Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) NỌVEMBA 2014

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Olee otú e si ahọpụta ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi n’ọgbakọ ọ bụla?

N’oge ndịozi Jizọs, Pọl onyeozi gwara ndị okenye nọ n’ọgbakọ Efesọs, sị: “Na-elezinụ onwe unu na ìgwè atụrụ ahụ dum anya, nke mmụọ nsọ họpụtara unu ka unu bụrụ ndị na-elekọta ya, ka unu na-azụ ọgbakọ Chineke dị ka atụrụ, nke o ji ọbara Ọkpara ya zụta.” (Ọrụ 20:28) Olee ọrụ mmụọ nsọ na-arụ mgbe a na-ahọpụta ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi?

Nke mbụ bụ na ọ bụ mmụọ nsọ mere ka ndị dere Baịbụl dee ihe mmadụ ga-eme, ya eruo eruo ịbụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi. Na 1 Timoti 3:1-7, e kwuru ihe iri na isii a chọrọ n’aka ndị okenye. E kwukwara ihe ndị ọzọ a chọrọ n’aka ha na Taịtọs 1:5-9 nakwa na Jems 3:17, 18. E kwuru ihe a chọrọ n’aka ndị ohu na-eje ozi na 1 Timoti 3:8-10, 12, 13. Nke abụọ bụ na ndị tụrụ aro ka a họpụta mmadụ ka ọ bụrụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi nakwa ndị họpụtara ya na-ebu ụzọ kpee ekpere ka mmụọ nsọ Jehova duzie ha ka ha na-atụle ma onye ahụ ò ruru ihe Akwụkwọ Nsọ chọrọ n’aka ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi. Nke atọ bụ na onye ahụ a chọrọ ịhọpụta kwesịrị ịna-egosi na ya nwere mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke. (Gal. 5:22, 23) N’ihi ya, mmụọ nsọ na-enye aka n’ihe niile a na-eme mgbe a na-ahọpụta mmadụ ka ọ bụrụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi.

Ma, ònye n’eziokwu na-ahọpụta ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi? N’oge gara aga, ọ na-abụ a tụọ aro ka a họpụta mmadụ ka ọ bụrụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi, e zigara ya alaka ụlọ ọrụ. N’ebe ahụ, ndị Òtù Na-achị Isi họpụtara na-elebara aro ndị ahụ anya ma họpụta ndị ruru eru. Alaka ụlọ ọrụ na-agwazi ndị okenye na a họpụtala onye ahụ. A gwa ndị okenye, hanwa agwazie nwanna ahụ a họpụtara ọhụrụ ma jụọ ya ma ọ̀ ga-achọ ịrụ ọrụ a nakwa ma ò ruru eru n’eziokwu ịrụ ya. Ihe ikpeazụ a na-eme bụ na a na-amara ọgbakọ ọkwa na a họpụtala onye ahụ.

Ma, olee otú e si họpụta ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi n’oge ndịozi Jizọs? Mgbe ụfọdụ, ndịozi ji aka ha họpụta ụmụnna ruru eru. Dị ka ihe atụ, e nwere mgbe ha ji aka ha họpụta ụmụ nwoke asaa ka ha na-ahụ kwa ụbọchị na a na-ekesara ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ nri. (Ọrụ 6:1-6) Ma, o nwere ike ịbụ na ndị ahụ bụ ndị okenye n’oge ahụ, ya bụ, tupu e nyekwuo ha ọrụ a ha ga-arụ.

 Baịbụl ekwuchaghị otú e si họpụta ụmụnna niile a họpụtara n’oge ahụ. Ma, anyị na-ahụ ihe ụfọdụ mere ka anyị ghọta otú ha si mee ya. Baịbụl gwara anyị na mgbe Pọl na Banabas si ebe ha gara ozi ala ọzọ mbụ ha na-ala, ‘ha họpụtaara ha ndị okenye n’ọgbakọ nke ọ bụla, mgbe ha buru ọnụ, kpeekwa ekpere, ha nyefere ha n’aka Jehova, bụ́ onye ha kweere na ya.’ (Ọrụ 14:23) Mgbe ọtụtụ afọ gara, Pọl degaara Taịtọs bụ́ onye nlekọta na-ejegharị ejegharị ibe ya akwụkwọ, sị: “Ihe mere m ji hapụ gị na Krit bụ ka i nwee ike idozi ihe gahiere agahie, ka i nweekwa ike ịhọpụta ndị okenye n’obodo dị iche iche, dị ka m nyere gị n’iwu.” (Taị. 1:5) Timoti so Pọl gaa ọtụtụ ebe. Ọ ga-abụkwa na e nyere ya ụdị ikike ahụ. (1 Tim. 5:22) N’ihi ya, o doro anya na ọ bụ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị họpụtara ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi n’oge ahụ, ọ bụghị ndịozi na ndị okenye nọ na Jeruselem.

N’ihi ihe a Baịbụl kwuru, Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova agbanweela otú e si ahọpụta ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi. Malite n’abalị mbụ n’ọnwa Septemba 2014, otú a ka a ga-esizi na-ahọpụta ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi: na sekit ọ bụla, ọ bụrụ na ndị okenye atụọ aro ndị ha chọrọ ka a họpụta, onye nlekọta sekit ga-eji nlezianya lebara ya anya. Mgbe ọ bụla ọ bịara ileta ọgbakọ, o kwesịrị ịgba mbọ mara ndị a tụrụ aro ka a họpụta, ha na ya arụọ n’ozi ọma ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe omume. Ọ bụrụ na ya na ndị okenye ọgbakọ ọ gara ileta elebachaa anya ná ndị ha chọrọ ka a họpụta, ọ bụzi yanwa ka ọ dịịrị ịhọpụta ha. Ọ bụrụ na e si otú a na-eme ya, ọ ga-eyi otú e si mee ya n’oge ndịozi Jizọs.

Ebe ndị okenye na onye nlekọta sekit na-atụle ma nwanna ò ruru eru ka a họpụta ya (Malawi)

Olee ndị na-eme nke ha na-eme n’ihe gbasara ịhọpụta ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi? Ọ bụ “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” ka e nyere ọrụ ịna-akụziri ezinụlọ Chineke Okwu Chineke. (Mat. 24:45-47) Otu ụzọ ha si eme ya bụ na mmụọ nsọ na-enyere ha aka inyocha Akwụkwọ Nsọ ma nye ntụziaka n’otú a ga-esi eme ihe Baịbụl kwuru gbasara ịhazi ọgbakọ Ndị Kraịst n’ụwa niile. Ọ bụkwa ha na-ahọpụta ndị nlekọta sekit na ndị so na Kọmitii Alaka ụlọ ọrụ anyị. Alaka ụlọ ọrụ nke ọ bụla na-enyezi aka ahụ na e mere ihe Òtù Na-achị Isi kwuru. Ndị okenye na-eji nlezianya atụle ma nwanna ha chọrọ ka a họpụta ò rukwara eru. Ndị okenye tụchaa aro ndị ha chọrọ ka a họpụta, onye nlekọta sekit na-eche echiche nke ọma ma kpee ekpere banyere ndị ahụ, họpụtazie ndị ruru eru.

Ọ bụrụ na anyị aghọta otú e si ahọpụta ụmụnna nwoke, ọ ga-eme ka ọrụ mmụọ nsọ na-arụ n’ihe a niile dokwuo anyị anya. Obi ga-esikwu anyị ike na ndị a họpụtara n’ọgbakọ Ndị Kraịst ga na-arụ ọrụ ha nke ọma. Anyị ga na-akwanyekwara ha ùgwù.—Hib. 13:7, 17.

 Ole ndị bụ ndị àmà abụọ e kwuru okwu ha ná Mkpughe isi 11?

Mkpughe isi iri na otu amaokwu atọ kwuru gbasara ndị àmà abụọ ga-ebu amụma ruo otu puku ụbọchị na narị ụbọchị abụọ na iri isii. Mgbe o kwuchara ihe a, o kwuru na anụ ọhịa ‘ga-emeri ha ma gbuo ha.’ Ma, mgbe “ụbọchị atọ na ọkara” gachara, a ga-eme ka ndị àmà abụọ a dị ndụ ọzọ. Ihe a ga-eju ndị hụrụ ya anya.—Mkpu. 11:7, 11.

Ole ndị bụ ndị àmà abụọ a? Ihe ndị e kwuru ná Mkpughe isi iri na otu ga-enyere anyị aka ịmata ndị ha bụ. Nke mbụ bụ na Baịbụl gwara anyị na “ọ bụ ha ka osisi oliv abụọ ahụ na ihe ndọba oriọna abụọ ahụ na-anọchi anya ha.” (Mkpu. 11:4) Ihe a na-echetara anyị ihe ndọba oriọna na osisi oliv abụọ Zekaraya kwuru okwu ha n’amụma ya. E kwuru na osisi oliv ndị ahụ na-anọchite anya ‘mmadụ abụọ e tere mmanụ,’ ya bụ, Gọvanọ Zerubabel na Nnukwu Onye Nchụàjà bụ́ Jọshụa. “Ha guzo n’akụkụ Onyenwe elu ụwa dum.” (Zek. 4:1-3, 14) Nke abụọ bụ na e kwuru na ndị àmà abụọ ahụ na-eme ihe ịrịba ama yiri ndị nke ahụ Mozis na Ịlaịja mere.—Jiri ihe e kwuru ná Mkpughe 11:5, 6 tụnyere ihe e kwuru n’Ọnụ Ọgụgụ 16:1-7, 28-35 nakwa ná 1 Ndị Eze 17:1; 18:41-45.

Gịnị ka Mkpughe Isi 11 na Zekaraya 4:1-3, 14 na-ekwu gbasara ya? Nke ọ bụla kwuru gbasara ndị e tere mmanụ, bụ́ ndị duziri ndị Chineke mgbe a na-ele ha ule. N’ihi ya, ka ihe ahụ e kwuru ná Mkpughe isi 11 nwee ike imezu, ndị e tere mmanụ, bụ́ ndị na-eduzi ndị Chineke mgbe e hiwere Alaeze Chineke n’eluigwe n’afọ 1914, ‘yiiri ákwà iru uju’ kwusaa ozi ọma ruo afọ atọ na ọkara.

Mgbe ndị e tere mmanụ yiiri ákwà iru uju kwusachaa ozi ọma, e nwere ike ikwu na e gburu ha mgbe a tụrụ ha mkpọrọ ruo obere oge. E nwere ike ikwu na obere oge a bụ ụbọchị atọ na ọkara. Ndị iro ha chere na a kwụsịla ọrụ ha, ya emezie ka ha na-enwe obi ụtọ.—Mkpu. 11:8-10.

Ma, amụma ahụ mezuru. Mgbe ụbọchị atọ na ọkara ahụ gachara, e mere ka ndị àmà abụọ ahụ dị ndụ ọzọ. Ọ bụghị naanị na a kpọpụtara ndị a e tere mmanụ n’ụlọ mkpọrọ, Chineke si n’aka Onyenwe ha Jizọs Kraịst nye ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’ime ha ọrụ pụrụ iche. N’afọ 1919, ha so ná ndị a họpụtara ka ha bụrụ “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche.” Ihe mere e ji họpụta ha bụ ka ha na-akụziri Ndị Kraịst Okwu Chineke n’oge ikpeazụ a.—Mat. 24:45-47; Mkpu. 11:11, 12.

Ihe e kwuru ná Mkpughe 11:1, 2 gosiri na e nwere ihe jikọrọ ihe ndị a na mgbe a ga-atụ ụlọ nsọ ihe atụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀. Malakaị isi atọ kwukwara na a ga-enyocha ụlọ nsọ ihe atụ ma mee ka ndị Chineke dị ọcha. (Mal. 3:1-4) Olee oge o were iji nyochaa ụlọ nsọ ahụ ma mee ka ọ dị ọcha? Ọ malitere n’afọ 1914 ruo ná mbido afọ 1919. Ọ bụ otu puku ụbọchị na narị ụbọchị abụọ na iri isii ahụ e kwuru okwu ya, ya bụ, ọnwa iri anọ na abụọ nakwa ụbọchị atọ na ọkara ahụ e kwuru okwu ya ná Mkpughe isi 11.

Obi dị anyị ụtọ na Jehova mere ka ndị ya dị ọcha ka e nwee ike ịsacha ndị pụrụ iche ga na-arụ ezi ọrụ. (Taị. 2:14) Obi dịkwa anyị ụtọ n’otú ndị e tere mmanụ duziri ndị Chineke mgbe ahụ e lere ha ule si rụsie ọrụ ike. Ha si otú ahụ gosi na ha bụ ndị àmà abụọ ahụ Baịbụl kwuru okwu ha. *