Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) ỌKTOBA 2014

“Na-atụkwasịnụ Uche n’Ihe Ndị Dị n’Elu”

“Na-atụkwasịnụ Uche n’Ihe Ndị Dị n’Elu”

“Na-atụkwasịnụ uche n’ihe ndị dị n’elu, ọ bụghị n’ihe ndị dị n’elu ụwa.”—KỌL. 3:2.

1, 2. (a) N’oge ndịozi, gịnị gosiri na nsogbu dị n’ọgbakọ dị na Kọlọsi? (b) Olee ihe Pọl gwara ụmụnna nọ na Kọlọsi nke ga-eme ka ha dịrị n’otu?

N’OGE ndịozi Jizọs, e nwere nsogbu chọrọ ime ka ọgbakọ Ndị Kraịst dị na Kọlọsi ghara ịdị n’otu. Ụfọdụ ụmụnna nọ na-ekwu na mmadụ niile kwesịrị ịna-edewe Iwu Mozis. E nwekwara ndị na-ekwu na mmadụ kwesịrị ịna-ata onwe ya ahụhụ, na ikpori ndụ bụ ihe ọjọọ. Pọl chọrọ ime ka a ghọta na ihe ndị ahụ ha na-ekwu bụ ụgha. Ọ bụ ya mere o ji degara ọgbakọ dị na Kọlọsi akwụkwọ ozi ma dọọ ha aka ná ntị, sị: “Nọrọnụ na nche: ma eleghị anya, a pụrụ inwe onye ga-eburu unu dị ka anụ oriri ya site na nkà ihe ọmụma na aghụghọ efu, dị ka ọdịnala mmadụ si dị, dị ka ihe ndị mbụ nke ụwa si dị, ọ bụghị dị ka Kraịst si dị.”—Kọl. 2:8.

2 Ọ bụrụ na obi Ndị Kraịst ahụ adịrị n’ihe ndị ụwa na-akụzi, ọ ga-eme ka ha jụ ihe Jehova mere iji zọpụta ha. (Kọl. 2:20-23) Pọl achọghị ka ihe ọ bụla mee ka ha na Jehova ghara ịdị ná mma. N’ihi ya, ọ gwara ha, sị: “Na-atụkwasịnụ uche n’ihe ndị dị n’elu, ọ bụghị n’ihe ndị dị n’elu ụwa.” (Kọl. 3:2) Ndị Kraịst nọ na Kọlọsi kwesịrị ịgba mbọ ka  uche ha dịrị n’olileanya ha nwere, nke bụ́ inweta ihe nketa na-agaghị emebi emebi ‘e debeere ha n’eluigwe.’—Kọl. 1:4, 5.

3. (a) Olee olileanya Ndị Kraịst e tere mmanụ nwere? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza n’isiokwu a?

3 Taa, obi Ndị Kraịst e tere mmanụ dị n’Alaeze Chineke nakwa n’olileanya ha nwere ịbụ “ndị ha na Kraịst na-eketakọ ihe.” (Rom 8:14-17) Olee ebe obi ndị nwere olileanya ibi n’ụwa dị? Olee otú ihe ahụ Pọl kwuru si gbasa ha? Olee otú “atụrụ ọzọ” si eme ka uche ha dịrị “n’ihe ndị dị n’elu”? (Jọn 10:16) Olee uru ọ ga-abara anyị niile ma ọ bụrụ na anyị atụlee ihe Baịbụl kọrọ gbasara Ebreham na Mozis, bụ́ ndị uche ha dị n’ihe ndị dị n’elu n’agbanyeghị na ihe siiri ha ike?

IHE ỊTỤKWASỊ UCHE ANYỊ N’IHE NDỊ DỊ N’ELU PỤTARA

4. Olee otú atụrụ ọzọ nwere ike isi mee ka obi ha dịrị n’ihe ndị dị n’elu?

4 Ọ bụ eziokwu na atụrụ ọzọ enweghị olileanya ịga eluigwe, obi ha kwesịrị ịdị n’ihe ndị dị n’elu. Olee otú ha ga-esi eme ya? Ọ bụ ịna-eme ihe gosiri na ihe kacha mkpa ná ndụ ha bụ ihe gbasara Jehova na Alaeze ya. (Luk 10:25-27) Ọ bụ ihe Kraịst mere. Anyịnwa kwesịkwara ime otú ahụ. (1 Pita 2:21) N’oge ndịozi Jizọs, echiche na-ezighị ezi na amamihe ụwa juru ebe niile. Ọtụtụ ndị na-achụkwa ego ọnwụ ọnwụ. Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị n’ụwa ochie a. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 10:5.) Anyị kwesịrị ime ka Jizọs ma ghara itinye aka n’ihe ọ bụla nwere ike ime ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma.

5. Olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị gbasara ịchụ akụnụba?

5 Ànyị na-achụ akụnụba otú ndị ụwa si achụ ya? Ọ bụ echiche anyị na omume anyị ga-eme ka a mata ihe anyị ji kpọrọ ihe. Jizọs sịrị: “N’ebe akụ̀ gị dị, n’ebe ahụ ka obi gị ga-adịkwa.” (Mat. 6:21) Anyị kwesịrị ịna-eme, anyị nọtụ, anyị echebara onwe anyị echiche ka anyị mata ebe obi anyị du anyị aga. Jụọ onwe gị, sị: ‘Àna m eji oge buru ibu eche ihe gbasara ego? Ihe na-echu m ụra ọ̀ bụ ihe gbasara ịchụ ego, inweta ọrụ ka mma, ma ọ bụ ịchọ otú m ga-esi biwe ndụ ndị oké ozu? Ka m̀ na-agba mbọ ilekwasị anya n’ihe gbasara ofufe Jehova?’ (Mat. 6:22) Ihe Jizọs kwuru gosiri na ọ bụrụ na ihe kacha anyị mkpa bụ ‘ịkpakọbara onwe anyị akụ̀ n’ụwa,’ o nwere ike ime ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma.—Mat. 6:19, 20, 24.

6. Olee otú anyị ga-esi merie n’ọgụ anyị na-alụso ihe ọjọọ na-agụ anụ ahụ́ anyị?

6 Ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, ọ dịịrị anyị mfe ime ihe na-adịghị mma. (Gụọ Ndị Rom 7:21-25.) Ọ bụrụ na anyị ekweghị ka mmụọ nsọ Chineke na-edu anyị, anyị nwere ike ime ihe ndị ahụ Baịbụl kpọrọ “ọrụ ndị dịịrị ọchịchịrị.” Ụfọdụ n’ime ha bụ “oriri oké mkpọtụ na ịṅụ oké mmanya, . . . mmekọahụ na-ezighị ezi na omume rụrụ arụ.” (Rom 13:12, 13) Ọ bụrụ na anyị chọrọ imeri n’ọgụ anyị na-alụso ‘ihe ndị dị n’ụwa,’ ya bụ, ihe ọjọọ ndị na-agụ anụ ahụ́ anyị, anyị kwesịrị ime ka uche anyị dịrị n’ihe ndị dị n’elu. Anyị ga-agbasi mbọ ike ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ya. Ọ bụ ya mere Pọl onyeozi ji kwuo, sị: “M na-etipụta ahụ́ m ọnyá, na-achị ya dị ka ohu.” (1 Kọr. 9:27) O doro anya na anyị kwesịrị ịna-arụ ahụ́ anyị ụka ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-agba ọsọ ndụ ahụ. Ka anyị tụlee otú ụmụ nwoke abụọ kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie si mee ‘ihe dị Chineke ezi mma.’—Hib. 11:6.

 EBREHAM ‘NWERE OKWUKWE N’EBE JEHOVA NỌ’

7, 8. (a) Olee nsogbu Ebreham na Sera nwere? (b) Olee ebe uche Ebreham dị mgbe niile?

7 Mgbe Jehova gwara Ebreham ka ọ kpọrọ ezinụlọ ya gaa biri n’ala Kenan, Ebreham mere ihe ọ gwara ya. N’ihi okwukwe Ebreham na otú o si rubere Jehova isi, ya na Jehova gbara ndụ. Jehova sịrị ya: “M ga-emekwa ka ị ghọọ mba ukwu, m ga-agọzikwa gị.” (Jen. 12:2) Ma, mgbe ọtụtụ afọ gara, Ebreham na Sera nwunye ya amụtabeghị nwa. Ọ̀ pụtara na Jehova echefuola nkwa ahụ o kwere Ebreham? Ihe ọzọ bụ na ihe adịrịghị ha mfe na Kenan. Ebreham na ezinụlọ ya hapụrụ ụlọ ha na ndị ikwu ha n’obodo Ọọ, bụ́ obodo bara ọgaranya na Mesopotemia. Ha gara ihe karịrị otu puku kilomita na narị isii tupu ha eruo Kenan. Mgbe ha ruru ebe ahụ, ha biri n’ụlọikwuu. Ụnwụ dakwara mgbe ụfọdụ. E nwekwara mgbe ndị ohi nyere ha nsogbu. (Jen. 12:5, 10; 13:18; 14:10-16) Ma, o nweghị mgbe ọ gụrụ ha agụụ ịlaghachi n’obodo Ọọ.—Gụọ Ndị Hibru 11:8-12, 15.

8 Obi Ebreham adịghị ‘n’ihe ndị dị n’ụwa,’ kama, o ‘nwere okwukwe n’ebe Jehova nọ.’ (Jen. 15:6) Uche ya dị n’ihe ndị dị n’elu, ya bụ, ọ na-eche mgbe niile gbasara nkwa Chineke kwere ya. Jehova hụrụ okwukwe Ebreham ma sị ya: “‘Biko, lelie anya n’eluigwe gụọ kpakpando ndị a ọnụ, ma ọ bụrụ na i nwere ike ịgụta ha.’ O wee gaa n’ihu ịsị ya: ‘Otú a ka mkpụrụ gị ga-adị.’” (Jen. 15:5) Ihe a mere ka obi sie Ebreham ike na Jehova echefubeghị ya. Mgbe ọ bụla Ebreham leliri anya elu hụ kpakpando, ọ ga-echeta nkwa ahụ Jehova kwere ya na mkpụrụ ya ga-adị ọtụtụ. Mgbe oge Chineke ruru, Ebreham mụtara nwa otú ahụ Jehova kwere ya ná nkwa.—Jen. 21:1, 2.

9. Olee otú ime ka Ebreham ga-esi mee ka anyị jiri ozi Jehova kpọrọ ihe?

9 Anyịnwa na-echekwa ka Jehova mezuo nkwa ndị o kwere anyị. (2 Pita 3:13) Ọ bụrụ na uche anyị adịghị n’ihe ndị dị n’elu, o nwere ike ịdị anyị ka Jehova ọ̀ na-egbu oge imezu nkwa ya. O nwekwara ike ime ka anyị ghara iji obi anyị niile na-ejere ya ozi otú anyị na-emebu. Dị ka ihe atụ, ò nwere ihe ụfọdụ ị hapụrụ n’oge gara aga ka i nwee ike ịbụ ọsụ ụzọ ma ọ bụ si n’ụzọ ọzọ jekwuoro Jehova ozi? Ọ bụrụ otú ahụ, i mere nke ọma. Ma, olee otú i si na-eme ugbu a? Cheta na o nweghị mgbe obi Ebreham pụrụ ‘n’obodo ahụ nke nwere ezi ntọala.’ (Hib. 11:10) O “nwere okwukwe n’ebe Jehova nọ, e wee gụọrọ ya nke ahụ dị ka ezi omume.”—Rom 4:3.

MOZIS HỤRỤ “ONYE AHỤ ANYA BỤ́ ONYE A NA-APỤGHỊ ỊHỤ ANYA”

10. Olee otú e si zụọ Mozis?

10 Mozis bụ onye ọzọ uche ya dị n’ihe ndị dị n’elu. Mgbe ọ na-eto eto, ‘a kụziiri ya ihe n’amamihe niile nke ndị Ijipt.’ Ihe a kụziiri ya abụghị obere ihe. N’oge ahụ, ọ bụ Ijipt na-achị ụwa. Mozis bikwa n’ụlọ Fero. Ihe a kụziiri Mozis mere ka “ọ dị ike n’okwu na n’omume.” (Ọrụ 7:22) Chegodị otú ihe a niile gaara esi mee ka ọ bụrụ nnukwu mmadụ n’Ijipt. Ma, uche Mozis dị n’ihe ka mkpa, ya bụ, n’ime uche Chineke.

11, 12. Olee ọzụzụ Mozis ji kpọrọ ezigbo ihe? Olee otú anyị si mara?

11 O doro anya na mgbe Mozis bụ nwatakịrị, mama ya bụ́ Jokebed kụziiri ya gbasara Chineke ndị Hibru. Mozis ji ihe a kụziiri ya gbasara Jehova kpọrọ ihe, ghọtakwa na ọ bara uru karịa ihe ọ bụla ọzọ. Ọ bụ ya mere o ji hapụ ihe  ndị ahụ gaara eme ka ọ bụrụ nnukwu mmadụ na onye a ma ama ebe ọ bụ na o bi n’ụlọ Fero. (Gụọ Ndị Hibru 11:24-27.) Ihe mama Mozis kụziiri ya na okwukwe o nwere na Jehova mere ka uche ya dịrị n’ihe ndị dị n’elu.

12 Ọzụzụ e nyere Mozis bụ agụmakwụkwọ kacha elu n’oge ahụ. Ma, ò ji ya chọwa otú ọ ga-esi bụrụ onye ukwu n’Ijipt, bụrụ onye a ma ama, ma ọ bụkwanụ chụwa akụnụba? Mba. A sị na o mere otú ahụ, ọ garaghị ‘ajụ ka a kpọọ ya nwa ada Fero ma họrọ ka e megbukọta ya na ndị Chineke kama ịnụ ụtọ mmehie ruo nwa oge.’ O doro anya na Mozis ji ihe a kụziiri ya gbasara Jehova mee uche Chineke.

13, 14. (a) Gịnị nyeere Mozis aka ka o ruo eruo ịrụ ọrụ Jehova ga-enye ya? (b) Olee ihe anyịnwa kwesịkwara ime?

13 Mozis hụrụ ma Jehova ma ndị Jehova n’anya. Mgbe ọ dị iri afọ anọ, o chere na ya eruola ịnapụta ndị Chineke n’ohu ha na-agba n’Ijipt. (Ọrụ 7:23-25) Ma, o nwere ihe Mozis kwesịrị ime tupu Jehova enye ya ọrụ ahụ. O kwesịrị ịmụta ịdị umeala n’obi, ịdị nwayọọ, inwe ndidi, na ịna-ejide onwe ya. (Ilu 15:33) E kwesịrị inye ya ụdị ọzụzụ ga-eme ka o nwee ike idi ọnwụnwa na nsogbu ndị ga-abịara ya. Afọ iri anọ o ji zụọ atụrụ nyeere ya aka ịmụta àgwà ọma ndị a.

14 Mozis ọ̀ mụtara ihe mgbe ahụ ọ na-azụ atụrụ? Ee. Baịbụl kwuru na Mozis “dị nnọọ umeala n’obi karịa mmadụ niile nọ n’elu ala.” (Ọnụ Ọgụ. 12:3) Ọ mụtara ịdị umeala n’obi. Ọ bụ ihe nyeere ya aka inwe ndidi mgbe ya na ụdị ndị dị iche iche na-emekọ ihe nakwa mgbe nsogbu bịaara ya. (Ọpụ. 18:26) Anyị kwesịkwara ịmụta àgwà ọma ndị ga-enyere anyị aka ịgafere “oké mkpagbu ahụ” ma baa n’ụwa ọhụrụ Chineke. (Mkpu. 7:14) Anyị na ndị mmadụ ànyị na-adị n’udo, ma ndị anyị chere na ha na-ewe iwe ọkụ? Anyị kwesịrị ime ihe Pita onyeozi gwara Ndị Kraịst ibe ya. Ọ sịrị: “Sọpụrụnụ ụdị mmadụ niile, hụnụ òtù ụmụnna dum n’anya.”—1 Pita 2:17.

OTÚ ANYỊ GA-ESI MEE KA UCHE ANYỊ DỊRỊ N’IHE NDỊ DỊ N’ELU

15, 16. (a) Gịnị mere uche anyị kwesịrị iji dịrị n’ihe ndị kwesịrị ekwesị? (b) Olee ihe mere Ndị Kraịst kwesịrị iji na-akpa àgwà ọma?

15 Anyị bi ‘n’oge dị oké egwu, nke tara akpụ.’ (2 Tim. 3:1) N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị chọrọ ka anyị na Jehova dịrị ná mma, anyị kwesịrị ime ka uche anyị dịrị n’ihe ndị kwesịrị ekwesị. (1 Tesa. 5:6-9) Ka anyị tụlee ụzọ atọ anyị nwere ike isi mee ya.

16 Àgwà anyị: Pita ghọtara na àgwà ọma dị ezigbo mkpa. Ọ bụ ya mere o ji kwuo, sị: “Na-emenụ omume dị mma n’etiti ndị mba ọzọ, ka o wee bụrụ na . . . ha ga-enye Chineke otuto . . . n’ihi ọrụ ọma unu nke ha ji anya ha na-ahụ.” (1 Pita 2:12) Anyị kwesịrị ime ike anyị niile ka àgwà anyị wetara Jehova otuto n’ụlọ anyị, n’ebe anyị na-arụ ọrụ, n’ụlọ akwụkwọ, n’ozi ọma, ma ọ bụ n’ebe anyị na-atụrụ ndụ. O doro anya na anyị na-emehie ihe n’ihi na anyị ezughị okè. (Rom 3:23) Ma, anyị ekwesịghị ịda mbà. Ọ bụrụ na anyị ‘ana-alụ ezi ọgụ nke okwukwe,’ Jehova ga-enyere anyị aka imeri n’ọgụ anyị na-alụso anụ ahụ́ anyị na-ezughị okè.—1 Tim. 6:12.

17. Olee otú anyị ga-esi nwee ụdị echiche Kraịst Jizọs nwere? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

17 Otú anyị si eche echiche: Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-akpa àgwà ọma, anyị kwesịrị inwe echiche kwesịrị ekwesị. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Nweenụ ụdị echiche a n’ime onwe unu bụ́ nke Kraịst Jizọs nwekwara.” (Fil. 2:5) Olee ụdị echiche Jizọs nwere? Ọ dị umeala  n’obi. Ọ bụ ya mere o ji jiri obi ya niile jeere Jehova ozi. Uche ya dị mgbe niile n’izi ndị ọzọ ozi ọma Alaeze Chineke. (Mak 1:38; 13:10) Jizọs weere na Baịbụl bụ o kwuchaa o bie. (Jọn 7:16; 8:28) Ọ mụsiri Akwụkwọ Nsọ ike ka o nwee ike ikwu ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru, kwado ya ma kọwaa ya. Ọ bụrụ na anyị adịrị umeala n’obi, jiri obi anyị niile na-eje ozi ọma, na-amụkwa Baịbụl, ọ ga-eme ka anyị na-eche echiche ka Jizọs.

Uche Jizọs dị mgbe niile n’izi ndị ọzọ ozi ọma Alaeze Chineke (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)

18. Olee ụzọ dị mkpa anyị nwere ike isi na-akwado ọrụ Jehova?

18 Otú anyị si akwado ọrụ Chineke: Ọ bụ uche Jehova ka ‘ikpere ọ bụla gbuo n’ala n’aha Jizọs, ma nke ndị nọ n’eluigwe ma nke ndị nọ n’elu ụwa ma nke ndị nọ n’okpuru ala.’ (Fil. 2:9-11) N’agbanyeghị na Chineke buliri Jizọs elu, Jizọs ji obi umeala na-eme uche Nna ya. Anyịnwa kwesịkwara ịna-eme otú ahụ. (1 Kọr. 15:28) Olee otú anyị ga-esi eme ya? Ọ bụ iji obi anyị niile na-arụ ọrụ a gwara anyị rụọ, ya bụ, ‘ime ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs.’ (Mat. 28:19) Anyị kwesịkwara ‘ịna-eme ihe ọma n’ebe mmadụ niile nọ,’ ya bụ, ịna-emere ma ndị agbata obi anyị ma ụmụnna anyị ihe ọma.—Gal. 6:10.

19. Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?

19 Obi dị anyị ụtọ na Jehova na-echetara anyị ka anyị mee ka uche anyị dịrị n’ihe ndị dị n’elu. N’ihi ya, anyị kwesịrị ‘iji ntachi obi na-agba ọsọ ahụ e debere n’ihu anyị.’ (Hib. 12:1) Ka anyị niile ‘jiri mkpụrụ obi anyị dum na-arụ ọrụ dị ka ọ̀ bụ Jehova ka anyị na-arụrụ ya.’ Anyị mee otú ahụ, Nna anyị nke eluigwe ga-agọzi mbọ niile anyị na-agba.—Kọl. 3:23, 24.