Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) NỌVEMBA 2014

 IHE SI N’EBE ANYỊ NA-EDEBE IHE OCHIE

Otú Ìhè Si Malite Inwu na Japan

Otú Ìhè Si Malite Inwu na Japan

E ji akwụkwọ ịkpọ òkù kpọsaa okwu ihu ọha na Tokio, sikwa n’ụgbọelu na-atụpụrụ ya ndị mmadụ n’obodo Osaka

N’ABALỊ isii n’ọnwa itoolu n’afọ 1926, otu onye Japan nke bụ́ onye pilgrim n’Amerịka laghachiri Japan ka ọ gaa bụrụ onye ozi ala ọzọ. Ihe a na-akpọ onye pilgrim ugbu a bụ onye nlekọta sekit. E nwere otu nwoke nọ na-eche ya ka ọ lọta. N’oge ahụ, ọ bụ naanị nwoke ahụ tụrụ ọda ka a na-ewetara ya Ụlọ Nche. E nwekwara mmadụ ole na ole ya na ha na-amụkọ Baịbụl ọnụ na Kobi. Ndị Mmụta Baịbụl nwere mgbakọ mbụ ha n’obodo ahụ n’abalị abụọ n’ọnwa mbụ n’afọ 1927. Mmadụ iri atọ na isii bịara ya, e meekwa mmadụ asatọ baptizim. Otú a ha si malite magburu onwe ya. Ma, olee otú mmadụ ole na ole a ga-esi nyere nde mmadụ iri isii bi na Japan aka ka ha hụ ìhè eziokwu Baịbụl?

N’ọnwa ise n’afọ 1927, Ndị Mmụta Baịbụl ji obi ha niile malite ịkpọsa okwu ihu ọha ndị si na Baịbụl. Mgbe a chọrọ ikwu okwu ihu ọha nke mbụ n’obodo Osaka, ụmụnna mapawara ihe gbasara okwu ihu ọha ahụ na saịn bọọdụ ndị e gwunyere n’akụkụ ụzọ nakwa ná nnukwu bọọdụ ndị dị n’obodo ahụ. Ha zigakwaara ndị a ma ama puku akwụkwọ ịkpọ òkù atọ. Ha kesara otu narị puku akwụkwọ ịkpọ òkù na puku iri ise, kpọsaakwa okwu ihu ọha ahụ n’akwụkwọ akụkọ ndị a ma ama n’Osaka nakwa na narị puku tiketi anọ e ji agba ụgbọ okporo ígwè. N’ụbọchị a ga-ekwu okwu ahụ, ụgbọelu abụọ nọ na-efegharị n’obodo ahụ, ụmụnna esi na ha na-atụpụrụ ndị mmadụ akwụkwọ ịkpọ òkù ruru otu narị puku. Ọ bụ n’ụlọ ezumezu dị n’Osaka Asahi ka a nọ kwuo okwu ahụ isiokwu ya bụ “Alaeze Chineke Dị Nso.” Ihe dị ka puku mmadụ abụọ na narị atọ bịara gere ya. Ụlọ ezumezu ahụ juru n’ọnụ. N’ihi ya, a gwara ihe dị ka otu puku ndị ọzọ bịaranụ ka ha lawa. Mgbe e kwuchara okwu ahụ, ihe karịrị narị isii n’ime ndị ahụ bịaranụ cheere ka a zaa ajụjụ ndị ha chọrọ ịjụ. N’ọnwa ndị na-eso ya, e kwuru okwu ihu ọha ndị ọzọ na Kioto nakwa n’obodo ndị ọzọ dị n’ebe ọdịda anyanwụ Japan.

N’ọnwa iri n’afọ 1927, Ndị Mmụta Baịbụl haziri okwu ihu ọha ndị a ga-ekwu na Tokio. Ha zigaara ndị a ma ama n’obodo ahụ akwụkwọ ịkpọ òkù, ya bụ, praịm minista, ndị omeiwu, nakwa ndị ndú okpukpe na ndị ọchịagha. Ha kpọsara okwu ahụ n’akwụkwọ ndị ha mapawara n’ebe dị iche iche nakwa n’akwụkwọ akụkọ, kesaakwa narị puku akwụkwọ ịkpọ òkù asaa na puku iri. Ndị bịara gere okwu ihu ọha atọ e kwuru n’isi obodo Japan dị puku anọ na narị asatọ.

NDỊ KỌPỌTỤA JI ỊNỤ ỌKỤ N’OBI KWUSAA OZI ỌMA

Nwanna Katsuo Miura na Hagino nwunye ya

Ndị kọpọtụa (ya bụ, ndị ọsụ ụzọ) gbara mbọ gaa n’ụlọ ndị mmadụ na-ezi ha ozi ọma. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Matsue Ishii so ná ndị kọpọtụa mbụ e nwere na Japan. E kee ndị bi na Japan ụzọ anọ, ya na di ya aha ya bụ Jizo ziri ụzọ atọ ozi ọma. Ha si Saporo dị n’ebe ugwu ziri ozi ọma ruo Sendaị, Tokio, Yokohama, Nagoya, Osaka, Kioto, Okayama, na Tokushima. Nwanna Nwaanyị Ishii na nwanne ya nwaanyị tọrọ ya aha ya bụ Sakiko Tanaka yiiri uwe pụrụ iche ndị Japan na-eyi gaa hụ ndị ọnụ na-eru n’okwu n’ọchịchị Japan. Otu n’ime ha kwuru ka e wetara ya akwụkwọ abụọ a kpọrọ The Harp of God na Deliverance ọ ga-edewe n’ọ́bá akwụkwọ ndị dị n’ụlọ mkpọrọ. Akwụkwọ nke ọ bụla ga-adị narị atọ.

Otu nwoke aha ya bụ Katsuo Miura na nwunye ya bụ́ Hagino so ná ndị Nwanna Nwaanyị Ishii nyere  akwụkwọ, ha aghọta ozugbo na ihe e kwuru na ya bụ eziokwu. E mere ha baptizim n’afọ 1931, ha emechaa ghọọ ndị kọpọtụa. Onye ọzọ aha ya bụ Haruichi Yamada na nwunye ya bụ́ Tane natara eziokwu tupu afọ 1930, ha na ọtụtụ ndị ezinụlọ ha. Nwanna Yamada na nwunye ya ghọrọ ndị kọpọtụa, nwa ha nwaanyị bụ́ Yukiko agaa jewe ozi na Betel dị na Tokio.

JIHU NDỊ NNUKWU NA JIHU NDỊ OBERE

Jihu Nnukwu na-aba ndị ọsụ ụzọ isii

N’oge ahụ, ụgbọala bụ aka eru ogbenye. E nweghịkwa ezigbo okporo ụzọ. N’ihi ya, otu nwanna aha ya bụ Kazumi Minoura na ụmụ okorobịa ndị ọzọ bụ́ ndị kọpọtụa nwere ụgbọala ndị ha ji mere ụlọ. Ma ụgbọala ndị ahụ enweghị injin. Ihe ha kpọrọ ụgbọala ndị ahụ bụ “Jihu,” nke bụ́ aha otu nwoke na-agba ụgbọ ịnyịnya ike ike. O mechara bụrụ eze n’Izrel. (2 Eze 10:15, 16) Ha kpọrọ atọ n’ime ụgbọala ndị ahụ Jihu Nnukwu. Nke ọ bụla dị ihe dị ka amaụkwụ asaa n’ogologo, na ihe dị ka amaụkwụ isii n’obosara na n’ogo. Nke ọ bụla nwere ike ịba ndị ọsụ ụzọ isii. A nọkwa n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Japan rụọ ndị nke obere a kpọrọ Jihu Obere. Ha dị iri na otu. A na-eji ígwè adọkpụ ha. Nwanna Kiichi Iwasaki so ná ndị rụrụ ha. O kwuru, sị, “Jihu nke ọ bụla nwere ihe a ga-eji na-ekpuchi ya, nweekwa batrị ụgbọala ga na-enye ọkụ na ya.” Ndị kọpọtụa mere ka ìhè nke eziokwu Chineke na-enwu n’ebe niile na Japan. Ha dọkpụ ụgbọala ndị ahụ gafee ma ebe ndị bụ́ ugwu ma ebe ndị bụ́ ndagwurugwu, si n’obodo Họkaịdo dị n’ebe ugwu ruo Kiushu dị n’ebe ndịda.

Jihu Obere na-aba ndị ọsụ ụzọ abụọ

Otu onye kọpọtụa aha ya bụ Ikumatsu Ota kwuru, sị: “Ọ na-abụ anyị ruo n’obodo, anyị adọwa ụgbọala ahụ n’akụkụ osimiri ma ọ bụ n’ebe ahịhịa na-adịghị. Anyị na-ebu ụzọ gaa hụ onyeisi obodo na ndị ọzọ a ma ama. Anyị hụchaa ha, anyị agazie n’ụlọ ndị mmadụ nyewe ha akwụkwọ. Anyị gazuo obodo ahụ, anyị agawa n’obodo ọzọ.”

E nwere ike ịkpọ oge ahụ “ụbọchị ihe nta” n’ihi na n’oge ahụ, ọ bụ naanị Ndị Mmụta Baịbụl iri atọ na isii bịara mgbakọ mbụ ha nwere na Kobi. (Zek. 4:10) Mgbe naanị afọ ise gara, ya bụ, n’afọ 1932, ndị kọpọtụa na ndị nkwusa nyere akụkọ ozi ha na Japan dị otu narị na atọ. Akwụkwọ ha nyere ndị mmadụ karịrị puku iri na anọ. Taa, ná nnukwu obodo ndị dị na Japan, a haziela nke ọma otú e si na-ezi ndị mmadụ ozi ọma n’ebe ndị na-ekwo ekwo. Ihe dị ka narị puku ndị nkwusa abụọ na iri puku abụọ na-eme ka ìhè ha na-enwu na Japan.—Ihe si n’ebe anyị na-edebe ihe ochie na Japan.

Nwanna Kiichi Iwasaki so rụọ Jihu ndị ahụ na Betel dị na Japan. Ihe a bụ ebe o sere otú ha ga-adị ma a rụchaa ha