Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) NỌVEMBA 2014

“Ndị Chineke Ha Bụ Jehova”

“Ndị Chineke Ha Bụ Jehova”

“Obi ụtọ na-adịrị ndị Chineke ha bụ Jehova!”—ỌMA 144:15.

1. Gịnị ka ụfọdụ ndị na-ekwu gbasara ndị na-efe Chineke n’ụwa?

TAA, ọtụtụ ndị na-ekwu na o nweghị ezigbo ihe okpukpe ndị a ma ama n’ụwa na-eme iji nyere ndị mmadụ aka. Ụfọdụ na-ekwu na okpukpe ndị ahụ adịghị Chineke mma n’ihi na ha anaghị akụzi eziokwu gbasara Chineke. Ha na-emekwa ihe ndị jọgburu onwe ha. Ma, ụfọdụ ndị na-ekwukarị na e nwere ndị bụ́ ezigbo mmadụ n’okpukpe niile nakwa na Chineke na-ahụ ha, na-anabatakwa ofufe ha. Ha echeghị na ụdị ndị ahụ kwesịrị ịhapụ okpukpe ụgha ka ha nwee ike ịna-efe Chineke otú ọ chọrọ. Ma, ọ̀ bụ eziokwu? Ka anyị leba anya n’ihe ụfọdụ Baịbụl kọrọ gbasara ndị fere Jehova otú ọ chọrọ. Ọ ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ a.

NDỊ HA NA CHINEKE GBARA NDỤ

2. Olee ndị mechara bụrụ ndị Jehova? Gịnị gosiri na ha dị iche ná ndị ọzọ? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

2 Ihe dị ka puku afọ abụọ tupu oge Ndị Kraịst, e nwere ndị Jehova họọrọ ka ha bụrụ ndị ya n’ụwa. Na Baịbụl, a kpọrọ Ebreham “nna nke ndị niile nwere okwukwe.” Ọ bụ onyeisi ezinụlọ. Ndị nọ n’ezinụlọ ya rukwara ọtụtụ  narị mmadụ. (Rom 4:11; Jen. 14:14) Ndị na-achị ala Kenan kpọrọ ya “onyeisi.” Ha kwanyekwaara ya ùgwù. (Jen. 21:22; 23:6) Jehova na Ebreham na ụmụ ya gbara ndụ. (Jen. 17:1, 2, 19) Chineke gwara Ebreham, sị: “Nke a bụ ọgbụgba ndụ m nke unu ga-edebe, nke ga-adị n’etiti mụ na unu, ọbụna mkpụrụ gị nke ga-anọchi gị: A ga-ebi nwoke ọ bụla n’ime unu úgwù. . . . Ọ ga-abụ ihe ịrịba ama nke ọgbụgba ndụ ahụ dị n’etiti mụ na unu.” (Jen. 17:10, 11) N’ihi ya, e biri Ebreham na ụmụ nwoke niile nọ n’ezinụlọ ya úgwù. (Jen. 17:24-27) Úgwù ahụ e biri ụmụ Ebreham gosiri na ọ bụ naanị ha ka ha na Jehova gbara ndụ.

3. Olee otú ụmụ Ebreham si ghọọ mba?

3 Nwa nwa Ebreham aha ya bụ Jekọb ma ọ bụ Izrel mụrụ ụmụ nwoke iri na abụọ. (Jen. 35:10, 22b-26) Ụmụ ya ndị a mechara bụrụ ndị nna ebo iri na abụọ nke Izrel. (Ọrụ 7:8) Ka oge na-aga, Jekọb na ezinụlọ ya gara biri n’Ijipt n’ihi ụnwụ nri. N’ebe ahụ, ọ bụ Josef nwa Jekọb ka Fero mere onye na-elekọta nri. Ọ bụkwa ya bụ osote Fero. (Jen. 41:39-41; 42:6) Ụmụ Jekọb mechara dị ọtụtụ, ghọọkwa “ìgwè ndị dị iche iche.”—Jen. 48:4; gụọ Ọrụ Ndịozi 7:17.

NDỊ JEHOVA GBAPỤTARA

4. Ná mmalite, olee otú ndị Ijipt na ụmụ Jekọb si biri?

4 Ụmụ Jekọb biri ihe karịrị narị afọ abụọ n’Ijipt. Ha bi n’ebe a na-akpọ Goshen, nke dị n’akụkụ Osimiri Naịl. (Jen. 45:9, 10) O yiri ka ha na ndị Ijipt bi n’udo ruo ihe dị ka otu narị afọ. N’ebe ahụ, ha bi n’obere obodo dị iche iche na-azụ anụ ụlọ ha. Fero nabatara ha nke ọma n’ihi na ọ ma Josef, na-akwanyekwara ya ùgwù. (Jen. 47:1-6) Ma, ndị Ijipt anaghị achọ iji anya ahụ ndị na-azụ atụrụ. (Jen. 46:31-34) N’agbanyeghị nke ahụ, ha kwere ka ndị Izrel biri n’ala ha.

5, 6. (a) Olee otú ndị Chineke si gbawa ohu n’Ijipt? (b) Olee otú e si chebe Mozis? Gịnị ka Jehova meere ndị ya niile?

5 Ka oge na-aga, ndị Ijipt ji ụmụ Izrel mere ohu. Baịbụl kwuru, sị: “Eze ọhụrụ nke na-amaghị Josef malitere ịchị Ijipt. O wee gwa ndị ya, sị: ‘Lee! Ndị Izrel dị ọtụtụ ma dị ike karịa anyị.’ N’ihi ya, ndị Ijipt ji ọchịchị aka ike mee ka ụmụ Izrel gbaa ohu. Ha wee na-eme ka ndụ na-elu ha ilu site n’ime ka ha na-arụgbu onwe ha n’ọrụ n’ịkpụ ájá ụrọ na brik, nakwa ịrụgbu onwe ha n’ọrụ n’ụdị ọrụ ọ bụla a na-arụ n’ubi, ee, n’ụdị ọrụ ọ bụla ha ji ọchịchị aka ike mee ka ha na-arụrụ ha dị ka ndị ohu.”—Ọpụ. 1:8, 9, 13, 14.

6 Fero ọhụrụ a nyere iwu ka e gbuo nwa nwoke ọ bụla bụ́ onye Hibru ozugbo a mụrụ ya. (Ọpụ. 1:15, 16) Ọ bụ mgbe ahụ ka a mụrụ Mozis. Mgbe ọ dị ọnwa atọ, mama ya zoro ya n’etiti ahịhịa amị n’akụkụ Osimiri Naịl. Ọ bụ n’ebe ahụ ka ada Fero hụrụ ya ma mechaa jiri ya mere nwa. Chineke nyere aka, ya abụrụ Jokebed bụ́ mama Mozis zụrụ Mozis. Ka oge na-aga, Mozis ji obi ya niile na-ejere Jehova ozi. (Ọpụ. 2:1-10; Hib. 11:23-25) Jehova ‘hụrụ’ ahụhụ ndị ya na-ata ma kpebie na ya ga-esi n’aka Mozis napụta ha. (Ọpụ. 2:24, 25; 3:9, 10) Ọ bụ otú ahụ ka ha ga-esi bụrụ ndị Jehova “gbapụtara.”—Ọpụ. 15:13; gụọ Diuterọnọmi 15:15.

OTÚ NDỊ CHINEKE SI GHỌỌ MBA

7, 8. Olee otú ndị Jehova si ghọọ mba dị nsọ?

7 N’agbanyeghị na Jehova emebeghị ka ndị Izrel bụrụ mba n’oge ahụ,  ọ họọrọ ha ka ha bụrụ ndị ya. Ọ bụ ya mere o ji gwa Mozis na Erọn ka ha gaa gwa Fero, sị: “Nke a bụ ihe Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru, ‘Hapụ ndị m ka ha gaa meere m ememme n’ala ịkpa.’”—Ọpụ. 5:1.

8 Otú Jehova si napụta ụmụ Izrel n’ohu ha na-agba n’Ijipt bụ na o tiri ndị Ijipt ihe otiti iri, gbuokwa Fero na ndị agha ya n’Oké Osimiri Uhie. (Ọpụ. 15:1-4) Mgbe ihe na-erughị ọnwa atọ gara, Jehova na ndị Izrel gbara ndụ n’Ugwu Saịnaị. Ọ gwara ha, sị: “Ọ bụrụ na unu ga-erube nnọọ isi n’ihe m kwuru ma debe ọgbụgba ndụ m n’ezie, unu ga-aghọ ihe onwunwe m pụrụ iche n’etiti ndị niile ọzọ, . . . na mba dị nsọ.”—Ọpụ. 19:5, 6.

9, 10. (a) Dị ka e kwuru na Diuterọnọmi 4:5-8, olee otú Iwu Chineke nyere ụmụ Izrel si mee ka ha dị iche ná mba ndị ọzọ? (b) Olee otú ndị Izrel ga-esi ‘abụrụ Jehova ndị dị nsọ’?

9 Mgbe ahụ ụmụ Izrel bi n’Ijipt, ya bụ, tupu ha aghọọ ndị ohu, ezinụlọ ọ bụla nwere onyeisi ezinụlọ na-ekwu ihe a ga-eme na ya. Ọ bụ ndị isi ezinụlọ ndị ahụ bụ ma ndị ọchịchị ma ndị ikpe ma ndị nchụàjà n’ezinụlọ ha. Ọ bụ otú ahụ ka e si hazie ndị Chineke tupu mgbe ahụ. (Jen. 8:20; 18:19; Job 1:4, 5) Ma, Jehova mechara si n’aka Mozis nye ụmụ Izrel iwu ga-eme ka ha dị iche ná mba ndị ọzọ. (Gụọ Diuterọnọmi 4:5-8; Ọma 147:19, 20.) Iwu ahụ mere ka e nwee ndị nchụàjà, nweekwa “ndị okenye” na-ekpe ikpe. Ha bụ ndị a na-akwanyere ùgwù n’ihi amamihe ha. (Diut. 25:7, 8) Iwu ahụ kwuru otú ndị Izrel ga-esi na-efe Chineke na otú ha ga-esi na-eme ihe ndị ọzọ.

10 Tupu ụmụ Izrel abaa n’Ala Nkwa, Jehova gwara ha ihe ndị ahụ ọ gwaburu ha n’iwu ahụ o nyere ha. Mozis gwara ha, sị: “Jehova emewo ka i kwuo taa na unu ga-abụ ndị ya, bụ́ ihe onwunwe ya pụrụ iche, dị nnọọ ka o kwere gị ná nkwa, nakwa na ị ga-edebe ihe niile o nyere n’iwu, nakwa na ya onwe ya ga-eme ka ị dị elu karịa mba niile ọzọ o kere, bụ́ nke ga-eweta otuto na aha ọma nakwa ịma mma dị nnọọ ka o kwere ná nkwa, ọ bụrụhaala na unu abụụrụ Jehova bụ́ Chineke gị ndị dị nsọ.”—Diut. 26:18, 19.

NDỊ MBA ỌZỌ NWERE IKE ISO NDỊ CHINEKE NA-EFE YA

11-13. (a) Ole ndị sooro ndị Izrel na-efe Chineke? (b) Ndị na-abụghị ndị Izrel chọọ ife Jehova, gịnị ka ha kwesịrị ime?

11 N’agbanyeghị na Jehova họọrọ ụmụ Izrel ka ha bụrụ ndị ya n’ụwa, e nwere ụfọdụ ndị mba ọzọ o kwere ka ha na ha biri. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru na “ìgwè mmadụ gwara ọgwa” so ndị Izrel mgbe Chineke napụtara ha n’aka ndị Ijipt. Ụfọdụ n’ime ndị ahụ bụ ndị Ijipt. (Ọpụ. 12:38) Mgbe a chọrọ iti ndị Ijipt ihe otiti nke asaa, ụfọdụ “ndị na-ejere Fero ozi” tụrụ okwu Jehova egwu. Ọ ga-abụkwa na ha so ‘n’ìgwè mmadụ ahụ gwara ọgwa’ so ndị Izrel mgbe ha na-apụ n’Ijipt.—Ọpụ. 9:20.

12 Mgbe ọ fọrọ obere ka ụmụ Izrel gafee Osimiri Jọdan ma baa n’ala Kenan, Mozis gwara ha na ha ‘ga-ahụkwa onye mbịarambịa ha na ya bi n’anya.’ (Diut. 10:17-19) Ọ bụrụ na onye mba ọzọ kwetara ime ihe ndị bụ́ isi sekpụ ntị n’Iwu Mozis, Chineke gwara ụmụ Izrel ka ha kwe ka ha na ya biri. (Lev. 24:22) Ụfọdụ ndị mba ọzọ mechara fewe Jehova. Ha mere ụdị ihe ahụ Rut bụ́ nwaanyị Moab mere. Rut gwara Naomi, sị: “Ndị gị ga-abụ ndị m, Chineke gị ga-abụkwa Chineke m.” (Rut 1:16) Ihe a na-akpọ ndị  mba ọzọ a bụ ndị a tọghatara atọghata. E bikwara ụmụ nwoke ha úgwù. (Ọpụ. 12:48, 49) Jehova nabatara ha ka ha soro ná ndị ya.—Ọnụ Ọgụ. 15:14, 15.

Ndị Izrel hụrụ ndị mbịarambịa ha na ha bi n’anya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11 ruo nke 13)

13 Ihe Sọlọmọn kwuru n’ekpere o kpere mgbe a na-enyefe Jehova ụlọ nsọ ahụ ọ rụrụ gosiri na Jehova na-anabata ndị mba ọzọ na-efe ya. Sọlọmọn kwuru, sị: “Onye mba ọzọ, onye na-esoghị ná ndị gị Izrel, onye sikwa n’ala dị anya bịa n’ihi aha gị dị ukwuu nakwa n’ihi aka gị dị ike nakwa n’ihi ogwe aka gị ị gbatịrị agbatị, o wee bịa chee ihu n’ụlọ a kpee ekpere, mgbe ahụ, gị onwe gị, nọrọ n’eluigwe, bụ́ ebe obibi gị guzosiri ike, nụrụ, meekwa ihe niile mere onye mba ọzọ ahụ ji na-akpọku gị; ka ndị niile nke ụwa wee mara aha gị wee tụọ egwu gị dị ka ndị gị Izrel na-eme, ka ha wee marakwa na a kpọkwasịwo aha gị n’ụlọ a m wuru.” (2 Ihe 6:32, 33) Otú ahụ ka ọ dịkwa n’oge Jizọs. Ndị na-abụghị ndị Izrel chọọ ife Jehova, ha kwesịrị iso ndị Jehova họọrọ na-efe ya.—Jọn 12:20; Ọrụ 8:27.

MBA NKE BỤ́ NDỊ ÀMÀ JEHOVA

14-16. (a) Olee otú mba Izrel ga-esi gosi na ha bụ ndị àmà Jehova? (b) Gịnị ka ndị Jehova n’oge anyị a kwesịrị ime?

14 N’oge ochie, ụmụ Izrel na-efe Jehova bụ́ Chineke ha. Ma, ndị mba ọzọ na-efe chi ha dị iche iche. N’oge Aịzaya onye amụma, Jehova ji ihe na-eme n’ụwa tụnyere ihe na-eme n’ụlọikpe. Ọ gwara chi mba dị iche iche ka ha kpọta ndị àmà ha iji gosi na ha bụ chi. O kwuru, sị: “Ka a kpọkọta mba niile n’otu ebe, ka e meekwa ka mba dị iche iche zukọta. Ònye n’etiti [chi] ha pụrụ ịkọ ihe a? Ka hà pụrụ ime ka a nụrụ ọbụna ihe mbụ ga-emenụ? Ka ha kpọpụta ndị àmà ha, ka a gụọ ha ná ndị ezi omume, ma ọ bụ, ka ha nụ ya wee sị, ‘Ọ bụ eziokwu!’”—Aịza. 43:9.

15 Chi ndị mba ọzọ egosilighị na ha bụ chi. Ha bụ arụsị na-anaghị ekwu okwu. A na-ebukwa ha ebu. (Aịza. 46:5-7) Ma, Jehova gwara ndị Izrel, sị: “Unu bụ ndị àmà m, . . . ọbụna ohu m nke m họọrọ, ka unu  wee mara, nweekwa okwukwe n’ebe m nọ, ka unu wee ghọtakwa na abụ m otu Onye ahụ. Ọ dịghị Chi a kpụrụ tupu mụ onwe m, ọ dịghịkwa nke sochiri m. Mụ onwe m bụ Jehova, e nweghịkwa onye nzọpụta ọzọ ma e wezụga m. . . . Ya mere, unu bụ ndị àmà m, . . . abụkwa m Chineke.”—Aịza. 43:10-12.

16 Otu ajụjụ dị mkpa e kwesịrị ịza ma n’eluigwe ma n’ụwa bụ “Ònye bụ Chineke Kacha Elu?” Ndị Jehova họọrọ ga-eme ka o doo onye ọ bụla anya na ọ bụ naanị Jehova bụ ezi Chineke. Ọ ga-adị ka hà nọ n’ụlọikpe na-agbara Jehova akaebe. Ọ kpọrọ ha “ndị m kpụụrụ onwe m, ka ha wee kọọ akụkọ otuto m.” (Aịza. 43:21) Ọ bụ ha na-aza aha Jehova. Ebe ọ bụ na Jehova si n’Ijipt kpọpụta ha, ọ chọrọ ka ha jiri aka ha kpebie irubere ya isi ma mee ka ndị niile bi n’ụwa ghọta na ọ bụ ya bụ Ọkaakaa. Ha kwesịrị ime ihe ahụ Maịka onye amụma mechara kwuo gbasara ndị Chineke n’oge anyị a. Ọ sịrị: “Ndị niile dị iche iche ga na-ejegharị, onye ọ bụla n’aha chi ya; ma anyị onwe anyị ga na-ejegharị n’aha Jehova bụ́ Chineke anyị ruo mgbe ebighị ebi, ọbụna ruo mgbe niile ebighị ebi.”—Maị. 4:5.

NDỊ NNUPỤISI

17. N’anya Jehova, olee otú ụmụ Izrel si ghọọ ‘osisi vaịn mebiri emebi nke si ebe ọzọ’?

17 Ọ dị mwute na ụmụ Izrel mechara nupụrụ Jehova bụ́ Chineke ha isi. Ha bidoro mewe ka ndị mba ọzọ, na-efe chi ndị e ji osisi na nkume mee, rụọkwara chi ndị ahụ ọtụtụ ebe ịchụàjà. N’ihe dị ka narị afọ asatọ Tupu Oge Ndị Kraịst, Hosia onye amụma kwuru na ndị Izrel bụ osisi vaịn mebiri emebi nakwa na ha rụrụ ọtụtụ ebe ịchụàjà. O kwukwara, sị: “Obi ha dị aghụghọ; ugbu a, a ga-ama ha ikpe.” (Hos. 10:1, 2) Ihe dị ka otu narị afọ na iri ise o kwuchara ihe ahụ, Jeremaya dere ihe Jehova gwara ndị ya na-ekwesịghị ntụkwasị obi. Ọ sịrị: “Mụ onwe m kụrụ gị dị ka ezi mkpụrụ vaịn uhie, ọ bụ naanị ezi mkpụrụ vaịn. Oleezi otú i si gbanwee n’ebe m nọ wee ghọọ alaka mebiri emebi nke osisi vaịn si ebe ọzọ? . . . Ma olee ebe chi ndị i meere onwe gị nọ? Ka ha bilie ma ọ bụrụ na ha nwere ike ịzọpụta gị n’oge ọdachi gị . . . Ndị m echefuwo m.”—Jere. 2:21, 28, 32.

18, 19. (a) Olee otú Jehova si buo amụma na ya ga-enwe mba ọhụrụ n’ụwa? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza n’isiokwu na-esonụ?

18 Ụmụ Izrel kwesịrị ịmị ezigbo mkpụrụ, ya bụ, ha kwesịrị ịna-efe Jehova ofufe dị ọcha ma na-eme ihe gosiri na ha bụ ndị àmà ya kwesịrị ntụkwasị obi. Kama ime otú ahụ, ha kpeere arụsị, si otú ahụ gosi na ha na-amị mkpụrụ ọjọọ. N’ihi ya, n’oge Jizọs, ọ gwara ndị ndú ndị Juu bụ́ ndị ihu abụọ, sị: “A ga-anapụ unu alaeze Chineke, werekwa ya nye mba nke na-amị mkpụrụ ya.” (Mat. 21:43) Ọ bụ naanị ndị so ‘n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ’ ahụ Jehova si n’ọnụ Jeremaya onye amụma kwuo gbasara ya ga-eso n’Izrel nke Chineke. Jehova buru amụma banyere ha, sị: “M ga-abụ Chineke ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị m.”—Jere. 31:31-33.

19 Mgbe ụmụ Izrel nupụchaara Jehova isi, ọ họọrọ Izrel nke Chineke ka ha bụrụ ndị ya n’oge ndịozi Jizọs. Ma ole ndị bụ ndị Chineke n’ụwa taa? Olee otú ndị chọrọ ife Chineke ga-esi ama ndị na-efe ya ezi ofufe? A zara ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.