụta. Ngọzi gị dị n’ahụ́ ndị gị.”—Ọma 3:8.