Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) ỌKTOBA 2014

Nwee Okwukwe Siri Ike n’Alaeze Chineke

Nwee Okwukwe Siri Ike n’Alaeze Chineke

“Okwukwe bụ atụmanya e ji n’aka na ihe ndị a na-ele anya ha ga-emezu.”—HIB. 11:1.

1, 2. Gịnị ga-eme ka obi sikwuo anyị ike na Chineke ga-eji Alaeze ya mezuo ihe o bu n’obi kee ụmụ mmadụ? N’ihi gịnị? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

ANYỊ bụ́ Ndịàmà Jehova na-ekwukarị na ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-ewepụ nsogbu anyị niile. Anyị na-eji obi anyị niile akọrọ ndị mmadụ eziokwu a dị mkpa Baịbụl na-akụzi. Obi na-adịkwa anyị ụtọ ma anyị cheta ihe ọma niile anyị na-atụ anya na Alaeze Chineke ga-emere anyị. Ma, ànyị kwetasiri ike na Alaeze Chineke bụ ọchịchị dị adị nakwa na Chineke ga-eji ya mezuo nzube ya? Gịnị mere anyị kwesịrị iji nwee okwukwe siri ike na Alaeze Chineke ga-abịarịrị?—Hib. 11:1.

2 Jehova ga-eji ọchịchị Jizọs mezuo ihe o bu n’obi kee ụmụ mmadụ. Ihe mere Jehova ji nwee ike ihiwe ọchịchị ahụ bụ na ọ bụ naanị ya kwesịrị ịchị. Ọ bụ ya mere Alaeze ya ji bụrụ ọchịchị siri ezigbo ike. Jehova mere ka a mata ihe ụfọdụ dị mkpa gbasara Alaeze ahụ, ya bụ, ma eze ga-achị na ya, ma ndị ga-eso ya chịa, ma ebe ha ga-achị. O ji ọgbụgba ndụ dị iche iche mee ka a mata ihe a niile. N’ọgbụgba ndụ nke ọ bụla, ma ọ́ bụghị Jehova na ndị mmadụ gbara ndụ, ya abụrụ Jizọs na ndị mmadụ. Ọ bụrụ na anyị echebara ọgbụgba ndụ ndị ahụ echiche, anyị ga-aghọtakwu otú Jehova ga-esi mezuo nzube  ya nakwa ihe mere obi ji kwesị isi anyị ike na Alaeze Chineke bụ a kwaa akwụrụ.—Gụọ Ndị Efesọs 2:12.

3. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a nakwa n’isiokwu na-esonụ?

3 Baịbụl kwuru banyere ọgbụgba ndụ isii gbasara ọchịchị Jizọs Kraịst. Ha bụ (1) ọgbụgba ndụ Ebreham, (2) ọgbụgba ndụ Iwu, (3) ọgbụgba ndụ Devid, (4) ọgbụgba ndụ maka ịbụ onye nchụàjà dị ka Melkizedek, (5) ọgbụgba ndụ ọhụrụ, na (6) ọgbụgba ndụ Alaeze. Ka anyị leba anya n’otú ọgbụgba ndụ nke ọ bụla si gbasa Alaeze Chineke, na-emekwa ka Chineke jiri nwayọọ nwayọọ na-emezu ihe o bu n’obi kee ụwa na ụmụ mmadụ.—Gụọ ihe e dere na chaatị bụ́ “ Otú Chineke Ga-esi Emezu Nzube Ya.”

NKWA CHINEKE KWERE MERE KA ANYỊ GHỌTA OTÚ NZUBE YA GA-ESI EMEZU

4. Olee ihe atọ Chineke kwuru gbasara ụmụ mmadụ n’akwụkwọ Jenesis?

4 Mgbe Chineke kechara ụwa a mara mma ka ụmụ mmadụ biri na ya, o kwuru ihe atọ gbasara ụmụ mmadụ. Nke mbụ bụ na ọ ga-eke mmadụ n’oyiyi ya. Nke abụọ abụrụ na ndị mmadụ ga-eme ka ụwa bụrụ paradaịs, meekwa ka ụmụ ha bụ́ ndị ezi omume jupụta na ya. Nke atọ abụrụ na ndị mmadụ agaghị eri mkpụrụ osisi si n’osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ. (Jen. 1:26, 28; 2:16, 17) Ihe atọ a mere ka ihe Jehova bu n’obi kee ụwa na ụmụ mmadụ doo anya nke ọma. Mgbe Chineke kechara mmadụ, ihe o bu n’obi kee ụwa na ụmụ mmadụ ga-emezu ma ọ bụrụ na ha emee ihe nke abụọ ahụ na ihe nke atọ ahụ. Ma, gịnị mere Chineke na ndị mmadụ ji mechaa gbaa ndụ?

5, 6. (a) Olee otú Setan si gbaa mbọ ka nzube Chineke ghara imezu? (b) Olee ihe Jehova mere n’ihi isi ahụ e nupụụrụ ya n’Iden?

5 Setan bụ́ Ekwensu mere ka a malite inupụrụ Chineke isi. Ihe mere o ji mee ya bụ ka nzube Chineke ghara imezu. Ọ nwatara Iv, ya erie mkpụrụ si n’osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ, si otú ahụ mee ka o nupụrụ Chineke isi. (Jen. 3:1-5; Mkpu. 12:9) Ihe a Setan mere gosiri na ọ na-ama Chineke aka na ọ bụghị Chineke kwesịrị ịchị ihe ndị o kere. Setan mechakwara boo ụmụ mmadụ ebubo na ha na-efe Chineke n’ihi uru ha na-erite n’aka ya.—Job 1:9-11; 2:4, 5.

6 Gịnị ka Jehova ga-eme n’ihi isi ahụ e nupụụrụ ya? A sị na Jehova chọrọ, ọ gaara egbu ndị nnupụisi ahụ. Ma, a sị na o gburu ha, ọ pụtara na nzube ya agaghị emezu, ya bụ, ka ụmụ Adam jupụta ụwa. N’ihi ya, Jehova kpebiri na ya agaghị egbu ha. Kama ime otú ahụ, o buru otu amụma dị mkpa, ya bụ, nkwa ahụ o kwere n’Iden. Nkwa ahụ gosiri na ihe niile gbasara nzube Chineke maka ụwa na ụmụ mmadụ ga-emezu.—Gụọ Jenesis 3:15.

7. Gịnị ka nkwa ahụ Chineke kwere n’Iden mere ka a mata gbasara agwọ ahụ na mkpụrụ ya?

7 Ná nkwa ahụ Chineke kwere n’Iden, ọ mara agwọ ahụ na mkpụrụ ya ikpe ọnwụ, ya bụ, ma Setan bụ́ Ekwensu ma ndị niile ga-akwado ya n’ihe ahụ ọ na-ekwu na ọ bụghị Chineke kwesịrị ịchị. Chineke nyere mkpụrụ nwaanyị ahụ ike ka o gbuo Setan. N’ihi ya, nkwa ahụ Jehova kwere n’Iden mere ka a ghọta na a ga-ebibi onye ahụ kpatara nnupụisi n’Iden, wepụkwa nsogbu niile ihe ahụ o mere kpatara. O mekwara ka a ghọta otú a ga-esi eme ya.

8. Gịnị ka anyị ma gbasara onye ga-abụ nwaanyị ahụ na mkpụrụ ya?

8 Ònye ga-emecha bụrụ mkpụrụ nwaanyị ahụ? Mkpụrụ ahụ ga-abụ mmụọ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ ga-ebibi Setan, onye bụ́kwa mmụọ. (Hib.  2:14) N’ihi ya, nwaanyị ga-amụta mkpụrụ ahụ ga-abụkwa mmụọ. Ka mkpụrụ agwọ ahụ nọ na-adịkwu ọtụtụ, a mataghị onye bụ́ nwaanyị ahụ na mkpụrụ ya ruo ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ puku afọ anọ Jehova kwechara nkwa ahụ n’Iden. Ma, Jehova mere ka e nwee ọgbụgba ndụ dị iche iche mere ka a mata onye bụ́ mkpụrụ ahụ, meekwa ka obi sie ndị ohu ya ike na ọ bụ mkpụrụ ahụ ka ọ ga-eji wepụ nsogbu niile Setan kpataara ụmụ mmadụ.

ỌGBỤGBA NDỤ NKE MERE KA A MATA ONYE BỤ́ MKPỤRỤ AHỤ

9. Gịnị bụ ọgbụgba ndụ Ebreham? Olee mgbe ọ malitere ịdị irè?

9 Ihe dị ka puku afọ abụọ Jehova kwechara nkwa ahụ n’Iden, ọ gwara Ebreham ka ọ hapụ ụlọ ya dị n’obodo Ọọ dị na Mesopotemia kwaga Kenan. (Ọrụ 7:2, 3) Jehova gwara ya, sị: “Si n’obodo gị, n’etiti ndị ikwu gị nakwa n’ụlọ nna gị, kwapụ gaa n’obodo m ga-egosi gị; m ga-emekwa ka ị ghọọ mba ukwu, m ga-agọzikwa gị, m ga-emekwa ka aha gị dị ukwuu; bụrụkwa ngọzi. M ga-agọzi ndị na-agọzi gị, onye na-akọchakwa gị ka m ga-abụ ọnụ, ezinụlọ niile nke ala ga-agọzi onwe ha site na gị.” (Jen. 12:1-3) Ihe a na-akpọ nkwa a Chineke kwere Ebreham bụ ọgbụgba ndụ Ebreham. Anyị amaghị mgbe mbụ Jehova na Ebreham gbara ndụ. Ma, anyị ma na ọ malitere ịdị irè n’afọ 1943 Tupu Oge Ndị Kraịst mgbe Ebreham dị iri afọ asaa na ise. Ọ bụ mgbe ahụ ka ọ hapụrụ Heran gafee Osimiri Yufretis.

10. (a) Olee otú Ebreham si gosi na okwukwe ya siri ezigbo ike na Chineke ga-emezu nkwa o kwere ya? (b) Olee ihe ụfọdụ Jehova ji nwayọọ nwayọọ mee ka a mata gbasara mkpụrụ nwaanyị ahụ?

10 Jehova kwughachiri nkwa ahụ  o kwere Ebreham ugboro ugboro. Na nke ọ bụla, ọ gwakwuru Ebreham ihe ụfọdụ gbasara nkwa ahụ. (Jen. 13:15-17; 17:1-8, 16) Otú okwukwe Ebreham si sie ike mere ka o kweta iji nwa ya ọ hụrụ n’anya chụọrọ Chineke àjà. Ọ bụ ya mere Jehova ji mee ka obi sie ya ike na ya ga-emezurịrị nkwa ya. O si otú ahụ mee ka ọgbụgba ndụ ha abụọ sie ike. (Gụọ Jenesis 22:15-18; Ndị Hibru 11:17, 18.) Mgbe ọgbụgba ndụ Ebreham malitechara ịdị irè, Jehova ji nwayọọ nwayọọ mee ka a mata ihe ụfọdụ dị mkpa gbasara mkpụrụ nwaanyị ahụ. Mkpụrụ ahụ ga-esi n’agbụrụ Ebreham, ọ gaghị abụ otu onye. Ọ ga-abụ eze, bibie ndị iro Chineke niile, meekwa ka ọtụtụ ndị nweta ngọzi.

Ebreham nwere okwukwe siri ike na Chineke ga-emezu nkwa ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10)

11, 12. Olee otú ihe Baịbụl kwuru si gosi na nkwa Chineke kwere Ebreham ga-emezu ọzọ nakwa na uru ọ ga-aba ga-aka nke mbụ ahụ? Olee uru ọ ga-abara anyị?

11 Mgbe mbụ nkwa ahụ Jehova kwere Ebreham mezuru bụ mgbe ụmụ Ebreham nwetara Ala Nkwa ahụ. Ma, ihe Baịbụl kwuru gosiri na nkwa ahụ ga-emezu ọzọ nakwa na uru ọ ga-aba ga-aka nke mbụ ahụ. (Gal. 4:22-25) Pọl onyeozi si n’ike mmụọ nsọ kwuo na ọ bụ Jizọs Kraịst bụ isi sekpụ ntị ná mkpụrụ Ebreham. Ndị so ya bụrụ mkpụrụ ahụ bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ dị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ. (Gal. 3:16, 29; Mkpu. 5:9, 10; 14:1, 4) Nwaanyị ga-amụ mkpụrụ ahụ bụ “Jeruselem nke dị n’elu,” ya bụ, nzukọ Chineke dị n’eluigwe. Ndị so na ya bụ ndị mmụọ ozi. (Gal. 4:26, 31) Nkwa Chineke kwere mgbe ya na Ebreham gbara ndụ bụ na mkpụrụ nwaanyị ahụ ga-eme ka ụmụ mmadụ nweta ngọzi ga-adịru mgbe ebighị ebi.

12 Ndụ ahụ Jehova na Ebreham gbara mere ka o doo anya na o nweghị ihe ga-eme ka Chineke ghara ihiwe Alaeze ya n’eluigwe. Ọ ga-emekwa ka Eze ahụ na ndị ga-eso ya chịa nwee ike inweta Alaeze ahụ. (Hib. 6:13-18) Olee mgbe ọgbụgba ndụ a ga-adịru? Jenesis 17:7 kwuru na ọ ga-adịru “mgbe a na-akaghị aka.” Ọ ga-adịru mgbe ọchịchị Jizọs ga-ebibi ndị iro Chineke ma gọzie ezinụlọ niile nke ụwa. (1 Kọr. 15:23-26) Uru ndị ga-ebi n’ụwa mgbe ahụ ga-erite ga-adịru mgbe ebighị ebi. N’ihi ya, ọgbụgba ndụ Ebreham mere ka o doo anya na Jehova kpebisiri ike imezu nzube ya, ya bụ, ime ka ndị ezi omume “jupụta ụwa.”—Jen. 1:28.

ỌGBỤGBA NDỤ NKE GOSIRI NA ALAEZE AHỤ GA-ADỊRU MGBE EBIGHỊ EBI

13, 14. Gịnị ka ọgbụgba ndụ Devid mere ka obi sie anyị ike gbasara ọchịchị Mesaya?

13 Ma nkwa ahụ Jehova kwere n’Iden ma ndụ ya na Ebreham gbara gosiri na ọchịchị Jehova ga-esi n’aka Ọkpara ya chịa gbakwasịrị ụkwụ n’ezi omume. (Ọma 89:14) Ọchịchị Jizọs ọ̀ ga-emecha malite ime wuru wuru? À ga-emecha chọwa nke a ga-eji dochie ya? E nwere ọgbụgba ndụ ọzọ mere ka obi sie anyị ike na ụdị ihe ahụ agaghị eme eme.

14 Chegodị banyere nkwa Jehova kwere Eze Devid chịrị Izrel n’oge ochie. A kpọrọ nkwa ahụ ọgbụgba ndụ Devid. (Gụọ 2 Samuel 7:12, 16.) Ọ bụ mgbe Devid na-achị na Jeruselem ka ya na Jehova gbara ndụ a. Jehova kwere ya nkwa na Mesaya ga-esi n’agbụrụ ya. (Luk 1:30-33) Jehova si otú a mee ka a matakwuo ezinụlọ a ga-esi na ya mụta Mesaya. O kwukwara na ọ bụ nwa Devid bụ “onye o ruuru” ịnọkwasị n’ocheeze nke Alaeze Mesaya. (Ezik. 21:25-27) Ọchịchị Devid ga-adịru mgbe ebighị ebi n’ihi na Jizọs bụ́ nwa Devid “ga-anọru mgbe ebighị ebi, ocheeze ya ga-adịgidekwa dị ka anyanwụ.” (Ọma 89:34-37)  Obi kwesịrị isi anyị ike na ime wuru wuru agaghị abata n’ọchịchị Mesaya. Ihe ọma ọchịchị ya ga-eweta ga-adịrukwa mgbe ebighị ebi.

ỌGBỤGBA NDỤ MAKA ỊBỤ ONYE NCHỤÀJÀ

15-17. Olee ọrụ ọzọ mkpụrụ nwaanyị ahụ ga-arụ n’ihi ọgbụgba ndụ maka ịbụ onye nchụàjà dị ka Melkizedek? N’ihi gịnị?

15 Ọgbụgba ndụ Ebreham na ọgbụgba ndụ Devid mere ka o doo anya na mkpụrụ nwaanyị ahụ ga-abụ Eze. Ma, ka uru ọchịchị ya ga-abara ụmụ mmadụ nwee ike izu ezu, ọ ga-abụ onye nchụàjà, ọ bụghị naanị eze. Ọ bụ naanị onye nchụàjà nwere ike ịchụ àjà ga-eme ka a napụta ndị mmadụ n’aka mmehie, meekwa ka ha soro n’ezinụlọ Jehova, ya bụ, ndị ohu ya nọ ma n’eluigwe ma n’ụwa. Jehova mere ka e nwee ọgbụgba ndụ ọzọ ga-eme ka mkpụrụ ahụ nwee ike ịbụ onye nchụàjà, ya bụ, ọgbụgba ndụ maka ịbụ onye nchụàjà dị ka Melkizedek.

16 Jehova si n’aka Eze Devid mee ka a mata na ya na Jizọs ga-agba ndụ. E nwere ihe abụọ dị mkpa n’ọgbụgba ndụ ahụ. Nke mbụ bụ na Jehova ga-eme ka Jizọs “nọdụ ala n’aka nri [Chineke]” ruo mgbe ọ ga-emeri ndị iro ya. Nke abụọ bụ na Jizọs ga-abụ “onye nchụàjà dị ka Melkizedek ruo mgbe ebighị ebi.” (Gụọ Abụ Ọma 110:1, 2, 4.) Gịnị mere ọ ga-eji bụrụ onye nchụàjà “dị ka Melkizedek”? Ọ bụ n’ihi na tupu ụmụ Ebreham enweta Ala Nkwa ahụ, Melkizedek bụ eze obodo Selem, bụrụkwa “onye nchụàjà nke Chineke Onye Kasị Elu.” (Hib. 7:1-3) Ọ bụ Jehova ji aka ya họpụta ya ka ọ bụrụ eze na onye nchụàjà. Ọ bụkwa naanị ya ka Akwụkwọ Nsọ Hibru kwuru na ọ bụ ma eze ma onye nchụàjà. Ihe ọzọ bụ na Baịbụl ekwughị na e nwere onye bu Melkizedek ụzọ rụọ ụdị ọrụ a ma ọ bụ na e nwere onye nọchiri ya. N’ihi ya, e nwere ike ịkpọ ya “onye nchụàjà mgbe niile,” ya bụ, ruo mgbe ebighị ebi.

17 Jehova ji ndụ a ya na Jizọs gbara họpụta Jizọs ka ọ bụrụ onye nchụàjà. Jizọs ga-abụ “onye nchụàjà dị ka Melkizedek ruo mgbe ebighị ebi.” (Hib. 5:4-6) Ọgbụgba ndụ a gosiri na Jehova mere ka o doo anya na ya ga-eji ọchịchị Jizọs mezuo ihe o bu n’obi kee ụmụ mmadụ nakwa ụwa.

ALAEZE CHINEKE GBAKWASỊRỊ ỤKWỤ N’ỌGBỤGBA NDỤ DỊ ICHE ICHE

18, 19. (a) Olee otú ọgbụgba ndụ ndị anyị tụlerela si gbasa Alaeze Chineke? (b) Olee ajụjụ anyị ga-aza n’isiokwu na-esonụ?

18 N’isiokwu a, anyị ahụla otú ọgbụgba ndụ dị iche iche anyị tụlerela si gbasa ọchịchị Jizọs nakwa otú Alaeze Chineke si gbakwasị ụkwụ ná nkwekọrịta ya na ndị mmadụ nwere. Nkwa ahụ Jehova kwere n’Iden gosiri na ọ ga-esi n’aka mkpụrụ nwaanyị ahụ mezuo nzube ya maka ụwa na ụmụ mmadụ. Ònye ga-emecha bụrụ mkpụrụ nwaanyị ahụ? Olee ọrụ ọ ga-arụ? Ndụ ahụ Jehova na Ebreham gbara mere ka anyị ghọta ihe ndị a.

19 Ndụ ahụ Jehova na Devid gbara mere ka anyị ghọtakwuo ihe ụfọdụ gbasara ezinụlọ Mesaya ahụ ga-esi. Ọ bụkwa ya mere ka Jizọs nwee ikike ịchị ụwa ruo mgbe ebighị ebi. Ọgbụgba ndụ maka ịbụ onye nchụàjà dị ka Melkizedek mere ka obi sie anyị ike na Jizọs ga-abụ onye nchụàjà. Ma, ọ bụghị naanị Jizọs ga-enyere ụmụ mmadụ aka ka ha zuo okè. E nwere ndị ọzọ Chineke họọrọ ka ha soro ya bụrụ ndị eze na ndị nchụàjà. Olee ebe ọ ga-esi họrọ ha? Anyị ga-aza ajụjụ a n’isiokwu na-esonụ.