Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) NỌVEMBA 2014

Ihe Mere Anyị Ga-eji Dị Nsọ

Ihe Mere Anyị Ga-eji Dị Nsọ

‘Unu ga-adị nsọ.’—LEV. 11:45.

1. Olee otú akwụkwọ Levitikọs ga-esi enyere anyị aka?

N’AKWỤKWỌ Levitikọs, e kwuru gbasara ịdị nsọ karịa otú e si kwuo ya n’akwụkwọ ndị ọzọ dị na Baịbụl. Ebe ọ bụ na Jehova chọrọ ka ndị niile na-efe ya dịrị nsọ, ịghọta ihe e kwuru n’akwụkwọ Levitikọs na iji ya kpọrọ ihe ga-enyere anyị aka ịma otú anyị ga-esi na-adị nsọ.

2. Olee ihe ụfọdụ e kwuru n’akwụkwọ Levitikọs?

2 Levitikọs a Mozis dere so ‘n’Akwụkwọ Nsọ dum’ nke bara uru iji ya zie ihe. (2 Tim. 3:16) N’isi nke ọ bụla, aha Jehova pụtara ihe dị ka ugboro iri. Ọ bụrụ na anyị aghọta ihe e kwuru n’akwụkwọ Levitikọs, ọ ga-eme ka anyị ghara ime ihe ọ bụla ga-eme ka a kọchaa aha Chineke. (Lev. 22:32) Na Levitikọs, Jehova kwuru ugboro ugboro, sị, “Abụ m Jehova.” Ihe a o kwuru kwesịrị ichetara anyị ka anyị na-erubere ya isi. N’isiokwu a nakwa na nke na-eso ya, anyị ga-atụle ihe ndị bara ezigbo uru e kwuru n’akwụkwọ Levitikọs. Ihe ndị ahụ ga-enyere anyị aka ịna-adị nsọ n’ofufe anyị na-efe Jehova.

HA GA-ADỊ NSỌ

3, 4. Gịnị ka ahụ́ a sara Erọn na ụmụ ya nọchiri anya ya? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

3 Gụọ Levitikọs 8:5, 6. Jehova họọrọ Erọn ka ọ bụrụ nnukwu onye nchụàjà ụmụ Izrel. Ụmụ ya ga-abụkwa ndị nchụàjà  ha. Erọn nọchiri anya Jizọs Kraịst, ebe ụmụ ya nọchiri anya Ndị Kraịst e tere mmanụ. N’ihi ya, ahụ́ ahụ a sara Erọn ọ̀ pụtara na a ga-eme ka Jizọs dị ọcha? Mba. Jizọs emeghị mmehie. Ọ bụkwa “onye a na-emerụghị emerụ.” N’ihi ya, ọ baghị uru ime ka ọ dị ọcha. (Hib. 7:26; 9:14) Ma, ahụ́ a sara Erọn nọchiri anya ịdị ọcha Jizọs na ezi omume ya. Gịnịzi ka ahụ́ a sara ụmụ Erọn nọchiri anya ya?

4 Ahụ́ a sara ụmụ Erọn gosiri na a ga-eme ka ndị ga-eso Jizọs bụrụ ndị nchụàjà n’eluigwe dị ọcha. È nwere ihe jikọrọ baptizim e mere ndị e tere mmanụ na ahụ́ ahụ a sara ụmụ Erọn? Mba. Baptizim anaghị asachapụ mmehie. Kama, ọ na-egosi na mmadụ enyefeela Jehova Chineke onwe ya kpamkpam. E ji ‘okwu Chineke’ saa ndị e tere mmanụ ahụ́. N’ihi ya, ha ga-eji obi ha niile na-eme ihe Kraịst kụziri. (Efe. 5:25-27) Ọ bụ otú ahụ ka e si eme ka ha dị ọcha ma dị nsọ. Oleekwanụ otú e si eme ka “atụrụ ọzọ” dị ọcha?—Jọn 10:16.

5. Gịnị mere e nwere ike iji kwuo na e ji Okwu Chineke mee ka atụrụ ọzọ dị ọcha?

5 Ụmụ Erọn anọchighị anya “oké ìgwè mmadụ” bụ́ ndị so n’atụrụ ọzọ Jizọs. (Mkpu. 7:9) N’ihi ya, ọ̀ bụ Okwu Chineke ka e ji meekwa ka atụrụ ọzọ dị nsọ ma dịrị ọcha? Ee. Ọ bụrụ na ndị nwere olileanya ibi n’ụwa agụọ ihe Baịbụl kwuru banyere otú àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ si dị mkpa nakwa uru ọ bara, ha na-enwe okwukwe na ya, na-ejekwara Chineke “ozi dị nsọ ehihie na abalị.” (Mkpu. 7:13-15) A na-eme ka ndị e tere mmanụ na atụrụ ọzọ na-adị ọcha. Ọ bụ ya mere ha ji ‘na-eme omume dị mma’ mgbe niile. (1 Pita 2:12) Chegodị otú obi si adị Jehova ụtọ mgbe ọ hụrụ na ndị e tere mmanụ na atụrụ ọzọ dị ọcha, dịrịkwa n’otu nakwa na ha na-ege Jizọs, bụ́ Onye Ọzụzụ Atụrụ, ntị ma na-erubere ya isi.

6. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-eme anyị nọtụ, anyị eleruo onwe anyị anya?

6 E nwere ezigbo ihe ndị ohu Jehova taa ga-amụta n’iwu ahụ Jehova nyere ndị nchụàjà ụmụ Izrel ka ha na-adị ọcha. Ndị anyị na ha na-amụ Baịbụl na-achọpụtakarị na ebe ndị anyị na-anọ efe Jehova na-adị ọcha nakwa na anyị na-adị ọcha ma na-eji ejiji dị mma. Otú ahụ ndị nchụàjà si dị ọcha na-emekwa ka anyị ghọta na onye ọ bụla nke chọrọ ife Jehova kwesịrị inwe ‘obi dị ọcha.’ (Gụọ Abụ Ọma 24:3, 4; Aịza. 2:2, 3.) Ka anyị na-ejere Jehova ozi dị nsọ, uche anyị, obi anyị, na ahụ́ anyị kwesịrị ịdị ọcha. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-eme anyị nọtụ, anyị eleruo onwe anyị anya. Anyị mee otú ahụ, anyị nwere ike ịchọpụta na anyị kwesịrị ịgbanwe àgwà anyị ka anyị nwee ike ịna-adị nsọ. (2 Kọr. 13:5) Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na onye e mere baptizim na-ele ndị gba ọtọ, o kwesịrị ịjụ onwe ya, sị, ‘M̀ na-egosi na m dị nsọ?’ O kwesịrị ịgakwuru ndị okenye ka ha nyere ya aka ka ọ kwụsị àgwà ọjọọ a.—Jems 5:14.

NA-ERUBERE CHINEKE ISI IJI GOSI NA Ị DỊ NSỌ

7. Olee ihe Jizọs mere nke yiri ihe Levitikọs 8:22-24 kwuru na e mere ndị nchụàjà?

7 Mgbe ụmụ Izrel malitere inwe ndị nchụàjà, e tere ọbara ebule n’ọnụ ọnụ ntị aka nri Erọn bụ́ Nnukwu Onye Nchụàjà, ná mkpịsị aka ukwu nke aka nri ya nakwa ná mkpịsị ụkwụ ukwu nke ụkwụ aka nri ya. E mekwara ụmụ ya otú ahụ. (Gụọ Levitikọs 8:22-24.) Ihe ahụ e ji ọbara mee gosiri na ndị nchụàjà ga-eji obi ha niile na-arụ ọrụ ha. Jizọs bụ́ Nnukwu Onye Nchụàjà mere ihe yiri ya. O mere ihe ndị e tere mmanụ na atụrụ ọzọ kwesịrị ịgbalị na-eme. Ọ na-ege ntị mgbe ọ bụla Chineke na-agwa ya ihe ọ ga-eme. Ọ na-eme uche Jehova. Otú o si bie ndụ gosiri na ọ dị nsọ.—Jọn 4:31-34.

8. Gịnị ka ndị niile na-efe Jehova kwesịrị ime?

 8 Ma Ndị Kraịst e tere mmanụ ma atụrụ ọzọ kwesịrị ịna-eme ihe ziri ezi n’anya Chineke otú ahụ Nnukwu Onye Nchụàjà ha mere. Ndị niile na-efe Jehova kwesịrị ilezi anya na-eme ihe Chineke kwuru na Baịbụl ma si otú ahụ ghara ime ka “mmụọ nsọ Chineke nwee mwute.” (Efe. 4:30) Ha kwesịrị ime ka ụzọ ha ‘kwụrụ ọtọ.’—Hib. 12:13.

9. Gịnị ka ụmụnna atọ ha na ndị so n’Òtù Na-achị Isi rụkọrọ ọrụ kwuru? Olee otú ihe ha kwuru nwere ike isi nyere gị aka ịna-adị nsọ?

9 E nwere ụmụnna atọ nwere olileanya ibi n’ụwa. Ha na ndị so n’Òtù Na-achị Isi arụkọọla ọrụ ruo ọtụtụ afọ. Ka anyị leba anya n’ihe ha atọ ji obi ha niile kwuo. Onye nke mbụ kwuru, sị: “Ọ bụ eziokwu na ọrụ a mụ na ha na-arụkọ bụ ihe ùgwù pụrụ iche, o meela ka m ghọta ugboro ugboro na ụmụnna ndị a ezughị okè n’agbanyeghị na e ji mmụọ nsọ tee ha mmanụ. Ma, kemgbe ọtụtụ afọ, otu n’ime ihe m kpebisiri ike ime bụ ịna-erubere ndị Jehova ji na-eduzi nzukọ ya isi.” Nwanna nke abụọ kwuru, sị: “Ndị Kọrịnt nke Abụọ isi iri amaokwu ise kwuru banyere ‘irubere Kraịst isi.’ Ụdị amaokwu a enyerela m aka ịna-erubere ndị na-ahazi ihe a na-eme ná nzukọ Jehova isi ma na-akwado ha. M na-eji obi m niile erubere ha isi.” Nwanna nke atọ kwuru, sị: “Ọ bụrụ na anyị hụrụ ihe Jehova hụrụ n’anya n’anya ma kpọọ ihe ọ kpọrọ asị asị, kwekwa ka ọ na-eduzi anyị mgbe niile, anyị ana-emekwa uche ya, ọ pụtara na anyị ga na-erubere nzukọ ya isi, na-erubekwara ndị o ji na-arụ ọrụ ka nzube ya maka ụwa mezuo.” Nwanna a chetara àgwà ọma Nwanna Nathan Knorr, bụ́ onye mechara soro n’Òtù Na-achị Isi, kpara. Nwanna Knorr ji obi ya niile nabata ihe e kwuru n’otu isiokwu a kpọrọ “Ọmụmụ nke Mba Ahụ,” nke gbara n’otu Ụlọ Nche Bekee e bipụtara n’afọ 1925, n’agbanyeghị na ụfọdụ ndị anabataghị ihe e kwuru n’isiokwu ahụ. Otú Nwanna Knorr si rube isi masịrị nwanna a. Ọ bụrụ na i chebara ihe ụmụnna atọ a kwuru echiche, ọ ga-enyere gị aka ịna-erubere Chineke isi ma na-adị nsọ.

JIRI OBI GỊ NIILE NA-ERUBERE IWU CHINEKE NYERE GBASARA ỌBARA ISI

10. Gịnị mere anyị kwesịrị iji rubere iwu Chineke nyere gbasara ọbara isi?

10 Gụọ Levitikọs 17:10. Jehova nyere ụmụ Izrel iwu ka ha ghara iri “ụdị ọbara ọ bụla.” E nyekwara Ndị Kraịst iwu ka ha zere ọbara, ya bụ, ma ọbara mmadụ ma nke anụmanụ. (Ọrụ 15:28, 29) Anyị ekwesịghị ichetụdị n’echiche ime ihe ọ bụla ga-eme ka Chineke jụ anyị ma chụpụ anyị n’ọgbakọ ya. Anyị hụrụ Jehova n’anya, chọọkwa ịna-erubere ya isi. Ọ bụrụ na ndị na-amaghị Jehova ma ọ bụ ndị na-achọghị irubere ya isi agwawa anyị ka anyị nupụrụ ya isi, anyị kpebisiri ike na anyị agaghị ege ha ntị, ọ bụrụgodị na anyị nọ n’ọnụ ọnwụ. Anyị ma na ụfọdụ ndị ga-akwa anyị emo maka na anyị na-ajụ ọbara. Ma, anyị kpebiri irubere Chineke isi. (Jud 17, 18) Gịnị ga-enyere anyị aka ‘ikpebisi ike’ na anyị agaghị eri ọbara ma ọ bụ kwe ka a mịnye anyị ọbara?—Diut. 12:23.

11. Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo na ihe ndị Izrel mere n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie abụghị iji mezuo iwu?

11 N’oge ụmụ Izrel, ihe nnukwu onye nchụàjà na-eji ọbara eme kwa afọ n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie ga-enyere anyị aka ịghọta otú Chineke si were ọbara. A na-eji ọbara eme ihe pụrụ iche n’oge ahụ. E ji ya gbaghara ndị Izrel mmehie ha ka ha na Chineke nwee ike ịdị ná mma. A na-efesa ọbara oké ehi na nke ewu n’ihu ihe e ji kpuchie igbe ọgbụgba ndụ. (Lev. 16:14, 15, 19) Ọbara ahụ mere ka Jehova  gbaghara ndị Izrel mmehie ha. Ihe ọzọ bụ na Jehova kwuru na ọ bụrụ na mmadụ egbuo anụmanụ ọ chọrọ iri eri, o kwesịrị ịwụsa ọbara ya n’ala ma jiri ájá kpochie ya “n’ihi na mkpụrụ obi nke ụdị anụ ọ bụla bụ ọbara ya.” (Lev. 17:11-14) Ihe a niile ọ̀ bụ iji mezuo iwu? Mba. Ma ọbara ahụ e ji achụ àjà n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie ma iwu Chineke nyere ndị Izrel ka ha wụsa ọbara n’ala dabara adaba n’iwu o bu ụzọ nye Noa na ụmụ ya gbasara ọbara. (Jen. 9:3-6) Jehova Chineke nyere ha iwu ka ha ghara iri ọbara, ọ bụrụgodị na ha chere na iri ọbara ga-eme ka ha dị ndụ. Gịnị ka Ndị Kraịst ga-amụta n’ihe a?

12. Olee otú akwụkwọ ozi Pọl degaara Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru si gosi na e nwere ihe jikọrọ ọbara na ịgbaghara mmehie?

12 Mgbe Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru akwụkwọ na ọbara nwere ike ime ka ihe dị ọcha, ọ gwara ha, sị: “Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na a na-eji ọbara eme ka ihe niile dị ọcha dị ka Iwu ahụ si dị, ọ gwụla ma à wụsịrị ọbara, a gaghị enwe mgbaghara ọ bụla.” (Hib. 9:22) Pọl kwukwara na ọ bụ eziokwu na àjà e ji ụmụ anụmanụ chụọ batụrụ uru, naanị ihe o mere bụ ichetara ụmụ Izrel na ha bụ ndị mmehie nakwa na e kwesịrị ịchụ àjà ka nke ahụ ka e nwee ike ịgbaghara ha mmehie ha kpamkpam. Iwu ahụ bụ “onyinyo nke ihe ọma ndị gaje ịbịa, ma ọ bụghị ihe ndị ahụ kpọmkwem.” (Hib. 10:1-4) Gịnị ka a ga-eme ka e nwee ike ịgbaghara ndị mmadụ mmehie ha?

13. Olee otú obi dị gị maka na Jizọs gosiri Chineke ndụ mmadụ zuru okè o ji chụọ àjà?

13 Gụọ Ndị Efesọs 1:7. Jizọs ‘nyefere onwe ya maka anyị.’ Àjà o ji ndụ ya chụọ baara ndị niile hụrụ ya na Nna ya n’anya uru. (Gal. 2:20) Ma, ọ bụ ihe Jizọs mere mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ mere ka a gbapụta anyị, meekwa ka e nwee ike ịgbaghara anyị mmehie anyị. Ihe a Jizọs mere yiri ihe ndị Izrel na-eme n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie. N’ụbọchị ahụ, nnukwu onye nchụàjà na-eweretụ ọbara anụmanụ e ji chụọ àjà banye n’Ebe Kacha  Nsọ n’ụlọikwuu ma chee ya n’ihu Jehova, dị ka à ga-asị na Jehova nọ n’ebe ahụ. E mechara na-eme ya otú ahụ n’ụlọ nsọ ahụ Sọlọmọn rụrụ. (Lev. 16:11-15) Jizọs mere ihe yiri ya. Mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ, ọ laghachiri eluigwe ma gosi Chineke ndụ mmadụ zuru okè o ji chụọ àjà maka ịgbapụta ụmụ Adam. (Hib. 9:6, 7, 11-14, 24-28) Obi dị anyị ezigbo ụtọ na e nwere ike ịgbaghara anyị mmehie anyị, anyị enweekwa akọnuche dị ọcha maka na anyị nwere okwukwe n’àjà ahụ Jizọs ji ọbara ya chụọ.

14, 15. Gịnị mere anyị kwesịrị iji ghọta ihe mere Jehova ji nye anyị iwu gbasara ọbara, na-erubekwara ya isi?

14 Ị̀ ghọtakwuola ihe mere Jehova ji nye anyị iwu ka anyị ghara iri “ụdị ọbara ọ bụla”? (Lev. 17:10) Ị̀ ghọtala ihe mere ọbara ji dị nsọ n’anya Chineke? Otú o si were ọbara ka o si were ndụ. (Jen. 9:4) Í cheghị na anyị kwesịrị iwere ọbara otú Jehova si were ya ma rube isi n’iwu ahụ o nyere ka anyị zere ọbara? Naanị ihe ga-eme ka anyị na Chineke dị ná mma bụ inwe okwukwe n’àjà ahụ Jizọs chụrụ iji gbapụta anyị nakwa ịghọta na ọbara bara ezigbo uru n’anya Onye kere anyị.—Kọl. 1:19, 20.

15 Ihe nwere ike ime na mberede, ya abụrụ na anyị ga-ekpebi ihe anyị ga-eme gbasara ọbara. Ụdị ihe ahụ nwekwara ike ime onye ezinụlọ anyị ma ọ bụ ezigbo enyi anyị. Ụdị ihe ahụ mee, o nwere ike ịdị mkpa ka anyị kpebie ma à ga-amịnye anyị ọbara ma ọ bụ irighiri ihe ndị si n’ọbara, kpebiekwa otú anyị chọrọ ka e si gwọọ anyị. N’ihi ya, anyị kwesịrị ime nchọnchọ ma jikere ejikere maka ihe ndị nwere ike ime na mberede. Ime otú ahụ na ikpe ekpere ga-enyere anyị aka ịgbadosi ụkwụ n’ala ike jụ ihe ọ bụla nwere ike ime ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma. O doro anya na anyị achọghị ime ihe Jehova kwuru na ọ dịghị mma, nke ga-eme ka iwe wee ya. Ọtụtụ ndị dọkịta na ndị ọzọ na-akwado mmịnye ọbara na-agwa ndị mmadụ ka ha bịa ka a mịrị ha ọbara a ga-eji na-azọ ndị mmadụ ndụ. Ma, ebe ọ bụ na anyị bụ́ ndị Jehova dị nsọ, anyị ma na ọ bụ naanị Onye kere anyị kwesịrị ikwu ihe a ga-eji ọbara na-eme. N’anya ya, “ụdị ọbara ọ bụla” dị nsọ. N’ihi ya, anyị kwesịrị ikpebisi ike ime ihe o kwuru gbasara ọbara. Àgwà ọma anyị kwesịkwara igosi ya na obi dị anyị ụtọ maka ọbara Jizọs ji chụọ àjà iji gbapụta anyị. Ọ bụ naanị ọbara ya na-eme ka a gbaghara anyị mmehie anyị, anyị enweekwa ike ịdị ndụ ebighị ebi.—Jọn 3:16.

Ì kpebisiri ike ime ihe Jehova kwuru gbasara ọbara? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14 na nke 15)

IHE MERE JEHOVA JI CHỌỌ KA ANYỊ DỊRỊ NSỌ

16. Gịnị mere ndị ohu Jehova kwesịrị iji dị nsọ?

16 Mgbe Chineke napụtara ụmụ Izrel n’ohu ha na-agba n’Ijipt, ọ gwara ha, sị: “Abụ m Jehova onye dupụtara unu n’ala Ijipt iji gosi na m bụ Chineke unu; unu ga-adịkwa nsọ, n’ihi na adị m nsọ.” (Lev. 11:45) Jehova chọrọ ka ụmụ Izrel dị nsọ n’ihi na yanwa dị nsọ. Ebe anyị bụ Ndịàmà Jehova, anyịnwa kwesịkwara ịdị nsọ. Ihe ndị e kwuru na Levitikọs gosiri na ọ bụ eziokwu.

17. Olee otú obi dị gị ugbu a maka ihe ndị anyị tụlere n’akwụkwọ Levitikọs?

17 O doro anya na ị mụtara ihe n’ihe ndị anyị tụlerela n’akwụkwọ Levitikọs. O nwere ike ịbụ na o meela ka ị ghọtakwuo ihe ndị e kwuru na Levitikọs. O doro anya na ichebara ihe ndị ahụ echiche emeela ka ị ghọtakwuo ihe mere anyị ji kwesị ịdị nsọ. Ma, olee ihe ndị ọzọ anyị ga-amụta n’akwụkwọ Levitikọs? Olee ihe ọzọ ọ ga-akụziri anyị gbasara ijere Jehova ozi dị nsọ? Anyị ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.